Mba Sụdan akatọọla ndị agbataobi ha bụ Saụt Sụdan maka ikwuputa gbasara nhibe ụlọọgwụ n’akụkụ okeala ha dịka ha na-atụ egwu na e nwereike isite ebe ahụ
na-ekesara ndịagha Rapid Support Forces (RSF) ngwaọgụ.
Ọ bụ mba United Arab Emirates kwere Saụt Sụdan nkwa ụlọọgwụ
ahụ. Mana o teela Sụdan ji na-ebo mba ahụ ebubo ịkwado ndị otu RSF.
E boola mba United Arab Emirates ebubo iji ụlọọgwụ dị n’ọwụwa
anyanwụ Chad na-ekesara ndịagha RSF ngwaọgụ, mana ha gọpụrụ onwe ha n’ebubo ahụ.
Minista na-ahụ maka igwupụta akụ ndị chi nyere na Sụdan bụ
Mohamed Bashir Abunommo kọwara ụlọọgwụ ahụ dịka “ogige ndịagha” e mere dịka a
ga-asị na ọ bụ ụlọọgwụ.
Ndị ọchịchị Yurop akwadola atụmatụ Arabụ nwere iji rụzie Gaza
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, E mebiela ihe ruru 90 pacetị ụlọ ndị mmadụ na Gaza dịka UN siri kwuo
Mba ndị ọnụ na-eru n’okwu na Yurop akwadola atụmatụ Arabụ
nwere maka ịrụzie Gaza nke ga-eri ego ruru ijeri dọla iri ise na atọ ($53
billion) ma mekwa ka a ghara ịchụpụ ndị Palestine n’okeala ha.
Mba Izrel na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump jụrụ ịnabata
atụmatụ ahụ nke mba Ijipụt wepụtara tupu ndị ọchịchị Arabụ ndị ọzọ were kwado
ya.
Cheta na Onyeisiala Trump wepụtara atụmatụ chọrọ gbanwee ụzọ
Gaza ka ọ bụrụ "Middle East Riviera.
N’ụbọchị Satọde, 8 Maachị 2025, ndị mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme
na mba ofesi na Fransị, Jamini, Ịtali na Breten nabatara atụmatụ a ga-ewe ihe
karịrị afọ ise iji rụzie Gaza.
Ha kwuru na atụmatụ ahụ kwere “nkwa na-adịgide adịgide maka ọnọdụ
ibi ndụ nke ndị Gaza dị egwu" ugbu a.
Atụmatụ a na-akpọ oku ka eziga na mpaghara ahụ, kọmitii nke ndị
ọkachamara nọọrọ onwe ya na ndị na-ahụ maka udo mba ụwa, ka ha chịa Gaza nwa
oge.
O kwuru na ọ bụ kọmitii ahụ ga-ahụ maka ihe enyemaka mmadụ
ya na ịhazi ihe niile banyere mba Gaza n'okpuru nlekọta nke Palestine Authority.
Ha wepụtara atụmatụ a dịka a na-enwe nchegbu na nkwekọrịta
nkwụsị ịkwa mgbọ nke mba Izrel na Gaza nwere ike imebi dịka agba nke mbụ ya nọrọ
izuụka isii bịara na ngwụcha n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Maachị 2025.
Cheta na mba Izrel amalite igbochi ihe enyemaka ịbanye Gaza
iji manye Hamas ịnabata atụmatụ ọhụrụ mba Amerịka maka ịgbatị ogologo oge nke nkwụsị
ọgụ ahụ, n'oge a ka a ga-ahapụ ndị ọzọ ejidere na Gaza iji agbanwe ndị mkpọrọ
Palestine.
Idemmiri egbuola mmadụ 13 n'Argentina mgbe oke mmiri ozuzo gasịrị
Nkọwa foto, Ebe idei mmiri na-akpa mkpamkpa n'Argentina
Ihe ruru mmadụ iri na atọ anwụọla dịka idemmiri na-akpa
mkpamkpa n'obodo ọdụụgbọ mmiri nke Argentine bụ Bahía Blanca, ka oke mmiri
ozuzo gasịrị.
Mmiri ahụ zoro awa asatọ na-agwụsịghị agwụsị, mmebiri okporoụzọ
na akwa mmiri n’ụbọchị Fraịde 7 Maachị 2025, dịka idei tojuru ọtụtụ ụlọ ma mee
ka ọtụtụ mpaghara obodo ahụ ghara inwe ọkụ elatriki.
