Ndị uweojii Naịjirịa akpọọla Joe Ajaero oku ọzọ

Akụkọ niile dị mkpa na mba ụwa niile n'ọnwa Ọgọst 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Jessica Nwankwo, Chinonso Ugorji, Michael Ngene, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Uche Akolisa

  1. NJC enyela iwu ka e nyochaa ọkaikpe 27 nke steeti na gọọmenti etiti Naịjirịa

    Ọkaikpe Olukayode Ariwoola na njirimara otu NJC

    Ebe foto si, National Judicial Council/Website

    Otu ndịọrụ ikpe Naịjirịa bụ National Judicial Council (NJC) ehibela otu kọmiti 4 ga-enyocha ọkaikpe 27 nke gọọmenti etiti na nke steeti maka nrụrụaka.

    Ozi onyeisi ngalaba mgbasaozi NJC bụ Soji Oye wepụtara kwuru na atụmatụ ahụ pụtara ihe n’ọgbakọ ha nwere nke ọkaikpe ukwu Naịjirịa bụ Olukayode Ariwoola nọ n’isi ya.

    Soji Oye kwuru na e nwetara akwụkwọ mkpesa 22 e dere maka ndị ọkaikpe 27 ahụ.

    N’ime akwụkwọ mkpesa 22 ahụ, NJC kwuru na 18 enweghị isi ọbụla.

    Otu NJC gara n’ihu dọọ ọkaipe O. M. Olagunju nke ụlọikpe ukwu Oyo steeti aka na nti banyere ikpe ọ na-ekpe. A gwara ya ka ọ ghara ikpe ikpe na-ezighị ezi.

    NJC kwuru na a na-elebanyere ọkaikpe 5 anya maka ikpe gbara mmiri ha na-ekpe ma kwuo na ha nwereike inweta ntaramahụhụ maọbụrụ na ha agbanweghị.

    Ọgbakọ ahụ bụ nke ikpeazụ ọkaikpe Olukayode Ariwoola ga-anọ n'isi ya dịka ọkaikpe ukwu Naịjirịa tupu ọ naa ezumuike nka.

  2. Ndị ji egbe atọrọla ụmụakwụkwọ mahadum na Benue Steeti

    Nọọsụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uweojii na Benue steeti ekwuola na ndị ji egbe atọrọla ụmụakwụkwọ Mahadum University of Maiduguri na Mahadum University of Jos.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Anene Sewuese Catherine kwuru na mkpakpa ahụ mere ụbọchị Tọzde 15 Ọgọst,2024.

    N'ozi Anene wepụtara, ndị uweojii amaghị ụmụakwụkwọ ole ndị ahụ ji egbe tọọrọ.

    Ka ọ dị ugbua, ndị isi mahadum Univeristy of Jos na ogbo ha na Benue enwepụtabeghị ozi ọbụla banyere ụmụakwụkwọ ahụ a tọọrọ.

    Cheta na nke a abughị oge mbụ ndị ntọr na-atọrọ ụmụakwụkwọ na Naịjirịa.

    N'ọnwa Eprel 2022 ka a tọhapụrụ ụmụakawụkwọ asaa a tọorọ na Mahadum Abia state University.

    Ọnụ na-ekwuchitere mahadum Abia State University, bụ Chijioke Nwogu gwara BBC Igbo na a tọrọ ụmụakwụkwọ ahụ dịka ha si Okigwe alaghachi ụlọakwụkwọ ha n'abalị.

    Nke mere onyeisi mahadum Abia state University bụ Onyemachi Ogbulu machie ụmụakwụkwọ mahadum ahụ ka ha ghara ịga ije abalị.

  3. Ọkụ agbariela ụlọahịa dị na Lagos Island

    Ụlọ ahụ gbara ọkụ

    Ebe foto si, Lagos State Fire Service/X

    Ọkụ gbara ọtụtụ ụlọahịa dị n’ụlọelu ogogo asaa dị n’okpuruọchịchị Lagos Island taa bụ Fraịde 16 Ọgọst, 2024.

