Ndị uweojii Naịjirịa akpọọla Joe Ajaero oku ọzọ

Akụkọ niile dị mkpa na mba ụwa niile n'ọnwa Ọgọst 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Jessica Nwankwo, Chinonso Ugorji, Michael Ngene, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Uche Akolisa

  1. BBC agwaala Huw Edward weghachịta ụgwọọnwa £200,000 a kwụrụ ya kemgbe ọnwa anọ

    Huw Edward

    Ebe foto si, Getty Images

    Huw Edward ka BBC gwara weghachịta ụgwọọnwa a kwụrụ ya kemgbe anwụchiri ya n’ọnwa Novemba maka imetọ ụmụaka.

    Edward bụbu onye na-agụrụ BBC akụkọ n'onyonyoo ma soro na ndị a na-akwụ nnukwu ụgwọọnwa.

    N'akịwụkwọ o zigara ndị ọrụ, onyeisioche BBC bụ Samir Shah kwuru na Edward na-anara ụgwọọnwa ya ruo ọnwa ise kemgbe anwụchiri ya na Nọvemba.

    A chụpụrụ Edward n’ọrụ n’ọnwa Julaị mana a nwụchiri ya n’ọnwa anọ n’afọ gara aga. O deghị akwụkwọ arụkwaghịm rụọ n’ọnwa Eprel.

    Shah kwuru na Edward biri ndụ ihu abụọ, dịka onye na-agụ akụkọ n’onyonyoo a hụrụ n'anya, mana ọ na-ebi ajọ ndụ gbawara ndị mmadụ obi.

    Edward kwetere n’ụlọikpe na ikpe mara ya n’ebubo atọ e boro ya nke gụnyere inwe foto ụmụaka na ezighị ezi.

    A sị na ọ dara ịwụ ahụ n'afọ 2020 na 2022 ma kwukwaa na ọ bụ foto ọnụọgụgụ ya dị 37 bụ nke e kesara na soshal midịa Whatspp dịka ndị uweojii Metropolitan sị kwụọ.

    BBC e kwubeghị ma ha a ga-akpụpụ Edward ụlọikpe ma ọ bụrụ na ọ kwụghachịtaghị ego ụgwọọnwa ahụ.

  2. Ndị ojiegbe egbuola mmadụ karịrị 30 na Benue

    Gọvanọ Hyacinth Alia

    Ebe foto si, @HyacinthAlia

    Aka na-achị Benue steeti bụ Rev Fr Hyacinth Iormem Alia akasiela ezinaụlọ ndị e gburu oge ndị ojiegbe mere mwakpo na steeti ahụ obi ma katọọ ya bụ ajọ akparamaagwa.

    Alia kwupụtara nke ahụ site n’ozi onye enyemaaka mgbasaozi ya bụ Tersoo Kula tinyere aka na ya.

    Ozi ahụ kwuru na “Gọvanọ Alia na-egosipụta nnukwu iwe na ọnụma n’ihi mwakpo e mere n’obodo Ayati dị n’Okpuru ọchịchị Ukum nke steeti ahụ bụ ebe a nọọrọ gbuo ọtụtụ mmadụ”.

    “Gọvanọ Alia na-akatọ ya n’ebe ọ dị ukwuu bụ mwakpo ndị ojiegbe mere ụmụafọ Benue na-ejighị egbe maọbụ mma, ma na-egosi ụjọ na omume ọjọọ ahụ ka na-agakwa n’ihu na-agbanyeghị igwe ndị ọrụ nchekwa na mkparịtaụka gọọmenti na ndị ọnụ na-eru n’okwu na-enwe iji hụ na udo lọghachiri na Sankera,” ka ozi ahụ kwuru.

    Alia kwuru na ọchịchị ya ga-aga n’ihu were ụkpụrụ niile nke iwu kwadoro na-echekwa ụmụafọ Benue tụmadị ndị bi na mpaghara Ukum.

    Cheta na ndị ojiegbe wakporo obodo Ayati dị n’Okpuru ọchịchị Ukum nke Benue steeti ma gbuo ihe karịrị mmadụ iri atọ (30) n’ụbọchị Tọzde 8 Ọgọst 2024.

