Ana m ewesara Putin iwe maka mkparịtaụka nkwụsị ọgụ - Onyeisiala Trump

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Maachị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. E gbuola nwaagbọghọ dị afọ 18 oge ndị uweojii na ọkwọụgbọala na-azọ ụgbọala n’Imo steeti

    E gbuola nwaagbọghọ gbara afọ 18 oge ndị uweojii na ọkwọụgbọala na-azọ ụgbọala n’Imo steeti

    Ebe foto si, Oduoma family

    Kọmịshọna ndị uweojii n’Imo steeti bụ Aboki Danjuma enyela iwu ka e mee nnyocha chọpụta ihe butere ọnwụ Kasarachi Oduoma.

    Ụgbọala kwọpịara nwaagbọghọ ahụ gbara afọ iri na asatọ (18) n’Umuelemai dị n’okpuru ọchịchị Isiala Mbano n’ụbọchị Tọzde 27 Maachị 2025.

    A sị ihe ọdachi ahụ mere oge ndị uweojii abụọ na onye ọkwọụgbọala na-azọ ụgbọala Toyota Camry na-acha ọbara ọbara.

    Ka ihe ọdachi ahụ mere, onye ọkwọụgbọala riri mbọmbọ ebe ha bụ ndị uweojii buuru ụgbọala ahụ gaa n’ụlọorụ ha dị n’Umuelemai, n’okpuru ọchịchị Isiala Mbano.

    Akụkọ kwuru na ka ọ dị ugbua, Aboki Danjuma enyela iwu ka ndị ọrụ ya na-ahụ maka igbu mmadụ na ngalaba na-ahụ maka ndị omekome bụ CID mee ezigbo nnyocha gbasara okwu ahụ.

  2. Mmadụ abụọ anwụọla, 12 emerụọ ahụ n’ihi gaasị tiwara n’ụlọorụ dị n’Aba

    Mmadụ abụọ anwụọla, 12 emerụọ ahụ n’ihi gaasị tiwara n’ụlọorụ dị n’Aba

    Ebe foto si, Pastor Dike Nwankwo

    E kwupụtala mmadụ abụọ dịka ndị nwụrụ anwụ oge gaasị tiwara n’ụlọọrụ ndị Chaịna dị n’Aba bụ Inner Galaxy Steel.

    Ozi anyị nwetara kwuru na mmadụ iri na abụọ (12) ndị gara ịzụ gaasị n’ụlọọrụ ahụ nwetara ogogo mmerụahụ dị iche iche dịka e bugara ha n’otu ụlọọgwụ a kpọghị aha dị na Pọtakọt.

    Oge a gbara ya ajụjụ ọnụ pụrụiche, Onyeisioche okpuruọchịchị Ukwa West bụ Pastor Dike Nwankwo kwuru na mmadụ abụọ nwụrụ n’ihe mberede ahụ ebe iri ndị nke ọzọ merụrụ ahụ.

    Ọ sịrị na n’ime mmadụ iri na-abụọ ahụ ya bụ ihe ọdachi metụtara, iri na otu bụ ndị gara ịzụ ahịa ebe otu onye na-arụ n’ụlọọrụ ahụ.

    Nwankwo kọwara na site n’ihe onyonyoo CCTV ha nwetara, ihe mberede ahụ mere n’ihi otu onye ahịa ji igbe gaasị ya na-egwuri egwu.

    Ọ gara n’ihu kọwaa na e mechiela mpaghara ụlọorụ ahụ ya bụ ọnọdụ metụtara dịka a na-eche mpụtara nnyocha a na-eme maka ya.

    Ụfọdụ mmadụ ndị a gbara ajụjụ na-achọghị ka a kpọọ aha ha rịọrọ aka na-achị Abịa steeti bụ Alex Otti ka o nye ndịisi ụlọọrụ Inner Galaxy iwu ka ha were ọdịmma ndị ọrụ ha kpọrọ ihe dị mkpa.

    Ha kpọkwara oku ka gọọmenti hibe otu ga-enyocha ụlọọrụ ahụ na ihe ndị ha na-eme n’ihi aha ọjọọ ha na-ebutere Abịa steeti.

    Anyị ghọtara na ọnọdụ a na-abịa dịka ọ gachara ọnwa ole na ole otu nwaagbọghọ na-arụ n’ụlọorụ ahụ nwụrụ oge a sị otu n’ime ndịisi ha kwapụrụ ya n’elu ka ọ jụrụ ịnabata ka ha mee ọyị.

