Ndị isi mpaghara Etiti Ọwụwa Anyanwụ na Yurop anabatala atụmatụ udo Gaza nke Trump

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Septemba 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Ndị ọma kedụ ka unu mere n'ụtụtụ a?

    Nnọọ! n'ọgbakọ BBC Igbo n'ụbọchị taa.

    Anyị na-asị ka ndụ mmiri ndụ azụ.

    Biko sosie anyị ike maka ịgụrụ akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa gbaa gburu gburu.

  2. Gọọmenti Naịjirịa enyela ndị ọbịa akwụkwọ ha na-ezughị ezu oge amara ruo ngwụcha Septemba

    Gọọmenti Naịjirịa enyela ndị ọbịa akwụkwọ ha na-ezughị ezu oge amara ruo ngwụcha Septemba

    Ebe foto si, NIS/Getty Images

    Gọọmenti Naịjirịa kwuru na ha amalitela oge mgbaghara maka ndị ọbịa akwụkwọ ha na-ezughị ezu maọbụ ndị nke akwụkwọ njem ha kụrụla ọnụ.

    Ọ bụ mịnịstrị na-ahụ maka ihe na-eme na Naịjirịa na ụlọọrụ Immigration wepụtara atụmatụ ahụ iji nye ndị ọbịa bi na Naịjirịa n’ụzọ iwu na-akwadoghị oge amara iji mezie akwụkwọ ha.

    Dịka ụlọọrụ Immigration siri kwuo, oge amara ahụ malitere kemgbe ọnwa Mee afọ 2025 ma kwesị ịkụrụ ọnụ n’ụbọchị 30 Ọgọst 2025, mana gọọmenti jiri otu ọnwa gbatịa oge ya ruo n’ụbọchị 30 Septemba, 2025.

    “Ngwangwa oge mgbaghara ahụ gafere, anyị ga-amalite itinye iwu n’ọrụ n’ozuzuoke, ma nye ndị nọferela oge njem ha na Naịjirịa ntaramaahụhụ,” ka minista na-ahụ maka ihe ndị na-eme na Naịjirịa bụ Olubunmi Tunji-Ojo kwuru.

    N’ozi nke ha wepụtara, ụlọọrụ Immigration kwuru na “malite n’ụbọchị 1 Ọktoba 2025, anyị ga-ebido itinye iwu n’ọrụ megide ndị ọbịa akwụkwọ ha na-ezughị ezu.”

  3. Anyị enweghị ego ịkwụ ụgwọ ụlọ, ụgwọ ọnwa ndị ọrụ anyị - Mịnịstrị Naịjirịa na-ahụ maka mba ofesi

    Mịnịsta Naịjrịa na-ahụ maka mba ofesi, Amb. Yusuf M Tuggar

    Ebe foto si, Ministry of foreign Affairs, Nigeria / X

    Nkọwa foto, Yusuf M Tuggar

    Mịnịstrị Naịjirịa na-ahụ maka mmekọ Naịjirịa na mba ofesi ekwuola na ha enweghị ego ha ji-akwụ ụgwọ ụlọ na mba niile ha nwere ụlọ ọrụ nakwa ụgwọ ọnwa ndị ọrụ ha.

    Ha mere ka amata nke a n'akwụkwọ ozi ọnụ na-e kwuru ha bụ Kimiebi Imomotimi Ebienfa wepụtara n'abalị nke mbụ nke ọnwa Sepụtemba, 2025.

    N'akwụkwọ ozi ahụ ka ha nọ kọwaa etu ọnọdụ akụnụba Naịjirịa si emetụta ndị ọrụ ha, ndị niile na-arụrụ ha ọrụ nakwa ndị nwe ụlọ ha ji mere isi ụlọ ọrụ na mba dị icheiche.

    Ha kọwara na ọ bụ etu e si ewedata ego a na-etinyere mịnịstrị ha mgbe a na-eme ego mmefu kwa afọ ka ọ bụrụ iwu so ebutere ha ọnọdụ ego ezughị oke.

    Ha gwara ndị ọrụ ha nakwa ndị niile ha ji ụgwọ na Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu na-agba mbọ ịkwụsị ọnọdụ ahụ ma nye ha ezigbo nkwado.

