Ndị isi mpaghara Etiti Ọwụwa Anyanwụ na Yurop anabatala atụmatụ udo Gaza nke Trump

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Septemba 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Etu e si gbuo mmadụ anọ ebe a na-akwa ozu n’Ogidi Anambra Steeti

    Onyinyo ndị mmadụ atọ buliri egbe ha elu na ndị uweojii abụọ bu egbe n'etịtị ndị uweojii ọzọ jikọtara aka ha ọnụ.

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola na ha na-eme nnyocha iji chọpụta ndị otu nzuzo gbagburu mmadụ anọ n’Ogidi okpuruọchịchị Idemili North nke steeti ahụ.

    Ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Tochukwu Ikenga wepụtara kwuru na nke a mara n’ụbọchị Tọzde 11 Sepụtemba, 2025 ebe a na-eme akwamozu mmadụ.

    O kwuru na oge a na-eli otu onye nwụrụ anwụ n’obodo Ezi nke Ogidi ka ndị a na-eche bụ otu nzuzo wakporo ebe ahụ ma malite ịgba ndị mmadụ egbe aghara aghara.

    Ndị a gbagburu mmadụ anọ ebe mmadụ iri na ise merụrụ nnukwu ahụ.

    Ikenga kwuru na mgbe ndị uweojii wuchiri ebe ahụ ọ bụrụ na ndị otu nzuzo ahụ agbaala ọsọ.

    O kwuru na ha buuru ndị merụrụ ahụ gawa n’ụlọọgwụ ebe ha nwetere mgbọ egbe iri na isii.

    Ọ gara n’ihu kwuo na nnyocha mbụ ha mere gosiri na ọdachi a bụ n’ihi esemokwu dị n’etiti ndị otu nzuzo abụọ.

    O kwuru na ndị uweojii eweghachịla udo na mpaghara ahụ ma rịọ ọhanaeze ka ha gbaa ama ihe ọbụla dị aṅaa ha hụrụ.

  2. Izrel egbuola mmadụ 30 na Gaza n’ụbọchị Satọde

    Ụmụnwoke abụọ ji nwoke na-akwa arịrị dịka ha na-apụ n'ebe mwakpo ahụ mere

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-ahapụ ogige mwakpo ahụ mere

    Akụkọ anyị nwetara na Gaza kwuru na ndịagha Izrel gburu mmadụ 30 n’ụbọchị Satọde 13 Septemba, 2025.

    Ndị bi na mpaghara mwakpo ahụ mere kwuru na ọ bụ ogige ụlọakwụkwọ nakwa ogige ebe ebe ndị gbara ọsọ ndụ ka ndịagha ahụ wakporo.

    Ndịagha Izrel kwuru na ndị Palestinia ruru 250,000 ahapụla obodo Gaza gawa mpaghara Saụt ma ha kwuru na ha amaghị mmadụ ole ha dị.

    E nwere ndị kwuru na ha agaghị ahapụ Gaza maka na njem ịga mpaghara Saụt adịghị mfe.

    Hamas akpọọla oku ugboro ugboro ka ndị mmadụ nọrọ ebe ha nọ ma gwa ha ka ha ghara ime njem gawa mpaghara Saụt.

  3. Ndị obodo Utah ekwuola na ha maara ezinaụlọ nwaamadị be ha e boro ebubo na o gbagburu Charlie Kirk

    Cheta nd ndị ọrụ nchekwa steeti nakwa nke gọọmenti etiti malitere ịga n’ụlọ n’ụlọ dịka ha malitere ime nnyocha iji chọpụta onye gbagburu Kirk.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ụgbọala na ndị uweojii nọ n'ihu ụlọ ezinaụlọ Tyler Robinson e kwuru na ọ gbagburu Charlie Kirk

    Obodo Washington, Utah mba Amerịka dị na mpaghara ọdịda anyanwụ Zion National Park, bụ ebe nwere ọtụtụ ugwu ma bụrụ ebe ndị bịara ilegharị any ana-abịakarị.

    Mana n’ime awa iri anọ na-asatọ abụrụla ihe ịtụ n’anya nye ndị bi na mpaghara a dịka ha na-ajụ ihe mere onye be ha ji bụrụ onye kpara ajọ agwa a butere ọnwụ Charlie Kirk.

