Ndị uweojii Naịjirịa akpọọla Joe Ajaero oku ọzọ

Akụkọ niile dị mkpa na mba ụwa niile n'ọnwa Ọgọst 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Jessica Nwankwo, Chinonso Ugorji, Michael Ngene, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Uche Akolisa

  1. E kwuola ụbọchị a ga-eme ntụliaka okpuruọchịchị n’Anambra Steeti

    Ndị na-eme ntụliaka

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ na-ahazi ntụliaka bụ Anambra State Independent Electoral Commission (ANSIEC) ekwuputala Satọde 28 Septemba, 2024 dịka ụbọchị a ga-eme ntụliaka okpuruọchịchị n'Anambra steeti.

    Ozi onyeisi ụlọọrụ ANSIEC bụ Genevieve Osakwe wepụtara, kwuru na ụlọọrụ ya ga-ewepụta ntuziaka na etu ihe ga-esi aga na ntụliaka ahụ ụbọchị Wenezde 14 Ọgọst, 2024 ma gwa otu pati niile ga-esonye na ntụliaka ahụ ka ha bia n’ụlọọrụ ANSIEC ma nweta ya.

  2. Ọ bụ mmadụ ise nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ mere n’Abia Steeti – FRSC Abia Steeti

    Ụgbọala ahụ kụkpọrọ

    Ebe foto si, ABNTV/FACEBOOK

    Ụlọọrụ Federal Road Safety Corps n’Abia steeti, ekwuola na ọ bụ naanị mmadụ ise nwụrụ n’ihe mberede okporoụzọ mere n’ụzọ awaraawara si Enugu gawa Portharcọt ụbọchị Sọnde 11 Ọgọst na mpaghara Egbelu Mbutu dị n’okpuruọchịchị Isialangwa Saụt.

    Ihe njinji ahụ mere oge ụgbọala Toyota Previa akara ya bụ BKL 291 ZJ kụkpọrọ nnukwu ụgbọala nọ n’ụzọ ahụ.

    Ozi onyeisi FRSC na steeti ahụ bụ Ngozi Ezeoma wepụtara kwuru na mmadụ iri n’otu ihe ahụ metụtara gunyere ụmụnwoke isii, ụmụnwaanyị abụọ na ụmụaka atọ.

    Ozi ahụ kwuru na mmadụ anọ nwụrụ ebe ihe mberede ahụ mere ebe otu onye na ndị meruru ahụ nwụrụ n’ụlọọgwụ ebe ọ na-anata nleta.

    Mmadụ anọ pụtara n’ihe mberede ahụ na-emerụghị ahụ ọbụla ebe ndị meruru ahụ nọ n’ụlọọgwụ Federal Medical Center dị n’Umuahia na ụlọọgwụ Roland Hospital dị n’Ụmụikaa

    Nyocha mbụ e mere kwuru na ọ bụ ike ọgwụgwụ butere ihe mberede ahụ.

    Ụlọọrụ FRSC kwuru na ha ga-ewepụta okwe nyocha ha mgbe ha mechara ma dọọ ndị ọkwọụgbọala aka na nti ka ghara ịya ụgbọala na-adịghị mma.

  3. Philip Shaibu na-akụrụ na ọ bụ osote gọvanọ - Gọọmenti Edo

    Philip Shaibu

    Ebe foto si, @HonPhilipShaibu/X

    Gọọmenti Edo steeti ekwuola na Philip Shaibu na-akụrụ na ọ bụ osote aka na-achị steeti ahụ ma gwa onye ọbụla ka ha leghara ya anya.

    Osote aka na-achị Edo steeti etighachiri n’ọkwa bụ Shaibu mara ọkwa na ya amaliteghachila ọrụ ma nye ndị ọrụ ya ntụziaka ka ha lọghachi.

    Mana gọọmenti Edo site n’ozi kọmịshọna nzikọrịtaozi ha bụ Osa Nehikhare tinyere aka na ya kọwara omume Shaibu dịka “mmadụ ịkụrụ ihe ọ bụghị”.

    Ozi ahụ kwuru sị “anyị chọrọ ịgwa ụlọorụ niile ha na Shaibu na-emekọrịta ihe na ọ bụghị osote aka na-achị Edo steeti, e kwesịrị ịhụta ntụziaka ọbụla si ya n’aka dịka nke adigboroja.”

