Kanada akwadoola ịnabata Palestine dịka mba nweere onwe ya

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Julaị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Okpebholo meríri na ntuliaka Gọvanọ Edo n'ezie- Ụlọikpe Kachasí

    Gọvanọ Monday Okpebholo

    Ụlọikpe Kachasị ekpebiela na ọ bụ Monday Okpebholo nke otu APC merịrị na Ntuliaka ọwa Gọvanọ Edo steeti na n'ezie.

    N'ikpe ọkaikpe ise kpere nke Jọstịs Mohammed Garba Lawal nọ n'isi ya n'ụbọchị Tọzde, ụlọikpe ahụ nke guzoro na mkpebi nke Ụlọikpe Mkpegharị nyeburu n'okwu ahụ, sịrị na ndị gbara akwụkwọ egosighị n'ụzọ were anya na e nwere vootu adịghị mma nakwa na a gbasoghị usoro ntuliaka ahụ e mere n'ọnwa Septemba afọ 2024.

    Onye zọro ọkwa ahụ n'aha otu PDP bụ Asue Ighodalo gbara akwụkwọ iji gbagha mkpebi Ụlọikpe Mkpegharị nyeburu.

    Na ntuliaka ahụ, Inec kpọp,ụtara Okpebholo dịka onye meriri na ntuliaka Gọvanọ ahụ dịka o nwetara vootu dị 291,667, ebe Ighodalo nwetara vootu dị 247,274.

  2. Ameríka egbubiela oge akwụkwọ ohere ịbata ala ha maka mba Afrịka atọ

    Okoloto Naijiria na nke Amerịka

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba Amerịka amaala ọkwa na ha egbubiela akwụkwọ ohere mbata ala ha Bekeee kpọrọ 'visa' maka mba Kamerun, Ethiopia nakwa Naijiria.

    Ngalaba na-ahụ maka mmekọrịta mba na mba nke Amerịka kwuru sị, na akwụkwọ ikike mbata ala ha na-enye ụmụamala mba atọ a ga-abụzị nani otu mbanye ga-adị ire naanị ọnwa atọ.

    Mba Amerịka kwuru na nke a bu iji bọkwara ihe mba ndị a na-eme ndị Amerịka.

    Tupu iwu ọhụrụ a, Amerịka na-enye ụmụ Naijiria ohere ịbata Amerịka ọtụtụ ugboro nke na-adị ire afọ ise.

    Naijiria na-enye ndị si Amerịka abata Naijiria nani ohere otu mbata n'ime ọnwa atọ.

    mana ka ọ dị ugbua, gọọmentị Naijiria agbarụọla iru maka ụkwụ nke Amerịka zọpụrụ sị na, ọ bụ"ihe mwute metụtara ezigbo mmekọrịta enyi na enyi dịbu n'etiti mba abụọ ahụ".

    Ozi si na Ministry na-ahụ maka mmekọrịta Naijiria na mba ndị ọzọ nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Kimiebi Imomotimi Ebienfa binyere aka ma wepụta ụbọchị wednezde kwuru sị,

    "Ọgbachi ahụ ga-emetụta ụmụakwụkwọ na-achọ ohere agụmakwụkwọ, ndị ọrụ nakwa ndị ojiegoachụego, ezinaụlọ na-aga ileta ndị nke ha, nakwa mmekọrịta ọdịnala nakwa agụmakwụkwọ."

    Gọọmentị Naijiria gara n'ihu kpọọ Amerịka oku ka ha lebagharịa anya na mkpebi ha maka ọdịmma mba abụọ ahụ.

  3. Rọshịa ejirila abalị tụọ ogbunigwe na Kyiv, Yukren

    Yukren

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Yukren

    N’ime abalị garaaga ka mba Rọshịa tụrụ ogbunigwe dara na Kyiv ma gbuo mmadụ abọụ, meruo ihe ruru mmadụ iri na isii ahụ.

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky mere ka a mata nke a ma kọwaa na Rọshịa jị droonu 400 na ‘missile’ 18 nwere kpaa mkpamkpa ahụ.

