You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndị isi mpaghara Etiti Ọwụwa Anyanwụ na Yurop anabatala atụmatụ udo Gaza nke Trump

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Septemba 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Ụlọikpe atụọla onye bụbu minista mba ofesi mkpọrọ ọrụ ike maka nrụrụaka na Zambia

    Ụlọikpe atụọla onye bụbu minista mba ofesi na Zambia Joseph Malanji mkpọrọ afọ anọ ya na ịrụsi ọrụ ike maka nrụrụaka.

    A mara Malanji ikpe maka ebubo asaa nke gụnyere inweta akụrụngwa na helikopta a na-enyo enyo na ọ bụ site na ego mpụ dịka ụlọọrụ mgbasa ozi steeti kwuru.

    Onye bụbu odeakwụkwọ ego Fredson Yamba, a makọrọ ya na ya ikpe, nwetara mkpọrọ afọ atọ maka ịkwado ịnyefe ihe karịrị nde dọla asatọ $8m (£6m) n’aka ndị ọrụ nnọchi anya Zambia na Tọkị na-akọwapụtaghị uru ụgwọ ahụ bara.

    Ụlọikpe mara ọtụtụ ndị bụbu minista n'ọchịchị onyeisiala Edgar Lungu ikpe maka mpụ dị iche iche, mana Malanji bụ onye kacha ewu ewu n'ime ha.

  2. Gọọmenti Abịa steeti achụọla ndị ọrụ isii maka ebubo izu ohi ụgwọọnwa

    Gọọmenti Abịa steeti akwadola ka a chụọ ndị ọrụ isii na Mịnịstrị na-ahụ maka ikpe ziri ezi dịka a chọpụtara na aka ha dị n’izu ohi ụgwọọnwa.

    Nke a dị n’ozi Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ndị ọrụ n’Abịa steeti bụ Eno Jerry Eze wepụtara n’ụbọchị Tọzde 4 Septemba, 2025.

    Eze kwuru na e mere nchọpụta ahụ oge ya bụ mịnịstrị mere nnyocha ma leba anya n’ihe gbasara ndị ọrụ.

    Ozi ahụ kwuru na ndị a chụrụ n’ọrụ bụ ndị e kwuru na-ahazigharị usoro ụgwọọnwa, nke mere ha ji enweta akatamkpo ụgwọọnwa nke iwu na-akwadoghị kemgbe ọtụtụ oge.

    Ndị ahụ a chụrụ n’ọrụ gụnyere:

    • Mr. Dickson Uche Eze – Principal Accountant (SGL 12)
    • Mrs. Esther Emeruwa – Senior Accountant (SGL 10)
    • Mrs. Ijeoma Jonathan – Chief Executive Officer (Accounts - SGL 14)
    • Mrs. Treasure Isinguzo – Assistant Chief Executive Officer (Accounts - SGL 13)
    • Mrs. Chioma Victoria Erondu – Principal Executive Officer (Accounts - SGL 12)
    • Mrs. Hannah Ezinne Eze – Senior Executive Officer (General Duties - SGL 09)

    A chụrụ mmadụ ndị ahụ n’ọrụ dịka ụlọọrụ na-ahụ maka ndị ọrụ n’Abịa steeti bụ Abia State Civil Service Commission mechara nnyocha, gbaa ndị ọrụ ahụ ajụjụ n’otu n’otu, nyochaa akwụkwọ ego ndị kwesịrị ekwesị ma chọpụta na mmadụ ndị ahụ maara na ha na-anata ụgwọọnwa na-ezighị ezi.

    Ka o sina dị, Gọọmenti Abịa steeti kwuru na ha achọpụtala na aka Chioma Favour Madu e meburu nnyocha dị ọcha, n’ihi na o mere ngwangwa nye mkpesa maka nnukwu ụgwọọnwa a kwụrụ ya ma zọpụkwa njem iji dozie ya.

    Eze gbakwunyere na gọọmenti ga-enyefe ndị ahụ a chụrụ n’ọrụ n’aka ụlọọrụ kwesịrị ekwesị maka ikpe ha ikpe.

  3. Putin adọọla mba ndị ha na Yukren na-emekọrịta aka na ntị

    Onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin ekwuola na o kwenyeghị n’atụmatụ mba ndị ha na Yukren na-emekọrita ihe izite ndịagha ha na Yukren, ọ bụrụ ma ha nwee nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ n’etiti ha.

