Kanada akwadoola ịnabata Palestine dịka mba nweere onwe ya

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Julaị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Oke okpomọku ebutela ọkụ ọgbụgba na mba Greece, mebie ihe ndị mmadụ

    Anwụrụ ọkụ na ire ọkụ na-ebili ka ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ na-agba mbọ ịbelata ọkụ dara na mpaghara Krioneri n'Atens.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Anwụrụ ọkụ na ire ọkụ na-ebili ka ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ na-agba mbọ ịbelata ọkụ dara na mpaghara Krioneri n'Atens.

    Ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ na-aga n’ihu ịbeleta ọkụ na-agba na mpaghara dị iche iche na mba Greece.

    Oke okpomọkụ butere ọkụ ọgbụgba ahụ nke na-emebisi ihe ndị mmadụ kemgbe ụbọchị Satọde, Julaị 26, 2025.

    Onye na-ekwuchitere ndị ọru mgbanyu ọkụ bụ Vasilios Vathrakoyannis si na kemgbe abalị Satọde ruo ụbọchị Sọnde na ndị ọrụ ha nọ na-agbambọ ịhụ na ha kwụsịrị ọkụ na-agba.

    Mpaghara ebe ndị ọkụ na-agba bụ Islands nke Kythira na Evia, dika Mịnịsta na-ahụ maka nsogbu ihu igwe na nchekwa obodo, Giannis Kefalogiannis si kwuo.

    Na-aka nke ọzọ, ndị agbata obi mba Greece bụ Turkey na-enwekwa ọdịka nsogbu ọkụ ọgbụgba a.

  2. Mba Kambodịa na Taịland ekwetala izute na Malaysia maka ịkwụsị ịkwa mgbọ dị n’etiti ha

    Ndiagha Kambodịa na-akụkụ okeala na-ese okwu n'etiti ha na Taịland

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ndiagha Kambodịa na-akụkụ okeala na-ese okwu n'etiti ha na Taịland

    Kambodịa na Taịland ga-enwe mkparitụka na mba Malaysia n’ụbọchị Mọnde 28 Julaị, 2025.

    Mkparịtaụka ahụ bụ maka ime ka udo dị n’etiti ha dịka mba abụọ ahụ na-akwa mgbọ n’ihi ndọrọ ndọrọ okeala na-esere ha okwu.

    Kambodia na Tailand bidoro ịkwa mgbọ kemgbe ihe dịka abalị anọ garaaga ruo ugbua.

    Taịland kwuru sị n’ụbọchị Sọnde 27 Jualaị 2025 na Praịm Mịnịsta Phumtham Wechayachai ga-edu ndị ọrụ gọọment ha gaa mkparitaụka ahụ dịka Praịm Mịnịsta mbaKambodia bụ Hum Manet ga-anọkwa na nzukọ ahụ

    Nke a na-eme dịka Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump kpọrọ ndị isiala mba abụọ ahụ oku ka ha kwụsịtụ ikwa mgbọ.

  3. Mba Jọdan, UAE ebidola ị jiri ụgbọelu na-ekesa nri na Gaza

    Ụgbọelu na-atụsa nri na Gaza

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ụgbọelu na-atụsa nri na Gaza

    Mba abụọ bụ Jọdan na UAE ebidola ijiri ụgbọelu ha na-ekesa nri n’ime Gaza ugbua, .

    Ha na-eme nke a site na-eji ụgbọelu na-atụdata nri n’ala ebe ndị mmadụ juru.

    Ihe nke a bidoro na nkeji awa ole ma ole gara-aga dịka ndị ọrụ Emirati si kwuo.

    Cheta na nke a na-eme dịka mba Izrel kwetere ịkwụsịtụ ọgụ ma nyekwa ohere ka ndị ọrụ gbatagbata bubata ihe enyemaaka na Gaza.