Ihe ruru otu puku na otu narị mmadụ ahapụla ụlọ ha dịka a chụpụrụ
ụmụaka amụrụ ọhụrụ n’ụlọọgwụ.
Cheta na ndị ọchịchị obodo ahụ dọrọ aka na ntị na ọnwụ nwere
ike ịkarị ole ọ dị ugbu a.
Ndị ọchịchị mpaghara ahụ kwuru na ha ga-ezite helikọpta na ụgbọ
ihe mberede ya na nri na mmiri n’obodo ahụ dịka ndị nche osimiri “coast guard”
na-enye aka ịzọpụta ndị mmadụ.
Ọgwụ ekpenta dị mkpa ga-amalite ịbata Naịjirịa ọzọ ka otu afọ gachara - WHO
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Ọgwụ ekpenta dị mkpa ga-amalite ịbata Naịjirịa ọzọ ka otu afọ gachara
Ụlọọrụ na-ahụ maka ahụike na mba ụwa bụ World Health
Organization ekwuola na ndị nwere ọrịa ekpenta na Naịjirịa ga-amalite ịhụ ọgwụ dị
mkpa iji gwọọ ọrịa ahụ, dịka ọ gachara otu afọ ha ahụbeghị ọgwụ ndị ahụ.
Mba Naịjirịa nke na-enwe ihe karịrị ọrịa ekpenta ọhụrụ ruru puku
abụọ 2,000 kwa afọ, ka ọgwụ eji agwọ ọrịa ahụ agwụrụ n'ihi na ejidere ọgwụ mgbe
ewebatachara usoro iwu ọhụrụ.
Ụlọọrụ ahụike WHO kwuru na ya agwara mba Naịjirịa ka ọ wepụ
iwu nnyocha ọhụrụ ahụ, ma kwuo na ọ na-atụ anya n’ọgwụ ahụ ga-amalite site mba India
ịbata n’ụbọchị Sọnde.
A na-agwọ ekpenta site na ngwakọta ọgwụ nje dị iche iche, mana
ọ bụrụ na a gwọghị ya, ahụike ndị nwere ọrịa ahụ nwere ike ịkawanye njọ site na
ọnya na-emebi akwara nke na-akpata nrụrụ.
Ọ gwụgwọ ọrịa ekpenta na-eru ihe dịka ọnwa isii maọbụ ọnwa iri
na abụọ.
Mana n'ihi enweghị ọgwụ na Naịjirịa, a chụpụrụ ndị ọrịa n'ụlọọgwụ
nke nwere ike ime ka ịgbasa ọrịa ahụ na-abawanye maka na ọgwụ ndị ahụ
na-egbochi nnyefe ọrịa ahụ adịghị.
Onye ọkachamara n’ihe ahụike ọha bụ Dọkịnta Samimu Msheliza,
onye ndụmọdụ ahụike na ngalaba ekpenta nke Naịjirịa - the Nigerian branch of
the Leprosy Mission, kọwara na ọ dị oke mkpa inwete ọgwụ eji agwọ ọrịa ahụ.
E bola ndị ọrụ nchekwa Syria ebubo igbu ọtụtụ narị ndị nkịtị
Ebe foto si, EPA
Nkọwa foto, E bola ndị ọrụ nchekwa Syria ebubo igbu ọtụtụ narị ndị nkịtị
Dịka otu nlekọta agha siri kwuo, e boro ndị ọrụ nchekwa Syria
ebubo na ha egbuola ọtụtụ narị ndị nkịtị bụ ndị okpukperechi Alawite dị ntakiri
n’ọnụ ọgụgụ dịka ọgbaghara na ihe ike na-aga n'ihu n'akụkụ oke osimiri nke mba
ahụ.
Ụlọọrụ Syrian Observatory for Human Rights (SOHR) nọ na mba Breten
kwuru na e gburu ihe ruru mmadụ narị asaa na iri anọ na ise (745) ndị nkịtị mgbe
enwere igbuchapụ mmadụ “massacres” ruru iri atọ nke ezubere iche maka ndị Alawites
n’ụbọchị Fraịde na Satọde 7 na 8 Maachị 2025.