  3. Enweghị N570bn ọbụla gọọmenti etiti nyere steeti maka ịkwụsị oke agụụ – Gọvanọ Seyi Makinde

    Gọvanọ Seyi Makinde

    Ebe foto si, Seyi Makinde/X

    Gọvanọ Oyo steeti Seyi Makinde agọọla na Gọọmenti etiti kesere N570bn nye steeti ka ha were gbochie agụụ.

    Ego ahụ bụ nke onyeisiala, Bola Tinubu kwuru na ya nyere steeti dị icheiche na Naịjirịa mgbe ọ na agwa Naịjirịa okwu ka ụmụntọrọbịa maritere ime ngagharịiwe maka oke agụụ na ihe ụkọ.

    Na Okwu Tinubu, gọọmenti etiti nyere steeti N570bn ka ha nwere kwadoo ezinaulo na steeti ha ma kwụsị oke agụụ.

    Mana oge Makinde na-asa onye gbara ya ajuju gbasara ego ahụ ma gbokwa ya ebubo na ọ bụ ndị Gọvanọ mere ihe ji esiri ụmụ Naịjirịa ike; Makinde gọrọ agụgọ ma sị na-enweghị udiri ego ahụ gọọmenti etiti nyere steeti ya.

    Gọvanọ Seyi Makinde

    Ebe foto si, Seyi Makinde/X

    Ka Seyi na-akọwa ihe mere na shoshal media X ya, ọ sị “Gọọmenti steeti enyeghị steeti ego ọ bụla”.

    Ọ kọwara na ego ha wetere bụ ego mgbazinye sị na ụlọakụ mbaụwa bụ ego ha ga-akwụghachịazụ.

    “E nwetere m N5.98bn na mbụ ma nwete N822milion na nke abụọ”. Seyi kwuru na ya gi ego ahụ tinye na ngaraba atọ gbasara ọrụ ugbo na ihe ha kpọrọ NG-CARES bụ nke ha ji ahazị ma na akwado ndị ọrụ ugbo.

  4. A chọtala ozu ‘nwoke-nwaanyị’ a maara dịka Abuja Area Mama

    Abuja Area Mama

    Ebe foto si, @area_mama_of_abuja

    Ndị uweojii Naịjirịa amalitela ime nnyocha gbasara ọnwụ otu nwaokorobịa na-eyi akwa nwaanyị a maara dịka “Abuja Area Mama”.

    Akụkọ kwuru na a chọtara ozu nwaokorobịa ahụ gbara afọ iri atọ na atọ (33) n’isi obodo Naịjirịa bụ Abụja n’ụbọchị Tọzde 8 Ọgọst 2024.

    Abuja Area Mama nwere ọtụtụ ndị na-eso ya n’akara ọbaozi soshal midịa bụ ebe ọ na-ebipụta ozi gbasara ị bụ nwoke-nwaanyị nakwa ndụ ya dịka “onye ahịa rod”.

    E nweghị onye maara aha ya kama ọ na-akọwa onwe ya oge ụfọdụ dịka Ifeanyi.

    Abuja Area Mama

    Ebe foto si, @area_mama_of_abuja

    N’ozi ikpeazụ o bipụtara n’akara ọbaozi Instagram ya n’ụbọchị Wenezde 7 Ọgọst 2024, Abuja Area Mama kwuru na ya na-akwado ịga hụ enyi ya nwoke.

    Mana dịka ọtụtụ awa gasịrị, a chọtara ozu ya n’okporoụzọ siri Katampe gawa Mabushi nke dị na mpaghara Banex Wuse II Abụja.

    Ndị uweojii kwuru na ha wụchiri ebe ahụ ya bụ njinji jiri n’ụtụtụ Tọzde ma chọpụta na onye ahụ e gburu egbu bụ nwoke jiri ejiji nwaanyị.

    Ka osinadị, kọmịshọna ndị uweojii Abụja bụ Benneth Igwe enyela iwu ka e mee nnyocha miri emi iji chọpụta ihe butere ọnwụ ya.

