You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Peter Obi awụbala otu ndọrọndọrọ ọchịchị ADC

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Disemba 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa

  1. Igbo mụrụ nze mụọ ọzọ ndewonụ!

    Anyị ji obi ụtọ na-anabata gị n'izuụka Ekeresimesi a ma na-asị ka ahịa ị kpọsara ree onwe ya tupu ụbọchị Ekeresimesi eruo.

    Biko gbalịa nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

    Daalụ!

  2. Uzodimma egosila ụlọomeiwu Imo steeti bọjet afọ 2026

    Aka na-achị Imo Steeti bụ Hope Uzodimma echeela atụmatụ mkpata na mmefu ego nke afọ 2026 n’ihu ụlọomeiwu Imo steeti.

    Atụmatụ mkpata na mmefu ego ahụ dị otu tarị Naịra na ụma anọ (N1.439tr) bụ nke ọ kpọrọ “budget of economic breakthrough.”

    Uzodimma kpughere na atụmatụ mkpata na mmefu ego nke afọ 2026 ji pasenti iri asaa na asatọ karịa nke afọ 2025 dị narị ijeri Naịra asatọ na asaa (N807bn)

    O kwuru na nke a bụ maka na ego steeti ahụ na-eketa n’akpaego etiti nakwa ego ha na-akpatara onwe ha arịala elu.

    Gọvanọ Uzodimma kwuru na narị ijeri Naịra abụọ na iri atọ na asatọ na ụma ise (N238.5bn) nke nọchitere anya pasenti iri na isii na ụma isii nke bọjet ahụ ga-abụ maka ego ndị a na-emefu kwa mgbe kwa mgbe.

    Uzodimma kwukwara na otu tarị Naịra na ụma abụọ nke nọchitere anya ihe ruru pasenti iri asatọ na atọ na ụma anọ nke bọjet ahụ ga-abụ maka ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ.

    Nke a ka Uzodimma kọwara dịka ihe na-egosi njikere gọọmenti ya dị ịrụnye ngwongwo e ji enyere ndụ aka, ma kwalite akụnaụba Imo steeti.

  3. Ọ bụghị eziokwu na e zubatara ụfọdụ ihe n’iwu ụtụisi Naịjirịa – Obi ọchịchị

    Obi ọchịchị Naịjirịa azọbatala ụkwụ ma tinye ọnụ n’ọgbaaghara zutere iwu ụtụisi ọhụrụ, bụ nke gọọmenti sị ha ga-amalite itinye n’ọrụ n’ụbọchị 1 Jenụwarị, 2026.

    Ọnọdụ a na-abịa dịka onye bụbu osote onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abubakar, onye ji aha Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n’afọ 2023 bụ Peter Obi na otu ndị ọzọ kpọrọ oku ka a kwụsịtụ itinye iwu ahụ n’ọrụ.

    Cheta na otu onye omeiwu nnọchiteanya bụ Abdulsamad Dasuki pụtara na nso nso a gosi mmetụta gbasara ihe ọ kọwara dịka ndịiche n’etiti iwu ụtụisi nke ụlọomeiwu Naịjirịa nabatara na nke gọọmenti chịkọtara ma wepụtara ọhanaeze.

    Dasuki kwuru na emetọọla ikike ya dịka onye omeiwu n’ihi na ihe dị n’ime iwu ụtụisi nke gọọmenti chịkọtara egosipụtaghị ihe ndị omeiwu rụrịtara ụka ma nabata n’ime ụlọomeiwu.

    Mana oge ọ na-ekwu okwu n’ụlọmgbasaozi Channels TV n’ụbọchị Mọnde 22 Disemba 2025, Onyeisi otu kọmitii nke Onyeisiala hiwere maka mmegharị ụtụisi bụ Taiwo Oyedele sịrị na akụkọ ahụ a na-ebugharị ebe niile abụghị eziokwu.

  4. E gbuola ọchịagha ndịagha mba Rọshịa na mwakpo mere na Mosko

    Ọchịagha mba Rọshịa anwụọla na mwakpo e mere na Mosko.

