Akụkọ niile dị mkpa na mba ụwa niile n'ọnwa Ọgọst 2024.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Jessica Nwankwo, Chinonso Ugorji, Michael Ngene, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Uche Akolisa
Praịm Minista mba Bangladesh agbaala arụkwaghịm ma rie mbọmbọ ọsọ
Ebe foto si, Getty Images
Praịm Minista Bangladesh bụ Sheikh Hasina agbaala arụkwaghịm ma rie mbọmbọ
oge ndị na-eme ngagharịiwe megide gọọmenti wụchiri n'obi ọchịchị.
Ụfọdụ na-ekwu na ọ gawara India mana e nweghị onye ma ebe ọ nọ n'ihi na
akụkọ kwuru na ndịagha ji ụgbọelu helikọpta buru ya na nwanne ya nwaanyị gawa
ebe a ga-enye ha nchekwa.
Igwe mmadụ na-eme mkpesa wụchiri ebe obibi Hasina dị na Dhaka
na-agbanyeghị na e tinyere iwu mgbachi obodo ma gbubie ikuku nzikọrịtaozi ịntaneeti.
E gburu opekatampe mmadụ iri itolu (90) n'ụbọchị Sọnde 4 Ọgọst 2024 oge
ndị uweojii na ndị na-eme ngagharịiwe busoro onwe ha agha nke mere ka ọnụọgụ ndị
nwụrụ n'ihi ngagharịiwe ahụ na nso nso a ruo ihe karịrị narị atọ (300).
Nke a bụ nkwafu ọbara kachasị njọ a na-ahụta na mba ahụ dị na ndịda Eshịa
kemgbe e kepụtara ya n'afọ 1971.
Ngagharịiwe ụmụakwụkwọ ahụ malitere n'ọnwa Julaị iji kpochapụ ikenye ndị
mmadụ oke n'ọrụ obodo mana o mechara bụrụzie nke e ji akpọ oku ka Hasina gbaa
arụkwaghịm dịka ọ nọrọla ihe karịrị afọ iri abụọ (20) n'ọkwa.
Ndịisi mba UK ga-enwe ọgbakọ pụrụiche maka ọgbaghara na-eme n’obodo ha
Ebe foto si, Reuters
Isiụlọọrụ Praịm
minista mba Briten bụ Downing Street ekwuola na ha ga-enwe ọgbakọ ọnọdụ gbata gbata
dịka a nwụchiri ihe karịrị mmadụ 150 n’ọgbaghara na-eme na mpagara dị iche iche
na UK n’izuụka a.
Nke a na-abịa
dịka Praịm minister Kier Starmer katọrọ nwakpo e mere n’ụlọ ndina ebe ndị gbara
ọsọndụ dị na Rotherham ma kwee nkwa na ndị so n’ime ọgbaghara a “ga-atụ ahụhụ
ruru ha.”
Ndị uweojii
zara oku maka ọgbaghara dapụtara na Rotherham, Middlesbrough, Bolton na ebe ndị
ọzo na UK n’ụbọchị Sọnde.
Ọgbakọ a
na-abịa n’ime ụbọchị isii ọgbaghara dapụtara maka ọgbugbu e gburu ụmụaka atọ
site n’ịsụ ha mma na Southport n’izuụka gara aga.
A na-atụ anya
na ọgbakọ a ga-akọwa etu ọgbaghara mere na ngwụcha izuụka siri daa nakwa ihe ndị
a na-eme iji gbochie ya. Ndị mịnịsta nakwa ndịisi ọrụ nchekwa ga-anọ n’ọgbakọ
a.
Ebe foto si, PA
Na mgbasaozi Praịm minister mere n’ụbọchị Sọnde, o kwuru na ndị ọbụla so n’ime ọgbaghara ahụ ga-ata onwe ha ụta maka isonye na ya.
“Ndị bi na mba nwere ikike inwe nchekwa, mana anyị ahụla ka e si awakpo ebe obibi nakwa ebe okpukperechi ndị Alakụba,” ka praịm minista kwuru.
Na Rotherham, e merụrụ ndị uweojii iri ahụ, dịka otu onye nọzi n’ọnụ ọnwụ dịka ndị na-eme ngagharịiwe tụrụ ha osisi ma gbaa ha ikuku e ji emenyụ ọkụ bụ ‘fire extinguishers’.
