Ndị isi mpaghara Etiti Ọwụwa Anyanwụ na Yurop anabatala atụmatụ udo Gaza nke Trump

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Septemba 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Onye Chaịna efuola ka e mechara mwakpo na Naịjirịa

    Onye Chaịna efuola ka e mechara mwakpo na Naịjirịa

    Ebe foto si, Getty Images

    A ka na-achọ onye Chaịna a na-ebo ebubo na ndị ojiegbe tọọrọ n’ụbọchị Fraịde.

    E gburu ndị ọrụ Civil Defence asatọ ha na onye Chaịna ahụ so, tinyere ndị otu ya anọ oge ndị ojiegbe mere mwakpo n’Edo steeti.

    Onye Chaịna ahụ na-arụ n’ụlọọrụ BUA cement na ndị ọrụ Civil Defence nọ na-eme njem oge a gbara ha egbe.

    A tọọrọ mmadụ anọ n’ime ha ma mechaa tọghapụ ha mana achọtabeghị otu n’ime ha, ka ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Civil Defence bụ Afolabi Babawale kwuru.

    Agaala n’ihu na-ahụta mwakpo ndị ekperima na Naịjirịa, ọkachasị na mgbago ugwu, ebe ntọrọ mmadụ maka ego mgbapụta na-arị elu.

  2. Netanyahụ aṅụọla iyi na ya ga-ejide ndị niile nyere aka oge e mere mwakpo, gbuo mmadụ isii na Jerusalem

    Netanyahụ aṅụọla iyi na ya ga-ejide ndị niile nyere aka oge e mere mwakpo, gbuo mmadụ isii na Jerusalem

    Ebe foto si, EPA

    Praịm Minista Izrel bụ Benjamin Netanyahụ aṅụọla iyi na ya “ga-ejide ndị niile nyere aka” oge a kwara mgbọ na Jerusalem ma gbuo opekatampe mmadụ isii.

    Ndị ọchịchị “na-achụ ma na-agba okirikiri” n’obodo ebe ndị ahụ mere mwakpo siri pụta, ka Netanyahu gbakwunyere.

    Ndị uweojii mba Izrel kwuru na ha “memilara ndị oyi ọha egwu abụọ” oge ha kwachara mgbọ n’ọdọụgbọala dị na Ramot Junction nke mgbago ugwu mba ahụ.

    Ndị ọrụ gbatagbata Magen David Adom nke mba Izrel kwuru na ndị nwụrụ anwụ bụ ụmụokoroọbịa atọ na-akarịbeghị afọ iri atọ, otu nwaanyị na-akarịbeghị afọ iri ise na otu nwoke na-akarịbeghị afọ iri ise.

    Opekatampe, mmadụ asaa merụrụ nnukwu ahụ dịka e bugara mmadụ itoolu mgbọ egbe tụtara n’ụlọọgwụ.

  3. Gọọmenti na-eleba anya ịhụ na anyị agaghị agba abụbụọrụ - PETROAN

    Ọtụtụ ụgbọala na-ebu mmanụ agbidi ka ha kwụcha n'ahịrị n'ụlọọrụ Dangote na-esipụta mmanụ ụgbọala

    Ebe foto si, NNPCL/X

    Otu ngalaba na-ahụ maka orure mmanụ agbidi na Naịjirịa bụ Petroleum Products Retail Outlets Owners Association of Nigeria (PETROAN) ekwuola na Gọọmenti etiti amalitela inwe mkparịtaụka iji gboo nsogbu mere ha ji chọrọ ịgba abụbụọrụ.

    Onyeisi otu a bụ Billy Gillis-Hary kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV nwere n’ụbọchị Mọnde.

    Ọ gụpụtara ihe ndị mere ha ji chọrọ ịgba abụbụọrụ nke gbakwasịrị ụkwụ n’ebubo na ụlọọrụ Dangote na-esipụta mmanụ chọrọ ịkpakọrọ ihe niile.