    Ozi onyeisi ụlọọrụ na-agbanyụ ọkụ na Legọs bụ Margaret Adeseye wepụtara kwuru na o zigara ndị ọrụ ya si Ebute Elefun na Lekki 1 ngwa ngwa ha nwetara oku maka ọkụ ahụ malitere n’elekere ise nke ụtụtụ.

    Adeseye kwuru na ndị ọrụ ya gbanyụrụ ọkụ mebiri otụtụ ngwa ahịa ọnụego ya ruru ọtụtụ nde naịra.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ihe kpatara ọkụ ahụ bụ ọkụ latrịk gbaliri n’ike. O kwuru na enweghị onye ọbụla nwụrụ maọbụ meruo ahụ n’ọkụ ahụ.

  4. Ihe ndị ị ga-emezu iji nweta ohere ịtụbata ihe oriri n'efu na Naịjirịa

    Ihe oriri dị iche iche

    Ụlọorụ Customs amalitela iwepu ụtụisi n’elu nri ndị a na-ebubata Naịjirịa. Nke a bịara dịka onyeisiala Tinubu manyere iwu iwepu ya bụ ụtụisi n’elu nri iji belata oke agụụ nakwa ọnụ ahịa nri na-arị elu n’ike n’ike. Mana ọ bụghị nri niile ka mwepu ụtụisi a metụtara, ọ bụ naanị ọsikapa ajaja, ọka, mkpụrụ soghum, wit, milet na agwa.

    Ọzọ bụkwa na e nweela ụfọdụ ihe ndị mmadụ ga-enwerịrị iji soro na ndị ga-erite uru na ya.

    Nke mbụ bụ na ụlọọrụ ahụ ga-abụrịrị nke debanyere aha ya na naịjirịa ma bụrụkwa nke nọ n’ọrụ kemgbe ihe ruru afọ ise.

    Ọzọ bụ na ụlọorụ chọrọ ịtụbata osikapa na-acha ajaaja, soghum maọbụ milet ga-egosi na ha nwere igwe e ji afụchasị ihe ruru tọn 100 kwa ụbọchị ebe igwe ahụ ga-abụ nke nọ n’ọrụ ihe ruru afọ anọ. Ụlọorụ ahụ ga-egosikwa na ha nwere ala ugbo zuru oke maka ịkọpụta ha.

    Ụlọọrụ chọrọ ịtụbata ọka, wiit maọbụ agwa ga-abụrịrị ụlọọrụ nwere ala ugbo zuru oke maọbụ ụlọọrụ na-emepụta nri ụmụ anụmanụ.

    Ọ bụ mịnịstrị etiti na-ahụ maka ego ga-ezigara ụlọọrụ customs aha ụlọọrụ ndị mejupụtara ọnọdụ ahụ e nyere nkwado.

    Ụlọọrụ ndị ahụ ga-edobe ihe ndekọ kwesịrị ekwesị maka mgbereahịa ha niile na nchekwa ihe oriri ha ji usoro ndị ahụ tụbata n’ihi na gọọmenti nwereike ịna ya oge ọbụla.

    Ụlọọrụ ọbụla na-edobeghị ihe niile gọọmenti chọrọ ga-atụfu ikikere ha ma kwụghachi ụtụisi niile.

    Ụlọọrụ ọbụla tụgara ngwa nri ọbụla n’ime ndị ahụ mba ọzọ ga-atụfukwa ikikere nke ha.

  5. Mmadụ 11 anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ mere n'Abia

    Ụgbọala kpọkasịrị akpọkasị

    Ebe foto si, FRSC Abia state

    Ngalaba na-ahụ maka nchekwa okporoụzọ ekwuola na ihe ruru mmadụ 11 anwụọla na mberede okporoụzọ mere n'ụzọ ai Porthacourt gawa Enugu.

    N'ozi ụlọọrụ ha nke Abia steeti weputara, ọdachi ahụ mere n'akụkụ Aro Ngwa ma mee n'etiti ụgbọala abụọ otu n'ime ha bụ ụgbọala njem bu mmadụ 19 nakwa gwongworo ukwu.

