Ndị uweojii anwụchiela ndị omekome karịrị puku ise n’ọnwa isii n’Enugwu Steeti

Ebe foto si, Nigeria Police Force
Kọmishọna ndị uweojii Enugwu steeti bụ Mamman Bitrus Giwa ekwuola na ndị ọrụ ya anwụchiela ndị omekome dị puku ise, nari iri asaa na isii (5,176 ) n’onwa isii ọ malitere ọrụ dịka kọmishọna ndị uweojii steeti ahụ.
O kwuru na ndị omekome ahụ gụnyere ndị ohi, ndị ntọrị, ndị otu nzuzo, ndị na-azọ nwere onwe nakwa ndị dara iwu obodo di iche iche.
Giwa kọwapụtara na oge ọ malitere ọrụ n’ọnwa isii gara aga, o kpebiri ibelata mkpa mkpa ndị omekome na-akpa n’Enugwu steeti site na-inye ngalaba ndị uweojii dị iche iche nke steeti nkwado zuru oke n’ọrụ ha.
Ihe o kwuru ha nwetara n’aka ndị omekome ahụ gụnyere ego dị nde naira iri bụ nke ha napụtara ndị ntọrị, egbe 105 dị iche iche gụnyere AK 47 asatọ, otu egbe G-3 automatic, mgbọ egbe 271, ụgbọala 71, anwụrụ ike, uwe ndịagha nke adigboroja, egbe ọka, na ihe ndị ọzọ.
Kọmishọna Giwa mere ka o doo anya na ndị uweojii Enugwu Steeti kwụrụ chịm ibuso ndị omekome agha na steeti ahụ ma hụ na Enugwu steei nwere ezi nchekwa.

Ebe foto si, Nigeria Police Force

