    Mana o kwuru na ndị ọnụ na-eru n’okwu na gọọmenti na-enwe mkparịtaụka iji gboo nsogbu a.

    Ndị otu a kwuburu na ha ga-akwụsị ibupu na ikesa mmanụ ụgbọala n’ụbọchị Tuzde 9 Sepụtemba, 2025.

    Odeakwụkwọ ha bụ Joseph Obele kwuru na nke a ga-amalite ma ọ bụrụ na mkparịtaụka ha na gọọmenti amịtaghị mkpụrụ.

    Ha ṅụrụ iyi ime nke a iji gbochie ọnọdụ ‘ọ bụ naanị m’ nke ụlọọrụ Dangote na-eme ma chekwaa ndị ọrụ mmadụ ụgbọala.

    N’ebubo niile a, ụlọọrụ Dangote ekwubeghi ihe ọbụla.

  4. Ndị uweojii ahụla ụmụaka mba New Zealand na-efu efu e gburu nna ha

    Ndị uweojii ahụla ụmụaka mba New Zealand na-efu efu e gburu nna ha

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Ndị uweojii mba New Zealand ahụla ụmụaka atọ ahụ na-efu efu e gburu nna ha bụ Tom Phillips na mpaghara ọdịda anyanwụ Waikato n’ụtụtụ Mọnde 8 Septemba, 2025.

    E kwuru na Tom Phillips kpọọrọ ụmụaka atọ ahụ gbaa ọsọ kemgbe afọ anọ gara aga. E kwuru na ọ bụ n’ime ọhịa ka ọ kpọọrọ ụmụaka ahụ gbabaa mana ndị uweojii gburu ya dịka ha gara ebe ndị ohi.

    Otu ụmụaka ahụ na Phillips nọ oge ahụ ndị uweojii gbagburu ya ma nyere ndị uweojii aka chọta ụmụnne ndị ọzọ.

    Nne ha kọwara mwute ya banyere njinji a ma too ndị uweojii maka ịchọta ụmụaka ya.

    Ụmụaka atọ ahụ bụ Ember gbara afọ 9, Maverick dị afọ 10 na Jayda dị afọ 12.

    E kwuru na ụmụaka ahụ nọ n’aka ndị uweojii ugbua.

    Ụmụaka atọ ahụ a chọtara

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

  5. Gọọmenti arịọla otu NUPENG ka ha kagbuo abụbụọrụ ha chọrọ ịgba

    Gọọment Naịjiria  arịọla otu ndị na-ahụ maka ndị ọrụ mmanụ ụgbọala ka ha hapụ ịme nkwụsịtụ ọrụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọọment etiti arịọla otu jikọtara ndị ọrụ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa bụ NUPENG ka ha tụgharịa uche ma kagbuo abụbụọrụ ha chọrọ ịgba malite n'ụbọchị Mọnde 8 Sepụtemba, 2025.

    NUPENG na ụlọọrụ Dangote na-enwe esemokwu maka na Dangote manyere ndị ọkwọụgbọala mmanụ ya rụrụ puku anọ ka ha bịanye aka n’akwụkwọ na ha agaghị eso otụ ọbụla na galaba mmanụ.

    Mana NUPENG gbarụrụ iwu ma kwuo na omume a Dangote mere bụ mkparị megide iwu na-achịkwa ọnọdụ ọrụ ndị mmanụ na mbaụwa bụ nke Naịjịrịa bịanyere aka na ya.

    Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ na Naịjiria bụ Muhammad Maigari Dingyadi n’ụbọchị Sọnde 7 Septemba, 2025 si ka ndị NUPENG nye udo ohere maka na ihe gbasara mmanụ ụgbọala dị oke mkpa.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ọ ga-enwe mkparịtaụka n’etiti NUPENG na ndị ihe a metụtara n’ụbọchị Mọnde 8, Sepụtemba, 2025.

