Ndị uweojii Naịjirịa akpọọla Joe Ajaero oku ọzọ

Akụkọ niile dị mkpa na mba ụwa niile n'ọnwa Ọgọst 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Jessica Nwankwo, Chinonso Ugorji, Michael Ngene, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Uche Akolisa

  1. Naịjirịa ga-enweta ọgwụ mgbochi mpox n’izuụka na-abịa – Mịnịstri na-ahụ maka ahụike

    Ọgwụ mgbochi mpox

    Ebe foto si, Getty Images

    Mịnịstri na-ahụ maka ahụike na Naịjirịa ekwuola na Naịjirịa ga-enweta ọgwụ mgbochi ọrịa mpox ubọchị Tuzde 27 Ọgọst, 2024.

    Onyeisi mgbasaozi mịnịstri ahụ bụ Garba Ahmed Rufia kwuru na ọgwụ mgbochi ruru 10,000 nke ha nwetara site na-enyemaka gọọmenti mba Amerịka ga-abata na Naịjirịa.

    O kwuru na gọọmenti Naịjirịa na-agba mbọ inwenta ma kesa ọgwụ mgbochi ndịọzọ dịka ụbọchị na-aga.

    Ka ọ dị ugbua, ndị ọrụ ahụike na Naịjirịa na-enweta nkuzi iji chopụta njirimara ọrịa mpox.

  2. Ọ bụ Philip Shaibu ka iwu kwadoro dịka osote Gọvanọ Edo Steeti - Ụlọikpe mkpegharị

    Philip Shaibu

    Ebe foto si, Philip Shaibu/Facebook

    Ụlọikpe mkpegaharị Naịjirịa dị n’Abuja akwadọla ikpe ụlọikpe kachasị dị n'Abuja wechitara Philip Shaibu dịka osote Gọvanọ Edo Steeti.

    Ụlọikpe ahụ nọrọ ụbọchị Tuzde Ọgọst 20, 2024 kagbuo arịrịọ ụlọ omeiwu Edo Steeti wetara iji wepụ Shaibu dịka osote Gọvanọ.

    Cheta na ụlọomeiwu Edo Steeti chụpụrụ Shaibu n’ọkwa ụbọchị Mọnde 8 Eprel, 2024 ka ha nabatara mkpebi otu kọmiti ọkaikpe ukwu steeti ahụ bụ Daniel Okungbowa hibere iji nyocha ebubo mpụ e boro Shaibu.

    Mana ọkaikpe James Omotosho nke ụlọikpe kachasị dị n’Abuja, kagburu mkpebi ụlọomeiwu ahụ na Julaị 17.

    O kwuru na ebubo ahụ e bọrọ Shaibu megidere iwu Naịjirịa ma nye onyeisi ndị uweojii iwu ka e nweghachita ndị ọrụ nchekwa Shaibu dịka osote gọvanọ ruo oge ọkwa ya ga-agwụ.

    Ụlọikpe mkpegharị kwuru na ọ bụ naanị Philip Shaibu ka iwu kwadoro dịka osote Gọvanọ Edo Steeti.

  3. Ndị uweojii na-achọ onye ogbu mmadụ gbapụrụ n’ụlọ mkpọrọ na Kenya

    Collins Jumaisi Khalusa

    Ebe foto si, AFP

    Ndị uweojii mba Kenya na-achọ otu nwoke aha bụ Collins Jumaisi Khalusha gbara afọ 33 e kwuru na ọ na-egbu mmadụ na mmadụ 12 ndịọzọ gbapụrụ n’ụlọ mkpọrọ.

    Mmadụ 12 ahụ bụ ndị mba Eritrea a wuchiri maka ịnọ na mba Kenya n’ụzọ iwu na-akwadoghị.

    Ndị uweojii wuchiri Collins Jumaisi Khalusha n’ọnwa Julaị ka o kwuputara na ya gburu ụmụnwaanyị 42 nke gunyere nwunye ya kemgbe afọ 2022.

    Ọkaiwu Khalusha kwuru na ndị uweojii yiri egwu ka o kweta n’ebubo ahụ.

    Ụlọikpe kwuru ka a kpọchie Khalusa na mkpọrọ dịka nyocha na-aga n’ihu.

    Ndị uweojii chọpụtara na Khalusha na mmadụ 12 ndịọzọ ahụ gbapụrụ n’ụlọ mkpọrọ oge ndị uweojii na-eme emume ịgụọnụ.