    Ụlọọrụ kọmitii na-eme nnyocha kwuru na Ọchịagha Fanila Sarvarov nwụrụ n’ụtụtụ Mọnde 22 Disemba, 2025 oge ogbunigwe e tinyere n’okpuru ụgbọala gbawara.

    Otu kọmitii ahụ kwuru na Sarvarov bụ onyeisi na-ahụ maka ọzụzụ ndịagha.

    Ha kwuru na a na-eme nnyocha iji chọpụta ka aka mba Yukren a dị n’ọnwụ ọchịagha a. Mana mba Yukren ekwubeghị ihe ọbụla banyere nke a.

  5. Peter Obi akatọọla ụlọ omeiwu maka ha emeghị ka iji ego azụta vootu bụrụ ịda iwu

    Naịjirịa Peter Obi jibu otu ndọrọndọrọ ọchịchị Labour Party zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 akatọọla etu ndị omeiwu nnọchiteanya si ghara ime ka ịzụta vootu n’oge ndị pati na-ahọpụta onye ga-eji otu ha zọọ ọkwa ọchịchị dịka ịda iwu Naịjirịa.

    Peter Obi ji akara soshal midịa X ya kwuo nke a, ma kọwaa ịtụ mgbere vootu dịka ọrịa kansa dịịrị ntọala ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa.

    N’okwu ya “iji ego azụta vootu ga-akwụsịrịrị”. “N’abalị gara aga ka a na-atụ anya na ụlọomeiwu nnọchịtaanya ga-enwe mkpebi banyere ịzụta vootu, maka na ọ bụ nke na-emebi ọchịchị onye kwuo uche ya nakwa ntụkwasịobi e nwere n’ala anyị”.

    “Mana olileanya e nwere ebe ndị ụlọ omeiwu nọ gbasara nke a akpụọla afọ n’ala”. Ọ gara n’ihu kwuo na “agaghị ahazi ezigbo ntuliaka n’usoro na-anabata mpụ, ebe ọganịhu Naịjirịa agaghị apụta ihe ebe a na-enye ngarị."

    Peter Obi kwuru sị “Ịkwụsị ndị mmadụ ịzụ vootu kwesịrị ibido mgbe pati na-ahọpụta ndị ga-eji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa ọchịchị, ma kwuo na a hapụ nke a Naịjirịa agaghị enweike kwụsị ire na ịzụta vootu kpamkpam”.

    “Ọchịchị onye kwuo uche ya n’ebe a na-ere maọbụ na-azụta vootu abụghị nke ezigbo ya, kama ọ bụ ebe ndị ekperima na-atụ mgbere."

    Obi bụ onye katọrọ etu ire na ịzụta vootu n’oge ọbụla a na-azọ ihe ọbụla jụrụ sị kedụ mgbe a ga-akwụsị ajọ ihe na-emetọ Naịjirịa?

  6. Akatọọla ọnụ ọgụgụ ndị a mara ikpe ọnwụ na mba Saụdị Arabịa

    Mba Saụdị Arabịa emeela gahee ọnụ ọgụgụ mmadụ ole ha na-ama ikpe ọnwụ kwa afọ.

    Opekatamkpe mmadụ 347 ka a mara ikpe ọnwụ n’afọ a mana ọ bụ mmadụ 345 n’afọ 2024.

    A na-ahụta afọ a dịka afọ a kachasị gbuo ndị mmadụ kamgbe e bidoro na-etinye anya n’ihe na-eme na Saụdị.

    N’ikpeazụ a, mmadụ abụọ a na-achọ igbu bụ ndị mba Pakistani ụlọikpe mara ha ikpe maka ịda iwu metụtara ọgwụike.

    Ndị ọzọ gunyere onye ntaakụkọ, nakwa ụmụnwoke abụọ bụ ụmụaka mgbe e jidere ha maka ebubo ịda iwu metụtara ngagharịiwe. Ndị ọzọ bụ ụmụnwaanyị ọnụ ọgụgụ ha dị ise.

    Mana ndị ọchịchị na Saudi azabeghị ajụjụ BBC jụrụ ha banyere etu ọnụ ọgụgụ ndị ha na-ama ikpe ọnwụ sị arị elu.