    “Okwu gbasara ntighachi a si etighachiri ya ka nọ n’ụlọikpe ebe a ga-anụrụ ikpe n’akwụkwọ abụọ gọọmenti Edo na ụlọomeiwu steeti ahụ gbara megide ntighachi ya n’abalị 24 Septemba 2024,” ka ozi ahụ kwuru.

    Ozi ahụ kwukwara na e nyela ndị ọrụ nchekwa ntụziaka ka ha mụrụ anya iji gbochie mbibi iwu ma jidekwa Philip Shaibu ọ bụrụ ma e nwee ọgbaaghara na steeti ahụ n’ihi omume ọ na-egosi.

  4. Anyị ga-achụpụ ndị iro batara n'obodo anyị - Vladimir Putin

    Ndịisi mba Russia

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisiala mba Russia bụ Vladimir Putin eyiela egwu na ha ga-azaghachị Ukraine n’ụzọ ruuru ha na mwakpo ha na-eme na mba ha.

    Nke a na-abịa dịka Putin nwechara ọgbakọ nchekwa maka etu Ukraine si na-awakpo mba ha site n’okeala dị na Kursk.

    O kwuru na ọrụ ndị ministri nchekwa ha bụ ịhụ na e kpochapụrụ onye iro batara na mba ha.

    Kamgbe Ukraine malitere mwakpo ahụ, achụpụla mmadụ ruru 121,000 si n’ebe ha bi n’obodo Kursk pụọ.

    A na-atụ anya na mmadụ 59,000 ọzọ ka ga-esi na mpaghara ahụ pụọ.

    Gọvanọ mpaghara ahụ bụ Alexie Smirnov kwuru na e gbuola ihe ruru mmadụ nkịtị iri na abụọ ma merụọ 121 ahụ.

  5. Okwe ule WAEC afọ 2024 agbaala

    ụmụakwụkwọ na-ele ule

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ West African Examinations Council (WAEC) ewepụtala okwe ule nke afọ 2024 maka ụmụakwụkwọ sitere n’ụlọakwụkwọ dị iche iche.

    Ụlọọrụ WAEC kwupụtara nke a n’ozi ha bipụtara n’akara ọbaozi X ha n’ụbọchị Mọnde 12 Ọgọst 2024.

    Ozi ahụ kwuru na “WAEC ji obiụtọ agwa ụmụakwụkwọ niile lere ule WASSCE afọ 2024 na ewepụtala okwe ule ha taa bụ Mọnde 12 Ọgọst 2024.”

    Cheta na ọ bụ ụlọọrụ WAEC na-ahazi ule e ji apụta ụlọakwụkwọ sekọndrị na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka.

    Okwe ule WAEC afọ 2024 agbaala

    Ebe foto si, @waecnigeria/X

  6. Ihe anyị ma maka ihe mberede okporoụzọ tara isi mmadụ 11 n’Umuekai, Abia Steeti

    Ihe mberede okporoụzọ mere n'Abia Steeti

    Ebe foto si, ABNTV/Facebook

    Ihe ruru mmadụ iri na otu anwụọla n’ihe mberede okporoụzọ n’ụbọchị ụka 11 Ọgọst, 2024 dịka otu ụgbọala bu ha sọbara isi na nnukwu ụgbọala n’Abia Steeti.

    Ihe mberede a mere n’ebe a kpọrọ Apu na Ekpuna Egbelu Mbutu dị n’okporoụzọ awarawa si Enugwu gawa Portharcourt, mgbe o ji ihe dịka ọkara gafee elekere iri na abụọ nke ehihie.

    Odochabeghi anya ihe butere mberede a mana ụfọdụ ndị hụrụ ka o si mee kwuru na ọ dịka ụra o buuru onye ọkwọụgbọala ahụ nke mere ụgbọala ha jiri sọnye isi n’ụgbọala ọzọ kwụsịrị n’akụkụ okporoụzọ tupu ha etinyezie isi n’ime ọhịa.

    Ihe mberede okporoụzọ mere n'Abia Steeti

    Ebe foto si, ABNTV

    Ha kọwara na mmadụ niile a nwụrụ n’otu ntabi anya tupu ndị enyemaka a na-erute ebe ahụ. Ọ bụ naanị onye ọkwọụgbọala ahụ fọrọ ndụ.