    Ozi BBC wetara kwuru na ndị ahụ gbara ọsọ chabiri eriri waya e ji rụọ ụlọ mkpọrọ ahụ.

  4. Ndị uweoji agwaala onyeisi NLC bịa zara ọnụ ya maka ebubo iyi ọha egwu

    Joe Ajaero

    Ebe foto si, @NLCHeadquarters

    Ndị uweoji agwaala Joe Ajaero bụ onyeisi otu jịkọrọ ndị ọrụ nNaịjirịa ka ọ bịa zara ọnụ ya maka ebubo ịkwado ndị na-eyi ọha egwu, itisa obod, iso ndị omekome na ihe ndị ọzọ.

    Ụlọọrụ ndị uweoji mere ka a mata nke a n’akwụkwọ ọzị Amamu Mu’azu binyere aka bụ nke ha jị akpọ Joe Ajaero ka ọ bịa zara ọnụ ya.

    N’akwụkwọ ozi ahụ bụ nke ndị uweoji dere n’abalị Mọnde 19 Ọgọst 2024 ka ha nọ sị Joe Ajaero nọrọ n’ụlọọrụ ha taa n'elekere iri nke ụtụtụ. Ha kwuru na ọ bụrụ na Ajaero abịaghị n’ụlọọrụ ha, na ha ga-enweta ikike ịnwụchi ya.

    Na nzaghachi, otu Jịkọrọ ndị ọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) kwuru na e nwee ihe mere onyeisi ha bụ Joe Ajaero maọbụ onye otu ha n’aka ndị uweoji, na ha ga amalitae abụbọọrụ ozugbo ozugbo.

    NLC mere ka amata nke oge ha mechere nzụkọ gbatagbata maka nyocha ndị uweoji kwuru na ha na-eme n’isi onyeisi ha. NLC sị na abụbọ ọrụ ahụ ga-amalita na-etiti abali ga-efota echi.

    N’akwụkwọ ozi osote onyeisi NLC bụ Ado Sani Minijibir binyere aka, “nyocha ndị uweoji a edoghị anya. Ọ dịka aka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị a dị na ya”.

    Ha kwuru na “kama ndị uweoji ga-arịọ ebere maka ịwakpọ ụlọọrụ anyị, ndị Uweoji malịtara ịkpagbu anyị” “Ihe a bụ naanị etu ha sị chọọ imechi ndị ọrụ ọnụ ma mechie ndị isi otu jịkọrọ ndị ọrụ ọnụ”.

    “Anyị ga-eje hụ ndị uweoji, zaa oku ha kpọrọ” Ndị NLC gị ohere ahụ katọọ ebubo niile ndị uweoji boro onyeisi ha ma kọwaa dịka etu ndị mmadụ sị chịọ itisa otu ha.

    Ha gwara gọọmenti ka ha kwụsị nyocha ahụ ndị uweoji na-eme.

    - Agaghị m enwe ohere bịa taata zaa ọnụ m maka ebubo ahụ - Ajaero

    Onyeisi otu jịkọrọ ndị ọrụ (NLC) bụ Joe Ajaero agwaala ndị uweoji na ya ama nwe ohere taata ịbịa zaa ajuju gbasara ebubo ahụ ndị uweoji kwuru na ha na-enyocha.

    Joe Ajaero bụ onye gị onye ọka iwu ya bụ Femi Falana were degara onyeisi ndị uweoji akwụkwọ rụtụrụ aka na ya wetere akwụkwọ ọzị ịbịa n’ụlọọrụ ndị uweoji naanị abalị garaaga.

    Ọ kwuru na ya agaghi enwe ohere ịbịa n’ụlọ ọrụ ndị uweoji ruo n’ụbọchị Wenesde, Ọgọst 29 bụ oge ya ga-akwado ịza ajuju gbasara ebubo e boro ya.

    Ajaero gara n’ihu gwa ndị uweoji ka ha doo ya anya, ma kọwara ya ọfụma ihe niile gbasara ebubo ahụ.

  5. Onyeisiala Bola Tinubu ji ụgbọelu ọhụrụ gaa France - Onanuga

    New presidential jet

    Ebe foto si, @aonanuga1956

    Ndị ọchịchị Naịjirịa ekwuola na ọ bụ ụgbọelu ọhụrụ ka Onyeisiala Bola Tinubu jiri gawa mba Fransị n’ụbọchị Mọnde.