    Ndị uweojii kwuru na Tyler Robinson, nwoka ahụ e boro ebubo na ọ gbagburu Charlie Kirk na mahadum Utah Valley University, bi na mpaghara ahụ. Ndị uweojii anwụchiela ya dịka nna ya gwara ka o nyefe onwe ya n’aka ndị uweojii.

    Cheta nd ndị ọrụ nchekwa steeti nakwa nke gọọmenti etiti malitere ịga n’ụlọ n’ụlọ dịka ha malitere ime nnyocha iji chọpụta onye gbagburu Kirk.

    Ndị mmadụ gbakọrọ n’ihu ụlọ ezinaụlọ Robinson, kọwara mwute ha ma kwuo na akpataonyi juru ha ahụ n;ihi na ha amaghị ihe mere Robinson ji kpaa ajọ agwa di etu a.

    Addi Jacobson gbara afọ 20 bụ onye kwagara n’ụlọ nne ochie ya na nso nso a na mpaghara ahụ, kwuru na mpaghara atụghị anya onye nke ha ịkpa ụdịrị agwa ọjọọ a.

    N’okwu Jacobson ‘Amaghị m ezinaụlọ Robinson mana nne m ochie maara ha’.

    ‘Nne m ochie kọwara ezinaụlọ ha dịka ezigbo ezinaụlọ na-erube isi nye iwu obodo’, ka nwaada Jacobson kwuru.

  4. Ụtụtụ ọma ndị ọma

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde 14 Septemba, 2025.

    Anyị abịala iwetara gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ si mbaụwa, Afrịka na-akwa Naịjirịa.

    Gaa n'ihu sonyere akara soshal midia anyị nakwa Whatsapp Chaneelụ anyị maka akụkọ na ihe ndị ọzọ anyị na-ewetara gị

    Ndewo.

  5. E mezuola m ọrụ Onyeisiala Tinubu nyere m - Ọchịagha Ibas

    Vice Admiral Ibok-Ete Ekwe Ibas mgbe ọ na-aṅụ iyi ibido ọrụ.

    Ebe foto si, RSGH Press

    Nkọwa foto, Vice Admiral Ibok-Ete Ekwe Ibas mgbe ọ na-aṅụ iyi ibido ọrụ.

    Aka na-achị Rivas Steeti kemgbe Gọọmentị Etiti tinyere ọchịchị gbatagbata na steeti ahụ bụ Ọchịagha Ibok Ete Ibas ekwuola na ya emezuola ọrụ Onyeisiala Bola Tinubu nyere ya gbasara steeti ahụ.

    O kwuru nke a mgbe ụlọọrụ nhazi ntuliaka na steeti ahụ bụ Rivers State Independent Electoral Commission (RSIEC) bịara n’obi ọchịchị steeti ahụ inye ya akwụkwọ gosipụtara mpụtara ntuliaka okpuru ọchịchị e mere n’oge adịbeghị any ana steeti ahụ.

    Ibas kwuru na Onyeisiala Tinubu gwara ya mgbe ọ na-akwado ịbia ka ọhụ n’ihe niile gbasara ọnọdụ gọọmenti laghachiri azu etu ọ dị na mbụ.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ntuliaka e mere nakwa ịṅụ iyi ọrụ ndị isi oche okpuru ọchịchị iri abụọ na atọ bụ imezu nkwa okwere Onyeisiala Tinubu n’ọnwa Maachị, 2025.

    Ka ọ dị ugbua, gọọmenti Rivas steeti na-akwado emume inye ekele n’ụlọ ụka maka iji weghachite ọchịchị onyekwuouche ya n’ụbọchị Sọnde 14 Septemba dịka a na-atụ anya na Gọvano Siminalayi Fubara ga-ebidokwa ọrụ na Tọzde 18, Septemba 2025.