    Akụkọ gara n'ihu kwuo na obere ụmụaka abụọ e ku n'aka so na ndị nwụrụ n'ihe mberede a.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia Steetị bụ Maureen Chinaka kwuru na ha natara ozi ahụ ma kwuo na ha na-eme nyocha etu ihe mberede a si mee.

    Dịka ọ dị ugbua, e burula ozu ndị ahụ nwụrụ anwụ buga n’ụlọozi.

  7. E nyebeghị anyị ikikere ịkwụ ndị ji otu afọ efe ala nna ha 70,000 - NYSC

    Ndị ntorobịa ji otu afọ efe ala nna ha

    Ebe foto si, @officialnyscng/X

    Ụlọọrụ National Youth Service Corps (NYSC) agọpụla onwe ya n’ozi na-efegharị ebe niile na ya amalitela ịkwụ ndị ntorobịa ji otu afọ efe ala nna ha puku Naịra iri asaa (70,000).

    Ozi sitere n’aka ọnụ na-ekwuchitere NYSC bụ Eddy Megwa gwara ndị ji otu afọ efe ala nna ha, ndị nne na nna na ọhanaeze ka ha mata na ụlọọrụ ahụ anatabeghị ntụziaka ọbụla site n’aka ndị na-ahụ maka ụgwọnwa ndị ntorobịa na-efe ala nna ha.

    Ozi ahụ kwuru na ndị ntorobịa na-efe ala nna ha maara ụkpụrụ nzikọrịtaozi ụlọọrụ ahụ ma gwa ha ka ha leghara ozi ụgha ahụ anya.

    Cheta na ụlọọrụ NYSC buliri ụgwọọnwa ndị ntorobịa ji otu afọ efe ala nna ha n’afọ 2020 site na puku naịra iri na itoli na narị asatọ (19,800) ruo puku naịra iri atọ na atọ (33,000) dịka ọ gasịrị ọnwa ole na ole e kwupụtara ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ na Naịjirịa.

  8. Anyị na-eme nnyocha maka nwaanyị dọriri passport di ya n’ọdọ ụgbọelu – Immigration

    Ndị ọrụ immigration

    Ebe foto si, @nigimmigration/X

    Ụlọọrụ Nigeria Immigration Service amalitela ime nnyocha banyere ihe onyonyoo na-efegharị na soshial midịa, bụ nke gosiri otu nwaanyị na-eme njem ebe ọ na-adọri akwụkwọ passport Naịjirịa n’ọdọ ụgbọelu Murtala Mohammed Internationl Airport Legọs.

    Ụlọọrụ ahụ kwupụtara nke a n’ozi ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Kenneth T Udo tinyere aka na ya n’ụbọchị Sọnde 11 Ọgọst 2024.

    Ozi ahụ kwuru na “anyị amatala nwaanyị ahụ ma kpọọ ya oku ka ọ bịa n’ụlọọrụ anyị maka ime nnyocha”.

    “Ọ bụrụ ma anyị chọpụta na aka ya dị na ya, ihe ọ pụtara bụ na omume ya emegidela mpaghara 10(b) nke ụkpụrụ iwu ụlọorụ Immigration afọ 2015”.

    “A ga-enyekwa ya ntaramaahụhụ kwesịịrị ya dịka ọ dị na mpaghara 10(h) nke iwu ahụ,” ka ozi ahụ kwuru.

    Akụkọ kwuru na a hụrụ otu nwaanyị na-eme njem a matara aha ya dịka Favour Igiebor, onye akara ndebanyeaha passport ya bụ A11990869 ebe ọ na-adọri akwụkwọ passport di ya n’ọdọ ụgbọelu Murtala Mohammed Internationl Airport Legọs.

  9. "Ọ bụ ihe ọjọọ ịsị na ndị omeiwu na-ekpebi ego ole a na-akwụ ha n'ụgwọ ọnwa"

    Onyeisi ụlọomeiwu Naịjirịa bụ Godswill Akpabio

    Ebe foto si, The Senate President/Facebook

    Ụlọomeiwu Sịnetị akatọọla Olusegun Obasanjo bụbu Onyeisiala Naịjirịa maka ebubo o boro na ọ bụ ndị omeiwu na-ekwu ego ole a na-akwụ ha dịka ụgwọ ọnwa.