    Ndị ọrụ gọọment na Kyiv na-ekwu na ogbunigwe ahụ metụtara ụlọ ndị nkịtị dị na mpaghara etiti obodo Shevchenkivskyi ma butekwa ọkụ ọgbụgba na mpaghara dị icheiche n’ebe ahụ.

    Ihe a mere na ndị mmadụ ehighị ụra maka n amba Yukren ji ngwaagha na-agbatusi droonu na ‘missile’ ndị ahụ.

    Cheta n'abalị abụọ garaaga ka Rọshịa jikwara droonu 728 nwere mwakpoo mba Yukren bụ nke Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump katọrọ.

  4. Ndị be anyị ụtụtụ ọma nu.

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tózde, 10 Julaị, 2025 dịka anyị na-ewetara unu akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile.

    Ekpere anyị bụ na taa ga-abụrụ mmadụ niile ụbọchị ọma.

    Daalụ!

  5. Trump akatọọla nnukwu ogbunigwe Rọshịa tụrụ Yukren

    Ebe ogbunigwe dara na Yukren

    Ebe foto si, DSNS Ukraine

    Nkọwa foto, Ebe ogbunigwe dara na Yukren

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky ekwuola na mba Rọshịa tụrụ ha nnukwu ogbunigwe nke ọ kọwara dịka nke kacha kemgbe ha bidoro ịnụ agha.

    Rọshịa jiri droonu ruru 728 nakwa ogbunigwe nwere mwakpo mpaghara mba Yukren dị icheiche n'abalị garaaga.

    Nke a na-eme dịka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwuru na ha ga-eziga ngwa agha na Yukren.

    Cheta, n'ụbọchị Tuzde ka Trump kwuputara iwe ya ebe Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin nọ.

    Trump gwara ndị nta akụkọ sị "Putin tụrụ anyị ọtụtụ ogbunigwe".

    Mana na mba Yukren, ogbunigwe dara na mpaghara Lviv na Rivne.

  6. Ruto: Onye ọbụla ụnụ hụrụ na-emebi ihe, jiri egbe gbajie ya ụkwụ

    Onyeisiala William Ruto nke Kenya

    Ebe foto si, State House Kenya/Facebook

    Onyeisiala mba Kenya bụ William Ruto enyela ndịuweojii mba ahụ iwu ka ha gbaa onye ọbụla na-eme ngagharịiwe mebiri ahịa ndị mmadụ egbe n'ụkwụ mana ha egbula ha egbu dịka ngagharịwe na-akpọtụ na mba ahụ.

    Ngaggharịiwe dapụtara na Kenya na nsonso a, dịka ndị ntorobia na-egosi iwe ha banyere ọnọdụ akụnaụba dịka akụkọ gbara na gọọmentị mba ahụ chọrọ ibuli ego ụtụisi.

    Otu 'United Nation' na otu ndị ọzọ na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye na-ebo ndị uweojii ebubo iji aka ike karịrị akarị na ngagharịiwe ahụ a na-eme megide gọọmentị mba ahụ nke taarala isi mmadụ 31, dịka otu ahụ si kwuo.

    Onyeisala Ruto kwuru sị, "Onye ọbụla e jidere k a ọ na-amụnye ọdọahịa mmadụ maọbụ ụlọ mmadụ ọkụ, sị gbaa ya egbe n'ụkwụ, kpọga ya ụlọgwụ, eme cha a kpụpụ ya ụlọikpe. E gbula ha egbu, nnanị hụ na ịgajiri ya ụkwụ."

    Ọ gara n'ihu dọọ ndị iro ya na ndọrọndọrọ ọchịchị ka ha kwanye ngaharịiwe iji wepụ ya n'ọchịchị.

