Etu e si gbaara ụmụafọ Naịjirịa 103 ụgbọ nwamkpị site na mba Turkey

Akụkọ kwuru na otu onye Fada so na ndị nwụrụ na mwakpo ahụ

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Chinonso Ugorji, Jessica Nwankwo, Uche Akolisa, Michael Ngene, Michael Ilediagu

  1. Anyị ga-esonye n'abụbụọrụ NLC na TUC ụcbọchị Mọnde - NUPENG

    Njirimara NUPENG

    Ebe foto si, NUPENG/X

    Nkọwa foto, Njirimara NUPENG

    Otu ndị ọrụ Nigeria Union of Petroleum and Natural Gas Workers (NUPENG) enyela ndị ọrụ ha n’Naịjirịa gba gburugburu iwu ka ha sonye n’abụbụọrụ otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) na Trade Union Congress (TUC) ga amalite ụbọchị Monde abali atọ ọnwa Jun afọ 2024 maka ụgwọ opekatampe ndị ọrụ.

    Odeakwụkwọ NUPENG bụ Afolabi Olawale mere ka amata nke a n’akwụkwọ ozi o wepụtara ụbọchị Satọde Jun 1.

    O kwuru na ọ bụ ihe mwute na gọọmenti etiti achọghị ime ihe ọbụla banyere okwu ụgwọ ọnwa opekatampe ndị ọrụ Naịjirịa.

    N’okwu ya “Ndị ọrụ na-ata afụfụ dị egwu ebe ndị ọchịchị gbara nkịtị. Anyị na-enye iwu ka ngalaba anyị niile kwadoo ma sonye n’abụbụọrụ a ga-amalite ụbọchị Mọnde.

  2. Etu onye ọkwọ ụgbọala si kutuo otu nwaanyi ma rie mbọmbọ ọsọ n’Anambra steeti

    Foto ozu nwaanyị ahụ nwụrụ

    Ebe foto si, FRSC

    Nkọwa foto, Foto ozu nwaanyị ahụ nwụrụ

    Onye ọkwọ ụgbọala kuturu otu nwaanyị ji ụkwụ aga na mpaghara upper Iweka onitsha dị na Anambra steeti ma ripu ọsọ ụbọchị Fraịde 31 Mee, 2024.

    Ozi anyi nwetara n’aka onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka nchekwa okporoụzọ Federal Road Safety Corps (FRSC) nke steeti ahụ bụ Adeoye Irelewuyi kwuru na e buru nwaanyị ahụ ga n’ụlọọgwọ Toronto dị n’Onitsha ebe ndị dọkịta kwuru na ọnwụọla.

    Irelewuyi mere ka amata na ndị uweojii nọ na mpaghara ahụ na-agba mbọ ị chọpụta ezinaụlọ nwaanyị ahụ.

  3. Atọhapụla Abba Kyari n'akaebe

    DCP Abba Kyari

    Ebe foto si, Abba Kyari/Facebook

    Atọhapụla onye bụbu onyeisi ngalaba ndị uweojii ‘Intelligent Response Team’ bụ Abba Kyari n’ụlọmkpọrọ Kuje.

    Nke ahụ sochiri nchabi ikpe Ọkaikpe Emeka Nwite nke ụlọikpe ukwu etiti dị n’Abuja nyere n’abalị 22 Mee 2024.

    Dịka ọ na-enye ya beelụ n’ụbọchị ahụ, Ọkaikpe Nwaite sịrị na a ga-atọhapụ Kyari izuụka abụọ iji nyere ya aka hazie akwamoozu nne ya nwụrụ n’abalị 5 Mee 2024.

    Cheta na Kyari bụ onye akpọchiri n’ụlọmkpọrọ Kuje kemgbe ọnwa 27 gara aga n’ihi ebubo ịtụ mgbere ọgwụike NDLEA boro ya.

  4. Otu NLC na TUC ga-amalite abụbụọrụ n'ụbọchị Mọnde maka ụgwọ opekatampe

    Onye na-efe ọkọlọtọ ndị ọrụ Bekee na Naịjirịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) na Trade Union Congress (TUC) ekwuola na ha amalite abụbọọrụ ụbọchị Monde abali atọ ọnwa Jun afọ 2024 maka enweghị ike ịnwe nkwekọrịta n’etiti ha na gọọmenti etiti banyere ụgwọ opekatampe ndị ọrụ.

    Onyeisi mgbasa ozi NLC bụ Benson Upah mere ka amata nke a mgbe BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ taa banyere nzukọ ha na kọmiti gọọmenti etiti nyibere maka ụgwọ ọnwa opekatampe ahụ ụbọchi Fraide Mee 31.

    Upah kwuru na “Nzukọ Ahụ amịtaghị mkpụrụ ọbụla n’ihi na gọọmenti adighị njikere ịme ihe ọbụla banyere ụgwọ ọnwa opekatampe ahụ”

    “Gọọmenti e jighị anyị kpọrọ ihe, ọ bụ ya mere anyị ji si na nzukọ ahụ pụọ”

    Upah gbara ama na abụbọ ọrụ ga-amalite n'steeti niile ụbọchi Monde Jun 3 nwee ruo mgbe a na amaghị.

  5. Igbo ndị mụrụ nze mụọ ọzọ

    Nwoke na-elu ikoro iji nabata ọnwa ọhụrụ.
    Nkọwa foto, Nwoke na-elu ikoro iji nabata ọnwa ọhụrụ.

    Anyị ji obi ọma na-anabata unu n'ọgbakọ BBC Igbo n'ọnwa Juun, afọ 2024.

    Ekpere anyị bụ ndụ mmiri ndụ azụ. Ka ọ maara gị na mma n'ọwa a.

    Biko buru oche gị bịa n'ọnyere anyị ka ị gụrụ akụkọ ndị gbapụtara ihe na Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa gbaa gburugburu.

    Daalụ!