Ana m ewesara Putin iwe maka mkparịtaụka nkwụsị ọgụ - Onyeisiala Trump

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Maachị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Trump sị na ‘e weela nkwekọrịta n’ọtụtụ ihe’ ka ọ na-eche nkata ya na Putin n’ekwentị

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na “e weela nkwekọrịta n’ọtụtụ ihe na-ese okwu’ dịka ọ na-eche nkata ya na Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin ga-akpa n’ekwe ntị.

    Trump gwara ndị ntaakụkọ sị “anyị ga-agba mbọ hụ na anyị wetere nkekọrịta udo na ịkwụsị agha, ọ dị m ka anyị a ga-emewu ya”.

    Mana n’okwu Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky n’abalị garaaga ka o boro Putin ebubo sị na ọ ma ụma na-egbu oge ka-agha dị n’etiti ha abụọ dịrị na-aga.

    “Nkwekọrịta a bụ ihe anyị aka-etinye n’ọrụ kemgbe” maka na “ụbochị niile n’oge agha bụ mmadụ na-enwụ n’agha”.

    Mana a ka na-enwe ihe mgbagwoju anya etu nkwekọrịta ịkwụsịtụ agha abalị iri atọ nke gọọmentị Trump na-akwado ga-esi dị ire.

  2. Mmadụ 330 anwụọla dịka mba Izrel malitere ibuso Gaza agha ọzọ - Mịnịstrị ahụike Hamas

    Ụlọ ogbunigwe tụrụ na Gaza

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ụlọ ogbunigwe tụrụ na Gaza

    Ihe ruru mmadụ narị atọ na iri atọ (330) anwụọla dịka mba Izrel malitere ibuso ndị Hamas agha ọzọ na Gaza.

    Dịka Mịnịstrị ahụike ndị Hamas nwe siri kwuo, mba Izrel siri n’elu tụọ ogbunigwe n’abalị na Gaza nke gburu ọtụtụ ndị Palestine.

    Ndịagha Izrel kwuru na ha amalite ịtụ ogbunigwe na Gaza dịka ha na Hamas enwebeghị nkwekọrịta maka ịgbatị ịkwụsi ịkwa mgbọ na Gaza.

    Akụkọ kwuru na nke a bụ mwakpo kachasị na Gaza kemgbe Izrel na Hamas nwere nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ n’abalị iri na itoolu nke ọnwa Jenụwarị 2025.

    Otu onye ọrụ nchekwa Hamas kacha elu na Gaza aha ya bụ Mahmoud Abu Wafah so na ndị e kwuru na ha nwụrụ mgbe Izrel tụrụ ogbunigwe ahụ.

    Ozi si n’ụlọọrụ Praịm Mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu kwuru na Izrel ga-eji ike ndịagha ya were megide Hamas.

    O kwuru na nke a bụ maka ndị Hamas ekweghị ịtọhapụ ndị Izrel eji eji ya na ịjụ atụmatụ Onye nnọchiteanya Onyeisiala mba Amerịka bụ Steve Witkoff na ndị ogbugbo ndị ọzọ maka ịgbatị ịkwụsị ịkwa mgbọ.

    Mana ndị Hamas na-ebo ndị Izrel ebubo na ha mebiri nkwekọrịta nkwụsị agha na Gaza.

    Ozi ahụ kwuru na ọ bụ Praịm Mịnịsta Benjamin Netanyahu na onyeisi ndịagha bụ Katz nyere iwu ka amalite ibuso Hamas agha n’ọtụtụ Tuzde.

  3. Igbo bụ Igbo, ụtụtụ ọma nụ?

    Anyị na-asị ụnụ nọọ dịka ụnụ na-esonyere anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme na mba ụwa niile mana Chinonso Ugorji ga-emechaa sonyere anyị n'oge ehihie.

    Ka ụbọchị taa dịrị anyị niile mma.

    Ndewo nụ!

  4. Ego mkpata MTN ejirila 35.6% rịa elu dịka ha bulichara ụgwọ oku ekwentị na nke data

    Ego mkpata MTN ejirila 35.6% rịa elu dịka ha bulichara ụgwọ oku ekwentị na nke data

    Ebe foto si, MTN/Facebook

    Ego mkpata MTN jiiri pasenti iri atọ na ise na ụma isii (35.6%) rịa elu n’ọnwa Maachị dịka ha bulichara ụgwọ oku ekwentị na nke data n’ọnwa Febụwarị.