    N’ozi ọnụ na-ekwuru ụlọomeiwu Sịnetị bụ Yemi Adaramodu wepụtara, ọ mara onye ọbụla sị na ọ bụ eziokwu ka o wepụta ihe akaebe gosiri na ọ bụ ndị omeiwu na-ekwu ego ole a na-akwụ ha.

    Ọ gara n’ihu kọwaa na ebubo dị etu “jọrọ ezigbo njọ ma sigbuo nkapị”

    Adaramodu gara n’ihu kwuo na ego ndị Sịnetị na-anata dịka ụgwọ ọnwa bụ nke ụlọọrụ Revenue Mobilisation Allocation and Fiscal Commission (RMAFC) dịka usoro iwu Naịjirịa si dị.

    Onye omeiwu a na mpaghara Ekiti South kwuru na o nweghi onye omeiwu ọbụla n’oge ọchịchị ha natarala ego onyinye site n’aka ụlọọrụ Onyeisiala.

    O kwuru na ihe banyere ego nrụrụpụta ihe a kpọro ‘constituency project’ bụ atụmatụ nke ndị Sịnetọ na-eme site n’usoro e ji eme ihe n’ọchịchị onye kwuo uche na mpaghara ọzọ.

    Cheta n’ụbọchị Fraịde Obasanjo kwuru na ọ bụ ihe ọjọọ na ndị omeiwu gọọmentị etiti na-eji aka ha ekwu ego ole a na-akwụ ha dịka ụgwọ ọnwa nakwa ego mgbakwụnye ndị ọzọ na-abụghị ụlọọrụ RMAFC.

  10. Igbo ndị ọma unu abọọla chi?

    Obi ọma ka anyị ji anabata unu n'ọgbakọ BBC Igbo.

    Biko buru oche bịa nọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

  11. Mbụzeala egbuola mmadụ 12 na Uganda

    Mbụzeala egbuola mmadụ 12 na Uganda

    Ebe foto si, AFP

    Opekatampe mmadụ iri na abụọ (12) amatabeghị ndị ha bụ anwụọla oge e nwere mbụzeala ebe a na-ekpofu ureghure n’isi obodo Yuganda bụ Kampala.

    Ndị ọrụ nnapụta agaala n’ihu na-agwọcha ọdọ ureghure ahụ iji mara ma e nwere ndị ọzọ nyara ndụ na mbụzeala ahụ kpọtụrụ n’izuụka e nwere nnukwu mmiri ozuzo.

    Ọ bụ naanị n’olulu ahụ dị na Kiteezi ka mmadụ ruru nde anọ bi na Kampala na-ekpofu ureghure.

    Onye Meyọ Kampala bụ Erias Lukwago kwuru na nke ahụ bụ “ihe ọdachi a maara na ọ ga-eme”.

    Mbụzeala egbuola mmadụ 12 na Uganda

    Ebe foto si, AFP

    N’ụbọchị Satọde, ọnụọgụ ndị nwụrụ anwụ bụ mmadụ asatọ nke gụnyere ụmụaka abụọ mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Kampala bụ Patrick Onyango gwara ụlọmgbasaozi AFP n’ụbọchị Sọnde na achọtala ozu mmadụ anọ ndị ọzọ ma napụta mmadụ iri na anọ (14) na ndụ.

    O kwuru na ọrụ nnapụta ahụ ga-aga n’ihu ruo mgbe o doro ha anya na enwezighị mmadụ ọzọ tọrọ ebe ahụ.

  12. SERAP agwala Tinubu ka e nyochaa ego mbite si n'aka Ụlọakụ Mbaụwa nakwa China

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu

    Ebe foto si, SERAP/TINUBU

    Ụlọorụ na-ahụ maka ikike dịrị onye a kpọrọ ‘Soco-Economic Rights and Accountability (SERAP) agwala onyeisiala Bola Tinubu ka o nyochaa etu e si mefuo ego dị ijeri dọla 1.5 nke Ụlọakụ Mbaụwa nyere Steeti 36 nakwa Abuja maka iji belata ụbịam na Naịjirịa.

