You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndị isi mpaghara Etiti Ọwụwa Anyanwụ na Yurop anabatala atụmatụ udo Gaza nke Trump

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Septemba 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. A ga-ewepụta ọgwụ mgbochi nje HIV ọhụrụ dị ọnụala na mba karịrị 100 nwere obere ego n'ime afọ abụọ

    A ga-ewepụta ọgwụ mgbochi ọhụrụ dị ọnụala na mba karịrị otu narị nwere obere ego n’ime afọ abụọ maka igbochi nje HIV.

    Ka ọ dị ugbua, a na-atụ anya na ọ ga-enye ọtụtụ nde mmadụ ohere inweta ọgwụgwọ nke ọma ma nweeike ime ka ụwa bịaruo nso n'ịkwụsị ọrịa nje HIV/Aids.

    Ọgwụ a, nke a na-akpọ Lenacapavir ma na-agba ya site na ntụtụ, ga-apụta na njedebe nke afọ a, ga-eri ego ruru $28,000 (£20,000) maka onye ọ bụla kwa afọ.

    Mana ọkwa e wepụtara na Wenezde na-ekwe nkwa ibelata ọnụahịa ahụ naanị $40 - gburugburu pasent 0.1 nke ọnụahịa mbụ.

    E kwuru na a ga-ewepụta ụdị dị ọnụala n’afọ 2027 gafee mba otu narị na iri abụọ ndị nwere obere ego na nke etiti.

    Ndị ọkammụta sayensị na-ekwu na ọgwụ ahụ na-egbochi nje ahụ imegharị n'ime mkpụrụ ndụ.

    Nkwekọrịta dị ịrịba ama inye ndị nwere nje HIV na mba ndị ka na-emepe emepe bụ onye bụbu onyeisiala mba Amerịka Bill Clinton ka ya na ụlọọrụ ndị na-emepụta ọgwụ kparịtachara.

  2. Gana ebugaala mmadụ isii ndị Ọdịda Anyanwụ Afrịka mba Amerịka chụpụrụ na Togo

    Mba Gana ebugaala opekatampe ihe ruru mmadụ isii ndị Ọdịda Anyanwụ Afrịka mba Amerịka chụlatara na mba ha maka ịbata mba Amerịka n’ụzọ iwu akwadoghị, na Togo, dịka ndị ọkaiwu ha siri kwuo.

    E kwuru na ndị ahụ nọ na-agba gọọmentị Gana akwụkwọ ka ha gbochie ịchụpụ ha ọzọ, n'ihi nchegbu maka nchekwa ha.

    "Anyị nwereike ikwenye na e zigara mmadụ isii na Togo, ezipụla ndị ọzọ na mba ndị m na-enweghị ike ikpughe ugbu a," onye ọkaiwu bụ Oliver Barker-Vormawor gwara BBC.

    E kwukwara na ọ bụ naanị mmadụ atọ n'ime ndị ezigara Togo bụ ndị Togo. Mana e kwupụtabeghị mba nke ndị ọzọ.

  3. Mmiri eriela ihe karịrị ‘buffalo’ 80 na mba Namibịa oge ha si n’elu ugwu dapụ

    Ihe karịrị atụ iri asatọ anwụọla oge ha gwepịara onwe ha ma rugbuo n’osimiri, oge ọdụm na-achụ ha ọsọ.

    Ọ bụ ngalaba na-ahụ maka gburugburu na nlegharị anya na mba Namibịa wepụtara ozi a.

    Ozi ahụ kwuru na ụmụ atụ ahụ si n’ọnụ ugwu dapụ ma danye n’osimiri Chobe dị n’akụkụ okeala mba Namibịa na Botswana oge ụmụ ọdụm si mba Botswana na-achụ ha ọsọ.

    Ọtụtụ ụmụ atụ anwụọkwala n’ụzọ dị etu a n’oge ndị gara aga.