  6. Simone Gbagbo nwunye onye bụbu onyeisiala Ivory Coast ekwupụtala mmasị ya ịzọ ọkwa onyeisiala

    Simone Gbagbo na di ya banyere na nsogbu mgbe onyeisiala Alassane Ouattara weghaara ọchịchị n’aka ha ka emechara ntuliaka n’afọ 2010.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Simone Gbagbo na di ya banyere na nsogbu mgbe onyeisiala Alassane Ouattara weghaara ọchịchị n’aka ha ka emechara ntuliaka n’afọ 2010.

    Nwunye onye bụbu onyeisiala mba Ivory Coast bụ Simone Gbagbo ekwupụta mmasị ya ịzọ ọkwa onyeisiala mba ahụ.

    Gbagbo dị afọ iri asaa na isii so na ụmụnwaanyị abụọ n’ime mmadụ ise a họpụtara na-achọ oche onye mbụ na Ivory Coast.

    Cheta na Simone Gbagbo na di ya banyere na nsogbu mgbe onyeisiala Alassane Ouattara weghaara ọchịchị n’aka ha mgbe emechara ntuliaka n’afọ 2010.

    Ọzọ, Gbagbo na di ya chịrị Ivory Coast site n’afọ 2000 ruo 2011, mgbe ahụ a na-akpọ ya "nwaanyị ike" n'ihi na a mara ya dịka onye siri ike.

  7. Nato amalitela ọrụ ọhụrụ ga-akwalite ndịagha ọwụwa anyanwụ maka mwakpo Rọshịa

    A gbaturu ụfọdụ, ebe ndị ọzọ dara n'ọhịa na otu ụlọ dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Poland.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, A gbaturu ụfọdụ, ebe ndị ọzọ dara n'ọhịa na otu ụlọ dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Poland.

    Mba ndị nọ n’otu Nato ga-akpọga ndịagha ha na ụgbọelu ndịagha na mpaghara ọwụwa anyanwụ dịka Poland boro Rọshịa ebubo iji duronu mee mwakpo na-enwetụbeghị ụdị ya n’ụbọchị Wenezde.

    Ka ọ dị ugbua, mba gụnyere Denmark, Fransị na Jamini esonyela n'ọrụ ọhụrụ iji kwalite otu ndịagha nke akụkụ ọwụwa anyanwụ.

    A na-atụkwa anya na ndị otu NATO ndị ọzọ ga-emechaa sonye.

    Nke a na-abịa dịka Kremlin kwuru na Fraịde na "akwụsịtụrụ", mkparịtaụka udo nke Yukren, dịka ọnụ na-ekwuchitere Dmitry Peskov na-ekwu, sị: "Ị nweghị ike iyi akwa ugogbe anya na-atụ anya na usoro mkparịtaụka udo ahụ ga-amipụta mkpụrụ ozugbo."

    Ka ọ dị ugbua, esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị adịla elu na mpaghara Yurop mgbe Poland kwuchara na ụgbọelu iri na itoolu ndị Rọshịa gbagoro na mbara igwe ya n’ụbọchị Wenezde 10 Septemba 2025.

    A gbaturu ụfọdụ, ebe ndị ọzọ dara n'ọhịa na otu ụlọ dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Poland.

  8. Ụlọikpe ajụla igbochi nkesa ejije Netflix banyere ndụ onye na-edina mmadụ n'ike na Saụt Afrịka

    A mara Bester ikpe n’afọ 2012 maka idina n'ike na igbu ọchụ nke enyi ya nwaanyị na-eme ihe nlereanya ‘model’

    Ebe foto si, Gallo Images via Getty Images

    Nkọwa foto, A mara Bester ikpe n’afọ 2012 maka idina n'ike na igbu ọchụ nke enyi ya nwaanyị na-eme ihe nlereanya ‘model’

    Ụlọikpe ajụla igbochi nkesa ejije Netflix mepụtara banyere ndụ onye na-edina mmadụ n'ike na Saụt Afrịka a tụrụ mkpọrọ bụ Thabo Bester.

    E kwuru na ejije nke Netflix ahụ ga-egosipụta etu asị nwoke ahụ siri kwupụta ụgha banyere ọnwụ ya nke mere o jiri wee gbapụ n'ụlọ mkpọrọ.

    Ndị ọkaiwu ya rụrụ ụka na ejije ahụ nke a kpọrọ ‘Beauty and the Bester’ bụ ihe ga-akparị aha ya, mana Netflix gbachitere atụmatụ ya iwepụta mpụtara nnyocha nke akụkụ atọ ya.