    Mịnịsta Dingyadi rịọrọ otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ NLC ka ha wepụ iwu ha nyere ndị otu ha nke sị ha kwadoo ma soro NUPENG gbaa abụbụọrụ.

  6. Gọvanọ Borno Steeti etiela ezianụlọ mmadụ 63 nwụrụ na mwakpo ndị ojiegbe aka n’obi

    Akụkọ kwuru na ndịagha ise so na ndị ahụ nwụrụ dịka ha laghachitara n’obodo ahụ kemgbe ha gbara ọsọ ndụ.

    Ebe foto si, Borno Steeti

    Gọvanọ Borno Steeti bụ Babagana Umara Zulum agaala mgbaru n’obodo Darajamal dị n’okpuru ọchịchị Bama iji tie ezinaụlọ mmadụ 63 ahụ nwụrụ site na mwakpo ndị ojiegbe mere n’ebe ahụ n’abalị Fraịde, 5 Septemba, 2025.

    Akụkọ kwuru na ndịagha ise so na ndị ahụ nwụrụ dịka ha laghachitara n’obodo ahụ kemgbe ha gbara ọsọ ndụ.

    Obodo ahụ ka anyị nụrụ na ndịagha Naịjirịa nwere ogige ma bụrụ ebe ndị omekome a na-akpa ike dị egwu kemgbe.

    Gọvanọ Zulum zutere ndị isi obodo ahụ ma tie ezinaụlọ ndị o metụtara aka n’obi ma kwe nkwa inye ha ezi nkwado n’oge iru uju a.

    O kwuru na o nyela iwu ka ndị ọrụ nchekwa rụọ ọrụ ma weta ezi nchekwa n’obodo ahụ.

    N;aka nke ọzọ, Sinetọ na-anọchiteanya mpaghara ahụ bụ Sinetọ Kaka Shehu Lawan katọrọ mwakpo ahụ nke ọ kọwara dị ihe jọgburu onwe ya.

  7. Obodo Umuaka Asa dị n’Abia Steeti ehiwela arụsị ga-echekwa ha n’aka ndị ohi

    Ndị obodo ahụ kwuru na arụsị a ga-echekwa ma gbochie ndị omekome ịwakpo maọbụ zuo ha ohi.

    Ndị obodo Umuaka Asa dị n’opkuru ọchịchị Ukwa West Abịa Steeti ehiwela arụsị ga na-echekwa akụrụngwa a rụrụ n’obodo ha.

    Ndị obodo ahụ kwuru na arụsị a ga-echekwa ma gbochie ndị omekome ịwakpo maọbụ zuo ha ohi.

    Nke a na-abịa dịka e boro Eze obodo ahụ bụ Eze Sunday Nwogu ebubo ma izu igwe ọkụ Transformer abodo ahụ.

    Mana Praịm mịnịsta obodo Umuaka Asa bụ Sampson Nwaigwe kwuru na ọ bụghị Eze obodo ha zuuru igwe ọkụ ahụ. O kwuru ọ bụ ndị omekome a na-amaghị zuru igwe ọkụ ahụ nakwa eriri ọkụ armoured ya na ya so.

    Sampson Nwaigwe kwuru na ọ bụ maka oke ohi a na-aga n’ihu n’obodo mere ha ji hiwe arụsị ahụ ma kwuo na arụsị ahụ agaghị egbochi ndị okpukperechi ụka Kraịst ije ụka oge ọbụla ha chọrọ.

    Onyeisi ndị ọrụ nchekwa Umuaka Vigilante Network bụ Nwokeukwu Damian kwuru na ha mechara hụ eriri ọkụ amoured ahụ e zuuru.

    E kwuru na ọ bụ otu nwoke zọrọ ọkwa Igwe obodo ahụ bụ onye na-akwado ndị omekome ahụ na-akpa mkpamkpa n’obodo ahụ.

