Ụlọikpe atụọla onye bụbu minista mba ofesi mkpọrọ ọrụ ike maka nrụrụaka na Zambia

Ebe foto si, Anadolu Agency via Getty Images
Ụlọikpe atụọla onye bụbu minista mba ofesi na Zambia Joseph Malanji mkpọrọ afọ anọ ya na ịrụsi ọrụ ike maka nrụrụaka.
A mara Malanji ikpe maka ebubo asaa nke gụnyere inweta akụrụngwa na helikopta a na-enyo enyo na ọ bụ site na ego mpụ dịka ụlọọrụ mgbasa ozi steeti kwuru.
Onye bụbu odeakwụkwọ ego Fredson Yamba, a makọrọ ya na ya ikpe, nwetara mkpọrọ afọ atọ maka ịkwado ịnyefe ihe karịrị nde dọla asatọ $8m (£6m) n’aka ndị ọrụ nnọchi anya Zambia na Tọkị na-akọwapụtaghị uru ụgwọ ahụ bara.
Ụlọikpe mara ọtụtụ ndị bụbu minista n'ọchịchị onyeisiala Edgar Lungu ikpe maka mpụ dị iche iche, mana Malanji bụ onye kacha ewu ewu n'ime ha.




