    Na mkpebi ụlọikpe n’ụbọchị Fraịde 12 Septemba 2025, onye ọkaikpe kwuru na ikpe ndina n'ike bụ ihe dị n’ihu ọha na-ekwu na ha egosighi na arịrịọ ha dị ngwangwa.

    Cheta na a mara Bester ikpe n’afọ 2012 maka idina n'ike na igbu ọchụ nke enyi ya nwaanyị na-eme ihe nlereanya ‘model’ bụ Nomfundo Tyhulu.

    Otu afọ tupu mgbe ahụ, a mara ya ikpe maka idina n'ike na izu ụmụnwaanyị abụọ ọzọ ohi.

  9. Agaghị m ekwe ka aha di m nwụọ - Erika Kirk ekweela nkwa

    Charlie Kirk na nwunye ya ebe ha na amụrị ọnụ ọchi n'otu mmemme emere n'ọnwa Jenụwarị

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Charlie Kirk na nwunye ya ebe ha na amụrị ọnụ ọchi n'otu mmemme emere n'ọnwa Jenụwarị

    Nwunye onye na-akwado mgbanwe ọchịchị na mba Amerịka bụ Charlie Kirk, onye ojiegbe gbagburu na mahadum Utah nọ n'Amerịka ekweela nkwa na ọ gaghị ekwe ka aha di ya nwụọ n'okwu mbu ya kemgbe di ya nwụrụ.

    Erika Kirk gara n'ihu kwuo na “akwa nwaanyị di ya nwụrụ ga-adagharị gburugburu ụwa ka akwa agha”.

    N'aka nke ọzọ, e jidere onye dị afọ iri abụọ na abụọ si Utah maka ogbugbu nke Charlie Kirk, onye a gbagburu mgbe ọ nọ n’ọgbọ na emume mahadum n’izu a.

    A kpọchiri Tyler Robinson n'ime ngwụcha ụbọchị Tọzde ka a chọsịrị ya awa iri atọ na atọ nke kwụsịrị mgbe nna ya nyereaka mee ka o nyefee ndị uweojii onwe ya.

    Cheta na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump bụ onye mbụ kwupụtara njide ya, dịka ọ kpọrọ oku ka mee ka onye a na-enyo enyo nata ntaramahụhụ ọnwụ.

    Ogbugbu nke Kirk, onye agbagburu mgbe ọ na-arụrịta ụka n'ụka ụmụakwụkwọ na Wenezde, akpatala ndị Amerịka akpata oyi n'ahụ ma kpughee oke ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke mba ahụ.

  10. Onye osi nri Naịjirịa anwaala isi ite osikapa ‘jollof’ kachasị n'ụwa

    Hilda Baci bụ onye ji ọkwa onye kachasị esi nri ogologo oge n’ụwa n’afọ 2023
    Nkọwa foto, Hilda Baci bụ onye ji ọkwa onye kachasị esi nri ogologo oge n’ụwa n’afọ 2023

    Onye osi nri Naịjirịa ma bụrụkwa onye jibu ihe ndekọ ‘Guinness World Record,’ Hilda Baci, anwaala isi ite osikapa ‘jollof’ kasị ukwuu n'ụwa, bụ nri na-ewu ewu na mpaghara Ọdịda Anyanwu Afrịka.

    Ọtụtụ puku mmadụ gbakọtara na Legọs ka ha lelee ndekọ ụwa kachasị ọhụrụ nke osi nri ahụ, dịka o jidechara ọkwa onye kachasị esi nri ogologo oge n’ụwa n’afọ 2023 – o siri nri awa iri itoolu na atọ na nkeji iri na otu - ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụbọchị anọ.

    Ihe o jiri sie osikapa ‘jollof’ ya na-ewu ewu gụnyere osikapa 4,000kg (8,800 lb), katọn tomanto 500 na yabasị 600kg - ha niile wụsara n'ime ite arụrụ arụ ukwu nke fọrọ nke nta ka ọ bụrụ lita 23,000.

