You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Peter Obi awụbala otu ndọrọndọrọ ọchịchị ADC

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Disemba 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa

  1. Atụmatụ mbịbịego ₦20trn gosiri na Gọọmentị Etiti etinyebeghị bọjet 2025 n'ọrụ - Peter Obi

    Aka chịbụrụ Anambra steeti bụ Peter Obi akatọọla atụmatụ ọhụrụ Gọọmentị Naijiria na-atụ iji gbata mmbii ọhụrụ ọnụego ya dị tarị iri abụọ (N20trillion).

    Gọọmentị Etiti na-achọ nkwado ụlọomeiwu igbata mbibi ego dị tarị naira iri abụọ maka bọjet afọ 2026.

    Mana Obi kwuru n'ozi o wepụtara ụbọchị Fraide na atụmatụ ahụ dị njọ.

    " Kedụ ka anyị ga-esi na-ekwu okwu ibi ego ọzọ maka 2026 oge anyị ka na-etinye bọjet afọ 2024 n'ọrụ?

    " Ihe nke a gosiri bụ na a kpabeghị bọjet afọ 2025 aka. Kedụ ebe ego a kpatara na afọ 2025 dị ọbuladị dịka a gwara anyị kemgbe ọnwa Ọgụstụ na ego akparatala akarịala ihe a tụrụ anya n'afọ 2025."

    Obi gbarụrụ ihu na Gọọmentị Etiti na-agba mbibi a na-eri n'ọnụ, na- abụghị nke e ji akwado mwulite ewumewu na-enyere ndụ na azụmahịa aka.

  2. Agha agaala n’ihu n'etiti Taịland na Kambodịa dịka Trump kpọchara oku maka udo

    Ọgbaaghara agaala n’ihu n’okeala mba Taịland na Kambodịa, dịka ọ gachara elekere ole na ole onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump kwuru na mba ndị ahụ gbara onwe ha agbataobi ekwetala ịkwụsị ọgụ.

    N’ozi o bipụtara na soshal midịa, Praịm Minista mba Taịland bụ Anutin Charnvirakul kwuru na mba ya ga-aga n’ihu na-agbaso usoro ndịagha, ruo mgbe ọ dị ha ka ụmụafọ ha anọzighị n’ize ndụ.

    Na mbụ ka mịnịstrị nchekwa mba Kambodịa kwuru na ụgbọelu mba Taịland tụrụ ogbunigwe n’ụlọ oriri dị iche iche nakwa n’akwammiri.

    Taịland kwuru na ọtụtụ mmadụ nkịtị merụrụ ahụ oge mba Kambodịa tụrụ ogbunigwe rọket.

    Opekatampe mmadụ iri abụọ anwụọla ebe puku kwuru puku ndi ọzọ kwapụrụla n’ụlọ ha n’ime ụbọchị isii gara aga.

  3. Ndịagha nnupuisi ekposaala nkwekọrịta udo Trump mere na DR Kongo

    Onye nnọchiteanya Amerịka n’Otu Mbaụwa eboola Rụwanda ebubo idubanye mpaghara ‘Great Lakes’ nke Afrịka n’agha.

    Nke a bụ dịka ọ gachara naanị otu izuụka e binyere aka na nkwekọrịta udo na Washington, iji kwụsị agha dị kemgbe afọ iri.

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump toro nkwekọrịta ahụ onyeisiala DR Kongo bụ Félix Tshisekedi na onyeisiala Rụwanda bụ Paul Kagame nwere dịka “nke ahụbeghị ụdị ya mbụ” nakwa “nnukwu ụbọchị maka Afrịka, nnukwu ụbọchị maka ụwa niile”.

    Mana ndịagha nnupụisi M23 kwuru na ha “anapụtala” obodo Uvira, n’otu agha ha buru, bụ nke ndị ọchịchị Amerịka na Yurop kwuru na ọ bụ Rụwanda kwadoro ya.

    N’oge gara aga ka ndị ọkachamara n’Otu Mbaụwa boro ha ebubo “isi n’azụ” na-akwado ndịagha nnupuisi ahụ.

    Rụwanda agọpụla onwe ha n’ebubo ahụ, mana njem ha gara na Washington bụ iji gosi na o nwere ihe jikọtara ha na otu M23.

    Ndịagha nnupuisi ahụ esoghị binye aka na nkwekọrịta udo Trump mere, kama ha agaala n’ihu na-esonye n’usoro nkwekọrịta udo nke Qatar nọ n’isi ya.