    Cheta na Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron kwuru na mba iri abụọ na isii ha na Yukren na-emekọrịta ihe kwetara iziga ndịagha ha na mba ahụ mgbe ọbụla e nwere nkwekọrịta nkwụsị agha, mana ọ kpọghị aha mba ndị ahụ.

    Mana Putin ekwenyeghị n'ụdịrị atụmatụ ahụ ma dọọ aka na ntị sị "onye ezitekwala ndịagha ọbụla na Yukren" maka na ha kwenyere na mkparịtaụka ọbụla ga-eweta udo.

    Yukren na mba ndị ha na ha na-emekọrita ekwenyeghị n'okwu a Putin kwuru.

  4. Ọrịa Ebola egbuola mmadụ 15 na DR Congo

    Ọria Ebola egbuola ihe ruru mmadụ iri na ise na mpaghara etiti Kasai dị na mba Kongo, dịka Mịnịstrị Ahụike mba ahụ si kwuo.

    Ndị ọrụ ahụike anọ so n'ọnụọgụgụ mmadụ iri na ise nwụrụ.

    E mere nnyocha ma chọpụta ọrịa a n'ahụ otu nwaanyị dị ime gbara afọ iri atọ na anọ, bụ onye e tinyere n’ụlọọgwụ ọnwa gara aga.

    E kwuru na njirimara ndị o gosiri gụnyere oke ahụ ọkụ na ịgbọ agbọ.

    Nwaanyị ahụ e nyochara mechara nwụọ ka elekere ole na ole gasịrị n'ihi na ọtụtụ akụkụ ahụ ya kwụsịrị ịrụ ọrụ.

    Ụlọọrụ ahuike mba ụwa bụ World Health Organization sị na ha na-agba mbọ iji kwụsị mfesa ọrịa ahụ ma chebe obodo.

  5. Amerịka ekwuola na ha ‘ga-agbakasị’ otu ndị omempụ si mba ndị ọzọ

    Odeakwụkwọ obodo na mba Amerịka bụ Marco Rubio ekwuola na Amerịka “ga-agbakasị” otu ndị omempụ si mba ndị ọzọ ma ọ bụrụ na ọ bụ ihe a chọrọ.

    O kwuru na ha ga-eme nke ahụ site n’ịgbakọrọ obodo ndị ọzọ aka ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume.

    “Ugbua, ha ga-enyere anyị aka chọta mmadụ ndị a ma gbakasịa ha, ma ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọ ga-ewe,” ka Rubio kwuru oge ọ gara njem n’Ecuador.

    O kwupụtakwara na Amerịka ga-ahụta otu ndị omempụ abụọ kachasị n’Ecuador bụ Los Lobos na Los Choneros dịka otu ndị oyi ọha egwu.

    Okwu ndị a na-abịa n’ime mkpụrụ ụbọchị ole na ole ndịagha Amerịka tụrụ ogbunigwe n’otu ụgbọmmiri nọ n’osimiri Carribean Sea.

    Obi ọchịchị Amerịka kwuru na ha gburu mmadụ iri na otu ndị na-atụ mgbere ọgwụike, n’agbanyeghị na ha enyeghị nkọwa gbasara mmadụ ndị ahụ.

  6. Igbo kara aka, ụnụ abọọla chi, Ka Nkwọ taa kwọtara anyị ihe ọma!

    Obiụtọ ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo n'ụbọchị taa bụ Fraịde Nkwọ 5 Septemba, 2024.

    Gaa na websaịtị, Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị ka i nweta akụkọ niile na-akpọtụ n'ụwa.

    N'ụtụtụ a, ọ bụ Chinonso Ugorji na Marvelous Obomanu ka gị na ha ga-anọrị mana Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga-emecha buru oche n'oge ehihie.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị.

  7. A họpụtala Benjamin Hundeyin dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa

    Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Kayode Egbetokun ahọpụtala Benjamin Hundeyin dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa.

    Tupu a họpụta ya n’ọkwa ọhụrụ a, Hundeyin jibu ọkwa ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs Steeti.

    Benjamin Hundeyin gụrụ akwụkwọ na mahadum Lagos State University nakwa University of Ibadan.

    Ọ bụ onye nwetara ọzụzụ dị iche iche n’ihe banyere mgbasaozi, mmekọ nakwa nchekwa ma bụrụ onye otu Nigerian Institute of Public Relations (NIPR), International Public Relations Association (IPRA), nakwa otu Chartered Institute of Personnel Management of Nigeria (CIPM).