  5. A họpụtala onyeisioche APGA ọhụrụ n’Anambra Steeti.

    Ikechukwu Ejesieme

    Ebe foto si, Eneh Victor Chigozie/Facebook

    Onyeisioche otu All Progressive Grand Alliance (APGA) bụ Edozie Njoku ahọpụtala Ikechukwu Ejesieme dịka onyeisioche pati APGA n’Anambra Steeti na Sam Nwogbo dịka odeakwụkwọ pati APGA na steeti ahụ.

    Ejesieme bụ onye Agulu dị n’okpuruọchịchị Anaocha ka a na-ele ka onweta ezi nhazi n’otu APGA dịka a na-akwado ime ntụliaka okpuruọchịochị n’Anambra steeti.

    Mana BBC Igbo gbara onye bụbu odeakwụkwọ pati APGA bụ Tex Okechukwu ajụjụ ọnụ, ọ kọwara na enwere esemokwu dị na pati ahụ.

    N’okwu ya “Onye anyị họpụtara dịka onyeisioche pati APGA n’ọgbakọ kongress anyị mere n’ọnwa Mee 2024 bụ Sly Ezeokenwa, ọ bụghị Edozie Njoku’.

    ‘Anyị amaghị ihe o ji bụrụ Edozie Njoku ka otu INEC na-ahụta dịka onyeisioche APGA’, ka o kwuru.

  6. Chidinma Adetshina ewepụla onwe ya n’ịmaaka Miss South Africa

    Chidinma Adetshina

    Ebe foto si, @chichi_vanessa/Instagram

    Onye na-azọ ọkwa ọkachamma mba Saụt Afrịka bụ Chidinma Adetshina ewepụla onwe ya n’ihe omume ahụ dịka nnyocha ụlọorụ na-ahụ maka ihe na-eme na mba ahụ chọpụtara na e nwere ihe akaebe na-egosi na nne ya mere nrụrụaka ma zuru njirimara onye ọzọ mgbe ọ na-edebanye aha ya oge a mụrụ ya.

    Chidinma nwere ihe mkpọbiụkwụ gbasara ntozuoke ya isonye n’ihe omume ahụ n’ihi ụfọdụ ajụjụ a na-ajụ gbasara mba o si.

    Ọ bụ ajụjụ ndị ahụ mere ndị na-ahazi ihe omume Miss South Africa ji kpọtụrụ ụlọọrụ na-ahụ maka ihe na-eme na Saụt Afrịka ka ha nyochaa okwu ahụ.

    Chidinma Adetshina

    Ebe foto si, @chichi_vanessa/Instagram

    Chidinma depụtara n’akara ọbaozi Instagram ya sị na “e nweela m mkpebi tara ezigbo akpụ iwezuga onwe m n’ihe omume a maka nchekwa nke mụ na ezinaụlọ m.”

    Cheta na Chidinma depụtara ozi n’abalị 8 Ọgọst 2024 kwuo na isonye n’ịmaaka Miss South Africa bụ ezigbo ihe ọma meere ya.

    O kwuru na ndị mmadụ kwadoro ya oge ọ malitere njem ahụ mana mkpebi iwezuga onwe ya n’ịmaaka ahụ bụ nke o kwesịrị inwe.

  7. Eduola Yunus dị afọ 84 n’ịyị ọrụ dịka Praịm Mịnịsta nchereoge Bangladesh

    Muhammad Yunus

    Ode akwụkwọ amaama bụ Muhammad Yunus ka dị afọ 84 ka e duru n’ịyị ọlụ dịka praịm Mịnịsta nchereoge na mba Bangladesh. Oge ọ sị mba France lọta na Dhaka bụ ịsị obodo Bangladesh, ọ kwụru na enwere ọtụtụ e kwesiri ịlụ. Yunus were ọchịchị ka nwanyị chịbulu mba ahụ bụ Sheikh Hasina gbapụrụ ma gbalaga na Delhi dị na mba India oge ụmụntorobia na-eme ngagharịiwe nwakporo obi gọọmenti. Sheikh Hasina jị aka ike nwere chịa mba ahụ n’ime afọ ịrị na ise ọchịrị ha. Hasina pụrụ n’oche ka ngagharịiwe ahụ bụ nke ụmụakwụkwọ malitere bụ nke ọtụtụ mmadụ nwụrụ n’aka ndị ọrụnchekwa. Ụmụakwụkwọ ahụ sị na ha achọghị onye agha ị banye n’ọkwa dịka Praịm Mịnịsta ma kwadọ Yunus Muhammad ịbụ onye ndu.

