Etu e si gbaara ụmụafọ Naịjirịa 103 ụgbọ nwamkpị site na mba Turkey

Akụkọ kwuru na otu onye Fada so na ndị nwụrụ na mwakpo ahụ

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Chinonso Ugorji, Jessica Nwankwo, Uche Akolisa, Michael Ngene, Michael Ilediagu

  1. E mere nrụrụaka n’usoro e si ewe ndị ‘constable’ n’ọrụ - Ndị uweojii Naịjirịa

    Olumuyiwa Adejobi

    Ebe foto si, Nigeria Police Force

    Ndị uweojii Naịjirịa etiela mkpu n’ihi ebubo nrụrụaka e mere gbasara aha ndị a ga-ewe n’ọrụ maka ọkwa constable.

    Nke a dị n’ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa bụ Olumuyiwa Adejobi depụtara n’ụbọchị Satọde 15 Juun 2024 n’aha onyeisi ndị uweojii.

    N’ozi ahụ, Adejobi sịrị na mmadụ ndị ahụ bụ ndị e kwuru a ga-ewe n’ọrụ maka ọkwa constable nke afọ 2022/2023.

    Dịka ozi ahụ siri kwuo, ndị uweojii hụtara usoro e si were mmadụ ndị ahụ n’ọrụ dịka nke na-ezighị ezi n’ihi ọtụtụ mkpesa sitere n’aka ndị ọnụ na-eru n’okwu nakwa ndị ntorobịa debanyere aha ha maka ihe omume iwe n’ọrụ ahụ.

    Adejobi kwuru na dịka ndị uweojii lebara anya n’aha ndị ụlọọrụ Police Service Commission (PSC) bipụtara, a chọpụtara na ọtụtụ ndị e kwuru nwetara ohere ọrụ ahụ bụ ndị na-edebanyeghị aha ha maka iwe n’ọrụ ma bụrụkwa ndị na-esonyeghị n’usoro ihe omume iwe n’ọrụ ndị uweojii.

    Ọ kọwakwara na ọtụtụ ndị e bipụtara aha ha bụ ndị dara ule e ji igwe kọmputa lee (CBT) nakwa ule nke mmegharịahụ.

    Ha bokwara ebubo ịnara ngarị iji bipụta aha ndị na-etozughị oke ịbanye n’ụlọọrụ ndị uweojii nakwa ndị na-agaghị ekwe ọzụzụ.

    Ka o siladị, ndị uweojii wezugara onwe ha n’aha ndị ahụ e bipụtara ma kpọọ oku ka e mee nnyocha ga-ekwesị ntụkwasaobi.

  2. Finidi George agbaala arụkwaghịm dịka onye nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ Super Eagles

    Finidi George

    Ebe foto si, Super Egales/X

    Nkọwa foto, Finidi George

    Finidi George agbaala arụkwaghịm ya dịka nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ Super Eagles nke Naịjirịa.

    George kwụsịrị ọrụ ya ka Benin Republic ji ọkpụ gọọlụ abụọ asatara otu merie Super Eagles n’asọmpi iji tozuo maka asọmpi iko mbaụwa nke afọ 2026.

    Mịnịsta na-ahụ maka egwuregwu bụ Sinetọ John Enoh ekwuola na otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ 'Nigeria Footbal Federation', nwere nkọwa n’ihi na ya anabataghị ọyịpa Super Eagles na-agba na nso nso a.

    NFF n'ime nkwupụta ha ụbọchị Tọzdee kwuru na ha ga-ewe onye mba ozo ọrụ dịka onye nchịkọta otu egwuregwu Super Eagles maka asọmpi bọọlụ ndị ozo fọdụrụ.

    Ọgbabọọlụ bụ Victor Osimhen nọrọ na soshal midia 'Instagram' kwuo na ọnọdụ otu egwuregwu Super Eagles ugbua adighị ya mma n'obi.

    Agbanyeghị nke a, NFF ekwenyebeghị na ha enwetala akwụkwọ ịgba arụkwaghịm n'aka Finidi George.

    Nigeria nọ n'ọgogo nke ise n’otu Group C iji tozuo maka asọmpi iko mbaụwa afọ 2026.

