Ana m ewesara Putin iwe maka mkparịtaụka nkwụsị ọgụ - Onyeisiala Trump
Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Maachị 2025.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere
Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nụ oo
Biko bịa nụ sonyere
anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa.
Dịka ụnụ
na-eme nke a, ụbọchị taa ga-amịta anyị niile mkpụrụ ọma.
Ọ bụ
Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga na-ewetara ụnụ akụkọ ihe na-eme na mba ụwa
niile mana Ikechukwu Kalu ga-emechaa sonyere anyị n’oge ehihe.
Ndewo!
Ọrịa ‘meningitis’ etiwapụla na Kebbi steeti, gbuo mmadụ 26
Ebe foto si, Getty Images
Gọọmenti Kebbi steeti ekwuputala ntiwapụ ọrịa ọdọ n’ekwe bụ ‘meningitis’
n’ime okpuruọchịchị atọ e nwere na steeti ahụ bụ nke gburula mmadụ iri abụọ na
isii (26) ugbua.
Kọmịshọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Yanusa Ismail
kpuhere nke a n’ọgbakọ ya na ndị ntaakụkọ nwere na Birnin Kebbi.
O kpuhere na mmadụ narị abụọ na iri anọ na asatọ (248) bụ ndị
a na-enyo enyo butere ọrịa ahụ dịka mmadụ atọ n’ime iri na otu (11) e merela
nnyocha gosiri na ha ebughị ya bụ ọrịa.
Dịka kọmịshọna ahụ siri kwuo, mmadụ iri na asatọ (18) nwụrụ
n’okpuruọchịchị Gwandu, isii anwụọ n’okpuruọchịchị Jega, anọ anwụọ n’Aleiro ebe
otu onye nwụrụ n’Argungu.
Iji buo agha megide ọnọdụ ahụ, gọọmenti Kebbi steeti akwadoola
nde naịra iri atọ (30m) maka iji zụbata ọgwụ a ga-eji belata mfesa ọrịa ahụ.
Kọmịshọna ahụ gwara ọhanaeze ka ha gbaa mbọ na-adị ọcha oge
niile ma wezuga onwe ha ebe e nwere ọtụtụ mmadụ iji belata mfesa ọrịa ahụ.
O kwukwara na e hiwela ogige gbatagbata dị iche iche iji lekọta
ndị butere ya bụ ọrịa.
A malitela ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa ‘diphtheria’ dịka otu nwataakwụwọ nwụrụ na Legọs steeti
Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọrụ ahụike amalitela ọrụ gbatagbata na Legọs steeti n’isochi
ntiwapụ ọrịa mgbapịa akpịrị bụ ‘diphtheria’ nke butere ọnwụ nwataakwụkwọ dị afọ
iri na abụọ (12).
Opekatampe, mmadụ iri atọ na anọ (34) ka a na-elebara ezigbo
anya ugbua ebe ụmụakwụkwọ iri na anọ (14) bi n’ogige ụlọakwụkwọ Kings College gosirila
njirimara ọrịa ahụ.
Ka ọ dị, n’ime ha bụ ụmụakwụkwọ iri na anọ, a chọpụtara na
iri na abụọ (12) n’ime ha ebutela ọrịa ahụ dịka ha na-anara ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ
ugbua.
Dịka kọmịshọna na-ahụ maka ahụike na Legọs steeti siri kwuo,
a chọpụtara na otu nwataakwụkwọ nwoke nwere olu mgbu na ahụọkụ oge e mere ya
nnyocha n’ụlọọgwụ dị n’ụlọakwụkwọ Kings College n’abalị 22 Febụwarị, 2025. O
mechara nwụọ n’abalị 6 Maachị, 2025.
Ka ọ dị ugbua, a malitela ịgba ọgwụ mgbochi n’igwe, ọkachasị
maka ụmụakwụkwọ na ndị ọrụ ahụike e nwere n’ụlọakwụkwọ dị iche iche dịka ndị ọchịchị
na-atụle ime ya ka ọ gaa gburugburu Legọs steeti.