  8. A tụọla onye mba Briten nga maka ịkwaso nkịta iko

    Adam Britton

    Ebe foto si, ABC News

    Adam Britton bụ onye Britain amaama na-akpakọ agụịyị ka a tụrụ mkpọrọ afọ ịrị n’Austalia maka ịkwasọ nkịta iko.

    Adam Britton dị afọ ịrị ise na ịsịị gwara ụlọikpe na ya mere ihe ahụ.

    Adam Britton na-arụbụrụ ndị BBC na ihe onyonyo National Geographic kwetara na ya dara iwu imeto anụmanụ na imeso ihe ike.

    Britton kwetekwara na ya dara iwu iwe foto na onyoonyo imeto ụmụaka.

    Ụlọikpe dị elu n’Australia ka e nwetara okwu ahụ oge Britton jị aka ya see foto oge ọ na eti ọtụtụ anụmanụ ihe rụọ na ha anwụọ maka mee ihe onyonyo ya.

    Ọ na-eme ihe ahụ ọtụtụ afọ garaaga mana mmadụ achọpụtaghị ruo oge e ji ihe onyoonyo ọtụtụ nwere chọpụta ihe ọ na-eme na nzuzo. Awuchiri ya n’ọnwa Eprelu afọ 2022.

    Ndị ọlụnchekwa gara na be ya dị na Darwin nwere hụ ọtụtụ ihe onyoonyo na foto ụmụaka e metoro.

    Ọkaikpe turu Adam Britton nga kwuru na ihe ọ mere dị njọ na-ekwesighi ime ka ọha mmadụ hụ onyoonyo ya.

    Ka ọkaikpe na-agụpụta ihe britton mere, ọtụtụ ndị mmadụ bewere akwa, ndị ọzọ a na-akpọrị ya, ebe ọtụtụ hapụrụ ụlọikpe makana ha achọghịzị iji ntị ha nụọ ihe o mere.

  9. Chidinma Adetshina a bụ onye Saụt Afrịka eziokwu? Lee ihe ụlọọrụ mba ahụ kwuru

    Nwaada ahụ bụ Chidinma

    Ebe foto si, CHICHI VANESSA/IG

    Ngalaba na-ahụ maka ime obodo mba Saụt Afrịka ekwuputala mpụtara nyocha ha mere banyere ebe Chidinma Adetshina na-azọ Miss South Africa si.

    Chidinma malitere iwu mgbe ọtụtụ ndị mmadụ na-akpọ oku ka ewepu ya n'asọmpị ahụ n'ihi na ọ bụghị onye mba ahụ.

    Nwaada ahụ nke nna ya bụ onye Naịjirịa ebe nne ya bụ onye Mozambique mana a mụrụ ya na Saụt Afrịka.

    O so na ụmụada iri ga-azọ ọkwa n'asọmpị ahụ a ga-eme na Pretoria n'ụbọchị Satode na-abịa.

    Ngalaba ahụ ekwuola na ndị haziri asọmpị ahụ ziteere ha ozi ịchọpụta ebe Chidinma si n'ezie nke Chidinma nakwa nne ya binyere aka iji gosi na ha kwetara.

    Ngalaba ahụ kwuru na nyocha ha mere gosiri na

    • - N'ihu okwu, e nwere akaebe gosiri na onye akpọrọ nne Chidinma mere mpụ njirimara onye.
    • - Adetshina esoghi kpa nkata maọbụ soro na ya bụ mpụ n'ihi na ọ bụ nwata mgbe o mere n'afọ 2001.
    • - Otu nne nwaanyị onye mba Saụt Afrịka nke mpụ ahụ metụtara ataala ahụhụ maka na o nweghi ike ịdebanye aha nwa ya.
    • - Ngalaba ahụ amalitela nyocha zuruoke ịchọpụta ndị ọrụ ha aka ha dị na mpụ ahụ ma na-ege ntị ịnụrụ ihe iwu kwuru maka etu mpụ a sị metụta ọnọdụ Chidinma dịka onye si mba ahụ.
    • -Nyocha ahụ bịa na njedebe, ngalaba ahụ ga-aga n'ihu kpụpụ ndị niile a rụtụrụ aka na ha so kpa nkata mpụ ahụ ụlọikpe.
  10. Etu anwụrụ igwe Generator si kpochapụ mmadụ anọ n'otu ezinaụlọ n'Abia

