Ndị isi mpaghara Etiti Ọwụwa Anyanwụ na Yurop anabatala atụmatụ udo Gaza nke Trump

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Septemba 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Onyeisiala Trump ezutela Eze Charles na Windsor Castle

    Atụmatụ ndị e ji echekwa onyeisiala Trump na njem a dị oke ọnụahịa ruru ọtụtụ nde pounds nakwa ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa Secret Service ya na ọtụtụ puku ndị uweojii obodo.

    Ebe foto si, Reuters

    Eze Charles na nwunye ya ezutela Onyeisiala Trump na nwunye bụ Melania na Windsor Castle dịka ha mere ngagharị procession n’ogige ahụ.

    Onyeisiala Trump na Eze Charles nọ n’otu ụgbọala na ngagharị ahụ ebe Ezenwaanyị Camilla na Melania Trump nọ n’otu ụgbọala.

    Trump na-eme njem ugboro abụọ na UK iji wulite mmekọ dị n'etiti UK na mba Amerịka.

    Atụmatụ ndị e ji echekwa onyeisiala Trump na njem a dị oke ọnụahịa ruru ọtụtụ nde pounds nakwa ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa Secret Service ya na ọtụtụ puku ndị uweojii obodo.

    Ebe foto si, Getty Images

    Atụmatụ ndị e ji echekwa onyeisiala Trump na njem a dị oke ọnụahịa ruru ọtụtụ nde pounds nakwa ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa Secret Service ya na ọtụtụ puku ndị uweojii obodo.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisial Trump na Eze Charles nọ n'ụgbọala
    Atụmatụ ndị e ji echekwa onyeisiala Trump na njem a dị oke ọnụahịa ruru ọtụtụ nde pounds nakwa ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa Secret Service ya na ọtụtụ puku ndị uweojii obodo.

    Ebe foto si, Getty Images

  2. Sowore na DSS akpụpụrịtaala onwe ha n'ụlọikpe

    Onye ọru nchekwa DSS yi uweojii ma buru egbe na Sowore yi agwa ọdịnala ma tinye aka n'agba

    Ebe foto si, Getty Images

    Omoyele Sowore ji aha pati African Action Congress (AAC) zọọ ọkwa onyeisiala n’afọ 2023 akpụpụla ụlọọrụ nchekwa Department of State Services (DSS) na ụlọọrụ soshal midia Facebook na X n’ụlọikpe.

    N’ozi ha ọkaiwu ya bụ Tope Temokun wepụtara, o kwuru na nke a maka mmachi DSS na ụlọọrụ soshal midia ndị a machiri ihe o dere n’akara soshal midia ya nke ọ sị megidere ikike o nwere dịka mmadụ.

    O kwuru na akwụkwọ ha gbara n’ụlọikpe bụkwa iji mee ka ikike dịịrị onye ikwupụta uche ya agaghị anwụ na Naịjirịa ma sị na ọ bụrụ na ụlọọrụ gọọmenti Naịjirịa nwereike ịgwa ụlọọrụ soshal midia zuru mbaụwa ọnụ ihe ha ga-eme, na ọ pụtara na o nweghi onye nwere nchekwa na Naịjirịa.

    Ọkaiwu Sowore kwuru na ha tinyere aha Facebook and X n’akwụkwọ ahụ maka na gere ntị n’ihe DSS kwuru ma machie ozi Sowore n’ụzọ na-ezighi ezi.

    Sowore gwara ụlọikpe na DSS enweghi ikike ọbụla ịmachi ozi mmadụ bipụtara na soshal midia, ma kwuo ka ụlọọrụ Meta nwee Facebook na X ekwela ka e jiri ha dịka ngwaọrụ e ji akpagbu mmadụ.

    Akwụkwọ a Sowore gbara n’abịa n’ime awa ole ma ole, ụlọọrụ DSS gbachara ya akwụkwọ n’ụlọikpe ukwu dị n’Abuja n’ọnụ ebube ise

    Ha tinyekwara aha Facebook na X dịka ndị ga-azara ọnụ ha n’ụlọikpe ahụ.

    Ha gbara akwụkwọ maka Sowore jụrụ iwepu ihe o dere na soshal midia Facebook nakwa X, nke ha sị metọrọ aha Onyeisiala Bola Tinubu.

    Ha nyere Sowore na ụlọọrụ soshal midia ndị a otu izuụka iwepụ ozi ahụ mana ha emeghi nke a.