    Otu nke kachasị njọ mere n’afọ 2018, bụ mgbe ihe ruru atụ narị anọ nwụrụ oge ha gbabara n’ime osimiri Chobe.

    Otu onye si n’ụlọọrụ Kabulabula Conservancy nke mba Namibịa gwara BBC na igwe atụ ahụ na-achọ ịgbalahụ ụmụ ọdụm n’ogige Chobe National Park.

    “Oge ọbụla ụmụ ọdụm chụrụ ha ọsọ, ha na-agbalị ịgbaba na mba Namibịa, ma malite [ịgwepịa] onwe ha,” ka Mbeha Tadeus bụ onye ọrụ kwuru.

    Ọnụ na-ekwuchitere Mịnịstrị na-ahụ maka gburugburu, nchekwa okeọhịa na nlegharị anya na mba Namibịa bụ Ndeshipanda Hamunyela kwuru na ụmụ anụmanụ ahụ si Botswana, mana ọ kọwaghị ma ọ bụ n’ogige Chobe National Park ka ha si.

    Hamunyela gwara BBC na a ga-ekesa anụ sitere n’ozu atụ ndị ahụ n’etiti obodo dị iche iche na mpaghara ahụ.

  4. Kyiv nwereike iweghachite mpaghara Yukren niile n’aka mba Rọshịa - Trump

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na Kyiv nwereike “iweghachite mpaghara mba Yukren niile etu ha dị na mbụ”, nke na-egosi mgbanwe ọnọdụ ya n’agha dị n’etiti Rọshịa na Yukren.

    N’ozi o bipụtara n’ọbaozi Truth Social, Trump kwuru na Yukren nwereike weghachite “okeala niile etu ha dị tupu agha a amalite” site n’enyemaka Yurop na NATO.

    Trump kwuru nke a oge ya na onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky nwere mkparịtaụka dịka ọ gwachara ọgbakọ mbaụwa okwu na New York n’ụbọchị Tuzde.

    Trump egosila mmasị o nwere ịkwụsị agha ahụ ọtụtụ oge, mana ọ dọrọ aka na ntị n’oge gara aga na usoro ahụ nwereike ime ka Yukren gbahapụ ụfọdụ okeala ha, bụ nke Zelensky na-anabataghị.

    N’ozi ya, Trump gbakwunyere na Yukren “nwereike gaa n’ihu karịa nke ahụ”, mana ọ kọwaghị ihe ọ na-ekwu maka ya.

  5. Oke ifufe 'Typhoon Ragasa' awuchiela na Chaịna ka o gbuchara ndị mmadụ na Taiwan

    Mba Chaịna akpọpụla ihe ruru mmadụ nde abụọ site n’ebe obibi ha dị na Guangdong dịka oke ifufe a kpọrọ ‘Typhoon Ragasa’ na-abịa nso na mpaghara Ndịda mba ahụ.

    A na-atụ anya na mmiri na-amalite taa n’obodo Zhuhai dịka ọ ga-abute oke ebilimmiri a kpọrọ ‘king of storms”, onye ntaakụkọ bụ Laura Bicker kwuru.

    Oke ifufe a egbuola opekatampe mmadụ iri na asaa na mba Taiwan dịka ọdọmmiri ‘lake’ gbawachara, nke butere nnukwu idemmiri n’ọwụwa anyanwụ.

    E kwuru na oke ifufe Ragasa bụ nke kachasị akpa ike n’afọ a.

    Kamgbe ọtụtụ ụbọchị ka ọ malitere irugharị n’elu osimiri Saụt Chaịna, nke butere nnukwu mmiri ozizo, ikuku na mba Philippines, Taiwan, Hong Kong na mpaghara ndịda Chaịna.

  6. Igbo ndị ọma mma mma nụ ooo!

    Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe na mbaụwa.

    Sonyere anyị n'ọbaozi Websaịt, Facebook, Instagram na WhatsApp Chanelụ.