    Onye ndụmọdụ pụrụiche maka mgbasaozi na atụmatụ ọrụ onyeisiala bụ Bayo Onanuga kwupụtara nke a n’ozi o bipụtara n’akara ọbaozi X ya n’ụbọchị Mọnde 19 Ọgọst 2024.

    Onanuga kwuru na ụgbọelu ọhụrụ ahụ bụ Airbus A330-200 ga-anọchi anya Boeing B737-700 (BBJ) a zụtara n’oge ọchịchị onyeisiala Naịjirịa pụrụ apụ bụ Olusegun Obasanjo.

    Ọ sịrị na ihe mere e ji gbanwee ụgbọelu nke ochie ahụ bụ n’ihi arụghị ọrụ nke ọma tụmadụ n’oge e jiri ya mee njem gaa Saudi Arabia.

    Dịka o siri kwuo, a zụtara ụgbọelu ọhụrụ ahụ n’ọnụego dị ezigbo ala dịka ọ ga-ebelata nnukwu ego Naịjirịa na-emefu iji lekọta nke ọchie anya.

  6. Israel ebutela ozu mmadụ isii e jichiri na Gaza

    Israel ebutela ozu mmadụ isii e jichiri na Gaza

    Ebe foto si, Hostage Families Forum

    Ndịagha kwuru na e butela ozu ndị Izrel isii e ji eji na mpaghara Khan Younis dị na Gaza n’ụbọchị Mọnde.

    Ozi sitere n’aka ụlọọrụ ndịagha Izrel kwuru na ozu ndị ahụ gụnyere Yagev Buchshtab, Alexander Dancyg, Avraham Munder, Yoram Metzger, Nadav Popplewell na Haim Perry.

    Oge gara aga ka Izrel kwupụtara na mmadụ ise nwụrụ n’ihi na ha chere na Avraham Munder ka dị ndụ oge ahụ.

    Ọ bụ ndị ọrụ nchekwa Izrel gụnyere Israel Defence Forces (IDF) na Israel Security Agency butere ozu mmadụ ndị ahụ.

    Ezinaụlọ ndị ahụ nwụrụ anwụ sịrị na ozu ndị a e butere ga-eme ka obi ruo ha ala.

    Ozi ahụ gara n’ihu kwuo na mkpọghachite mmadụ otu narị na itoli (109) e ji eji na Gaza bụ nke a ga-enwetazu naanị site na mkparịtaụka ma kpọọ oku ka gọọmenti Izrel mee ihe niile dị ya n’aka ileba anya n’atụmatụ e chere ya n’ihu ugbua.

    N’ụbọchị Mọnde, onyeisiala Izrel bụ Isaac Herzog kwuru na ya na-ezigara ezinaụlọ mmadụ ndị ahụ nwụrụ anwụ ozi nkasiobi.

    Ọ gara n’ihu kwuo na “e nweghị ihe ọbụla ga-akwụsị ha ịgba mbọ ndị ha nwere ike ya iji kpọghachite ụmụafọ Izrel niile e ji eji”.

  7. Ndị omekome ataala isi ndị uweojii ọzọ n’Enugwu Steeti

    Foto ụgbọala ndị uweojii ndị ji egbe mụnyere ọkụ

    Ebe foto si, Okeke Billionbank/Facebook

    Akụkọ a na-ndị omekome gbagburu ndị uweojii buru egbe ha bụ ihe a na-anụ kwa mgbe kwa mgbe n’Enugwu Steeti.

    Ihe onyonyo vidio na-efegharị na soshal midia gosiri na ọzọ mere na okpuruọchịchị Nkanu West.

    Nchọpụta gosiri na mkpa mkpa ahụ mere ụbọchị Sọnde18th Ọgọst 2024 mgbe ndị ojị egbe ahụ wakporo check point ndị uweojii ahụ na Ishi Ozalla were egbe gbagbuo mmadụ atọ na ndị uweojii ahụ.

    Ndị nọ na gburu gburu Four Corner ebe ihe ahụ mere, kwuru na ndị ahụ ji egbe gbagburu otu onye uweojii ma gbukwaa mmadụ abụọ ọzọ, gbaa ozu ha ọkụ n’ime ụgbọ ala ndị uweojii dị ebe ahụ.