  3. Trump ga-ezute Eze Charles na Windsor Castle

    Trump ga-ezute Eze Charles na Windsor Castle

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ga-ezute Eze Charles na Windsor Castle dịka akụkụ njem otu ụbọchị ya nke ugboro abụọ na mba UK.

    Trump garuru Lọndọn n’abali ụnyahụ, ma kwuo na “taa ga-abụ nnukwu ụbọchị.”

    Donald Trump na nwunye ya bụ Melania Trump lakpuru na Winfield House n’abalị, nke bụ ụlọ onyennọchiteanya Amerịka na mba UK kemgbe afọ 1955.

    A tụọla akwa n’acha ọbara ọbara n’ala, tinyere ndị na-azọ njem ahịrị, ngosi ndịagha, ube ‘Red Arrow’ na oriri.

    Eze Charles ga-ekwu okwu nnabata n’oriri a ga-ahazi n’abalị Wenezde, mana ndị ọrụ ọkwa ha dị elu n’obieze ga-enye aka maka ile Trump ọbịa.

    Lọlọ Camilla bụ onye a tụrụ anya isonye, n’agbanyeghị na ọ wezugara onwe ya n’akwamozu Ezenwaanyị Kent n’ụbọchị Tuzde n’ihi ọrịa imi mkpọchi bụ sinusitis.

  4. Ndị be anyị, ụnụ asaala chi, Ka Nkwọ taa kwọtara anyị ihe ọma!

    Obiụtọ ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo n'ụbọchị taa bụ Wenezde Nkwọ 17 Septemba, 2025.

    Gaa na websaịtị, Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị ka i nweta akụkọ niile na-akpọtụ n'ụwa.

    N'ụtụtụ a, ọ bụ Ikechukwu Kalu na Chinonso Ugorji ka gị na ha ga-anọrị mana Uzoamaka Ewuzie, Michael Ngene na Michael Ilediagu ga-emecha buru oche n'oge ehihie.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị.

  5. SSANU, NASU enyela gọọmenti Naịjirịa otu izuụka tupu ha amalite abụbụọrụ

    SSANU, NASU enyela gọọmenti Naịjirịa otu izuụka tupu ha amalite abụbụọrụ

    Ebe foto si, NAN

    Otu jikọtara ndị ọrụ na-abụghị ndị nkụzi na mahadum ndị e nwere na Naịjirịa bụ SSANU na NASU n'ịchafụ Bekee enyela gọọmenti otu izuụka tupu ha amalite abụbụọrụ.

    N'ozi leta ha degaara Minista na-ahụ maka ọrụ na inye ohere ọrụ bụ Muhammad Dingyadi, ndị otu ahụ kwuru na ọ bụrụ na gọọmenti egboghị nsogbu ha n'ime otu izuụka, na ha ga-amalite abụbụọrụ.

    Iwe ndị otu SSANU na NASU gụnyere akwụghị ha ego mmachi akpa ruru ijeri naịra iri ise nakwa ụgwọọnwa ndị e jichiri ejichi, akwụghị ụgwọọnwa e buliri elu n'oge 25/35, ya na etinyeghị nkwekọrịta ha na gọọmenti nwere n'afọ 2009 n'ọrụ.

    Ụlọmgbasaozi News Agency of Nigeria (NAN) kwuru na mbirimbi oge ahụ otu SSANU na NASU nyere malitere n'ụbọchị Mọnde 15 Septemba, 2025.

  6. Otu ngalaba United Nation ekwuola na mba Izrel adaala iwu agha na Gaza

    Ndí Gaza na-ebe akwa.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Gaza

    Otu ngalaba United Nation emeela nnyocha ma kwuo na mba Izrel adaala iwu agha megide ndị Palestine na Gaza.

    Ha kwuru na mba Izrel mere ihe anọ megidere iwu mba ụwa nke gunyere igbu igwe mmadụ kamgbe ha na-ebuso ndị Hamas agha.

    Ha kwuru na igbu ndị otu Hamas, itinye ha n’ọnọdụ na-emetuta ahụike ụbụrụ, itinye ha n'ọnọdụ ga-ekpochapụ ha ma mee ka ha hara ịmụ ụmụaka ọzọ bú ihe megidere ikike díaala mmadú.