  4. Amachiela onye ndu otu mmegide Kamerun ịma onyeisiala Biya aka na ntuliaka

    Kamto bụ onye gbara onye nke abụọ na mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere n’afọ 2018

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Kamto bụ onye gbara onye nke abụọ na mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere n’afọ 2018

    E wepụla aha onye ndu otu mmegide bụ Maurice Kamto na ndepụta aha ndị ga-eme ntuliaka n’ọkwa onyeisiala nke 12 Ọktọba.

    Akụkọ kwuru na ọ bụ naanị aha iri na atọ n’ime aha mmadụ iri asatọ na atọ e zigara ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka nke mba ahụ Elecam ka a nabatara.

    Cheta na Kamto bụ onye gbara onye nke abụọ na mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere n’afọ 2018 nke e boro ebubo na nrụrụaka dị na ya.

    Mana Nwaamadị ahụ ekwubeghị ihe ọbụla banyere mkpebi ahụ.

    Chetakwa na Paul Biya, dị afọ iri itoolu na abụọ, bụ onyeisiala kacha ochie n'ụwa, ka e tinyere n’akwụkwọ ndepụta ndị ga-azọ ọkwa onyeisiala, ma bụrụ onye na-achọ ọkwa onyeisiala nke ugboro asatọ.

    N'ịzaghachi oku a na-akpọ ka ọ pụọ n’ọchịchị, ọ na-ekwu na ọ ka nwere ọtụtụ ihe ọ ga-enye ndị Kamerun n'agbanyeghị na ọ nọ n'ọchịchị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri na anọ.

  5. Ọkụ oke ọhịa na-echere mba Greece aka mgba, na-achụpụ ndị bi nso n’Athens

    Greece na-arịọ enyemaka otu mba Yurop iji luso ọkụ na-agbasa mba ahụ ọgụ

    Ebe foto si, YANNIS KOLESIDIS/EPA/Shutterstock

    Nkọwa foto, Greece na-arịọ enyemaka otu mba Yurop iji luso ọkụ na-agbasa mba ahụ ọgụ

    Mba Greece na-ebu agha megide ọkụ oke ọhịa n’gburugburu mba ahụ dịka ndị ọrụ malitere ịkpọpụ ndị bi na mpaghara ọkụ siri ike nke dị naanị 30km (kilomita 18.6) n'ebe ugwu nke isi obodo Athens.

    Isi osisi na-ere ọkụ na-agazu mapaghara etiti Athens, ka Greece na-arịọ enyemaka otu mba Yurop iji luso ọkụ na-agbasa mba ahụ ọgụ.

    Mana ndị ọrụ gbatagbata na-ọrụ agbanyeghị oke okpomọkụ.

    A na-atụ anya na okpomọkụ ga-eru 44C (111.2F) na Sọnde, ebe na-atụkwa anya na oke okpomọkụ ga-adịgide ọtụtụ ụbọchị n’izu ụka.

    "Anyị nwere ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ merụrụ ahụ, tinye ndụ mmadụ n'ihe ize ndụ, agbaala ihe onwunwe ndị mmadụ ọkụ, ma bibie mpaghara ọhịa," Minista na-ahụ maka Climate Crisis and Civil Protection Giannis Kefalogiannis kwuru.

  6. Izrel ekwupụtala 'kwụsịtụ' ịlụ ọgụ n’akụkụ Gaza wee kwuo na ọ ga-emeghe ụzọ enyemaka

    Opekatampe mmadụ otu narị na iri abụọ na asaa anwụọla site n’erighị nri na-edozi ahụ kemgbe agha malitere

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Opekatampe mmadụ otu narị na iri abụọ na asaa anwụọla site n’erighị nri na-edozi ahụ kemgbe agha malitere

    Mba Izrel ekwupụtala ‘nkwụsịtụ’ ọrụ ndịagha n’akụkụ Gaza dịka o si n’ikuku ebubata ihe enyemaka na Gaza.

    Ndịagha nchekwa Izrel (IDF) na-ekwu na a na-emepe “ụzọ ndị mmadụ ahọpụtara” maka ụgbọala ụlọọrụ UN iji “gbaghaa ebubo ụgha na ha kpachapụrụ anya” aka ndị Gaza agụụ.