    Onye okwuchite ọnụ ndị uwe ojii n’Enugwu bụ Daniel Ndukwe asabeghị ozi BBC Igbo zigaara ya maka ịchọpụta ka osiri mee.

  8. Abdullahi Ganduje na Hope Uzodinma ekwuola na ha anaghị azọ ọkwa onyeisiala

    Abdullahi Ganduje na Hope Uzodinma

    Ebe foto si, Abdullahi Ganduje/Hope Uzodinma Facebook

    Onyeisi otu pati All Progressives Congress (APC) bụ Abdullahi Ganduje na Gọvanọ na-achị Imo Steeti ekwuola na aka ha adịghị n'akụkọ ahụ na-efegharị na ha na-azọ ọkwa onyeisiala na osote onyeisiala Naịjirịa.

    Cheta na akwụkwọ poster Abdullahi Ganduje na Hope Uzodinma na-ekwu na ha na-azọ ọkwa onyeisiala na osote onyeisiala pụtara n'izu gara aga.

    N'ozi Ganduje wepụtara nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Edwin Olofu binyere aka, kwuru na akwụkwọ poster ahụ bụ aka chịburu Kano Steeti bụ Rabiu Kwankwanso na ndị ọzọ na-ebuso ya agha mepụtara akwụkwọ poster ahụ.

    O kwuru na Kwankwanso mere nke a iji tinye nsogbu n'etiti Ganduje na onyeisiala Bola Tinubu.

    N'aka nke ọzọ, Gọvanọ Hope Uzodinma kwuru na anya ya adịghị na-ịzọ ọkwa osote onyeisiala Naịjirịa.

    Ozi kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Imo Steeti bụ Declan Emelumba wepụtara kwuru na ọ bụ ndị iro gọvanọ Hope Uzodinma chọrọ inweta nsogbu n'etiti ya na onyeisiala Bola Tinubu na-akpa nkata ahụ.

  9. Mmadụ isii na-efu efu oge ụgbọmmiri ha kpuru n’osimiri Italy

    Ndị ọrụ gbata gbata na-achọ ndị ahụ na-efu efu

    Ebe foto si, Reuters

    Otu nwoke anwụọla ebe mmadụ anọ ọzọ ka a na-achọ achọ oge ụgbọmmiri ha ji eme njem kpuru n’osimiri na mpaghara Sicily dị na mba Itali

    Ndị ụlọọrụ na-agbanyụ ọkụ kwuru na mmadụ 22 nọ n’ụgbọmmiri ahụ bụ ndị mba Briten, mba Amerịka na mba Kanada.

    E kwuru na mmadụ 10 bụ ndị ọrụ ụgbọmmiri ahụ ebe mmadụ 12 bụ ndị njem.

    Akụkọ kwuru na ụgbọmmiri ahụ dabara na mmiri na mapaghara Palermo oge ebulimmiri tornado kuru ebe ahụ.

    Ndị ọrụ gbatagbata napụtara mmadụ 15 ihe ahụ metụtara gụnyere otu nwatakiri gbara otu afọ onye e dugara ụlọọgwụ palermo paediatric hospital. Ndị nke ọzọ a napụtara na-enweta nleta n'ụlọọgwụ.

  10. Ụlọakụ etiti Lybia akwụsịla ọrụ maka otu onyeisi ha a tọọrọ

    Ụlọakụ etiti Lybia akwụsịla ọrụ maka otu onyeisi ha a tọọrọ

    Ebe foto si, Reuters

    Ụlọakụ etiti Libịa ekwuola na ha akwụsịla ọrụ ha niile maka onye ọrụ ha ọkwa ya dị elu a tọọrọ n’isi obodo mba ahụ bụ Tripoli.

    Ụlọakụ ahụ kwupụtara n’ụbọchị Sọnde 18 Ọgọst 2024 na a tọọrọ onyeisi ha na-ahụ maka nkanụụzụ mgbasaozi bụ Musab Msallem.

    Ha kwuru na ndị amaghị ndị ha bụ tọọrọ Msallem n’ụlọ ya n’ụtụtụ Sọnde dịka ha yiri egwu ịtọrọ ndị ọrụ ụlọakụ ahụ ọzọ.

