Rụwanda ezigaala ndịagha 6,000 n’ọwụwa anyanwụ DR Kongo

Ebe foto si, Reuters
Otu Mbaụwa bụ United Nations (UN) eboola Rụwanda ebubo itinye aka n’ihe metụtara ndịagha na mpaghara ọwụwa anyanwụ mba DR Kongo.
Dịka ụlọmgbasaozi redio asụsụ French bụ RFI siri kwuo, Kịgali ezipụla opekatampe ndịagha puku isii na mpaghara ahụ.
Ozi ahụ e wepụtara ụnyahụ kpughere etu mba Rụwanda siri kwado ndịagha nnupụisi M23 oge ha kpachiri obodo Goma na Bukavu na mmalite afọ a.
Ozi ahụ kwukwara na Gọọmenti Rụwanda weere ndị nọbu n’otu FDLR n’ọrụ iji rụọrọ ha ọrụ inweta ozi dị mkpa.
Ozi ahụ kpọrọ aha ụfọdụ ndịagha Rụwanda ọkwa ha dị elu a na-enyo enyo aka ha dị n’atụmatụ ahụ.
Ndị a kpọrọ aha gụnyere James Kabarebe, onye mba Amerịka taraala ahụhụ n’ọnwa Febụwarị maka ebubo ịkwado ndị otu M23, nakwa ndị Ọchịagha bụ Vincent Nyakarundi na Patrick Karuretwa.
Ndị otu kansụl ahụ kwuru na ebumnobi Rụwanda bụ ịkpachi mba DR Kongo, weghara ala ha na akụ ndị si na chi, ma nwee ikike n’ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.




