  4. A gbaala otu nwaanyị ọkụ maka ikwujọ onye amụma na Naịjirịa

    A gbaala otu nwaanyị ọkụ maka ikwujọ onye amụma na Naịjirịa

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Ụmụ mmadụ iwe juru obi agbaala otu nwaanyị ọkụ na Naịja steeti oge ha bochara ya ebubo ikwujọ Onye Amụma Mohammad.

    Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Naịja steeti bụ Wasiu Abiodun kwupụtara nke a n’ozi o wepụtara n’ụbọchị Mọnde 1 Septemba, 2025.

    Ndị uweojii katọrọ ogbugbu e gburu nwaanyị ahụ na-ere nri a matara dịka Amaye, ma kọwaa ya dịka igbu mmadụ na-ebughị ụzọ kpee ya ikpe bụ “jungle justice” n’asụsụ Bekee.

    Ha kwuru na ha amalitela ime nnyocha miri emi iji nwuchie ndị kpara arụ ahụ ma kpee ha ikpe.

    Otu ụlọmgbasaozi dị na Naịja steeti kwuru na onye hụrụ mgbe o mere kọrọ ha na otu nwoke ji egwuruegwu kwe nwaanyị ahụ nkwa ọlụlụ, mana nzaghachi o nyere nwoke ahụ bụ nke ụfọdụ hụtara dịka ikwujọ Onye Amụma.

    “Nke a mere ha ji wakpoo nwaanyị ahụ ma mụnye ya ọkụ tupu ndị ọrụ nchekwa erute ebe ahụ,” ka Wasiu Abiodun kwuru.

  5. Mba Burkina Faso amachiela mmekọ nwoke na nwoke nakwa nwaanyị na nwaanyị

    Mba Burkina Faso amachiela mmekọ nwoke na nwoke nakwa nwaanyị na nwaanyị

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndịagha na-achị mba Bọkịna Faso anabatala iwu ọhụrụ, bụ nke mere ka ọ bụrụ arụ inwe mmekọ n’etiti nwoke na nwoke nakwa nwaanyị na nwaanyị.

    Ọnọdụ a na-abịa n’ime ihe dịka otu afọ ha nabatara akwụkwọ maka imegharị iwu mere ka omume ahụ bụrụ arụ.

    Tupu oge a, Bọkịna Faso so n’ime mba iri abụọ na abụọ nabatara ịkpọ ntu na ịghụ aka n’Afrịka.

    N’ụbọchị Mọnde Septemba 1, 2025 ka ndịagha ahụ jikọtara aka nabata iwu machiri mmekọ nwoke na nwoke nakwa nwaanyị na nwaanyị.

    Iwu ahụ kwupụtara mkpọrọ afọ ise maka ndị tinyere aka n’omume ahụ, dịka ọ bụ otu ụzọ e si ebu agha megide mmekọ n’etiti otu ụdị ekere n’Afrịka.

    Cheta na mba Mali machiri omume ahụ n’afọ gara aga ma kwupụta ya dịka arụ, ebe mba ndị ọzọ gụnyere Naịjirịa, Gana na Yuganda nwere iwu nke machiri ya.

  6. Mbuze egbuola mmadụ 1,000 na mba Sudan

    Ihe ruru mmadụ 800,000 bi na mpaghara Darfur ebe mbuze ahụ mere agbapụla n'ụlọ ha kemgbe agha ahụ malitere n'afọ 2023

    Ebe foto si, Reuters

    Otu ndịagha Sudan Liberation Movement ekwuola na ihe ruru mmadụ 1,000 anwụọla na mbuze mere n’ugwu Marra dị na mpaghara ọdịda anyanwụ mba Sudan.

    Akwụkwọ ozi ndịagha ahụ wepụtara kwuru na oke mmiri ozuzo bụ ihe kpatara mbuze ahụ mere n’ụbọchị Sọnde 31 Ọgọst, 2025 n’obodo Tarasin nke ọ bụ out onye ji ndụ ya pụta na ya.

