Onyeisiala Syrịa aṅụọla iyi ichekwa Druze dịka Izrel wakporo Damaskọs

Ebe foto si, Reuters
Onyeisiala Syria bụ Ahmed al-Sharaa ekwuola na ọ kwụrụ chịm ichekwa ndị obodo Druze dịka Izrel kwuru na ha ga-awakpo ndịagha ha kwuru na ha wakporo mpaghara Suweida.
N’ozi o wepụtara dịka Izrel wakporo Damaskọs, Ahmed al-Sharaa kwuru na Syrịa anaghị atụegwu ọgụ maọbụ agha dị n’ụdị ọbụla.
Akụkọ kwuru na ndịagha amalitela ịpụ na mpaghara Suweida dịka e nwere nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ ha na ndị isi obodo Druze nwere, mana o doghị anya ka nke a ọ bụ eziokwu.
Akụkọ kwuru na ihe ruru mmadụ 350 kemgbe ndị otu ndịagha nnupuisi Druze na ndị Bedouin malitere ịwakpo onwe ụbọchị Sọnde 13 Julaị, 2025.

