  3. Obere ụmụagbọghọ ndị ahụ a tụrụ mgbere ịgba akwụna na Ghana alọghachịla na Naịjirịa

    Obere ụmụagbọghọ a tụrụ mgbere na Ghana

    Ebe foto si, NIDCOM/Twitter

    Obere ụmụagbọghọ iri ahụ bụ ndị Naịjirịa a tụrụ mgbere na mba Ghana maka ịgba akwụna alọghachịla na Naịjirịa dịka ụlọọrụ na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi na mba bụ NIDCOM ofesi si kwuo.

    Onyeisi ụlọọrụ Nigerians in Diaspora Commission bụ Abike Dabiri-Erewa kwuru nke a n’akara soshal midia X ya, na ụmụaka ndị a gbara ụkwụ na Legọs n’ụbọchị Fraịde.

    O kwuru na ụmụaka ndị a nke ọtụtụ n’ime ha bụ ndị Imo Steeti so ndị ọrụ na-anọchiteanya gọọmentị Imo steeti lọta.

    O kwuru na ụlọọrụ na-ahụ maka ndị a tụrụ mgbere bụ National Agency fo the Prohibition of Trafficking in Person (NAPTIP) nabatara ụmụaka ndị a.

    Ụmụagbọghọ ndị a dị n’okpuru afọ 18 ka a sị na otu nwoke a na-amaghị onye ọ bụ tụrụ ha mgbere si Naịjirịa gawa Ghana. Ndị uweojii mba Ghana anwụchiela nwamadị ahụ.

    Onyeisi NIDCOM kwuru na ọ bụ ndị Naịjirịa bi na mba Ghana zọpụtara ụmụagbọghọ ndị ahụ.

  4. Mgbe onyeisiala Tinubu zutere onyeisi ụlọọrụ FBI nke Amerịka

    Onyeisiala Tinubu na Onyeisi FBI bụ Wray

    Ebe foto si, Ajuri Ngelale

    Onyeisiala Bola Tinubu nọọrọ n’ụbọchị Fraịde nabata Onyeisi ụlọọrụ Federal Bureau of Investigation (FBI) nke mba Amerịka bụ Christopher Asher Wray n’isiụlọọrụ ya dị n’Abuja.

    Onyeisiala Tinubu gwara Wray na Naịjirịa na-agba mbọ ikpochapụ iyi ndụ egwu, mpụ ịntanetị nakwa arụ ndị ọzo.

    Tinubu gara n’ihu kpọọ oku ka Naịjirịa na mba Afrịka ndị ọzọ jikọta aka ọnụ iji kpochapụ mpụ na mpaghara ahụ.

    Ọ kpọkwara oku ka mba Amerịka nyere mba ndị na-emepe emepe aka n’ụzọ tekịnụzụ nakwa nkesa amamihe iji buo agha megide mpụ.

    Na nzaghachịm Dịrektọ Wray kwuru na ọ bịara Naịjirịa maka ịkwalite mmekọrịta dịbu n’etiti gọọmentị Naịjirịa na gọọmentị mba Amerịka.

  5. Otoro agbagbuola mmadụ 30 na Naịjirịa – NCDC

    Ụmụaka na-ekuta mmiri

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ụmụaka na-ekuta mmiri

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naijiria bụ 'National Centre for Disease Control' (NCDC), adọọla aka na nti maka ọrịa otoro nke ha kwuru na na-agbasa ụgbụa na Naịjirịa..

    NCDC mere ka amata na-enwela ihe ruru mmadụ 1,141 bụ ndị a na-enyo enyo bu ọrịa ahụ, ebe mmadụ 30 nwụọrọla site n'ọrịa ahụ n'okpuruọchịchị 90 dị na steeti 30 kemgbe Jenụwarị.

    Steeti ndị ọ kacha metụta gunyere Bayelsa, Zamfara, Abia, Cross River, Bauchi, Delta, Katsina, Imo, Nasarawa na Legọs steeti.

    Ụlọọrụ NCDC na ndị ọrụ ahụ ike mbaụwa ndị ọzọ na-arụkọ ọrụ iji nweta ibu agha ma chụọ cholera ọsọ ụkwụ eru ala.

    Ọrịa otoro bụ ọrịa e nwere ike ibute site na mmiri maọbụ nri, site na ịnụ mmiri adịghị ọcha.