Ụlọ mgbasa ozi BBC enwebeghị ike ime nnyocha banyere ebubo
ndị a iji mara maọbụ eziokwu.
Ọtụtụ narị mmadụ agbapụla n’ụlọ ha na mpaghara ahụ nke a mara
dịka obi ala nke onyeisiala Bashar al-Assad a chụpụrụ achụpụ, onye nke kwenyere
na okpukperechi Alawite.
Ụlọọrụ SOHR kwuru na e gbuola mmadụ karịrị otu puku na mkpụrụ
abalị abụọ gara aga dịka a na-enwe ọgbaghara kachasị njọ na mba Syria kemgbe ndịagha
nnupụisi kwaturu ọchịchị Assad na Disemba.
Ọnụọgụ a gụnyere ọtụtụ ndịagha gọọmentị na ndị ojiegbe
na-eguzosi ike ma na-esonye ọchịchị Assad.
Dịka akụkọ SOHR siri kwuo, e gbuola ihe dịka mmadụ otu narị
na iri abụọ na ise (125) nke ndịagha nchekwa gọọmentị ndị Islam na-edu na ndịagha
nnupụisi Assad mmadụ otu narị na iri anọ na asatọ (148).
Igbo bụ Igbo, ụtụtụ ọma nụ oo
Ọfọ anyị
bụ na ọ ga-adịrị anyị niile mma dịka ụnụ na-esonyere anyị n'ọgbakọ BBC
News Igbo taa.
Ọ bụ
Uzoamaka Ewuzie ga na-ewetara ụnụ akụkọ ihe na-eme na mba ụwa niile mana Chinonso
Ugorji ga-emechaa sonyere anyị n’oge ehihe.
Ya gazie!
Etu e si tụọ ụkọchukwu mkpọrọ afọ iri maka ịmetọ nwata nwaanyị dị afọ anọ
Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe ‘magistrate’ dị n’Umuahia atụọla otu ụkọchukwu a kpọrọ
Uche Arua Kalu mkpọrọ afọ iri na-akwụghị ụgwọ mgbapụta maka imetọ nwata nwaanyị
dị afọ anọ n’obodo Amaogudu Abiriba nke Abia Steeti.
Ọkaikpe Onuoha U.C chabiri ikpe ahụ n’ụbọchị Fraịde mgbe nwamadị
a kwupụtara n’ezie na o mere ihe dị etu a.
Ụlọikpe nyochara mkpesa niile nke gụnyere ihe akaebe e
gosiri megide ụkọchukwu ahụ nakwa ọsịsa ya n’ebubo ndị a, ọ gara n’ihu maa ya
ikpe ma tụọ ya mkpọrọ afọ iri nke na ọ gaghị eji ego gbapụta onwe ya nke
malitere na Fraịde 7 Maachị, 2025.
Ihe gbara okwu a n’anwụ bụ emume a na-eme na Redio a kpọrọ “Talk
Make I Talk” n’olu Bekee, bụ ebe nne nwata ahụ kọwaara etu ụkọchukwu ahụ siri rata
ma dinaa nwa nwaanyị.
Nwaanyị a kwuru na ụkọchukwu zụnyere nwa ya achịcha ma sị ya
mechie ọnụ ghara ịgwa onye ọbụla.
Mkpuhe ahụ nwaanyị nyere mere ka ọtụtụ mmadụ tinye ọnụ n’okwu
a nke mere e jiri nwụchie ụkọchukwu a ma malite ikpe ya ikpe.
Ọtụtụ ndị mmadụ nabatara mkpebi ụlọikpe a ọfụma ebe ndị ọzọ
na-ekwu na ụlọikpe gaara etinye afọ n’elu mkpọrọ afọ iri ahụ.
Ndị uweojii anwụchiela nwataakwụkwọ Michael Okpara University; napụta ya egbe anọ
Ebe foto si, Abia Police Command
Ndị uweojii Abịa steeti anwụchiela nwataakwụkwọ nke mahadum
Michael Okpara University of Agriculture Umudike bụ Chidozie Humble.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abịa steeti bụ Maureen Desmond
kwuru na ọ bụ ngalaba ndị uweojii Serious Crime Investigation Squad (SCISSORS)
nwụchiri nwataakwụkwọ ahụ dabere n’ozi dị oke mkpa ha nwetara.
