Ka o sinadị, ha nwere olileanya ịrụ ọrụ n’uju taa dịka ụfọdụ
ụgbọelu maliterela ifedata ma na-efepụkwa n’abalị Fraịde.
Ndị uweojii na-ebu agha megide iyi ndụ egwu amalitela ime
nnyocha mana ndị uweojii Met Police kwuru na enwebeghị ihe na-arụtụ aka na e mere
nrụrụaka ọbụla.
Ọhanaeze ụnụ abọọla chi, Ọfọ anyị taa bụ ndụ mmiri, ndụ azụ. Mmiri atala ma azụ anwụla.
Anyị ji obi ekele anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde Eke 22 Maachị 2025.
Chinonso Ugorji awuchiela iwetere gị akụkọ niile na-akpọtụ n'ala Igbo, na Naịjirịa nakwa n'akụkụ ụwa dị iche iche. Ikechukwu Kalu ga-anọkwa ebe a n'oge ehihie.
Biko gaa n'ihu sonyere anyị.
Ụlọikpe Kachasị akagbuola ọchụchụ a chụrụ Sam Daddy dịka odeakwụkwọ PDP
Ebe foto si, Senator Samuel Anyanwu/Facebook
Ụlọikpe
Kachasị na Naịjirịa akagbuola ọchụchụ ụlọikpe mkpegharị chụrụ Samuel Anyanwu dịka
odeakwụkwọ otu Peoples Democratic Party (PDP).
Ikpe ahụ
nke ndị ọkaikpe mmadụ ise chabiri kwuru na okwu banyere onye bụ odeakwụkwọ pati
ahụ bụ nsogbu dịịrị ha n’ime ụlọ.
Ọkaikpe Jamilu Tukur onye gụpụtara ikpe ahụ kagburu ikpe ahụ
nke ụlọikpe mkpegharị kpere n’ọnwa Ọktoba 2024 bụ nke chụpụrụ Anyanwu dịka
odeakwụkwọ PDP.
N’ọnwa gara aga, kọmitii nke Tom Ikimi nọ n’isi ya tụrụ arọ
ka a chụpụ Anyanwu site n’otu PDP. O kwuru na Anyanwu jụrụ ịpụta n’ihu kọmitii
ahụ iji zara ọnụ ya megide ebubo ndị ntoroọbịa PDP boro ya.
Ndị a boro Anyanwu ebubo ime ihe ndị dị aṅaa megide PDP nke megidere iwu na-achị
pati ahụ.
Netanyahu achụọla onyeisi ọrụ nchekwa mba Izrel n’ọrụ maka e weghị ntụkwasị obi
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ronen Bar
Praịm mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu achụọla
onyeisi ọrụ nchekwa na mba ahụ bụ Ronen Bar.
Netanyahu kwuru na ihe mere ya jiri chọọ ịwepu Ronen Bar n'oche dịka onyeisi ụlọọrụ Shin Bet bụ
maka na ọ chọpụtaghị na ndị Hamas na-akwado ịwakpo mba ahụ n’Ọktoba 7, 2023.
Netanyahu mere ka a
mata ebum n’obi ya ịwepu Bar n’ozi o binyere aka n’ụbọchị Sonde garaaga ma
na-ekwu na ọ bụ maka “e weghị ntụkwasị obi” n’etiti ya na Bar na-akawanye
njọ kwamgbe kwamgbe”.
Nke a bụ nke mbụ na mba Izrel a na-achụ onyeisi ọrụ nchekwa ụlọọrụ “Shin Bet” n’ọrụ.
N’akwụkwọ ozi ahụ Netanyahu degara ndị Gọọmenti mgbe ha na-enwe ọgbakọ
ka ọ gwara ha na “enweghị ntụkwasị obi n’ebe ya na Ronen Bar nọ na-akawanye njọ n’oge
agha mba Izrel na ndị Hamas".
Netanyahu gwara ha na ya chọrọ ka "Ronen Bar pụọ n’oche n’Epril
20, 2025”.
Shin Bet bụ ụlọọrụ nchekwa na-arụ ọrụ miri emi na ngaraba
nchekwa ma bụrụkwa ụloọrụ nchekwa na-arụ ọrụ nzuzo na ịgba ama.
Mana Bar kwuru na ọ bụ maka ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ihe mere
Netanyahu jiri chọọ ịwepụ ya n’oche.