    Ha na-arịọ enyemaka n’aka out United Nations nakwa out eyemaka dị iche iche.

    Ọtụtụ ndị bi na mpaghara ugwu Darfur steeti ka anyị nụrụ na ha gbagara n’ugwu Marra maka na agha ahụ dị n’etiti ndịagha Sudan na out ndịagha Rapis Support Forces chụpụrụ ha n’ụlọ ha dị iche iche.

    Gọvanọ ndịagha Darfur bụ Minni Minnawi kọwara mbuze ahụ dịka oke ọdachi.

  7. Onyeisiala Gana ewepụla Gertrude Torkonoo dịka Ọkaikpe Ukwu

    Eboro onye ọkaikpe ukwu Gana ebubo site n'arịrịọ atọ dị iche iche.

    Ebe foto si, Ghana Presidency

    Nkọwa foto, Eboro onye ọkaikpe ukwu Gana ebubo site n'arịrịọ atọ dị iche iche.

    Onyeisiala mba Gana bụ John Mahama ewepụla Gertrude Torkonoo dịka Ọkaikpe ukwu.

    O mere nke a oge kọmitii mmadụ ise e hiwere ka ha nyochaa ebubo omume ọjọọ e boro Torkonoo kwadoro ka e wepụ ya n’oche.

    Ụfọdụ ebubo e boro ya bụ na o ji ego ọha kwado di ya na nwa ya nwaanyị ka ha gaa ezumike.

    Akụkọ kwuru na ebubo ọzọ e boro ya bụ na ọ gbalịrị ime ka onye bubu onyeisiala Gana họpụta ndị Ọkaikpe mmadụ ise ọ chọrọ n'Ụlọikpe Kachasi n’usoro na-ezighị ezi.

    E wepụrụ Gertrude Torkonoo n’ọrụ site na nkeji 146 (1) nke akwụkwọ iwu Ghana dịka nkeji 146 (9) nyere onyeisiala ikike ime ihe kọmitii mere nnyocha ahụ kwupụtara.

  8. Ihe ụlọọrụ Dangote kwuru maka ọnwụ Ruth Otabor

    Akwụkwọ ozi Dangote wepụtara kọwara mwute ụlọọrụ ha banyere ọnwụ Ruth ma tie ezinaụlọ ya na ndị enyi ya aka n’obi.

    Ebe foto si, Ruth Otabor/TikTok

    Ụlọọrụ Dangote ekwuputala ezi mwute ha maka ọnwụ nwaada Ruth Otabor.

    Cheta na ụgbọala Dangote meruru nwaada Ruth Otabor ahụ n’ihe mberede okporoụzụ mere n’Auchi, Edo Steeti n’ụbọchị Wednezde 13 Ọgọst, 2025 nke mere ka e bepụ otu ụkwụ ya n’ụlọọgwụ.

    Ihe mberede a mere naanị abalị isii nwaada Ruth Otabor gụsịrị akwụkwọ mahadum.

    Akwụkwọ ozi Dangote wepụtara kọwara mwute ụlọọrụ ha banyere ọnwụ Ruth ma tie ezinaụlọ ya na ndị enyi ya aka n’obi.

    Akwụkwọ ozi ahụ gara n’ihu kwuo na kemgbe ihe mberede ahụ mere, ụlọọrụ Dangote na-akwụ ụgwọ ụlọọgwụ Ruth Otabor ma na-akwado ezinaụlọ ya.

    Dangote kwuru na ha mapụtara atụmatụ ibuga Ruth mba Indịa iji nye ya ezi nleta zuruoke kama na ha na-eche ndị dọkịnta ka ha gwa ha mgbe Ruth ga-enweike ime njem ahụ. Mana ka ọ dị ugbua, nwaada ahụ anwụọla.

    Ụlọọrụ Dangote mere ka o doo anya na ụlọọrụ ha kwụrụ chịm n’eziokwu ma kwuo na ha ga-aga n’ihu kwalite usoro nchekwa ha ma kọwaa na ha ga-enye onye ọbụla nwere ihe mberede ọbụla nkwado. Ha kpere ekpere ka mkpụrụobi Ruth Otabor zuo ike na ndokwa.

