A kwụsịtụla Praịm Minista mba Thailand ọrụ maka mkparịtaụka ekwentị nzuzo pụtara ihe

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe Thailand akwụsịtụla Praịm Minista Paetongtarn Shinawatra, onye ọtụtụ kpọrọ oku ka ọ gbaa arụkwaghịm n’ihi mkparịtaụka ya na onye bụbo onye ndu Kambodịa Hun Sen nwere n’ekwentị.
A kwụsịtụrụ Paetongtarn Shinawatra ọrụ dịka ụlọikpe Thai na-atụle oku ka ewepụ ya.
Mkparịtaụka nzuzo ahụ nke pụtara ihe, gosiri etu Paetongtarn si kpọọ Hu Sen “nwanne nna” ya ma katọọ “ọchịagha Thailand, kpalitere ngagharịiwe nke mere ka igwe mmadụ kpọọ oku ka a chụpụ ya n’ọrụ, nke ụlọikpe na-atụle ugbua.
Akụkọ kwuru na nke a nwereike ime ka Paetongtarn bụrụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke atọ si n’agbụrụ Shinawatra – nke nọ n’isi nchịkwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị Thailand n'ime afọ iri abụọ gara aga – a na-achụpụ n’ọchịchị tupu oge ha agwụchaa.