    SERAP kwuru na ndị a na-enyo enyo maka ime mpụ na imefu ego kwesịrị ka a taa ha ahụhụ ruuru ha ma ka gọọmentị gbaa mbọ napụta ego ndị ahụ e zuru ezu.

    SERAP gwara Onyeisiala Tinubu ka o nye Ọkaiwu ukwu gọọmentị etiti bụ Lateef Fagbemi na ụlọọrụ ndị na-ahụ maka mpụ ikike ka ha nyochaa ihe mere ego dị ijeri dọla 3.121 nke mba China gbazinyere Gọọmentị etiti.

    Nke a dị n’akwụkwọ ozi onyeisi otu a bụ Kolawole Oluwadare degaara Onyeisiala Tinubu ma kwuo na ịkọwa etu ego mbite ndị a si gaa ga-eme ka ndị mmadụ nwee ntụkwasịobi n’ebe ọchịchị onye kwuo uche ya nọ.

    “Mpụ banyere etu e si mefuo ego mbite si n’aka ụlọakụ Mbaụwa na nke si n’aka mba China ga-aga n’ihu ma ọ bụrụ na a taghị ndịisi ọrụ gọọmentị ahụhụ maka ebubo ime mpụ.”

    “Ọ bụ site n’inyocha ego ndị a nakwa iji ihe akaebe aga n’ụlọikpe ka a ga-eji chọpụta nke bụ eziokwu.”

    Ụlọọrụ SERAP kwuru na ọ na-ewute ha banyere etu e si na-emefu ego ndị Gọọmentị etiti bitere n’aka Ụlọakụ Mbaụwa na China bụ nke e nyere steeti 36 tinyere isiobodo Abuja.

  13. Ndịagha Ukraine eburula ọgụ banye na mba Russia - Onyeisiala Zelensky

    Ndịagha Ukraine abanyela na Russia site n'obodo Kursk

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisiala mba Ukraine bụ Volodymyr Zelensky ekwuola na ndịagha ha buzi ọgụ banye na mba Russia bụ ndị na-ebuso ha agha.

    Nke a dị na mgbasaozi o mere n’abalị Satọde.

    Ọ gara n’ihu kelee ndịagha Ukraine ma kwuo na ya na onyeisi ndịagha ha bụ Oleksandr Syrskyi nwere mkparịtaụka banyere mwakpo a ha na-eme na mba Russia.

    “Ukraune na-egosi na ha nwereike iweghachite ikpe ziri ezi ma kwanye onye na-ebuso ha agha ọkụ n’ike,” ka Zelensky kwuru.

    Mana o kwughi na ọ bụ mpaghara Kursk nke Russia ebe ndịagha Ukraine kpachiri ọtụtụ obodo ma na-eyi egwu ịkpachi obodo mepere emepe.

    Maapụ na-egosi ebe ndịagha Ukraine banyerela na Russia

    Kamgbe ndịgha Ukraine weere ọnọdụ n’obodo Kursk nke mba Russia, ọtụtụ ndị bi ebe ahụ akwakọrọla pụọ dịka ọ na-ara ha ahụ ịkwụsị ndịagha Ukraine.

    Ihe karịrị mmadụ 76,000 esila n’obodo ahụ pụọ dịka e tinyere ọnọdụ gbata gbata n’okeala atọ dị na mpaghara ahụ.

    Mwakpo ọhụrụ a mgba Ukraine na-eme ụbọchị Tuzde mana ha gafeela ihe karịrị 10km n’ime mba Russia – nke kachasị na mwakpo ịbanye mba Russia ha mere kamgbe Russia wakporo ha n’ọnwa Febụwarị afọ 2022.

  14. Igbo mma mma nụ ooo!

    Anyị ji obiọma anabata unu n'ọgbakọ BBC Igbo n'ụbọchị taa.

    Biko bịa nọrọ ala ka ị gụrụ akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa gbaa gburu gburu.

  15. Anyị chọrọ ka Mali, Niger na Burkina Faso laghachita n’otu ECOWAS – Onyeisiala Bola Tinubu

    Onyeisiala Naịjirịa na ọkọlọtọ mba nọ n'otu ECOWAS

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu akpọọla oku ka mba Mali, Niger na Burkinaso Faso ka ha laghachịta n’otu ECOWAS.