    Nri ahụ were ọtụtụ awa iji sie mana ugbua, ‘Guinness World Record’ ga-aga n’ihu ime nnoycha ya na ihe akaebe foto na vidiyo ya.

  11. Ndị be anyị, ụnụ asaala chi

    Ka ụbọchị taa maara onye niile mma

    Obiụtọ ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo n'ụbọchị taa bụ Satọde 12 Septemba, Afọ 2025.

    Gaa na websaịtị, Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị ka i nweta akụkọ niile na-akpọtụ n'ụwa.

    N'ụtụtụ a, ọ bụ Marvelous Obomanu ka gị na ha ga-anọrị mana Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga-emecha buru oche n'oge ehihie.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị.

  12. Nepal enwetala Praịm Minista nwaanyị mbụ mgbe emechara ngagharịiwe megide nrụrụaka

    A na-ele Shushila Karki anya dịka onye ezi omume

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, A na-ele Shushila Karki anya dịka onye ezi omume

    Onye bụbu onye ọkaikpe n'ụlọikpe kachasị elu nke Nepal bụ Sushila Karki abụrụla nwaanyị mbụ e mere Praịm Minista mgbe mba ahụ mechaara ngagharịiwe megide nrụrụaka nke chụpụrụ gọọmenti.

    Karki dị afọ iri asaa na atọ ṅụrụ iyi ọrụ n'obere emume, ma bụrụkwa nwaanyị mbụ ga-achị mba Himalaya dara ogbenye, ka ha na ndị isi ndị ngagharịiwe nwechara nkwekọrịta.

    Cheta na e gburu ihe karịrị mmadụ iri ise n'ọgụ ndị ngagharịiwe na ndị uweojii mgbe a na-eme nnukwu ngagharịiwe nke mmachibido iwu soshal midịa kpalitere.

    Mana e wepụrụ mmachibido iwu ahụ n’ụbọchị Mọnde - mana mgbe ahụ ngagharịiwe ahụ abụrụla nnukwu 'ọgbaaghara.

    Chetakwa na igwe mmadụ iwe na-ewe gbara ụlọomeiwu na ụlọ gọọmenti dị n’isi obodo Kathmandu ọkụ n’ụbọchị Tuzde, nke manyere Praịm Minista KP Sharma Oli ka ọ gbaa arụkwaghịm.

  13. Trump ekwuola na e jidela onye a na-enyo enyo gbagburu Charlie Kirk

    Tyler Robinson

    Ebe foto si, FBI

    Nkọwa foto, Tyler Robinson

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na e jidela onye a na-enyo enyo gbagburu Charlie Kirk.

    N’okwu Trump “Ọ dị m ka anyị ejidele onye gbagburu Kirk”.

    Trump gara n’ihu kọwaa na onye ha jidere dị afọ 28 maọbụ 29.

    Ọ sị na ọ bụ onye maala nwa amadị ahụ nyefere ya n’aka ndị ọrụ nchekwa.

    Ọ sị na ya na-atụanya na ụlọikpe ga-ekpe ikpe ya ngwangwa ma nye ya ahụhụ nwereike inwere ndụ ya.

    Mana aha onye ahụ dịka ụlọọrụ mgbasa ozi na mba Amerịka si ekwu bụ Tyler Robinson. Ha sị na ọ dị naanị afọ iri abụọ.

  14. INEC anabatala otu 14 chọrọ ịbụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị

    INEC ga-enwe nzụkọ n’etiti ha na ndị isioche n'odeakwụkwọ otu ndị ahụ ahọpụtara n’ụbọchị Wenezde 17 Septemba, 2025 n’isi ụlọọrụ ha n’Abuja.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, INEC ga-enwe nzụkọ n’etiti ha na ndị isioche n'odeakwụkwọ otu ndị ahụ ahọpụtara n’ụbọchị Wenezde 17 Septemba, 2025 n’isi ụlọọrụ ha n’Abuja.

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) si na ha ewepụtala aha otu ruru iri na anọ chọrọ ka e debanye aha dịka otu ndọrọndọrọ ọchịchị.