Ụlọ mgbasaozi Times nke Izrel na-ekwu na Bar kowara na ụlọọrụ
Shin Bet na-eme ndị ọrụ Benjamin "nyocha maka
ebubo na mba Qata na-eso ekwu ihe na-eme n’ime mba Izrel”.
Attorney General mba Izrel bụ Gali Baharav-Miara n’ọnwa
garaaga nyere iwu ka ndị uweojii na ụlọọrụ Shin Bet mee nyocha n’isi ndị ọrụ Netanyahu
maka ị nwe mmekọ ihe gbasara ego n’etiti ha n amba Qatar.
Mana otu ndọrọndọrọ ọchịchị Netanyahu bụ Likud Patị gọrọ agụgọ kwuo na aka ha dị ọcha n'ebubo a na-ebo ndị otu ha.
Ndịagha mba Sudan ekwuola na ha eweghachịtala isi obodo ha n’aka ndị iro
Ebe foto si, Sudan Tv
Nkọwa foto, Nabil Abdallah
Ndịagha mba
Sudan ekwuola na ha eweghachịtala isi obodo mba ha bụ Khartoum n’aka
ndịagha ndị iro ha wakporo mpaghara ahu n'oge garaaga.
Ha sị na e
wepụ ụlọ ebe obibi Onyeisiala ha, na ha chụpụkwara ndịagha ndị iro ha n’ụlọọrụ gọọmenti
dị icheiche dị na khartoum.
Ọnụ
na-ekwuru ndịagha na mba ahụ bụ Nabil Abdallah kwuru sị “ndịagha anyị emeriela ndịagha ndị iro ma napụ ha akụrụngwa ha ji anụ agha”.
Nabil
Abdallah bụ onye kwuru nke a n’ihe onyonyoo o mere n’ụlọọrụ ndị ntaakụkọ sị na “anyị na-enwe mmeri n’ihu ọgụ niile
na mpaghara obodo anyị niile. Anyị ga-ebuso ndịagha ndi iro a agha ruo na anyị achụpụ ha na mba anyị kpamkpam".
A ga-agbachi ọdọụgbọelu Heathrow Airport n’ihi ụkọ ọkụ latrik
Ebe foto si, Getty Images
A ga-emechi ọdọụgbelu
Heathrow Airport n’ụbochị Fraịde n’ihi ụkọ ọkụ latrik nke a tụrụ anya na ihe kpatara
ya bụ ọkụ gbara n’ụlọọrụ na-akesara ha ọkụ latrik.
Ọdọụgbọelu ahụ kachasị enwe ndị njem na mba UK dọrọ aka na ntị na ha ga-akwụsịtụ ọrụ n’ime
ụbọchị ndị na-abịa n’ihu ma gwa ndị njem ka ha ghara ime njem “n’agbanyeghị ọnọdụ
ọbụla” ruo oge ha malitere ọrụ.
“Iji hụ na e
chekwara ndị njem na ndị ọrụ anyị, enweghị ihe ọzọ anyị maara anyị ga-eme karịa
imechi Heathrow ruo mgbe ọ ga-afọdụ otu nkeji ka ọ kụọ elekere iri na abụọ nke
ime abalị n’ụbọchị 21 Maachị 2025,” ka ọnụ na-ekwuru ọdọụgbọelu ahụ sịrị.
“Anyị maara
na nke a ga-ewute ndị njem, ma anyị chọkwara ikwe ha nkwa na anyị na-arụsi ọrụ
ike iji dozie ya bụ ọnọdụ,” ka ozi ahụ gbakwunyere.
“Dịka ndị ọrụ
mgbanyụọkụ na-elebara ọnọdụ ahụ anya, anyị amatabeghị mgbe e nwere ike
iweghachi ọkụ latrik,” ka ọnụ na-ekwuchitere Heathrow kwuru.
Ọdọụgbọelu ahụ
rịọrọ mgbaghara maka ịkwụsịtụ ọrụ ma nye ndị njem ndụmọdụ ka ha kpọtụrụ ụlọọrụ
njem ụgbọelu ha maka inwetakwu ozi.
Heathrow bụ ọdọụgbọelu
kachasị buo ibu na mba UK dịka ụgbọelu ruru otu puku na narị atọ (1,300) na-efepụ
ma na-efebatakwa na ya bụ ọdọụgbọelu kwa ụbọchị.