Ka o sinadị, e nyela ndị bi na steeti ahụ ndụmọdụ ka ha were
okwu adịmọcha kpọrọ ihe dị oke mkpa, wezuga onwe ha ebe e nwere ọtụtụ mmadụ ma
chọọ enyemaka n’ụlọọgwụ oge ọbụla ha malitere ịhụ njirimara dịka nke ọrịa mgbapịa
akpịrị.
Mgbapịa akpịrị bụ ọrịa bakterịa na-efe efe nke ukwuu, nke
na-emetụta imi na akpịrị ma na-efesa site n’ụkwara maọbụ mgbe onye nwere ya
mara uzere.
Mmadụ nwekwara ike ibute ọrịa ahụ site n’imetụ aka n’ihe ọbụla
nje ahụ metụtara tụmadị ebe e nwere ọtụtụ mmadụ maọbụ ebe ikuku anaghị abanye
nke ọma.
Ntiwapụ ọrịa mgbapịa akpịrị n’afọ 2023 gburu mmadụ karịrị
narị isii (600) ọkachasị ụmụaka. Ọ metụtara steeti iri na itoolu (19) ọkachasị
na mgbago ugwu.
N’ịga n’ihu
na mbọ ha na-agba ikpochapụ ndị omekome, ụlọọrụ ndị uweojii Imo steeti na njikọaka
ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ na ndị nche obodo ebuola agha n’ogige ndị ekperima dị na
steeti ahụ.
Mwakpo ha
jikọtara aka mee n’ụbọchị Mọnde 10 Maachị 2025 lekwasara anya n’okeọhịa dị n’Avu,
Irete, Okuku, Ihiagwa na Obinze dịcha n’okpuruọchịchị Owerri West tinyere ụfọdụ
akụkụ okpuruọchịchị Ngor Okpala nakwa ebe ndị ọzọ.
Ọnụ na-ekwuru
ụlọọrụ ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye sịrị na ndị uweojii nwụchiri mmadụ
asatọ a na-enyo enyo n’Okuku dị n’okpuruọchịchị Owerri West ma napụta ha egbe
pump action abụọ, mgbọ egbe iri na asaa (17), igwe ‘walkie-talkie’ itoolu, mma
atọ, ekwentị asaa, igwe laptop, otu ọgbaatumtum na ihe ndị ọzọ.
Ebe foto si, Imo State Police Command
Okoye sịrị
na a malitela ime mmadụ ndị ahụ a na-enyo enyo nnyocha iji mara ogogo mpụ ha
mere nakwa iji nye aka nwụchie ndị otu ha ndị ọzọ.
Ọ gara n’ihu
kpuhee na kọmịshọna ndị uweojii Imo steeti bụ Aboki Danjuma ehiwela otu ọrụ pụrụ
iche bụ ‘Special Tactical Unit’ ndị ọrụ ha bụ ịchọpụta na ikpochapụ ndị omekome
zoro onwe ha n’ime ọhịa n’akụkụ steeti ahụ dị iche iche.
Ebe foto si, Imo State Police Command
Ebe foto si, Imo State Police Command
Ebe foto si, Imo State Police Command
Mba Uganda ezigala ndịagha na Saụt Sudan - Onyeisi ndịagha
Ebe foto si, AFP
Nkọwa foto, Onyeisi ndịagha mba Uganda bụ Gen Muhoozi Kainerugaba kwuru na Uganda ezigala ndịagha na Saụt Sudan
Onyeisi ndịagha
mba Uganda bụ Gen Muhoozi Kainerugaba ekwuola n’Uganda ezigala ndịagha ha n’isi
obodo Saụt Sudan bụ Juba iji nyere Onyeisiala Salva Kiir aka n’ọrụ nchekwa.
Nke a na-eme
dịka esemokwu na-abawanye n'etiti Onyeisiala Kiir na osote onyeisiala bụ Riek
Machar, na-eme ka ụjọ na-atụ ndị mmadụ na nkwekọrịta udo ha na-esighị ike nwere
ike ịda, ma mee ka esemokwu were laghachite na mba ahụ.
Gen
Kainerugaba akọwaghị ihe mere Uganda jiri were ziga ndịagha ha na mba ahụ bụ ndị
agbata obi ha, mana o kwuru na ihe ọ bụla e mere megide Onyeisiala Kiir bụ ibu agha
megide Uganda.