    Mmadụ abụọ anwụọla, 12 emerụọ ahụ n’ihi gaasị tiwara n’ụlọorụ dị n’Aba

    Ebe foto si, Pastor Dike Nwankwo

  3. Onyeisiala Zimbabwe ahọpụtala onyeisi ndịagha ọhụrụ

    Onyeisiala Zimbabwe ahọpụtala onyeisi ndịagha ọhụrụ

    Ebe foto si, AFP

    Onyeisiala Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa ahọpụtala onyeisi ndịagha ọhụrụ dịka ndịagha lara ezumike na mba ahụ na-eme atụmatụ ịhazi ngagharịiwe n’ụbọchị Mọnde iji kpọọ oku ka ọ gbaa arụkwaghịm.

    Onyeisi ndịagha ọhụrụ ahụ bụ Emmanuel Matutu ga-amalite ọrụ ozugbo.

    Ndị na-akwado Mnangagwa n’oge gara aga akpọọla oku ka ọ rịtuo n’okwa n’ihi ebubo nrụrụaka na amaghị achị.

    Na mmalite izu a ka Mnangagwa gwara onyeisi ndịagha ya bụ Lt Gen Anselem Sanyatwe ka ọ laa ezumike n’oge na-erughị eru ma họpụta ya dịka minista na-ahụ maka egwuruegwu, nka na omenala.

  4. Nnukwu ala ọma jijiji akpaala mkpa mkpa na Myanmar ma mebie ọtụtụ ụlọ

    Ụlọ ọhụrụ ala ọma jijiji ahụ mebiri

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ụlọ ọhụrụ ala ọma jijiji ahụ mebiri

    Ụlọọrụ Geological Survey mba Amerịka ekwuola na nnukwu ala ọma jijiji mere na Myanmar.

    Ha mere ka a mata na ala ọma jijiji ahụ bụ mpaghara Sagaing ka ọ kachasị metụta.

    Ka ọ dị ugbua, a na-achọ ndị ọrụ 43 achọ dịka ụlọ ha na-arụ ọrụ na ya dị na Bangkok dara site na ala ọma jijiji ahụ.

    Akụkọ na-ekwu na ala ọma jijiji a metụtara ụzọ e si abanye isi obodo Myanmar bụ Naypyidaw ma metụta mba Thailand nakwa ndịda ọdịda anyanwụ mba Chaịna.

    Myanmar na-enwe nsogbu ndọrọndọrọ kemgbe ndịagha junta nwere ọchịchị n'ike n'afọ 2021

    Okporoụzọ ala ọma jijiji ahụ metụtara

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Okporoụzọ ala ọma jijiji ahụ metụtara
    Okporoụzọ ala ọma jijiji ahụ metụtara

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Okporoụzọ ala ọma jijiji ahụ metụtara
  5. Putin akpọọla oku ka e nwee gọọmenti nchere oge na mba Yukren

    Vladimir Putin

    Ebe foto si, EPA

    Nkọwa foto, Vladimir Putin

    Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin ekwuola ka e wepụ Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky n’ọkwa ma tinye gọọmenti nchere oge.

    Putin kwukwara na atụmatụ ya wepụtara bụ ihe otu jịkọrọ mba ụwa bụ United Nation (UN) ga-ahazị ma kwadoo.

    Putin na-ekwu nke a n’ihe dịka awa ole ma ole ka gọọment mba dị icheiche na Yurop kwupụtara na ha na-akwado nchekwa mba Yukren.

    Putin sị na ọ bụ gọọmenti nchere oge ahụ nke UN ga ahụ maka ya bụ ihe ga-enye ohere maka ịkpa nkata banyere udo maka agha Rọshịa na Yukren.

    Ọ sị na ọ bụ UN ga-elebanye anya n’ihe gọọmenti ọhụrụ ahụ ga na-eme ruo n’oge mba Yukren ga-eme ntuliaka wepụta ‘gọọment maara ihe ha na-eme”.

  6. Onyeisiala Rọshịa akwadola atụmatụ Donald Trump inwere Greenland

    Onyeisiala Rọshịa akwadola atụmatụ Donald Trump inwere Greenland

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Rọshịa akwadola atụmatụ Donald Trump inwere Greenland

    Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin ekwuola na ọ ga-akwado atụmatụ ọbụla ga-ewulite ọnọdụ Rọshịa na mpaghara Arctic ma dọọ aka na ntị na e nweela ọtụtụ ihe chọrọ imegide nke a.