    Ya bụ ụlọakụ kwuru na ha agaghị amalite ọrụ ruo mgbe a tọhapụrụ Msallem.

    Ụlọakụ etiti Libịa bụ naanị ụlọakụ mbaụwa nabatara maka ịkwụbanye ego mba ahụ retere na mmanụ agbịdị, nke bụ ụzọ mkpata ego mba ahụ kemgbe afọ iri ehiwere gọọmenti abụọ na Tripoli na Benghazi.

    Ụlọmgbasaozi AFP kwuru na ọnọdụ a na-abịa dịka ọ gasịrị otu izuụka ndị ojiegbe gbara ụlọakụ ahụ okirikiri.

    AFP sịrị na ụlọmgbasaozi dị na Libịa kwuru na ndị ojiegbe ahụ wakporo ya bụ ụlọakụ iji manye onyeisi ha bụ Seddik al-Kabir ka ọ gbaa arụkwaghịm.

  11. Ukraine sị na ha etibiela akwammiri Russia nke abụọ

    Ukraine sị na ya etibiela akwammiri Russia nke abụọ

    Yukren ekwuola na ha etibiela akwammiri nke abụọ dị oke mkpa na Rọshịa dịka ha buuru agha banye na mpaghara Kursk.

    Ndịagha Yukren wepụtara ihe onyonyoo akwammiri ahụ dị n’elu osimiri Seym River n’ụbọchị Sọnde 19 Ọgọst 2024.

    Ọ bụ site n’akwammiri ahụ ka Kremlin si ebubata ndịagha ya.

    Onyeisi ndịagha elu Yukren bụ Lt Gen Mykola Oleschuk depụtara n’ọbaozi soshal midịa sị ha “agbariela akwammiri ọzọ”.

    Dịka awa ole na ole gasịrị, Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky kwuru na ebumnobi ndịagha ya banyere na Kursk bụ ikepụta “ogige nchekwa ogbe” iji kwụsị mwakpo Rọshịa.

    Ọ fọdụrụ obere ka o ruo izuụka abụọ kemgbe Yukren bidoro mwakpo ọjọọ n’okeala Rọshịa kemgbe Mosko malitere ịwakpo Yukren n’afọ 2022.

    Ukraine sị na ya etibiela akwammiri Russia nke abụọ

    Ebe foto si, Telegram

  12. Kọmishọna Anambra Steeti a tọọrọ ya na nwunye enwerela onwe ha

    Patrick Aghamba

    Ebe foto si, APGA INTERACTIVE FORUM/FACEBOOK

    Kọmishọna na-ahụ maka ndị ntorobịa Patrick Aghamba na nwunye ya enwerela onwe ha site n’aka ndị ntọ tọọrọ ha ụbọchị Fraịde 16 Ọgọst, 2024.

    Ndị ji egbe tọọrọ Patrick Aghamba na nwunye ya ka ha na-aga mmeme agbamakwụkwọ nwa Gọvanọ Chukwuma Soludo bụ Ifeatu Adaora Soludo e emere n’Abuja ụbọchị Satọde 17 Ọgọst, 2024.

    Ozi ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Chukwuma Soludo bụ Christian Aburime gwara BBC Igbo na ndị ahụ ji egbe tọghapụrụ Patrick na nwunye ya ụbọchị Satọde 17 Ọgọst, 2024.

    Cheta na ndị ahụ ji egbe gburu otu onye ọrụ kọmishọna ahụ aha bụ Kpajie Offia.

  13. Ndị uweojii ezigala ndị ọrụ na akụrụngwa iji gbapụta ụmụakwụkwọ a tọọrọ na Benue Steeti

    Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa Kayode Egbetokun

    Ebe foto si, Nigeria Police/X

    Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Kayode Egbetokun enyela iwu ka e ziga ndị uweojii na Benue Steeti iji nyere aka gbapụta ụmụakwụkwọ ahụ ndị ji egbe tọọrọ na Steeti ahụ.

    Cheta na ndị ji egbe tọọrọ ụmụakwụkwọ mahadum University of Maiduguri na mahadum University of Jos ụbọchị Tozde 15 Ọgọst, 2024 ka ha na-aga ọgbakọ n’Enugu Steeti.

    Ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Muyiwa Adejobi wepụtara mere ka a mata na Egbetokun nyere iwu ka e ziga ndị uweojii nakwa akụrụngwa ọrụ gunyere dronu, ụgbọelu helikọpta na ụgbọala ndịagha na-aghọ mgbọ iji hụ na-azopụtara ụmụakwụkwọ ahụ.

    Ozi ahụ gara n’ihu rịọ ndị steeti ahụ ka ha nyere ndị uweojii aka ma nye ha ozi ọbụla nwereike ịba uru n’ọrụ ha.

    Egbetokun gara n’ihu kasie ezịnaụlọ ụmụakwụkwọ ahụ a tọọrọ obi ma kwe nkwa na ndị uweojii ga-agba mbọ zọpụta ha.

  14. Onye njem na-aga Vietnam anyụọla akpa cocain 88 n’Abuja

    Onye njem na-aga Vietnam anyụọla akpa cocain 88 n’Abuja

    Ebe foto si, NDLEA/Facebook

    Ụlọọrụ na-ebu agha megide ire na ịtụ mgbere ọgwụike na Naịjirịa bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) anwụchiela onye ojiegoachụntaego aha ya bụ Paul Okwy Mbadugha n’Abụja.

    Ndị ọrụ NDLEA nwụchiri nwaamadị ahụ n’ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe International Airport dị n’Abụja maka ịda nnwale ọgwụike oge ọ na-achọ ifega Vietnam.

    Ọnụ na-ekwuchitere NDLEA bụ Femi Babafemi kwupụtara nke a n’ozi o bipụtara n’akara ọbaozi Facebook ụlọọrụ ahụ n’ụbọchị Sọnde 18 Ọgọst 2024.

    Ọ sịrị na ndị ọrụ NDLEA nwụchiri nwaamadị ahụ gbara afọ iri ise na anọ (54) n’ọnụụzọ ọdọụgbọelu ahụ n’ụbọchị Mọnde 12 Ọgọst 2024 oge ọ na-akwado ifega Vietnam site Doha.

    Babafemi kwuru na Mbadugha nyụrụ akpa ọgwụike cocain iri asatọ na asatọ (88) nke arụ ya dị 1.710kg oge elebachaara ya anya abalị anọ n’ụlọnga.

    Onye njem na-aga Vietnam anyụọla akpa cocain 88 n’Abuja

    Ebe foto si, NDLEA/Facebook

    N’ozi ahụ o wepụtara, Babafemi sịrị na Mbadugha kwuru na ya bụ onye ji ego achụ nta ego na Legọs. Ọ sịrị na enyi ya nwoke bi na mpaghara Isolo Legọs nyere ya akpa cocain ndị ahụ o loro maka ibugara ya mmadụ na Vietnam n’ọnụego dọla puku abụọ ($2,000).

  15. A malitela ngagharịiwe na Venezuela n’ihi okwe ntụliakaelu

    Ndị na-eme ngagharịiwe na Venezuela

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị na-akwado otu na-agba gọọmenti ụkwụ ezukọọla na mpaghara dị iche iche na Venezuela ime ngagharịiwe maka mmeri Nicolas Maduro nwetara na ntụliaka onyeisiala a haziri n’ọnwa gara aga.

    Onyendu otu ahụ bụ María Corina Machado sonyeere puku kwuru puku ndị ahụ na-eme ngagharịiwe n’isi obodo Venezuela bụ Caracas ma gbaa ha ume ka ghara ịtụ egwu.

    Nwada Machado, onye nọ kemgbe na-ezogharị n’ihi ebubo ịkpali ọgbaaghara kwuru na enweghị ihe karịrị olu ụmụ mmadụ.

    E zipụrụ ndị uweojii na ndịagha n’igwe dịka ndị na-akwado Maazị Maduro hazikwara ngagharịiwe nke ha.

    “Anyị agaghị apụ n’ogbe,” ka Machado gwara ndị na-eme ngagharịiwe, dịka a hụrụ ka ọtụtụ n’ime ha na-egfegharị okwe ntụliakaelu e nwetara n’ogige ntụliakaelu dị iche iche iji gosi na ọ bụ ha nwetara mmeri.

    Ọ kpọrọ oku ka e mee nghagharịiwe gburugburu mba ahụ iji kwanye Maduro ọkụ n’ahụ ịnabata mmeri.