    Ozi ngalaba ụlọorụ ahụ dị na Saụt Afrịka wepụtara n’ụbọchị Mọnde 17 Maachị 2025 kwuru na ha tụrụ anya na ego mkpata ha ga-aga n’ihu na-arị elu n’afọ 2025.

    Nke a bịara n’oge ego ụlọọrụ ahụ na-akpatara onwe ya kwa afọ jiiri pasenti iri isii na itoolu (69%) gbatuo ala n’ihi ikike ego naịra gbara ọnyụpa nakwa ihe isiike ha na-agabiga na mba Sụdan n’ihi agha dị na mba ahụ, ka ụlọmgbasaozi Channels kwuru.

    Ka o sinadị, n’agbanyeghị nsogbu nke ikike ego naịra dara mba nakwa agha dị na Sụdan, onyeisi ụlọọrụ MTN bụ Ralph Mupita kwuru na ihe ọma ka dị n’ihu.

  5. Mba Rụwanda akwụsịla mmekọrịta ha na Belgium n’ihi agha dị na DR Kongo

    Mba Rụwanda akwụsịla mmekọrịta ha na Belgium n’ihi agha dị na DR Kongo

    Ebe foto si, AFP

    Mba Rụwanda egbubiela ụdọ mmekọrịta ha na Beljọm ma kwuo na mba hụ “agaala n’ihu na-elelị ha anya mgbe dum” n’agha dị na DR Kongo ugbua.

    Brussels anọrọla na-akpọ oku ka mba ndị Yurop nye Rụwanda ntaramaahụhụ n’ihi nkwado ha na-enye otu M23, bụ ndịagha nnupuisi na-ebu agha na DR Kongo.

    Ndị ọchịchị n’isi obodo Rụwanda bụ Kigali enyela ndị nnọchiteanya mba Beljọm elekere iri anọ na asatọ (48) iji pụọ na mba ahụ.

    Beljọm bụbu mba kuchiri Rụwanda kwuru na ha ga-enye nzaghachi ha gbasara ọnọdụ ahụ ma kọwaa mkpebi ahụ Rụwanda nwere dịka ‘’nke adabaghị adaba”.

    N’agbanyeghị ebubo si n'aka otu mbaụwa bụ UN na mba Amerịka, Rụwanda agọọla agụgọ inye ndị otu M23 nkwado.

    N’ozi ha wepụtara n’ụbọchị Mọnde 17 Maachị 2025, Kigali boro Brussels ebubo ịkpa nkata “ịga n’ihu na-akuchi ha”.

  6. E wepụtala foto izizi Popu Francis kemgbe ọ gara ụlọọgwụ

    E wepụtala foto izizi Popu Francis kemgbe ọ gara ụlọọgwụ

    Ebe foto si, Vatican Press Office

    Nkọwa foto, E wepụtala foto izizi Popu Francis kemgbe ọ gara ụlọọgwụ

    Ụlọọrụ Vatican ewepụtala foto izizi Popu Francis, onyeisi ụka Katọliki n’ụwa niile, kemgbe ọ nọ n'ụlọọgwụ otu ọnwa gara aga.

    Foto Popu Francis ahụ gosiri ebe ọ ọdụ n'oche nkwagharị n'ihu ebe ịchụaja n'ụlọ ekpere dị n’ụlọọgwụ ‘Rome Gemelli Hospital’, ebe ọ nọ na-agbake site na ọrịa oyi baa.

    N'ozi Angelus o dere n’ụbọchị Sọnde 16 Maachị 2025, Popu kwuru na ya gabigara ọnwụnwa; o kelele ndị ezi omume maka ekpere ha, ma kpee ekpere maka udo na "mba ndị agha merụrụ ahụ".

    Ụbọchị Sọnde ahụ bụ nke ise n'usoro Popu anọghị iji aka ya nye ndị mmadụ ngọzi ọ na nye kwa izu.

    Vatican kwuru na mbido izu a na nnyocha ‘X-ray’ gosiri na ọnọdụ ya amalitela ịdị mma, mana na ọ ka chọrọ ọgwụgwọ ụlọọgwụ.