    Kayode Egbetokun gwara Benjamin Hundeyin ka ọ rụọ ọrụ iji kwalite ngalaba mgbasaozi ndị uweojii Naịjirịa iji hụ na ndị uweojii na ọhanaeze nwere ezi mmekọ.

  8. Onyeisiala Tinubu agawala njem ezumike abalị iri na Yurop

    Onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu amalitela njem ezumike abalị iri na mba Yurop Frans na Ịngland.

    Ozi ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Bayo Onanuga bụ onye kwuputara nke n’akara soshal midia ya.

    O kwuru na Onyeisiala Tinubu ga-ahapụ Abuja n’ụbọchị Tọzde 4 Septemba, 2025 ịga zuo ike na mba Frans na Ịngland.

    O kwuru Onyeisiala Tinubu ga-anọ abalị iri na njem ahụ tupu ọ laghachita Naịjirịa.

  9. Yukren ewetala nkwado pụrụiche mba Amerịka kwadoro - Starmer

    Praịm mịnịsta Briten bụ Keir Starmer agwala mba iri atọ na-akwado mba Yukren sị na mba Amerịka enyela Yukren nkwado pụrụiche.

    Starmer kwuru na naanị ihe họrọ ugbua bụ ka e mee ka Rọshịa kwụsị ibuso mba Yukren agha.

    Starmer mere ka a mata nke a mgbe ọ na-agwa ndị ndu mba iri atọ ahụ okwu n’ọgbakọ ha mere n’intanet.

    Ọ dọrọ aka na ntị kwuo na Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin abụghị onye e kwesiri ịtụkwasị obi n’atụmatụ udo ọ chọrọ dịka ọ na-aga n’ihu na-ebuso mba Yukren agha.

    Dịka agha na-aga n’ihu na Yukren, ọgbakọ maka nkwekọrịta udo n’etiti Rọshịa – Yukren dịzị ka ihe na-agaghị amịta ezi mkpụrụ kemgbe Donald Trump na Vladimir Putin zutechara n’Alaska, n’ọnwa garaaga.

  10. Ọtụtụ ndị mmadụ ka tọrọ n'ime ala ebe mbuze mere na Sudan – Onye orụ enyemaka

    Onye ọrụ enyemaka na-akwado ọrụ nnapụta n’ebe mbuze mere na mba Sudan agwaala ụlọmgbasa BBC na ọtụtụ ndị mmadụ ka tọrọ n'ime ala n’ebe mbuze ahụ mere.

    Onyeisi ụlọọrụ Coordinating Council of the Tawila and Jebel Marra Emergency Room na-ahụ maka ihe mberede na mpaghara Tawila na Jebel Marra bụ Abdul Hafeez Ali kwuru na ha ebupụtala ozu mmadụ itoolu n’ebe ihe mberede ahụ mere.

    Ọ kọwara na oke mmiri ozuzo bụ ihe kpatara ihe mberede ahụ mere n’ụbochị Sọnde 31 Ọgọst, 2025 nke gburu mmadụ ruru nari atọ na iri asaa.

    Mana ndịagha na-achị mpaghara ebe ahụ mbuze mere bụ Sudan Liberation Movement/Army (SLM/A) si na mmadụ ruru puku nwụrụ n’ihe mberede ahụ.

  11. Mmadụ 17 anwụọla n’ihe mberede ụgbọoloko ‘funicular’ mere na Lisbon

    Ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ ọnwụ n’ihe mberede ‘funicular’ mere n’obodo Lisbon nke Pọtụgal e ruola opekatampe iri na asaa ka ndị uweojii kwuru na ha amalitela ime nnyocha iji chọpụta ihe kpatara ya.

    Ka ọ dị ugbua, mba Pọtụgal amalitela iru uju maka ihe mberede ahụ dịka akụkọ kwuru na mmadụ karịrị iri abụọ merụrụ ahụ nke gụnyere ụmụafọ Pọtụgal mmadụ anọ, ụmụafọ Jamini mmadụ abụọ na ụmụafọ Spen mmadụ abụọ ya na nwata dị afọ atọ.

    Ọzọ, ndị uweojii kwuru na ha na ụlọọrụ na-ahụ maka ụgbọoloko ‘Gloria funicular’ na-arụkọ ọrụ, iji chọpụta ndị nọ n'ụgbọ ahụ bụ nke na-ewu ewu n’etiti ndị njem nlegharị anya.