    Otu n’ime ya bụ atụmatụ Onyeisiala Donald Trump na-achị Amerịka inwere Greenland.

    Ozi si n’obi ọchịchị mba Rọshịa kwuru na Onyeisiala Putin akatọghị maọbụ kagbuo atụmatụ Onyeisiala Trump.

    Nke a na-abịa dịka mba Amerịka na Rọshịa na-agba mbo iji wulite mmeko dị n’etiti ha abụọ.

  7. Igbo bụ Igbo, ụtụtụ ọma nụ oo

    Anyị na-asị gị nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 28 Maachị 2025.

    Sonyere anyị dịka Michael Ngene na Michael Ilediagu na-ewetara gị akụkọ ihe na-eme n'ala Igbo, Naịjirịa nakwa mba ụwa niile.

    Ndewo.

  8. E jidela osote Onyeisiala mba Saụt Sudan bụ Riek Machar n’ụlọ ya, machie ya ịpụ ilo

    Riek Machar

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Riek Machar

    E jidela Osote Onyeisiala nke mbụ na mba Saụt Sudan bụ Riek Machar n’ụlọ ya ma machie ya ị ga ebe ọbụla.

    Ndị otu Patị nke Riek Machar mere ka a mata nke a ma kwuo na ndịagha banyere n’ụlọ Machar dị n’isi mba ahụ bụ Juba, napụ ndị ọrụ nchekwa na-eso Riek Machar egbe ha ma were ọnọdụ n’ụlọ ya.

    Patị ahụ aha ha bụ Sudan People's Liberation Movement mere ka a mata nke a ma kwuo na “ndịagha ahụ gbara mbọ ka ha kpụrụ Riek Machar pụọ”.

    N'aka nke ọzọ, otu jịkọrọ mba ụwa bụ United Nation na-adọ aka na ntị banyere ihe na-eme na mba Saụt Sudan.

    UN kwuru na ihe na-eme ugbua n'etiti Riek Machar na Onyeisiala mba ahụ nwereike ime ka agha ọzọ bido.

    Cheta na Onyeisiala mba Saụt Sudan na Osote ya bụ Riek Machar were nkwekọrịta udo n’ọnwa Ọgụst 2018 ka agha kwụsị. Agha ahụ tara isi mmadụ ruru 400,000.

    Mana kemgbe afọ asaa garaaga, ọgbaaghara dị n’etiti agbụrụ dị icheiche na mba ahụ na-akawanye njọ.

    Etu ọnọdụ si dị ugbua, mba Amerịka na nke Briten wedatara ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ nnọchịtaanya ha ma gwa ọtụtụ n’ime ha si na mba ahụ pụọ, ebe mba Jamini na Nọrway mechiri ụlọ nnọchịtaanya ha na Juba isi obodo Saụt Sudan.

  9. Lee ihe ọkụ na-agba na Saụt Korịa megoro kemgbe Maachị 21 o bidoro

    Ebe ọkụ na-agba na Saụt Korịa

    Ebe foto si, EPA

    Nkọwa foto, Ebe ọkụ na-agba na Saụt Korịa

    Kemgbe ọkụ bidoro ịgba na ndịda-ọwụwa anyanwụ na mba Saụt Korịa ọtụtụ mmadụ anwụọla, ndị ọzọ meruru ahụ ebe igwe mmadụ gbara ọsọ ndụ ha si na ụlọ ha gbapụ gbalaga ebe ha na-ezere ndụ.

    Kemgbe ọkụ ahụ bidoro, lee ihe megoro:

    • Ọkụ ahụ egbuola mmadụ 26, mmadụ karịrị puku abụọ esila n’ụlọ ha pụọ gbalaga ebe ha na-ezere ndụ.
    • Ọkụ ahụ na-agba na gburugburu dị ụbara ma bụrụ ọkụ ọgbụgba kacha ibe ya kembe Saụt Korịa bidoro dịka otu mba.
    • Ndị ọchịchị na-ekwu na ihe mere ọkụ ji akawanye njọ bụ maka na nnukwu ukuku na-eku ebe ahụ. Ihe ọzọ bụ na ala kpọrọ nkụ ma taa mmiri.
    • Ndị ọrụ gbatagbata na-agba mbọ ka ha zọta ihe ọkọrọtọ njiri mara mba ahụ dị n'ebe ọkụ na-agba. Ihe ndị ahụ gunyere ụlọ ekpere gbagoro afọ A 1,300 dị n’Uiseong bụ nke ọkụ gbagoro. Ha na-azọkwa ihe ndị ọzị dị na mpaghara ahụ.