Ụfọdụ ndị otu ahụ kọwara mpio ụlọ ndina ahụ ka ha nwee ike banye n’ime ya ma gbaa ụfọdụ ihe e ji ekpo atịtị ọkụ.
Unu abọọla chi?
Anyị ji obiọma anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo ebe ị ga-akụ maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.
Gbaa jii ma soro anyị taa.
Etu ndị ojiegbe si gbuo mmadụ asatọ n’Onuime nke Imo Steeti
Ebe foto si, Imo Police Command
Ndị ojiegbe
wakporo obodo Umucheke Okwe dị n’okpuruọchịchị Onuimo nke Imo Steeti n’ụbọchị
Satọde 3 Ọgọst, 2024 ma gbagbuo mmadụ asatọ.
Ndị e gburu
gụnyere President General obodo ahụ bụ Hyginus Ohazuruike na mmadụ asaa ndị ọzọ bụ
ndịisi obodo ahụ.
Anya hụrụ
ka ihe a jiri mee kwuru na mmadụ asaa nọ na-enwe ọgbakọ n’ụlọahịa PG ahụ dị n’ime
ahịa obodo ha mgbe ndị ojiegbe wakporo ma gbuo ha.
Onye a hụrụ
a kwuru na a mabeghi ihe mere ndị ojiegbe jiri gbagbuo mmadụ asaa ahụ.
Dịka ọ dị
ugbua kọmishọna ndị uweojii bụ Aboki Danjuma na onyeisioche okpuruọchịchị Onuimo
bụ Emeka Obi na ndị ọrụ nchekwa ọzọ agaala mgbaru ebe ihe a mere.
Danjuma
kwuru na ha na-enyo na ọ bụ otu IPOB/ESN kpara arụ a ma kwuo na ha na-eme nyocha
iji nwụchie ha.
Ọ gara n’ihu
kasie ezinaụlọ ndị a e gburu egbu obi nakwa ndị obodo niile.
Cheta na ndị
ojiegbe n’oge gara aga gburu otu onyendu otu All Progressive Congress (APC) na
mmadụ asaa ndị ọzo n’otu obodo a.
N’otu aka
ahụ ndị ojiegbe wakporo ma gbuo ndị uweojii anọ tinyere otu onye nwagbọghọ ọrụ
ndọrọ ego bụ POS n’Irete dị n’Owerri.
E nwekwaala
ọtụtụ akụkọ mwakpo na ogbugbu ndị mmadụ na mpaghara dị iche iche n’Imo steeti
kamgbe izuụka gara aga.
Mba dị iche iche agwala ụmụafọ ha bi na Lebon kwakọro pụọ na agha nwereike ịda
Ebe foto si, Getty Images
Mba Amerịka agwala ụmụafọ ha bi na mba Lebanon ka ha si n’obodo ahụ pụọ
ngwa ngwa maka na agha nwereike ịda na Middle East.
Ọtụtụ mba ndị ọzọ gụnyere UK enyekwala otu ndụmọdụ ahụ.
Mba Iran aṅụọla iyi imegwara mba Isreal bụ ndị ọ na-ebo ebubo igbu
onyeisi ndị otu Hamas, Ismail Haniyeh na Tehran n’ụbọchị Wenezde.
Isreal ekwubeghi okwu banyere nke a. Ogbugbu ya na-eso ogbugbu mba
Isreal gburu otu onyeisi ọchịagha otu Hezbollahbụ Faud Shukr na Beirut.
Mba ndị si mpaghara West na-atụ ụjo na Hezbollah bụ otu agha Iran
na-akwado ma nwere mgbọrọgwụ na Lebanon nwereike iso megwara mba Isreal bụ nke
Isreal n’ọnwa ha ga-agbarịazụ megwara n’ụzọ ga-adị egwu.
Mba Amerịka na ndị ọzọ na-agbasi mbọ ike ịhụ na ha gbochiri nsogbu
nwereike ịdapụta na mpaghara ahụ.
Na nzaghachị nsogbu niile a, mba UK, Sweden, France na Jordan agwala ụmụafọ
ha ka ha si na Lebanon pụọ, dịka a na-akagbuo ọtụtụ ohere iji ụgbọelu efepu n’otu
ọdọụgbọelu mba a nwere dị na Beirut.
Igbo mma mma nụ ooo!
Daalụ maka ịnọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo.
N'ebe a, anyị na-ewete akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.