    E kwuru na ụgbọoloko ahụ gbapụrụ n’okporoụzọ ya wee kụọ ụlọ dị na Lisbon.

    N’aka nke ọzọ, ndị mgbasa ozi mpaghara na-ekwu na eriri gbapụrụ n'okporoụzọ ụgbọoloko ahụ, nke mere ka ọ ghara inwe njikwa mgbe ihe mberede ahụ mere.

  12. Mmadụ 32 anwụọla n'ihe mberede ụgbọmmiri

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ọnọdụ gbatagbata na Naịjirịa bụ National Emergency Management Agency (NEMA) ekwuola na mmadụ iri atọ na abụọ nwụrụ n'ihe mberede ụgbọmmiri mere na Naịja steeti

    Ọnụ na-ekwuchitere NEMA bụ Abdullahi Baba Ara kwuru na ha ka na-achọ mmadụ asatọ dịka a napụtara mmadụ iri ise.

    Ọ kọwara na ihe mberede a mere mgbe ụgbọmmiri ahụ bu ọtụtụ mmadụ kụrụ ogwe osisi dị na mmiri ma tụgharịa.

    Ihe mberede ahụ mere na Gausawa, n'okpo mmiri siri Malale gawa Kainji dị n'ọchịchị ime obodo Borgu n’ụbọchị Tuezde 2 Septemba, 2025.

    Ụlọọrụ na-ahụ maka njem mmiri na Naịjirịa bụ National Inland Waterways Authority (NIWA) kwuru na ụmụnwoke ruru iri anọ na isii, ụmụnwannyị iri ise na asatọ na ụmụnaka ana amaghị ole ha dị bụ ndị e jiri akwa mkpuchi ndụ zọpụta

    Ọdachi a na-agbakwụnye n'ọnụọgụgụ ihe mberede ụgbọmmiri na-arị elu na Naijirịa.

    N'Ọgọst, ndị ọrụ nnapụta nọ na-achọ ihe karịrị mmadụ iri anọ dịka ihe mberede ụgbọ mmiri mere na Sokoto

    Ihe ruru mmadụ iri na asaa ndị ọrụ ugbo nwụrụ na ihe mberede ụgbọ mmiri na Ọgọst 2024 dịka ha nọ na-aga ọrụ ugbo osikapa ha.

    Na Julaị 29, 2024, mmiri riri ụmụ agbọghọ isii ka ụgbọ mmiri bu ha na-alọta ọrụ kpuru n'etiti mmiri na ugwu ọdịda anyanwụ Jigawa steeti.

    Ụbọchị abụọ tupu mgbe ihe a mere, mmadụ iri na atọ nwụrụ na ihe mberede ụgbọ mmiri na Niger steeti.

  13. Trump arịọla Ụlọikpe Kachasị ka ha nabata ụtụisi ndị o tinyere

    Onyeisiala Donald Trump agwala Ụlọikpe Kachasị n’Amerịka ka ha tụgharịa mkpebi ụlọikpe nta, bụ nke chọpụtara na iwu akwadoghị ọtụtụ n’ime ụtụisi ndị o tinyere.

    N’akwụkwọ o tinyere n’abalị Wenezde, ọchịchị Trump gwara ndị Ọkaikpe ka ha gbata ọsọ enyemaka ngwangwa, ma kwupụta na onyeisiala nwere ikike itinye ụtụisi na ngwaahịa si mba ndị ọzọ.

    Ụlọikpe Mkpegharị mba Amerịka kewara n’izuụka gara aga dịka ndị Ọkaikpe asaa kwuru na ụtụisi Trump webatara site n’iwu nyere onyeisiala ikike n’ọnọdụ gbatagbata nke akụnaụba adabaghị n’ikike e nyere onyeisiala.

    Mana ndị Ọkaikpe anọ kwadoro Trump n’agbanyeghị na e kwuru na ọ bụ “ikike dịịrị ndị omeiwu” itinye ụtụisi.

    Iwu ahụ nwereike kụnye ụkwụ n’atụmatụ Trump nwere maka akụnaụba na mba ndị ọzọ, ma manye Amerịka ịkwụghachi ijeri kwuru ijeri n’ụtụisi.

  14. Igbo mụrụ nze mụọ ọzọ, ụnụ asaala chi, Ka ụbọchị taa maara onye niile mma

    Obiụtọ ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo n'ụbọchị taa bụ Tọzde Afọ 4 Septemba, 2024.

