Mịnịstri na-ahụ maka ahụike na Naịjirịa ekwuola na Naịjirịa ga-enweta ọgwụ
mgbochi ọrịa mpox ubọchị Tuzde 27 Ọgọst, 2024.
Onyeisi mgbasaozi mịnịstri ahụ bụ Garba Ahmed Rufia kwuru na ọgwụ
mgbochi ruru 10,000 nke ha nwetara site na-enyemaka gọọmenti mba Amerịka ga-abata na Naịjirịa.
O kwuru na gọọmenti Naịjirịa na-agba mbọ inwenta ma kesa ọgwụ mgbochi ndịọzọ
dịka ụbọchị na-aga.
Ka ọ dị ugbua, ndị ọrụ ahụike na Naịjirịa na-enweta nkuzi iji chopụta njirimara ọrịa
mpox.
Ọ bụ Philip Shaibu ka iwu kwadoro dịka osote Gọvanọ Edo Steeti - Ụlọikpe mkpegharị
Ebe foto si, Philip Shaibu/Facebook
Ụlọikpe mkpegaharị Naịjirịa dị n’Abuja akwadọla ikpe ụlọikpe kachasị dị n'Abuja wechitara
Philip Shaibu dịka osote Gọvanọ Edo Steeti.
Cheta na ụlọomeiwu Edo Steeti chụpụrụ Shaibu n’ọkwa ụbọchị Mọnde 8
Eprel, 2024 ka ha nabatara mkpebi otu kọmiti ọkaikpe ukwu steeti ahụ bụ Daniel
Okungbowa hibere iji nyocha ebubo mpụ e boro Shaibu.
Mana ọkaikpe James Omotosho nke ụlọikpe kachasị dị n’Abuja, kagburu mkpebi ụlọomeiwu ahụ na Julaị 17.
O kwuru na ebubo ahụ e bọrọ Shaibu megidere iwu Naịjirịa ma nye onyeisi
ndị uweojii iwu ka e nweghachita ndị ọrụ nchekwa Shaibu dịka osote gọvanọ ruo
oge ọkwa ya ga-agwụ.
Ụlọikpe mkpegharị kwuru na ọ bụ naanị Philip Shaibu ka iwu kwadoro dịka
osote Gọvanọ Edo Steeti.
Ndị uweojii na-achọ onye ogbu mmadụ gbapụrụ n’ụlọ mkpọrọ na Kenya
Ebe foto si, AFP
Ndị uweojii mba Kenya na-achọ otu nwoke aha bụ Collins Jumaisi Khalusha gbara afọ 33 e kwuru na ọ na-egbu mmadụ na mmadụ 12 ndịọzọ gbapụrụ n’ụlọ
mkpọrọ.
Mmadụ 12 ahụ bụ ndị mba Eritrea a wuchiri maka ịnọ na mba Kenya n’ụzọ
iwu na-akwadoghị.
Ndị uweojii wuchiri Collins Jumaisi
Khalusha n’ọnwa Julaị ka o kwuputara na ya gburu ụmụnwaanyị 42 nke gunyere
nwunye ya kemgbe afọ 2022.
Ọkaiwu Khalusha kwuru na ndị uweojii yiri
egwu ka o kweta n’ebubo ahụ.
Ụlọikpe kwuru ka a kpọchie Khalusa na
mkpọrọ dịka nyocha na-aga n’ihu.
Ndị uweojii chọpụtara na Khalusha na mmadụ
12 ndịọzọ ahụ gbapụrụ n’ụlọ mkpọrọ oge ndị uweojii na-eme emume ịgụọnụ.
Ozi BBC wetara kwuru na ndị ahụ gbara ọsọ
chabiri eriri waya e ji rụọ ụlọ mkpọrọ ahụ.
Ndị uweoji agwaala onyeisi NLC bịa zara ọnụ ya maka ebubo iyi ọha egwu
Ebe foto si, @NLCHeadquarters
Ndị uweoji agwaala Joe Ajaero bụ onyeisi otu jịkọrọ ndị ọrụ nNaịjirịa ka ọ bịa zara ọnụ ya maka ebubo ịkwado ndị na-eyi ọha egwu, itisa obod, iso ndị omekome na ihe ndị ọzọ.