Igbo Chukwu gọziri agọzi, ụnụ asaala chi, Ya dịrị onye niile mma ooo
Obi aṅụrị ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo n'ụbọchị taa bụ Fraịde Nkwọ 21 Maachị 2025.
Chinonso Ugorji na Michael Ilediagu ga-amalite ugbua iwetere gị akụkọ niile na-akpọtụ na n'ala Igbo, na Naịjirịa nakwa n'akụkụ ụwa dị iche iche. Ikechukwu Kalu ga-anọkwa ebe a n'oge ehihie.
Ihe karịrị mmadụ isii wụrụ n’oge ọkụ gbara ọtụtụ ụgbọala n’abalị garaaga n’Abuja bụ isi obodo Naịjirịa.
Ihe a mere n’ihe
dịka elekere asaa n’abalị nke mere ọtụtụ ndị mmadụ ji chere na ọ bụ ndị n’enyi ọha
egwu tụrụ ogbunigwe.
Cheta na ndị
Boko Haram tụrụ ogbunigwe na mpaghara ahụ n’afọ 2014 nke gburu mmadụ ọnụ ọgụgụ
ha karịrị iri na itoolu.
Nkọwa foto, Ụgbọala Dangote kpara mkpamkpa ahụ
Dịka ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ bụ Federal Road Safety si kwuo, ọ bụ ụgbọala na-ebu simentị Dangote kpara mkpamkpa ahụ n’Abuja.
Ha sị na ndị VIO na-akwụsị ụgbọala ahụ na-ebu sịmenti Dangote mana okweghị akwụsị.
Ha sị na o bidoro gbawa ọsọ nke mere o ji na-akụ ụgbọala ndị ọzọ.
Nkọwa foto, Ndị na-agbanyụ ọkụ
Ha kọwara na ọtụtụ ụgbọala ndị ahụ bidoro wuru ọkụ mana ihe dara ụda ka ogbunigwe bụ gaasị ụgbọala Dangote ahụ.
Sunday Okonkwo bụ onye nwanne ya meruru ahụ na mkpamkpa ahụ gwara BBC na ya hụrụ ozu mmadụ isii.
Saụt Afrịka: mmadụ karịrị 70,000 were mmasị ị ga Amerịka dịka ndị na-agba ọsọ ndụ
Ebe foto si, AFP
Nkọwa foto, Saụt Afrịka na Amerịka
Ọtụtụ ndị ọcha na mba Saụt Afrịka chọrọ i jiri ohere Onyeisiala
mba Amerịka bụ Donald Trump nyere ha were gbalaga na mba Amerịka.
Ihe ruru mmadụ 70,000 chọrọ iji ohere ahụ gaa mba Amerịka dịka ndị
na-agba ọsọ ndụ maọbụ ndị a na-akpagbu.
Ụlọọrụ na-ahụ maka azụmahịa bụ South African Chamber of Commerce dị
n’Amerịka (Saccusa) kwuru na igwe mmadụ n’achọ ozi gbasara etu e si edenye aha
ha ma rite n'erere ahụ.
N’ọnwa
Febuwarị ka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump nyere iwu ka ndi Afrikanas (ya
bụ ndị agbụrụ ha bụ Dutch bụ ndị bịara na mba Saụt Afrịka na Narị afọ nke 17 garaaga (17
Century) ka ha were ike ịbịa Amerịka dịka ndị na-agba ọsọ ndụ maka na ha bụ “ndị a na-akpagbu
maọbụ ndị a na-akpara oke agbụrụ”.
Adịm na mma
mba Amerịka na nke Saụk Afrịka na-emebi
kemgbe Trump banyere n’ọkwa ọchịchị nke ugboro abụọ.
Saccusa kwuru na ha enyela ụlọ nnọchịtaanya mba
Amerịka dị na Pretoria aha na ndekọ ndị Saụt Afrịka chọrọ ịga Amerịka bụ nke otu onye n’ụlọ ọrụ ndị nnọchitaanya ahụ gwara BBC na ha natara ndekọ ahụ.