    Onye na-ahụ maka ndị a mara ikpe ọnwụ na mpaghara Afrịka na Asia bụ Jeed Basyouni sị na Saụdị na-emetọ ikike dịrị mmadụ.

    N'ime ndị e gburu n'afọ a gunyere Abdullah al-Derazi na Jalal al-Labbad bụ ndị e jidere mgbe ha ka bụ ụmụaka.

  7. Ndị ojiegbe egbuola mmadụ itoolu na mwakpo ụlọ oriri na ọṅụṅụ mba Saụt Afrịka

    Ndị uweojii mba Saụt Afrịka amalitela ịchọ ndị ojiegbe e kwuru na ha wakporo ma gbuo mmadụ itoolu ebe mmadụ iri ọzọ merụrụ ahụ n’ụlọ oriri na ọṅụṅụ dị na mpaghara Johannesburg.

    E kwuru na ndị ojiegbe ahụ ruru 12 ji ụgbọala abụọ wuchie na Bekkersdal ma malite ịgba ndị nọ n’ụlọ oriri na ọṅụṅụ ahụ egbe.

    Ndị uweojii katọrọ ajọ agwa ahụ ma kwuo na ha amalitela ime nnyocha iji chọpụta ma nwụchie ndị ojiegbe ahụ.

    Cheta nnyocha ụlọọrụ United Nations Office on Drugs and Crime mere na 2023/2024 kwuru na mba Saụt Afrịka bụ mba kachasị nwee akụkọ ogbugbu ndị mmadụ. Ha kwuru na a na-egbu mmadụ 45 n’ime mmadụ otu puku narị.

    Na mmalite ọnwa Disemba 2025, ndị ojiegbe gbagburu mmadụ iri na otu gụnyere otu nwatakịrị n’ụlọ obibi dị na Pretoria

  8. Ụtụtụ ọma ndị ọma anyị ji eme ọnụ

    Ọ bụ obi ụtọ ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde 21 Disemba, 2025.

    Anyị ji akụkọ ndị ahụ gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile.

    Sonyere akara soshal midịa anyị niile maka akụkọ foto na vidio ndị anyị ji bịa taa,

    Ndewo.

  9. Anthony Joshua ajụwaala Jake Paul agba, e buga ya ụlọọgwụ

    Otiọkpa nwa afọ Naijiria na-etiri Ingland ọkpọ Anthony ajụwala ogbo ya bụ Jake Paul agba dịka ha zutere n'ọgụ ha lụrụ na Miami, mba Amerịka na ngwụcha izuụka a.

    Joshua onye kpụrụ Paul n'agba nke isiii nke ọgụ ahụ kwuru na " Obi kara ịtọ m ụtọ ma ọ bụrụ na m m koụrụ ya na mbido, mana dịka anyị sị hụ ya, KJake nwere mmụọ, nwee obi. Ọ nwara oko ya."

    Jake nwetara onwe ya n'ụlọọgwụ dịka Joshua meriri n'asọmpị ahụ nke bụ okwu akpụ n'ọnụ ugbua na soshal midia.

    Jake sọrọ ganiganị ka nwa atụrụ malite na mbido rue n'ọgwụgwụ asọmpi ahụ dịka ọ kụtalighị Joshua ọkpọ.

    Nke a bụ nke ugboro 29 Anthony Joshua na-emerị n'ọgụ 33 ọ lụọrọla dịka otiọkpọ.

  10. Ndị uweojii anwụchiela nwaanyị rere nwa ya N1.5m

    Aka ndị uweojii Delta Steeti akparala otu nwaanyị rere nwa ọhụrụ ya dị ọnwa abụọ na Delta Steeti.

    Nwaanyị ahụ a kpọrọ 'Rita' gbara afọ 28, kụnyere otu nwaanyị bụ nwunye ụkọchukwu nwa ya n'ọnụ ego otu nde nara na ụma ise.

    Nwaanyị ahụ gara ogige ndị uweojii dị n' Ekpan dị na Delta Steeti inye mkpesa na a wakporo ya ma tọọrọ nwa ọhụrụ ya.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Delta Steeti bụ Bright Edafe kwuru sị,"O rere nwa ya, gaa n'ogige ndịuweojii nye mkpesa na a tọọrọ nwa ya."