  8. Rọshịa atụọla ogbunigwe n'otu n'ime isiụlọọrụ gọọmenti Yukren dị na Kyiv

    Anwụrụ ọkụ si n'ụlọọrụ gọọmenti Yukren dị na Kyiv ekupụta

    Ebe foto si, Reuters

    Mba Rọshịa tụrụ ogbunigwe n’otu n’ime ụlọọrụ gọọmenti mba Yukren dị n’obodo Kyiv n’abalị - BBC hụrụ ka ogbunigwe na anwụrụ ọkụ na-arị elu n’isiobodo mba Yukren.

    Ọ na-ara ahụ ka ogbunigwe mba daa n’etiti obodo ahụ n’ihi ngwaagha nchekwa dị n’elu dịka onye ntaakụkọ BBC siri dee.

    N’ebe ọzọ dị n’obodo ahụ, ogbunigwe gbatara ọtụtụ ụlọelu ndị mmadụ bi ma mebie akụkụ ụlọ ndị ahụ - mmadụ abụọ anwụọla, nke gụnyere obere nwa ebe mmadụ iri na isii ọzọ merụrụ ahụ.

    Rọshịa wakpokwara obodo Kryvyi Rih – bụ obodo Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky – gbarie ụlọọrụ atọ.

    Mwakpo a na-abịa dịka Onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin dọrọ mba ndị mpaghara Ndịda Anyanwụ ka ha ghara iziga ndịagha udo na Yukren ma e nwechaa nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ.

    Na nzaghachị ogbunigwe ahụ, Onyeisiala Zelenskykpọkuru ndị enyi ya ka ha “tinye nkwekọrịta ha nwere n’obodo Paris, nke Fransị n’ọrụ”.

    N’ozi o wepụtara na Telegram, Zelensky kwuru na ogbunigwe dị iche iche karịrị narị asatọ (800) dakwasịrị mba ha.

    N’aka nke ọzọ, mba Rọshịa kwuru na ha gbochiri ogbunigwe ruru iri isii na itoolu nke mba Yukren tụrụ na mba ha n’abalị.

    Ha kwuru na ogbunigwe ndị a chọrọ ịda n’obodo dị iche iche gụnyere Krasnodar Krai, mpaghara Voronezh, Belgorod na ebe ndị ọzọ.

  9. Trump ekwuola na a ga-agbatu ụgbọelu Venezuela ma ha tinye ụgbọmmiri Amerịka n'ihe egwu

    Onyeisiala Venezuela bụ Nicolás Maduro kwuru na ebubo mba Amerịka gbasara mba ya abụghị eziokwu

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Venezuela bụ Nicolás Maduro kwuru na ebubo mba Amerịka gbasara mba ya abụghị eziokwu

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump adọọla aka na ntị na ha ga-agbatu ụgbọelu Venezuela ma ọ bụrụ na ha tinye ụgbọmmiri ndịagha Amerịka n’ihe egwu.

    Ịdọ aka na ntị nke Onyeisiala Trump na-abịa mgbe ụgbọelu ndịagha Venezuela fefere ugboro abụọ n'ime abalị abụọ n'akụkụ ụgbọmmiri mba Amerịka na mpaghara ndịda Amerịka dịka ndị ọrụ Amerịka gwara ụlọọrụ CBS News ha na BBC na-arụkọ ọrụ.

    Nke a na-abịa n’ihi mwakpo mba Amerịka gburu mmadụ iri na otu na-ibu agha megide ihe ndị ọrụ Trump kwuru na ọ bụ "ụgbọ otu ndị omempụ na-ebu ọgwụ ike site na Venezuela".

    Mana Onyeisiala Venezuela bụ Nicolás Maduro kwuru na ebubo mba Amerịka gbasara mba ya abụghị eziokwu.

  10. Dọkịta nyere m ezumike abalị abụọ maọbụ atọ maka ahụike m - Peter Obi

    Peter Obi na ndị ọzọ

    Ebe foto si, Peter Obi/FB

    Nkọwa foto, Peter Obi na ndị ọzọ

    Peter Obi bụ onye zọrọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n’afọ 2023 ekwuola na dọkịnta gwara ya zuo ike ihe dịka abalị abụọ maọbụ atọ.