Ụlọọrụ ndị uweoji mere ka a mata nke a n’akwụkwọ ọzị Amamu Mu’azu binyere aka bụ nke ha jị akpọ Joe Ajaero ka ọ bịa zara ọnụ ya.
N’akwụkwọ ozi ahụ bụ nke ndị uweoji dere n’abalị Mọnde 19 Ọgọst 2024 ka ha nọ sị Joe Ajaero nọrọ n’ụlọọrụ ha taa n'elekere iri nke ụtụtụ.
Ha kwuru na ọ bụrụ na Ajaero abịaghị n’ụlọọrụ ha, na ha ga-enweta ikike ịnwụchi ya.
Na nzaghachi, otu Jịkọrọ ndị ọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) kwuru na e nwee ihe mere onyeisi ha bụ Joe Ajaero maọbụ onye otu ha n’aka ndị uweoji, na ha ga amalitae abụbọọrụ ozugbo ozugbo.
NLC mere ka amata nke oge ha mechere nzụkọ gbatagbata maka nyocha ndị uweoji kwuru na ha na-eme n’isi onyeisi ha.
NLC sị na abụbọ ọrụ ahụ ga-amalita na-etiti abali ga-efota echi.
N’akwụkwọ ozi osote onyeisi NLC bụ Ado Sani Minijibir binyere aka, “nyocha ndị uweoji a edoghị anya. Ọ dịka aka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị a dị na ya”.
Ha kwuru na “kama ndị uweoji ga-arịọ ebere maka ịwakpọ ụlọọrụ anyị, ndị Uweoji malịtara ịkpagbu anyị”
“Ihe a bụ naanị etu ha sị chọọ imechi ndị ọrụ ọnụ ma mechie ndị isi otu jịkọrọ ndị ọrụ ọnụ”.
“Anyị ga-eje hụ ndị uweoji, zaa oku ha kpọrọ”
Ndị NLC gị ohere ahụ katọọ ebubo niile ndị uweoji boro onyeisi ha ma kọwaa dịka etu ndị mmadụ sị chịọ itisa otu ha.
Ha gwara gọọmenti ka ha kwụsị nyocha ahụ ndị uweoji na-eme.
- Agaghị m enwe ohere bịa taata zaa ọnụ m maka ebubo ahụ - Ajaero
Onyeisi otu jịkọrọ ndị ọrụ (NLC) bụ Joe Ajaero agwaala ndị uweoji na ya ama nwe ohere taata ịbịa zaa ajuju gbasara ebubo ahụ ndị uweoji kwuru na ha na-enyocha.
Joe Ajaero bụ onye gị onye ọka iwu ya bụ Femi Falana were degara onyeisi ndị uweoji akwụkwọ rụtụrụ aka na ya wetere akwụkwọ ọzị ịbịa n’ụlọọrụ ndị uweoji naanị abalị garaaga.
Ọ kwuru na ya agaghi enwe ohere ịbịa n’ụlọ ọrụ ndị uweoji ruo n’ụbọchị Wenesde, Ọgọst 29 bụ oge ya ga-akwado ịza ajuju gbasara ebubo e boro ya.
Ajaero gara n’ihu gwa ndị uweoji ka ha doo ya anya, ma kọwara ya ọfụma ihe niile gbasara ebubo ahụ.
Onyeisiala Bola Tinubu ji ụgbọelu ọhụrụ gaa France - Onanuga
Ebe foto si, @aonanuga1956
Ndị ọchịchị
Naịjirịa ekwuola na ọ bụ ụgbọelu ọhụrụ ka Onyeisiala Bola Tinubu jiri gawa mba
Fransị n’ụbọchị Mọnde.
Onye ndụmọdụ
pụrụiche maka mgbasaozi na atụmatụ ọrụ onyeisiala bụ Bayo Onanuga kwupụtara nke
a n’ozi o bipụtara n’akara ọbaozi X ya n’ụbọchị Mọnde 19 Ọgọst 2024.