    Nwaanyị ji ụmụ atọ kọwara na ihe mere ya ji gaa mkpesa n'ogige ndị uweojii bụ iji mesaa ndị nọ ya nso anya ka ha ghara ịmata ihe mere nwa ya.

    "Obi m nwa m na-eme m m were begaara m nwa nwanne nna m akwa sị ya na a tọọrọ nwa m, ọ sị m gaa nye mkpesa n'ogige ndị uweojii."

    Ikuku kuru ahụ ike ọkụkọ dịka nwaanyị ji egwu kwupụta nke bụ eziokwu n'ihe mere ma lọghachi gwa onyeisi ogige ndị uweojii na mkpesa ahụ o nyeburu bụ ụgha.

  11. Trump amachiela atụmatụ iji 'visa lottery' abata Amerịka

    Onyeisiala mba Ameríka bụ Donald Trump ekwuola na ohere usoro iji ịgba chaa chaa gbata akwụkwọ ikike ibi na mba agaghị adikwa ọzọ.

    Nke a na-abịa dịka otu nwoke gbagburu mmadụ abụọ na mahadum 'Brown University' dị n' Amerịka n'ụbọchị Wenezde.

    Onye a na-enyo gbara ya bụ egbe bụ Claudio Neves Valente, gbara afọ 58c, gburu otu nwa akwụkwọ onye Portugal na-agụ akwụkwọ na mahadum, 'Massachusetts Institute of Technology'.

    Ndị ọrụ nchekwa mechara hụ ozu Valente bụ onye ji ohere ịgba chaa chaa maka akwụkwọ ikike mbata (visa lottery) were bata Amerịka n'afọ 2017.

    E nyekwara ya akwụkwọ ikike ibiri ebighi ebi n'Amerịka nke a kpọrọ 'Green Card' na Bekee.

    Odeakwụkwọ na-ahụ maka ihe na-eme n'ụlo nke Amerịka bụ Kristi Neom kwuru na a ga-akwụsịgodi atụmatụ a dịka Trump nyere iwu, sị na ndị Amerịka agaghị anọrọ n'ụlọ nọpịa mkpụrụ amụ n'ihi atụmatụ ahụ.

  12. E gbochiela nnukwu ọdachi, dịka tanka mmanụ ụgbọala dara n’Aba

    E gbochiri ihe gaara abụ nnukwu ọdachi n’abalị Fraịde 19 Disemba 2025, oge tanka bu mmanụ ụgbọala dị lita puku iri atọ (30,000) kpugharịrị n’ahịa Good Morning dị n’Aba, n’Abịa steeti.

    Ihe mberede a mere n’ugwu dị n’okporoụzọ Ngwa Road, n’akụkụ ahịa Good Morning na-ekwo ekwo.

    Akụkọ kwuru na ụgbọala tanka ahụ dara oge ọ na-apụghị ịghọta onwe ya nke ọma, ma nọchie okporoụzọ niile, dịka ụjọ bịara ndị mmadụ na o nwereike ịgba ọkụ.

    Ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ etiti na nke Abịa steeti jiri ọsọ na ije gbata ọsọ enyemaka ma gbochie ihe ahụ gaara abụ nnukwu ọdachi.

    Onye ụlọọrụ mgbanyụ ọkụ etiti bụ Ndubueze Kelechi kwuru na ụlọọrụ ha nwetara ozi gbatagbata mgbe ọ fọdụrụ ihe dịka nkeji iri abụọ ka ọ kụọ elekere iri na abụọ nke etiti abalị n’ụbọchị Fraịde 19 Disemba, 2025 gbasara ihe mberede ahụ.

    “Anyị zipụrụ ndị ọrụ anyị ozugbo gaa n’ogige ahụ, ma gbochie mmanụ ụgbọala ndị kwafuru akwafu ịbara ọkụ,” ka Maazị Ndubueze kwuru.