    Igwe ndị mmadụ ji enweta ọkụ latrik bụ Generator na Bekee

    Ebe foto si, Getty Images

    Akụkọ si Abia steeti apụta ugbua na-ekwu na otu ezinaụlọ anwụọla n'ihe echeere bụ anwụrụ igwe Generator gburu ha.

    Ndị nwụrụ n'ọdachi ahụ gụnyere Nne, ụmụ ya abụọ nakwa nwanne di nwaanyị ahụ n'ọdachi ahụ mere n'okpuruọchịchị Ukwa West dị na steeti ahụ.

    Maureen Chinaka bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na nke a bụ eziokwu.

    O kwuru na eburula ozu mmadụ anọ gawa n'ụlọ nchekwa ozu dịka nyocha banyere ihe mere n'ezie na-aga n'ihu.

    Mana di nwaanyị ahụ anwụghị na ihe ahụ mere dịka akụkọ kwuru na ọ nọghị n'ụlọ ya mgbe ihe mere mere.

  11. Mba Niger achabiela mmekọ niile n'etiti ha na Yukren

    Ochichi ndi agha di na mba Niger kemgbe e weghaara ochichi n'ike

    Ebe foto si, AFP

    Mba Niger ekwuola na ha achabiela mmekọ niile n'etiti ha na mba Yukren.

    ọnụ na-ekwuru gọọmentị ndị agha mba ahụ bụ Amadou Abdramane boro gọọmentị mba Yukren ebubo ikwado otu ndị na-eyi ndụ egwu.

    N'ime nke a, ha sooro nzọmụkwụ mba Mali kwuputara otu nchabi a dịka ha boro Yukren ebubo ịnyere ndị ilo ha aka egbu ọtụtụ ndị agha na mba ahụ n'ọnwa gara aga.

    Mana Kyiv bụ oche gọọmentị mba Yukren apụtabeghi kwuo hoo haa na aka ha dị na mwakpo ndị agha Abzinawa bụ ebe e gburu ụfọdụ ndị agha Rọshịa.

    Niger, Mali na Bọkịna Faso bụ ndị niile nwere ọchịchị ndị agha na mba Rọshịa ejikọsiela aka ike dịka ha na-alụso ndị agha Jihad ọgụ.

  12. Ali Ndume arịọla APC mgbaghara dịka ọ katọchara gọọmenti Onyeisiala Tinubu

    Abdullahi Ganduje, Ali Ndume na ndị pati APC

    Ebe foto si, @OfficialAPCNg/X

    Sịnetọ na-anọchite anya Borno South n’ụlọomeiwu Naịjirịa bụ Ali Ndume arịọla ọchịchị All Progressives Congress (APC) mgbaghara maka ebughị ụzọ kpọtụrụ otu ahụ tupụ ya apụta n’ihu ọhanaeze boo Onyeisiala Tinubu ebubo amaghị ọchịchị.

    Ndume, onye bụbu omeiwu na-ahụ maka ime ihe n’ezi usoro n’ụlọomeiwu kwuru nke a oge ya na onyeisioche APC bụ Abdullahi Ganduje nwechara nzukọ n’isi ụlọọrụ otu ahụ dị n’Abụja.

    Ọ sịrị na ya na-eguzosiike n’okwu ya dịka ebumnobi ya oge niile bụ ọdịmma nke Naịjirịa.

    Cheta na e wezugara Ndume ma were Sịnetọ Mohammed Monguno dochie anya ya site na leta pati APC dere iji taa onye omeiwu ahụ ahụhụ maka okwu o kwuru megide Onyeisiala.