  7. Onyeisiala Trump na Netanyahu enweela nzukọ nke abụọ maka mkparịtaụka nkwụsị agha Gaza

    Nke a na-eme ya ugboro atọ Netanyahu na-abịa njem nleta kemgbe Onyeisiala Trump malitere ọchịchị nke ugboro abụọ n’Amerịka

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Nke a na-eme ya ugboro atọ Netanyahu na-abịa njem nleta kemgbe Onyeisiala Trump malitere ọchịchị nke ugboro abụọ n’Amerịka

    Onyeisiala Donald Trump na Praịm Minista mba Izrel Benjamin Netanyahu enweela nzukọ nke abụọ na mgbede Tuzde iji mkparịtaụka maka agha na-aga n’ihu na Gaza.

    Nzukọ a na-abịa dịka onye nnọchiteanya Onyeisiala Trump na mpaghara Middle East bụ Steve Witkoff kwuru na Izrel na Hamas nwere otu okwu fọdụrụ ka ha kwenye na nkwekọrịta nkwụsị agha abalị iri isii.

    Netanyahụ rutere n’obi ọchịchị mba Amerịka bụ White House oge ọ kụrụ elekere ise nke mgbede n’ụbọchị Tuzde maka nzukọ ahụ nke ha ekweghị ndị ntaakụkọ isonye na ya.

    Cheta na Netanyahu na osote onyeisiala mba Amerịka bụ JD Vance nwere nzukọ n’ụtụtụ Tuzde dịka ya na Onyeisiala Trump nwekwara nzukọ awa ole na ole mgbe ha na-eri nri abalị na White House n’ụbọchị Mọnde.

    Chetakwa na nke a na-eme ya ugboro atọ Netanyahu na-abịa njem nleta kemgbe Onyeisiala Trump malitere ọchịchị nke ugboro abụọ n’Amerịka.

  8. Ramaphosa akatọla tarifu pasent 30 nke Onyeisiala Trump tinyere na mbubata si Saụt Afrịka

    Saụt Afrịka bụ naanị mba dị na mpaghara Afrịka nke Onyeisia Trump nyere ụtụisi dị elu na nkwupụta a

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Saụt Afrịka bụ naanị mba dị na mpaghara Afrịka nke Onyeisia Trump nyere ụtụisi dị elu na nkwupụta a

    Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa akatọla tarifu dị elu nke mba Amerịka tinyere na mbubata niile si Saụt Afrịka bata Amerịka.

    Cheta na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwupụtara n’ụbọchị Mọnde 7 Julaị 2025 na ya ga-amanye tarifu pasent 30 na mbubata niile si Saụt Afrịka malite n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọgọst.

    Nke a mere mba Saụt Afrịka jiri bụrụ naanị mba dị na mpaghara Afrịka nke Onyeisia Trump nyere ụtụisi dị elu na nkwupụta ahụ, na-egosi mmekọ adịghị mma nke Onyeisiala Trump na ọchọchị Ramaphosa nwere.

    N’akwụkwọ o degara Ramaphosa, Onyeisiala Trump kwuru na mmekọ azụmaahịa mba Saụt Afrịka na Amerịka “dị nwute dịka ọ dịla anya n'ichegharị.”

    Na nzaghachi, Ramaphosa kwuru na tarifu pasent 30 "anaghị egosi ndekọ azụmaahịa dị n’etiti ha nke ọma".

    Chetakwa na Amerịka bụ mba nke abụọ ya na Saụt Afrịka kacha azụ ahịa, dịka ụgbọala emepụtara na Saụt Afrịka, ndị ọrụugbo na ngalaba akwa nwere ohere ibubata ahịa n’Amerịka n'efu n'okpuru iwu African Growth and Opportunity Act (Agoa).

  9. Ndị be anyị ụtụtụ ọma nu.

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde 9 Julaị, 2025 dịka anyị na-ewetara unu akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile.

    Ekpere anyị bụ na ụbọchị taa ga-amara anyị niile mma.

    Daalụ!

  10. Gọọmenti Naịjirịa enwetuola afọ ole eji abanye mahadum, akara JAMB

    JAMB

    Ebe foto si, Getty Images / JAMB

    Nkọwa foto, JAMB

    Gọọmenti Naịjirịa emeela ka akara 150 n’ule Joint Admission and Matriculation Board (Jamb) bụrụ opekatampe nwata akwụkwọ ga-eji banye mahadum.