Ọ sịrị na a nwụchiri nwataakwụkwọ ahụ nọ n’ogogo nke atọ (300 L) na
ngalaba ihe ọmụmụ Animal Breeding and Physiology maka ibugharị egbe n’ụzọ iwu
akwadoghị.
Ozi o wepụtara kwuru na oge ndị uweojii wakporo ụlọ Chidozie
gbara afọ iri abụọ na otu (21), ha chọtara egbe ntụ pistle atọ na otu English
Czech scorpion pistle.
Ozi ahụ sịrị “mgbe ọ fọdụrụ ihe dịka nkeji iri ka ọ kụọ
elekere iri na otu nke ụtụtụ n’ụbọchị Wenezde 5 Maachị 2025, ndị uweojii si na ngalaba
SCISSORS nwụchiri Chidozie Humble n’ime ụlọ ya dị na Royal Heritage Lodge,
Umudike dị n’okpuru ọchịchị Ikwuano.”
Ka o sinadị, ụlọorụ ndị uweojii ahụ kwere nkwa ịga n’ihu n’agha
ha na-ebu megide mpụ na omekome gburugburu Abịa steeti.
Ụfọdụ mmadụ anwụọla oge mgbọ tụtara ụgbọelu helikọpta UN na Saụt Sụdan
Ebe foto si, Unmiss
Otu Mbaụwa bụ United Nations (UN) kwuru na ụfọdụ mmadụ anwụọla
na Saụt Sụdan dịka a katọchara mbọ UN gbara ịkpọpụ ndịagha mba ahụ.
Otu onye ọrụ ụgbọelu nwụrụ oge mgbọ tụrụ ụgbọelu helikọpta,
ka ozi si n’aka ndị ọrụ UN na Saụt Sụdan bụ Unmiss kwuru.
Ozi ahụ gbakwunyere na otu ọchịagha mba Saụt Sụdan merụrụ ahụ
ebe ụfọdụ ndịagha ndị ọzọ nwụrụ oge a gbara mbọ ịkpọpụ ha na Upper Nile steeti.
UN ekwuola na mwakpo e mere ụgbọelu helikọpta ha nwereike “imejupụta
mpụ agha”.
Onyeisiala Saụt Sụdan bụ Salva Kiir mechara kwuo na ụgbọelu
helikọpta nke abụọ jisiri ike fepụ oge e mechara mwakpo ahụ dịka o mechara kpọkaa
ma gbuo mmadụ niile nọ n’ime ya.
Mana ka o sinadị, ndị otu UN kwuru na ụgbọelu helikọpta ha
abụọ dachara n’udo na Malakal.
Ụlọmgbasaozi Reuters kwuru na Minista mgbasaozi bụ Michael Makuei
sị na ndịagha Saụt Sụdan dị iri abụọ na asaa (27) n’ozuzuoke nwụrụ na mwakpo ahụ.
Agha dara na Upper Nile steeti kemgbe izuụka ole na ole
eyiela egwu megide nkwekọrịta udo na-esichaghị ike dị n’etiti onyeisiala Saụt Sụdan
bụ Salva Kiir na Osote Onyeisiala bụ Riek Machar.
Ogbunigwe Rọshịa tụrụ na mpaghara Donetsk egbuola mmadụ 11 – Ka Yukren kwuru
Ebe foto si, Donetsk Emergency Service
E gbuola opekatampe mmadụ iri na otu (11) dịka iri atọ (30)
ndị ọzọ merụrụ ahụ oge ogbunigwe Rọshịa dara na mpaghara Donetsk.
Ndị ọchịchị Yukren kwuputara nke a.
Ụlọ obibi asatọ na otu ụlọorụ ka a sị ogbunigwe ahụ lara n’iyi.
Ọnọdụ a na-abịa dịka Trump kwuru na ya “na-atule” inye Rọshịa
ezigbo ntaramaahụhụ n’ụdị ịkwụ nha na ụtụisi maka ‘ịgwepịa’ Yukren n’ọgbọ agha.
N’izuụka a ka Amerịka kwụsịtụrụ enyemaka ndịagha ha na Kyiv
ma kwụsịtụkwa ikesaara ha ozi nchekwa.
