Kanada akwadoola ịnabata Palestine dịka mba nweere onwe ya
Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Julaị 2025.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu
Mmadụ 81 anwụọla ebe a na-achọ ọtụtụ ndị ọzọ achọ n’idemmiri Texas
Ebe foto si, Getty Images
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Mmadụ ise nwụrụ na mpaghara Travis County, mmadụ abụọ nwụrụ na Burnet County.
Ihe ruru
mmadụ 81 anwụọla ebe a na-achọ mmadụ 41 achọ dịka nnukwu idemmiri kpara mkpamkpa
na Texas ụbọchị Fraịde.
Akụkọ kwuru
na ụmụaka 28 nọ na mpaghara Kerr County ebe idemmiri ahụ mebiri ogige ọgbakọ ụmụnwaanyị.
E kwuru na a na-achọ ụmụnwaanyị 10 na otu onye nkụzi achọ.
Mmadụ ise
nwụrụ na mpaghara Travis County, mmadụ abụọ nwụrụ na Burnet County.
Mmadụ abụọ
ka e kwuru na ha nwụrụ na Williamson County na Kendall County ebe otu onye nwụrụ
na Tom Green County.
Ndị ọrụ
gbatagbata kwuru na ọnụọgụ ndị nwụrụ nwereike ịgbago dịka ha na-aga n’ihu ịchọ
ndị na-efu efu.
Ụtụtụ ọma ndị be anyi
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Mọnde 7 Julaị, 2025 dịka anyị na-ewetara gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ na Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa.
Biko gaa n'ihu sonyere anyị n'akara soshal midia dị maka akụkọ foto na vidio.
Nnọọ!!!!
Onyeisiala mba Yuganda bụ Musaveni dị afọ 80 chọrọ ime ka ya chịkarịa afọ 40
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Onyeisiala Yoweri Musaveni
Pati ndọrọndọrọ
ọchịchị bụ ndị nke nọ n'ọchịchị na mba Yuganda ewepụtala Onyeisiala Yoweri
Musaveni dịka onye ga-eji aha Pati ha zụọ ọkwa ọchịchị.
N'okwu
nnabata ya, Musaveni gbara afọ 80 nke ọchịchị ya na Yuganda fọrọ ntakịrị ka o ruo afọ 40 si na ya azala oku a kpọrọ ya.
Ọ sị na ọ bụrụ
na a kwado ya nkeoma, ọ ga-aga n'ihu ị tụgharị obodo ha ka ọ bụrụ "mba ndị
nọ n’ime ya nwere ego na-ezuru ha".
Mana ndị n'akatọ ọchịchị
ya kwuru na o jiri aka ike soro ndị Yuganda kemgbe ọ nwụchịrị ọchịchị dịka onye
ndụ nnupụisi n’afọ 1986.
Mba Amerịka achụpụla ụmụ nwoke asatọ, ziga ha Saụt Sụdan
Ebe foto si, US Department of Homeland Security
Nkọwa foto, Ndị a chụpụrụ n'Amerịka
Mba Amerịka
achụpụla ụmụ nwoke asatọ ma ziga ha mba Saụt Sụdan.
Mmadụ asatọ
ndị ahụ gunyere ndị a tụrụ nga maka mpụ dị icheiche dịka izu ohi, ịma nwaanyị
elu n’ike nakwa igbu mmadụ.
Ọtụtụ n’ime
ndị ahụ bụ ndị nwere naanị obere oge ka ha nọzuo afọ ole a tụrụ ha nga nakwa ndị
nọzugoro afọ ole ha kwesiri ịnọ n’ụlọnga.
Mana ọ bụ
naani otu nwoke n'ime mmadụ asatọ ahụ bụ onye Saụt Sụdan.
Amerịka
na-ekwu na mba ndị ọzọ ekweghị anabata ndị obodo ha nke mere ha jiri duga ha asatọ na Saụt Sụdan.
Mana nke a
abụghị nke mbụ gọọment Donald Trump na-achụpụ ndị mmadụ.
Cheta na ndị
El Salvador na Kosta Rika so na ndị achụnalala n’oge garaaga.
Edo steeti ekwupụtala ntiwapụ ọrịa 'Dengue fever'
Ebe foto si, Edo State Government/Facebook
Nkọwa foto, Gọọmentị Edo Steeti ekwupụtala ntiwapụ ọrịa ‘Dengue fever’
Gọọmentị Edo Steeti ekwupụtala ntiwapụ ọrịa ‘Dengue fever’ ma
kwukwa na ọrịa ahụ metụtara mmadụ iri asatọ na isii.
Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Dọkịnta Cyril
Oshiomhole kwupụtara nke a mgbe ya na ndị ntaakụkọ kparịtara ụka n’isi obodo steeti
ahụ bụ Benin City.
"Anyị a chọpụtala mmadụ iri asatọ na isii nwere ọrịa ‘dengue
fever’ na mpaghara okpuru ọchịchị dị iche iche. Ọ bụ ezie na anyị ka na-eme nnyocha
banyere ọnụọgụgụ ndị nwụrụ anwụ, usoro ahụ dị egwu ma na anyị na-akpọ oku ka
onye ọbụla tinye aka," ka o kwuru.
Ọ gara n’ihu kwuo na steeti ahụ ahụla na mgbe gara aga, ọrịa
Lassa Fever metụtara mmadụ otu narị atọ na iri atọ na asaa, nke butere ọnwụ
mmadụ iri abụọ na anọ.
O kwukwara na mmadụ abụọ e nwebuola ọrịa Yellow Fever nke otu
n’ime ha nwụrụ, mmadụ asatọ nwere Mpox dịka mmadụ asatọ nwere ọrịa Diphtheria nke
mmadụ atọ n’ime nwụrụla.
Izrel ga-eziga ndị ogbugbo na Gaza maka mkparịtaụka n'agbanyeghị ‘anabataghị' ọchụchọ ndị Hamas – Praịm Minista
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Mwakpo ogbunigwe ndị Izrel mere n’abalị nke n'ụlọakwụkwọ ụlọọrụ UN nke ndị a chụpụrụ n’obodo Gaza
Mba Izrel ekpebiela iziga ndị ogbugbo na Kataa n’ụbọchị Sọnde
maka mkparịtaụka ha na ndị Hamas ga-enwe banyere atụmatụ nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa
mgbọ na ntọhapụ ndị ejiji na Gaza.
Ụlọọrụ Praịm Minista Benjamin Netanyahu kwuru na ya nabatara
oku isonye na mkparịtaụka ahụ n'agbanyeghị ihe ọ kọwaara dịka "anabataghị"
mgbanwe ndị Hamas chọrọ ime banyere atụmatụ nke ndị ogbugbo si Kataa, Amerịka na
Ijipt gosipụtara.
N’abalị Fraịde, Hamas kwuru na ya enyela "nzaghachi
ziri ezi" n’atụmatụ maka nkwụsị ọgụ ụbọchị iri isii nakwa na ọ dịla
njikere maka mkparịtaụka.
Mana, onye ọrụ Palestine kwuru na ndị otu a chọrọ mgbanwe gụnyere
nkwa na ọgụ agaghị ebido ma ọ bụrụ na mkparịtaụka inwe nkwụsị agha na-adịgide enweghị
isi.
Elon Musk ekwuola na ya na-ewepụta otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọhụrụ
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, O dobeghị anya ma edebanyela aha pati ahụ n’akwụkwọ ndị ọchịchị na-ahụ maka ntuliaka na mba Amerịka
Elon Musk kwuru na ya na-ewepụta otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọhụrụ,
ka ọ gachara izu ole na ole ya na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump nwechara
esemokwu.
Onye ọchụnta ego ahụ kwupụtara n’ọbaozi soshal midịa X na ya
ehibela Amerịka pati, nke ga-echere otu ndọrọndọrọ abụọ a ma ama na mba Amerịka
bụ Republican na Democratic aka mgba.
Mana, o dobeghị anya ma e debanyela aha pati ahụ n’akwụkwọ
ndị ọchịchị na-ahụ maka ntuliaka na mba Amerịka.
Musk bụ onye a mụrụ na mpụga Amerịka ma bụrụkwa onye
na-erughị eru ịzọ ọkwa Onyeisiala Amerịka, ekwughị onye ga-edu otu ndọrọndọrọ ọchịchị
ahụ.
Cheta na o bu ụzọ kwupụta maka iguzobe otu pati ahụ n'oge
esemokwu ya na Onyeisiala Trump pụtara ihe, ọ bụ esemokwu a mere ka ọ hapụ ọrụ
ya n’ọchịchị Onyeisiala Trump, ha abụọ wee banye n'ọgbaghara.