    Ha jikwara ohere ahụ wepụta akara JAMB opekatampe e ji abanye ụlọ akwụkwọ dị elu ndị ọzọ dịka kolege na politeknik.

    Mịnịsta na-ahụ maka agụmaakwụkwọ bụ Maruf Olatunji Alausa kwuputara na akara opekatampe nke kolege bụ 140, politeknik ga-abụ 100 ebe ụlọakwụkwọ dị elu bụ ebe a na-azụpụta ndị nkuzi ga-abụkwa akara 100.

    Mịnịsta Olatunji kwuru nke a dịka ya na ndị isi na ngaraba agụmaakwụkwọ nakwa ndị Jamb mechere nzuko n’Abuja.

    Ha kwekọtara na mahadum ga-akwụsị ịnabata ndị ọhụrụ n’ọnwa Disemba 2025.

    Ha kwuru na ọ bụrụ na mahadum enye mmadụ ohere ịbata, onye ahụ were naanị izuụka anọ ịnabata ya maọbụ ịjụ ya. Ọ bụrụ na onweghị ihe onye ahụ mere maka ịnabata ohere ịgụ akwụkwọ ahụ, a ga-enwere ya dịka ihe efu.

    Ọ sị na ọ bụ afọ iri na isii ka e ji abanye mahadum ugbua na ọbụghizi afọ iri na asatọ.

  11. Ndị uweojii anwụchiela nwata akwụkwọ Mahadum Nsụka maka ọnwụ otu nwagbọghọ

    Ndị uweojii nwụchiri ya n'abalị abụọ nke ọnwa Julaị

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị uweojii nwụchiri ya n'abalị abụọ nke ọnwa Julaị

    Ndị Uweojii Enugwu steeti anwụchiela otu nwata akwụkwọ nke ngalaba Metallurgical and Material Engineering na Mahadum Nsụka maka ọnwụ nwaghọghọ aha ya bụ Deborah Sam-praise Emenem.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe kwuru na nwata nwoke ahụ aha ya bụ Emmanuel Gambo nke gbara afọ iri abụọ na abụọ bụ onye a na-enyo enyo n’aka ya dị n’ọnwa nwada ahụ.

    Ozi Ndukwe wepụtara kọwara na Gambo bụ onye Kogi steeti na Deborah Emenem gara n’ụlọ oriri na nkwari dị n’Obukpa Nsụka inwe aṅụrị.

    Ha abụọ batara n’ebe ahụ n’ụbọchị 14 Juun, mana ka chi bọọrọ, ọ bụ naanị Emmanuel pụtara n’ime ụlọ e nyere ha abụọ.

    Mana ka ha jụrụ ya maka nwaanyị ahụ, ọ gwara ndị nchekwa ụlọ oriri na nkwari ahụ na nwaada ahụ pụọla.

    Akụkọ kwuru na ọ bụzị n’ụtụtụ 15 Juun ka ndị na-eficha ụlọ chọpụtara ozu nwada ahụ ebe nwoke ahụ zoro ya.

    Kemgbe ahụ, ndị uweojii na-esi imi n’ala ị chọpụta nwata nwoke ahụ mere ihe ahụ.

    Ọ bụzị ama gbara ha were gaa na “hostel”ụmụakwụkwọ Mahadum Nsụka ebe ndị uweojii nọrọ nwụchie ya abalị abụọ nke ọnwa Julaị.

    Oge ndị uweojii na-agba ya ajụjụ ọnụ, nwata nwoke ahụ kwuru na ọ bụ maka mmekọahụ mere ka ya na nwagbọghọ ahụ jiri lụba ọgụ tupu o were aka tọgbuo ya.

    Kọmishọna ndị uweojii Enugwu steeti bụ Bitrus Giwa kelere ndị ọrụ ya maka ijide nwoke ahụ.

    Ọ gara n'ihu dọọ ndị nne na nna nakwa onye ọbụla na-elekọta ụmụaka aka na ntị ka ha tinye anya n’ala ị chọpụta ụdịrị enyi nwa ha nwere.

  12. Ọnụọgụgụ mmadụ idemmiri gburu na Texas akarịala 100

    Ndị otu na-achọ mmadụ na ndị nnapụta ka na-awagharị n'akụkụ mmiri nke apịtị juru dịka mmiriozuzo na egbe eluigwe na-eyi mpaghara ahụ egwu

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị otu na-achọ mmadụ na ndị nnapụta ka na-awagharị n'akụkụ mmiri nke apịtị juru dịka mmiriozuzo na egbe eluigwe na-eyi mpaghara ahụ egwu

    Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n’oke idemmiri mere na mpaghara etiti Texas nke mba Amerịka n’ụbọchị Fraịde 4 Julaị 2025 akarịala otu narị dịka mmadụ ole amabeghị ọnụọgụgụ ha ka na-efu efu.

    Ndị otu na-achọ mmadụ na ndị nnapụta ka na-awagharị n'akụkụ mmiri nke apịtị juru dịka mmiriozuzo na egbe eluigwe na-eyi mpaghara ahụ egwu, mana olileanya na-ebelata maka ịchọta ndị ọzọ dị ndụ dịka o rugoro abalị anọ ka ọ dachi ahụ gachara.

    Cheta na e nwere ogige Camp Mystic, ebe ọtụtụ ụmụnwaanyị Ndị Kraịst nwere ọgbakọ mgbe ọdachi ahụ mere, mana e kwupụtala na ihe ruru ụmụagbọghọ iri abụọ na asaa na ndị ọrụ so na ndị nwụrụ anwụ.

    Ụmụagbọghọ iri na otu onye ndụmọdụ n’ogige ahụ ka na-efu.

    Mana obi ọchịchị mba Amerịka White House jụrụ aro na mbelata mmefu ego na National Weather Service (NWS) nwereike igbochi nzaghachi ọdachi ahụ.

  13. Amerịka ekwupụtala ọnụego ọhụrụ maka ụfọdụ mba ma gbuo oge itinye ụtụisi dị elu

    Onyeisiala Trump kwupụtara maka ụtụisi pasentị 25% na ngwaahịa ndị na-esi na Japan na Saụt Korea na-abata na mba Amerịka

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Trump kwupụtara maka ụtụisi pasentị 25% na ngwaahịa ndị na-esi na Japan na Saụt Korea na-abata na mba Amerịka

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump egbuola oge itinye tarifu dị elu na mbubata Amerịka mana ọ gara n’ihu degara mba iri na anọ gụnyere Japan na Saụt Korea akwụkwọ na-egosipụta ọnụego chere ngwaahịa niile si mba ndị ahụ abata Amerịka.

    Nke a na-eme dịka nkwụsịtụ nke abalị iri itoolu nke obi ọchịchị mba Amerịka bụ ‘White House’ mere banyere nnukwu ụtụisi e tinyere na mbubata niile ga-agwụcha n’izu a.

    Onyeisiala Trump kwupụtakwara maka ụtụisi pasentị 25% na ngwaahịa ndị na-esi na Japan na Saụt Korea na-abata na mba Amerịka ma kesara ndị isi na mba ụwa akwụkwọ ozi ịdọ aka na ntị banyere ụtụisi ga-amalite site n’abalị mbụ nke ọnwa Ọgọst.

    Cheta na mba Amerịka kwuru na ụtụisi ọhụrụ nke mba ụwa ga-amalite 9 Julaị dịka mba ahụ kwụsịtụrụ ya.

  14. Ụtụtụ ọma Igbo ndị ọma

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tuzde 8 Julaị, 2025 dịka anyị na-ewetara gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile.

    Dịka ị na-esonyere anyị, ka ụbọchị taa wete ụtụtụ ihe ọma na ndụ gị.

    Daalụ!

  15. Etu ndị ọrụ gbatagbata si zọọ ndụ igwe mmadụ ebe ọkụ na-agba n’Abịa steeti

    Ebe ọkụ gbara
    Nkọwa foto, Ebe ọkụ gbara

    Ngwa ngwa ndị ọrụ mmenyụ ọkụ n’Abia steeti bịara ebe ọkụ na-agba n’ime abalị zọrọ igwe mmadụ nakwa ọtụtụ akụnụba.

