Gọọmentị Enugwu adọọla ụlọakwụkwọ aka na ntị maka ụgwọ WAEC/NECO akwadoghị

Ebe foto si, Peter Ndubuisi Mbah/X
Mịnịstrị na-ahụ maka mmụta n’Enugwu steeti adọọla ụlọakwụkwọ niile nọ na steeti ahụ aka na ntị maka ịnapụ ndị nne na nna na ụmụakwụkwọ ụgwọ WAEC/NECO akwadoghị.
Ozi si n’aka Kọmishọna na-ahụ maka mmụta na steeti ahụ bụ Ọkankụzi Ndubueze Mbah wepụtara, kwuru na mịnịstrị ahụ enwetala ozi na ọtụtụ ụlọakwụkwọ na-anapụ ụmụakwụkwọ ego buru ibu dịka ụgwọ WAEC na NECO.
O kwuru na ego ole gọọmentị kwadoro maka WAEC n’afọ 2025 bụ puku iri abụọ na asatọ N28,000 ebe ụgwọ NECO bụ puku iri atọ N30,000.
Mbah kwuru na Mịnịstrị ahụ edebala aha ụmụakwụkwọ mmadụ puku anọ 40,000 ebe ọ malitere ideba aha ụmụakwụkwọ ndị ga-ede ule NECO.
Ọ dọrọ ndị isi ụlọakwụkwọ aka na ntị ma kwuo na onye ọbụla a hụrụ na-eme ihe ọjọọ ga-anata ntaramahụhụ.
O gwara ndị nne na nna ka ha ghara ikwe ka ụlọakwụkwọ na-anapụ ha ego ezighị ezi maka ule WAEC na NECO.

Ebe foto si, Enugu State Government
