O kwuru na
soshịa midia ya bụ X na “Anyị ga-echekwa okeala niile nke mba Saụt Sudan wee
etu anyị si echekwa nke anyị”.
Ndị ọchịchị
Saụt Sudan ekwubeghị ihe ọ bụla banyere ndịagha ahụ ezitere ha.
Cheta na ihe
banyere nchekwa na-akawanye njọ na mba Saụt Sudan dịka mba Amerịka enyere ndịọrụ
ya na-abụghị ndịọrụ mberede iwụ na Satọde ka ha hapụ mba ahụ.
N’izu gara
aga, ndịagha Saụt Sudan nwụchiri osote onyeisi ndịagha ya na ndị mịnịsta abụọ bụ
ndị ha na Machar na-arụkọ ọrụ, mana ọnụ na-ekwuchitere ndị emegidere emegide kpọrọ
nke a "oke mmebi" ihe dị na nkwekọrịta udo ahụ.
Mana a tọhapụla
otu n’ime ndị mịnịsta abụọ ahụ a nwụchiri.
Ndị uweojii anwụchiela ndị a na-enyo enyo na ha jiegbe ezu ohi
Ebe foto si, Enugu State Police Command
Nkọwa foto, Ihe ndị uweojii napụtara ndị a na-enyo enyo na ha jiegbe ezu ohi
Ndị uweojii
anwụchiela ụmụnwoke abụọ a na-enyo enyo na ha jiegbe ezu ohi n’Enugwu steeti.
Ozi si n’aka
ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe kwuru na mmadụ abụọ ndị ahụ
anwụchiri n’abalị Tọzde 6 Maachị 2025 na mpaghara Nsukka dị na steeti ahụ gụnyere
Ugwu Ejiofor nke dị afọ iri atọ na abụọ (32) ya na Sunday Ugwuanyi nke dị afọ
iri abụọ na isii (26).
Ndukwe kwuru
na ihe ndị a napụtara ha gụnyere egbe nwere mgbọ, kaadị eji adọrọ egọ n’igwe ATM,
ekwentị abụọ, ọgba tum tum eji aga ohi na ihe ndị ọzọ.
O kwuru na nnyocha
mbụ e mere gosiri na ndị ahụ a na-enyo enyo jidere otu nwaagbọghọbịa n’ebe a
na-akpọ Obukpa Amebo na Nsukka were napụ ya akpa ya.
Akụkọ a mere
ka ndị uweojii were chọba ma nwụchie tupuu ha were napụtakwa ihe ndị ahụ niile.
Ndukwe kwuru
na a ga-akpụpụ ndị a na-enyo enyo ụlọikpe ma ọ bụrụ na emechaa nnyocha.
Yukren atụọla nnukwu ogbunigwe n'isi obodo mba Rọshịa gbuo mmadụ abụọ
Ebe foto si, Governor Andrei Vorobyov/Reuters
Nkọwa foto, Mosko, Rọshịa
Mba Yukren ejirila droonu were tụọ nnukwu ogbunigwe n'isi obodo mba Rọshịa bụ Mosko.
Ugbua a na-ekwu na ọ bụ mmadụ abụọ bụ ihe nwụrụ n'ogbunigwe ahụ mana ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ na ya wereike ịbanwanye.
Ụlọọrụ nchekwa mba Rọshịa kwuru na ha gbaturu droonu ndị Yukren ruru 337 n'isi obodo mba ha nakwa mpaghara ndị ọzọ ruru itoolu na-abụghị Mosko.
Andrei Vorobyev bụ gọvanọ na-achị mpaghara ahụ kwuru na nwoke dị afọ iri ise nwụrụ n'ogbunigwe ahụ nke mere ya mmadụ abụọ a maara nwụgoro anwụ ụgbua ma kwuo na e were ndị merukwara ahụ n'ogbunigwe ahụ.
Etu ọnọdụ si dị ugbua, mba Yukren enwebeghị ihe ha kwuru maka iwakpo Mosko.
