Egbuola ndị uweojii abụọ n'ọgbaghara ndị Shiites na ndị uweojii n’Abuja

Ndị uweojii abụọ na otu onye ji ego achụ ego anwụọla ebe mmadụ abụọ ọzọ meruru ahụ n'ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị Shiite nke otu Islamic Movement of Nigeria (IMN), ndị na-eso Sheik Ibrahim El-Zakzaky, n'ahịa Wuse dị n'Abuja.
Akụkọ kwuru na aha onye ahụ ji ego achụ ego bụ Amiru nwụrụ ka a gbara ya egbe n'obi mgbe ndị uweojii na-achụ ndị Shiites ahụ na-eme ngagharịiwe.
Otu onye hụrụ ihe mere jụrụ ka a kpọ aha ya kwuru na e bugara nwoke ahụ n’ụlọọgwụ Wuse Zone 3 ebe ọtụtụ ndị uweojii merụrụ ahụ n’esemokwu ahụ nọ.
Ndị na-eso otu IMN na-eme ngagharịiwe nke ha na-akpọrọ Arbaeen, bụ ụbọchị iri anọ ka ọgbakọ Ashura gachara.
Ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Abuja bụ Josephine Adeh kwuputara na ogbugbu egburu ndị ọrụ ha abụọ na imerụ mmadụ abụọ ọzọ ahụ yana ọkụ a gbara ụgbọala atọ ndị uweojii n'ọgbaghara ahụ bụ nke na ọdịghị mkpa. Ọ gara n’ihu kwuo na ọ ghọtaghị ihe mere otu Shiites ahụ ji wakpo ndị uweojii.
Mana ozi anyi nwetara n’aka ndị otu Shiites nke Sheikh Sidi Munir Mainasara binyere aka kwuru na ọ bụ ndị uweojii wakporo ha ma gbuo ụfọdụ ndị otu ha ma wuchie ụfọdụ.
Sheikh Sidi Munir Mainasara kwuru na ndị meruru ahụ na-enweta nleta n’ụlọọgwụ ebe ọ gara n’ihu kwuo na ọ ga-ewepụta aha ndị otu ha ndị uweojii wuchiri.
