    A na-ekwu na ọtụtụ ndị nwụrụ n’ọkụ ọgbụgba ahụ bụ ndị dị n’etiti afọ 60 ruo afọ 70 bụ ndị ọnọdụ ahụ ribidoro.

  10. Ụmụ Igbo unu abọọla chi?

    Anyị na-ekele unu maka i sonyere anyị taa ma sị ka ahịa na ọrụ aka unu wetere unu ngọzị.

    Ọ bụ Michael Ilediagu ga-ewetere unu akụkọ ihe na-eme n'ala Igbo, Naịjirịa nakwa mba ụwa niile n'ụtụtụ a mana Ikechukwu Kalu ga-esonyere ya n'oge ehihie.

    Daalụ!

  11. Ụgbọala Tipa akụgbuola otu nwata akwụkwọ n'Amaekpu Ohafia

    Ụgbọala Tipa kugburu nwata akwụkwọ

    Ụgbọala Tipa akụgbuola otu nwata akwụkwọ na onye ọgbatumtum n’Amaekpu Ohafia

    Otu nwata akwụkwọ nọ na-aga n’ụlọakwụkwọ anwụọla dịka ụgbọala tipa si n’azụ kụọ ọgbatumtum bu ya n’okporoụzọ Amaekpu Ohafia nke Abia Steeti.

    N’otu aka ahụ, onye ọgbatumtum bu nwata akwụkwọ ahụ nwụkwara n’ihe mberede ahụ.

    Odobeghi anya ihe butere mberede okporoụzọ a, maọbụ na ụgbọala tipa ahụ na-agba nnukwu ọsọ ka ọ bụ na ụgbọala ya jụrụ ịkwụsị.

    Mana ndị hụrụ ka ihe a si mee kwuru na ụgbọala tipa ahụ si n’azụ kụọ mmadụ abụọ dịka ọ na-agbasi ọsọ ike.

    Ha kwara arịrị maka etu ụfọdụ ndị ọkwọ ụgbọala si agba ọnwụ ọnwụ n’okporoụzọ ha ma rịọ ka ndị ọ dị n’aka lebara ya anya.

    Onyeisi ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ nke Abia Steeti bụ Ngozi Ezeoma, mgbe a kpọtụụrụ ya kwuru na ọ ga-eme nnyocha banyere ya.

  12. Atụmatụ iwu iwepụ mkpuchi 'imunity' nke osote onyeisiala na ndị gọvanọ agafeela ngụpụta nke abụọ

    Ndị ụlọomeiwu nta

    Ebe foto si, House of Reps/Facebook

    Atụmatụ iwu iri anọ na abụọ gafere ngụpụta nke ugboro abụọ n’ụlọmeiwu nta n’ụbọchị Wenezde 26 Maachị, 2025.

    Otu n’ime ha bụ atụmatụ iwu kwuru ka e wepụ ikiki na-echekwa osote onyeisiala, ndị gọvanọ na osote ha iji belata mpụ, arụ nakwa nrụrụaka ndị ji ọkwa a na-eme.

    Nke a na-esote iwu iri atọ na itoolu nke gafere ngụpụta nke ugboro abụọ n’ụlọomeiwu nta n’ụbọchị Tuzde.

    Ụfọdụ iwu ndị a kwuru ga-akpatụ iwu na-ekpuchi onyeisiala Naịjirịa aka ma wepụ mkpuchi nke e nyere osote onyeisiala, ndị gọvanọ na osote ha iji belata mpụ na nrụrụaka ego ma wulite nkụwa aka ọtọ n’ọkwa ọhanaeze.

    Ọzọ bụkwa atụmatụ iwu sị ka e keewa ụlọọrụ ọkaiwu ukwu gọọmentị etiti, ụlọọrụ ọkaiwu gọọmentị steeti site n’ụlọọrụ Ọkaikpe ukwu nke gọọmentị etiti na Kọmishọna ikpe nke Steeti.

    Atụmatụ iwu ndị a agafeghi nrụrịtaụka, nke mere atụmatụ iwu iri asatọ na otu gaferela ngụpụta nke ugboro abụọ n’ụlọomeiwu nta.