    Ha kwuru na ụgbọala abụọ a kwakọtara onwe ha ma kwuo na mmadụ iri bụ ndị meruru ahụ nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ ugbua ebe mmadụ itoolu ọzọ nwụrụ ebe ahụ kpọm kwem.

    Mmadụ abụọ ọzọ mechara nwụọ n'ụlọọgwụ ebe ebugara ha ịnata ọgwụgwọ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị nchekwa ụzọ n'Abia steeti bụ Ngozi Ezeoma kwuru na ha chọpụtara na ọ bụ ịgba oke ọsọ butere ya bụ ọdachi.

  6. Gọọmentị steeti ekpebiela mgbe ha ga-esepụ aka n'ego ndị okpuruọchịchị

    Ogbako ndi Govano

    Ebe foto si, X/NGFSecretariat

    Gọọmentị steeti ga-esepuaka n’ihe gbasara ego gọọment okpuruọchịchị n’ọnwa Ọktoba Gọọmenti etiti na gọọmenti steeti enwela nkwekọrịta na gọọmenti okpuruọchịchị ga-ewere onwe ha na ọwa atọ na abịaabịa.

    N’ọwa Ọktoba 2024 ka ha kpebiri na gọọmenti okpuruochichi ga-ewere onwe ha, ka onye gọọmenti steeti ohere ịhazị onwe ha tupuu ha esepu aka na-ego gọọmenti okpuruọchịchị.

    Nke a pụtara na gọọmenti okpuruọchịchị ga-echere ka o ruo ọwa Ọktọba afọọ tupuu ha ebido na-enweta ego ha n’aka gọọmenti etiti.

    Gọvanọ Gombe steeti bụ Inuwa Yahaya kwuru na ihe ndị ọzọ ha kpara gunyere na ọtụtụ steeti emebeghị ntụlịaka; ma kọwaa na ohere ọwa atọ ahụ enyere ha bụ ka enweike ime ya.

    Ọ sị na ha tinyere ọnụ na ọnọdụ ahụike na agụmụakwụkwọ bụ ebe gọọmenti steeti na nke okpuruọchịchị na ejiko aka entinye akwado bụ nke a ga ahazị ka a hara iwe nghọtafe.

    Yahaya kwuru na ya nwere orilanya na steeti ndị na emebeghị ntụlịaka ga-eme ya tupuu nkwekọrịta ahụ adị ire.

    Ndị mara nke ekwe na-akụ n’ọchịchị obodo kwuru na ime ka gọọmenti okpuruọchịchị ga enyere aka gboo ọtụtụ mkpa dị na Naịjirịa maka na ọ bụ gọọmenti maara nsugbu ha nwere n’ime obodo ma bụrụ gọọmenti dị ndị mmadụ nso.

    Mana ọtụtụ kwukwara na ọtụtụ gọọmenti okpuruọchịchị obodo na-emekwa mpụ na nrụrụ aka

  7. Gọọmentị ewepụtakwuola aha ụlọakwụkwọ ndị a ga-ebinye ụmụakwụkwọ ha ego

    Ụmụakwụkwọ

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọorụ Gọọmentị na-ahụ maka ibinye ụmụakwụkwọ ego bụ Nigeria Education Loan Fund (NELFUND) ewepụtakwuola aha ụlọakwụkwọ ndị tozuruoke ka ebinye ha ego.

    Nke a dị n’ozi nke ụlọọrụ NELFUND wepụtara n’akara soshal midia X ha.

    Ha kwuru na aha ndị a si n’ụlọakwụ 22 bụ nke steeti nwe nke mere ka ọnụọgụgụ ụlọakwụkwọ ndị tozurula oke bụrụ 108.

    Nke a na-abị n’ime otu ọnwa Onyeisiala Bola Tinubu wepụtara atụmatụ ibinye ụmụakwụkwọ ego mgbe o tinyere aka n’iwu a kpọrọ ‘Access to Higher Education Act’.

    Iwu ahụ mere ka ehiwela ụlọọrụ NELFUND bụ ndị ọrụ ha bụ ịhụ maka ibinye ụmụakwụkwọ ego.