    Ha rụtụrụ aka n’ihe ndị ọchịchị mba Izrel na-ekwu, etu ndịagha mba Izrel si akpa-agwa nke gosiri na ha chọrọ ikpochapụ ndị Hamas.

    Onye nnochitaanya mba Izrel katọrọ ihe ngalaba UN ahụ kwuru ma kọwaa na mpụtara na nnyocha ha mere dịka okwu asị na ntigharịanya.

    Ọ sị na ndị ahụ bụ ndị “ihe Hamas na-amasị na nzuzo” maka na mpụtara nnyocha ha ‘gbadoro ụkwụ n’asị Hamas na-asị” bụ ihe ha na-agaghị ekwete maka ya.

  7. A tụọla ụmụnwoke chọrọ ịta onyeisiala Zambịa amoosu mkpọrọ

    Ndị uweojii nwụchiri Leonard Phiri na Mozambican Jasten Mabulesse Candunde n’ọnwa Disemba 2024

    Ebe foto si, EPA-EFE / REX / Shutterstock

    Ụlọikpe mba Zambịa atụọla ụmụnwoke abụọ mkpọrọ afọ abụọ maka atụmatụ igbu Onyeisiala Hakainde Hichilema site n’ịta ya amoosu.

    Cheta na a nwụchiri mmadụ abụọ ahụ aha ha bụ Leonard Phiri na Mozambican Jasten Mabulesse Candunde n’ọnwa Disemba 2024. Ihe e nwetara n’aka ha gụnyere ọgwụ dị cihe iche na out ogwumaagana.

    Ọkaikpe Fine Maymbu nke ụlọikpe majie kwuru na mmadụ abụọ a bụ ndị iro mba Zambịa na onyeisiala ha.

    Ikpe a bụ nke ọtụtụ mmadụ tinyere uche ha nay a maka na nke a bụ oge mbụ a na-ama onye chọrọ ịta onyeisiala amoosu ikpe n amba Zambịa.

    N’agbanyeghị na mmadụ abụ a kwuru na ha bụ dibịa mkpọrọgwụ na mkpọakwụkwọ, ụlọikpe ahụ kwuru na ha na-ata amoosu

  8. Mịnịsta mba Izrel na-ahụ maka nchekwa ekwuola na ha tụrụ nnukwu ogbunigwe na Gaza

    Otu United Nations mere ka o doo anya na mba Izrel na-egbukpọ ndị Palestinia na Gaza.

    Ebe foto si, Reuters

    Mịnịsta mba Izrel na-ahụ maka nchekwa ekwuola na Gaza na-agba ọkụ dịka otu IDF tụrụ nnukwu ogbunigwe na Gaza n’abalị.

    Nke a na-abịa akụkọ si n’ụlọọrụ mgbasaozi Jerusalem Post kwuru na Izrel amalitela iwakpo Gaza dịka ha na-agba mbọ inwere ọnọdụ ebe ahụ.

    Praịm Mịnịsta Izrel bụ Benjamin Netanyahu kwuru na Gaza bụ ebe ikpeazụ otu Hamas nwere ọnọdụ ma kwuo na ha ga-anapụ ha ya. Mana atụmatụ a bụ nke ọtụtụ mba dị iche iche katọrọ.

    Otu United Nations mere ka o doo anya na mba Izrel na-egbukpọ ndị Palestinia na Gaza.

    Ka ọ dị ugbua, mịnịstrị mba Izrel na-ahụ maka mmekọ mba ofesi gọnarịrị okwu a UN kwuru.

  9. Ndị obodo Umuenyere Alayi akpọọla oku ka Gọọmenti Abịa steeti gbatara ha ọsọ enyemaka

    Ndị obodo Umuenyere Alayi akpọọla oku ka Gọọmenti Abịa steeti gbatara ha ọsọ enyemaka

    Ebe foto si, Chidera Miracle

    Ndị obodo Umuenyere Alayi dị n’okpuru ọchịchị Bende n’Abịa steeti ezigarala gọọmenti ozi gbatagbata maka ndakpọ okporoụzọ si Umuenyere Alayi gawa Item.

    Okporoụzọ ahụ jikọtara ọtụtụ ime obodo adakpọọla n’ihi nnukwu mmiri zoro ọtụtụ ụbọchị nakwa mbụze.

    Ọnọdụ a egbochiela ndị mmadụ ime njem na mpaghara ahụ.