Amerịka enyela ndị abụghị ndịọrụ mberede iwu ka ha pụọ na Saụt Sudan maka esemokwu
Ebe foto si, AFP
Nkọwa foto, O ruola afọ ise agha na-aga n'ihu na Saut Sudan
Mba Amerịka
enyela ndịọrụ ya na-abụghị ndịọrụ mberede iwụ ka ha hapụ Saụt Sudan dịka nsogbu
na-akawanye njọ na mba ahụ.
Ọgụ malitere
n’ụbọchị ndị na-adịbeghị anya na-eyi nkwekọrịta udo na-esighị ike dị n'etiti
Onyeisiala Salva Kiir na osote onyeisiala Riek Machar, egwu.
Cheta na ndị
ọchịchị abụọ ahụ binyere aka n’akwụkwọ nkwekọrịta udo n’afọ 2018 ka ha kwụsị
agha afọ ise ahụ nke gburu ọtụtụ narị puku mmadụ, mana mmekọ ha enwebeghị udo.
N’ụbọchị Sọnde
9 Maachị 2025, mba Amerịka kwuru n’ọgụ na-aga n’ihu na mba Saụt Sudan n’etiti
ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị agbụrụ dị iche iche dịka ngwa agha dị n’aka ndị
mmadụ.
Ngalaba
na-ahụ maka ikike dịrị mmadụ nke ụlọọrụ UN na mba Saụt Sudan dọrọ aka na ntị n’ụbọchị
Satọde 8 Maachị 2025, banyere ọgbaghara na-amalite iyi udo egwu na mba ahụ.
Onyeisiala Kiir
akpọọla oku ka enwe udo ma kwekwa nkwa na mba ahu agaghị alaghachi n’agha ọzọ.
Igbo bụ Igbo, ụnụ abọọla chi
Ọ bụ
Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga na-ewetara ụnụ akụkọ ihe na-eme na mba ụwa
niile mana Chinonso Ugorji ga-emechaa sonyere anyị n’oge ehihe.
Dịka ụnụ
na-esonyere anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa, ọfọ anyị bụ n’ụbọchị taa ga-amịta
mkpụrụ ọma.
Ndewo!
Ndị uweojii abanyela n’okeọhịa ndị e nwere n’Imo steeti
Ebe foto si, Imo State Police Command
Ụlọọrụ ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ha amalitela
ipiogharị n’okeọhịa dị n’ụfọdụ obodo na steeti ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye
kwuputara nke a n’ozi ọ wepụtara n’ụbọchị Mọnde 10 Maachị 2025.
Akụkụ ozi ahụ sịrị “Ụlọọrụ ndị uweojii Imo steeti na njikọaka
ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ, ndị nche obodo na otu forest guard na-epiogharị n’ọhịa ndị
dị n’obodo Avu, Irete, Ihiagwa na Obinze dịcha n’okpuruọchịchị Owerri West
tinyekwara ụfọdụ akụkụ okpuruọchịchị Ngor Okpala ka ọ dị ugbua.”
Ebe foto si, Imo State Police Command
Okoye kọwara na ebomnobi ha jiri banye n’ọrụ ahụ bụ iji
kpochapụ ndị omekome na-eyi steeti ahụ egwu.
Ọ rịọrọ ndị obodo ahụ niile ka ha kwado ma gbakọọrọ ndị ọrụ
nchekwa aka na mbọ ha na-agba iweghachi udo n’Imo steeti.
Ebe foto si, Imo State Police Command
Ebe foto si, Imo State Police Command
Ebe foto si, Imo State Police Command
Aka ndị uweojii akparala onye ọrụ nchekwa maka ịgbagbu nọọsụ na Delta steeti
Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii anwụchiela onye otu Delta State Anti-Cult
Volunteer Corps maka ịgbagbu nọọsụ enyemaka dị afọ iri na itoolu (19).
Ihe ọdachi ahụ mere n’Okpanam dị n’isi obodo Delta steeti n’ụbọchị
Satọde 8 Maachị, 2025.
Onye nọọsụ ahụ nwụrụ anwụ a matara aha ya dịka Isioma
Nwayilan si ọrụ wee na-ala n’ụlọ ya dị n’Asaba na mgbede Satọde tupu o zute ọnwụ
erughị eru ahụ.