    Gaa na websaịtị, Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị ka i nweta akụkọ niile na-akpọtụ n'ụwa.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị.

  15. Rọshịa ga-eji agha nwete ihe niile ha chọrọ ma Yukren hara ikweta n’atụmatụ udo – Putin

    Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin ekwuola na ha ga-eji agha nwete ihe niile ha chọrọ ma ọ bụrụ na mba Yukren ekweteghị n’atụmatụ Rọshịa wepụtara maka nkwekọrịta udo.

    Vladimir Putin kwuru nke a dịka ọ gachara mba Chaịna mere ngosipụta ngwaagha nakwa ncheta nwere onwe.

    Cheta na a na-ahụ Chaịna dịka ndị na-ama mba Amerịka aka na ngaraba nchekwa na ngwaagha.

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-agba mbọ ka Putin kwụsị ibuso mba Yukren agha mana ọ mịtabeghị ezi mkpụrụ.

    Putin bụ onye toro mmasị Trump nwere banyere iweta udo n’etiti Yukren na Rọshịa akwụsịbeghị ịbụso ndi Yukren agha.

  16. Ọtụtụ ụmụnwaanyị esonyela na ngagharịiwe dịka Onyeisiala mba Indonesia gbagara Chaịna

    Ọtụtụ ụmụnwaanyị esonyela ngagharịiwe a na-eme na mba Indonesia dịka Onyeisiala ha gbagara mba Chaịna.

    A na-eme ngagharịiwe megide ndị uweojii na-akpagbu ndị mmadụ nakwa ego mmefu gọọmenti mba ahụ na-emefu n’ihe na-enweghị isi.

    Ngagharịiwe ahụ eruola izu ụka atọ n’isi Jakarta nakwa obodo dị icheiche n amba ahụ.

    Igwe mmadụ na-enwe iwe maka ọnọdọ akụnụba, oke agụụ nakwa ego a na-emefu n’isi ndị nọ n’ọchịchị.

    Ọgbaaghara dapụtara na ngagharịiwe ahụ mgbe ụgbọala ndị uweojii jiri ụgbọala ha gbuo nwata nwoke a na-akpọ Affam Kurniawan bụ onye ọkwọ ọgba tumtum.

    Onyeisiala mba ahụ bụ Prabowo Subianto jiri maka ngagharịiwe ahụ kwuo nay a agaghị aga mba Chaịna maka ncheta afọ Chaịna mana a hụrụ ya na Beijing ebe ọ nọ n’akụkụ Xi Jinping na Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin na-ese foto.

  17. Idemmiri egbuola mmadụ 30 ma mebie obodo 1,400 na steeti Ịndịa

    Opekatampe mmadụ iri atọ anwụọla ebe oke mmiri ozuzo na idemmiri metụtara ihe karịrị mmadụ narị puku atọ na puku iri ise na anọ na mpaghara ugwu nke Punjab steeti dị n’Ịndịa.

    Ndị ọchịchị ekwupụtala na mpaghara iri abụọ na atọ niile dị na steeti ahụ nwere idemmiri, ka osimiri na ọdọ mmiri tolitere ruo n'ọkwa dị nso.

    Ka ọ dị ugbua, ihe dịka mmadụ puku iri abụọ esiwo n'ebe ndị idemmiri metụtara pụọ, ebe e hiwere ọtụtụ narị ogige enyemaka iji nye ezinụlọ ndị o metụtara ebe obibi na ihe ndị dị mkpa.

    N'ịrịọ mba ahụ ka ọ "guzoro n'akụkụ steeti ahụ", minista nke steeti ahụ bụ Punjab Bhagwant Mann kwuru na nke a bụ idemmiri kacha njọ steeti ahụ na-ahụ kemgbe afọ 1988.

  18. Ọrụ nnapụta agaala n’ihu n’ebe e nwere mbuze na mba Sudan

    Ọrụ nnapụta ka na-aga n’ihu n’otu ime obodo dị na Dafur nke mba Sudan, bụ ebe e kwenyere na mbuze gburu ọtụtụ mmadụ ma kpochapụ obodo niile.

    Otu Mbaụwa kwuru na ha na otu enyemaka na-agbakọta aka iji rọpụta enyemaka gbatagbata n’akụkụ obodo Tarsin dị n’ọdịda anyanwụ El Fasher.

    Ọnụọgụ ndị nwụrụ anwụ edochabeghị anya.