Ọ na-esiri m ike mụ na Yukren imekọrịta ihe karịa Rọshịa – Donald Trump
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala
Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na “ọ na-esiri ya ike ya na Yukren imekọrịta ihe” karịa Rọshịa na mbọ a na-agba iweta udo n’etiti mba abụọ ahụ.
Amerịka “na
Rọshịa na-eme nke ọma,” dịka “o nwereike ịdị mfe ka anyị na Mosko mekọrịta ihe”
karịa Kyiv, ka Trump gwara ndị ntaakụkọ n’ụlọorụ onyeisiala Amerịka.
Na mbụ ka Trump kwuru na ya “na-atule” inye Rọshịa ezigbo
ntaramaahụhụ n’ụdị ịkwụ nha na ụtụisi ruo oge a ga-enwe nkwekọrịta maka nkwụsị ịkwa
mgbọ n’etiti ha na Yukren.
Ka o sinadị, ụlọorụ Maxar gwara BBC Verify na Amerịka akwụsịtụla
Yukren inweta ozi na satlaịt dịka Trump kwụsịtụrụla enyemaka ndịagha na mba ahụ.
Ya bụ ọnọdụ na-abịa n’ime otu izuụka e nwechara nzukọ pụrụiche
n’obi ọchịchị White House ebe Trump nọọrọ katọọ onyeisiala Yukren bụ Volodymyr
Zelensky maka “inupuru Amerịka isi”.
Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi, Ọfọ anyị taa bụ ndụ mmiri, ndụ azụ.
Abọ ekele ka anyị na-ebutere gị maka isonyere anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo nke taa.
Chinonso Ugorji kwụ chịm ugbua iwetere gị akụkọ ndị ahụ na-akpọtụ n'akụkụ ụwa dị iche iche mana Ikechukwu Kalu ga-emecha sonyere ya.
Biko gbaa mbọ nọnyere anyị taa.
E enyeela Pati ikike ime ntuliaka imeụlọ maka ndị ga-azọ ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti
Ebe foto si, INEC/Facebook
Ụlọọrụ na-ahazi
ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (INEC) ewepụtala
usoro a ga-eji mee ntuliaka imeụlọ nke pati dị iche iche maka ịhọpụta ndị
ga-eji aha ha azọ ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti.
Site n’ọgbakọ
ụlọọrụ a nwere n’ụbọchị Tọzde 6 Maachị, 2025, ha kpebiri na ntuliaka ime ụlọ
nke pati ọbụla ga-amalite n’ụbọchị 20 Maachị 2025 ruo na 10 Eprelụ, 2024.
Ụlọọrụ Inec kwuru na pati iri na abụọ n’ime iri na itoolu edetela
akwụkwọ usoro ha ga-eji ahazi ntuliaka ime ụlọ ha nke mere ha ji agwa pati asaa
ndị fọrọ afọ ka ha gbalịa deta akwụkwọ nke ha.
Ha rịọkwara pati ndị a ka ha biko soro usoro ndị ahụ ha
detara ma hazie ntuliaka ime ụlọ ndị a n’ụbọchị ha hiwere ya na-abụghị a bịa a
na-agbanwe na ntabi anya.
Inec kwuru na nke a ga-enyere ha aka ileba anya ọfụma n’etu
e si hazie ntuliaka ime ụlọ ahụ.
Cheta na ụlọọrụ Inec nọọrọ n’afọ gara aga hiwe ntuliaka ọkwa
Gọvanọ Anambra Steeti ka ọ bụrụ n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Nọvemba afọ 2025.
Gọọmenti Naịjirịa ekwuputala Simon Ekpa dịka onye na-akwado iyi ndụ egwu
Ebe foto si, Simon Ekpa/Instagram
Gọọmenti Naịjirịa
nọọrọ n’ụbọchị Tọzde 6 Maachị 2025 kwuputa Simon Ekpa dịka onye ji ego na-akwado
iyi ndụ egwu na Naịjirịa.
Aha Simon
Ekpa so n’ime aha mmadụ iri na asaa (17) gọọmenti Naịjirịa kwuru a ga-agbachi ọbaego
ha n’ihi ebubo iji ego akwado iyi ndụ egwu.
Na nzukọ a
haziri n’Abụja, gọọmenti Naịjirịa kwuru na mmadụ ndị ahụ a kpọrọ aha ga-awuchi
n’ihu kọmitii na-ahụ maka ntaramaahụhụ maka ịzara ọnụ ha.