    Otu onye obodo ahụ aha ya bụ Maazị Ogbonna Ogbonna gwara BBC Igbo na mpaghara okporoụzọ ahụ dakpọrọ adakpọ nọ n’akụkụ ahịa ‘Afia Ozara”.

    Ọ kọwara na o ruola afọ ole na ole nsogbu ahụ malitere mana ọ bịara kawanye njọ n’oge udummiri a.

    Dịka o siri kwuo, oku niile ha kpọrọ gọọmenti ka a gbatara ha ọsọ enyemaka n’oge amịtaghị mkpụrụ ọbụla ruo ugbua okporoụzọ ahụ gbabiri ụzọ abụọ.

    Onyeisi okpuru ọchịchị Bende bụ Uwabunkonye Bassey agaruola ebe ahụ okporoụzọ dakpọrọ ma kwee nkwa na gọọmenti Abịa steeti ga-agbata ọsọ enyemaka ngwangwa iji dozie ya.

    Bassey kasiri ndị ọnọdụ okporoụzọ ahụ metụtara obi, ma gosi obi ekele na o nweghị onye nwụrụ anwụ site na ya.

    Ndị obodo Umuenyere Alayi akpọọla oku ka Gọọmenti Abịa steeti gbatara ha ọsọ enyemaka

    Ebe foto si, Chidera Miracle

  10. Ndị uweojii amalitela ịchọ ụzọ ha ga-esi napụta Ngozi Ogbu n’aka ndị omekome

    Ndị uweojii amalitela ịchọ ụzọ ha ga-esi napụta Ngozi Ogbu n’aka ndị omekome

    Ebe foto si, Imo State Police Command, Screenshot

    Ụlọọrụ ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ha ahụla onyonyoo na-efegharị ebe niile, bụ nke gosiri Ngozi Ogbu bụbu Onyeisioche okpuru ọchịchị Ọkigwe, ebe ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu IPOB na ESN ji ya eji.

    Nke a dị n’ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye wepụtara n’ụbọchị Sọnde 14 Septemba, 2025.

    Ozi ahụ kwuru na Kọmịshọna ndị uweojii Imo steeti bụ Aboki Danjuma enyela iwu ka e zipụ ndị uweojii na njikọaka ha na ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ maka ịnapụta onye omeiwu ahụ.

    “Anyị amalitela ime nnyocha miri emi iji nwuchie ndị omekome aka ha dị na ya, ma hụkwa na a napụtara onye omeiwu ahụ a tọọrọ n’Ọnụimo n’ụbọchị 7 Septemba, 2025,” ka Okoye kwuru.

    Ndị uweojii rịọrọ ọha mmadụ ka ha dere duu ma gaa n’ihu mụru anya. Ha gwakwara ndị nwere ozi dị mkpa ga-enyere ha aka iji nwuchie ndị omekome ahụ ka ha gaa n’ụlọọrụ ndị uweojii ọbụla dị ha nso.

    N’otu onyonyoo fesara ebe niile, a hụrụ ebe Maazị Ogbu na-akpọ oku ka ndị ọchịchị wezuga ndị nchekwa niile nọ n’Ọkigwe tupu ụbọchị anọ, ka ndị omekome ji ya nweeike tọghapụ ya.

  11. A tụọla mmadụ abụọ mkpọrọ maka ebubo na ha nwara iji amoosu tagbuo onyeisiala Zambia

    Onyeisiala Zambia Hakainde Hichilema si na okwenyeghị na amoosu

    Ebe foto si, EPA-EFE / REX / Shutterstock

    Nkọwa foto, Onyeisiala Zambia Hakainde Hichilema si na okwenyeghị na amoosu

    Ụlọikpe mba Zambịa atụọla mmadụ abụọ mkpọrọ afọ abụọ maka ebubo na ha nwara iji amoosu tagbuo onyeisiala mba ahụ bụ Hakainde Hichilema.

    A tụrụ Leonard Phiri bụ onye Zambịa na Jasten Mabulesse Candunde bụ onye Mozambique mkpọrọ n'ihi ebubo ịta amoosu, dịka a nwuchiri ha n'ọnwa Disemba ka ha ji ọtụmọkpọ na anụmanụ ugwumagana.

    Ndị gbara ha akwụkwọ n’ụlọikpe boro ebubo na ọ bụ otu onye omeiwu kpọtara mmadụ abụọ ndị ahụ ka ha gbuo onyeisiala Zambịa.