    Obi mere ka a mata nke a n’ozi ọ wepụtara n’akara soshal mịdịa ya n’ụbọchị Satọde, Ọgọst 6, 2025.

    Dịka ọ si kọwaa “n’Enugwu steeti ka m nwere ọnọdụ ahụike adịghị mma nke mere m ji gaa ụlọọgwụ”.

    N'okwu ya "maka nke a, enweghị m ike ime maọbụ ịgaa ebe niile a kpọrọ m oku ma n’ime Naịjirịa nakwa mba ofesi n’ime izuụka a.

    “E ji m obi m na-arịọ ka unu ghọta m ọkachasị ndị ọnọdụ m nwereike emetụta”.

    Cheta na Peter Obi gara n’ọgbakọ a kpọrọ ya n’Enugwu, Anambra na Imo steeti steeti n’otu ụbọchị ahụ.

  11. Ndị ọrụ gbatagbata na-eji inyinya ekesasị ihe enyemaka ebe mbuze mere na mba Sụdan

    Ndị Save the Children ji inyinya n'ebe ahụ mbuze mere na Sụdan

    Ebe foto si, Save the Children

    Nkọwa foto, Sụdan

    Ndị ọrụ enyemaka "Save the Children" ji inyinya ekesasị ngwa enyemaka n'ebe mbuze gburu ọtụtụ ndị mmadụ n'obodo ugwu dị na mpaghara ọdịda Darfur na mba Sụdan.

    Oke mmiri ozuzo na ide mmiri kpatara ihe mberede ahụ mere n’obodo Tarsee n’ụbochị Sọnde 31 Ọgọst, 2025.

    Ọ bụ naanị inyinya bụ ihe a ga-eji mee njem ruo n'ezinaụlọ ndị mbuze metụtara.

    Dịka Francesco Lanino bụ otu onye ọrụ enyemaka ụlọọrụ “Save the children” si kwuo, ezinaụlọ ndị nọ n'obodo ihe a mere gba aka, ha enweghị ihe ọbụla.

    Etu ọnọdụ si dị ugbua, amabeghị mmadụ ole nwụrụ n’ihe mberede a.

  12. Nwoke aha ya bụ Mark Zucherberg akpụpụla onye nwe Facebook ụlọikpe maka ebubo abụọ

    Onye okaiwu Amerịka ha na onye kewapụtara soshịal midia Facebook Mark Zuckerberg na-azakọta otu aha

    Ebe foto si, Getty Images/Mark S Zuckerberg

    Nkọwa foto, Onye okaiwu Amerịka ha na onye kewapụtara soshịal midia Facebook Mark Zuckerberg na-azakọta otu aha

    Otu nwoke bụ onye ọkaiwu na mba Amerịka aha ya bụ Mark Zuckerberg agbaala onye nwepụtara soshịal midia Facebook bụ Mark Zuckerberg akwụkwọ n'ụlọikpe maka ebubo izuru aha ya.

    Onye ọkaiwu ahụ bụ Mark S Zuckerberg sị na a gbanyụrụ akara ọbaozi facebook ya ugboro ise n’ime afọ asatọ dịka ọ kọwara na o furu ya ọtụtụ puku dollar n'ahịa furu efu.

    Onye ọkaiwu ahụ sị na aha ya bụ Mark Steven Zuckerberg kọwara na ọ malitere ime ihe gbasara iwu kamgbe afọ iri atọ na asatọ oge onye nwe facebook bụ Mark Elliot Zuckerberg ka bụ nwatakịrị.

    Ọ si na Meta bụ ụlọọrụ nwe Facbook mebiri nkwekọrịta maka na ya kwụrụ ha ụgwọ puku iri na otu na dọlla $11,000 (£8,200) maka mgbasa ozi nke ha wedara.