    Ndewo!

  7. Ndị be anyị, unu asaala chi, Ka ụbọchị taa maara onye niile mma

    Obiụtọ ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo n'ụbọchị taa bụ Wenezde 24 Septemba, 2025.

    Gaa na websaịtị, Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị ka i nweta akụkọ niile na-akpọtụ n'ụwa.

    N'ụtụtụ a, ọ bụ Ikechukwu Kalu na Chinonso Ugorji ka gị na ha ga-anọrị, mana Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga-emecha buru oche n'oge ehihie.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị.

  8. “Mgbanwe ihu igwe bụ chandum kachasị e gwuru mmadụ n’ụwa a” – Trump

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na mgbanwe ihu igwe bụ chandum kachasị e gwuru mmadụ n’ụwa a.

    Donald Trump kwuru nke a n’ọgbakọ otu jịkọrọ mba ụwa bụ United Nation ma kwuo na “enweghị ihe dịka mgbanwe ihu igwe, ime ka ihu igwe dị ọkụ maọbụ ime ka ọ dị onyi”.

    Ọ sị na ihe niile UN na otu ndị ọzọ dị icheiche na-ekwu maka mgbanwe ihu igwe abụghị eziokwu ma kọwaa ya dịka okwu ndị amaghị ihe.

    Trump gwara ndị isiala mba dị icheiche bịara ọgbakọ ahụ ka ha sepụ aka n’ihe gbasara “chandum mgbanwe ihu igwe” maọbụ ha ahụ etu mba ha “ga-esi daa”.

    Mana ọtụtụ ndị maara ihe ekwe na-akụ na ngaraba seyensị kwetere na ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-eme so ebute mgbanwe ihu igwe.

  9. Mba Afrịka atọ ewezugala onwe ha n'ụlọikpe ICC

    Mba Bọkịna Faso, Mali na Nijie ekwupụtala na ha ga-ewezuga onwe ha n'Ụlọikpe Mbaụwa bụ ICC ozugbo.

    Ha kọwara ụlọikpe ahụ dịka nke ndị nkụchi ọchịchị ji enwetazu ebumnobi mmegide ha.

    Mba atọ ahụ ndịagha na-achị jikọtara aka wepụta ozi, ma kwuo na ha agaghị anabata ikikere ụlọikpe ahụ dị na Hague, bụ nke Otu Mbaụwa na-akwado.

    "ICC egosila na o nweghị ikike ileba anya ma kpee ikpe ndị metụtara mpụ agha, mpụ ndị megidere mmadụ na mpụ na-ebute emegide na mmegbu," ka ndị ndu mba atọ ahụ kwuru.

    Ka ọ dị, ICC enyebeghị nzaghachi gbasara mkpebi mba atọ ahụ, bụ ndị ha na onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin na-emekọrịta ihe.

    Mba atọ ahụ kwuru na ha chọrọ iji aka ha hiwe ụkpụrụ ndị ga-eweta udo na ikpe nkwụmọtọ.

    Ha boro ICC ebubo imegbu mba ndị na-enweghị ka ọ dị ha, nke bụkwa otu ebubo onyeisiala mba Rụwanda bụ Paul Kagame boro ụlọikpe ahụ n'oge gara aga.

    E hiwere Ụlọikpe Mbaụwa n'afọ 2002 iji leba anya n'okwu ndị metụtara mkpochapụ agbụrụ, mpụ ndị megidere mmadụ, mpụ agha na mmegbu.

  10. Onyeisiala Trump ga-agwa ọgbakọ otu mbaụwa okwu taa

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ga-ekwupụta ebumnobi ya maka mbaụwa oge ọ ga-agwa ọgbakọ United Nations General Assembly okwu n'ụbọchị taa.

    Ihe a bụ nke mbụ Trump ga-aga nrụrịtaụka nke ọgbakọ ahụ kemgbe afọ 2020.