    Onye na-ahụ maka mgbasaozi n'ụlọọrụ INEC bụ Sam Olumekun kwupụtara nke a n’ụbọchị Tọzde 11 Septemba, 2025 mgbe ha nwechara nzukọ.

    Ọ kọwara na ihe ruru otu narị na iri ise na asaa tinyere akwụkwọ mana INEC nabatara sọọsọ iri na anọ.

    Otụ ndị Inec nabatara gụnyere:

    • African Transformation Party (ATP)
    • All Democratic Alliance (ADA)
    • Advance Nigeria Congress (ANC)
    • Abundance Social Party (ASP)
    • African Alliance Party (AAP)
    • Citizens Democratic Alliance (CDA)
    • Democratic Leadership Alliance (DLA)
    • Grassroots Initiative Party (GRIP)
    • Green Future Party (GFP)
    • Liberation People’s Party (LPP)
    • National Democratic Party (NDP)
    • National Reform Party (NRP)
    • Patriotic Peoples Alliance (PPA)
    • Peoples Freedom Party (PFP).

    Ihe ọzọ fọrọ ime dịka INEC si kwuo bụ inwe nzụkọ n’etiti ha na ndị isioche na odeakwụkwọ otu ndị ahụ a họpụtara nke ga-abịa n’ụbọchị Wenezde 17 Septemba, 2025 n’isi ụlọọrụ Inec dị n’Abuja.

  15. Burkina Faso akagbuola ụgwọ akwụkwọ njem ‘visa’ maka ndị Afrịka

    E kwuru na iwu ọhụrụ a bụ maka iji akwalite njem mmadụ na mbụbata ngwaahịa na mba ahụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, E kwuru na iwu ọhụrụ a bụ maka iji akwalite njem mmadụ na mbụbata ngwaahịa na mba ahụ

    Mba Burkina Faso ekwuola na ndị njem niile si mba ndị dị n’Afrịka agaghị akwụ ụgwọ maka akwụkwọ njem ‘visa’ dịka ha na-agba mbọ iji akwalite njem mmadụ na mbụbata ngwaahịa na mba ahụ.

    "Site ugbu a gaa n'ihu, ụmụafọ ọ bụla si na mba Afrịka chọrọ ịbịa Burkina Faso agaghị akwụ ụgwọ ọ bụla iji nwete visa," Mahamadou Sana, onye bụ minista nchekwa nke mba ahụ, kwuru.

    Nke a na-esochi nzukọ ndị minista nke onyeisi ndịagha bụ Ibrahim Traoré haziri n’ụbọchị Tọzde 11 Sepụtemba 2025.

    Mana minista ahụ kọwara na ndị ọbịa si Afrịka chọrọ ịbịa na mba ahụ ga-etinye akwụkwọ maka inwete akwụkwọ njem ‘visa’ n'ịntanetị, nke a ga-enyocha maka inye nkwado.

    Ka ọ dị ugbua, mba ahụ dị na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka esonyeela mba ndị dịka Gana, Rụwanda na Kenya, bụ ndị mere ka njem nke ndị ọbịa si Afrịka, dị mfe.

  16. Nnyocha anyị mere gosiri na ọkwọụgbọelu Air Peace ṅụrụ mmanya - NSIB

    Nnyocha anyị mere gosiri na ọkwọụgbọelu Air Peace ṅụrụ mmanya - NSIB

    Ebe foto si, NSIB, Air Peace/X

    Nnyọcha ụlọọrụ na-eme nnyocha gbasara nchekwa na Naịjiria bụ ‘Nigeria Safety Investigation Bureau’ mere egosila na onye ọkwọụgbọelu Air Peace na ndị otu ya kwọ ụgbọelụ gaa Pọtakọt dị na Rivas steeti ṅụrụ mmanya ọkụ.

    Cheta na ụbọchị 13 Julaị, 2025 onye ọkwọụgbọelu Air Peace Boeing 737-524 bu akara 5N-BQQ kwọ ndị njem iri itoolu na isii gbafee okporo okporo ụgbọelu na Riva steeti, bụ nke tinyere ndụ ndị njem n’ihe egwu mana o nweghị onye nwụrụ.