    Ka o sina dị, n’ụtụtụ Satọde 20 Disemba, 2025 ka e zipụrụ ụgbọala payloader gara bupụ tanka ahụ n’okporoụzọ.

  13. A tụnyela nwaanyị rere nwa obido ya ọkụ n'otele n'ụlọmkpọrọ

    Ọkaikpe n'ụlọikpe Majie di n'Owere, Imo steeti, enyela iwu ka a tụnye otu nwaanyị gbara nwaobido ya ọkụ n'otele n'ụlọmkpọrọ ganye na-e kpebie ikpe ya.

    Ndị uweojii nwụchiburu Juliet Igwe gbara afọ 38 n'Oha dị n'Ideatọ-North, Owere, maka iji ọkuụ mpanaka (candle) ree nwata dị afọ ise ya na ya bi ma manye aka abụo nwata ahụ na mmiri ọkụ n'ihi ebubo na nwata ahu zuru anụ dị n'ite nri.

    Akwụkwọ e jiri kpubụ nwaanyị ahụ ụlọikpe boro ebubo sị, nwere ebunobi igbu (nwata anyị achọghị ịkpọ aha ya), gbara afọ ise site na iji ọkụ mpanaka ree ya n'otele ma manye ya ka o tinye aka abụọ na mmiri ọkụ nke merụụ ya nnulkwu ahụ ma megide akụkụ nke 320 n'Iwu Ọwụwa Anyanwụ Naijiria nke afọ 1963."

    Onye dara iwu a nwere ike irite nga mkpụrụ ọka dịak ntaramahụhụ.

  14. Ezinaụlọ ọkụ gbara ụlọ ha n’Abia Steeti arịọla enyemaka gọọmenti

    Mazị Godwin Nwosu na nwunye ya si okpuru ọchịchị Arochukwu dị n’Abia steeti ebeela akwa arịrị begara gọọmenti Abia steeti nakwa ndị ọzọ nwere obi ọma ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka dịka ọkụ gbariri ụlọ ha na ezinaụlọ ha.

    Di na nwunye ahụ kwuru na ọkụ ahụ gbara ụlọ ha dị n’Agbama Housing Estate, Umuahịa n’abalị Tuzde 16 Disemba, 2025 ma kwuo na ọ bụ site n’amara chineke ka ụmụaka anọ ha ji jiri ndụ ha pụta n’ọkụ ahụ.

    Ha kwuru na ọ bụ ihe e ji amụ ọkụ kandụl kpatara ọkụ ahụ. Ha kwuru na ụmụaka ha mụnyere ọkụ kandụl ahụ iji gụọ akwụkwọ n’abalị ma kwuo na ọkụ ahụ gbariri ihe niile ha nwere.

    Nwunye Godwin Nwosu kwuru na ọ bụ ya zụtara kandụl ahụ maka na ha enweghị ọkụ latrik na mpaghara ha bi kemgbe.

    Ha gara n’ihu kpọọ oku maka enyemaka gọọmenti nakwa ndị ọzọ nwere obi ọma ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka n’oge ihe isi ike.

  15. Ihe Tinubu kwuru dịka o bugaara Ụlọomeiwu bọjet afọ 2026

    Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu ekwuola na malite n'ọnwa Maachị afo 2026, Najịrịa ga-akwụsị iwepụta ọtụtụ bọjet n'otu afọ.

    Tinubu kwuru nke a n'Ụlọọmeiwu dị n'Abuja dịka ọ gara bunye ndị omeiwu akwụkwọ bọjet afọ 2026 ka ha omeiwu binye ya ụbọchị Fraide.

    Ọ sịrị, "Malite n'ọnwa Maachị afo 2026, Najịrịa ga-akwụsị iwepụta ọtụtụ bọjet n'otu afọ, ma laghachi n'usoro iji ego a tụrụ anya ịkpata n'afọ rụọ ihe a tụrụ anya ịrụ n'otu afọ ahu."

    Tinubu kwekwara nkwa na ọchịchị ya ga-enye uchu na nchekwa, agụmakwụkwọ, ahụike,ewumewu, ọrụugbo nakwa nchekwa nri n'afọ 2026.