    Nrị nwere ike ịfọtọ site n' aka akwọghị akwọ, oge a na-esi ya maọbụ oge a na-eri ya.

  6. Otu kọmitii ụlọomeiwu nta ekwuola ka a zụtara Tinubu na Shettima ụgbọelu ọhụrụ

    Bola Tinubu

    Ebe foto si, Kashim Shettima

    Kọmitii ụlọomeiwu nnọchiteanya na-ahụ maka nchekwa obodo agwala Gọọmenti Etiti ka ọ zụta ụgbọelu ọhụrụ maka Onyeisiala bụ Bola Tinubu na Osote Onyeisiala bụ Kashim Shettima.

    Nke a dị n’ozi kọmitii ahụ wepụtara n’oge ha mechara nnyocha gbasara ọnọdụ ụgbọelu onyeisiala na osote ya.

    Dịka ha siri dee n’ozi ahụ, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ịzụta ụgbọelu abụọ maka onyeisiala na osote ya iji gbochie ihe ọghọm ọbụla nwere ike ịdapụta n’ihi nsogbu ụgbọelu ha nwere.

    N’ime ọnwa Mee, ụlọomeiwu nnọchiteanya nyere kọmitii ahụ iwu ka ha mee nnyocha miri emi gbasara ọnọdụ ụgbọelu dị iche iche onyeisiala ji eme njem iji chọpụta ma ha ka tozuru oke ife n’elu.

  7. Otu G7 ekwetele ibinye mba Ukraine ijeri dọla 50 site n'akụnaụba mba Russia ha kpachiri

    Joe Biden na Volodymyr Zelensky

    Ebe foto si, Getty Images

    Otu ọgbakọ G7 enweela nkwekọrịta ibinye mba Ukraine ego dị ijeri dọla iri ise $50bn site n’akụnaụba mba Russia ha kpachiri akpachi iji nyere Ukraine aka ibuso ndị Russia agha.

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden kwuru na nke a bụ iji chetere ọha na “anyị anaghị alaghachị azụ,” mana mba Russia eyiela egwu “imegwara n’ụzọ na-afụ ụfụ” ma dịkwa egwu.

    A na-atụ anya na ego ahụ ga-eru mba Ukraine aka na ngwụcha afọ mana a na-ahụta ya dị ka ụzọ dị ga-egbu oge iji nyere Ukraine aka n’agha nakwa n’akụnaụba.

    N’ọgbakọ G7 ahụ na-aga n’ihu na mba Italy, Onyeisiala Ukraine bụ Volodymyr Zelensky na ogbo nke Amerịka bụ Joe Biden tinyere aka n’akwụkwọ nkwekọrịta maka nchekwa obodo nke ga-ewe afọ iri.

    Ndịisiala mba ndị so n'ọgbakọ G7

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkwekọrịta ahụ gụnyere ndịagha mba Amerịka inye mba Ukraine ọzụzụ pụrụiche n’ịlụ agha mana ọ gụnyeghi iziga ndịagha mba Amerịka na Ukraine maka ịlụrụ ha ọgụ.

    Ndị Amerịka na otu European Union kpachiri akụnaụba mba Russia ruru ijeri dọla narị atọ na iri abụọ na ise ($325bn) maka etu Russia si were ikike wakpoo mba Ukraine n’afọ 2022.

    Ọgbakọ ga-elebakwa anya n’etu mba ndị a mepere emepe ga-esi enyere mba Afrịka nakwa ndị ọzọ na-emepe emepe aka.

  8. Igbo ndị ọma unu abọọla chi?

    Anyị ji aka na i hiri ụra ọfụma ma tetakwa ọfụma?