  4. Igbo bụ Igbo, mmamma nụ, Ọfọ anyị taa bụ nke onye chiri, ya zere!

    Anyị na-ebutere gị abọ ekele maka isonyere anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde Afọ, 13 Disemba, 2025.

    N'ụtụtụ a, ọ bụ gị na Chinonso Ugorji ga-anọrị, tupu Uche Akolisa eburu oche n'oge ehihie.

    Gaa n'ihu sonyere anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ, iji nweta akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ụwa.

    Nnọọ!

  5. Di m na-agbalị n'ọrụ nchekwa- Remi Tinubu

    Nwunye Onyeisiala Naijiria bụ Remi Tinubu akpọọla oku ka ụmụafọ Naijiria jaa di ya bụ Onyeisiala Bola Tinubu ike n'ihi ọrụ ya n'okwu gbasara nchekwa.

    Remi Tinubu kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ ọkwụ n'ụbọchị Tọzde n'Abuja n'emum nriko Ekeresimesi ọ haziri ụmụaka.

    Ọ rụtụrụ aka na ọ bụ gọọmentị Onyeisiala Tinubu kachasị mee ngwangwa n'ịzọpụta ụmụaka a tọọrọ na nsonso a, ma kwuo "Kweta na di m na-agbalị, anyị na-agbasi mbọ ike maka nchekwa ụmụ Naijiria."

    Ọ gara n'ihu kwuo na ichekwa ala Naijiria bụ ebe e nwere mmadú ọnụgụgụ ha karịrị narị nde abụọ na iri ise(250m) adịghị mfe.

  6. Ndị nchekwa Amerịka ejichiela ụgbọmmiri si Naịjirịa

    Ndị nchekwa ụzọ mmiri na-arụrụ ndịagha mmiri mba Amerịka bụ Coast Guards ejichiela ụgbọmmiri ‘supertanker’ nke nwaafọ Naịjirịa n’ihi ebubo izu ohi mmanụ agbịdị na ihe ndị ọzọ.

    Ụgbọmmiri ahụ dị afọ iri abụọ akara ya bụ 9304667 bụ nke a kpachiri oge nnyocha kpalitere ozi ọkụ gbasara njem ya.

    Ọ bụ eziokwu na ụgbọmmiri ahụ bụ nke ụlọọrụ Thomarose Global Ventures Ltd. dị na Legọs Steeti, mana ụlọọrụ a maara debanyere aha ya bụ Triton Navigation Corp. dị na Marshall Islands.

    Ndị ọchịchị Amerịka kwuru na ọ bụ ndị nchekwa Amerịka jichiri ụgbọmmiri ahụ.

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald kwupụtara maka ya n’ụbọchị 10 Disemba, ma kọwaa ya dịka otu akụkụ mbọ ha na-agba izute nsogbu ndị si ụzọ mmiri e chere mba ahụ aka mgba.

  7. Ọhanaeze ndị ọma, unu abọọla chi?, Ka Chukwu gọzie onye niile taa!

    Anyị ji obiọma na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde Orie, 12 Disemba, 2025.

    N'ụtụtụ a, ọ bụ gị na Chinonso Ugorji ga-anọrị, tupu Uche Akolisa na Michael Ngene eburu oche n'oge ehihie.

    Gaa n'ihu sonyere anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ, iji nweta akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ụwa.

    Nnọọ!

  8. Ụlọikpe akwụsịla nkwekọrịta mba Kenya na Amerịka nwere maka ahụike

    Ụlọikpe na mba Kenya akwụsịla mmejupụta nkwekọrịta ha na mba Amerịka nwere nke metụtara enyemaka ahụike si mba Amerịka.

    Ha kwụsịrị nke a n'ihi egwu metụtara ozi na ndekọ nke onye (ya bụ persona data n'asụsụ bekee).

    Kenya na Amerịka nwere nkwekọrịta ego ya ruru ijeri dọla abụọ na ọkara.

    Nke a na-abịa dịka otu na-agba mbọ maka ichekwa ikeike ndị na-azụ ahịa gbara akwụkwọ i ji kwụsi inyefe ozi nke onye maọbụ ndekọ ahụike nke ụmụamala Kenya n'aka mba ọzọ.