    Mgbe NSIB mere nnyocha, ha chọpụtara na onye kwọ ụgbọelu ahụ na onye otu ya ṅụrụ mmanya nwere ‘Ethyl Glucuronide (EtG)”, nke gosiri ihe na-aba n'anya na ọgwụike ‘nicotine’.

    Ozi ụlọọrụ Air Peace wepụtara n'ọbaozi X ha kwuru na NSIB enyebeghị ha nnyocha ha mere ma kọwaa na ụlọọrụ ha na-eme nnyocha mmanya ọkụ na ọgwụike maka ndị na-akwọ ụgbọelụ mgbe ọbụla, karịsịa awa asatọ tupu njem amalite, dịka iwu si kwado.

    Ha gara n’ihu kwuo na ha akwụsila ọkwọụgbọelụ ahụ ọrụ, mana ọ bụghị maka mmanya ọkụ na ọgwụike, kama ọ bụ maka na o rubeghị isi n'ihe onye ọrụ ibe ya ya kwuru mgbe ha nọ n’ụgbọelụ ahụ.

  17. E bola osote onyeisiala mba Saụt Sụdan ebubo igbu ọchụ na ịgba ọchịchị mgba okpuru

    Riek Machar nọ mkpọrọ n'ụlọ ya kemgbe ọnwa Maachị

    Ebe foto si, Reu

    Nkọwa foto, Riek Machar nọ mkpọrọ n'ụlọ ya kemgbe ọnwa Maachị

    E boro Osote onyeisiala mbụ nke Saụt Sụdan Riek Machar ebubo igbu ọchụ, ịgba ọchịchị mgba okpuru na mpụ megidere mmadụ dịka ụfọdụ na-atụ egwu nke a nwereike ịmalite agha obodo na mba ahụ.

    Minista na-ahụ maka ikpe ziri ezi bụ Joseph Geng Akech kwuru na ebubo a na-ebo Machar metụtara mwakpo nke otu ndịagha nnupụisi mere n’ọnwa Maachị gburu ndịagha narị abụọ na iri ise na otu Ọchịagha, nke ebubo kwuru na osote onyeisiala ahụ maara maka ya,.

    Na nzaghachi, onye nkwuchite ọnụ Machar katọrọ ebubo ahụ ma kwuo na ọ bụ "mkpagbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị".

    Ka ọ dị ugbua, ndịagha ejirila tankị gbochie ụzọ ndị esi aga n'ụlọ Machar dị n’isi obodo Juba.

  18. Gọvanọ Otti abịnyela aka n'iwu ga-achịkọta usoro nkesa ọkụ latrik dị nta

    Gọvanọ Otti abịnyela aka n'iwu ga-achịkọta usoro nkesa ọkụ latrik dị nta

    Ebe foto si, Abia state government/Getty Images

    Gọvanọ Abịa steeti bụ Alex Otti abịnyela aka n’iwu ga-achịkọta usoro nkesa ọkụ latrik dị nta n’Abịa steeti a kpọrọ Abia Mini-Grid Regulation n’asụsụ Bekee.

    Nke a bụ usoro iwu e mere iji mepeere ndị ruru eru itinye ego na ngalaba ọkụ latrik nke steeti ahụ.

    E wepụtara iwu a iji kwalite mmepụta na nkesa ọkụ latrik, ọkachasị n'ebe ọkụ latrik na-erubeghị maọbụ ebe ọ na-ezughị oke na steeti ahụ.

    Oge ọ na-abịnye aka n'akwụkwọ iwu ahụ n’obi ọchịchị dị n'Ụmụahịa, Otti kwuru na usoro ọhụrụ a agaghị abụ naanị na ọ ga-agbasapụ ụzọ dị iche iche na-achịkọta ọkụ latrik a pụrụ ịtụkwasị obi maka mmadụ niile, kama, ọ ga-abụkwa nke ga-akwalite mmepe ụlọọrụ mmepụta ngwaahịa na mmụba akụnaụba maka ọtụtụ nde mmadụ nọ n'Abịa.

    Ọ kọwara na, iwu ahụ a kpọrọ ‘Iwu Nhazi Maka Ọkụ Latrik dị Nta Nke Abia Steeti’ na-enye ọsịsa doro anya maka ajụjụ gbasara teknụzụ na azụmahịa sitere n'aka ndị na-etinye ego na ndị na-erite uru ya.