    Anyị na-anabata unu n'ọgbakọ anyị bụ BBC News Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

  9. Ndịagha egbuola mmadụ abụọ otu IPOB na ESN n’Abia steeti

    Onye e gburu na ngwa agha e nwetara n'aka ndị IPOB/ESN

    Ebe foto si, Nigeria Army

    Nkọwa foto, Onye e gburu na ngwa agha e nwetara n'aka ndị IPOB/ESN

    Ndịagha Naịjirịa na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na mbọ ha na agba ikpochapụ mpụ and ndị ji egbe eyi ọha egwu, a wakpola ogige ndị Indigenous People of Biafra (IPOB) nakwa otu Eastern Security Network (ESN) dị n'ime ọhịa Umudi na mpaghara Umuaku nke ime obodo okpuruọchịchị Umu-nneochi nke Abia steeti,

    Ndịagha ahụ wakporo ma bibie ogige ndị ahụ na-eyi ọha egwu, gbuo mmadụ abụọ, ebe ndị ọzọ gbara ọsọ.

    Ha bibikwara ụlọ arụsị, ma nweta otu egbe AK 47, ọtụtụ mgbọegbe, ekwenti 16, uwe ndịagha na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

    Mwakpo a bụ nke gosiri mbọ ndịagha na-agba iji nweta ezi nchekwa na mpaghara ahụ.

  10. A ga-anwụchiriri Simon Ekpa ma kpee ya ike – Onyeisi ọrụ nchekwa na Naịjirịa

    Christopher Musa, onyeisi ndị ọrụ nchekwa na Naịjirịa na Simon Ekpa, onyendu otu alaka Ipob

    Ebe foto si, Defence Headquarters/Simon Ekpa/Twitter

    Onyeisi ọrụ ndị nchekwa na Naịjirịa bụ Ọchịagha Christopher Musa ebola mba Finland ebubo na ha na-ekpuchi Simon Ekpa bụ onyendu otu alaka Indigenous People of Biafra (IPOB).

    Musa kwuru nke a n’ọgbakọ nchekwa nke ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV haziri maka ncheta afọ 25 ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa malitere.

    Ọ katọrọ agwa ndị otu IPOB na-eme na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nke Naịjirịa, ma kpọọ oku ka a nwụchie ma kpee Simon Ekpa ikpe.

    Ọ kpọkuru gọọmentị Naịjirịa ka ha kpebie ihe ha ga-eme iji kwụsị mpụ onyendu otu alaka IPOB a na-eme, nke gụnyere iji usoro mkparịtaụka mba na mba ibe ya.

    “Anyị emeela mkpesa ugboro ugboro maka Simon Ekpa. Ọ nọ na mba Finland, gọọmentị mba ahụ na-akwado ya n’ụzọ ọbụla ka ọ na-eme ihe ndị ọ na-eme, “

    “Okwu ndị ọ na-ekwu na-ebute ogbugbu ndị mmadụ mana onweghi ihe a na-eme maka ya. Ihe a bụ ọchịchị onye kwuo uche ya. Ọ bụru na European Union na-akwado ọchịchị onye kwuo uche ya, ihe ndị a na-eme mana onweghi ihe ha na-eme, ha achọghị ọdị mma Naịjirịa.

    “Anyị ekwuola ya ka o doo anya. Anyị kwesịrị ịchọ ụzọ mkparịtaụka a ga-eji nwụpụta ya n’ihe ọbụla ọ na-eme. E ga-anwụchi ya ma kpee ya ikpe.

    “Lee ya anya n’ụzọ ọzọ, ọ bụrụ na ọ nọ na Naịjirịa na-eme gọọmentị Finland ihe a, i cheere na mba European Union ga-agba nkịtị ka ọ na-eme? Ha agaghị ekwe.”

    Skip YouTube post
    Hapụ Google YouTube ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na Google YouTube. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Google YouTube iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ. YouTube mgbasaozi azụmaahịa nwereike ịdị na ya

    End of YouTube post

  11. Ihe karịrị mmadụ 80 anwụọla n'ụgbọmmiri kpuru na mba DR Congo

    Ndị nọ n'ụgbọmmiri na-eme njem

    Ebe foto si, AFP

    Ihe karịrị mmadụ 80 anwụọla mgbe ụgbọmmiri kpuru na mba Democratic Republic of Congo dịka onyeisiala ha si kwuo

    Mkpa mkpa a mere n’ụbọchị Wenezde n’osimmiri a kpọrọ ‘Kwa River’ dị nso n’obodo Mushie nke mpaghara Mai-Ndombe na-agbata okeala Congo-Brazzaville.

    Onyeisiala mba ahụ bụ Félix Tshisekedi n’ozi o wepụtara n’akara soshal midia X, kwuru na “obi agbawaala” ya.