Otu onye hụrụ ka ihe ọdachi ahụ siri mee na-achọghị ka a kpọọ
aha ya kwuru na onye ọrụ nchekwa ahụ na-arịtu n’ụgbọala tupu egbe ya agbapụ
mgbọ na mberede ma tụta nwaagbọghọ ahụ.
O kwuru na e mere ngwangwa bugaa nọọsụ ahụ n’ụlọọgwụ nọ nso,
bụ ebe a nọọrọ kwuputa ya dịka onye nwụrụ anwụ ka elekere ole na ole gasịrị.
Oge onye ntaakụkọ BBC News Igbo kpọtụurụ ọnụ na-ekwuru ndị
uweojii Delta steeti bụ Bright Edafe n’ekwentị, ọ kọwara akụkọ ahụ dịka
eziokwu.
Cheta na ọ bụ n’afọ 2022 ka ụlọọrụ ndị uweojii hibere otu Anti-Cult Volunteer Corps dịka akụkụ mbọ ha na-agba ịchụ mpụ na omekome ọsọ na steeti ahụ.
Ndị Bishọpụ Katọlik agwala gọọmenti ka ha gboo nsogbu enweghị nchekwa na ihe isiike
Ebe foto si, Catholic Archdiocese of Owerri
Nkọwa foto, Archbishop Lucius Iwejuru Ugorji
Otu jikọtara ndị Bishọpụ ụka Katọlik na Naịjirịa bụ Catholic
Bishops’ Conference of Nigeria (CBCN) agwala gọọmenti ka ha buo agha
megide ihe ha kọwara dịka ọnọdụ nchekwa na-agba ọnyụpa na ihe isiike na-arị elu
na mba ahụ.
Onyeisioche CBCN bụ Archbishọpụ Lucius Iwejuru Ugorji nyere
ndụmọdụ ahụ n’ọgbakọ mbụ nke afọ 2025 ndị otu ahụ nwere n’Abụja.
Ugorji kwara arịrị maka ọgbaaghara na-arị elu na Naịjirịa
tinyekwara ọnọdụ akụnaụba na-adakpọ adakpọ bụ nke merela ka nde kwuru nde ụmụafọ
Naịjirịa nọrọ na nhujuanya.
Archbishọpụ Ugorji gbarụkwara ihu megide mkpamkpa ndị otu
Boko Haram na-eyi ndụ egwu, ndị ojiegbe na otu ọjọọ ndị ọzọ na-ebugharị ngwaọgụ
gburugburu Naịjirịa.
Ọ rụtụrụ aka n’ogogo ntọrị na-arị elu, ọkachasị ndị nke chewere
ihu ebe ndị Ụkọchukwu na ndị isi ụlọụka nọ.
N’agbanyeghị mbọ ndị ọrụ nchekwa na-agba, onye Ụkọchukwu ahụ
jụrụ ihe mere gọọmenti ezipụbeghị akụrụngwa teknụzụ ọlọrọọhụrụ iji kwalite ọrụ
ndị nchekwa.
Gbasara ọnọdụ akụnaụba, Ugorji kwuru na ihe isiike emetụtala
onye ukwu na onye nta, tinyekwara ọtanisi na ahụghị ego e ji ebi ndụ.
Ọ rụtụrụ aka n’ihe ndekọ ụlọakụ mbaụwa bụ World Bank wepụtara
bụ nke gosiri na ụmụafọ Naịjirịa dị otu narị nde na iri abụọ na itoolu (129m) bụ
ndị na-ebi ndụ n’ime ụbịam.
Droonu mba Yukren atụọla ogbunigwe n'ebe a na-arụpụta mmanụ ụgbọala na mba Rọshịa
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelenskiy
Ndịagha mba Yukren ejirila droonu were tụọ ogbunigwe n'ebe a na-arụpụta mmanụ ụgbọala na mba Rọshịa.
Ozi a si n'ụlọọrụ mgbasaozi dị na mba Yukren a na-akpo Ukrayinska Pravda.
Ha kwuru na ndị bi na mpaghara Samara dị na Rọshịa kwuru na ha nụrụ nnukwu ụda dara ka ogbunigwe.