A na-eme ngagharịiwe na Sunderland n'ihi ụmụaka atọ e gburu na Southport
Ndị na-eme
ngagharịiwe awakpoola ndị uweojii na ụlọorụ ha dịka e jichara mma magbuo ụmụntakịrị
nwaanyị atọ na Southport.
Kọmịshọna ndị
uweojii Northumbria kọwara ọgbaaghara dị na Sunderland bụ nke dugara ndị
uweojii anọ ụlọogwụ dịka nke ihe mgbawa obi.
N’oge ọgbaaghara
ahụ, ndị na-eme ngaharịiwe ji okwute na ihe dị iche iche meruo ndị uweojii ahụ
ma gbaa ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ mana ugbua e bidola mkpocha na nzacha na
mpaghara ahụ.
Oge ọ
na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n’ụbọchị Satọde na City Hall, Kọmịshọna ndị uweojii bụ
Susan Dungworth kwuru na ndị ahụ aka ha dị n’ọgbaaghara ahụ na-akwalite atụmatụ
mkpọrọmaasị.
Ọ sị na
ngagharịiwe ahụ jupụtara n’ọgbaaghara, izụ ndị mmadụ ohi na ịwakpo ụlọahia ndị
mmadụ bụ ihe na-esoghi na ngagharịiwe n'ụzọ udo. O kwuru na ọ bụ agwa ndị
omekome.
E gbuola mmadụ 32 na mwakpo e mere n’egberemmiri Somalia
Ebe foto si, EPA
E gbuola
opekatampe mmadụ iri atọ na abụọ (32) ma merụọ ndị ọzọ ahụ oge onye ogburu mmadụ
gbuo onwe ya tiwara ogbuniigwe n’egberemmiri dị n’isi obodo Sọmalịa.
Ọnụ
na-ekwuru ndị uweojii Sọmalịa bụ Abdifatah Adan Hassan kwupụtara nke a n’ụbọchị
Satọde 3 Ọgọst 2024.
Hassan
kwuru na ihe ruru mmadụ iri isii na atọ (63) nwetara mmerụahụ dịka ụfọdụ n’ime
ha bụ nnukwu mmerụahụ.
Ihe
onyonyoo vidio gosiri ụfọdụ ndị nwuru anwụ nakwa ndị merụrụ ahụ na mpaghara Abdiaziz
dị na Mogadishu.
Ụlọmgbasaozi
dị ma mba ahụ kwuru na ndị mere ya bụ mwakpo bụ ndịagha al-Shabab nke nọ n’isi ọtụtụ
mpaghara dị n'etiti na ndịda Sọmalịa.
Ndị
ekperima amataghị ndị ha bụ wakporo ụlọnche ndịagha dị na mpaghara Amangwu, n’okporoụzọ
siri Amasiri gawa Owutu na Edda dị n’Okpuru ọchịchị Edda nke Ebonyi steeti.
Ọnụ
na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi steeti bụ Joshua Ukandu kwuru na e mere mwakpo ahụ
n’ụzọ ụtụtụ Fraịde 2 Ọgọst 2024.
O kwuru na
o doghị anya ma e gburu mmadụ n’oge mwakpo ahụ mana a na-enyo enyo na ọ bụ ndị ekperima
na-eji ọgbaatumtum akpa arụ na mpaghara ahụ mere ya.
Donald Trump ekwetala ka ya na Kamala Harris wee nrụrịtaụka
Ebe foto si, Getty Images
Onye bụbu onyeisiala mba Amerịka Donald Trump
ekwuola na ya ga-ezute osote onyeisiala mba Amerịka bụ Kamala Harris na nrụrịtaụka
n’abali 4 Septemba, 2024.
Donald Trump mere ka a mata nke a n’ozi o wepụtara
n’akara mgbasaozi ‘Truth Social’ ya banyere ntụliaka mba Amerịka nke a ga-eme n’ọnwa
Novemba 2024.
Trump kwuru na ọ bụ ụlọ mgbasaozi Fox News ga-ahazi
nrụrịtaụka ahụ a ga-eme na Pennsylvania. Ọ bụ ndị ntaakụkọ Bret Baier na
Martha MacCallum ga-achịkọta ya.
Cheta na osote onyeisiala mba Amerịka Kamala Harris
kpọrọ oku ka Donald Trump zute ya na nrụrịtaụka dịka ha na-akwado ntụliaka
onyesiala mba Amerịka.