    N’aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị mmadụ akatọọla ụlọọrụ Dangote ma kwuo na nke a abụghị oge mbụ ụgbọala ha na-ebute maka ọnwụ mmadụ ma kpọọ oku ka ụlọọrụ Dangote nye ndị ọkwọụgbọala ha ezi nkụzi iji hụ na ụdịrị ọdachi a emeghị ọzọ.

  9. Ihe karịrị mmadụ 600 anwụọla n'oke alaọmajiji mere na mba Afghanistan

    Nwatakịrị merụrụ ahụ dina n'ụlọọgwụ dị n'Afghanistan

    Ebe foto si, AIMAL ZAHIR/AFP VIA GETTY IMAGES

    Ihe karịrị mmadụ narị isii (600) anwụọla n’oke alaọmajijiji nke ogogo 6.0 mere na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ mba Afghanistan dịka mịnịstrị na-ahụ maka ihe na-eme n'ime obodo jiri kwuo.

    Ndị ọrụ na-adọ aka na ntị na ọnụọgụgụ ndị o metụtara nwere ike ịrị elu dịka a na-eche ịzọpụta ndị mmadụ - Ebe ihe a mere dị n’ime ime obodo nke mere o jiri esi ike ịmata ọnụọgụgụ ndị kpọmkwem.

    Ọtụtụ ụlọ emiela n’ime ụvụrụ aja, ndị ọrụ gọọmenti Taliban si kwuo, ebe ndị ọrụ kwuru na obodo niile alaala n’iyi n’ihi alaọmajijiji a.

    Ndị bi n’obodo kwuru na mbuze ekewaala ụzọ ebe dị nso n’ebe ihe a mere – nke pụtara na ọ ga-egbu oge tupu a mata ihe ndị alaọmajijiji a lara n’iyi dịka onye ntaakụkọ Yogita Limaye nọ na Kabul si kwuo.

    Alaọmajijiji a nke omimi ya dị kilomita asatọ (maịli isii), mere ka ọtụtụ ụlọ dị na Kabul ruo Islamabad bụ isioboso mgba Pakistan maa jijiji, nke a bụ ihe ji kilomita narị atọ dị anya.

    Onye merụrụ ahụ mmadụ abụọ kwa n'igwe e ji ebu mmadụ n'ụlọọgwụ

    Ebe foto si, Reuters

    A gwala ndị ọrụ enyemaka ka ha biko nye aka n’ịzọpụta ndị mmadụ na mpaghara ahụ bụ nke e ji naanị ụgbọelu abanye n’ihi mbuze na idemmiri.

    Ozi si n’akara soshal midia X ndị Taliban kwuru na alaọmajijiji ahụ butere “ọnwụ ndị mmadụ nakwa akụnaụba ịla n’iyi na mpaghara ọwụwa anyanwụ”.

    Ndị ọrụ obodo nakwa ndị bi n’obodo na-enye aka ugbua ịzọpụta ndị nke a metụtara. Ebe ndị ọrụ enyemaka nọ nso ebe ihe mere nọ n’ụzọ na-abịa,” ka ozi ahụ kwuru.

    Kepukepu na-ekwu na ihe ruru mmadụ iri atọ si n’otu obodo anwụọla, mana dị ka ọ dị ugbua, a mabeghi kpọmkwem ọnụọgụgụ ndị o metụtara,” ọnụ na-ekwuru mịnịstrị ahụike bụ Sharafat Zaman kwuru nke a.

  10. Igbo ndị ọma e ji eme ọnụ!

    Unu asaala chi?

    Anyị ji obi sara sara anabata gị n'ọnwa Sepụtemba afọ 2025 bụ mmalite ọnwa ndị 'emba'.

    Ekpere anyị bụ ka ngwụcha afọ a mụtara gị ihe ọma gbaa gburu gburu.

    Biko jisie ike sonyere BBC Igbo n'ọgbakọ Websaịt, Facebook, Instagram nakwa WhatsApp Chanelụ.

    Ị ga-ahụ akụkọ ndị na-amasị gị nke ukwuu.

    Ndewo!