    Ndume nọọrọ n’oge BBC Hausa na-agba ya ajụjụ kwuo na “ikikere ọjọọ” dị n’obi ọchịchị Naịjirịa akpachiela Onyeisiala dịka ha na-agwa ya okwu ụgha ma na-ekpuchite ya n’aka ndị Naịjirịa pụrụ ịgwa ya eziokwu.

    Okwu nkatọ ahụ mere ka a napụ ya ọkwa ukwu o ji n’ụlọomeiwu tinyekwara onyeisioche kọmitii ụlọomeiwu.

  13. A tụọla ụmụnwoke atọ nga maka ọgbaaghara Southport

    Ọgbaaghara Southport

    A tụọla Derek Drummond nga afọ atọ maka isonye n’ọgbaaghara Southport. Ọ bụ ya bụ onye nke mbụ a na-atụ nga kemgbe nsogbu ahụ malitere. A tụkwara ya nga ọnwa abụọ maka iti onye uweojii ọkpọ.

    N’otu aka ahụ, a tụọla Declan Geiran nga ọnwa iri atọ maka ọgbaaghara na ịmụnye ụgbọala ndị uweojii ọkụ na Liverpool tinyekwara nga ọnwa abụọ maka ifesa ozi ụgha.

    Liam Riley ka a tụrụ nga ọnwa iri abụọ tinyekwara ọnwa abụọ maka ịgbakwasa ụkwụ n’agbụrụ kpalite ọgbaaghara.

    Ụmụaka ndị nwaanyị atọ e gburu na Southport

    Ebe foto si, PA/Merseyside Police

    A malitere ikpe mmadụ atọ ahụ a kpụpụrụ n’ụlọikpe maka ọgbaaghara Merseyside nke sochiri mwakpo e mere na Southport n’ụlọikpe Liverpool Crown Court.

    Ihe a bụ nnọkọ mbụ ụlọikpe ahụ na-enwe maka nnukwu arụ n’isochi ọgbaaghara tiwapụrụ kemgbe otu izu.

    Derek Drummond gbara afọ iri ise na asatọ (58) ma bụrụ onye bi na Pool Street na Declan Geiran gbara afọ iri abụọ na itolu (29) ma bụrụ onye bi na Kelso Road dịcha na Liverpool tinyere Liam James Riley bi na Walton Road, Kirkdale kwetara na ha soro bute ọgbaaghara oge ụlọikpe na-anụrụ okwu ha n’ụbọchị Mọnde.

    Drummond kwukwara na ya metọrọ onye ọrụ gbatagbata ebe Geiran kwuru na ya wakporo ụgbọala ndị uweojii.

    Cheta na ọgbaaghara tiwapụrụ na Southport oge e jichara mma sugbuo ụmụaka nwaanyị atọ gbara afọ isii, afọ asaa na afọ itoli n’otu n’otu.

  14. Connie Chiume anwụọla dịka ọ gbachara afọ 72

    Connie Chiume

    Ebe foto si, Getty Images

    Nwaafọ Saụt Afrịka na-eme ejije bụ Connie Chiume anwụọla dịka ọ gbachara afọ iri asaa na abụọ (72).

    Ozi ndị ezinaụlọ ya wepụtara kwuru na nwaanyị ahụ soro mee ejije Black Panther nwụrụ n’ehihie Tuzde 6 Ọgọst 2024 n’otu ụlọọgwụ dị na Johannesburg.

    Chiume natara ọzụzụ dịka onyenkuzi mana o mechara bụru aha mmadụ niile kpụ n’ọnụ oge ọ malitere isonye n’ejije dị iche iche a na-emepụta na tivii.

    O nwetere onyinye nkwanyeugwu dị iche iche oge ọ dị ndụ ma sonyekwa n’ọtụtụ ejije ndị gụnyere Rhythm City, Zone 14 na nke o sonyere na nso nso a bụ Gomora.

    Ozi ahụ ndị ezinaụlọ ya wepụtara kwuru ka e nyetụ ha ohere n’oge a ma kwuo na ha ga-ewepụta ozi n’uju oge na-adịghị anya.