Rwanda emechiela ụlọụka 4,000 maka ịda iwu
Ebe foto si, Getty Images
E mechiela
ihe karịrị ụlọụka puku anọ (4,000) na Rwanda n’ime otu ọnwa gara aga n’ihi erubeghị
isi n’ụkpụrụ ahụike, nke gụnyere inwe ihe mkpuchi ụda.
ọnọdụ ahụ
emetụtala ụlọụka ndị ọlọrọọhụrụ na ụlọ okpukperechi ndị alakụba nke ụfọdụ n’ime
ha dị na mpaghara ọgba na egberemmiri.
Minista
na-ahụ maka Okpuru ọchịchị na mba ahụ bụ Jean Claude Musabyimana gwara ndị
ntaakụkọ na ha emeghị nke ahụ iji gbochie ndị mmadụ ikpe ekpere kama ọ bụ iji hụ
maka ahụike na ezi ọnọdụ ndị na-efe ofufe.
Ihe a bụ
nke mbụ a na-agbachi ụlọ okpukperechi n’igwe kemgbe afọ ise e tinyere iwu
ga-ebelata ifesa ụlọ okpukperechi na Rwanda.
Iwu ahụ bụ
nke manyere ndị na-ekwusa oziọma ka ha buru ụzọ nata ọzụzụ tupu ha e mepee ụlọụka.
Iwu ahụ chọkwara
ka ha hazie onwe ha n’ụzọ dabara adaba ma zeghara iji ngwa egwu ndị na-eme oke
mkpọtụ eme ihe.
Oge a nabatara
iwu ahụ n’afọ 2018, e mechiri ihe ruru ụlọụka narị asaa (700).
N’oge ahụ,
onyeisiala Rwanda bụ Paul Kagame kwuru na ya bụ mba achọghị ọtụtụ ụlọ okpukperechi
ma kwuo na ịlekọta ọnụọgụ ụlọụka dị etu ahụ bụ nke kwesịirị mba ndị ọnọdụ akụnaụba
ha gbagotere agbagote.
Gịnị na-esere Whatsapp na Gọọmentị etiti?
Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba gọọmentị na-echekwa ọdimma na ego mmadụ bụ FCCPC n'ịchafụ apụtala kọwaa ihe mere ha ji manye ụlọorụ nwe Whatsapp na Facebook ụgwọ $220m dịka nha.
N'ozi ha wepụtara n'akara Twitter ha, ha kọwara na ọ bụ n'ihi ịda iwu na nchekwa njirimara ndị mmadụ nakwa ịkpaso ndị Naịjirịa agwa dị iche na nke ha kpasara ndị mba ọzọ mere ha ji daa ha nha ahụ.
FCCPC sị "FCCPC nyochara Whatsapp na soshal midia ndị Meta ọzọ ma chọpụta na ha dara ụfọdụ iwu nke gụnyere ịnapụ ụmụ Naịjirịa ikike ihazi njririmara ha nakwa ikesa njirimara ahụ na anataghị ndị Naịjirịa ikike ime nke a"
Ha kwukwara na iwu ha nyere ha bụ iji mee ka ha gbanwee usoro ọrụ ha ma kwụsị ịmegbu ndị Naịjirịa ma hụkwa na ha tozuru ebe iwu ala Naịjirịa si ha rue.
"Iji hụ na ihe a emeghi ọzọ nakwa ị manye ha dịka ihe ha mere si dị bụ ihe mere anyị ji daa ha nha $220m" ka ngalaba ahụ kọwara n'akara Twitter ha.
E kpobala ndị ọrụ nchekwa n’Imo steeti
Ebe foto si, Imo Police Command
E zipụla ndị
ọrụ nchekwa n’igwe n’akụkụ Imo steeti dị iche iche iji buo agha megide ọnọdụ
enweghị nchekwa tọpụrụ ọgọdọ na steeti ahụ na nso nso a.
Nke a dị n’ihe
onyonyoo ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye zipụrụ n’ụbọchị Tọzde
1 Ọgọst 2024.
Ebe foto si, Imo Police Command
Dịka Okoye
siri kwuo, ndị ọrụ nchekwa ahụ e zipụrụ sitere n’ụlọọrụ nchekwa niile dị n’Imo
steeti, nke gụnyere ndịagha, ndị uweojii, ndị DSS, ndị Civil Defense, ndị Road
Safety, ndị Immigration na ndị Fire Service.