Trump atụọla aro ka Amerịka nara ọdọ ọkụ nukle mba Yukren dị n'aka mba Rọshịa
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Zelensky na Trump
Amerịka
ekwuola na otu n’ime nkata Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump na Zelensky kpara
bụ ka US were ọdọ ọkụ nukle mba Yukren a na-akpọ Zaporizhzhia bụ nke dị n’aka
mba Rọshịa.
Onye ọnụ n’eru
n’okwu n’Amerika bụ Marco Rubio kwuru na “Amerika ị nara ọdọ ọkụ nukle ahụ ga-enyereaka chekwaa ya ma kwadoo ọkụ latrịk nke mba Yukren”.
Ọdọ ọkụ nukle
Zaporizhzhia ahu dị na mba Yukren bu ọdọ ọkụ nukle kacha ndị ọzọ na mpaghara Yurop.
Mana ndịagha Rọshịa
napụrụ mba Yukren ọdọ ọkụ latrịk ahụ n’afọ 2022 mgbe ha wakporo mpaghara Zaporizhzhia.
Ụmụ Igbo unu asaala chi?
Ka Chi kere taa ketere anyị ihe ọma, ọkachasị ndị na-esonyere anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo oge
niile.
Mara na ọ bụ Michael Ilediagu ga-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme na mba
ụwa n'ụtụtụ a, mana Chinonso Ugorji na Ikechukwu Kalu ga-eburu oche n’ehihie.
Daalụ nụ!
Kongo na Rwanda akpọla oku nkwụsị agha mgbe ha kparịtaụka na Kataa
Ebe foto si, Qatar's Ministry of Foreign Affairs
Nkọwa foto, Kongo na Rwanda akpọla oku nkwụsị agha mgbe ha kparịtaụka na Kataa
Onyeisiala mba DR Kongo bụ Félix Tshisekedi na Onyeisiala
Rwanda bụ Paul Kagame akpọọla oku ka akwụsị ịkwa mgbọ n’ọwụwa anyanwụ nke DR
Kongo mgbe ha kparịtaụka na mba Kataa.
Ọ bụ oge mbụ ndị isiala abụọ na-ahụkọrịta onwe ha kemgbe ndịagha
nnupụisi Rwanda na-akwado a na-akpọ M23 na-ebuso agha na mpaghara ahụ nke ndị ọchịchị
kwuru na e gburu mmadụ puku asaa (7,000) kemgbe Jenụwarị.
Akụkọ kwuru na o dobeghị anya ma ndị M23 a ga-ekwenye n’oku
nkwụsị ịkwa mgbọ dịka ndị nnupụisi jụrụ isonye na mkparịtaụka e mere n’Angola na
Tuzde.
DR Kongo na-ebo Rwanda ebubo na ha na-enyere ndịagha nnupụisi
M23 aka site na-izitere ha ndịagha, mana Rwanda ekweteghị ebubo ụlọọrụ UN na mba
Amerịka boro ha.
Ndịọrụ UN mmadụ abụọ anwụọla dịka Izrel wakporo Gaza ọzọ
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Mgbe Izrel wakporo Gaza na Tuzde 18 Maachị 2025
Ụlọọrụ UN ekwuola na e gburu ndịọrụ ha mmadụ abụọ ebe ndị ọzọ
merụrụ ahụ mgbe e mebiri ogige ụlọọrụ ha dị na Gaza na Wenezde, mana ndịagha
Izrel kwuru na ọ bụghị ha wakporo ụlọọrụ ndị UN dị na Deir al-Balah.
Akụkọ kwuru na ihe ruru mmadụ 13 nwụrụ dịka mba Izrel siri n’elu
wakpoo Gaza ọzọ n’abalị ma kwenkwa iji ike ịlụso ha ọgụ
Izrel kwuru na ha na-amaliteghachi ọgụ na mpaghara
Palestine.
E gburu ndị nkịtị mmadụ abụọ ebe mmadụ ise ndị ọzọ merụrụ ahụ
mgbe mba Izrel ji doronu kụrụ ụlọikwuu dị nso na mpaghara ndị enyemaka mmadụ
na-elekọta mmadụ n’al-Mawasi dịka ụlọ mgbasa ozi Palestinian Wafa siri kwuo.
Ndịagha Izrel kwuru na ha lekwasịrị anya ebe ndịagha Hamas
na-akwado ka ha si kwanye mgbọ n’Izrel.