    Mana Meta si na ha eweghachitela akara ọbaọzi onye okaiwu a nakwa na-eme ihe iji gbochie mmejọ ahụ ịbịaghachi ọzọ.

  13. Ndị obodo ji aka na-abọ ala iji wepụta ndị mbuze kpochiri n’ime ala na Sụdan

    Sudan

    Ebe foto si, Sudan Liberation Movement/Army

    Nkọwa foto, Sudan

    Otu na-arụ ọrụ gbatagbata na mba Sụdan a kpọrọ “Save the Children” ekwuola na ọ bụ naanị aka nkịtị ka ndị obodo ji na-abọ ala ka ha bọpụta ndị nke ha ala ọmajiji kpochiri n’ime ala na mpaghara Darfur.

    Francesco Lanino bụ onye wenitere isi n’ụlọọrụ "Save the children" kwuru na ọ bụ maka na enweghị akụrụngwa ọbụla e nyere ha maọbụ gọọmenti wetere maka ịzọpụta ndị ahụ.

    Amabeghị mmadụ ole nwụrụ n’ala ọmajiji ahụ mana a na-ekwu na ọnụ ọgụgụ ha nwereike iru ihe dịka otu puku.

    Ozi si na ngaraba gọọmenti na-ahụ maka ohuike na mpaghara ahụ na-ekwu na ọ bụ naanị ozu mmandụ abụọ ka e wepụtara.

    N’aka nke ọzọ “Save the Children” kwuru na e wepụtara okpekatampe ozu mmadụ 373, na-ekwu na mmdụ ruru otu puku nwereike ịnwụ n’ihe mgberede ahụ ma kwuo na nke ahụ gunyere ụmụaka ọnụ ọgụgụ ha dị narị abụọ.

  14. E bola ndịagha RSF ebubo mpụ megide mmadụ maka ịnọchibido obodo el-Fasher na Darfur

    Ndị RSF weghaara ogige ndị gbara ọsọ ndụ na Zamzam na mbido afọ a

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị RSF weghaara ogige ndị gbara ọsọ ndụ na Zamzam na mbido afọ a

    Otu mba ụwa ebola ndịagha Rapid Support Forces (RSF) ebubo mpụ megidere mmadụ mgbe ha nnọchibidoro obodo el-Fasher na Darfur, dịka ndị nnoycha ụlọọrụ UN siri kwuo.

    Ngalaba nke UN Fact-Finding Mission boro otu ahụ ebubo "igbu mmadụ, mmekpa ahụ, ịgba ohu, idina mmadụ n'ike, ịgba ohu mmekọahụ, ime ihe ike, ịkwaga n'ike na mkpagbu n'ihi agbụrụ, okike na ndọrọ ndọrọ ọchịchị".

    Ọ kọwapụtakwara ihe akaebe gosipụtara ebubo mpụ agha megidere ndị RSF na ndịagha, n'agbanyeghị na ha abụọ gọnarịrị ime ihe ọjọọ ọ bụla n’agha obodo na-aga n'ihu na Sụdan.

    Ụlọọrụ UN kwukwara na otu abụọ a mere mpụ agha megide ndị nkịtị n'ọtụtụ ụzọ ma kwukwa na mpụ ahụ bụ atụmatụ a kpachapụrụ anya mee.

  15. Onyeisiala Trump weghachiri ngalaba nchekwa dịka ngalaba agha

    Ngalaba ahụ ga-ebu ụzọ jiri aha ọhụrụ a dịka "aha nke abụọ" dịka ọchịchị Trump ga-aga n’ihu inweta nkwenye ụlọomeiwu

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ngalaba ahụ ga-ebu ụzọ jiri aha ọhụrụ a dịka "aha nke abụọ" dịka ọchịchị Trump ga-aga n’ihu inweta nkwenye ụlọomeiwu

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ebinyela aka n’iwu ọhụrụ nke kwuru na Ngalaba nchekwa ga-abụzi Ngalaba agha.