  13. Ọtụtụ narị mmadụ sonyere ngagharịiwe megide ọchịchị Hamas na Gaza

    Ngagharịiwe megide ọchịchị Hamas na Gaza

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Ngagharịiwe megide ọchịchị Hamas na Gaza

    Ọtụtụ narị mmadụ sonyere ngagharịiwe emere megide ọchịchị Hamas na Gaza. Nke a bụ ngagharịiwe kachasị ukwuu na Gaza kemgbe agha Hamas na Izrel malitere dịka ndị mmadụ na-achọ ka Hamas pụọ n’ọchịchị.

    Ndịagha nnupụisi kpuchiri ihu ha ma jiri egbe, jikwa ike na-achụpụ ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe, ha busoro ọtụtụ n’ime ha agha.

    Ihe onyonyo onye na-akwado mgbanwe ziri ezi n’ọchịchị kesara na soshịa midia gosiri etu ụmụntorobịa si na-eme ngagharịiwe n’okpuru ụzọ Beit Lahia dị na mpaghara ugwu Gaza n’ụbọchị Tuzde, ma na-ekwu Hamas pụọ, pụọ.

    Ndị Hamas ekwubeghị ihe ọbụla banyere nke a, mana ozi ha wepụtara na Wenezde tara Praịm Mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu ụta maka ịmalite agha ọzọ.

    Mana ndị na-akwado Hamas ekwenyeghị n’uru ngagharịiwe ahụ bara. Ha gara n’ihu ịta ndị ọzọ ụta ma kwuo na ha bụ sabo.

    Ngagharịiwe a mere n’ugwu Gaza otu ụbọchị ka ndị omekome Islamic Jihad jiri rọketi wakpoo Izrel, nke mere ka ndị Izrel kpebie ịwepụ Beit Lahia, nke kpalitere iwe ndị mmadụ na mpaghara ahụ.

    Otu n'ime ndị mere ngagharịiwe ahụ, onye bi na Beit Lahia bụ Mohammed Diab, emebiri ụlọ ya n'agha ma gbukwa nwanne ya nwoke mgbe Izrel si n’elu wakpoo Gaza otu afọ gara aga, kwuru na ha achọzighị ịnwụ maka ebumnuche otu ọ bụla maọbụ ọdịmma nke mba ọzọ.

    Ọtụtụ narị ndị Palestine anwụọla ebe a chụpụrụ ọtụtụ pụka mmadụ n’ụlọ ha kemgbe 18 Maachị Izrel malitere ịtụ ogbunigwe na Gaza.

  14. E gbuola ọtụtụ ndịagha Naịjirịa na Borno Steeti

    Ndị ji egbe

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Ndị ji egbe

    Ndị a na-enyoenyo na ha bụ Boko Haram wakporo ma gbuo ọtụtụ ndịagha Naịjirịa na Borno steeti.

    Ha wakporo ọdọ ndịagha Naịjirịa dị na Wajirko n’ime Damboa nakwa nke Wulgo dị na mpaghara Gamboru Ngala n’ụbọchị Monde.

    Akụkọ kwuru na ọtụtụ ndị Boko Haram nwụkwara n’oge ha na ndịagha Naịjirịa na-akwakọrịta ngbọ.

    Ọdọ ndịagha Wulgo dị n’oke ala Naịjirịa na mba Kamerun.

    Cheta na Boko Haram bidoro ịkpa mkpamkpa na Naịjirịa n’ihe dịka afọ 2009 mana kemgbe ahụ ruo ugbua mmadụ karịrị 40,000 anwụọla ebe mmadụ ruru nde abụọ gbara ọsọ ma hapụ ụlọ ha.

  15. Ihe ruru mmadụ 18 anwụọla n’ọkụ ọgbụgba na mba Saụt Korịa

    Ebe ọkụ na-agba na Saụt Korịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ebe ọkụ na-agba na Saụt Korịa

    Opekatamkpe mmadụ iri na asatọ anwụọla ebe mmadụ ịrị na itoolu meruru ahụ n’ọkụ ọgbụgba na-emebi ihe na mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ mba Saụt Korịa.

    Onyeisiala nchere oge nke mba ahụ bụ Han Duck-soo kọwara ọkụ ọgbụgba ahụ dịka “nke ọjọọ” kemgbe mba ahụ malitere.