    Na mkpebi ụlọikpe gbachiri ndi ọrụ gọọmentị mba Kenya inyefe ozi nke onye, ikesa maobụ nyefee ozi metụtara ahụike ndị amala ha.

    Kemgbe Kenya na Amerịka nwere nkwekorịta a, ọchịchi Donald Trump na mba ndị ọzọ dị n'Afrịka enweela nkwekọrịta yiri ya bụ nke Amerịka ji ahazigharị mmekọrịta ya na mba ndị ọzọ n'ihe gbasara atụmatụ enyemaka Amerịka na-enye mba ndị ọzọ.

  9. Ngozi Okonjo-Iweala esonyela n’ụmụnwaanyị 100 kacha kajaa akaja n’ụwa nke afọ 2025

    Aha Ngozi Okonjo-Iweala abanyela na ndekọ nke akwụkwọ akụkọ 'Forbes wepụtara maka ụmụnwaanyị ọnụọgụgụ dị otu narị kacha sieike n’ụwa niile n’afọ 2025.

    Ngozi Okonjo-Iweala mere ka a mata nke a n’akara X sohal mịdịa ya ma kelee ụmụnwaanyị Afrịka ndị ọzọ aha ha banyere na ndekọ ndị Forbes.

    N’okwu ya, “Ọ bụ ihe mara mma aha m ibanye na ndekọ ndị Forbes dịka otu onye n’ụmụanwaanyị otu narị kachasị kajaa akaja n’ụwa.”

    Okonjo-Iweala mere ka a mata na ọ bụ nke ugboro asatọ aha ya na-abanye n’akwụkwọ ndị Forbes dịka otu onye n’ụmụnwaanyị 100 kajara akaja.

    Ọ sị na ya na-agba mbọ ime ka usoro azụmahịa mba ụwa ghara ịkpagbu mba ndị na-enweghị nnukwu ego.

    Ndị ọzọ aha ha so ụmụnwaanyị Afrịka ndị ọzọ banyere n’akwụkwọ ndị Forbes n’afọ a gunyere HE Netumbo Nandi-Ndaitwah bụ Onyeisiala mba Namibia, Suminwa Judith bụ Praịm Mịnịsta DRC, na Mpumi Madisa onyeisi ụlọọrụ Bidvest nakwa Mo Abudu nwe Ụlọọrụ Ebonylife.

  10. Ndị Uweojii Enugwu akpụpụla nwoke gburu nwanne ya nwaanyị n’ụlọikpe

    Akụkọ kwuru na otu nwoke aha ya bụ Emeka Emmanuel Nwangwu ji aka tigbuo nwa nwanne ya bụ Loveth Uloma Nwangwu ụbọchi ole na ole gara aga.

    Ugbua ndị Uweojii ewepụtala ozi iji kọwaa etu mkpamkpa ahụ siri mee.

    N’ozi o wepụtara, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu Steeti bụ Daniel Ndukwe dere na: “Nwoke kpara arụ ahụ bụ Emeka Emmanuel Nwangwu, onye gbara afọ 51, ma bụrụ onye ọrụ nchekwa neighbourhood watch nke Nsụka bụ onye ọtụtụ mmadụ maara na gburugburu ahụ”

    Nwoke ahụ na nwa nwanne ya bụ Loveth Nwangwu gbara afọ 19 bi n’otu ụlọ, n’ihi na nwata nwaanyị ahụ na-enyere ya aka dịka odibo.

    O meela ọtụtụ ọnwa nwata nwaanyị ahụ gwara ndị uweojii na ndị agbataobi ka ha nyere ya aka zọpụta ya n’aka Nwangwu, onye o boro ebubo ịkwaso ya iko n’ike, iti ya ihe, imeru ya ahụ nakwa iwakpo ya n’ụzọ dị iche iche.

    Nke meziri n’ụbọchị 1 Disemba 2025 bụ na Loveth gara na nke ndị uweojii dị na Nsụka ma nye mkpesa maka mwakpo nwoke ahọ wakpokwara ya ọzọ.

    Ndị uweojii buuru ya gaa na “Bekay” Pharmacy ka a gbaa ya ọgwụ. Na ntabianya, Emeka Nwangwu jiiri iwe bata n’ebe ahụ a na-ere ọgwụ, malite iti nwaagbọghọ ahụ ihe ma tigbuo ya.

    N’ụbọchị 10 Disemba ka a kpụpụrụ Nwangwu n’Ụlọikpe Majie dị n’Enugwụ Steeti ma kpọchie ya na ngalaba CID nke ndị uweojii.

