Praịm Mịnịsta Keir Starmer ga-ekwuputa na UK anabata Palestinia dịka steeti kwụrụ onwe ya
Praịm Mịnịsta Keir Starmer ga-anọ n’ụbọchị Sọnde 21 Septemba, 2025 kwuputa na UK anabatala Palestinia dịka steeti kwụụrụ onwe ya.
N’ọnwa Julaị ka Starmer kwuru na mba UK ga-agbanwe nkwenye ha ma ọ bụrụ na Izrel emezughị ụfọdụ ihe gụnyere nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ na Gaza nakwa nkwekọrịta udo nke ga-enye Palestinia ohere ịkwụrụ onwe ya.
Mana mba Izrel anabataghị nke a kemgbe agha bidoro oge otu Hamas wakporo mpaghara Saụt Izrel na 7 Ọktoba, 2023 ma gbuo mmadụ 1,200 ma nwuchie mmadụ 251.
Mkpebi Keir Starmer bụ nke gọọmenti mba Izrel, ezinaụlọ ndị a nwuchiri katọrọ.
N’aka nke ọzọ Praịm Mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu kwuru na ịhụta Palestinia dịka steeti kwụụrụ onwe ya ga-ebute agha.