    Akwụkwọ ozi ha wepụtara na Satọde kwuru: “Nna dị nsọ ka chọrọ ọgwụgwọ ahụike ụlọọgwụ nke gụnyere moto na ‘physiotherapy’ nke iku ume,"

    A hụbeghị Popu Francis dị afọ iri asatọ na asatọ n’ezi kemgbe ọ gara ụlọọgwụ na 14 Febụwarị 2025 tupuu ewepụta foto ya nke a.

  7. Mụ na Putin ga-akpa maka 'ala na igwe ọkụ' n'ụbọchị Tuzde - Onyeisiala Trump

    Agha Yukren na Rọshịa
    Nkọwa foto, Agha Yukren na Rọshịa

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin ga-akparịtaụka n’ụbọchị Tuzde 18 Maachị 2025 maka iwete udo n’agha dị na Yukren.

    Onyeisiala Trump kwuru na ya na Onyeisiala Trump ga-akpakwa maka ‘ala na igwe ọkụ’ n’ụbọchị ahụ.

    O kwuru na ya chere na Yukren na Rọshịa amalita ikwu okwu banyere udo ya ikekwa ụfọdụ akụ.

    Maka ịkwụsị agha ahụ, Onyeisiala Trump kwuru: "Ma eleghị anya, anyị nwere ike, ikekwe anyị enweghị ike. Anyị nwere ezigbo ohere".

    Mgbe mba Amerịka na Yukren kparịtaraụka na Saudi Arabịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mgbe mba Amerịka na Yukren kparịtaraụka na Saudi Arabịa

    Cheta na mba Amerịka na-agba mbọ ịhụ na akwụsịrị agha Yukren mana mba Rọshịa enwebeghị ebe ha kwụ siri ike, kama ha na-ewepụta ọnọdụ dị iche iche.

    Ka ọ dị ugbu a, Yukren na Rọshịa na-aga n’ihu na-eji doronu awakpo mba ha dịka mba Yukren kwuru na Rọshịa ka na-achọ ịwakpo mpaghara Sumy nke dị n’ugwu Yukren.

    Sumy dị nso na mpaghara Kursk dị na mba Rọshịa nke ndịagha Rọshịa na-agba mbọ iweghaara.

    Ndị ọchịchị mba abụọ ahụ kwuru na Rọshịa na Yukren ji doronu were wakpoo onwe ha n’abalị.

    Ndịagha ụgbọelu nke mba Yukren kwuru na mba Rọshịa ji doronu otu narị na iri asaa na anọ (174) wakpoo mba ha n’abalị.

    Ebe ndị ọchịchị mba Rọshịa kwuru na ha mebiri doronu iri asaa na abụọ nke ndị mba Yukren tụrụ n’akụrụngwa ọkụ mba ahụ dị na mpaghara Astrakhan, ebe otu onye merụrụ ahụ n’ihi ọkụ ọgbụgba.

  8. Nkwekọrịta udo ọbụla anyị ga-eweta ga-amachi Yukren iso n'otu NATO - Onye Rọshịa

    Yukren

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Yukren

    Ọtụtụ ụlọ obibi ndị mmadụ emebiala n'ogbunigwe mba Rọshịa tụrụ na mpaghara Kostiantynivka dị na Donetsk n'uzu ụka a.

    Osote onye nnọchiteanya mba Rọshịa kwuru na ha na-achọ ka e kwe ha nkwa na otu NATO agaghị etinye mba Yukren. Ọ sịrị na mba Yukren ga-anọrọ onwe ha na-enweghị ndị ha ga-akwado n'oge niile Rọshịa na mba ọbụla were nsogbu.

    Alexander Grushko kwuru na "anyị ga-achọ ka nchekwa gbara ọkpụrụkpụ a na-akpọ "ironclad" soro ná nkwekọrịta udo ahụ".

    N'ime nkwekọrịta ahụ gụnyere" nkwa na Yukren agaghị aba n'otu NATO nakwa nkwa na ha agaghị akwado mba ha na Rọshịa na-enwe nsogbu ".

    Nke a na-eme dịka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwuru na ya na Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin ga-akpa nkata n'ekwenti maka nkwekọrịta udo na ịkwụsị agha Rọshịa na Yukren na-aṅụ kemgbe afọ atọ.

    Yukren

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Yukren

    N'ụbọchị Sonde n'oge Trump na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'odo ndịagha ụgbọelu (Air Force One) ka ọ sịrị "e meela ọtụtụ ihe n'izu ụka. Anyị chọrọ ịhụ na a kwụsịrị agha a.".