Onanuga
kwuru na ụgbọelu ọhụrụ ahụ bụ Airbus A330-200 ga-anọchi anya Boeing B737-700
(BBJ) a zụtara n’oge ọchịchị onyeisiala Naịjirịa pụrụ apụ bụ Olusegun Obasanjo.
Ọ sịrị na
ihe mere e ji gbanwee ụgbọelu nke ochie ahụ bụ n’ihi arụghị ọrụ nke ọma tụmadụ
n’oge e jiri ya mee njem gaa Saudi Arabia.
Dịka o siri
kwuo, a zụtara ụgbọelu ọhụrụ ahụ n’ọnụego dị ezigbo ala dịka ọ ga-ebelata nnukwu
ego Naịjirịa na-emefu iji lekọta nke ọchie anya.
Israel ebutela ozu mmadụ isii e jichiri na Gaza
Ebe foto si, Hostage Families Forum
Ndịagha
kwuru na e butela ozu ndị Izrel isii e ji eji na mpaghara Khan Younis dị na Gaza
n’ụbọchị Mọnde.
Ozi sitere
n’aka ụlọọrụ ndịagha Izrel kwuru na ozu ndị ahụ gụnyere Yagev Buchshtab,
Alexander Dancyg, Avraham Munder, Yoram Metzger, Nadav Popplewell na Haim Perry.
Oge gara
aga ka Izrel kwupụtara na mmadụ ise nwụrụ n’ihi na ha chere na Avraham Munder
ka dị ndụ oge ahụ.
Ọ bụ ndị ọrụ
nchekwa Izrel gụnyere Israel Defence Forces (IDF) na Israel Security Agency
butere ozu mmadụ ndị ahụ.
Ezinaụlọ ndị
ahụ nwụrụ anwụ sịrị na ozu ndị a e butere ga-eme ka obi ruo ha ala.
Ozi ahụ
gara n’ihu kwuo na mkpọghachite mmadụ otu narị na itoli (109) e ji eji na Gaza
bụ nke a ga-enwetazu naanị site na mkparịtaụka ma kpọọ oku ka gọọmenti Izrel
mee ihe niile dị ya n’aka ileba anya n’atụmatụ e chere ya n’ihu ugbua.
N’ụbọchị Mọnde,
onyeisiala Izrel bụ Isaac Herzog kwuru na ya na-ezigara ezinaụlọ mmadụ ndị ahụ
nwụrụ anwụ ozi nkasiobi.
Ọ gara n’ihu
kwuo na “e nweghị ihe ọbụla ga-akwụsị ha ịgba mbọ ndị ha nwere ike ya iji kpọghachite
ụmụafọ Izrel niile e ji eji”.
Akụkọ a na-ndị omekome gbagburu ndị uweojii buru egbe ha bụ ihe a na-anụ kwa mgbe kwa mgbe n’Enugwu Steeti.
Ihe onyonyo vidio na-efegharị na soshal midia gosiri na ọzọ mere na okpuruọchịchị Nkanu West.
Nchọpụta gosiri na mkpa mkpa ahụ mere ụbọchị Sọnde18th Ọgọst 2024 mgbe ndị ojị egbe ahụ wakporo check point ndị uweojii ahụ na Ishi Ozalla were egbe gbagbuo mmadụ atọ na ndị uweojii ahụ.
Ndị nọ na gburu gburu Four Corner ebe ihe ahụ mere, kwuru na ndị ahụ ji egbe gbagburu otu onye uweojii ma gbukwaa mmadụ abụọ ọzọ, gbaa ozu ha ọkụ n’ime ụgbọ ala ndị uweojii dị ebe ahụ.
Onye okwuchite ọnụ ndị uwe ojii n’Enugwu bụ Daniel Ndukwe asabeghị ozi BBC Igbo zigaara ya maka ịchọpụta ka osiri mee.