    Ndị na-eme ngagharịiwe na Venezuela

    Ebe foto si, Reuters

    Maduro esiela ọnwụ na ọ bụ ya nwetara mmeri maka oge ọchịchị nke isii mana ndị na-agba ya ụkwụ wepụtara ndekọ okwe ntụliakaelu na-egosi na ọ bụ onye pati nke ha bụ Edmundo Gonzalez nwetara ọnụọgụ vootu kachasị.

    Ụlọọrụ na-ahazi ntụliakaelu na Venezuela nke ndị nkwado Maduro nọ n’isi ya ajụla iwepụta okwe ntụliakaelu ahụ n’uju kama ha kwupụtara na o jiri pasenti iri ise na abụọ (52%) nweta mmeri.

    E meela ụdị ngagharịiwe ahụ na mba dị iche iche dịka Australia, Spain, United Kingdom, Canada, Colombia, Mexico na Argentina ebe otu European Union jụrụ ịnabata okwe ntụliakaelu ahụ.

  16. A gwala ndị njem ka ha lee ma ha aga-agba ọgwụ mgbochi mpox

    Onye nwere ọrịa mpox

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị njem kwesịrị itule ma ha ga-agba ọgwụ mgbochi mpox tupu ha agaa mba ndị nwere ọrịa ahụ n’Afrịka.

    Ụlọọrụ European Centre for Disease Prevention and Control (ECDC) kwupụtara nke a oge ha na-ekwu okwu gbasara ntiwapụ ụdịrị ọrịa mpox ọhụrụ n’Afrịka.

    Ụlọọrụ ahụ kwukwara na akụkụ ụwa ndị ọzọ tinyere Yurọp kwesịrị ịtụ anya ọrịa ahụ.

    ECDC kwuru na a na-enwe obere ụjọ na ọrịa mpox nwereike fesaa n’ụwa niile n’agbanyeghị na ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organization nọọrọ na nso nso a kwupụta mpox dịka ọnọdụ gbatagbata na mbaụwa.

    Ọrịa ahụ a maburu dịka monkeypox bụ nke mmadụ nwereike ibute site na mmekọ ahụ.

  17. Ndị omeiwu nta ekwuola ka atọghapụ ụmụakwụkwọ iri abụọ atọọrọ na Benue steeti

    Ọnyeisi ụlọomeiwu nta Tajudeen Abbas

    Ebe foto si, House of Representatives, Federal Republic of Nigeria

    Ụlọomeiwu nta Naịjirịa egosila mwute ha na ntọrọ atọọrọ ndị ụmụakwụkwọ ruru iri abụọ na Benue steeti ebe ha na-aga nzụkọ ụmụakwụkwọ ndị ụka Katolik n'Enugwu.

    N'zoi ha wepụtara n'ụbọchị Satode ha kwuru na ozi ntọrọ ụmụakwụkwọ ahụ ebutela oke nchekasị na ụjọ n'ebe niile na Naịjirịa.

    Ha kpọkwara oku ka ndị uweojii mee ihe ngwa ngwa iji hụ na atọghapụrụ ụmụakwụkwọ ahụ

    "Anyị na-akpọ oku ka ndị ọrụ nchekwa tinye uchu nakwa ngwa niile ha nwere ịhụ na atọghapụrụ ụmụakwụkwọ ahụ n'ihi na mwakpo mere ha pụtara mwakpo ọdịnihu ndị ọrụ ọgwụgwọ na Naịjirịa.

    Ha kwukwara ka emee ngwangwa hụ na akpọlatara ụmụakwụkwọ ahụ n'udo na nchekwa.

    N'otu aka ahụ onyeisi ndị uweojii bụ Kayode Egbetokun enyela ndị otu ya iwu ka ha wegara ndị uweojii na Benue steeti enyemaka mmadụ na ngwagha na ihe ndị ọzọ ha chọrọ iji hụ na achọtara ụmụakwụkwọ ahụ ma tọghapụ ha n'aka ndị tọrọ ha.

    Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Wenzde ka akụkọ gbọwara na atọọrọ ụmụakwụkwọ na-agụ Medicine na Dentistry na Benue steeti.

    O mere dịka ha nọ n'ime ụgbọala eme njem ịga nzụkọ ụmụakwụkwọ ahụike ụka katolik na-eme n'Enuugwu steeti.

    Mmadụ 12 n'ime ha bụ ndị si Mahadum Jos ebe mmadụ 8 n'ime ha si mahadum Maiduguri.