Ndịagha kwuru na akụkpọrọ ụgbọmmiri ndị Hamas na-ahụ maka ya.
Cheta na Praịm Mịnịsta mba Rọshịa bụ Benjamin Netanyahu
kwuru n’ọgụ ga-amalite n’ike ma kwukwa na ogbunigwe ahụ Izrel tụrụ na Gaza
gburu mmadụ karịrị 400 na Tuzde 18 Maachị 2025 ka bụ bido.
Mwakpo ogbunigwe ahụ mere taat abụghị otu ọ dị na Tuzde,
mgbe ndị ọrụ ahụike Hamas kwuru na e gburu ihe karịrị mmadụ 400 - mana ọ
na-egosi na ọ nweghị nkwụsị na mwakpo ọhụrụ nke Izrel malitere na Gaza.
Mwakpo nke Tuzde bụ nke kachasị njọ kemgbe nkwụsị ọgụ na
nkwekọrịta ịtọhapụ ndị eji eji malitere na 19 Jenụwarị 2025, dịka Izrel na
Hamas ekwenyeghị ka ha ga-esi banye n’agba nke abụọ nke nkwekọrịta nkwụsị ọgụ
ahụ.
Rọshịa na Yukren esila n’elu wakpoo mba ha mgbe Putin na Trump kwuchara n’ekweantị
Nkọwa foto, Rọshịa na Yukren esila n’elu wakpoo mba ha
Rọshịa na Yukren esila n’elu wakpoo akụrụngwa mba ha dịka
Onyeisiala Vladimir Putin jụrụ atụmatụ mba Amerịka ka ọ kwụsị ịkwa mgbọ na
Yukren mkpụrụ abalị iri atọ (30).
Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky kwuru na Rọshịa lekwasịrị
anya imebi "ihe akụrụngwa obodo" n'otu abalị nke gụnyere ụlọọgwụ abụọ
dị na Sumy.
Cheta na Onyeisiala Putin nabatara oku Onyeisiala mba Amerịka
bụ Donald Trump kpọrọ ka Rọshịa kwụsị mwakpo ọ na-eme n'akụrụngwa ikike ọkụ
Yukren mkpụrụ ụbọchị iri atọ, mana o kweghị ka akwụsị ịkwa mgbọ n'uju na
Yukren.
Onye nnọchiteanya Onyeisiala Trump na mpaghara Etiti ọwụwa
anyanwụ ụwa ‘Middle East’ bụ Steve Witkoff kwuru na mkparịtaụka mba Amerịka
banyere agha Yukren ga-aga n’ihu n’ụbọchị Sọnde n’isi obodo Jeddah dị na Saudi
Arabia.
Onyeisiala Putin na Onyeisiala Trump nkwekọrịtakwara oge ha
kpọrọ oku ahụ na mba Rọshịa na Yukren ga-agbanwe ndị mkpọrọ mmadụ otu narị na
iri asaa na ise (175) site n’akụkụ onye ọ bụla taa.
Onyeisi iwu
mba ofesi nke otu jikọrọ mba Yurop ‘European Union’ bụ Kaja Kalas, kwuru na Rọshịa
achọghị ikwenye na mkparịtaụka maka ịkwụsị agha na-aga n'ihu na Yukren.
Ọ gwara ndị
ntaakụkọ na Rọshịa na-atụ anya ka Yukren hapụ nchekwa ya.
Ebe foto si, AFP
Nkọwa foto, Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na mba Jamini bụ Boris Pistorius
Mana Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na mba Jamini bụ Boris Pistorius kwuru na nkwekọrịta Onyeisiala Putin ịkwusi mwakpo a na-ebuso akụrụngwa ọkụ Yukren enweghị uru ọbụla ọ bara.
Pistorius gwara onye mgbasa ozi German ZDF na,"Mwakpo akụrụngwa ndị nkịtị n'abalị mbụ mgbe oku ekwentị gosiri na nnukwu oku a akwụsịbeghị ihe ọbụla."
Putin anabatala oku ịkwụsị iwakpo akụrụngwa ikike ọkụ mba Yukren
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Onyeisiala Trump na Onyeisiala Putin
Onyeisiala
mba Rọshịa bụ Vladimir Putin anabatala oku Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald
Trump na-akpọ ka Rọshịa kwụsị mwakpo ọ na-eme n'akụrụngwa ikike ọkụ Yukren, mana
o kweghị nkwụsị ịkwa mgbọ n'uju na Yukren.