Abdullahi Ganduje na Hope Uzodinma ekwuola na ha anaghị azọ ọkwa onyeisiala
Ebe foto si, Abdullahi Ganduje/Hope Uzodinma Facebook
Onyeisi otu pati All Progressives Congress (APC) bụ Abdullahi Ganduje na Gọvanọ na-achị Imo Steeti ekwuola na aka ha adịghị n'akụkọ ahụ na-efegharị na ha na-azọ ọkwa onyeisiala na osote onyeisiala Naịjirịa.
Cheta na akwụkwọ poster Abdullahi Ganduje na Hope Uzodinma na-ekwu na ha na-azọ ọkwa onyeisiala na osote onyeisiala pụtara n'izu gara aga.
N'ozi Ganduje wepụtara nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Edwin Olofu binyere aka, kwuru na akwụkwọ poster ahụ bụ aka chịburu Kano Steeti bụ Rabiu Kwankwanso na ndị ọzọ na-ebuso ya agha mepụtara akwụkwọ poster ahụ.
O kwuru na Kwankwanso mere nke a iji tinye nsogbu n'etiti Ganduje na onyeisiala Bola Tinubu.
N'aka nke ọzọ, Gọvanọ Hope Uzodinma kwuru na anya ya adịghị na-ịzọ ọkwa osote onyeisiala Naịjirịa.
Ozi kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Imo Steeti bụ Declan Emelumba wepụtara kwuru na ọ bụ ndị iro gọvanọ Hope Uzodinma chọrọ inweta nsogbu n'etiti ya na onyeisiala Bola Tinubu na-akpa nkata ahụ.
Mmadụ isii na-efu efu oge ụgbọmmiri ha kpuru n’osimiri Italy
Ebe foto si, Reuters
Otu nwoke anwụọla
ebe mmadụ anọ ọzọ ka a na-achọ achọ oge ụgbọmmiri ha ji eme njem kpuru n’osimiri na mpaghara Sicily dị na mba Itali
Ndị ụlọọrụ
na-agbanyụ ọkụ kwuru na mmadụ 22 nọ n’ụgbọmmiri ahụ bụ ndị mba Briten, mba Amerịka
na mba Kanada.
E kwuru na mmadụ 10 bụ ndị ọrụ ụgbọmmiri ahụ ebe mmadụ 12 bụ ndị njem.
Akụkọ kwuru na ụgbọmmiri
ahụ dabara na mmiri na mapaghara Palermo oge ebulimmiri tornado kuru ebe ahụ.
Ndị ọrụ
gbatagbata napụtara mmadụ 15 ihe ahụ metụtara gụnyere otu nwatakiri gbara otu
afọ onye e dugara ụlọọgwụ palermo paediatric hospital. Ndị nke ọzọ a napụtara na-enweta nleta n'ụlọọgwụ.
Ụlọakụ etiti Lybia akwụsịla ọrụ maka otu onyeisi ha a tọọrọ
Ebe foto si, Reuters
Ụlọakụ
etiti Libịa ekwuola na ha akwụsịla ọrụ ha niile maka onye ọrụ ha ọkwa ya dị elu
a tọọrọ n’isi obodo mba ahụ bụ Tripoli.
Ụlọakụ ahụ kwupụtara
n’ụbọchị Sọnde 18 Ọgọst 2024 na a tọọrọ onyeisi ha na-ahụ maka nkanụụzụ
mgbasaozi bụ Musab Msallem.
Ha kwuru na
ndị amaghị ndị ha bụ tọọrọ Msallem n’ụlọ ya n’ụtụtụ Sọnde dịka ha yiri egwu ịtọrọ
ndị ọrụ ụlọakụ ahụ ọzọ.
Ya bụ ụlọakụ
kwuru na ha agaghị amalite ọrụ ruo mgbe a tọhapụrụ Msallem.
Ụlọakụ
etiti Libịa bụ naanị ụlọakụ mbaụwa nabatara maka ịkwụbanye ego mba ahụ retere
na mmanụ agbịdị, nke bụ ụzọ mkpata ego mba ahụ kemgbe afọ iri ehiwere gọọmenti
abụọ na Tripoli na Benghazi.