    Kọmishọna ndị uweojii n’Enugwu Steeti bụ Giwa kwere nkwa na ya ga-ahụ isi ya bụ ihe.

  11. A napụtụla ọtụtụ mmadụ ikike ịkwọ ụgbọala na mba Japan

    Ndị uweojii mba Japan anapụtụla mmadụ ruru narị itoolu (900) ikike ịkwọ ụgbọala, oge e jidere ha ebe ha na-agba igwe ka ha ṅụchara mmanya ọkụ.

    Ọ bụ ụlọmgbasaozi dị na mba Japan wepụtara akụkọ a.

    Ndị ọchịchị kwuru na ndị dara iwu a “nwereike ibute nnukwu ọdachi oge ha na-akwọ ụgbọala”.

    Ọnụọgụ ndị a napụtụrụ ikike ha ji akwọ ụgbọala na mba Japan malite n’ọnwa Jenụwarị ruo Septemba agbagoola nke ukwuu, ma ọ bụrụ na e jiri ya tụnyere nke afọ gara aga.

    Nke a na-eme dịka mba ahụ tinyere iwu okporoụzọ ọhụrụ ndị siri ike, bụ nke wepụtara ntaramaahụhụ tara akpụ maka ndị na-agba igwe.

    Iwu ọhụrụ ahụ e webatara n’ọnwa Nọvemba, 2024 bụ nke ga-eme ka ndị ji anya mmanya na-agba igwe gaa mkpọrọ ihe ruru afọ atọ, maọbụ kwụọ nha 500,000 yen ($3,200).

  12. Ndị nwe mmadụ, unu asaala chi?, Ọfọ anyị bụ ka ụbọchị taa maara anyị mma ooo

    Nnukwu ọṅụ ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tọzde Eke, 11 Disemba, 2025.

    N'ụtụtụ a, ọ bụ gị na Chinonso Ugorji ga-anọrị, tupu Uche Akolisa, Michael Ilediagu na Michael Ngene eburu oche n'oge ehihie.

    Gaa n'ihu sonyere anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ, iji nweta akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ụwa.

    Nnọọ!

  13. Ndịagha agbagbuola ụmụnwaanyị itoolu na-eme ngaharịiwe n'Adamawa steeti

    Otu na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye bụ 'Amnesty International' akpọọla oku ka e nyocha ihe ha kpọrọ 'akaike.'

    Ndịagha Naijiria agbagbuola o pekatampe ụmụnwaanyí itoolu n'ime ụmụnwaanyị na-eme ngagharịiwe n'okpuru ọchịchị Lamorde dị n' Adamawa steeti.

    Ụmụnwaanyị ndị ahụ na-eme ngagharịiwe maka nsogbu ala a na-azọ azọ n'etiti Bachama na Chobo.

    Otu na-agba mbọ maka ikike dịrị onye bụ 'Amnesty International' katọrọ ndịagha Naijiria mana,"Ndịagha Naijiria gbara ndị mmadụ egbe bu mgbọ na-adọghị ha aka na ntị ọbụla."

    "Ndị merụrụ ahụ a gbara egbe n'akụkọ ahụ dị iche iche. Ọtụ meruru ahụ n'isi, olu, azụ ,obi, ubu, ụkwụ nakwa n'aka".

    Amnesty gbarụrụ ihu si na gọọmentị azaghị oku gbatagbata ọsọsọ na tigbuo-zogbuo dapụtara , ha ga-aza aza n'abali asatọ nke ọnwa Disemba afọ 2025, were nnukwu aka ike nke butere ọnwụ nakwa nnukwu ihe mmebi.

    Otu ahụ dọrọ aka na ntị ma gwa gọọmentị ka ha mee nnyochaghị ihe mere ma kpụpụ ndị aka ha dị na ya ụlọikpe.

    Mana ndịagha Naijiria gọrọ n'ozi ha wepụtara sị na ndị otu ha egbughị onye ọbula, kama na ọ bụ ndịagha nnupuisi gbara egbe n'ebe ahụ.

  14. Mba Amerịka ga-enyocha ihe ndị mbịarambíara mere n'akara soshal midia afọ ise tupu enye ha 'visa'

    Mba Amerịka ekwuola na ha ga-amalite inyocha ihe onye mbịarabịara ọbụla chọrọ ịbata ala merela n’akara soshal mịdịa ha kemgbe afọ ise gara aga tupu e nye ha akwụkwọ ikike ịbata ala ha(visa).