Onyeisiala
mba Rọshịa ekwetaghị ibinye aka n’akụkwọ nkwekọrịta nkwụsị agha otu ọnwa nke bụ
atụmatụ ndị nke Onyeisiala Trump wepụtara mgbe ha nwere nzukọ na Saudi
Arabia.
Onyeisiala
Putin kwuru na nkwụsị ịkwa mgbọ n’uju ga-eme ma ọ bụrụ na enyemaka ndịagha mba ọzọ
na ikekọrịta ozi ọgụgụ isi na Yukren bịara na njedebe.
Mana ndị
Yurop na-akwado Yukren anabataghị ya bụ ọnọdụ Onyeisiala Putin wepụtara.
Onye nnọchiteanya
Onyeisiala Trump na mpaghara Etiti ọwụwa anyanwụ ụwa ‘Middle East’ bụ Steve Witkoff kwuru na mkparịtaụka mba Amerịka
banyere agha Yukren ga-aga n’ihu n’ụbọchị Sọnde isi obodo Jeddah dị na Saudi
Arabia.
N'ime agha afọ atọ ahụ, mba Rọshịa na-eweghachite okeala na
mpaghara Kursk nke ndị Yukren weghaara ọnwa isii gara aga.
Mgbe ndị nnọchianya mba Amerịka zutere ndị ogbo ha si Yukren
na Jeddah na Tuzde gara aga, ha mere ka Yukren kwenye n'atụmatụ ha maka nkwụsị agha
ụbọchị iri atọ (30) "ozugbo" n'ofe ala, ikuku na oke osimiri.
Igbo ndị ọma, unu abọọla chi?
Anyị na-asị nọọ dịka unu na-esonyere anyị n'ọgbakọ BBC News
Igbo taa.
Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga-ewetere ụnụ akụkọ
ihe na-eme na mba ụwa niile mana Chinonso Ugorji ga-emechaa sonyere anyị n'oge
ehihie.
Aka na-achi
Ebonyi steeti bụ Francis Nwifuru akwụsịla ndị kọmịshọna atọ ọrụ maka abịaghị
nzukọ.
Ọ bụ kọmịshọna
na-ahụ maka mgbasaozi na nduziuche ọhanaeze n’Ebonyi steeti bụ Jude Okpor
kpughere nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na ngwụcha nzukọ nke otu kansul
na-achị steeti ahụ.
Dịka Okpor
siri kwuo, a kwụsịtụrụ ndị kọmịshọna ahụ ọrụ ruo otu ọnwa n’ihi na ha agaghị
nzukọ otu kansul na-achị Ebonyi steeti haziri n’ụbọchị Mọnde 16 Maachị 2025.
Kọmịshọna ndị
ọnọdụ ahụ metụtara gụnyere Solomon Azi na-ahụ maka enyemaka na ụlọọrụ ndị na-agbata
ọsọ enyemaka, Victor Chukwu na-ahụ maka gburugburu na Ikeuwa Omebe na-ahụ maka
mmepe ime obodo.
Okpor sịrị na
Gọvanọ Nwifuru dọrọ aka na ntị megide agwa ejighị ọrụ kpọrọ ihe nke e ji mara ụfọdụ
ndị ọrụ obodo.
Ọ gakwara n’ihu
kwuo na Nwifuru nyere ntuziaka ka a napụ kọmịshọna ndị ahụ a kwụsịtụrụ ọrụ
ikikere na ngwongwo niile e nyere ha ruo mgbe ntaramaahụhụ ha ga-akụrụ ọnụ.
A ga-enwe ụkọ ọgwụ HIV na Naịjirịa oge na-adịghị anya - WHO
Ebe foto si, BBC, Reuters
Ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organization
(WHO) nọọrọ n’ụbọchị Mọnde 17 Maachị 2025 kwuputa Naịjirịa dịka otu n’ime mba
asatọ ndị ga-anọ n’ụkọ ọgwụ e ji agwọ HIV n’ime oge na-adịghị anya.
Ọnọdụ a na-abịa
dịka mkpebi ọchịchị Trump nwere ịkwụsị enyemaka na mba ndị ọzọ kụnyere ụkwụ na
nkesa ọgwụ HIV na mba ndị ahụ.