  18. Anyị ga-akagbu ikike ọdụ mmanụ ụgbọala na-ezo mmanụ ụgbọala – Ulọọrụ NMDPRA

    Ọdụ mmanụ ụgbọala

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ Nigerian Petroleum Regulatory and Refining and Transport Agency (NMDPRA) ekwuola na ha ga-akagbu ikike ọdụ mmanụ ụgbọala ọbụla achọpụtara na ha na-ezo ma ghara ire mmanụ ụgbọala.

    Onyeisi ụlọọrụ NMDPRA bụ Ogbugo Ukoha kwuru nke a n’ozi o wepụtara n’akara soshal midia X oge ya na ndị ọrụ ya gara nleta a na-atụghị anya n’ogige ndị na-ere mmanụ ụgbọala n’Abuja.

    Cheta na n’izu ole n’ole, enwela ụkọ mmanụ ụgbọala na steeti ụfọdụ na Naịjirịa gba gburugburu.

    Ukoha dọrọ aka na nti nye ndị ọdụ mmanụ ụgbọala ka ha ghara iresi ndị na-abịa goro mmanụ ụgbọala ma reesi ya ndị ọzọ n’ọnụego dị elu.

    O kwuru na nke a megidere iwu.

  19. Ndị ji egbe atọrọla kọmishọna na-ahụ maka ndị ntorobịa n’Anambra Steeti

    Patrick Aghamba

    Ebe foto si, APGA Interactive Forum/Facebook

    Ndị ji egbe atọrọla kọmishọna na-ahụ maka ndị ntorobịa n'Anambra steeti bụ Patrick Aghamba, nwunye ya ma gbagbuo otu onye ọrụ kọmishọna ahụ e kwupụtara aha dịka Kpajie ABK Offiah.

    Akụkọ kwuru na njiji ụbọchị Fraịde 16 Ọgọst, 2024 ka kọmishọna ahụ na-aga mmeme agbamakwụkwọ nwa Gọvanọ Chukwuma Soludo bụ Ifeatu Adaora Soludo a na-eme n’Abuja ụbọchị Satọde 17 Ọgọst, 2024.

    A na-ekwu na mkpamkpa ahụ mere na mpaghara Kogi steeti mana odeakwụkwọ Gọvanọ Soludo bụ Christian Aburime kwuru na gọọmenti Anambra amatabeghị kpọmkwem ebe ọdachi ahụ mere.

    Ka ọ dị ugbua, enwebeghị ozi ọbụla ndị uweojii wepụtara maka njiji a.

  20. Ndị dọkita mba India agbaala abụbọ ọrụ maka onye otu ha e gburu

    Ndị dọkita na-eme ngagharịiwe na mba India

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị dọkita ahụike na mba India agbaala abụbọ ọrụ ma malite ngagharịiwe maka onye otu ha nwaanyị e dilara n’ike ma gbuo ya na mpaghara Bengal dị n Kolkata.

    A chopụtara ozu nwaanyị e gburu n’ogige ụlọakwụkwọ ọgwụ RG kar medical college n’izu gara aga ka o kwuru na ọ chọrọ ịge zuo ike ebe ahụ.

    Otu jikọrọ ndị ọrụ ahụike na India bụ Indian Medical Association (IMA), kwuru na ha akwusịla ọrụ n’ụlọọgwụ niile dị na mba ahụ taa bụ Satọde 17 Ọgọst.

    IMA kọwara ogbugbu ahụ mere n’izu gara aga dịka ihe arụ nke gosiri na e nweghị ezi nchekwa nye ụmụnwaanyị ma kpọọ oku ka gọọmenti nyere aka hụ maka ezi nchekwa na mba India.

    Ha kwuru na ndị ọrụ gbatagbata ga-aga n’ihu irụ ọrụ dịka abụbọ ọrụ a na-aga n’ihu.

    Onyeisi IMA bụ R.V Asokan gwara BBC na o teela ndị dọkita ahụike ji eme ngagharịiwe maka ahụhụ ha na-ata na mba India.

    Asokan kwuputara na ha chọrọ ka gọọmenti hibe iwu ga-ahụ maka nchekwa ndị ọrụ ahụike, itinye ezi nchekwa n’ụlọọgwụ niile ma mee ka ndị ọrụ ahụike nwee ebe ezumike n’ụlọọgwụ.