    "Anyị ga-akpa ọtụtụ ihe gụnyere ala. Anyi ga-akpa maka odo ọkụ latrik bụ" power plant". N'oge a jụrụ Trump na e were ihe dị icheiche ndị Yukren ga ahụpụ ka udo chịa ka ọ sịrị na "anyị na-akpa etu a ga-esi kee ọtụtụ ihe n'etiti mba Yukren na Rọshịa".

    Cheta na mba US na Yukren ekwetala ka agha kwusitu abalị iri atọ bụ nke Putin kwadoro ma wepụta ọnọdụ mba Rọshia ga-eji kweta ịkwụsịtụ agha n'abalị iri atọ ahụ.

  9. Ụmụ Igbo unu abọọla chi?

    Anyị na-asị unu ụtụtụ ọma ma na-asị unu ndewo maka isonyere anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa.

    Ọ bụ Michael Ilediagu na Uzoamaka Ewuzie ga-ewetere unu akụkọ ihe na-eme na mba ụwa niile mana Chinonso Ugorji ga-ewere ọnọdụ n'ehihie.

    Buru oche gị bịa nso!

  10. Ụgbọala trọọkụ egbuola mmadụ isii n’Anambra steeti

    Ebe ihe mberede okporoụzọ mere

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ebe ihe mberede okporoụzọ mere

    Ihe mberede okporoụzọ ataala isi mmadụ isii na mpaghara Upper Iweka dị n’Ọnicha n’Anambra steeti n’ụbọchị Satọde 15 Maachị 2025.

    N’ozi o mere ka o rute BBC Igbo aka, ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kwuru na ndị uweojii akpachiela ebe ahụ ya bụ ihe mberede mere.

    “Mmadụ isii nwụrụ n’ihe mberede ahụ ebe ụfọdụ ndị ọzọ nwetara ogogo mmerụahụ dị iche iche,” ka ozi ahụ kọwara.

    Ikenga kwuru na ebumnobi ha jiri kpachie ebe ahụ bụ iji hụ na e mere ihe n’usoro ma hụkwa na e mere ezigbo nnyocha gbasara ihe ọdachi ahụ.

    Ndị hụrụ ka ya bụ ihe siri mee kpughere na ọ bụ ụgbọala trọọkụ enweghị ike ịjịkwata onwe ya gara zuo ike n’ahụ ndị ji ụkwụ na-aga, ụgbọala keke abụọ na otu ụgbọala bọọsụ ndị njem juru n’ime ya.

    Ka o sinadị, ọ sịrị na ụfọdụ n’ime ndị ahụ merụrụ ahụ na-anara ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ ugbua ebe ha dọnyere ozu ndị nke nwụrụ anwụ n’ọbaozu.

  11. Trump akwụsịla ndị na-arụ na Voice of America ọrụ

    Trump akwụsịla ndị Voice of America ọrụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump azọpụla njem ịkwụsị ndị ọrụ ụlọmgbasaozi Amerịca bụ Voice of America (VOA) ọrụ tinyekwara ndị niile na-agbakọrọ ha aka agbasa ihe omume gburugburu ụwa.

    Nnukwu onyeisi ụlọmgbasaozi Voice of America bụ Mike Abramowitz kwuru na a manyela ndị ọrụ ha niile ka ha gaa ezumike.

    Ọzọ a bụrụ na a kwụsịla iwepụta ego nkwado maka ụlọorụ ndị na-agbakọrọ ha aka dịka Radio Europe and Asia nakwa Liberty.

    E nwebeghị nkọwa doro anya si n’aka gọọmenti Amerịka iji kọwaa ihe ọnọdụ ahụ pụtara, dịkwa ka ọ na-edobeghị onye ọbụla anya ma a chọrọ ịgbachi ụlọmgbasaozi ahụ n’ozuzuoke.

    Onyeisi otu jikọtara ndị ntaakụkọ n'Amerịka bụ William McCarren kwuru na ya bụ ọnọdụ adịghị mma maka ọrụ mgbasaozi ọkachasị n’oge a na-ebu agha megide akụkọ ụgha.

    Ụlọmgbasaozi Voice of America na-agbasa ozi nye mmadụ karịrị narị nde anọ (400m) gburugburu ụwa ma dịrịkwa ka BBC nke gọọmenti Briten nwe.

