E kwuola ụbọchị a ga-eme ntụliaka okpuruọchịchị n’Anambra Steeti

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ na-ahazi ntụliaka bụ Anambra State Independent Electoral Commission (ANSIEC) ekwuputala Satọde 28 Septemba, 2024 dịka ụbọchị a ga-eme ntụliaka okpuruọchịchị n'Anambra steeti.
Ozi onyeisi ụlọọrụ ANSIEC bụ Genevieve Osakwe wepụtara, kwuru na ụlọọrụ ya ga-ewepụta ntuziaka na etu ihe ga-esi aga na ntụliaka ahụ ụbọchị Wenezde 14 Ọgọst, 2024 ma gwa otu pati niile ga-esonye na ntụliaka ahụ ka ha bia n’ụlọọrụ ANSIEC ma nweta ya.





