Nkọwa foto, Ebe idemmiri buuru ihe karịrị ụmụagbọghọ 20 site n'ogige dị n'akụkụ osimiri
E zipụla ọtụtụ narị ndị nnapụta ka ha na-achọ ndị mmadụ
na-efu efu n’obodo Texas nke mba Amerịka dịka idemmiri gburu mmadụ iri ise na otu gụnyere ụmụaka
iri na ise.
Mpaghara ihe a kachasị metụta bụ Kerr County ebe mmadụ iri
anọ na atọ nwụrụ na ụmụaka iri abụọ na asaa na-efu efu site n’ogige ndị ntoroọbịa
nwere ọgbakọ Ndị Kraịst ‘christain summer camp’ dị n'akụkụ Osimiri Guadalupe.
“Ọrụ na-aga n’ihu, ọ ga na-aga n’ihu ruo mgbe a ga-achọta
onye ọbụla,” onyeisi ndị uweojii nke Kerr County bụ Larry Leitha kwere nkwa.
N’aka nke ọzọ, ekwupụtala ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ n’akụkụ ebe
ndị ọzọ na steeti ahụ gụnyere Travis County na Tom Green County.
Onyeisiala Amerịka Donald Trump kwuru na ọchịchị ya na ndị ọchịchị obodo na-arụkọ ọrụ ọnụ iji zaghachi ihe mberede ahụ.
Mana ndị na-eme nnoycha banyere ihuigwe adọọla aka na ntị n'etiti Texas nwereike ịhụ oke idemmiri na ngwụcha izu a.
Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nu
Anyị na-anabata unu n’ụbọchị taa Sọnde 6 Julaị 2025.
Anyị na-asị ka izuụka ọhụrụ a mara anyị mma.
Biko, na-anọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo dịka anyị na-ewetere unu akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.
Udo dịrị unu!
Trump ebinyela aka n'iwu ụtụisi na iwu ịkpachibido ndị mbịarambịara na mba Amerịka
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ebinyela aka n’atụmatụ
iwu ndị ọchịchị ya hiwere ka ha bụrụ iwu dịka o jisiri ike gafee nkwado ndị ụlọomeiwu.
O mere nke n’obi ọchịchị bụ White House n'ehihie ụbọchi Fraịde
Julai 4, ụfọdụ iwu ndị a metụtara mbelata ụtụisi, itinyekwu ego na nchekwa ha na
iwu ịmachi ndị mbịarambịa.
Trump gwara ndị na-akwado ya na iwu a o binyere aka ga-emepe
akụnaụba mba Amerịka.
Ebe foto si, Getty Images
Ihe ndị nọ n’ime akwụkwọ ahụ gunyere:
ịgbatị mbelata ụtụisi nke 2017 o mere n’oge mbụ ọ na-achị
Mbelata dị elu na mmefu enyemaka ahụike ‘Medic aid’, atụmatụ nlekọta ahụike steeti nyere maka ndị nwere obere ego na ndị nwere nkwarụ.
Nkwụsịtụ ụtụ ọhụrụ na ego a na-enweta, oge ọrụ na nchekwa ọha.
Ibuli ego dị $150bn n’ime ego a na-emefu maka nchekwa.
Mbelata ụtụisi nke Biden tinyere na ngalaba ‘clean energy’.
Inye ndọ ọrụ na-ahụ maka ọpụpụ na mbata (ICE) ego dị $100bn ka ha tinye n’ọrụ.
Julian McMahon nwafọ Australia so n'ejije 'Fantastic Four' anwụọla ka ọ gbara afọ 56
Ebe foto si, Reuters
Onye ejije na mba Austrialia Julian McMahon nke ama-ama
maka ọrụ ya n’usoro ihe onyonyo Nip/Tuck
na Charmed anwụọla dịka ọ gbachara afọ iri ise na isii (56)
Nwunye ya, onye kwupụtara onwu ya si na ọ nwuru na mpaghara
Clearwater, Florida n’ụbọchi Wenezde 3 Julaị, 2025 dịka a chọpụtara na ọ na-arịa
ọrịa kansa.
“Julian hụrụ ndụ n’anya. Ọ hụrụ ezinaụlọ ya n’anya. Ọ hụrụ
ndị enyi ya n’anya. Ọ hụrụ ọru ya n’anya. Ọ hụrụ ndị ndu ya n'anya. Ihe ọchịchọ
ya bụ iweta obi ụtọ na ndụ ndị mmadụ o nwere ike,” Kelly Paniagua kwuru nke a dịka ụlọọrụ Deadline si depụta
ya.