  12. Ndị uweojii ejirila anwụrụ ‘teargas’ chọpụ ụmụnwaanyị nọchiri okporoụzọ ka Nyesom Wike ghara ịga n’Abalama

    Mgbe Nyesom Wike bịara Rivas steeti maka otu nnukwu nnabata ndị Kalabari na-eme n’ihi ya

    Ebe foto si, Nyesom Wike/Facebook

    Nkọwa foto, Mgbe Nyesom Wike bịara Rivas steeti maka otu nnukwu nnabata ndị Kalabari na-eme n’ihi ya

    Ndị uweojii ejirila anwụrụ ‘teargas’ chọpụ ụmụnwaanyị nọchiri okporoụzọ ka aka chịburu Rivas steeti bụ Nyesom Wike ghara ịga n’Abalama, bụ obodo dị n’okporo ọchịchị Asari-Toru dị na Rivas steeti.

    Akụkụ kwuru na ụmụnwaanyị ndị ahụ na-eme ngagharịiwe, yii akwa ojii ma keekwa akwa ọcha gburugburu isi ha, gbochiri ụzọ mgbe Nyesom Wike bụ mịnịsta na-ahụ maka isi obodo Naịjirịa, bịara steeti ahụ maka otu nnukwu nnabata ndị Kalabari na-eme n’ihi ya otu ụlọ akwụkwọ bụ ‘Community Secondary School’ dị n’Abalama.

    Mgbe Nyesom Wike bịara Rivas steeti maka otu nnukwu nnabata ndị Kalabari na-eme n’ihi ya

    Ebe foto si, Nyesom Wike /Facebook

    Nkọwa foto, Mgbe Nyesom Wike bịara Rivas steeti maka otu nnukwu nnabata ndị Kalabari na-eme n’ihi ya

    E kwuru na ụmụnwaanyị ndị ahụ na-eme ngagharịiwe maka otu a sị Wike siri kparịa ndị Ijaw oge a gbara ya ajụjụ ọnụ n’Abụja n’ụbọchị Wenezde 12 Maachị 2025.

    Nke a na-emekwa dịka Wike bụ aka chịburu steeti ahụ na onye nọchiri ya bụ Gọvanọ Siminalayi Fubar na-enwe nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ugbu a.

  13. Ọkụ agbagbuola mmadụ 51 n'ụlọ oriri na ọṅụṅụ dị na North Macedonia

    Ọkụ agbagbuola mmadụ 51 n'ụlọ oriri na ọṅụṅụ dị na North Macedonia

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ọkụ agbagbuola mmadụ 51 n'ụlọ oriri na ọṅụṅụ dị na North Macedonia

    Dịka ndị ọchịchị siri kwuo, ọkụ agbagbuola ihe ruru mmadụ iri ise na otu (51) n'ụlọ oriri na ọṅụṅụ dị na mba North Macedonia.

    Ọkụ ahụ malitere ihe dịka elekere atọ na ụlọ oriri na ọṅụṅụ ‘the Pulse club’ dị na Kocani, obodo dị n’ihe dịka 100 kilomita (60 maịl) n'akụkụ ọwụwa anyanwụ nke isi obodo, Skopje.

    Ihe onyonyo e tinyere na soshịa midia gosiri etu ụlọ ahụ siri nwere gbaa ọkụ.

    E kwuru na ihe ruru otu puku na narị ise mmadụ (1,500) gara ịhụ ihe nkiri otu ADN, otu a mara n’egwu ‘hip-hop’ na-egos na mba ahụ.

    Ụlọọrụ mgbasa ozi nọ n’obodo ahụ kwuru na o nwere ike ịbụ n’ihe kpatara ọkụ sitere na iji ngwaọrụ ‘pyrotechnic’, dịka ihe nkiri na-egosi ọkụ sitere n'ogbo ebe a na-eti egwu ahụ were lagoro n'elu ụlọ tupu ọ gbasaa ngwa ngwa.

    E kwuru na ihe ruru otu puku na narị ise mmadụ (1,500) gara ịhụ ihe nkiri

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, E kwuru na ihe ruru otu puku na narị ise mmadụ (1,500) gara ịhụ ihe nkiri

    Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa bụ Pance Toskovski kwuru na-ejidela ndị mmadụ maka ihi ọkọ ọgbụgba ahụ.