    Ọ sịrị," 2026 ga-abụ omume omume, ịchụta ego nakwa igosi etui e si mefuo ego.

    " Anyị ga-akwalite ntụkwasịobi site na a na-ekwu ekwu, a na-eme eme."

    O kelere ụmụ Naijiria maka ndidi ha na nkwado ha nyere ọchịchị ya.

    Bọjet afọ 2026 nke ọnụego ya a dị tarị 58.18(N58.18 tn) bụ nke Tinubu kpọrọ "Bojet maka iwulie nke a na-arụ arụ' bu nke a gbakorọ ọnụ ego ya n'ọnụ N1400 maka otu dọla, ebe ọ bụbụ N1500 maka otu dọla n'afọ 2025.

    N'ọsịsa ya, Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu bụ Godwin Akpabio kwuru sị, " "Onyeisiala, ụlọ bụ ụlọ gị. O nweghị ihe na-eme. Anyị kwụ gị n'azụ."

  16. Ngalaba ikpe ziri ezi, ndị ọnụ na-eru n’okwu chọrọ ka a kagbuo ikpe ọnwụ maka ndị ntọrị

    Ndị ọnụ na-eru n’okwu na ngalaba ikpe ziri ezi, nchekwa na ikike nke mmadụ agbaala ụkwụ megide atụmatụ Ụlọomeiwu Sịnetị chọrọ ka e kwupụta ntọrị dịka iyi ndụ egwu, ma mee ka ntaramaahụhụ ya bụrụ ikpe ọnwụ.

    Ha kwupụtara nke a n’oge nnụrụ uche ọhanaeze nke Kọmitii Ụlọomeiwu Sịnetị na-ahụ maka ikpe ziri ezi, ikike nke mmadụ na okwu iwu haziri.

    Nnukwu Ọkaiwu Naịjirịa nakwa Minista ikpe ziri ezi bụ Lateef Fagbemi dọrọ aka na ntị na ikpe ọnwụ enweghị ike ịkwụsị ntọrị, kama ọ ga-eme ka ọnọdụ enweghị nchekwa Naịjirịa kawanye njọ.

    Fagbemi kwukwara na atụmatụ iwu ahụ nwereike ịkụnye ụkwụ na mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ, dịka ọ sịrị na ọtụtụ mba dị iche iche nwereike jụ ịkpọlata ndị a na-ebo ebubo ntọrị, ma mee ka ndị bara ọgaranya gbanarị ikpe nkwụmọtọ.

    Otu National Human Rights Commission (NHRC) katọkwara atụmatụ iwu ahụ, ma gwa ndị omeiwu ka ha tụlee etu iwu niile ha wepụtara ga-esi metụta ikike nke mmadụ.

    N’ọzọ yiri nke ahụ, otu jikọtara ndị Ọkaiwu Naịjirịa bụ Nigerian Bar Association (NBA) kpọrọ oku ka a saa anya mmiri, dịka ha kwuru na e kwesịrị ikwupụta ntọrị ka iyi ọha egwu naanị mgbe ha nwere otu ndị ọzọ ha na ha na-agbakọ aka iji yijaa ọhanaeze maọbụ manye gọọmenti.

    NBA kpọrọ oku ka e were ntaramaahụhụ ndị dịka mkpọrọ ọka gbanwee ikpe ọnwụ ndị omeiwu kwupụtara.

    Ka ọ dị, ndị kọmitii Ụlọomeiwu Sịnetị kwere nkwa na ha ga-elebara mkpesa niile anya nke ọma dịka ha na-aga n’ihu na mkparịtaụka gbasara atụmatụ iwu ahụ.

  17. Ọgbaaghara adaala na Bangladesh dịka a gbagbuchara onyendu ndị ntoroọbịa

    Ngagharịiwe etiwapụla na Bangladesh n’ihi ọnwụ onyendu ndị ntoroọbịa bụ Sharif Osman Hadi.

    Hadi bụ otu onye gbapụtara ihe na ngagharịiwe e jiri chụpụ onye bụbu Praịm Minista Bangladesh bụ Sheikh Hasina n’afọ 2024.