Ọrụ McMahon malitere site n’usoro ihe nkiri onyonyo Charmed
tupu ya enweta nkwanye ugwu na Nip/Tuck, ihe nkiri ahụike nke ọ rụrụ ọrụ dị ka
dọkịnta na-awa arụzi ahụ bụ dọkinta Christian Troy.
Ihe nkiri onyonyo ahụ nke na-achu oge isii site na afọ 2003
rue afọ 2010 nwetara ya nhọpụta Golden Globe.
Onye so ya n’ihe onyonyo ahụ bụ Dylan Walsh gwara ụlọọrụ
ntaakụkọ Dealine na "o juru ya anya". "Anyị gbakọrọ ebili mmiri
a onu, ahụrụ m ya n'anya”
"Jules! Amaara m na ị ga-achọ ka m kwuo ihe ga-eme gị ọnụ
ọchị - ihe ọchị niile dị n'ime. N'afọ ndị ahụ niile i nwere azụ m, na chi m,
anyị chịrị ọchị. Obi m dịnyere gị. Zuru ike n'udo."
McMahon, nwa nke onye bụbu Praịm Minista Australia mere
ejije ọrụ praịm minista Australia n’ihe onyonyo Netflix - The Residence - otu
n'ime ihe ngosi ya nke ọ hụrụ
McMahon lụrụ nwaanyi ugboro atọ - onye mbụ bụ onye Australia
na-agụ egwu Dannii Minogue, nwanne Kylie Minogue.
Igwe mmadụ na-eru uju ugbua n'emume akwamozu Diogo Jota na nwanne ya Andrew
Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ ndị na-eru uju na-awuchi n’akwamozu
Diogo Jota na nwanne ya nwoke Andre Silva n’obodo ha bụ Gondomar dị na mba
Portugal.
Ndị ezinaụlọ nakwa ndị ọnụ na-eru
n’okwu n’egwuregwu bọọlụ na Portugal bịara akwamozu ahụ - ndị igwe mmadụ gbakọtara
na mbaraezi na-ekpe ekpere nakwa ịkwanyere ha ugwu nke ikpeazụ.
Ụmụnne abụọ a nwụrụ n’ihe mberede
nke okporoụzọ n amba Spen n’ụbọchị Tọzde 3 Julaị – ndị ọrụ kwuru na ụgbọala ha gbapụrụ
n’okporoụzọ mgbe ụkwụ ‘tire’ ya gbara dịka ọ na-achọ ịgbafe ụgbọala ọzọ.
Ebe foto si, PA Media
Diogo Jota dị afọ iri abụọ na asatọ na-agbara Liverpool bọọlụ ka lụchara nwunye ya bụ Rite Cardoso n’ime ụbọchị iri na out tupu ọnwụ ya – ha mụtara ụmụatọ.
E ziteere ezinaụlọ ụmụnne abụọ a ọtụtụ ozi itiaka n’obi dịka ọtụtụ mmadụ pụtara maka ịmụrụ ha anya abalị.
Ọtụtụ ndị gbaara Liverpool n’oge gara aga nakwa ugbua wuchiri ebe ahụ iji kwanyere onye out ha ugwu ikpeazụ.
Ndị bịaranụ gụnyere Onyeisiala Portugal bụ Marcelo Rebelo de Sousa, Praịm Minista Luís Montenegro, ndị na-agbara Pọtugal bọọlu dịka Bruno Fernandes, Bernardo Silva, João Moutinho, Diogo Dalot na Ricardo Horta, na onye nnọchi anya Jota Jorge Mendes.
Ndị ọzọ gunyere ndị egwuregwu Liverpool na ndị ọrụ ha nke gụnyere Virgil Van Dijk nakwa ndị ọzọ.
Ebe foto si, Getty Images
Oke idemmiri egbuola ihe ruru mmadụ 24 na Texas ebe a na-achọ ọtụtụ ụmụaka achọ
Ebe foto si, Getty Images
A ka na-achọ ọtụtụ mmadụ ugbua n’obodo Texas mba Amerịka dịka
idemmiri gburu opekatampe mmadụ iri abụọ na anọ, ebe ọtụtụ ụmụagbọghọ ndị gara ọgbakọ
‘christain summer camp’ na-efu efu.