    Praịm Mịnịsta bụ Hristijan Mickoski kwupụtara n’ozi o dere na Facebook na gọọmentị ga-eme ihe ọbụla dị mkpa iji mezie ihe niile ọkụ ahụ mebiri ma gbaa mbọ iji chọpụta ihe kpatara ihe mberede ahụ.

    Praịm Mịnịsta Mickoski kpọrọ ya "ụbọchị nwute" na mba ahụ n’ihi ọnwụ "ọtụtụ ndụ ndị na-eto eto".

  14. Amerịka esila n'elu wakpoo ndịagha nnupụisi Houthi dị na Yemen

    Amerịka esila n'elu wakpoo ndịagha nnupụisi Houthi dị na Yemen
    Nkọwa foto, Amerịka esila n'elu wakpoo ndịagha nnupụisi Houthi dị na Yemen

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na mba Amerịka esila n'elu wakpoo ndịagha nnupụisi Houthis nke Yemen, ma kwuo na mwakpo ahụ bụ maka etu ndịagha nnupụisi ahụ siri wakpoo ụgbọmmiri na oke osimiri a maama dịka ‘Red Sea’.

    Onyeisiala Trump kwuru na akara soshịa midia ya ‘Truth social’ na ndịagha nnupụisi ahụ mba Iran na-akwado tụrụ ogbunigwe n’ụgbọelụ mba Amerịka iji gbuo ndịagha mba Amerịka.

    O kwuru na ndịgha nnupụisi ahụ na-awakpo ụgbọmmiri, na-eme ihe ike, na iyi ọha egwu nke napụrụ ndị mmadụ ọtụtụ ijeri dọla ma tinye ndị mmadụ n'ihe ize ndụ.

    Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike nke Houthi na-ahụ maka ya kwuru na ihe ruru mmadụ iri atọ na otu (31) anwụọla ebe mmadụ otu narị na otu ndị ọzọ (101) merụrụ ahụ mgbe mba Amerịka wakporo ha.

    Ndị otu ahụ nke malitere ịwakpo ụgbọmmiri n’ihi agha dị n’etiti mba Izrel na Hamas na Gaza, kwuru na ndịagha ya ga-azaghachi mwakpo mba Amerịka ahụ.

    Ndị Houthis kwuru na e nwere ọtụtụ mgbawa na mgbede Satọde 15 Maachị 2025 na Sanaa na mpaghara ugwu Saada - ebe ndị nnupụisi ahụ siri ike na okeala Saudi Arabia.

    Otu nnupụisi ahụ nke mba Iran na-akwado, nke na-ahụta mba Izrel dịka ndị iro ya, na-achịkwa Sanaa na ugwu ọdịda anyanwụ nke Yemen, mana ọchịchị ahụ abụghị ọchịchị mba ụwa nabatara.

    Ihe onyonyo enyochabeghị na-egosi nnukwu anwụrụ ọkụ ojii n'akụkụ ọdụ ụgbọelu Sanaa - nke gụnyere ebe ndịagha nwe.

    N’ozi ha wepụtara, ndị Houthis tara mba Amerịka na mba UK ụta maka “ajọ mwakpo ahụ” e zubere ebe obibi mmadụ n’isi obodo Yemen, Sanaa.

    Mba UK etinyeghị aka na mwakpo ahụ mba Amerịka mere n’abalị Satọde megide ndị Houthi mana o nyere mba Amerịka nkwado mmanụ ụgbọala ọ na-enye ya oge niile.

  15. Mmadụ 34 anwụọla dịka oke ifufe ọjọọ ‘tornadoes’ na-efe na mba Amerịka

    Oke ifufe ọjọọ ‘tornadoes’ na-efe na mba Amerịka
    Nkọwa foto, Oke ifufe ọjọọ ‘tornadoes’ na-efe na mba Amerịka

    Ihe ruru mmadụ iri atọ na anọ (34) anwụọla na ndịdị mba Amerịka dịka oke ifufe ọjọọ ‘tornadoes’ na-efe na steeti ndị dị na ndịdị mba Amerịka.

    Ifufe ọjọọ a nke gburu mmadụ ruru iri na abụọ (12) n’otu steeti a na-akpọ Missouri, buru ụgbọala ma kwadaa ọtụtụ ụlọ ebe obibi.

    Na Kansas, ihe ruru mmadụ asatọ nwụrụ dịka ụgbọala ruru iri ise na ise nwechara ihe mberede n'ihi oke uzuzu.