    Onyeisiala Tinubu bụ onyeisioche otu ECOWAS kwuru nke a oge ya na onyeisi nchekwa otu ECOWAS nwere ọgbakọ n’Abuja.

    Ozi onye na-ekwuchitere onyeisiala bụ Bayo Onanuga wepụtara n’akara soshal midia X ya kwuru na onyeisiala Tinubu kọwara na mba atọ ahụ dị otu ECOWAS mkpa ma kwuo na ha ga aga n’ihu rịọ ndị isi ndịagha mba ahụ ka laghachita ma sonyere ECOWAS..

    N’okwu ya “E nweghị onyeisiala mba ECOWAS ka ibe ya, anyị ga-agba mbọ hụ na e nwere ezi mkparịtaụka dị n’etiti anyị na ndị isi ndịagha mba Mali, Niger na Burkina Faso iji mee ka ha nwe mgbanwe obi maka ọpụpụ ha na mbụ.

  16. Ụgbọelu kpọkara na Brazil gburu mmadụ niile nọ n’ime ya

    Ụgbọelu ahụ kpọkara

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụgbọelu ahụ bu ndị njem kpọkara na São Paulo dị na Brazịl ụbọchị Fraịde 9 Ọgọst, gburu mmadụ niile nọ n’ime. Ha gunyere ndị njem iri ise n’asaa (57) na ndị ọrụ anọ (4).

    Ozi onye uweojii bụ Emerson Massera wepụtara kwuru na oge ndị mgbanyụ ọkụ gbanyụchara ọkụ ebe ụgbọelu ahụ dara, ha chọpụtara na mmadụ niile nọ n’ime anwụọla.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ụlọọrụ ụgbọelu ahụ Voepass na-aga n’ihu eti ezinaụlọ ihe ahụ metutara aka n’obi dịka a na-eme nyocha ịchọpụta ihe mere ụgbọelu ji wee kpọkaa.

    Ụgbọelu ATR-72 turboprop si Cascavel dị na steeti Paranã aga Guarulhos dị na São Paulo tupu ọ kpọkaa.

    N’aka nke ọzọ, ozi onyeisiala mba Brazil bụ Luiz Inãcio wepụtara n’akara soshal midia X ya, kwuru na a ga-enwe abalị atọ iri uju iji na Brazil iji kwanyere ndị ahụ nwụrụ ugwu.

    Gọvanọ São Paulo Tarcísio de Freitas kwuru na a ga-enwe abalị atọ iri uju na mpagahra ahụ iji kwanyere mmadụ iri isii n’otu ahụ nwụrụ ugwu.

  17. Ndị ji egbe egbuola onye uweojii n’Anambra Steeti

    Ụgbọala ndị uweojii ogbuniigwe mebiri

    Ebe foto si, Nigeria Police

    Kọmishọna ndị uweojii n’Anambra steeti bụ Nnaghe Obono Itam, enyela ndị uweojii steeti ahụ iwu ka ha chọpụta ma wuchie ndị ahụ ji egbe gburu otu onye uweojii ma meruo otu onye ọzọ ahụ na mpaghara Omata dị n’ụzọ si Nnewi gawa Oba dị n’okpuruọchịchị idemili saụt, Anambra steeti.

    Ozi onye na-ekwuchitere ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kwuru na njiji ahụ jiri ụbọchị Fraịde Ọgọst 9 oge ndị ahụ ji egbe tụrụ ndị uweojii nọ ọrụ nchekwa n’omata ogbuniigwe wee gbuo otu onye uweojii.

    O kwuru na onye ahụ meruru ahụ na-enwenta nleta n’ụlọọgwụ ugbua.

    Ikenga gara n'ihu kwuputa na ndị uweojii anwuchiela mpaghara ahụ ebe nyocha na-aga n’ihu iji chọpụta ma wuchie ndị ahụ ji egbe.

  18. Emeka Anyaoku akpọọla oku iwu ọhụrụ na Naịjirịa

    Emeka Anyaoku

    Onye bụbu odeakwụkwọ otu Commonwealth bụ Emeka Anyaoku agwala onyeisiala Bola Tinubu ka o hibe ọgbakọ ‘national constituent assembly’ iji depụta iwu ọhụrụ na Naịjirịa.