    Cheta na ndị ọchịchị ọdịda anyanwụ mba ụwa na-arụgide Izrel dịka ndị ọrụ enyemaka na-adọ aka na ntị maka oke agụụ na-ejide ndị mmadụ na Gaza.

    Ọzọ, ụlọọrụ enyemaka katọrọ Izrel maka atụmatụ isi n’ikuku ebubata ihe enyemaka na-ekwu n’ole ha ga-ebubata agaghị ezu ebe ndị Gaza na-atụ egwu n’usoro ahụ nwereike inwe ihe ize ndụ.

    Chetakwa na opekatampe mmadụ otu narị na iri abụọ na asaa anwụọla site n’erighị nri na-edozi ahụ kemgbe agha malitere dịka ndị Mịnịstrị ahụike nke ndị Hamas na-ahụ maka ya siri kwuo.

    Ndị ọrụ enyemaka na-adọ aka na ntị maka oke agụụ na-ejide ndị mmadụ na Gaza

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ndị ọrụ enyemaka na-adọ aka na ntị maka oke agụụ na-ejide ndị mmadụ na Gaza
  7. Ụtụtụ ọma, ụmụ Igbo

    Nnọọ n’ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde 27 Julaị.

    Anyị ga na-ewetere unu akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Biko sonyekwara anyị n'akara Facebook, Instagram na ọbaozi WhatsApp Channelụ anyị.

    Ka Chineke zaa ekpere anyị niile taa.

    Daalụ!

  8. Ọkụ latrik agaghị adịcha n'ụfọdụ ebe na Legọs ruo izuụka atọ

    Ụfọdụ akụrụngwa na-enye ọkụ na legọs

    Ebe foto si, Getty Images/Pius Utomi Ekpei

    Nkọwa foto, Ụfọdụ akụrụngwa na-enye ọkụ na legọs

    Ufọdụ ndị bi na mpaghara Legọs dị iche iche agaghi enwe ọkụ latrik otu ha kwesịrị ruo ụbọchị iri abụọ na ise maka oru mmezi a na-eme n'akụrụngwa na-enye ọkụ nke a na-akpọ 'Transmission line'.

    Ụlọọru na-ahụ maka ịnye ọkụ, Ikeja Electric Plc mere nkwupụta a n'akara soshial midia X ha dịka ha kọwara na ụlọọru na-enyefe ọkụ bụ Transmission Company of Nigeria (TCN) chọrọ imezi akụrụngwa ọkụ ha nọ na mpaghara Omotosho – Ikeja West 330kV transmission line, n’ihi nke a ọkụ agaghị adicha site na Mọnde 28 Julai ruo Ọgọst 21, 2025.

    Lee kwa ihe enweghị ọkụ dịka na okporo ụzọ Legọs n'abali

    Ebe foto si, Getty Images/Pius Utomi Ekpei

    Mpaghara dị iche iche ọ ga-emetuta gunyere; Ojodu, Oke-Ira, Agidingbi, Omole Phase 1 & 2, Iju, Berger, Magodo (Phase 1 & 2), ụfọdụ mpaghara Ketu, Oregun, Ojota, ụfọdụ mpaghara Agege, Ifako, Abule Egba, Ojo, Ikeja, Oshodi, Ayobo, Alimosho, Ogba, Alausa na Ejigbo.

    N’aka nke ọzọ, ụlọọrụ Eko Electricity Distribution Company, EKEDC kwupụtakwara na ndị ahia ha ga-enwekwa ụdịrị nsogbu a n’ihi mmezi ahụ TCN na-ebido ime mana ha ekwughị mpaghara ebe ndị ọ ga-emetụta.

    EKEDC na-enye ọkụ na mpaghara Legọs Island, Victoria Island, Lekki, Apapa, Festac nakwa Surulere.