    Obi ọchịchị White House kwuru na Trump ga-arụtụ aka etu ụlọọrụ mbaụwa dị iche iche siri bibie usoro ụwa.

    Onyeisiala Amerịka nwekwara ike ikwu okwu gbasara mkpebi ọtụtụ mba dị iche iche nwere ịnabata Palestaịn dịka mba kwụụrụ onwe ya, bụ nke Amerịka na-agba ụkwụ.

    Izrel kwuru na ịnabata Palestaịn dịka mba kwụụrụ onwe ya pụtara ibugara Hamas ụkpa ekele maka mwakpo ha mere n'ụbọchị 7 Ọktoba, 2023 ma gbuo mmadụ ruru otu puku na narị abụọ.

    Ka o sina dị, ndịagha Izrel na-aga n'ihu na mwakpo ha na-eme iji kpachie obodo Gaza.

    Dịka Mịnịstrị Ahụike Gaza ndị Hamas na-elekọta siri kwuo, Izrel egbuola ihe karịrị ndị Palestaịn puku iri isii na ise kemgbe ụbọchị 7 Ọktoba.

  11. Izrel ka na-awakpo obodo Gaza na-agbanyeghi nkwado ọtụtụ mbaụwa nyere Palestaịn

    Ndịagha mba Izrel ka na-aga n’ihu na mwakpo ha na-eme n’obodo Gaza, dịka ndị anya hụrụ ka ihe si mee si kwuru n’ụgbọala ogbunigwe ndịagha na-abanyekwu n’etiti ime obodo site na mpaghara ugwu na ndịda.

    Nke a na-abịa dịka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-akwado ịgbasa ozi n’ọgbakọ otu United Nation – nke mbụ ọ na-esonye na ya kamgbe afọ 2020.

    Otu ihe so n’isiokwu ọgbakọ ahụ bụ mkpebi ọtụtụ mbaụwa ịhụta ma kpọpụta Palestaịn dịka mba kwụụrụ onwe ya na nso nso a.

    N’ụbọchị Mọnde, Fransị kpọpụtara Palestaịn dịka mba kwụụrụ onwe, soro ndị ogbo ha gụnyere UK, Ọstrelịa, Kanada na Pọtugal.

    Mbaụwa ha na-akwanye mba Izrel ọkụ n’ike maka nsogbu ọnọdụ ọjọọ ndị bi na Gaza nakwa nsogbu ụlọobidi na West Bank site na nwakpo ha na-eme n’ebe ahụ.

    Izrel kwuru na ịkpọpụta Palestaịn dịka mba kwụụrụ onwe ya bụ ịkwụ ndị Hamas ụgwọ maka mwakpo ha mere mba Izrel n’ọnwa Ọktoba 7, 2023 ebe e gburu ihe ruru mmadụ 1200 ma tọọrọ mmadụ 251.

    Kamgbe ahụ mba Izrel egbuola ndị Palestaịn ruru mmadụ puku 65, dịka mịnịstrị ahụike nke Hamas nọ n’isi ya si kwuo.

  12. Ụmụibe, nnọọ n'ọgbakọ anyị taa

    Obiọma ka BBC Igbo ji anabata gị n'ọgbakọ anyị taa.

    Buru oche gị bịa gụọ akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

    Daalụ!

  13. UK agwala Izrel ka ha ghara ime mwakpo ọbụla maka na Frans na mba ndị ọzọ na-akwado ịnabata Palestine dịka steeti kwụụrụ onwe

    Odeakwụkwọ mba UK n’ihe gbasara mmekọ mba ofesi bụ Yvette Cooper ekwuola na UK adọọla mba Izrel aka na ntị ka ghara ime mwakpo ọbụla maka na ha nabtara Palestine dịka steeti kwụụrụ onwe ya.

    Nke a na-abịa dịka mba Frans, Kanda na Ọstrelịa na-akwado ịnabata Palestine dịka steeti kwụụrụ onwe ya.