    Ọtụtụ mmadụ amalitela idegara ya ozi nkwanyeugwu na soshal midịa dịka ọtụtụ mmadụ kọwara ya ka onye maara ọrụ ya nke ọma.

    Ozi gọọmenti Saụt Afrịka bipụtara n’akara ọbaozi X kwuru na “agaghị echefu ịgba pụrụ iche o tiri oge ọ dị ndụ.”

    Ndị ọ hapụrụ nwụọ gụnyere ụmụ ya ndị nwoke abụọ na ndị nwaanyị abụọ.

  15. Ọkammụta Muhammad Yunus abụrụla onyendu ọchịchị nchereoge na Bangladesh

    Ọkammụta Muhammad Yunusa

    Ebe foto si, Getty Images

    A họpụtala Muhammad Yunus bụ onye ritere nturuugo ‘Nobel Laureate’ dịka onyendu ọchịchị nchereoge na mba Bangladesh.

    A họpụtara nwamadị adị afọ 84 ma bụrụkwa onye na-akatọ Praịm Minista Sheikh Hasina n’ime otu ụbọchị Praịm Minista ahụ gbara arụkwaghị ma rie mbọmbọ ọso.

    E toola ọkammụta Yunus maka atụmatụ iwepụta usoro mbinye ndị ogbenye ego, Nwada Hasina na-ahụta ya dịka onye iro ya – ugbua Yunus na-agbagha ikpe e kpere nke tụrụ ya nga ọnwa isii bụ nke a sị na ọ bụ ebubo ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

    Ụmụakwụkwọ mere ngagharịiwe chụpụrụ Hasina jụrụ na ha agaghị anabata ọchịchị ndịagha ma kwadoo ka Ọkammụta Yunus bụrụ onyendu gọọmentị nchereoge.

    Mkpebi ịhọpụta Ọkammụta Yunus dịka onye ndụmọdụ ọchịchị nchereoge si na mkparịtaụka Onyeisiala Mohammed Shahabuddin, ndịagha na ndị ndu ụmụakwụkwọ mere.

    “Mgbe ụmụakwụkwọ ndị gbara oke mbọ na-achọ ka m bata bịa mezie obodo n’oge ihe isiike a, kedụkwa ka m ga-esi jụụ?” Ọkammụta Yunus kwuru.

    Ọ ga-esi na Paris ebe ọ na-anata obere ọgwụgwọ ahụike lọta na Dhaka, ka ọnụ na-ekwuru ya si kwuo.

    Ngagharịiwe malitere na mbido ọnwa Julaị na Bangladesh mgbe ụmụakwụkwọ na-achọ ka a kagbuo usoro e si eke ọrụ gọọmentị mana ọ banyeziri ngagharịiwe megide ọchịchị gọọmentị ha.

    Ihe ruru mmadụ karịrị 400 anwụọla site n’ọgbaghara dị n’etiti ndị nkịtị na ndị ọrụ nchekwa gọọmentị - ọtụtụ n’ime ha bụ ndị uweojii gbagburu ha.

  16. Igbo ndị ọma ndewo nụ

    Unu abọọla chi?

    Anyị ji ọṅụ anabata unu n'ọgbakọ BBC Igbo ebe anyị na-ewetere unu akụkọ gbapụtara ihe n'ụwa.

  17. Onyeisiala Bangladesh ekposaala ndị omeiwu mba ahụ

    Onyeisiala mba Bangladesh, Mohammed Shahabuddin

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala mba Bangladesh bụ Mohammed Shahabuddin ekposaala ndị omeiwu mba ahụ.

    Mohammed Shahabuddin kwuru na nke a bụ otu ihe ụmụakwụkwọ na-eme ngagharịiwe chọrọ.

    Ndị ndu ụmụakwụkwọ ahụ na-eme ngagharịiwe ewepụtala ihe onyonyona Facebook na-ekwu na ha agaghị anabata ọchịchị ndịagha.

    Ndị a gara n’ihu kpọọ oku ka e hiwe ọchịchị nchereoge a kpọrọ ‘Interim government’ ebe Muhammad Yunus nwere nturuugo ‘Noble Peace laureate’ ga-abụ onye ndụmọdụ.