    Ọ sịrị na iwu ahụ na-akọwapụta ikike na ọrụ dịịrị ndị niile o metụtara, ma wepụtakwa ụzọ a ga-esi dozie esemokwu na-agaghị egbu oge.

    O kwere ndị Abia nkwa na ọchịchị ya gbakwasara ụkwụ n’ihe mba niile na-achọ, nke bụ ka a na-etinyekwu nnukwu ego n'ihe gbasara ikike ọkụ a na-emepụta nakwa ikike ọkụ kennwogharị (renewable energy).

    Gọvanọ Otti abịnyela aka n'iwu ga-achịkọta usoro nkesa ọkụ latrik dị nta

    Ebe foto si, Abia state government

    Kọmishọna na-ahụ maka ikike ọkụ na ihe ndị e ji enyere ndụ aka bụ Maazị Ikechukwu Monday, kwuru na site n'iwu a, steeti Abịa esorola n'ime gọọmentị steeti mbụ na Naịjirịa wepụtara usoro iwu doro anya na nke ziri ezi maka mmepe usoro ọkụ latrik dị nta.

    O kwuru na nke a na-ezipụ ozi siri ike nye ndị na-etinye ego, ndị ọrụ mmepe, na ụmụ amaala Abịa steeti dị njikere ịnabata echiche ọhụrụ n'ihe gbasara ikike ọkụ.

    Onye nnọchite anya otu 'International Solar Alliance' (ISA) bụ Onyi Iyizoba, mgbe ọ na-ewepụta akwụkwọ iwu nhazi ahụ, gosipụtara nchekwube na ọ ga-adọta ego itinye n'ọrụ ndị ọhụrụ, mee ka ọrụ inye ọkụ latrik n'ime ime obodo gaa n'ihu ngwangwa, ma kwalite ogogo ndụ na azụmahịa maka ọtụtụ ndị bi na steeti ahụ.

  19. A kpọpụla mmadụ karịrị nde abụọ n’ebe e nwere nnukwu idemmiri na Pakistan

    A kpọpụla mmadụ karịrị nde abụọ n’ebe e nwere nnukwu idemmiri na Pakistan

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị ọchịchị kwuru na ha akpọpụla mmadụ karịrị nde abụọ na mpaghara Punjab nke mba Pakịstan dịka nnukwu idemmiri kpara mkpamkpa na mpaghara ọwụwa anyanwụ mba ahụ.

    Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ọnọdụ gbatagbata bụ Inam Haider Malik gwara ndị ntaakụkọ n’ụbọchị Tọze na a kpọpụla mmadụ otu narị puku na iri ise ndị ọzọ na mpaghara Sindh.

    Ọ dọkwara aka na ntị na ọnụọgụ mmadụ ndị a ga-akpọpụ nwereike ịrị elu n’ime ụbọchị ndị na-abịa abịa.

    Ozi e nwetara n’ụlọọrụ International Medical Corps n’ụbọchị Fraịde kwuru na nnukwu mmiri ozuzo egbuola mmadụ karịrị narị itoolu na mba ahụ kemgbe ọnwa Juun.

    Mgbanwe ihu igwe emeela ka idemmiri kawanye njọ na mba Pakịstan, dịka nnukwu mmiri ozuzo mere ka osimiri rịa elu karịa etu o kwesịrị.

    Mana ndị nkatọ tara gọọmenti ụta maka etinyeghị ego n’ịbelata ihe ọdachi, dịka usoro mgbaama dị mma nakwa ngwongwo e ji enyere ndụ aka.

  20. Ndị be anyị, ụnụ asaala chi, Ka ụbọchị taa maara onye niile mma

    Obiụtọ ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo n'ụbọchị taa bụ Fraịde Afọ 12 Septemba, 2024.

    Gaa na websaịtị, Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị ka i nweta akụkọ niile na-akpọtụ n'ụwa.

    N'ụtụtụ a, ọ bụ Chinonso Ugorji na Marvelous Obomanu ka gị na ha ga-anọrị mana Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga-emecha buru oche n'oge ehihie.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị.