Etu e si gbuo mmadụ anọ ebe a na-akwa ozu n’Ogidi Anambra Steeti
Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola na ha na-eme nnyocha iji chọpụta ndị otu nzuzo gbagburu mmadụ anọ n’Ogidi okpuruọchịchị Idemili North nke steeti ahụ.
Ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Tochukwu Ikenga wepụtara kwuru na nke a mara n’ụbọchị Tọzde 11 Sepụtemba, 2025 ebe a na-eme akwamozu mmadụ.
O kwuru na oge a na-eli otu onye nwụrụ anwụ n’obodo Ezi nke Ogidi ka ndị a na-eche bụ otu nzuzo wakporo ebe ahụ ma malite ịgba ndị mmadụ egbe aghara aghara.
Ndị a gbagburu mmadụ anọ ebe mmadụ iri na ise merụrụ nnukwu ahụ.
Ikenga kwuru na mgbe ndị uweojii wuchiri ebe ahụ ọ bụrụ na ndị otu nzuzo ahụ agbaala ọsọ.
O kwuru na ha buuru ndị merụrụ ahụ gawa n’ụlọọgwụ ebe ha nwetere mgbọ egbe iri na isii.
Ọ gara n’ihu kwuo na nnyocha mbụ ha mere gosiri na ọdachi a bụ n’ihi esemokwu dị n’etiti ndị otu nzuzo abụọ.
O kwuru na ndị uweojii eweghachịla udo na mpaghara ahụ ma rịọ ọhanaeze ka ha gbaa ama ihe ọbụla dị aṅaa ha hụrụ.