Ụlọmgbasaozi
AFP kwuru na ọnọdụ a na-abịa dịka ọ gasịrị otu izuụka ndị ojiegbe gbara ụlọakụ
ahụ okirikiri.
AFP sịrị na
ụlọmgbasaozi dị na Libịa kwuru na ndị ojiegbe ahụ wakporo ya bụ ụlọakụ iji
manye onyeisi ha bụ Seddik al-Kabir ka ọ gbaa arụkwaghịm.
Ukraine sị na ha etibiela akwammiri Russia nke abụọ
Yukren
ekwuola na ha etibiela akwammiri nke abụọ dị oke mkpa na Rọshịa dịka ha buuru
agha banye na mpaghara Kursk.
Ndịagha
Yukren wepụtara ihe onyonyoo akwammiri ahụ dị n’elu osimiri Seym River n’ụbọchị
Sọnde 19 Ọgọst 2024.
Ọ bụ site n’akwammiri
ahụ ka Kremlin si ebubata ndịagha ya.
Onyeisi ndịagha
elu Yukren bụ Lt Gen Mykola Oleschuk depụtara n’ọbaozi soshal midịa sị ha “agbariela akwammiri ọzọ”.
Dịka awa
ole na ole gasịrị, Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky kwuru na ebumnobi ndịagha
ya banyere na Kursk bụ ikepụta “ogige nchekwa ogbe” iji kwụsị mwakpo Rọshịa.
Ọ fọdụrụ
obere ka o ruo izuụka abụọ kemgbe Yukren bidoro mwakpo ọjọọ n’okeala Rọshịa
kemgbe Mosko malitere ịwakpo Yukren n’afọ 2022.
Ebe foto si, Telegram
Kọmishọna Anambra Steeti a tọọrọ ya na nwunye enwerela onwe ha
Ebe foto si, APGA INTERACTIVE FORUM/FACEBOOK
Kọmishọna na-ahụ
maka ndị ntorobịa Patrick Aghamba na nwunye ya enwerela onwe ha site n’aka ndị
ntọ tọọrọ ha ụbọchị Fraịde 16 Ọgọst, 2024.
Ndị ji
egbe tọọrọ Patrick Aghamba na nwunye ya ka ha na-aga mmeme agbamakwụkwọ nwa Gọvanọ
Chukwuma Soludo bụ Ifeatu Adaora Soludo e emere n’Abuja ụbọchị Satọde 17 Ọgọst,
2024.
Ozi ọnụ
na-ekwuru Gọvanọ Chukwuma Soludo bụ Christian Aburime gwara BBC Igbo na ndị ahụ
ji egbe tọghapụrụ Patrick na nwunye ya ụbọchị Satọde 17 Ọgọst, 2024.
Cheta na ndị ahụ ji egbe gburu otu onye ọrụ kọmishọna ahụ aha bụ Kpajie Offia.
Ndị uweojii ezigala ndị ọrụ na akụrụngwa iji gbapụta ụmụakwụkwọ a tọọrọ na Benue Steeti
Ebe foto si, Nigeria Police/X
Onyeisi ndị
uweojii Naịjirịa bụ Kayode Egbetokun enyela iwu ka e ziga ndị uweojii na Benue
Steeti iji nyere aka gbapụta ụmụakwụkwọ ahụ ndị ji egbe tọọrọ na Steeti ahụ.
Cheta na ndị ji
egbe tọọrọ ụmụakwụkwọ mahadum University of Maiduguri na mahadum University of
Jos ụbọchị Tozde 15 Ọgọst, 2024 ka ha na-aga ọgbakọ n’Enugu Steeti.
Ozi ọnụ na-ekwuru
ndị uweojii bụ Muyiwa Adejobi wepụtara mere ka a mata na Egbetokun nyere iwu ka
e ziga ndị uweojii nakwa akụrụngwa ọrụ gunyere dronu, ụgbọelu helikọpta na ụgbọala
ndịagha na-aghọ mgbọ iji hụ na-azopụtara ụmụakwụkwọ ahụ.