    Aha ụlọakwụkwọ ndị a gụnyere;

    Ụlọakwụkwọ ndị tozuruoke

    Ebe foto si, NELFUND

    Aha ụlọakwụkwọ ndị tozuruoke

    Ebe foto si, NELFUND

    Aha ụlọakwụkwọ ndị tozuruoke

    Ebe foto si, NELFUND

    Aha ụlọakwụkwọ ndị tozuruoke

    Ebe foto si, NELFUND

  8. Okwu onyeisi ụlọọrụ WHO banyere nfesa ọrịa mpox n’Afrịka

    Tedros Adhanom Ghebreyesus na onye na-arịa ọrịa mpox

    Ebe foto si, Reuters/Getty Images

    Onyeisi ụlọọrụ ahụike mbaụwa bekee kpọrọ World Health Organization bụ Tedros Adhanom Ghebreyesus ekwuola na ọ na-ewute ya etu ọrị Mpox si agbasa n’Afrịka ma kwuo na ọ na-enweta ndụmọdụ iji mara ka ọrịa mpox ọghọọla ihe ọnọdụ gbatagbata.

    N’okwu ya na mbido ọgbakọ kọmiti gbatagbata nke ụlọọrụ WHO, Ghebreyesus kwuru na ọrịa mpox na-efesaa n’ike n’ike na mba DR Kongo na mba gbara ya gburugburu.

    Ghebreyesus kọwara na ‘N’afọ gara aga, ọtụtụ ndị mmadụ butere ọrịa Mpox, n’ime afọ 2024, ndị butegoro ọrịa ahụ eruola 14,000 ebe mmadụ 524 anwụọla.

    O kwuru na nke bụ oge mbụ a na-enwe ọrịa mpox Burundi, Kenya, Rwanda na Uganda..

    Ghebreyesus gbara ama na ụlọọrụ WHO ewepụtala atụmatụ iji belata nfesa ọrịa Mpox ma kwuo na ụlọọrụ WHO ewepụtala otu nde dọla na ụma anọ ebe ha ka chọrọ ego ruru nde dọla iri na ise iji buo agha megide ọrịa mpox.

  9. Lee ihe ụlọọgwụ University College Hospital Ibadan kwuru maka ọnwụ Aduke Gold

    Aduke Ajayi

    Ebe foto si, Aduke Ajayi/Facebook

    Ụlọọgwụ University College Hospital (UCH) Ibadan, ekwuola okwu banyere ọnwụ otiegwu Aduke Ajayi nwụrụ n’ụlọọgwụ ha ụbọchị Mọnde 12 Ọgọst, 2024.

    Onye na-ekwuru ụlọọgwụ UCH bụ Funmilayo Adetuyibi kwuru na ọ bụ eziokwu na Aduke Ajayi nwụrụ n’ụlọọgwụ ha mana ọbụghị eziokwu na ụlọọgwụ ahụ achụghị inye ezinaụlọ ya asambodo ọnwụ ya.

    Cheta na ewere ihe oyonyo fesara na soshal midịa nke na-ekwu na ụlọọgwụ UCH ekweghị ibunyw ezịnaụlọ Aduke ozu ya ka ọ nwụrụ.

    N’okwu Adetuyibi, “Ihe mere bụ na ọ bụ oge a na-eme nyocha iji chọpụta ihe na-arịa Aduke bụ oge ọ nwụrụ, Aduke anwụghị n’ime ward maọbụ n’ime ebe a na-awa ya ahụ”.

    Ọ gara n’ihu kwuo na eweghị dọkịta nọ ebe ahụ ọ nwụrụ iji dee asambodo ọnwụ ya.

    Aduke Gold bụ otiegwu a mụrụ na Ilesha dị n’Osun Steeti.

    Tupu ọ nwụọ, Aduke gụrụ akwụkwọ na mahadum University of Lagos ebe ọ gụrụ maka mmekọ mba na mba ‘International Relations'.

    Oge o bidoro iti egwu, a na-akpọ ya ‘Aduke Penkele’ maka na obughị buru ibu.