Ụlọmgbasaozi
Reuters sị na nnukwu onyeisi ụlọọrụ WHO bụ Tedros Ghebreyesus kwuru na ọgwụ e
ji agwọ HIV nwereike ịkọ na Naịjirịa, Haiti, Kenya, Lesoto, Saụt Sụdan, Bọkịna
Faso, Mali na Yukren n’ime ọnwa ole na ole na-abịa n’ihu.
“Ịkụsasị ihe
omume dị iche iche a haziri maka HIV nwereike ime ka ọganịihu e nwetara kemgbe
afọ iri abụọ laa n’iyi,” ka a sị Ghebreyesus kwuru n’otu ọgbakọ ya na ndị ntaakụkọ
nwere.
Ọ gbakwunyere
na ọnọdụ a nwereike ime ka ndị ọhụrụ karịrị nde iri (10m) bute nje HIV ma
mekwaa ka mmadụ ruru nde atọ (3m) nwụọ n’ihi nje HIV.
Nkwụsịtụ
enyemaka mba ndị ọzọ nke mba Amerịka tinyere n’ọrụ site n’aka onyeisiala ha bụ Donald
Trump emetụtala mbọ a na-agba ibu agha megide HIV, ọrịa nkwarụ ụmụaka bụ polio,
ọrịa ịba na ụkwaranta.
Ndị nọọsụ amalitela ngagharịiwe n'Ebonyi steeti maka onye nọọsụ etiri ihe
Ebe foto si, Chibueze Nwegede
Nkọwa foto, Mgbe ndị nọọsụ na-eme ngagharịiwe n'Ebonyi steeti
Ndị nọọsụ amalitela ngagharịiwe n'isi obodo Abakaliki dị n’Ebonyi
dịka otu onye ikwu onye ọrịa tiri nọọsụ ihe n’ụbọchị Mọnde 17 Maachị 2025, nwere
wepụ eze ya.
Ihe ọjọọ a, mere n’ụlọọgwụ Federal Teaching Hospital dị n’okporoụzọ
gara Abakaliki na Enugwu.
Otu onye nọọsụ achọghị ka akpọ aha ya, gwara ndị ntaakụkọ na
ọ bụ maka etu ndị ikwu ndị ọrịa si emeso ndị nọọsụ omume mere ha ji eme ngagharịiwe
ahụ.
King Charles na-aga njem nleta n’Ịtali agbanyeghị ọria Popu Francis
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Onyeeze Breten bụ King Charles
Onye eze
na-achị Breten bụ King Charles III na nwunye bụ Queen Camilla na-aga n’ihu ime
njem nleta na mba Ịtali ya na Vatican, ebe e kwuru na ya na Popu Francis ga-enwe
nzukọ.
Popu na-arịa
ọrịa mana obi ọchịchị King Charles a na-akpọ ‘Buckingham Palace’ kwuru na njem Onyeeze
ahụ ga-amalite na Mọnde 7 ruo Tọzde 10 Eprel 2025 ebe ọ ga-enwe ọtụtụ ihe ọ ga-eme
na Rome na Ravenna.
Onyeeze ahụ
zigara Popu akwụkwọ ozi mgbe ọ na-arịa ọrịa mana foto Vatican wepụtara n’izu
gara aga gosiri na Popu ahu dị afọ iri asatọ na asatọ na-agbake obere obere.
Nleta ahụ ga-ahụ njikọ ihe atụ nke dị n'etiti Chọọchị Roman
Katọliki na Chọọchị England, nke King Charles bụ Gọvanọ Kasị elu.
N’ime nzukọ ya na Popu, Onyeeze ahụ ga-aga ụka mbụ ya n’ebe
nchụaja ‘Sistine Chapel’ tupuu ọ gaa nleta na Papal Basilica dị na Saint Paul.
Ndị eze Breten gara aga nke malitere n’oge ọchịchị Anglo-Saxon
na-enye chọọchị ahụ ihe enyemaka na ego nkwado, nke a mere eji ahụta nleta King
Charles dịka ihe ịrịba ama nke ime udo ga-enweta ma kpokọta ihe ndị a mere oge
mbụ.
Njem ahụ na Rome dabara n’oge ncheta afọ iri abụọ nke onyeeze
ahụ na nwunye lụrụ di na nwunye.