    Ọkaikpe Mayambu kwuru na ọtụtụ mmadụ nọ na Zambịa, dịka mba ndị nọ n'Afrịka kwenyere n'amoosu n’agbanyeghị na sayensị ewepụtabeghị nkwenye n'amoosu.

  12. NFF ga-enwe mkpebi gbasara ọnọdụ Eric Chelle - NSC

    NFF ga-eme mkpebi gbasara ọnọdụ onye nchịkwa egwuregwu bọọlụ Naịjiria Eric Chelle - NSC

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, NFF ga-eme mkpebi gbasara ọnọdụ onye nchịkwa egwuregwu bọọlụ Naịjiria Eric Chelle - NSC

    Dịka amamaaka ntozuoke maka Iko Mbaụwa na-aga n'ihu, ụlọọrụ na-ahụ maka egwuregwu na Naịjirịa bụ National Sports Commission (NSC) ekwuola na otu na-ahụ egwu bọọlụ na Naịjirịa bụ ‘Nigeria Football Federation’ (NFF) ga-ekpebi ọdinihu Eric Chelle, onye nchịkọta otu egwu Super Eagles.

    Onyeisioche NSC bụ Shehu Dikko kwuru nke a mgbe ndị ntaakụkọ Channels TV na-agba ya ajụjụ ọnụ.

    Ọ sịrị na ụlọọrụ ha enyela ndị Super Eagles nkwado ha chọrọ mana imeri maọbụ itozu oke maka asompi Iko Mbaụwa anọghị ha n’aka.

  13. Peter Obi ezutela Obasanjo, Ladoja dịka a na-eche maka ntuliaka 2027

    Peter Obi ezutela Obasanjo, Ladoja dịka a na-eche maka ntuliaka 2027

    Ebe foto si, Peter Obi/X

    Onye ji aha Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka afọ 2023 bụ Peter Obi ezutela Olusegun Obasanjo bụbu onyeisiala Naịjirịa, dịka a na-eche maka ntuliaka afọ 2027.

    Obi gakwara kelee onye a họpụtara ọhụrụ dịka Olubadan n’Ọyọ steeti bụ Rashidi Ladoja.

    N’ozi o bipụtara n’akara ọbaozi X ya, Peter Obi kwuru na ebumnobi o jiri gaa kelee Ladoja bụ iji kwanyere ya ugwu maka uru Ibadan bara n’ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, mmekọrịta na akụnaụba Naịjirịa.

    Obi kwuru na Ladoja ga-ewebata amamihe ya dịka onye bụbu sịnetọ, gọvanọ nakwa eze ahịa iji bugoo Ibadan n’ogogo dị elu.

    Peter Obi gbakwunyere na “njem ahụ ọ gara na n’ụlọ Obasanjo na Ladoja bụ maka mmepe Naịjirịa na ọchịchị nwere eziokwu.”

    Peter Obi ezutela Obasanjo, Ladoja dịka a na-eche maka ntuliaka 2027

    Ebe foto si, Peter Obi/X

  14. Qatar na-eguzobe ọgbakọ Arab-Islamic summit iji kpaa maka mwakpo Izrel wakporo Doha

    Praịm mịnịsta Qatar bụ Mohammed bin Abdulrahman bin Jassim al-Thani nọ n'isi ọgbakọ ahụ na-aga n'ihu

    Ebe foto si, Reuters

    Ọgbakọ gbatagbata Arab-Islamic summit na-aga n’ihu na Qatar na nzaghchi mwakpo mba Izrel wakporo ndị isi Hamas na Doha n’izuụka gara aga.

    Akwụkwọ nkwekọrịta e gosiri ndị ntaakụkọ, katọrọ mwakpo ahụ Izrel mere ma kwuo na mwakpo a na-echere atụmatụ udo na ịdị n’out. Mana Izrel gọnarịrị ebubo ndị a.

    O doghị anya ihe mkpebi ọgbakọ a ga-abụ mana ndị ọrụ nchekwa doro anya kwuru na ha agaghị eji mwakpo zaghachi Izrel.

    Cheta na Praịm mịnịsta Qatar bụ Mohammed bin Abdulrahman bin Jassim al-Thani gwara ndị isi mbaụwa ka ha kwụdo n’eziokwu ma nye mba Izrel ntaramahụhụ zuruoke.