  10. Russia ekwuputala ọnọdụ gbatagbata na Belgorod site na mwakpo mba Ukraine

    Ndịagha Ukraine

    Ebe foto si, Reuters

    Gọvanọ mpaghara Belgorod dị na mba Rọshịa bụ Vyacheslav Gladkov ekwupụtala na e nwere ọnọdụ gbatagbata na mpaghara ahụ dịka mwakpo mba Ukraine na-aga n'ihu n'ebe ahụ.

    Vyacheslav Gladkov kwuru na mwakpo ahụ na-eme kwa ụbọchị, emebiela ọtụtụ ụlọ, ụgbọala ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ.

    Ukraine na-ekwu na ha enwerela ọnọdụ n’obodo 74 dị na mpaghara Belgorod dịka mwakpo ahụ banyere n’izu ụka nke abụọ ya.

    Ụfọdụ ndị ihe metụtara kwuru na ha na-ata ahụhụ ebe ụfọdụ kwuru na ụlọ ha anaala site na mwakpo ahụ.

    Ndị ọzọ kwuru na ha na-atụ egwu ikwu okwu maka na ha achọghị ka a chọba ha.

    Mịnịstri na-ahụ maka nchekwa na mbva Rọshịa kwuru na ha gbaturu ogbunigwe 117 mba Ukraine gbara n’ọtụtụ mpagahara Rọshịa.

    Mba Ukraine malitere mwakpo a na-atughị anya na mba Rọshịa ụbọchị 6 Ọgọst, 2024. Mwakpo ahụ bụ nke a na-ahụtubeghị ụdịrị ya kemgbe agha dị n’etiti ha na mba Rọshịa malitere.

    Onyeisila mba Rọshịa bụ Vladimir Putin na-ebo Ukraine ebubo ibu agha megide ndị ọ na-achị ma kwe nkwa imekwara zuru oke.

    Ndịagha

    Ebe foto si, Reuters

  11. Lee ego ole ndị Sịnetọ na-eri dịka ụgwọ ọnwa kpọmkwem - Ụlọọrụ RMAF

    Ndị omeiwu Sịnetị

    Ebe foto si, Nigeria Senate

    Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ịkwụ ndị ọrụ gọọmentị ụgwọ bụ Revenue Mobilization and Fiscal Commission (RMAFC) akọwaala ego ole ndị ụlọomeiwu Sịnetị na-eri n’ụgwọ ọnwa.

    Ụlọọrụ a kwuru na mgbakọta ego ọnwa na nke mgbakwụnye ndị Sịnetọ na-eri pụtara otu nde naịra, puku iri isii na atọ na narị asatọ na iri isii (N1,063,860) kwa ọnwa.

    Na nkesa ego a, ụgwọ ọnwa bụ N168,866, mmanụ ụgbọala N126,650, Ndị enyemaka N42,216, Ndị ọrụ ụlọ N126,650, inwe aṅụrị - N50,660, ụgwọ ọkụ, mmiri na ndị ọzo – N50,660 na ego ndị ọzọ mejupụtara ya otu nde naịra.

    Onyeisi ụlọọrụ a bụ M.B Shehu n’ozi o wepụtara n’ụbọchị Tuzde iji katọọ ebubo onye bụbu Sịnetọ Shehu Sani kwuru na otu Sịnetọ na-eri nde naịra iri na tọ na ụma (N13.3m) kwa ọnwa.

    Shehu kwuru na ụlọọrụ RMAFC enweghi ikike ịmanye ego ole ndị omeiwu ga na-eri dịka ụgwọ ọnwa na ego mgbakwụnye.

    Mana Shehu kwuru na ụfọdụ ego mgbakwụnye na-abịa kwa mgbe ebe ndị ọzọ anaghị abịa kwa mgbe.

    Cheta na Onye bụbu Onyeisiala Naịjirịa Olusegun Obasanjo kwuru na ọ bụ ndị omeiwu na-eji aka ha ekpebi ego ole a na-akwụ ha mana ndị omeiwu gọrọ sị na nke ahụ bụ okpotokpo asị.

  12. Igbo ndị ọma ndewo nụ

    Obioma ka anyị ji anabata unu n'ọgbakọ BBC Igbo taa.

  13. Ọrịa Mpox bụzi ọrịa ọnọdụ gbatagbata n'Afrịka - Ụlọọrụ Africa CDC

    Onye nwere ọrịa Mpox

    Ebe foto si, Reuters

    Ụlọọrụ Afrịca Centre for Disease Control and Prevention (Africa CDC), ekwuola na ọrịa Mpox abụrụla ọrịa ọnọdụ gbatagbata n’Afrịka.

    Nke a bụ mbụ a na-ekwupụta ọrịa Mpox dịka ọrịa ọnọdụ gbatagbata kemgbe e hibere ụlọọrụ Africa CDC n'afọ 2016.

    Otu ahụike mbaụwa bụ World Health Organization kwuru na n’ime mba 26 Mpox gbasara na ya, mba 16 dị n’AfrỊka.

    N mba DR Kongo, mmadụ 13,700 enweela ọrịa Mpox ebe ogbugoro mmadụ 450 kemgbe mbido afọ 2024,

    Ndị nyocha ụlọọrụ Africa CDC kwuru na ọrịa Mpox agbasaala na mba Kenya, Yuganda, Rwanda na Burundi ma kwuo na etụ ọrịa ahụ si agbasa n’Afrịka dị ịtụnanya

    Nkwuputa ụlọọrụ Africa CDC pụtara na e kwesiri ịchọpụta ụzọ iji gbochie mgbasa ọrịa Mpox ma chọpụta ọgwụgwọ ya.

  14. Onyeisiala Bola Tinubu ga-aga Equitorial Guinea na Wenezde

    Onyeisiala Bola Tinubu

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ga-aga njem ọrụ abalị atọ na mba Ekwitorịa Ginii n’ụbọchị Wenezde 14 Ọgọst 2024.

    Oge ọ na-ekwupụta nke a n’ụbọchị Tuzde 13 Ọgọst 2024, ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala bụ Ajuri Ngelale sịrị na Tinubu ga-ahapụ Naịjirịa gawa isi obodo Ekwitorịa Ginii bụ Malabọ.

    Ngelale kwuru na njem ahụ bụ n’ihi oku onyeisiala mba Ekwitorịa Ginii bụ Teodoro Obiang Nguema Mbasogo kpọrọ Tinubu.

    O kwuru na Tinubu ga-eji ohere ahụ kechikwuo mmekọrịta dị n’etiti Naịjirịa na Ekwitorịa Ginii.

  15. Onyeisiala Tinubu ewepụtala atụmatụ ga-egbochi ndị ọrụ ahụike ịgbaga mba ọzọ

    Onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu

    Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook

    Onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu ewpụtala atụmatụ ‘National Policy on Health Workforce Migration’ ga-eweta ezi mgbawe n’ọnọdụ ndị dọkịta na ndị ọrụ ahụike na Naịjirịa.

    Mịnịsta na-ahụ maka ahụike na Naịjirịa bụ Muhammed Ali Pate kwupụtara nke a n’ozi o wepụtara n’akara soshal micia X.

    O kwuru na iwu National Policy on Health Workforce Migration bụ atụmatụ gọọmenti ga-egbochi oke ọpụpụ ndị ọrụ ahụike na-apụ na Naịjirịa gawa mba ọzọ iji nweta ezi ọnọdụ ọrụ.

    Muhammed gara n’ihu kwuo na iwu ahụ ga-ahazi usoro ọrụ ndị ọrụ ahụike, chịkọba ha, mee ka ndị ọrụ ahụike nweta ezi ọzụzụ, nleta ma hụ na a na-akwụ ndị ọrụ ahụike ụgwọ kwesiri ha.

    N’aka nke ọzọ, atụmatụ National Policy on Health Workforce Migration ga-eme ka ndị mmadụ nweta ezi nleta n’ụlọ ahụike ọbụla ha gara.

  16. N’ihi ebubo ịgba mgba okpuru: A kpọgaala mmadụ 76 fere ọkọlọtọ Russia n’isi ụlọorụ ndị uweojii

    Ndị ngagharịiwe na-efe ọkọlọtọ Rọshịa

    Ndị uweojii Kano atụgaala mmadụ iri asaa na isii (76) a na-enyo enyo tinyere ndị ọbịa si mba ndị ọzọ n’isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Abụja maka nnyocha miri emi n’ihi ebubo ịgba gọọmenti Naịjirịa mgba okpuru.

    E kwuru na ndị ahụ a na-enyo enyo bụ ndị a nwụchiri maka ife ọkọlọtọ mba Rọshịa oge ngagharịiwe e mere na Naịjirịa na nso nso a maka agụụ na ihe isiike.

    Oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n’ụbọchị Mọnde, kọmịshọna ndị uweojii Kano bụ Salman Garba kwuru okwu gbasara nnyocha na-aga n’ihu nakwa nnwuchi ndị e merela maka ndị butere ọgbaaghara oge ngagharịiwe ahụ.

    O kwuru na dịka ha na-agba mbọ igbochi ya bụ ọgbaaghara, ha nwụchiri mmadụ narị asatọ na iri asaa na atọ (873) a na-enyo enyo ma napụtakwa ha ihe akaebe dị iche iche.

    Dịka Garba siri kwuo, enyefeela mmadụ iri asaa na isii (76) ndị na-efe ọkọlọtọ Rọshịa a nwụchiri oge ngagharịiwe ahụ n’aka ndị uweojii dị n’Abụja maka ime ha nnyocha.

    O kwukwara na ha akpọfeela onye ọbịa si mba ọzọ a na-enyo enyo n’isi ụlọorụ ndị uweojii dị n’Abụja n’ihi ebubo ịgba gọọmenti Naịjirịa mgba okpuru.

    Ndị ngagharịiwe na-efe ọkọlọtọ Rọshịa

    Ebe foto si, Saadu Labin Gusau

    Kọmịshọna ahụ kpuhere na a nwụchiela mmadụ otu narị na iri ise (150) ma na-ekpe ha ikpe maka ibibi iwu mgbachi obodo gọọmenti Kano tinyere n’oge ngagharịiwe ma nwụchiekwa madụ isii maka itinye aka na mbibi, ịmụnye ọkụ nakwa izu ohi n’ụlọọrụ Kano Printing Press.

  17. Ndị ọkachamara na-akwado ikwupụta ntiwapụ ọrịa mpox n’Africa

    Onye nwere ọrịa mpox

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị ọkachamara sayensi n’Afrịka na-akwado ikwupụta ọnọdụ gbatagbata n’ihi ụjọ maka mfesa ọrịa mpox na mba ahụ dịka a chọpụtara ụdị nke ọhụrụ ya na-afesa ngwangwa.

    A tụrụ anya na ndị ọkachamara ga-ekwupụta ọnọdụ gbatagbata gbasara ọrịa ahụ n’ụbọchị Tuzde 13 Ọgọst 2024.

    Ọrịa mpox ji ọkụ ọkụ na-efesa n’afọ a kemgbe a chọpụtara onye mbụ butere ya na mba Democratic Republic of Congo.

    Ndị ọrụ nke African Centres for Disease Control and Prevention ka a tụrụ anya iwepụta ozi ịdọ aka na ntị n’ụzọ ọrịa ahụ pụrụ isi fesaa ọ bụrụ ma agbasoghị ụkpụrụ mgbochi ndị kwesịrị ekwesị.

    Ọ tụrụ ndị dọkịta n’anya etu ụdị ọrịa mpox ahụ si efesa ngwangwa.

    Ọrịa ahụ na-efesa site na mmekọ ahụ mmadụ na ibe ya ebe njirimara ya dị ka nke onye nwere oyi ewezuga na nke mpox dị njọ karịa.

    Na mba Democratic Republic of Congo ebe ọrịa ahụ kachasị njọ, mmadụ puku iri abụọ na asaa (27,000) ebutela ya n’afọ 2024 ebe ihe karịrị mmadụ otu puku (1,000) n’ime ha nwụrụla.

    Ya bụ ọrịa efesaala ruo na mba Kenya, Rụwanda, Burundi na Central African Republic.