Ozi ahụ gara n’ihu
rịọ ndị steeti ahụ ka ha nyere ndị uweojii aka ma nye ha ozi ọbụla nwereike ịba
uru n’ọrụ ha.
Egbetokun gara
n’ihu kasie ezịnaụlọ ụmụakwụkwọ ahụ a tọọrọ obi ma kwe nkwa na ndị uweojii
ga-agba mbọ zọpụta ha.
Onye njem na-aga Vietnam anyụọla akpa cocain 88 n’Abuja
Ebe foto si, NDLEA/Facebook
Ụlọọrụ
na-ebu agha megide ire na ịtụ mgbere ọgwụike na Naịjirịa bụ National Drug Law
Enforcement Agency (NDLEA) anwụchiela onye ojiegoachụntaego aha ya bụ Paul Okwy
Mbadugha n’Abụja.
Ndị ọrụ NDLEA
nwụchiri nwaamadị ahụ n’ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe International Airport dị n’Abụja
maka ịda nnwale ọgwụike oge ọ na-achọ ifega Vietnam.
Ọnụ
na-ekwuchitere NDLEA bụ Femi Babafemi kwupụtara nke a n’ozi o bipụtara n’akara ọbaozi
Facebook ụlọọrụ ahụ n’ụbọchị Sọnde 18 Ọgọst 2024.
Ọ sịrị na
ndị ọrụ NDLEA nwụchiri nwaamadị ahụ gbara afọ iri ise na anọ (54) n’ọnụụzọ ọdọụgbọelu
ahụ n’ụbọchị Mọnde 12 Ọgọst 2024 oge ọ na-akwado ifega Vietnam site Doha.
Babafemi
kwuru na Mbadugha nyụrụ akpa ọgwụike cocain iri asatọ na asatọ (88) nke arụ ya
dị 1.710kg oge elebachaara ya anya abalị anọ n’ụlọnga.
Ebe foto si, NDLEA/Facebook
N’ozi ahụ o
wepụtara, Babafemi sịrị na Mbadugha kwuru na ya bụ onye ji ego achụ nta ego na
Legọs. Ọ sịrị na enyi ya nwoke bi na mpaghara Isolo Legọs nyere ya akpa cocain
ndị ahụ o loro maka ibugara ya mmadụ na Vietnam n’ọnụego dọla puku abụọ
($2,000).
A malitela ngagharịiwe na Venezuela n’ihi okwe ntụliakaelu
Ebe foto si, Reuters
Ndị na-akwado
otu na-agba gọọmenti ụkwụ ezukọọla na mpaghara dị iche iche na Venezuela ime ngagharịiwe
maka mmeri Nicolas Maduro nwetara na ntụliaka onyeisiala a haziri n’ọnwa gara
aga.
Onyendu otu
ahụ bụ María Corina Machado sonyeere puku kwuru puku ndị ahụ na-eme ngagharịiwe
n’isi obodo Venezuela bụ Caracas ma gbaa ha ume ka ghara ịtụ egwu.
Nwada Machado,
onye nọ kemgbe na-ezogharị n’ihi ebubo ịkpali ọgbaaghara kwuru na enweghị ihe
karịrị olu ụmụ mmadụ.
E zipụrụ ndị
uweojii na ndịagha n’igwe dịka ndị na-akwado Maazị Maduro hazikwara ngagharịiwe
nke ha.
“Anyị agaghị
apụ n’ogbe,” ka Machado gwara ndị na-eme ngagharịiwe, dịka a hụrụ ka ọtụtụ n’ime
ha na-egfegharị okwe ntụliakaelu e nwetara n’ogige ntụliakaelu dị iche iche iji
gosi na ọ bụ ha nwetara mmeri.
Ọ kpọrọ oku
ka e mee nghagharịiwe gburugburu mba ahụ iji kwanye Maduro ọkụ n’ahụ ịnabata
mmeri.
Ebe foto si, Reuters
Maduro esiela
ọnwụ na ọ bụ ya nwetara mmeri maka oge ọchịchị nke isii mana ndị na-agba ya ụkwụ
wepụtara ndekọ okwe ntụliakaelu na-egosi na ọ bụ onye pati nke ha bụ Edmundo
Gonzalez nwetara ọnụọgụ vootu kachasị.