Oge ọ
na-ekwu okwu gbasara nke a, Onyendu Njikọ Igbo bụ Rev. Obiora kwuru na dịka
onye otu Njikọ Igbo na ọ gaghị achọ ịmanye ọnụ n’okwu ọbụla gbasara Simon Ekpa
na gọọmenti Naịjirịa.
Obiora sịrị
na ya anaghị akwado ibugharị ngwaọgụ n’ala Igbo nakwa iwu onye apụtakwala ezi
kwa ụbọchị Mọnde ndị otu Ekpa tinyere na mpaghara ahụ.
“Gọọmenti
Naịjirịa anaghị emeso ndị Igbo ezi omume mana anaghị m akwado ka ndị mmadụ
na-ebugharị egbe,” ka o kwuru.
O jikwa
ohere ahụ kpọọ oku maka ntọhapụ onyendu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ
Nnamdi Kanu, dịka ọ sịri na ọ bụ oku nnwereonwe ka nwaamadị ahụ na-akpọ.
Kọmishọna na-ahụ maka ala na nrụpụta ihe n'Abia Steeti anwụọla
Ebe foto si, Ferdinand Okeoma/Facebook
Gọọmentị Abia Steeti ekwupụtala ọnwụ kọmishọna na-ahụ maka
ala na nrụpụta ihe bụ Sunny Nwanganga Onwuma.
N’ozi kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi bụ Okey Kanu wepụtara, o kwuru na Onwuma nwụrụ n’ụbọchị Mọnde 3 Maachị 2025 ka ọ rịachara obere ọrịa.
Gọọmentị Abia Steeti ezigarala ezinaụlọ Onwuma ozi itiaka n’obi ma kwuo ka mkpụrụobi
ya zuo ike na ndokwa.
Onwuma gbara afọ iri isii na otu tupu ọnwụ ya. Ọ bụ nwaafọ
obodo Ihie dị n’okpuruọchịchị Ugwunagbo nke Abia Steeti.
Ọ gụrụ akwụkwọ n’ụlọakwụkwọ Government College dị n’Umuahia
nakwa mahadum Abia dị n’Uturu.
Ọ bụ onye otu Labour Pati ma bụrụkwa onyendu n’obodo ya.
Ọ lụrụ nwaanyị ma mụọ ụmụ anọ.
Ụgbọelu agha mba Fransị esonyela n'agha Yukren na Rọshịa
Ebe foto si, ECPAD HO via Reuters
Nkọwa foto, Ụgbọelu French Mirage
Ndịagha mba Yukren ekwuola na ha ji ụgbọelu agha mba Fransị zọọ onwe ha dịka mba Rọshịa tụrụ ọtụtụ
ogbunigwe n’ebe Yukren na-emepụta gaasị.
Ha sị na ogbunigwe ahụ gụnyere ‘missile’ dị 67 nke ihe n’ime ya bụ cruise
missile 43, kalibr ballistic missile 3 na kh-59/69 dị asatọ.
Ha kwuru na Rọshịa zipụkwara droonu dị 194 n’ọnụọgụgụ.
Yukren sị na n’ime ogbunigwe na droonu ndị ahụ niile, ha
gbaturu cruise missile dị 33 n'ọnụọgụgụ, otu kh-59/69 nakwa droonu.
Ndịagha mba Yukren sị na nke a bụ nke mbụ mba Yukren na-eji
ngwaagha mba Fransị a na-akpọ ‘French Mirage Planes’ na-azọ onwe ha n’aka Rọshịa.
Ọtụtụ mmadụ emeruola ahụ na ngagharịiwe na-akpọtụ na Mozambique
Ebe foto si, AFP
Nkọwa foto, Mozambique
Okpekatamkpe
ihe ruru mmadụ iri na abụọ meruru ahụ n’oge ndị uweojii na-achụsa ndị mmadụ na-akwado
Venâncio Mondlane na-eme ngagharịiwe.
Venâncio
Mondlane bụ onye ndu ndị na-agba gọọmentị ụkwụ na mba Mozambique.
Mondlane na
ndị ọzọ hụrụ ihe mere na-ekwu na ndị uweojii ji egbe nrị dị n’ime ya na-achụsa ha
oge ha na-eme ngagharịiwe n’isi obodo Mozambique bụ Maputo.