Onye ụlọọrụ ndị nchekwa nke mba Yukren bụ Andriy Kovalenko dere n'akara Telegram ya sị "na ọdọ ebe a na-arụpụta mmanụ ụgbọala ahụ so na ọdọ iri kachasi ibe ha n'ebe a na-emepụta mmanụ ụgbọala na mba Rọshịa"
Ebe a na-arụpụta mmanụ ụgbọala ahụ bụkwa ebe a na-arụpụta mmanụ ndị ọzọ dị icheiche nakwa akụrụ ngwa ndịagha dịka Kovalenko si kwuo.
Nasir El-Rufai agbala APC arụkwaghịm dịka ọ banyere pati SDP
Ebe foto si, Nasir El-Rufai/Facebook
Nkọwa foto, Nasir El-Rufai
Aka chịburu
Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai agbala pati ya bụ All Progressives Congress
(APC) arụkwaghịm dịka ọ banyere patị ọhụrụ akpọrọ Social Democratic Party (SDP).
Dịka akwụkwọ
ozi El-Rufai wepụtara n’akara Facebook ya siri kwuo, o tinyere akwụkwụọ arụkwaghịm
ahụ n’ụbọchị taa bụ Mọnde 10 Maachị 2025.
El-Rufai bụ otu
onye n’ime ndị mbụ hibere otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị APC, kwuru na ọ bụ ọkọrọtọ
SDP ka ya ga-eji azọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla ya ga-azọ mgbe ọ dị n’ihu.
O kwuru na dịka
onye otu SDP, na ya ga-elekwasị anya ma tinye aka n’ime ka ndị isi ndị otu ndọrọ
ndọrọ ọchịchị ndị ọzọ sonyere ha, ma gbakọta n'okpuru usoro ọchịchị onye kwuo
uche ya iji maa APC aka na ntuliaka na-abịa n’afọ 2027.
Cheta na izuụka
abụọ gara aga, Nasir El-Rufai gwara ụlọ mgbasa ozi Arise tv mgbe ha gbara ya ajụjụ
ọnụ na ọ bụghị eziokwu na ndị omeiwu Sinetị akwadoghị ka ọ bụrụ Mịnịsta, kama ọ
bụ Onyeisiala Bola Tinubu gbanwere obi ịhọpụta ya dịka otu n’ime ndị mịnịsta
ya.
Aka na-achị Rivasị steeti bụ Siminalayi Fubara akpọọla onyeisi ụlọ omeiwu steeti ahụ bụ Martin
Amaewhule na ndị omeiwu ndị ọzọ, nzukọ.
A ga-enwe
nzukọ ahụ n'ụlọọrụ Gọvanọ dị n'ụlọ gọọmentị na Port Harcourt n’ụbọchị taa bụ Mọnde
10 Maachị 2025, dịka ụlọikpe kacha elu na Naịjirịa kpebiri na onyeisi ndị
omeiwu bụ Amaewhule na ndị omeiwu ndị ọzọ bụ ndị otu ọgbakọ omeiwu Rivasị
steeti.
Dịka akwụkwọ
ozi ode akwụkwọ steeti ahụ bụ Tammy Danagogo wepụtara siri kwuo, nzukọ ahụ ga-ahụ
na a haziri esemokwu dị n’etiti ndị omeiwu na aka na-achị steeti ahụ.
O kwuru na
ndị omeiwu na Gọvanọ Fubara ga-akpa maka inweta ụlọ di mma ga-abụ ebe ndị
omeiwu ga na-arụ ọrụ ha; ịkwụ ndị omeiwu ụgwọ niile eji ha ya na igosi usoro
mmefu ego steeti ahụ na ihe ndị ọzọ iche iche.
Cheta na ndị
omeiwu steeti ahụ na Gọvanọ Fubara na-enwe nsogbu kemgbe banyere ọnọdụ ndị
omeiwu a na-ebo ebubo na ha na-erubere onye bụbụ gọvanọ steeti ahụ isi.
Anyị ga-emeri agha ọnụ azụmaahịa mba Kanada na Amerịka - Mark Carney
Ebe foto si, EPA
Nkọwa foto, Mark Carney, onye ga-anụ iyi ọrụ dịka Praịm Mịnịsta mba Kanada
Mark Carney,
onye ga-anụ iyi ọrụ dịka Praịm Mịnịsta mba Kanada ekwela nkwa imeri agha ọnụ azụmaahịa
tarifu nke dị n’etiti mba Kanada na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump.