    Mana Otu Mbaụwa kwuru na ekwupụtala opekatampe mmadụ narị atọ na iri asaa dịka ndị nwụrụ anwụ, ebe ndịagha nnupuisi a ma ama na mpaghara ahụ kwuru na ndị nwụrụ anwụ karịrị otu puku mmadụ.

    Agha na-aga n’ihu ugbua na Sudan na-adọghachi enyemaka azụ, nke mere otu African Union ji akpọ oku ka a kwụsị ịkwa mgbọ, iji mee ka enyemaka ruo na mpaghara ahụ.

  19. Ụlọnnọchiteanya Amerịka akọwaala ihe mere ha ji anapụ ndị Naịjirịa ‘visa’

    Ụlọnnọchiteanya mba Amerịka dị na Naịjirịa enyela nzaghachi gbasara akụkọ kwuru na ha na-anapụ akwụkwọ njem ‘visa’ ndị ha nyereburu ụfọdụ ụmụafọ Naịjirịa na-ebughị ụzọ nye nkọwa ọbụla maka ya.

    Akwụkwọ akụkọ Guardian nke Naịjirịa sịrị “naanị ihe a gwara ndị a napụrụ akwụkwọ njem ha bụ na ozi ọhụrụ ha nwetara bụ ihe mere e ji napụ ha visa.”

    Ọnụ na-ekwuru ụlọnnọchiteanya Amerịka gwara onye ntaakụkọ BBC na ọ bụ eziokwu na ngalaba na-ahụ maka ihe ndị na-eme n’Amerịka nwere ikike ịnapụ ndị mmadụ akwụkwọ njem, mana ha ji ozi niile ha nwetara eme nke ugbua “n’ogogo a hụbeghị ụdị ya mbụ”.

    Dịka o siri kwuo, “nke a bụ iji chekwaa okeala Amerịka niile nakwa obodo niile e nwere n’ime mba ahụ.”

    Ozi ahụ si n’aka ọnụ na-ekwuru ụlọnnọchiteanya mba Amerịka sịrị na “ọchịchị Donald Trump na-echekwa mba Amerịka na ụmụafọ ha niile site n’ijigide ogogo kachasị elu maka nchekwa mba na ọhanaeze site n’usoro e si enye akwụkwọ njem.”

    Ka o siladị, otu onye nwetara akwụkwọ njem n’oge gara aga gwara onye ntaakụkọ BBC na ọnọdụ ahụ emetụtaghị ya.

    Kemgbe ọchịchị nke ugboro abụọ ya malitere, Onyeisiala Trump ewepụtala ụfọdụ atumatụ tara akpụ maka ndị mbịarambịa si mpaghara Afrịka.

    Ha gụnyere ịmachi akwụkwọ njem, ibelata oge akwụkwọ njem na ibuli ọnụego e ji enweta akwụkwọ njem.

  20. Mba Chaịna ekpugheela ọtụtụ ngwaagha ọhụrụ ha rụpụtara

    Ngwaagha ọkụ ‘laser’, ngwagha nuklịa nakwa ogbunigwe ‘drone’ na-agba n’okpuru mmiri so n’ihe ndịagha mba Chaịna gosiri iji cheta afọ iri asatọ ha meriri mba Japan n’agha mbaụwa nke abụọ.

    Na mgbasaozi Onyeisiala ha bụ Xi Jinping mere tupu emume ahụ amalite, o kwuru na o nweghi onye pụrụ “igbochi” mba ha na o nweghi onye nwereike “ịkpagbu ha”.

    Ndịisiala mba iri abụọ na isii sonyere ya n’emume ahụ nke gụnyere Vladimir Putin nke Rọshịa na Kim Jong Un nke Nọt Korịa.

    Nke a bụ mbụ Xi, Putin na Kim ga-ezute onwe ha – Ndị ntaakụkọ BBC nọ n’obodo Beijing, Seoul na Moscow kọwara ihe mere o ji dị mkpa.

    Ha kwuru na ihe ngosi a bụ ebumnobi Onyeisiala Xi ma kwuo na nke a gosiri na Chaịna nwereike ịwakpo mba Taiwan nke Chaịna sị na ọ bụ nke ha.

    N’aka nke ọzọ, Onyeisiala mba Amerịka bụ onye na-esoghi n’emume ngosi ahụ katọrọ Xi n’akara soshal midia.

    N’okwu ya “Biko kelere m Vladimir Putin na Kim Jong Un dịka ha na-akpa nkata megide mba Amerịka.”