    Nke a bụ n'agbanyeghị na ọkụ ahụ gbara ma mebie ihe n’ebe Health Centre dị nso na World Bank House dị n’Umuahia, Abịa steeti.

    Ọ bụ ụlọ olili na nkwari a na-akpọ ‘Exclusive Bar’ bụ ebe o bidoro ma na-achọ ịgafe n’ụlọ ndị ọzọ ọkachasị ụlọọgwụ dị nso n’ebe ahụ.

    Mana ọ bụ etu ndị ọrụ gbatagbata na-emenyụ ọkụ si bịa ngwangwa mere na ọkụ ahụ abanyeghị n’ulọọgwụ dị nso.

    Dịka ndi mmadụ na-eto ndi ọrụ gbatagbata ahụ maka ịzọ ndụ, Gọọmenti Abịa steeti na mbụ na-ekwe nkwa banyere nchekwa ndụ na akụnụba.

  16. Gọọmenti Enugwu steeti ewepụtala ụlọọrụ njem ụgbọelu ha kpọrọ Enugu Air

    Enugu Air

    Ebe foto si, Sreen grab

    Nkọwa foto, Enugu Air

    Gọọmenti Enugwu steeti ebidola ụlọọrụ njem ụgbọelu ọhụrụ a na-akpọ Enugu Air.

    Ha mere emumu e jiri malite ụlọọrụ ahụ n'ụbọchị Monde 7, Julaị 2025.

    Aka n’achị steeti ahụ bụ Peter Ndubuisi Mbah kọwara Enugu Air dịka nke ọhanaeze.

    Enugu air

    Ebe foto si, Sreen grab

    Nkọwa foto, Enugu air

    N’edemede otu onye n'ime ndị na-arụrụ gọọmenti Enugwu steeti ọrụ na ngaraba mgbasa ozi bụ Dan Nwomeh dere ka ọ sịrị na igwe mmadụ nabatara atụmatụ Enugu Air.

  17. Ndị uweojii anwụchiela nwoke ji ara nwaanyị n'Anambra steeti

    Nwoke ahụ gwara ndị uweojii n’ọbụ ara ehi ka ya bu

    Ebe foto si, Getty Images/Anambra State Police Command

    Nkọwa foto, Nwoke ahụ gwara ndị uweojii n’ọbụ ara ehi ka ya bu

    Ndị uweojii Anambra steeti anwụchiela otu nwoke aha ya bụ Samuel Eze ka o ji ara nwaanyị amaghi onye ọ bụ.

    E kwuru na ọ bụ ama otu ndị ọrụ nchekwa obodo ‘Anambra Vigilante’ gbara ka ndị uweojii jiri gaa n’okporoámá Jude Onyekwere dị n’Awada Obosi nke Anambra steeti, ebe aka nọrọ kpara nwoke ahụ gbara afọ iri abụọ na ise.

    Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midịa, gosiri ka onye omekome ahụ siri buru ara nwaanyị ahụ n’aka were na-asa ndị uweojii ajụjụ.

    Nwoke ahụ gwara ndị uweojii n’ọbụ ara ehi ka ya bu mana onye ọbụla hụrụ na ọ bụ ara mmadụ.

    Mana ka ndị uweojii ji aka ike na-agba ya ajụjụ ọnụ iji mata onye nwe ara ahụ, nwoke ahụ malitere ime ka ‘onye ọrịa isi mgbaka’.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga gwara ndị Obosi nakwa ndị Anambra niile ka ha dere jụụ ma nye ndị uweojii ohere ị chọpụta ebe ara ahụ siri pụta.

  18. A maala nwaanyị ikpe maka iji nri ero ọjọọ dị gbuo mmadụ atọ

    Erin Paterson

    Ụlọikpe kwuru na ikpe mara otu nwaanyị maka iji ero ọjọọ sie nri o jiri nyegbuo ndị ezinaụlọ ya mmadụ atọ ,ebe onye nke anọ n'akwa ọrịa n'ụlọọgwụ.