Mark Carney turu
ugo dịka onye ga-anọchite anya Praịm Mịnịsta Justin Trudeau dịka onyeisi Liberal
Pati nke Kanada.
Dịka onyeisi
otu Liberal Pati bụ pati nọ n’ọchịchị ugbu a, Mark Carney ga-anọchi anya Justin
Trudeau dịka Praịm Mịnịsta mba Kanada mana akụkọ kwuru na ọ bụghị ihe ga-eme ozugbo.
Praịm Mịnịsta
Trudeau kwesịrị ịlọtu n’ọchịchị tupuu Gọvanọ izugbe, onye nnọchi anya gọọmentị
etiti nke onyeisiala Kanada bụ King Charles III, ga-ahụ na Carney ṅụrụ iyi ọrụ.
Akụkọ kwuru
na-enwebeghị oge a ga-eme ihe ndị a, mana Praịm Mịnịsta Trudeau ga-anọ n’ọchịchị
ruo mgbe ya na Gọvanọ izugbe bụ Mary Simon ga-enwe nzukọ.
"Ndị
Amerịka ekwesịghị mmejọ ihe a: n’ịzụ ahịa, dịka ọ na-eme na egwuregwu ‘hockey’,
Kanada ga-emeri," onye bụbu Gọvanọ Bank nke England gwara ndị na-akwado
ya.
O kwere nkwa
itinye ọnụ azụmaahịa bụ tarifu mmegwara na ngwa ahịa si mba Amerịka, ma kwuo na
mba Amerịka kwesịrị ịkwanyere mba Kanada ugwu.
Carney dị afọ
iri ise na itoolu (59), bụ onye arụbeghị ọrụ a họpụtara ahọpụta mbụ, jiri pacetị
iri asatọ na isii (86%) were merie ntuliaka.
A malitela ngagharịiwe na Kenya maka onyinye ego Onyeisiala nyere ụka
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ụfọdụ jiri okwute were gbochie okporoụzọ ndị mmadụ si aga
Ndị uweojii mba
Kenya atụọla ‘tear gas’ iji achụsa ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe bụ ndị chọrọ iweghaara
otu ụlọụka Onyeisiala mba Kenya bụ William Ruto nyere onyinye ego buru ibu.
Onyinye ahụ
Onyeisiala Ruto nyere ụka ahụ akpọrọ Jesus Winner Ministry nọ na Roysambu ruru otu
puku narị na iri ise na ise dọla ($155,000), nke ọtụtụ ndị na-eto eto na Kenya katọrọ
dịka ihe isiike na nnukwu ọnụ ahịa obibi na-akawanye njọ n amba ahụ.
Onyeisiala Ruto
agbachitela onyinye ya ma nyekwa ụlọụka ọzọ dị na Eldoret onyinye yiri ya.
Afọ gara
aga, ndị ọchịchị ụka Katọliki na ụka CMS jụrụ onyinye dị otu ahụ ma kwuo na ọ dị
mkpa ichebe ụka ka a ghara iji ya mee ihe ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Ndị uweojii
anwụchiela ọtụtụ mmadụ maka ime ngagharịiwe ahụ dịka ọtụtụ n’ime ha chọrọ ịmụnye
ọkụ n’ụlọụka ahụ ebe ụfọdụ jiri okwute were gbochie okporoụzọ ndị mmadụ si aga.
Mana ozi si n’aka
ụlọ mgbasa ozi n’obodo ahụ kwuru na ndị ụka ahụ kakwara ụka dịka enyere ha
nchekwa siri ike.
Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nụ oo
Ọ bụ
Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga na-ewetara ụnụ akụkọ ihe na-eme na mba ụwa
niile mana Chinonso Ugorji ga-emechaa sonyere anyị n’oge ehihe.
Dịka ụnụ
na-esonyere anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa, ọfọ anyị bụ na ihe ọ bụla anyị
tinyere aka n’izuụka ọhụrụ a ga-amịta mkpụrụ ọma.
Udo dịrị ụnụ!