Ọ sịrị na nke a bụ na ngbakwunye nyere ndị ọrụ
nchekwa e zipụrụ oge gara aga ịchọpụta ma nwụchie ndị omekoome n’ogbe dị iche
iche na steeti ahụ.
Ebe foto si, Imo Police Command
Cheta na
kemgbe mkpụrụ ụbọchị atọ gara aga, ndị ekperima egbuola ndị uweojii anọ na mmadụ
nkịtị abụọ na mwakpo ha mere aghara aghara n’akụkụ Imo steeti dị iche iche.
Atọhapụla Gershkovich na ndị mkpọrọ na mgbanwerịta mba Amerịka na Rọshịa
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Evan Gershkovich
Mba Amerịka ekwuola na ndị mkpọrọ 24 so na mgbanwerịta ha na mba Rọshịa nakwa ndị mba ndị ishi ọcha ndị ọzọ gụnyere Amerịka na Jamanị mere.
Ndị gụnyere na ndị mkpọrọ so na mgbanwerịta a bụ onye ntaakụkọ Wall Street Journal ma bụrụkwa onye mba US; Evan Gershkovich, nakwa onye bụbụ onyeagha n'elu mmiri bụ Marine Paul Whelan, dịka Onyeisiala Joe Biden si wee kwuo.
N'aka ọzọ, ma sonyekwa na nkwekọrịta ha, onye mba Russian na-elekọta anya na nche na-ememina ndị mmadụ bụ Vadim Krasikov, ga-esi mba Jamanị alọta.
Evan Gershkovich
Onye ntaakụkọ sị na mba Amerịka bụ Evan Gershkovich ka a tụrụ na mkpọrọ afọ iri na isii na mbido Julaị.
Onye ntaakụkọ Wall Street Journal (WSJ) ka ndị ọrụ nchekwa nwuchiri n'ọnwa Maachị ka ọ na-arụ ọrụ ya n'obodo Yekaterinburgnke na-eteghị aka na Moscow.
Prosecutors accused him of working for the Central Intelligence Agency (CIA), accusations that Mr Gershkovich, the WSJ and the US government vociferously deny.
Ka e jidere ya, ha tụrụ ya na mkpọrọ nke Lefortovo na Moscow.
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Alsu Kurmasheva
Otu ụbọchị ahụ e kpere ikpe Gershkovich bụkwa ụbọchị a mara Alsu Kurmasheva ikpe afọ isii na ọma ka e kpechara ya ikpe nzuzo.
Ọ bụ onyeisis ndị ntaakụkọ Radio Free Europe/Radio Liberty nke ndị Amerịka na-etinye ego na ya. Mba Rọsha boro ya ebubo ịgbasa ozi ụgha.
Di ya sị na a nwuchiri ya maka akwụkwọ "Say no to war" nke ụlọọrụ ya bipụtara n'afọ 2023 bụ nchịkọta akụkọ ndị mmadụ kọrọ maka ahụmihe ha n'agha mba Rọshịa na Yukren.
Odoziakụ Kurmasheva ji akwukwọmba ikikere mba Amerịka na Rọshịa ma ya ma di ya na ụmụ ya abụọ bi na Prague. Ejidere ya n'afọ Juune 2023 n'ọdọụgbọelu Kazan ka o si Rọshịa alọta ebe o gara leta nne ya.
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Paul Whelan
E nyere Paul Whelan dị afọ 54 ikpe ụlọmkpọrọ afọ 16 n'afọ 2020 ka anwuchiri ya na Moscow maka na ha boro ya ebubo inyopu na nzuzo n'afọ 2018.
Onye mba US a bụkwa onye bụbụ onye agha mmiri a kpọrọ Marine bụ onye mba Kanada, Amerịka, Briten nakwa Ireland.
Onye ọkaiwu ya sị na e ji ya n'ụlọ mkpọrọ dị na mpaghara Mordovia.
Dịka ọ pụrụ n'ọrụ ndị agha, n'afọ 2008 maka ajọ agwa, ọ malitere ọrụ nchekwa a na-akpọtụrụ na-aga njem ma na-alọta site na Rọshịa na mba ndị ọzọ.
Dizemba afọ 2018 ka ndị ụlọọrụ FSB nke Rọshịa nwuchịrị ya n'ebubo na " ejidere ya ebe ọ na-enyopụ" obodo. Ndị ezinaụlọ ya si na ebubo ndị ahụ abụghị eziokwu.