    Usoro ọhụrụ ibanye mba Amerịka a nwereika imetụta ọtụtụ mba nke gunyere mba Briten.

    Nke a nwereike imetụta ndị chọrọ ịga mba Amerịka nọrọ abalị iri itoolu n’ejighị akwụkwọ visa.

    Kamgbe Onyeisiala Donald Trump lọghachịtara azụ n’ọchịchị ka ọ na-eme ka nchekwa n’oke ala ha sie ike dịka ọ na-ekwu na ọ bụ maka nchekwa obodo ha.

    Ndị ma ihe ekwe na-akụ kwuru na usoro ọhụrụ a nwereike imetụta ndị nwere mmasị ịbata n’Amerịka nakwa ikike onye kwuo uche ya ha nwere n’ịntaneti.

  15. A kwụsịla ụmụaka na-erubeghị afọ 16 iji soshal midịa eme ihe na mba Ọstrelịa

    Nde kwuru nde ụmụaka na-erubeghị afọ iri na isii atụfuola ikike ha nwere ịbanye n’akara ọbaozi soshal midịa ha dị iche iche na mba Ọstrelịa, dịka e tinyere mmachi.

    Ihe a bụ mbụ a na-ahụta ụdịrị ọnọdụ dị etu a na mbaụwa.

    Ọbaozi ndị a tụrụ anya na ha ga-emejupụta iwu ọhụrụ a gụnyere Instagram, Facebook, Threads, X, Snapchat, Kick, Twitch, TikTok, Reddit na YouTube.

    Agaghị enye ndị nne na nna maọbụ ụmụka ntaramaahụhụ ma ha nupụ isi na mmachi ahụ, kama ụlọọrụ ọbaozi nwereike ịkwụ nha ruru A$49.5m (US$32m, £25m) maka imebi iwu.

    Gọọmenti mba Ọstrelịa kwuru na mmachi a nwere ebumnobi ichekwa ndị na-eto eto site n’ihe nkịrị ndị jọrọ njọ, mana ndị nkatọ kwuru na nke a nwere ike ịkpa oke megide ndị na-eto eto, ma dunye ụmụaka ịga na mpaghara ịntaneetị nke a na-adịghị elebara anya.

    Ndị na-eto eto na mba Ọstrelịa egosila echiche dị iche iche maka nke a, dịka ụfọdụ katọrọ ya, ebe ndị ọzọ kwuru na ọ ga-ama ha ahụ oge na-adịghị anya.

  16. Ọgụ dapụtara n’etiti Thailand na Kambodia ataala isi ọtụtụ mmadụ

    Ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ maka ọgụ dapụtara n’etiti mba Kambodia na Thailand na-arị elu dịka mba abụọ ahụ bidoro ịkwa onwe ha mgbọ maka nghọtafe dapụtara n’oke ala ha na-azọ.

    Akụkọ si na mpaghara ahụ na-ekwu na ọtụtụ ndị mmadụ esila n’ụlọ ha gbaa ọsọ ndụ.

    Mba Kambodia kwuru na ndị nkịtị mmadụ abụọ nwụrụ mbe ndịagha Thailand tụrụ ha ogbunigwe nke mere ya mmadụ asaa nwụrụ anwụ kamgbe ọgụ ahụ dapụtara ọhụrụ.

    Mana ndị Thailand na-ekwu na ndịagha ha mmadụ atọ nwụkwara.

    Cheta na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump adịla na mbụ mee ka ha nwee nkwekọrịta udo n’ọnwa Julaị afọ 2025 ma kọwaa ya dịka ihe nrụbaama.

    Mana ugbua mba abụọ a na-ebo onwe ha ebubo emweghị ihe ha kwetere na nkwekọrịta ahụ Trump mere ka ha nwee.

  17. Ụmụ Igbo anyị ekelee unu

    Anyị na-anabata unuị n'ọgbakọ BBC Igbo n'ụbọchị taa.

    Ekpere anyị bụ ka Chineke gozie gị na ezinaụlọ gị mgbe ọbụla.

    Biko, buru oche gị bịa nọnyere anyị taa maka akụkọ ndị gbapụtara ihe.