  9. E wepụla aha Kamto na ndị ga-azọ ọkwa Onyeisiala mba Kameroon

    Maurice Kamto mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu mgbe ọ bara na pati MANIDEM

    Ebe foto si, Getty Images

    Dịka Kameroon na-akwadọ ime ntuliaka ọkwa onyeisiala n'ọnwa Ọktoba afọ 2025, ụlọọrụ na-ahụ maka nhazi ntuliaka bụ ELECAM ewepụla aha Maurice Kamto bụ onye ndu otu pati na-achọ ịnapụ pati na-achị ugbua ọkwa n’akwụkwọ ndị ga-azọ ọkwa onyeisiala na mba ahụ.

    Site n’akwụkwọ ha wepụtara na Satọde 26 Julaị, 2025, naanị mmadụ iri atọ ka a nabatra aha ha n’ime iri asatọ na atọ chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala.

    Maurice Kamto na-ekele ndị na-akwado pati ha mgbe ọ gwachara ndị ntaakụkọ okwu

    Ebe foto si, Getty Images

    O nweghị onye ma ihe mere e ji wepụ aha ya mana mkpebi ụlọọru na-ahazi ntuliaka bịara dịka Kamto kwupụtara ọpụpụ ya site na pati Cameroon Renaissance Moverment (CRM) ma banye na pati MANIDEM nke mere ka ọ buru onye ga-eji aha pati ahụ zọọ ọkwa onyeisiala.

    Akụkọ kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ na-ebo ebubo na e wepụrụ aha Kamto ka ọghara ima onyeisiala Biya aka na ntuliaka onyeisiala na-abịa n'ihu.

  10. Mba Kambodịa akpọọla oku ka a kwụsị ịkwa mgbọ dị n'etiti ha na mba Taịland

    Kambodịa na Taịland na akwakọrita mgbọ n'ihi okeala

    Ebe foto si, Getty Images

    Kambodịa akpọọla oku ka a kwụsịtụ ịkwa mgbọ dị n'etiti ha na mba Taịland n’ihi ndọrọ ndọrọ okeala dịka mmadụ iri atọ anwụọla kamgbe ọgụ ha malitere n'ụbọchị Tọzde 24 Julaị, 2025.

    Onye na-anọchiteanya mba Kambodịa n'otu United Nations bụ Chhea Keo kwuru na obodo ya chọrọ udo.

    Mmadụ rụrụ puku mmadụ abụọ n’ime mba abụọ ndịa n’alụ ọgu agbapụla n’ụlọ ha

    Ebe foto si, Getty Images

    Na-agbanyeghị nke a, Mịnịsta na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi na Taịland bụ Maris Sangiampongsa nọọrọ n’ubọchị Satọde 26 Julaị, 2025 kwuo na Kambodịa ga-ezipụta ezigbo mmasi na ha chọrọ ihu ka udo chịa tupu ọgụ ahụ akwụsị n’etiti ha.

    Kamgbe nsogbu okeala a bidoro, mmadụ rụrụ puku abụọ n’ime mba abụọ ndị a ahapụla ebe obibi ha ma gbaa ọsọ ndụ.

  11. O nweghi mgbe anyị tinyere afọ 12 dịka afọ e ji abanye ụlọakwụwkọ Sekọndịrị - Mịnịstrị Agụmaakwụkwọ

    Ụmụakwụkwọ nọ n'ụlọakwụkwọ ha yi uwe ọcha na uwe ndụndụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Mịnịstri na-ahụ maka agụmaakwụkwọ na Naịjirịa ekwuola na akụkọ ahụ kwuru na gọọmentị tinyere afọ iri na abụọ dịka afọ nwata nwereike iji banye n’ụlọakwụkwọ Sekọndịrị bụ asị ọcha.

    N’ozi ha wepụtara n’ụbọchị Fraịde, ọnụ na-ekwuru mịnịstrị ahụ b Folashade Boriowo kwuru “akụkọ ahụ abụghị eziokwu.”

    “Iji mee ka o doo anya, afọ pekarịrị mpe iji banye n’ụlọakwụkwọ Sekọndịrị bụ afọ iri,” ka o kwuru. “Dịka iwu si kwuo o nweghi nwata ọbụla na-agụcha ụlọakwụkwọ praịmarị n’okpuru afọ iri.”