    Dịka ọnọdụ ha dị ugbua, a kpọpụla mmadụ karịrị 23,000 n’ụlọ ha ma duga ha ebe ọkụ agaghị emetụta ha.

    Ọkụ ahụ gbara ụlọ dị icheiche nakwa ebe a maama ọkachasị ụlọekpere ndị Buddhist rugoro afọ 1,3000.

    Ndị na-agbanyụ ọkụ nakwa ndị agha ruru mmadụ puku ise, ma ụgbọelu helịkọpta nke mba Amerịka ka e zịgara ebe ahụ.

  16. Rọshịa na Yukren kwekọrịtara nkwụsị ọgụ n’Osimiri Ojii ‘Black Sea’

    Rọshịa na Yukren kwekọrịtara nkwụsị ọgụ n’Osimiri Ojii ‘Black Sea’

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Rọshịa na Yukren kwekọrịtara nkwụsị ọgụ n’Osimiri Ojii ‘Black Sea’

    Mgbe ụbọchị atọ nke mkparịtaụka udo ha nwere na Saudi Arabia gasịrị, Rọshịa na Yukren ekwekọrịtala nkwụsị ọgụ ndịagha mmiri n’oke Osimiri Ojii bụ ‘Black Sea’ na nkwekọrịta dị iche iche mba abụọ ahụ na mba Amerịka nwere.

    Amerịka kwuru na ndị ọbụla ga aga n’ihu ịgba mbọ maka ịchọta udo n’adịgide adịgịde dịka ha wepụtara ozi nkwekọrịta nke ekwuru na ọ ga-ahụ maka imepe ụzọ azụmaahịa dị mkpa.

    Mba Amerịka kwuru na mba abụọ ahụ ekwetala ewepụta etu a ga-esi emezu nkwekọrịta ha nwere maka nkwụsị iwakpo nkụrụngwa ọkụ ha.

    Mana Rọshịa kwuru na nkwekọrịta nkwụsị ọgụ ndịagha mmiri ga-amalite mgbe ewepụrụ mmachi enyere ya maka ịzụ ahịa nri na fatịlaịza.

    Ndị ọrụ mba Amerịka zutere ndị mkparitaụka dị iche iche si na Rọshịa na Yukren na Saudi Arabịa maka ime ka esemokwu dị n'etiti mba abụọ ahụ kwụsị.

    Mana ndị mkparịtaụka Rọshịa na Yukren ezutebeghị onwe ha.

    Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky kwuru na nkwekọrịta nkwụsị ọgụ n’oke Osmiri Ojii bụ nnukwu ihe dị mma.

    O gwara ndị ntaakụkọ na Yukren na oge ka dị ikwu ma ọ ga arụ ọrụ ma ọ gaghị arụ ọrụ mana otu ihe pụtara ihe bụ na ọ bụ nzukọ bara uru ya na nkwekọrịta dị mma.

  17. Igbo bụ Igbo, ụtụtụ ọma nụ oo

    Anyị na-asị ụnụ nọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde 26 Maachị 2025.

    Biko, bịa nụ sonyere anyị dịka Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu na-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme n'ala Igbo, Naịjirịa nakwa mba ụwa niile.

    Chinonso Ugorji ga-esonyere anyị n'oge ehihie.

    Udo dịrị ụnụ.

  18. Ndị nchekwa egbuola otu onye ntọ, napụta onye ha tọọrọ n’Anambra steeti

    Ndị nchekwa egbuola otu onye ntọ, napụta onye ha tọọrọ n’Anambra steeti

    Ebe foto si, Anambra State Police Command

    Ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị uweojii, ndịagha na ndị nche obodo kpachiri ụgbọala bọọsụ ojii akara ya bụ RSH 255MS n’abalị Mọnde 24 Maachị 2025.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kọwara na ọ bụ n’ihi etu ọkwọụgbọala ahụ ji agba ọnwụ ọnwụ mere ha jiri kpachie ya.

    N’ozi Ikenga wepụtara n’ụbọchị Tuzde 25 Maachị 2025, ọ sịrị na dịka ha na-achọ ịkwụsị ụgbọala ahụ, ndị nọ n’ime ya malitere ịgba ha egbe.

    “Oge anyị na ha na-akwarịta mgbọ, e memilara otu n’ime ndị ojiegbe ahụ ebe ndị nke ọzọ gbahapụrụ ya bụ ụgbọala ma buru apa mgbọ dị iche iche rie mbọmbọ”.