    A mara Erin Patterson gbara afọ 50 ikpe maka ịgbụ mmadụ atọ nakwa ịgbalị igbu otu onye ọzọ dịka o ji ero oke rie ọnwụọ siere ha nri ehihie n'ụlọ ya dị na Leongatha, Victoria.

    Ndị ọgọọ ya ;Don na Gail, nakwa nwanne di ya nwaanyị bụ Heather Wikkinson nwuru n'ime abalị ole na ole.

    Mana di Heather gbakere ka ọ nọchara n'ụlọọgwụ ogologo n'ọnọdụ ọ-dị ndụ-ọnwụ-ka-mma..

    Dịka ya bụ ikpe na-aga, ụlọikpe nụrụ ebubo na Patterson ma ama tinye erọ ọjọọ na nri ahụ ma zoo ihe aka ebe. E kwukwara na o nweghị ihe doro anya mere o jiri mee nke a.

    Mana Patterson na-ekwu na ọ maghị ama tinye ero na-egbu mmadụ na nri.

    Ero

    Ebe foto si, Getty Images

  19. Ndị Kenya na-akwado ngagharịiwe maka ncheta afọ 35 kemgbe nke ngagharị Saba Saba

    Saba Saba bụzi ihe eji ebu agha maka nnwere onwe nke ọchịchị onyekwuoucheya na Kenya
    Nkọwa foto, Saba Saba bụzi ihe eji ebu agha maka nnwere onwe nke ọchịchị onyekwuoucheya na Kenya

    Ndị Kenya na-akwado ngagharịiwe maka ncheta afọ iri atọ na ise kemgbe mba ahụ nwere ngagharị nke Julaị 7, a maara nke ọma dịka Saba Saba.

    Ngagharị Saba Saba mere mgbe ndị ndu mmegide mara ọchịchị otu ndọrọndọrọ nke Onyeisiala Daniel arap Moi aka, dịka ha kpọrọ oku ka mba ahụ nwee ọtụtụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị ndị ọzọ.

    Mana gọọmentị zaghachiri ha n’ike dịka e jidere ọtụtụ ndị ngagharịiwe, mekpaa ha ọnụ ma gbuo ọtụtụ.

    Kemgbe ahụ, Saba Saba bụzi ihe eji ebu agha maka nnwere onwe nke ọchịchị onyekwuoucheya na Kenya.

    Cheta na mba Kenye n’oge adịbeghị anya, nwere ngagharịiwe nke kpalitere ọnwụ ihe ruru mmadụ iri na isii ebe mmadụ narị anọ merụrụ ahụ na 25 Juun 2025.

  20. Netanyahu na-aga Amerịka dịka Onyeisiala Trump na-agba mbọ ka Izrel kwenye na nkwekọrịta nkwụsị agha Gaza

    A na-enwe olileanya na-aga ekwupụta nkwekọrịta nkwụsị agha Gaza ọhụrụ

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, A na-enwe olileanya na-aga ekwupụta nkwekọrịta nkwụsị agha Gaza ọhụrụ

    Praịm Minista mba Izrel Benjamin Netanyahu na-aga mba Amerịka izuta Onyeisiala Donald Trump n’obodo Washington.

    Nke a na-eme dịka a na-enwe olileanya na-aga ekwupụta nkwekọrịta nkwụsị agha Gaza ọhụrụ dịka ọ gachara ọnwa iri abụọ na otu agha ahụ malitere.

    Cheta na Onyeisiala Trump gwara ndị ntaakụkọ na ya na Netanyahu 'kwụsiri ike' maka ịkwụsị esemokwu ahụ ma kwuo na-aga enwe nkwekọrịta n’izu a.

    Ọzọ, mkparịtaụka na-aga n’etiti Izrel na Hamas banyere nkwụsị ịkwa mgbọ abalị iri isii na nkwekọrịta ịtọhapụ ndị ejieji nke mba Amerịka na-akwado.