    Ozi ahụ gbakwụnyere na akụkọ ahụ esighi n’aka ụlọọrụ iwu kwadoro, na Mịnịsta na-ahụ maka agụmaakwụkwọ bụ Tunji Alausa adịla mbụ kwuo na afọ nwata akwụkwọ nwereike iji banye mahadum na Naịjirịa bụ afọ iri na isii.

  12. Ụlọelu ogogo atọ adaala n'Umuahia ma merụọ ọtụtụ mmadụ ahụ

    Ụlọelu ogogo atọ dara n'Umuahia Abia steeti

    Ebe foto si, Chukwuemeka Igu

    Ụlọelu ogogo atọ adaala n'okporoụzọ Olokoro 'Federal Low Cost Housing Estate' dị n'Umuahia isiobodo Abia steeti n'isi ụtụtụ Satọde 25 Julaị, 2025.

    O nweghị ndị nwụrụ n'ụlọ a dara kama ndị hụrụ mgbe ọ dara si na ndị bi n’ụlọ dị ya n'akụkụ merụrụ ahụ maka na ọ dabatara n'ebe ha mana a kpọrọla ha gaa n'ụlọọgwụ.

    Mgbe ndị mmadụ gbakọtara na-ele ụlọ ahụ dara ada

    Ebe foto si, Chukwuemeka Igu

    Akụkọ kwuru na ọnye nwe ụlọ ahụ bụ Ikechi Emenike, nke zọburu ọkwa gọvano Abia Steeti n'aha APC.

    Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mmepe obodo a kpọrọ 'Umuahia Development Control Authority' si na ha amalitela ime nnyocha ihe mere ụlọ ahụ jiri daa.

  13. UN adọọla aka na ntị maka oke agụụ na-abawanye na Gaza dịka UK na-akwado inye enyemaka

    Ndị bu akpa nri ntụọka

    Ebe foto si, EPA

    Otu UN na-ahụ maka nri ekwuola na ọtụtụ mmadụ na Gaza na-anọ ọtụtụ ụbọchị na-enweghị nri.

    Ụlọọrụ World Food Programme (WFP) adọọla aka na ntị na oke agụụ na-akwanye njọ dịka ha kwuru na ụmụnwaanyị na ụmụaka ruru 90,000 nọ n’ọrịa ma chọọ nleta.

    A na-adọ aka na ntị maka oke agụụ n’ime izuụka ole na ole gara aga ebe ụlọọrụ enyemaka na-akpọ oku ka mba Izrel nye ohere ka enyemaka bata.

    Na nzaghachi, Izrel kwuru na ha agaghị egbochi enyemaka ọbụla si mba ofesi abata Gaza n’ụbọchị ole na ole na-abịa.

    N’aka nke ọzọ, Praịm Mịnịsta mba Uk bụ Keir Starmer kwuru na UK ga-enye ngwa enyemaka.

    Ndị bu akpa nri ntụọka

    Ebe foto si, EPA

  14. Ụtụtụ ọma ndị ọma

    Nnọọ n;ọgbakọ BBC News Igbo.

    Anyị abịala iwetara gị akụkụ niile dị mkpa si Naịjịrịa nakwa ụwa niile.

    Gaa n'ihu sonyere anyị na Sohal midia anyị nakwa Whatsapp chanelụ anyị.

    Ndewo..

  15. A na-ekpe onye bụbu Onyeisiala mba Congo ikpe maka ịgba ọchịchị mgba okpuru

    Onye bubu onyeisiala DR. Congo Joseph Kabila

    Ebe foto si, Getty Images

    Ikpe ebubo ịgba ọchịchị mgba okpuru e boro onye bụbu Onyeisiala mba D.R Congo bụ Joseph Kabila bidoro n'ụlọikpe ndịagha dị n'isiobodo ha bụ Kinshasa.

    Mgbe ọtụtụ awa gachara, a kwụsịrị ikpe ahụ malitere n'ụbọchị Fraịde 25 Julaị, 2025 ma tinye ya ngwụcha ọnwa Julaị dịka ndị ọkaiwu rịọrọ ka e nye ha oge iji nyochaa akwụkwọ gbasara ikpe ya.