    Dịka teknụzụ na-ahụ mgbe ọkụ eletrik nkwụsịrị bụ ‘tracker PowerOutage’ siri kwuo, ihe karịrị ụlọ puku narị abụọ na iri ise (250,000) enweghị ọkụ eletrik na steeti asaa nke gụnyere Michigan, Missouri na Illinois n’abalị bọọrọ ụbọchị Sọnde.

    A na-atụ anya na ihu igwe agaghị adị mma na mpaghara ahụ, dịka a malitere iche nche maka ifufe ọjọọ n’ọwụwa anyanwụ Louisiana, ọdịda anyanwụ Georgia, etiti Tennessee na ọdịda anyanwụ Florida Panhandle.

    Gọvanọ Tate Reeves kwuru na mmadụ isii nwụrụ na Mississippi dịka e nwere oke ifufe ọjọọ fere na steeti ahụ.

    Ajọ ifufe 'tornadoes' buru ụgbọala ma kwadaa ọtụtụ ụlọ ebe obibi

    Ebe foto si, Missouri State Trooper

    Nkọwa foto, Ajọ ifufe 'tornadoes' buru ụgbọala ma kwadaa ọtụtụ ụlọ ebe obibi

    E nyela ịdọ aka na ntị maka ideimmiri nwere ike ime n’etiti Mississippi, n'ebe ọwụwa anyanwụ Louisiana na ọdịda anyanwụ Tennessee; yana akụkụ nke Alabama na Arkansas, dịka ajọ ihu igwe na-aga n'ihu n'ofe ndịda-ọwụwa anyanwụ.

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ihu igwe bụ National Weather Service (NWS) kwuru na ideimmiri nwere ike igbu mmadụ.

  16. Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi.

    Anyị na-asị ụnụ nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie ga-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme na mba ụwa niile mana Chinonso Ugorji ga-emechaa sonyere anyị n'oge ehihie.

    Ndewo nụ!

  17. Ndị uweojii Abia Steeti sị ha gburu ndị ntọ mmadụ isii ma zọpụta ndị ha tọọrọ

    Egbe na mgbọ e nwetere n'aka ndị a.

    Ebe foto si, Abia State Police Command

    Ndị uweojii Abia ekwuola na ha zọpụtara mmadụ anọ ndị ntọrị tọọrọ ma gbuo ndị ntọ mmadụ isii n’okporoụzọ New Umuahia dị n’Obingwa.

    N’ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Maureen Chinaka wepụtara kwuru na ndị ntọrị ahụ tọọrọ mmadụ anọ ahụ nọ n’ụgbọala na-eme njem n’okporoụzọ New Umuahia mgbe ndị ntọrị ahụ wakporo ma tọọrọ ha n’ihe dịke elekere itoolu nke ụtụtụ ụbọchị 9 Maachị, 2025.

    O kwuru na ngwa ngwa ha nwetere ozi banyere nke a, na ndị uweojii wuchiri n’ogige ndị ntọrị ahụ dị n’obodo Osokwa nke okpuruọchịchị Osisioma n’ụbọchị Satọde 14 Maachị, 2025.

    O kwuru na mgbe ha ruru n’otu ụlọ ebe e ji mmadụ anọ a kamgbe ụbọchị anọ, na ndị ntọrị ahụ malitere ịkwa ndị uweojii mgbọ mana ndị uweojii zaghachịrị ha n’ịkwa mgbọ ahụ.

    Egbe na mgbọ e nwetere n'aka ndị a.

    Ebe foto si, Abia State Police Command

    Chinaka kwuru na dịka ịkwa mgbọ ahụ na-aga n’ihu na ndị uweojii gbagburu mmadụ ise n’ime ndị ntọrị ahụ ma zọpụta mmadụ anọ ndị ha tọọrọ.

    O kwuru na ụfọdụ ndị ntọrị ahụ bucha mgbọ egbe a gbara ha rie mbọmbọ ọsọ mana ndị uweojii ka na-esi imi n’ala ịchọta ma nwuchie ha.

    Ọ gara n’ihu kwuo ma ha kpachiri mgbe AK47 anọ na ọtụtụ mgbọ egbe n’ogige ndị ntọrị ahụ.

    Dịka ọ dị ugbua, ọ sị na e burula ndị ha zọpụtara gawa n’ụlọọgwụ maka ịnata ọgwụgwọ.