    Cheta na Ngalaba agha bụ aha nke ụlọọrụ ahụ zara ikpeazụ n’afọ ndị dị na 1940 mana ozi nke BBC hụrụ kwuru na ebumnuche aha ahụ bụ iji "gosipụta ike na mkpebi".

    Ka ọ dị ugbua, ngalaba ahụ ga-ebu ụzọ jiri aha ọhụrụ a dịka "aha nke abụọ" dịka ọchịchị Trump ga-aga n’ihu inweta nkwenye ụlọomeiwu iji mee ka mgbanwe ahụ dịgide adịgide.

    N’aka nke ọzọ, obi ọchịchị Amerịka bụ White House ekwubeghị ego ole nweghachi aha ahụ ga-eri, mana ụlọọrụ mgbasa ozi mba Amerịka na-atụ anya na ọ ga-eri ego ruru ijeri dọla maka imechi ọtụtụ narị ụlọọrụ, akara ngosi, adreesị ozi na uwe njirimara ha.

  16. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma

    Anyị na-asị nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo n'ụbọchị taa bụ Satọde 6 Septemba, 2025.

    Biko sonyere anyị na websaịtị anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Gaakwa na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị ka kirie akụkọ foto na vidiyo.

    Gaa n'ihu nọnyere anyị.

  17. Ị bụ osote Praịm Minista bụ nkwanye ugwu m nwere na ndụ - Lammy

    David Lammy

    Ebe foto si, PA Media

    Nkọwa foto, David Lammy

    David Lammy ekwuola okwu banyere ọkwa ọhụrụ e nyere ya dịka Osote Praịm Minista mba Briten.

    E nyere David Lammy ọkwa ahụ mgbe Angela Rayner rituru na ya, gbaa arụkwaghịm n'ihi akwụghị ụtụisi zuru oke.

    Lammy jiri akara X soshal mịdịa sị na “ọ bụ nkwanyere ugwu na e nyere m ọkwa dịka osote Praịm mịnịsta" nakwa odeakwụkwọ ngalaba iwu nke Keir Starmer.

    “Kamgbe m bụ nwata na Tottenham, ebum n’obi na m ga-enyereaka mee ka obodo a bụrụ ebe ga-abara mmadụ niile uru, bụrụ ebe nchekwa dị nakwa ebe ka mma”.

    Lammy tokwere onye nke si n’ọkwa ahụ pụọ bụ Rayner maka “ọrụ ọ rụrụ” n’ọkwa ọchịchị.

  18. Hamas ewepụtala onyonyo ndị Izrel abụọ ha tọọrọ, jichie na Gaza

    A hụrụ Guy Gilboa-Dalal n'onyonyo ndị Hamas wepụtara sị n'ebe ọ nọ bụ na Gaza

    Ebe foto si, Hamas

    Nkọwa foto, Guy Gilboa-Dalal

    Hamas ewepụtala onyonyo ndị Izrel abụọ ha tọọrọ ma jichie na Gaza.

    Mmadụ abụọ ndị ahụ so na ndị a tọọrọ n’Izrel n’Ọktoba 2023 n’oge Hamas nwapkoro mba Izrel.

    N’onyonyo ahụ Hamas wepụtara ka a hụrụ Guy Gilboa-Dalal n'ebe a sị na ọ bụ mpagahara Gaza n’ihe dịka ngwụcha ọnwa Ọgọst.

    Guy kwuru na ya na mmadụ asatọ ndị ọzọ ka nọ n’aka ndị Hamas n’agbanyeghị na mba Izrel na-ebuso Hamas agha.

    Onyonyo ahụ gosikwara onye ọzọ nọ n’aka ndị Hamas aha ya bụ Alon Ohel.

    N’oge garaaga, ndi ọnụ na-eru n’okwu katọrọ ndị Hamas mgbe ha wepụtara onyonyo ndị ha tọghapụrụ.

    Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa n’Izrel ekwuola na naanị usoro a ga-eji tọhapụ ndị niile Hamas tọọrọ ma jichie na Gaza bụ mba Izrel ịnapụ ha nchekwa na ọchịchị Gaza.

  19. A kagbuola emume 'graduation' maka ụmụakwụkwọ ọtaakara n'Ebonyi steeti

    Ọchịchị gọọmenti Ebonyi steeti si na ndị ga na-eme emume ngụsị akwụkwọ bụ ndị gụchara “JSS 3” na “SS 3”

    Ebe foto si, Ụlọọrụ agụmakwụkwọ Ebonyi steeti "Ministry of Education"

    Nkọwa foto, Ọchịchị gọọmenti Ebonyi steeti si na ndị ga na-eme emume ngụsị akwụkwọ bụ ndị gụchara “JSS 3” na “SS 3”

    Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Francis Ogbonna Nwifuru akagbuola emume ngụsị akwụkwọ maka ụmụakwụkwọ ọtaakara na ndị nke praịmarị na steeti ahụ.

    Ọnọdụ a metụtara ụlọakwụkwọ ọhanaeze na nke ndị nkịtị, dịka ebumnobi ya bụ iji beleta ahụhụ ndị nne na nna na-ata iziga ụmụaka ha ụlọakwụkwọ.

    Ọ gara n’ihu machie nkuzi a na-enye ụmụakwụkwọ oge a gbasara akwụkwọ nke Bekee kpọrọ “extra mural lesson” n’ụlọakwụkwọ niile nọ n’Ebonyi steeti.

    Gọọmenti Ebonyi steeti si na ndị ga na-eme emume ngụsị akwụkwọ ugbua bụ naanị ndị gụchara “JSS 3” na “SSS 3”.

    Kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ na steeti ahụ bụ Donatus Ilang onye kwupụtara nke a, si na ụlọakwụkwọ niile ga na-eji akwụkwọ ederede nke gọọmenti kwadoro akụzi ihe.

    Ọ dọkwara aka na ntị na ụlọakwụkwọ ndị ụka maọbụ nke ndị nkịtị gọọment na-akwdoghị ga-emechi, ma gwa ndị nne na nna ka ha kpọpụ ụmụ ha n'ụdị ụlọakwụkwọ dị etu ahụ.

  20. Osote Prịam Minista UK Angela Rayner agbaala arụkwaghịm n'ihi akwụghị ụtụisi zuru oke

    Rayner kwetachara na ya akwụghị ụgwọ ụtụisi stampụ zuru oke n'ụlọ ya ruru £800,000.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Rayner kwetachara na ya akwụghị ụgwọ ụtụisi stampụ zuru oke n'ụlọ ya ruru £800,000.

    Osote Prịam Minista mba UK bụkwa odeakwụkwọ na-ahụ maka ụlọ Angela Rayner agbaala arụkwaghị n'ihi akwụghị ụtụisi zuru oke n'ụlọ ya dị na Hove, East Sussex.

    Ọ gbakwara arụkwaghịm dịka osote onyeisi otu Labour Party, nke pụtara na pati ahụ ga-enwe ntuliaka maka onye ga-anọchi Rayner.

    Rayner bụ onye omeiwu nke Ashton-under-Lyne, zigara onwe ya maka nnyocha otu na-ahụ maka ezi omume na mbido izu a, mgbe ọ kwetachara na ya akwụghị ụgwọ ụtụisi stampụ zuru oke n'ụlọ ya ruru £800,000.

    N'akwụkwọ ozi arụkwaghịm ya, o kwuru na ya ga-anabata ihe ga-esi na nnyocha ahụ pụta maka "njehie" nke achọghị ndụmọdụ ụtụisi ọzọ tupu ọ zụọ ụlọ ahụ.

    Otu ezi omume ahụ chọpụtara na Rayner mebiri iwu site na "akpachapụghị anya" na ndụmọdụ gbasara iwu ọ natara.