    “Oge anyị na-enyocha ụgbọala bọọsụ ahụ ka anyị hụrụ otu nwoke e kechiri anya, ọnụ, aka na ụkwụ, bụ onye anyị na-enyo enyo na ha tọọrọ,” ka ozi ahụ kwuru.

    Ikenga sịrị na ndị uweojii napụtara nwoke ahụ ma lekọta anya dịka ọ kwesịrị. Ọ sị na ha weghachitekwara ụgbọala bọọsụ ahụ dịka ha na-agbasi mbọ ike ugbua ịnwụchi ndị nke gbara ọsọ.

    Ụlọọrụ ndị uweojii ahụ gwara ụlọogwụ dị iche iche ka ha nabata ndị niile bu apa mgbọ ma hụ na ha nyere mkpesa n’ụlọorụ ndị uweojii ọbụla dị ha nso.

  19. Mba Rụwanda na-akwado ịwakpo anyị – Ka onyeisiala Burundi gwara BBC

    Mba Rụwanda na-akwado iwakpo anyị – Ka onyeisiala Burundi gwara BBC

    Onyeisiala Burundi bụ Évariste Ndayishimiye agwala BBC na ya ahụla “ihe akaebe” na-egosi na Rụwanda na-eme atụmatụ ịwakpo mba ha.

    Évariste Ndayishimiye kwukwara na Rụwanda agbaala mbọ ịhazi nkwatu ọchịchị na Burundi afọ iri gara aga, nke gaara adị ka “ihe ha na-eme na mba DR Kongo” ugbua.

    Rụwanda azaghachila ebubo ahụ ma kwuo na ya bụ okwu si n’ọnụ onyeisiala Burundi bụ nke “na-atụ n’anya”.

    O kwusiri ya ike na mba Rụwanda na Burundi na-agbakọta aka dịka ndị agbataobi n’ihe gbasara atụmatụ nchekwa maka okeala ha e mechiri kemgbe ihe karịrị otu afọ.

    N’agbanyeghị ọtụtụ ihe akaebe si n’aka otu mbaụwa bụ UN, Rụwanda agaala n’ihu na-agọ agụgọ ịkwado ndịagha nnupuisi M23, bụ ndị kpachirila ọtụtụ mpaghara ọwụwa anyanwụ mba DR Kongo na njikọaka ha na ndịagha Rụwanda.

    Rụwanda gọkwara na e nweghị ihe ọbụla jikọtara ha na ndịagha nnupuisi Red Tabara, nke Onyeisiala Ndayishimiye kwuru Rụwanda na-akwado iji tisasịa Burundi.

  20. Ọkaikpe Egwuatu ewezugala onwe ya n’ikpe Natasha Akpoti-Uduaghan

    Ọkaikpe egwuatu ewezugala onwe ya n’ikpe Natasha Akpoti-Uduaghan

    Ebe foto si, Natasha Akpoti-Uduaghan/Instagram

    Ọkaikpe Obiora Egwuatu nke Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n’Abuja ewezugala onwe ya n’ikpe onye omeiwu na-anọchite anya Kogi Central n’ụlọ omeiwu ukwu bụ Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan.

    Na nnọkọ ụlọikpe ahụ nwere n’ụbọchị Tuzde 25 Maachị 2025 ka Ọkaikpe Egwuatu nọọrọ kwupụta mkpebi o nwere iwepụ aka n’okwu ahụ.

    O kwuru na ihe mere o ji nwee mkpebi ahụ bụ maka ebubo ikpejọ ikpe onyeisi ụlọ omeiwu bụ Sịnetọ Godswill Akpabio boro ya.

    Anyị nụrụ na onyeisi ụlọ omeiwu sịnetị gosiri enweghị ntụkwasịobi n’ikikere ụlọikpe ahụ nwere inye ikpe ziri ezi gbasara okwu ahụ.

    Egwuatu gbakwunyere na a ga-ebughachiri Nnukwu Ọkaikpe nke Ụlọikpe Ukwu Etiti bụ Ọkaikpe John Tsoho akwụkwọ ikpe ahụ ka o bunye ya Ọkaikpe ọzọ.

    Na mbụ ka Ọkaikpe Egwuatu nyere iwu ka otu kọmitii ụlọ omeiwu sịnetị na-ahụ maka ezi akparamaagwa, ikike na mkpesa ọhanaeze kwụsị nnyocha ha na-eme Akpoti-Uduaghan.