Gọọmenti Namibia ekwuola ka a kwụsị oriri na ọṅụṅụ n’ebe a na-eli ozu
Ndị ọchịchị Namibia adọọla aka na ntị nye ndị obodo ha ka ha kwụsị ime oriri na ọṅụṅụ ebe a na-eli ozu.
Nke a na-abịa mgbe e nwere nnọkọ oriri na ọṅụṅụ n’ebe a na-eli ozu na Gammams bụ isiobodo Windhoek nke kpalitere iwe.
Otu onye bi na mpaghara Windhoek hụrụ ka a na-eme oriri na ọṅụṅụ si na “ọ bụ ihe ihere” .
O kwuru na ndị bịara ili onye ha nwụrụ nọ na-aṅụ mmanya n’ihe ndị ọzọ, dịka ha mere ebe a na-eli ozu ka ọ bụrụ ebe a na-ere mmanya.
Na nkwupụta ndị ọchịchị mere n’ụbọchị Tọzde, ha katọrọ ụdịr,ị omume ahụ ma kwuo na ọ bụ “ịkparị ugwu onye nwụrụ anwụ”.