A dọrọ ndị mmadụ aka na ntị dịka oyi Guadalupe tolitere n’ogogo
26ft n’ime otu awa, dịka idemmiri buuru ọtụtụ ụlọ, ụgbọala, nakwa ụlọ ebe
ezumike mgbe ndị mmadụ nọ n’ụbọchị Julaị 4.
Ndị ọrụ gbata gbata ka na-achọ ihe ruru ụmụaka 25 n’ime ụmụaka
ụmụnwaanyị 750 gara ọgbakọ ahụ n’akụkụ obodo Kerrville.
Donald Trump bụ onyeisiala Amerịka kọwara oke idemmiri ahụ dịka "ihe na-awụ akpata oyi" ma kwee nkwa ị gbatara ha ọsọ enyemaka.
Ebe foto si, Getty Images
Gọvano obodo Texas bụ Dan Patrick kwuru "n'ime nkeji 45, osimiri Guadalupe bidoro itoli elu ruo ogogo 26ft, ma bido imebisi ihe tinyere ndụ mmadụ.
O kwuru na a na-agbasi mbọ ike ịzọpụta ọtụtụ ndị mmadụ ma kwuo na ọ bụghị na ndị a na-achọ achọ anwụọla kama na o nwereike ha nọ otu ebe mana n'isi nsogbu ekwentị ha enweghi ike ịkpọ onye ọbụla.
Ọ rịọrọ ndị nne na nna ka ha nwee ndidi na ndị ọrụ gbata gbata na-agbasi mbọ ikọ ịchọta ụmụaka a na-efu efu.
Igbo ndị ọma e ji eme ọnụ!
Anyị ji obi ọcha na-anabata unu na ngwụcha izuụka a.
Ekpere anyị bụ ka ihe ọma ị tụrụ anya ya ruo gị aka tupu ọ kụrụ ọnụ.
Biko, gbalịa na-anọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo.
Daalụ!
A machiela iji POS adọrọ ego na gburu gburu ụlọọrụ ndị uweojii n’Abia Steeti
Ebe foto si, Abia State Police Command/Getty Images
Kọmishọna
ndị uweojii n’Abia Steeti amachiela azụmaahịa ịdọrọego n’igwe ‘Point of Sale' (POS)
na gburugburu ụlọọrụ ndị uweojii niile dị na steeti ahụ.
Danladi Isa
kwuru nke a mgbe ya na ndị ọrụ ya na-enwe mkparịtaụka n’isiụlọọrụ ha dị n’Umuahia
n’ụbọchị Fraịde.
Ọ gara n’ihu
kwuo ka ndị uweojii kwụsị ijide ma kpọchie onye dara iwu e nwereike ịgbapụta ya
karịa otu ụbọchị. Ọ gbakwụnyere na site ugbua gawa n’ihu na onye ọbụla e ji eji
n’aka ndị uweojii na-arịa ọrịa ga-enwete nlekọta nke ahụ ike na-egbughi oge.
Isa dọrọ ndị
uweojii nọ n’okpuru ya aka na ntị ka ha sepu aka n’ime mpụ ọbụla, ma kwuo na
onye ọbụla dara iwu a ga-anata ntaramahụhụ ruru ya.
O kwuru na
ndị ga-ebu uzọ taa ahụhụ ahụ bụ onye ọrụ uweojii du ndị mere mpụ ahụ gaa ọrụ.
E bola Thomas Partey ebubo idina ụmụnwaanyị n'ike
Ebe foto si, Getty Images
E bola Thomas Partey bụ nwafọ mba Gana gbabuuru otu egwuregwu Arsenal bọọlụ ebubo idina nwaanyị n'ike na mwakpo mmekọahụ.
Ndị uweojii obodo kwuru na Partey kpara arụ ndị a n'agba afọ 2021 ruo afọ 2022, dịka a
na-atụ anya na ọ ga-apụta n'ụlọikpe Westminster na Tuzde 5 Ọgọst.
Ọnụ ebubo ise e boro ya metụtara
ụmụnwaanyị atọ; ebubo abụọ nke idina n'ike metụtara otu nwaanyị, ebubo atọ
nke idina n'ike metụtara nwaanyị nke abụọ na otu ebubo mmekọ nwoke na nwaanyị jikọtara
nwanyị nke atọ.
Onye uweojii na-eleba anya na nnyocha ahụ bụ Andy Furphy kwuru, sị: "Ihe kachasị anyị mkpa bụ
inye ụmụnwaanyị ndị a pụtara kwupụta okwu nkwado.