    Onyeisiala Félix Tshisekedi boro ya ebubo na ọ bụ ya kwadoro ndị otu agha nnupụisi a na-akpọ M23 Rebels.

    Ebubo ndị ọzọ e boro ya gunyere, ịgbu mmadụ nke jikọtara ebubo nkwado o nyere ndị otu agha nnupụisi M23 Rebels nakwa ịdina nwaanyị n’ike.

    Onye bubu onyeisiala DR. Congo Joseph Kabila

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onye bubu onyeisiala DR. Congo Joseph Kabila
  16. A gwala mba Izrel ka ha wepụ mgbochi ha tinyere na mbubata ihe enyemaka na Gaza

    Ndị mmadụ nọ na Gaza na-azọ inwete ihe enyemaka

    Ebe foto si, Reuters

    Mba Germany, France na Briten akpọkuola Izrel ka ha wepụ ihe mgbochi ha tinyere na mbubata enyemaka na Gaza ozugbo dịka odeakwụkwọ otu United Nations katọrọ nkiti ndị mbaụwa gbara n'ahụhụ ndị mmadụ na-ata na Gaza.

    N'abalị abụọ gara aga, mmadụ itoolu nwụrụ nke na-eweta ọnọgụgụ ndi nwụrụ n’ihi erighi ezigbo nri ro otu narị na iri abụọ na abụọ, dịka ụlọ ahụike Gaza si kwuo.

    Izrel ekwuola na ha ga-ahapụ ndị mba ofesi ka ha si n’ụgbọelụ webata ihe enyemaka nye ndi bi na mpaghara Gaza.

  17. Peter Obi asaala Gọvanọ Okpebholo maka ịnara ya ikike tupu ọ bata Edo Steeti

    Peter Obi ji aha Labour Pati zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023

    Ebe foto si, Getty Images

    Peter Obi bụ onye ji aha Labour Pati zọọ ọkwa onyeisiala na ntulaiaka afọ 2023 azaghachila aka na-achi Edo steeti bụ Monday Okpebholo maka ihe o kwuru banyere ọbịbịa ya na steeti ahụ.

    Obi kwuru na mgbe ọbula o nwere ihe ọ chọrọ ime n'Edo Steeti na ọ ga-abịa ọzọ, na egwu anaghị atụ ya banyere ihe o kwuru.

    Obi bụbu Gọvanọ Anambra steeti kwuru nke a mgbe ndi ntaakụkọ na-agba ya ajụjụọnu dịka ọ gara n’ụlọakwukwọ Christ the King College (CKC) dị n'Onitsha bụ ebe ọ gụrụ akwụkwọ.

    Mgbe a jụrụ ya banyere egwu Okpebholo yiri ya, ọ si na ụjọ anaghị atụ ya maka na ọtụtụ ndị mmadụ na-ezitere ya ozi ihe iyi egwu mgbe ọbula dika o kwuru na o nwere ihe di mkpa o kwesịrị ị ga mee n'Edo steeti, na ọ ga-aga.

    Obi gara CKC Onitsha, ebe ya na ndị ọzọ gụrụ akwụkwọ ebe ahụ nyere ụlọakwụkwọ ahụ onyinye nde naịra iri ise.

    Cheta na Gọvanọ Monday Okpebholo nọọrọ n’ụbọchị Fraịde 18 Julaị, 2025 oge ọ nabatara ndị si patị PDP bata APC machie Peter Obi ịbata na steeti ahụ ma ọ bụrụ na ọ nataghị ya ikike.

  18. A nwụchiela onye otu na-atụ mgbere ụmụaka ma zọpụta ụmụaka 11 n’Anambra Steeti

    Ụmụaka ahụ a zọpụtara

    Ebe foto si, Anambra State Police Command

    Nkọwa foto, Ụmụaka ahụ a zọpụtara

    Ndị uweojii Anambra steeti na ndị uweojii Adamawa steeti emeela nnyocha ma nwụchie ndị otu na-atọrọ ma na-atụ mgbere mmadụ.