  18. Mmadụ anọ anwụọla n'ihi mkpamkpa ndị otu nzuzo n'Anambra steeti

    Ụlọọrụ ndị uweojii Anambra Steeti ekwuola ihe ha maara gbasara mwakpo ndị otu nzuzo mere na steeti ahụ.

    Nke a dị n'ozi ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga wepụtara n'ụbọchị Mọnde 8 Disemba, 2025.

    Ikenga kwuru na ndị otu nzuzo mere mwakpo ahụ na mpaghara Afọ Nọfịa dị n'okporoụzọ ochie si Ọnịcha gawa Ọka n'abalị Sọnde 7 Disemba, 2025.

    Ozi ahụ kọwara na ndị uweojii nke ngalaba Special Anti-Cult Squad dị n'Enugwu-Ukwu buuru ụzọ nwuchie mmadụ abụọ a na-enyo enyo ụbọchị anọ gara aga site n'ozi ha nwetara gbasara atụmatụ ndị otu nzuzo na-eme ibu agha, ma napụta ha ngwaọgụ.

    "Ndị ahụ anyị nwụchiri na-enyere anyị aka site n'iwepụta ozi ndị anyị ga-eji gbochie ọgbaaghara ndị otu nzuzo n'Ọka nakwa gburugburu ya niile," ka ndị uweojii kwuru.

    Ka o sina dị, ndị uweojii kwuru sị n'agbanyeghị mbọ niile a ha gbara, ụfọdụ ndị otu nzuzo ahụ buuru ụgbọala Lexus a na-amatabeghị akara njirimara ya wakpoo Afọ Nọfịa n'ụbọchị 7 Disemba ma gbaa egbe aghara aghara.

    Dịka ozi ahụ ndị uweojii wepụtara siri kwuo "mwakpo ọjọọ ahụ butere ọnwụ mmadụ anọ."

    "Ọ bụ eziokwu na ndị omekome ahụ riri mbọmbọ tupu ndị uweojii abịaruo, mana ozi ndị anyị nwetara n'ogige ahụ na-enyere anyị aka, dịkwa ka ụlọọrụ anyị ji ha eme ihe ugbua iji hụ na a nwuchiri ndị kpara arụ ahụ," ka Ikenga kwuru.

  19. Zelensky ga-ezute Emmanuel Macron na Keir Starmer na Lọndọn maka atụmatụ iweta udo na Yukren

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky na Praịm mịnista mba UK bụ Keir Starmer, onyeisiala mba Frans bụ Emmanuel Macron na Chanselọ mba Jamini bụ Friedrich Merz, ga-enwe mkparịtaụka n’ụbọchị Mọnde 8 Disemba, 2025 na Lọndọn.

    Mkparịtaụka a bụ iji kpaa maka atụmatụ iweta udo ọhụrụ mba Yukren na Amerịka mapụtara na Florida n’izuụka gara aga iji kwụsị agha dị n’etiti mba Rọshịa na Yukren.

    Onyeisiala Donald Trump nọrọ n’ụbọchọ Sọnde kwuo na ndị nọchitereanya Yukren na ọgbakọ ahụ nabatara atụmatụ ọhụrụ.

    Ọ gara n’ihu kwuo na o jighị aka na Onyeisiala Zelensky agụọla akwụkwọ banyere atụmatụ ahụ.

    Na nzaghachi, Onyeisiala Zelensky kwuru na ndị nnọchiteanya ya ga-agwa ya ihe atụmatụ bụ ma mee ka o doo any ana ọ bụghị ihe niile ka a na-akpa maka ya n’ekwentị.

  20. Ụgbọelu ndịagha Naịjirịa akpọkaala na Niger Steeti

    Ụgbọelu Alfa Jet ndịagha ụgbọelu Naịjirịa akpọkaala n’obodo Karabonde dị n’okpuru ọchịchị Borgu dị na Niger steeti.

    Akụkọ kwuru na ndị ọkwọ ụgbọelu abụọ ahụ mapụrụ tupu ụgbọelu ahụ kpọkaa mana enweghị onye ọbụla merụrụ ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndịagha ụgbọelu Naịjirịa bụ Ehimen Ejodame kwuru na ụgbọelu ahụ kpọkara n’ụbọchị Satọde 6 Disemba, 2025.

    N’aka nke ọzọ, onyeisi ndịagha ụgbọelu Naịjirịa bụ Marshal Sunday Aneke toro ndị ọkwọụgbọelu ahụ maka mbọ ha nakwa etu ha si mee ihe na njinji.