    Emeka Anyaoku onye bụ onyeisioche otu patriots, kwuru na nke a bụ otu ihe ha na onyeisiala kpara n’ọgbakọ ha nwere n’obi ọchịọchị dị n’Abuja.

    O kwuru na steeti ọbụla ga-ahọpụta mmadụ atọ na abụghị ndị otu pati ọbụla ebe Abuja ga-ahọpụta otu onye ga-esonye nọ ọgbakọ national constituent assembly ahụ.

    Banyere ngagharịiwe e mere na Naịjirịa, Emeka Anyaoku kwuru na ha gwara onyeisiala Tinubu ka ọ kpọọ ndị isi ngagharịiwe ahụ iji chopụta ihe chọrọ ma tie ha aka n’obi.

  19. Maka agụụ: MTN enyela Gọọmenti etiti N1bn, akụrụngwa ruru 4,600 n’efu - Shettima

    Ndị ọchịchị na ndịisi ụlọọrụ MTN

    Ebe foto si, @officialSKSM/X

    Osote onyeisiala Naịjirịa, Kashim Shettima ekwuola na ndị ọrụ MTN bụ ndị amaama maka mkparịtaụka ekwenti na mgbasaozi yere gọọmenti etiti otu ijeri naịra.

    Shettima kwuru na ego ahụ bụ n’efu, ma bụrụ nke ha ji na-akwado mbọ gọọmentị na-agba ime ka nrị dị n’naịjirịa ma beleta oke agụụ.

    O sịkwara na MTN nyere gọọmenti akụrụngwa ọnụ ọgụgụ ya dị 4600 bụ nke a ga ekesa n’ụlọ akwụkwọ dị icheiche na Naịjirịọa.

    N'okwu Shettima “Obi dị m anụrị maka ihe MTN mere dịka ụlọọrụ, nakwa mmasị ha were maka ọdịmma Naịjirịa.

    E ji m aha onyeisiala anyị bụ Bola Tinubu nwere na-ekele unu maka ihe unu nyere anyị”.

    Shettima kwuru nkea mgbe onyeisioche ndị MTN bụ Ernest Ndukwe biara hụ ya n’ụlọọrụ ya dị n’ime obi gọọmenti na Abuja.

    O ji otu aka ahụ were kpooku ka ụlọọrụ ndị ọzọ na Naịjirịa yomie ihe MTN mere ma kwuo na udiri ihe ahụ ga enyereaka n’igbomkpa ndị na-enweghị ka ọha ha.

  20. Ụgbọelu bu mmadụ 62 akpọkaala na Brazil

    Ụgbọelu bu ndị njem 62 akpọkaala na Brazil

    Ebe foto si, Alamy

    Ụgbọelu bu ndị njem iri ise na asatọ (58) na ndị ọrụ anọ akpọkaala na São Paulo dị na Brazịl.

    Ụgbọelu ahụ nwere njini abụọ si Cascavel dị na Paraná steeti na-aga n’ọdọ ụgbọelu dị na São Paulo tupu ọ daa n’obodo Vinhedo.

    Ozi si n’aka ụlọọrụ ugbọelu ahụ kwuru na “o dobeghị anya etu ya bụ ihe mberede siri mee maọbụ ọnọdụ ndị nọ n’ime ya”.

    Ndị ọchịchị kwuru na ụgbọelu ahụ dara n’elu ụlọ mmadụ mana ụlọmgbasaozi dị na Brazịl bụ GloboNews tivii gosiri ihe onyonyoo ebe ọkụ na-agba nke ụlọ jupụtara na ya.

    Ndị uweojii na ndị mgbanyụ ọkụ awụchiela ebe ahụ dịkwa ka e mere ka ụlọogwụ dị iche iche mata banyere ya bụ ọnọdụ.

    Ka osinadị, Onyeisiala Brazịl bụ Luiz Inácio Lula da Silva jiiri otu nkeji kwanyere ha ugwu n’otu ọgbakọ ọ na-ekwu okwu.

    Ọ depụtara n’akara ọbaozi ya sị ‘ozi banyere mkpọka ụgbọelu ahụ dị ezigbo mwute. Obi m na-agara ezinaụlọ na ndị enyi mmadụ ndị nwụrụ anwụ.”