    Onyeisiala Trump na-achị Amerịka kwuru na Amerịka na mba Qatar na Izrel na-enwe mmekọ ma kwuo na ọ dị mkpa ka onye ọbụla kpachara anya dịka ha na-awakpo mba ọbụla.

  15. Ọkwọ ụgbọelụ Air Peace agọọla na o nweghi mmanya ọbụla ọ ṅụrụ tupu na-akwọ ụgbọelu

    Ụgbọelu bụ akara na njirimaara ụlọọrụ Airpeace ka ọ nọ n'okporoụzọ ụgbọelu.

    Ebe foto si, Fly Airpeace/Instagram

    Otu onye so na-akwọ ụgbọelu Air Peace Boeing 737-524 bu akara 5N-BQQ bu ndị njem iri itoolu na isii gbafee okporoụgbọelu na Riva steeti n'ụbọchị 13 Julaị, 2025 ekwuola na ọ naghị anụ mmanya ọkụ maobụ ọgwụ ike.

    David Bernard kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ n'ụlọorụ ntaakụkọ Arise TV banyere nchọpụta ụlọọrụ na-eme nnyocha gbasara nchekwa na Naịjiria bụ ‘Nigeria Safety Investigation Bureau’ mere nke gosiri na ha hụrụ mmanya ọkụ na ọgwụ ike na-ahụ ya na onye otu ya.

    Ụlọọrụ a kwuru na ha ji mamịrị na ọbara ha mee nyocha n'ime ụbọchị iri ka ihe a mechara.

    O kwuru na ọnọdụ ime nyocha agbanwela, “ya bụrụ na mmadụ nwere mmanya ọkụ n'ahụ ya, e nwere ihe e ji eme nyocha ga-egosi eziokwu ozugbo ozugbo dịka ‘breathalyser’ mana ndị NSIB weere ọbara na mamịrị anyị ka ha ji mee nyocha kamgbe ụbọchị 13 Julaị bia weta mpụtara ya n'abalị iri nke bụ 23 Julaị” Ọ na-ajụ si ogologo oge ole ka ọ na-ewe iji wepụta mpụtara nyocha?

    Bernard si na o mefuru ezigbo ego iji gụọ akwụkwọ ịnya ụgbọelụ na NSIB agaghị emechu aha ya maka ha kwesịrị iji ụlọọgwụ ndị ụgbọelu wepụtara ji mee nyocha ha.

  16. Gọọmenti Ebonyi akụtuola ụlọelu ogogo abụọ n'ihi enweghi ikike si n'aka ha

    Osisi na ụvụrụ aja e ji arụ ụlọ ahụ tọgbọrọ n'ala dịka a kutuchara ya

    Ebe foto si, Enyinna Omoke

    Mịnịstrị na-ahụ maka mmepe obodo n'Ebonyi Steeti akụtuola ụlọelu ogogo abụọ a na-arụ ọhụrụ na mpaghara Azuebonyi n’ọchịchị ime obodo Ebonyi.

    Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka mmepe obodo bụ Sunday Inyima si na o nyere onye nwe ụlọ ahụ ntuziaka ka o wepụ ya maka na mpaghara ebe ọ na-arụ ụlọ ya bụ ebe e kewapụtara ịrụ okporoụzọ.

    Ọ gara n’ihu kwụọ na ụlọọrụ ha akwadoghi onye nwe ụlọ ahụ ịrụ ụlọ ebe ahụ dịka ọ dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha gbaa mbọ hụụ na ha nwetara nkwado n’aka ndị ụlọọrụ mmepe obodo tupu ha eme ihe ọbụla.

  17. Ndịagha Niger kwuru na e gburu ndị otu ha mmadụ iri na anọ

    Ndịagha bu egbe kwụrụ n'ihu ogige ha na-eche ụzọ ama ha nche

    Ebe foto si, Getty Images

    Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na Niger ezigala ozi iti aka n’obi nye ezinaụlọ ndịagha mmadụ iri na anọ e gburu na mwakpo ndị na-eyi ndụ egwu mere n’ụbọchị Wenezde.

    Dịka Ọchịagha Salifou Mody si kwuo “mba Niger na-eri uju n'ihi ọnwụ ndịagha ndị ahụ e gburu”

    Ndị ntaakụkọ mpaghara ActuNiger kwuru na ndị omekome wakporo ndịagha na mpaghara Tlaberi dị n'ọdịda mba Niger.