Ụlọọrụ
na-ahazi ntụliakaelu na Venezuela nke ndị nkwado Maduro nọ n’isi ya ajụla iwepụta
okwe ntụliakaelu ahụ n’uju kama ha kwupụtara na o jiri pasenti iri ise na abụọ
(52%) nweta mmeri.
E meela ụdị
ngagharịiwe ahụ na mba dị iche iche dịka Australia, Spain, United Kingdom,
Canada, Colombia, Mexico na Argentina ebe otu European Union jụrụ ịnabata okwe
ntụliakaelu ahụ.
A gwala ndị njem ka ha lee ma ha aga-agba ọgwụ mgbochi mpox
Ebe foto si, Reuters
Ndị njem
kwesịrị itule ma ha ga-agba ọgwụ mgbochi mpox tupu ha agaa mba ndị nwere ọrịa ahụ
n’Afrịka.
Ụlọọrụ
European Centre for Disease Prevention and Control (ECDC) kwupụtara nke a oge ha
na-ekwu okwu gbasara ntiwapụ ụdịrị ọrịa mpox ọhụrụ n’Afrịka.
ECDC kwuru na
a na-enwe obere ụjọ na ọrịa mpox nwereike fesaa n’ụwa niile n’agbanyeghị na ụlọọrụ
ahụike mbaụwa bụ World Health Organization nọọrọ na nso nso a kwupụta mpox dịka
ọnọdụ gbatagbata na mbaụwa.
Ọrịa ahụ a
maburu dịka monkeypox bụ nke mmadụ nwereike ibute site na mmekọ ahụ.
Ndị omeiwu nta ekwuola ka atọghapụ ụmụakwụkwọ iri abụọ atọọrọ na Benue steeti
Ebe foto si, House of Representatives, Federal Republic of Nigeria
Ụlọomeiwu nta Naịjirịa egosila mwute ha na ntọrọ atọọrọ ndị ụmụakwụkwọ ruru iri abụọ na Benue steeti ebe ha na-aga nzụkọ ụmụakwụkwọ ndị ụka Katolik n'Enugwu.
N'zoi ha wepụtara n'ụbọchị Satode ha kwuru na ozi ntọrọ ụmụakwụkwọ ahụ ebutela oke nchekasị na ụjọ n'ebe niile na Naịjirịa.
Ha kpọkwara oku ka ndị uweojii mee ihe ngwa ngwa iji hụ na atọghapụrụ ụmụakwụkwọ ahụ
"Anyị na-akpọ oku ka ndị ọrụ nchekwa tinye uchu nakwa ngwa niile ha nwere ịhụ na atọghapụrụ ụmụakwụkwọ ahụ n'ihi na mwakpo mere ha pụtara mwakpo ọdịnihu ndị ọrụ ọgwụgwọ na Naịjirịa.
Ha kwukwara ka emee ngwangwa hụ na akpọlatara ụmụakwụkwọ ahụ n'udo na nchekwa.
N'otu aka ahụ onyeisi ndị uweojii bụ Kayode Egbetokun enyela ndị otu ya iwu ka ha wegara ndị uweojii na Benue steeti enyemaka mmadụ na ngwagha na ihe ndị ọzọ ha chọrọ iji hụ na achọtara ụmụakwụkwọ ahụ ma tọghapụ ha n'aka ndị tọrọ ha.
Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Wenzde ka akụkọ gbọwara na atọọrọ ụmụakwụkwọ na-agụ Medicine na Dentistry na Benue steeti.
O mere dịka ha nọ n'ime ụgbọala eme njem ịga nzụkọ ụmụakwụkwọ ahụike ụka katolik na-eme n'Enuugwu steeti.
Mmadụ 12 n'ime ha bụ ndị si Mahadum Jos ebe mmadụ 8 n'ime ha si mahadum Maiduguri.