    A tụrụ anya na ikwupụta ntiwapụ ọrịa mpox ga-enyere gọọmenti aka ime atụmatụ ọdụrụkụọ iji gbochie mfesa ọrịa ahụ ma kwalite ohere ndị mmadụ nwere inweta enyemaaka ndị ọrụ ahụike na mba ndị a hụtara ya.

    Ogige ahụike ndị anọghị n’Afrịka ga-atụle ka ọnọdụ ahụ ga-esi gaa iji mara ihe ga-eme n’ọdịnịihu.

  18. Mba Ukraine ekwuola na ha akpachiela okeala ruru 1,000 sq Km na mba Russia

    A gawala ndị bi na mpaghara Kursk ka ha zoo n'ụlọ nchekwa dị n'okpuruala ma gwaa ndị ọzọ kwakọrọ pụọ

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisi ndịagha mba Ukraine ekwuola na ndịagha ha akpachiela okeala ruru 1000 sqKm na mba Russia dịka ha na-aga n’ihu n’ịwakpo mba ahụ nke kachasị kamgbe agha ha malitere n’afọ abụọ.

    Ọchịagha Oleksandr Syrskyi kwuru na Ukraine ga-agakwa n’ihu na “mwakpo ha na-eme na mpaghara Kursk” kamgbe otu izuụka.

    Onyeisiala mba Ukraine bụ Volodymyr Zelensky kwuru na mba Russia bu agha zute ndị ọzọ mana ugbua na ihe ha zubere ndị ọzọ emewela ha.

    Mana Onyeisiala mba Russia bụ Vladimir Putin kwuru na mwakpo bụ mkpasu oke iwe nye ma gwaa ndịagha ya ka ha “chụpụ ndị iro batara n’obodo ha”.

    A kpọpụla ọtụtụ ọnụọgụgụ ndị mmadụ site na mpaghara ndịda anyanwụ mba Russia maka nchekwa ha dịka a gwara mmadụ 59,000 ka ha pụọ.

    Maapụ na-ego ebe ndịagha Ukraine wakporola

    Gọvanọ mpaghara ahụ kwuru na obodo 28 adaala ma bụrụ ebe ndịagha Ukraine kpachiri, na e gbuola mmadụ nkịtị 12, nd ọnọdụ ahụ siri ike.

    Ndịagha Ukraine malitere mwakpo ha n’ụbọchị Tuzde dịka ha njiri ogogo 30km banyekwuo na mba Russia.

    Mwakpo a emeela na obi sie ndị mba Ukraine ike mana ndị ọkachamara kwuru na ọ bụ ihe ga-adị egwu nye mba Ukraine.

  19. Igbo ndị ọma ụtụtụ ọma nụ oooo!

    Anyị na-asị ka ụbọchị taa maara gị na mma.

    Nnọọ n'ọgbakọ anyị taa dịka ị na-esonyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

  20. Anyị nwereike ịkwụsị ụgbọelu si mba UK ịbata Naịjirịa – Festus Keyamo

    Festus Keyamo

    Ebe foto si, Festus Keyamo/Instagram

    Minịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naịjirịa bụ Festus Keyamo ekwuola na Naịjirịa nwereike ịkwụsị ụgbọelu si mba UK ịbata Naịjirịa maọbụrụ na mba UK enyeghị ụlọọrụ ụgbọelu ‘Air Peace’ ogige nke ya n’ọdọ ụgbọelu Heathrow dị na London.

    Keyamo kwuru na ọ dịmma ka mba UK nye Air Peace ogige ahụ maka na ụlọọrụ ụgbọelu British Airways na Virgin Atlantic nwere ogige nke ha n’ọdọ ụgbọelu dị na Lagos na Abuja.

    Cheta na Festus Keyamo degaara ode akwụkwọ ụlọọrụ na-ahụ maka njem akwụkwọ mkpesa ụbọchị Tozde 1 Ọgọst, 2024 banyere okwu ahụ.

    Keyamo kwuru na Naịjirịa agaghị anabata mkpagbu ọbụla nye ụlọọrụ ụgbọelu ya ọbụla.