NDLEA anwụchiela onye na-ere akụkụ ụgbọala maka ebubo ịtụ mgbere ‘cocaine’
Ebe foto si, NDLEA/Facebook
Ndị ọrụ nke ngalaba ụlọọrụ na-ebu agha megide ịṅụ na ịtụ mgbere ọgwụike na Naịjirịa bụ National
Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) anwụchiela onye na-ere akụkụ ụgbọala na Legọs
steeti bụ Levi Chidiebele Obodoeze.
Dịka ọnụ
na-ekwuru NDLEA bụ Femi Babafemi siri kwuo n’ozi ọ wepụtara n’ụbọchị Sọnde 9
Maachị 2025, ndị ọrụ NDLEA nwụchiri nwaamadị ahụ oge ọ na-agba mbọ ịtụga ọgwụike
‘cocaine’ arụ ya dị kilogram iri asaa na asaa na ụma iri ise (77.50kg) mba
Angola.
Ozi ahụ kwuru na ọ bụ n’ime ‘propeller’ ụgbọala ka Obodoeze
zoro ọgwụike ahụ tupu ndị ọrụ NDLEA enyopuo ya.
Babafemi kọwara na ọ bụ mgbanwerịta ozi dị mkpa n’etiti
NDLEA na ndị ọchịchị Angola mere nnwụchi ahụ ji nwee isi.
Dịka ya bụ ozi siri kwuo, Obodoeze kwetara na aka ya dị n’ịtụ
mgbere ọgwụike ‘cocaine’ dịka ọ na-erekwa akụkụ ụgbọala n’ahịa Ladipo dị na
mpaghara Mushin na Legọs steeti.
O kwuru na onye ọ na-atụgara ọgwụike ahụ na mba Angola mere
ka ọ mata na anwụchiela ya, bụ nke mere ya onwe ya ji agba mbọ ịkwapụ n’ụlọ ya
tupu aka ndị ọrụ NDLEA akpara ya.
DR Kongo ekwela nkwa inye onyinye $5m maka ịgba ama banyere ndị ndu ndịagha nnupụisi
GọọmentịDR Kongo ekwela nkwa inye ndị ga-agba ama
banyere ndị ndu ndịagha nnupụisi nde dọla ise ($5m) maka inyere ha aka ijide mmadụ
atọ ahụ bụ ndị ndụ ndịagha nnupụisi, nke weghaara ọwụwa anyanwụ nke mba ahụ.
Otu n’ime ndị ndu ahụ bụ Corneille Nangaa, bụbu onyeisi ụlọọrụ
na-ahụ maka ntuliaka na DR Kongo bụzi onye na-achị Congo River Alliance nke gụnyere
otu ndịagha nnupụisi M23.
Mmadụ abụọ ndị ọzọ Gọọmentị Kongo na-achọ bụ Sultani Makenga
na Bertrand Bisimwa.
N’afọ gara aga, e kpere mmadụ atọ ahụ ikpe azụ n’ụlọikpe ndịagha
ma makwa ha ikpe ọnwụ n’ihi imegịde gọọmentị.
N’aka nke ọzọ, gọọmentị kwupụtara ihe onyinye nde dọla anọ ($4m)
maka inyere ha aka anwụchị ndị niile na-enyere ndị ndu ndịagha nnupụisi ahụ
aka.
Mana ohere e nwere ijide ha dịkwa ntakịrị.
N'ime izu ndị na-adịbeghị anya, ndịagha enwebeghị ike ime ihe
ndị nnupụisi Rwanda na-akwado na-eme, bụ ndị weghaara ala buru ibu na mpaghara ọwụwa
anyanwụ DR Kongo, gụnyere obodo abụọ kachasị ukwuu na mpaghara ahụ - Goma na
Bukavu.
Mana Onyeisiala DR Kongo bụ Félix Tshisekedi na-agba mbọ ịhụ
na mba ụwa machiri mba Rwanda maka ịkwado
ndịagha nnupụisi ahụ.
N'afọ gara aga, akụkọ sitere n'aka ndị ọkachamara UN kwuru
na ihe ruru ndịagha Rwanda puku anọ (4,000) na ndị otu M23 na-arụkọ ọrụ na DR Kongo.