    Mpaghara Tlaberi bụ okeala nọketere Burkina Faso na Mali bụ etiti ebe ndị na-eyi ndụ egwu dịka ‘Islamic State na Al-Qaeda’ na-akpa ike.

  18. Ezịnaụlọ ụmụafọ Izrel ndị Hamas ji ekwuola na ọ bụ Netanyahụ mere atọhapụbeghi ha

    Ndị na-eme ngagharịiwe n'abalị ka ha ji akwụkwọ e biri ihe iji gosi iwe hanyahụ bụ Mgbochi nwere onwe ha

    Ebe foto si, Getty Images

    Ezinaụlọ ụmụafọ Izrel ndị otu Hamas ji ekwuola na Praịm Mịnịsta Benjamin Netanyahu bụ “mgbochi” ha na-enwe mere na atọhapụbeghi ụmụnne ya.

    Otụ jikọtara ndị ezinaụlọ Hamas ji ụmụnne a kpọrọ 'The Hostages and Missing Families Forum' kwupụtara nke a na soshial midịa na mwakpo Izrel mere na Qatar izuụka gara aga na-egosi na mgbe ọbụla a chọrọ inwe nkwekọrịta ikwụsị ọgụ, Netanyahu ga-emebi ya.

    N’ụbọchị Sọnde 14 Septemba, odeakwuụkwọ mba Amerịka Marco Rubio batara n’Izrel inwe nzụkọ ha na Netanyahu dịka a na-ama Izrel ikpe na mbaụwa maka ịwakpo ndịisi Hamas mgbe ha na-enwe nzukọ na mpaghara Doha, mba Qatar.

  19. Mba Romania achọpụtala na 'drone' mba Rọshịa na-efe na mbara eluigwe ha

    Ụgbọelu agha 'fighter jet' na-efegharị na mbara eluigwe

    Ebe foto si, EPA

    Mba Romania akọwaala na ha hụrụ obere ụgbọelu na-ebu ogbunigwe a kpọrọ 'drone' nke mba Roshịa na mbara ihu eluigwe ha.

    Mịnịstri na-ahụ maka nchekwa na Romanịa si na mgbe ndị ọrụ nchekwa nọ na-elekọta mwakpo Rọshịa mere na Yukren n’ụbọchị Satọde, ha chọpụtara 'drone' ahụ ma soro ya ka ọ na-aga na mpaghara okeala ndịda Yukren.

    Onyeisiala mba Yukren Volodymyr Zelensky si na 'drone' Rọshịa ha hụrụ abụghị nduhie kama na ọ bụ etụ Rọshịa chọrọ iji agbasa agha. O nwebeghị ihe Rọshịa kwuru make nke a.

    Cheta n’ụbọchị Wenezde mba Poland si na ha gbaturu ụgbọelu 'drone na mbara ohu eluigwe ha.

    Nke a na-eme ya mba abụọ so n'otu NATO na-ahụ ụgbọelu 'drone' nke Rọshịa na mbara ihu eluigwe ha.

  20. Otiọkpọ a ma ama bụ Ricky Hatton nke mba Briten anwụọla

    Ricky Hatton yi uweojii nọrọ dịka ebe ọkụ na-acha ya n'ihu

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uweojji na mpaghara Manchester na mba Briten ekwupụtala ọnwụ nwamadị a ma ama nna-eti ọkpọ bụ Ricky Hatton.

    Akụkọ kwuru na ndị uweojji gara n’ulọ Hatton dị n'okporoụzọ Bowlacre, Hyde, na Tameside mgbe ha natachara ozi n'aka otu onye ma hụụ ọzụ ya n’ime ụlọ ya ka ọ tọgbọrọ n’ala n'ụbọchị Sọnde 14 Sepụtemba, 2025.

    Mgbe Ricky Hatton na otu nwoke ọzọ na-eti ọkpọ n'ime ọgbọ

    Ebe foto si, Getty Images

    E nwebeghị onye ma ihe gburu nwoke a gbara afọ iri anọ na isii mana ndị uweojii si na ọ dịghị ihe mgbagwoju anya ha hụrụ gbasara ọnwụ ya.

    Ọtụtụ ndị ọkụ ọkpọ ibe ya nakwa ndị enyi na-ezitere ezinaụlọ ya ozi iti aka n’obi.

    Nnyocha na-agakwa n'ihu ịchọpụta kpọmkwem ihe gburu nwamadị a.