Omoyele Sowore ji aha pati African Action Congress (AAC) zọọ ọkwa onyeisiala n’afọ 2023 akpụpụla
ụlọọrụ nchekwa Department of State Services (DSS) na ụlọọrụ soshal midia
Facebook na X n’ụlọikpe.
N’ozi ha ọkaiwu
ya bụ Tope Temokun wepụtara, o kwuru na nke a maka mmachi DSS na ụlọọrụ soshal
midia ndị a machiri ihe o dere n’akara soshal midia ya nke ọ sị megidere ikike
o nwere dịka mmadụ.
O kwuru na
akwụkwọ ha gbara n’ụlọikpe bụkwa iji mee ka ikike dịịrị onye ikwupụta uche ya
agaghị anwụ na Naịjirịa ma sị na ọ bụrụ na ụlọọrụ gọọmenti Naịjirịa nwereike ịgwa
ụlọọrụ soshal midia zuru mbaụwa ọnụ ihe ha ga-eme, na ọ pụtara na o nweghi onye
nwere nchekwa na Naịjirịa.
Ọkaiwu
Sowore kwuru na ha tinyere aha Facebook and X n’akwụkwọ ahụ maka na gere ntị n’ihe
DSS kwuru ma machie ozi Sowore n’ụzọ na-ezighi ezi.
Sowore
gwara ụlọikpe na DSS enweghi ikike ọbụla ịmachi ozi mmadụ bipụtara na soshal
midia, ma kwuo ka ụlọọrụ Meta nwee Facebook na X ekwela ka e jiri ha dịka ngwaọrụ
e ji akpagbu mmadụ.
Akwụkwọ a Sowore gbara n’abịa n’ime awa ole ma ole, ụlọọrụ
DSS gbachara ya akwụkwọ n’ụlọikpe ukwu dị n’Abuja n’ọnụ ebube ise
Ha tinyekwara aha Facebook na X dịka ndị ga-azara ọnụ ha n’ụlọikpe
ahụ.
Ha gbara akwụkwọ maka Sowore jụrụ iwepu ihe o dere na soshal
midia Facebook nakwa X, nke ha sị metọrọ aha Onyeisiala Bola Tinubu.
Ha nyere Sowore na ụlọọrụ soshal midia ndị a otu izuụka iwepụ
ozi ahụ mana ha emeghi nke a.