    “Anyị agaghị anabata ọchịchị ọbụla na-abụghị nke anyị nyere kwadoro,” Nahid Islam so na ndị haziri ụmụakwụkwọ kwuru n’ihe onyonyo, ma kwuo na Maazị Yunus ekwetela ịnabata ọrụ ahụ.

  18. A maala Google ikpe n'ebubo mpụ ịbụ naanị ụlọọrụ e ji achọta ihe n'ịntanetị

    Ụlọorụ google

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọikpe dị na mba Amerịka ekwuola na ụlọọrụ Google dara site n’ịkpachi ụlọọrụ ndị ọzo na-ama ha aka ma bụrụ naanị ndị e ji achọta ihe n’ịntanetị nakwa azụmaahịa.

    N’ikpe a bụ nke e kpere na Mọnde ga-emetụta ụlọorụ Alphabet bụ ndị nwe Google dịka o nwereike ịgbanwe usoro ndị a ji arụ ọrụ.

    Ọkaịkpe Amit Mehta kwuru na ụlọọrụ Google kwụrụ ọtụtụ ijeri dọla iji bụrụ naanị ndị a ga-ahụta ma mmadụ chọọ ihe n’ịntanetị.

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ikpe ziri ezi na mba Amerịka kpụpụrụ ụlọọrụ Google n’ụlọikpe n’afọ 2020 maka etu ha si kpachie ihe ruru pasentị 90% n’azụmaahịa ịchọta ihe n’ịntanetị.

    Nke a bụ otu n’ime ọtụtụ ikpe cheere ụlọorụ a n’ihu dịka ngalaba na-ahụ mmegbu ndị na mba Amerịka na-achọ ka e nwee ihe ịma aka n’etiti ụlọọrụ dị iche iche.

    Odobeghi anya ihe ga-abụ ntaramahụhụ ụlọọrụ Google na Alphabet site n’ikpe ahụ. A ga-ekpebi ụgwọ ha ga-akwụ maọbụ ntaramahụhụ ya n’ọdịnihu.

    Gọọmentị enyela atụmatụ a kpọro “structural relief” – nke nwereike ịpụta na a ga-ekewa ụlọọrụ ahụ.

    Ụlọọrụ Alphabet nwe Google kwuru na ha ga-agbagha mkpebi ahụ ụlọikpe nyere.

  19. Ụmụakwụkwọ Bangladesh na-eme ngagharịiwe ajụla ịnabata ọchịchị ndịagha

    Ụmụakwụkwọ na-eme ngagharịiwe na Bangladesh

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị ndu ụmụakwụkwọ mba Bangladesh na-eme ngagharịiwe ewepụtala ihe onyonyona Facebook na-ekwu na ha agaghị anabata ọchịchị ndịagha.

    Ndị a gara n’ihu kpọọ oku ka e hiwe ọchịchị nchereoge a kpọrọ ‘Interim government’ ebe Muhammad Yunus nwere nturuugo ‘Noble Peace laureate’ ga-abụ onye ndụmọdụ.

    “Anyị agaghị anabata ọchịchị ọbụla na-abụghị nke anyị nyere kwadoro,” Nahid Islam so na ndị haziri ụmụakwụkwọ kwuru n’ihe onyonyo, ma kwuo na Maazị Yunus ekwetela ịnabata ọrụ ahụ.

    “Anyị agaghị anabata ọchịchị ndịagha maọbụ nke ọbụla ndịagha kwadoro.”

    Maazị Yunus dị afọ 84 ritere nturuugo ‘Noble Peace laureate’ n’afọ 2006 maka ihiwe ụlọakụ Grameen nakwa ụlọọrụ mbinye ego nke nyeere ọtụtụ ndị ogbenye aka.

    Ụlọikpe mba Bangladesh boro ya ebubo izuru ego ọha n’ọnwa Juun mana ọ gọnarịrị nke, ebe ọtụtụ ndị kwado ya kwuru na ebubo bụ n’ihi ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

  20. Mma mma nụ ooo!

    Anyị na-ekele unu n'ụbọchị taa, biko nọnyere anyị n'ọgbakọ a.