Ugbua ma ndị
uweojii ma ndị ọchịchị na mba ahụ enwebeghị ihe ha kwuru maka ọnọdụ a.
Nke a na-eme
dịka Onyeisiala mba ahụ bụ Daniel Chapo kpọkọrọ ndị ndu otu ndọrọmdọrọ ọchịchị
niile na-eme ngagharịiwe maka etu ntụlịaka si gaa ma mee ka ha nwee nkwekọrịta, mana
Chapo akpọghị Mondlane ka o soro n'amụma udo ahụ.
N’oge ndị
uweojii na-achụsa ndị so Mondlane eme ngagharịiwe ka mmadụ ruru iri na isii
meruru ahụ mana BBC achọpụtabeghị nke bụ eziokwu n’ọnụ ọgụgụ mmadụ ole meruru
ahụ.
Ndị otu
Mondlane na-ekwu na otu nwataakwụkwọ nwụrụ anwụ mgbe mgbọ egbe ndị uweojii tụrụ ya
ebe ndị ọzọ were nsogbu sitere n’awụrụ anya mmịrị ndị uweojii tụrụ n’oge ahụ.
Eji m aka na mkparịtaụka ga-adị n’etiti Amerịka na Yukren n’izuụka ọzọ ga-aba uru - Zelensky
Ebe foto si, EPA-EFE/REX/Shutterstock
Volodymyr
Zelensky ekwuola na ya ga-eme njem gaa mba Saụdi Arebịa n’izuụka na-abịa abịa
maka mkparịtaụka ga-adị n’etiti ndị ọchịchị Yukren na Amerịka gbasara ịkwụsị agha
dị n’etiti ha na Rọshịa.
Zelensky
kwuru na ya nwere olileanya na nzukọ ahụ ga-bụ “nke bara uru” ma kwuo na ya
ga-agbakọrọ Trump aka iji weta udo “ga-adịgide adịgide ọsọọsọ”.
Onye nnọchiteanya
Amerịka bụ Steve Witkoff kwuru na ndị otu mkparịtaụka si Amerịka ga-achọ ịkpa banyere “usoro” a ga-esi nweta udo nke ga-enye aka kwụsị agha ahụ.
Na nzukọ ha
nwere na Brussels, Zelensky kpọrọ ndị ndu Yurop oku ka ha kwadoo atụmatụ ndị o
wepụtara maka iweta agha ahụ n’isi njedebe.
Dịka Minista
ikike mba ahụ siri kwuo, Rọshịa tụrụ ogbunigwe n’akụrụngwa ikike ọkụ na gaasị
nke mba Yukren n’abalị gara aga.
Ụmụ Igbo kara aka, ụnụ asaala chi eee, Ka ụbọchị taa maara onye niile mma
Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo nke taa bụ Fraịde Orie 7 Maachi, 2025.
Chinonso Ugorji na Michael Ilediagu awuchiela iwetere gị akụkọ niile na-akpọtụ n'akụkụ ụwa dị iche iche mana Ikechukwu Kalu ga-emecha sonyere anyị.
Onyeisiala Bola Tinubu ewerela ndị ọrụ ahụike mmadụ 774 n’ọrụ
ozugbo n’atụmatụ ‘national health programme’.
O kwuru nke a n’emume mgbape atụmatụ ahụ n’Abuja n’ụbọchị
Wenezde.
Mgbe ọ na-agwa ndị a e nyere ọrụ ilekọta ụlọọrụ ‘Primary
Healthcare Centres’ dị n’okpuruọchịchị 774 na Naịjirịa okwu, Tinubu kwuru, “E
weela gị n’ọrụ” ma kwee nkwa inye ha ọrụ ma oge ha zuo n’ime out afọ.
Onyeisiala
Tinubu kwuru nke a n’ihu Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ Ali Pate na nke na-ahụ
maka akụnaụba ma kwuo na atụmatụ a dị mkpa iji wulite ọnọdụ ahụike na Naịjirịa.
A họpụtara
mmadụ 774 a eduru n’iyi ọrụ site na mmadụ 359,000 tinyere akwụkwọ maka ọrụ ahụ.
Atụmatụ dịka
e si kwuo so na mbọ ọchịchị Tinubu na-agba iji nwogharịa ngalaba ‘primary healthcare’
na Naịjirịa.