"Anyị na-ajụ onye ọbụla nke ikpe a metụtara maọbụ onye ọbụla nwere ozi akaebe bịa kpọtụrụ ndị uweojii."
Ohere Partey nwere ịgbara Arsenal bọọlụ bịara na njedebe n'ụbọchị Mọnde 30 Mee, 2025 dịka ọ malitere ịgbara ha bọọlụ kamgbe afọ 2020.
Partey dị afọ iri atọ na abụọ.
Rọshia atụọla ogbunigwe na Yukren dịka Putin jụrụ atụmatụ ime udo nke Trump
Anwụrụ ọkụ na ọchịchịrị amachiela obodo Kyiv dịka Rọshia bidoro n’abalị Fraịde Julaị 4 na-awakpo mpaghara ọbụla nke isiobodo Yukren.
Mwakpo a mere ka ihe ruru mmadụ iri abụọ na atọ meruọ ahụ.
Yukren kwuru na Rọshia gbapụrụ ogbunigwe 'drone' dị 550 na ngwagha ruru iri na otu.
Ebe foto si, Reuters
Mwakpo a bịara n'ime awa ole ma ole Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump na Onyeisiala mba Rọshia Vladimir Putin nwechara mkparitaụka n'ekwenti dịka Trump mechara kwuo na o “nwere nkụda mmụọ” na Putin adịghị njikere ịkwụsị agha ha na-ebuso Yukren.
A ga-amụrụ Diogo Jota na nwanne ya nwoke nwụrụ anya abalị ụbọchị Fraịde Julaị 4
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Jota na nwanne ya bụ Andre Silva nwụrụ n’ihe mberede okporoụzọ na mpaghara Zamora, mba Spen dịka ha na-eme njem.
Ọtụtụ mmadụ
na-ezita ozi iti aka n’obi nye ezinaụlọ, enyi na otu bọọlụ Liverpool maka ọnwụ
Diogo Jota na nwanne ya nwoke nwụrụ.
Jota na
nwanne ya bụ Andre Silva nwụrụ n’ihe mberede okporoụzọ na mpaghara Zamora, mba
Spen dịka ha na-eme njem.
Akụkọ kwuru
na a ga-amụrụ ha anya abalị ụbọchị Fraịde Julaị 4, 2025, tupu e lie ha ụbọchị
Satọde Julaị 5, 2025 na Pọtụgal.
Ọ bụ oge Jota
na-agbara Liverpool bọọlụ na-alaghachi maka nkwado otu egwu bọọlụ Liverpool ka ụgbọala
Lamborghini ya nwere ihe mberede ahụ.
Jota lụrụ
nwunye ya bụ Rute Cardoso n’izuụka abụọ gara aga. Ha abụọ mụtara ụmụaka atọ.
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Jota lụrụ nwunye ya bụ Rute Cardoso n’izuụka abụọ gara aga. Ha abụọ mụtara ụmụaka atọ.
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ndị na-eru uju maka ọnwụ Diogo Jota
Ụtụtụ ọma ndị be anyị
Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 4 Julaị, 2025 dịka anyị na-ewetara gị akụkọ pụtara ihe n'ụwa.
Sonyekwara anyị n'akara soshal midia anyị maka ihe onyonyo na foto akụkọ ndị ọzọ.
Ndewo.
Peter Rufai anwụọla dịka ọ gbachara afọ 62
Ebe foto si, Getty Images
Onye bụbụ ochee
goolu otu egwu bọọlụ Super Eagles nke Naịjirịa bụ Peter Rufai anwụọla.
Otu egwu bọọlụ
Super Eagles kwupụtara maka ọnwụ onye ahụ bụbu kaptịn ha.
Dịka ha
siri kwuo, Peter Rufai nwụrụ ka ọ gbachara afọ iri isii na abụọ (62)
Akụkọ kwuru na ochie dike ahụ a maara nke ọma dịka Dodo
Mayana nwụrụ n’ụtụtụ Tọzde 3 Julaị, 2025.
A mụrụ ya na Legọs steeti, ọ malite njem ya dịka ọgbaabọọlụ
n’otu egwu bọọlụ Stationery Stores FC nakwa Femo Scorpions.
N’afọ 1986, ọ gara mba Bene ma sonyere otu egwu bọọlụ AS Dragons FC de l'Ouémé.
Peter Rufai nọchitere anya Naịjirịa n’ịmaaka Iko Mbaụwa abụọ
nakwa ọtụtụ ịmaaka Iko Mba Afrịka.