    Nwaokoroọbịa ahụ nwụrụ n’otu ụlọọgwụ dị na Singapore n’abalị ụnyaahụ, dịka ọ gachara otu izuụka ndị ojiegbe fụchiri ihu wakporo ya na Dhaka ma gbaa ya egbe.

    Ọ na-akwado isonye na ntuliaka a ga-ahazi n’ọnwa Febụwarị, nke mbụ ya kemgbe e wepụrụ ya n’ọkwa.

    N’abalị, ndị ngagharịiwe wakporo ụlọọrụ akwụkwọ akụkọ ndị a ma ama na Bangladesh bụ The Daily Star na Prothom Alo ma mụnye ha ọkụ.

    Ngagharịiwe ahụ agaala n’ihu n’ụbọchị taa, dịka a tụrụ anya na a ga-esi Singapore bughachi ozu Hadi na Dhaka mgbe ọ ga-akụ elekere isii nke mgbede na mba ahụ.

  18. A tụọla dọkịta ji nsi gbuo mmadụ 12 nga mkpụrụ ọka

    A tụọla otu dọkịta ọrụ ya bụ ịgba ndị a chọrọ ịwa ahụ ọgwụ ụra nga mkpụrụ ọka maka ịma ụma gbaa mmadụ 30 nsi, ebe 12 n'ime ndị ahụ nwụrụ pịị.

    Frédéric Péchier gbara afọ 53 bụ onye a mara ike dịka e kpechara ikpe ọnwa anọ n'obodo Besançon dị na mba Fransị

    Akụkọ kwuru na Péchier na-agbanye kemịkal a kpọrọ 'potassium chloride' maọbụ 'adrenaline' 'n'ime 'drip' ndị ahụ adịghị.

    otu onye kachasị bụ obere nwa na ndị o mere ya bụ ihe bụ nwata dị afọ anọ bụ onye nwere nsogbu mkpọchi obi (cardiac arrest) ugboro abụọ dịka a na-awa ya ahụ maka nsogbu akpịrị(tonsil) ma dịkwa ndụ ọzọ nke mere n'afọ 2016. Onye kachasị okenye na ndị danyere n'aka ya gbara afọ 89.

    Ndị okpeikpe gwara ya sị, "Ị bụ Dọkịta Ọnwụ, onye nsi, ogbu ọchụ. I wetara ihe ihere n'ebe ndị dọkịta no. Tụgharịa ụlọgwụ ọ bụrụ iliozu."

  19. Praịm Minista mba Ọstrelịa kwuru na ya ga-amalite ibu agha megide okwu mkpọrọmasị

    Praịm Minista mba Ọstrelịa bụ Anthony Albanese ekwuola na gọọmenti mba ahụ ga-amalite ibu agha megide okwu mkpọrọmasị.

    Albanese kwuru na nke a bụ maka egbe ọjọọ a gbara n’ụbọchị Sọnde na Bondi Beach, nke lekwasara anya n’emume ndị Juu.

    E gburu mmadụ iri na ise, oge ndị ojiegbe abụọ gbara egbe aghara aghara n’otu emume e ji echeta ụbọchị mbụ nke Hanukkah.

    Iwu ọhụrụ a ga-abụ maka “ndị na-efesa mkpọrọmasị, nkewa na imefe ihe oke”, ka Albanese gwara ndị ntaakụkọ na Canberra.

    A ga-enyekwa Minista na-ahụ maka ihe ndị na-eme na mba ahụ ikike ọhụrụ iji kagbuo maọbụ jụ inye ndị na-efesa mkpọrọmasị akwụkwọ visa.

  20. Igbo bụ Igbo, mmamma nụ, Ọfọ anyị taa bụ ndụ mmiri, ndụ azụ.

    Anyị na-ebutere gị abọ ekele maka isonyere anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tọzde Nkwọ, 18 Disemba, 2025.

    N'ụtụtụ a, ọ bụ gị na Chinonso Ugorji ga-anọrị tupu Uche Akolisa, Michael Ngene na Michael Ilediagu eburu oche n'oge ehihie.

    Gaa n'ihu sonyere anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ, iji nweta akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ụwa.

    Nnọọ!