  18. Onweghi ogbugbu ọbụla a na-egbusi ndị okpukperechi Kraịst - Gọọmenti Naịjirịa

    Onyeisiala Bola Tinubu

    Ebe foto si, Presidency/X

    Gọọmentị Naịjirịa agọnarịla otu akụkọ ha sị bụ “akụkọ ụgha” nke kwuru na a ma ụma na-egbusi ndị okpukperechi Kraịst na mba.

    Ozi Ministri na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ wepụtara akwughi kpọmkwem ndị wepụtara akụkọ ahụ, mana o kwuru na e mere nke a iji gbanwee etu mbaụwa si ahụta Naịjirịa.

    “Ọ bụ ihe mwute na a an-eme nke a iji gbanwee echiche mbaụwa n’ebe Naịjirịa nọ, ọkachasị mba Amerịka, ka ha kpọpụta dịka mba nwere nsogbu.” Ka o kwuru.

    “Ọ dị mma ka a mata na nsogbu dị na mpaghara Ugwu nke Naịjirịa ebe ndị okpukperechi Alakụba kachasị ukwuu abụghị nwakpo nke ndị na-eso okpukperechi butere.

    “Akụkọ ọbụla na-ebulite atụmatụ dị etu a bụ asị.”

  19. Ahịrị ụgbọala Onyeisiala Kenya akụgbuola nwaafọ Briten

    Ahịrị ụgbọala Onyeisiala Kenya akụgbuola nwaafọ Briten

    Ebe foto si, AFP

    Otu n’ime ahịrị ụgbọala onyeisiala mba Kenya bụ William Ruto akụgbuola nwaafọ Briten ma rie mbọmbọ.

    Nwoke ahụ dị afọ iri asaa na itoolu (79) a matara aha ya dịka Edgar Riches nwụrụ n’ụbọchị Tọzde 13 Maachị 2025 oge e ji ụgbọala kutuo ya n’isi obodo Kenya bụ Naịrobi.

    Ndị uweojii jichiri onye ọkwọụgbọala ahụ mana e mechara tọhapụ ya na beelụ.

    E kwuru na ọ na-akwọ otu n’ime ahịrị ụgbọala ndị so Onyeisiala Ruto na-azụ oge ọ na-eme njem.

    Dịka ndị uweojii siri kwuo, ụgbọala nke bu onyeisiala na ndị ọrụ ya agbafeela tupu ya bụ ihe mberede emee.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Michael Muchiri gwara BBC na Maazị Riches bụ onye na-abịakarị Kenya ileta nwanne ya nwaanyị na nwa ya nwoke bi na mba ahụ.

    Nnyocha e mere ozu nwoke ahụ gosiri na o nwetara ọtụtụ mmerụahụ n’obi nakwa n’isi ya.

    Ọ bụụrụ onye ọrụ obi ebere si Poole dị na Dorset, onye na-akpakọta ego maka atụmatụ ọrụ dị iche iche na Kenya.

  20. Amerịka ekwuola na ha achọghị ịhụ onye nnọchiteanya Saụt Afrịka na mba ha ọzọ

    Ebrahim Rasool

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba Amerịka na-akwado ịchụpụ onye nnọchiteanya Saụt Afrịka na Washington bụ Ebrahim Rasool, dịka odeakwụkwọ Amerịka bụ Marco Rubio kwuru sị “anyị achọghị iji anya ahụ gị ọzọ na mba ukwu anyị”.

    N’ozi o bipụtara n’akara ọbaozi X ya, Rubio boro Rasool ebubo inwe mkpọrọmaasị n’ebe Amerịka na onyeisiala ha bụ Donald Trump nọ ma kọwaa ya dịka “onye na-egwu ndọrọndọrọ ọchịchị na-akpa oke agbụrụ”.

    Mkpebi ahụ bụ nke kwesịrị “nchegharị”, ka ụlọọrụ Onyeisiala Saụt Afrịka kwuru n’ụbọchị Satọde 15 Maachị 2025.

    Ọ gbakwunyere na ha ka dị njikere iwulite mmekọrịta ga-abara onye niile uru n’etiti ha na Amerịka.

    Mkpebi ahụ siri ike bụ nke na-egosipụta ọnọdụ ọhụrụ n’esemokwu dị n’etiti mba abụọ ahụ.