    Cheta na Praịm mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu kwuru na nkea nwereike ibute agha na mwakpo.

    Ndị isi mbaụwa na-eme ọgbakọ na New York maka ọgbakọ UN General Assembly ebe ha ga-anọ kpaa maka iweta udo na Gaza. A na-ekwu na mba Belguim nwereike ịnọ n’ọgbakọ ahụ kwuputa nkwado ha ka Palestine bụrụ steeti kwụụrụ onwe.

    Mba ndị ọzọ gụnyere Luxembourg, Andorra, San Marino na Malta.

  14. Ọtụtụ ọma Igbo ndị ọma

    Anyị ji obi ụtọ anabata gị n'ọgbakọ BBC News dịka anyị bịara iwetara gị akụkọ niile dị mkpa si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile taa bụ Mọnde 22 Septemba, 2025 ma bụrụ ahịa Eke

    Anyị na-asị ka taa ketara gị na ezinaụlọ gị naanị ihe ọma.

    Biko gaa n'ihu sonyere akara soshla midia anyị dị iche iche maka akụkọ ndị ọzọ anyị ji bịa taa.

    Ndewo!

  15. Onye ọkaikpe Naijiria ga-ewepụta ndị ọkaiwu a ga-enye ọkwa (SAN) na Mọnde

    Ọkaikpe Naijiria Kudirat Kekere-Ekun n’ụbọchị Mọnde 22 Sepụtemba, 2025 ga-ewepụta ndị ọkaiwu a ga-enye ọkwa nke ndị bekee na-akpọ ‘Senior Advocate of Nigeria' (SAN).

    Ndi ọkaiwu ewepụtara ga-aṅụ iyi n’ụlọikpe ukwu Naịjiria tupu amalite afọ 2025/2026 iwu nke ụlọikpe n’elekere iri nke ọtụtụ.

    Festus Akande, onye isi mgbasa ozi na mmekọrịta ọha nke ụlọikpe ukwu Naịjiria wepụtara nkwupụta ma kọwa na ndị na-arụ ọrụ na ngalaba ikpe ziri ezi ga-ekwu okwu na emume a.

  16. Ebuka Chukwu: Ngagharịiwe adaala n'Okposi, Ebonyi steeti maka ọnwụ nwataakwụkwọ FGC

    Ndị obodo Okposi dị n’Ebonyi steeti emeela ngagharịiwe maka ọnwụ nwata akwụkwọ na-aga ụlọakwụkwọ Federal Government College Okposi a kpọrọ Ebuka Chukwu bụ onye a si nwụrụ n’ọnwa Julaị 27, 2025.

    Ezinaụlọ Ebuka na ndị obodo gbakọtara ọnụ ma gaa n’ụlọakwụkwọ Federal Government College ebe ha gwara onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ na ha chọrọ ikpe ziri ezi

    Onye kwuchitere ndị obodo na ngagharịiwe a bụ Collins Agwu si na nnyocha e mere gosiri na e gburu nwata akwụkwọ Ebuka onye nke nọ klassi ‘SS2’ tupu a tufuo ozu ya n’ime mmiri.

    O boro ebubo na aka otu onye ọrụ ụlọakwụkwọ ahụ a kpọghị aha ya dị ọnwụ Ebuka dịka ọ gara n’ihu kwuo na ndị ụlọakwụkwọ chọrọ ikpuchi ihe mere nụ

    Osote onyeisioche ụlọakwụkwọ 'Federal Government College' Okposi bụ Ojima Emmanuel mesiri ndị ngagharịiwe ahụ obi ma kwuo na ụlọakwụkwọ ha ga-eme ihe niile n’ikike ha ihu na ha chopụtara etu nwaakwụkwọ ahụ si nwụọ nakwa ndị gburu ya.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n’Ebonyi steeti Joshua Ukandu si na ndị uweojii anyị nwụchiri mmadụ atọ gbasara ọnwụ ahụ dịka nnyocha ka na-aga n’ihu.