Ụlọọrụ Nigerian
Petroleum Regulatory and Refining and Transport Agency (NMDPRA) ekwuola na ha
ga-akagbu ikike ọdụ mmanụ ụgbọala ọbụla achọpụtara na ha na-ezo ma ghara
ire mmanụ ụgbọala.
Onyeisi ụlọọrụ NMDPRA bụ Ogbugo Ukoha kwuru nke a n’ozi o wepụtara
n’akara soshal midia X oge ya na ndị ọrụ ya gara nleta a na-atụghị anya n’ogige
ndị na-ere mmanụ ụgbọala n’Abuja.
Cheta na n’izu ole n’ole,
enwela ụkọ mmanụ ụgbọala na steeti ụfọdụ na Naịjirịa gba gburugburu.
Ukoha dọrọ aka na nti
nye ndị ọdụ mmanụ ụgbọala ka ha ghara iresi ndị na-abịa goro mmanụ ụgbọala
ma reesi ya ndị ọzọ n’ọnụego dị elu.
O kwuru na nke a
megidere iwu.
Ndị ji egbe atọrọla kọmishọna na-ahụ maka ndị ntorobịa n’Anambra Steeti
Ebe foto si, APGA Interactive Forum/Facebook
Ndị ji egbe atọrọla kọmishọna na-ahụ maka ndị ntorobịa n'Anambra steeti bụ
Patrick Aghamba, nwunye ya ma gbagbuo otu onye ọrụ kọmishọna ahụ e
kwupụtara aha dịka Kpajie ABK Offiah.
Akụkọ kwuru na njiji ụbọchị Fraịde 16 Ọgọst, 2024 ka kọmishọna ahụ na-aga mmeme agbamakwụkwọ nwa Gọvanọ Chukwuma Soludo bụ Ifeatu Adaora Soludo a na-eme n’Abuja ụbọchị Satọde 17 Ọgọst, 2024.
A na-ekwu na
mkpamkpa ahụ mere na mpaghara Kogi steeti mana odeakwụkwọ Gọvanọ Soludo bụ Christian
Aburime kwuru na gọọmenti Anambra amatabeghị kpọmkwem ebe ọdachi ahụ mere.
Ka ọ dị ugbua, enwebeghị ozi ọbụla ndị uweojii wepụtara maka njiji a.
Ndị dọkita mba India agbaala abụbọ ọrụ maka onye otu ha e gburu
Ebe foto si, Reuters
Ndị dọkita ahụike na mba India agbaala abụbọ ọrụ ma malite ngagharịiwe maka onye otu ha nwaanyị
e dilara n’ike ma gbuo ya na mpaghara Bengal dị n Kolkata.
A chopụtara ozu
nwaanyị e gburu n’ogige ụlọakwụkwọ ọgwụ RG kar medical college n’izu gara aga
ka o kwuru na ọ chọrọ ịge zuo ike ebe ahụ.
Otu jikọrọ ndị ọrụ
ahụike na India bụ Indian Medical Association (IMA), kwuru na ha akwusịla ọrụ n’ụlọọgwụ
niile dị na mba ahụ taa bụ Satọde 17 Ọgọst.
IMA kọwara
ogbugbu ahụ mere n’izu gara aga dịka ihe arụ nke gosiri na e nweghị ezi nchekwa
nye ụmụnwaanyị ma kpọọ oku ka gọọmenti nyere aka hụ maka ezi nchekwa na mba
India.
Ha kwuru na ndị
ọrụ gbatagbata ga-aga n’ihu irụ ọrụ dịka abụbọ ọrụ a na-aga n’ihu.
Onyeisi IMA bụ
R.V Asokan gwara BBC na o teela ndị dọkita ahụike ji eme ngagharịiwe maka ahụhụ
ha na-ata na mba India.
Asokan kwuputara na ha chọrọ ka gọọmenti hibe iwu ga-ahụ maka nchekwa ndị
ọrụ ahụike, itinye ezi nchekwa n’ụlọọgwụ niile ma mee ka ndị ọrụ ahụike nwee ebe
ezumike n’ụlọọgwụ.