    Onu na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kwuru na mbọ ahụ ha gbara bụ nke mere ka ha nwụchie out nwaanyị aha ya bụ Uche Okoye gbara afọ 43, ma zọpụta ụmụaka iri na out gụnyere ụmụnwoke ise na ụmụnwaanyị isii n’obodo Uragu dị n’okpuru ọchịchị Nnewi, Anambra Steeti.

    E kwuru na nwaanyị ahụ ha nwụchiri ka a na-eyo eyo na ọ bụ onye na-ahụ maka ntọrị nakwa ịtụ mgbere ụmụaka ahụ na steeti abụọ ahụ.

    Ikenga kwuru na nnyocha ha mere gosiri na a na-atọrọ maọbụ zuru ụmụaka n’Adamawa Steeti ma resi ha n’aka ndị na-achọ nwa n’Anambra steeti. E kwuru na e rere ụmụnwoke out nde na puku narị ise (N1.5m) ebe e rere ụmụnwaanyị puku narị asatọ (800,000).

    E nyefeela ụmụaka ahụ a zọpụtara dị afọ atọ ruo afọ isii n’aka osote kọmishọna ndị uweojii Adamawa bụ Shuaibu Wara iji hụ na a kpọnyere ha ezinaụlọ ha.

    Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii kwuru na ha na-agba mbọ ịnwụchi ndị otu ahụ gbara ọsọ.

    Kọmishọna ndi uweojii Anambra Steeti bụ Ikioye Uche Orutugu dọrọ nne na nna ọbụla chọrọ ikute nwa aka na ntị ma gwa ha ka ha soro Usoro iwu kwadoro iji mee nke a.

  19. Praịm Minista UK Onyeisiala Macron ga-enwe mkparịtaụka banyere steeti Palestinia

    Praịm Minista UK Keir Starmer na Onyeisiala Fransi bụ Emmanuel Macron

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Fransi Emmanuel Macron ekwuola na Fransi ga-amalite ịhụta Palestinia dịka Steeti kwụụrụ onwe ya malite n’ọnwa Septemba.

    Nke a pụtara na Fransi ga-abụ mba mbụ n’otu mba G7 ga-eme nke a.

    Ndị ọchịchị Palestinia kwuru na ha nabatara atụmatụ a mana Praịm Minista Izrel bụ Benjamin Netanyahu na odeakwụkwọ gọọmenti Amerịka bụ Marco Rubio katọrọ atụmatụ a.

    Praịm Minista mba UK bụ Keir Starmer na ndị isi mba Fransi na Jamini ga-enwe mkparịtaụka n’ekwentị dịka ndị omeiwu na-akwanye ya ọkụ ka ọ hụta Palestinia dịka steeti.

    Ngalaba UN bụ Unrwa kwuru na ọrụ na atụmatụ enyemaka na Gaza na-ada mba ebe ọnụọgụ ndị nwụrụ na-arịgo.

  20. Taịland ekwuola na esemokwu ha na Kambodịa nwereike ibute agha

    Ụgbọala ndịagha

    Ebe foto si, Getty Images

    Ọgụ dị n’etiti ndịagha mba Taịland na Kambodịa maka okeala abanyela abalị abụọ dịke Bangkok dọrọ aka na ntị m kwuo na ọgụ a nwereike ibuta agha.

    Akụkọ kwuru na mmadụ 16 anwụọla ebe e zigara ọtụtụ puku mmadụ n’ogige nchekwa dị n’akụkụ abụọ okeala ahụ.

    Ọgụ a malitere ụbọchị Tọzde bụ nke hụrụ mmalite esemokwu bidoro kemgbe afọ otu narị.

    Ka ọ dị ugbua, Amerịka, Chaịna, Ọstrelịa nakwa otu jikọrọ mba niile nọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ Eshia akpọọla oku ka ọgụ a kwụsị.

    Ụgbọala ndịagha

    Ebe foto si, Getty Images