  17. Mba Briten anabatala Palestine dịka mba kwụụrụ onwe ya

    Praịm Mịnịsta mba UK Keir Starmer anabatala Palestine dịka mba kwụụrụ onwe ha.

    N’ihe onyonyo ọ wepụtara n’ọbaozi X ya, o kwuru na “anyị na-agbalị ihu na e nwetara udo nakwa mba abụọ kwụụrụ onwe ha”.

    Mba Australia na Kanada kwupụtara nnabata Palestine ka a na-atụ anya na Pọtugal ga-esonye na mba ndị nabatara Palestine.

    Mba Izrel akatọla nnabata a dịka Praịm Minista Benjamin Netanyahu kwuru na nnabata a “ga-etinye anyị n'ihe ize ndụ ma bụrụ ụgwọ ọrụ maka iyi ọha egwu”.

  18. Ndịọrụ nchekwa mmadụ iri anwụọla n'aka ndị oyiọhaegwu na Benue steeti

    Ihe ruru ndị ọrụ nchekwa iri anwụọla,ebe a ka na-achọ ọtụtụ ha achó díka ndị a na-enyo na ha bú ndị oyiọhaegwu wakporo ha na Benue steeti.

    Ndị ọrụ nchekwa nọ na-eme ngagharị mgbe ha gbabara n’aka ndị a egbe na Fraịde, abalí 19 nke ónwa Septemba afó 2025.

    Dịka onyeisioche ọchịchị ime obodo Katsina-Ala, Shaku Justice si kwuo, ndị ọrụ nchekwa dabara n’aka ọtụtụ otu oyióhaegwu ndị e boro ebubo na ha si Taraba steeti bịa.

    Dịka ha kwakọrịtara mgbọ, ndị otu a na-eyi ọha egwu jidere otu onyeisi ndịagha dịka ọtụtụ nwụrụ

    E zigala ndị ọrụ nchekwa ebe ihe a mere ka bughachite ozu ndịagha e gburu egbu na-efu efu.

  19. Charlie Kirk: Trump agaala Arizona maka emume ncheta nwoke a a gbagburu

    Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị agaala mpaghara Arizona maka emume ncheta nke e hibere maka ọnwụ Charlie Kirk e gburu izu abụọ gara aga.

    A na-atụ anya na igwe mmadụ ga-abịa emume ncheta a nke Turning Point USA haziri n' ama egwuregwu ‘State Farm’ nọ na Glendale.

    Ndị ga-ekwu okwu n'emume ncheta Kirk bụ Donald Trump, onye osote ya bụ JD Vance, nwunye Kirk bụ Erika, ọkpara Trump bụ Donald Trump Jr na ndị ọzọ

    Ka o sị dị ugbu a, ndị mmadụ agbakọla n' amaegwuregwu maka emume a.

  20. "Ikwupụta Palestaịn ka mba kwụụrụ onwe ya bụ imezi mmehie e mere n'oge gara aga"

    Onye na-anọchiteanya Palestaịn na mba Briten bụ Husam Zomlot gwara BBC na mbọ mba ndị nọ na Ndịda ụwa ihụta Palestine dịka mba kwụụrụ onwe ya bụ “imezi mmehie ndị e mere na mbụ.”

    Zomlot kwuru na ndị ndu Palestaịn na-eme atụmatụ ịhazi ntuliaka n’oge na-adịghị anya. “Ugbua ọ gaghị adị mfe n’ihi ihe ọgbatauhie, tinyere ọgbaghara dị na West Bank nakwa olulu Jordan”, ka o kwuru.

    Ọ gbakwụnyere na ị hụta Palestaịn dịka ọchịchị kwụụrụ onwe ya “dị oke mkpa” na onye ọbụla kwuru na nke ahụ adịghị mma bụ onye ọganihu adịghị amasị.