    Félix kwuru na ndị o metụtara ga-enweta enyemaka, ma nye iwu ka e mee nyocha ịchọpụta ihe kpatara ya.

    “Ana m akpọ oku ka e me nyocha, chọpụta ihe kpatara mkpa mkpa ahụ ka anyị nweeike igbochi ya n’ọdịnihụ”.

    Ihe mgberede ụgbọmmiri na-eme ugboro-ugboro na mba DR Congo, mana ụgbọmmiri ha na-eju eju karịa, ebe ndị na-aba

  12. India mmadụ 40 so n'ime mmadụ 49 nwụrụ n’ọkụ gbara ụlọelu na Kuwait

    Ụlọelu gbara ọkụ na Kuwait, ebe mmadụ iri anọ na itoolu nwụrụ

    Ebe foto si, Reuters

    Mịnịstrị na-ahụ maka ndị India nọ na mba ofesi ekwuola na mmadụ iri anọ bụ ụmụafọ ha so na mmadụ iri anọ na itoolu nwụrụ anwụ n’ọkụ gbara n’ụlọelu na mpaghara Mangaf dị na mba Kuwaiti.

    Ọkụ gbara ụlọelu ahụ bụ ebe ọtụtụ ndị ọrụ ji mere ebe obibi n’ụbọchị Wenezde.

    Praịm Mịnịsta mba India bụ Narenda Modi jị akara soshal mịdịa na X wee zigara ezinaụlọ o metụtara ozi iti aka n’obi.

    N’ozi ahụ “Ọkụ ahụ gbara na Kuwait bụ ihe obi mgbawa”.

    “Obi m nonyere ezinaụlọ bụ ndị mmadụ nwụnahụrụ ma na-ekpee ekpere ka ndị merụrụ ahụ gbakee ngwa ngwa”.

    O kwuru na mba India na Kuwait jịkọrọ aka ọnụ na-ahazi ihe niile gbasara ọnwụ ndị ahụ.

    Kirti Vardhan Singh bụ osote praịm mịnịsta n’India, onye gara na Kuwait n’ụtụtụ Tọzde kwuru na e meela nyocha DNA iji mara aha na njirimara ndị a hụrụ ozu ha.

    “Ụgbọelu ndịagha anyị nọ n’akụkụ. Oge ọbụla anyị chọpụtara aha na ndị anyị hụrụ ozu ha , anyị ga-agwa ezinaụlọ ha ma bulata ozu ha”.

    Osote Praịm Mịnịsta ndị Kuwait bụ Sheikh Gahad Yusuf al-Sabah kwuru na onye nwe ụlọ ahụ gbara ọkụ dara ụsọrọ e ji arụ ụlọ bụ nke kpatara ọkụ ọgbụgba ahụ.

    “Ọ bụ anya-ukwu onye nwe ụlọ ahụ kpatara mkpamkpa ahụ. Ha dara iwu”.

  13. Igbo ndị ọma, unu abọọla chi?

    Anyị nabatata unu n'ọgbakọ anyị n'ụbọchị taa.

    Bia gere akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ọbaozi anyị bụ BBC Igbo

  14. Ihe mberede okporoụzọ egbuola mmadụ abụọ n’Enugu steeti

    Foto ihe mbere na njirimara FRSC

    Ebe foto si, FRSC/EYEWITNESS

    Nkọwa foto, Foto ihe mberede

    Ihe mberede okporoụzọ mere na mpaghara Ugwu Onyeama dị n’okporoụzọ si Enugu gawa Onitsha, egbuola mmadụ abụọ n’Enugu steeti.

    Ozi BBC Igbo nwetara nke si n'aka Adeyemi Sokunbi, onyeisi ụlọọrụ na-echekwa ime njem okporoụzọ bụ 'Federal Road Safety Corps FRSC' na steeti ahụ mere ka a mata na ya bụ ọdachi mere mgbe ọtụ ụgbọala ‘Trailer’ bu mmanụ kerozin kwụpụrụ n’ụdọ wee kụkpọ ụgbọala isii ndị ọzọ nọ n’ebe ahụ.

    Sokunbi kwuru na n’ime mmadụ 29 ihe mberede ahụ metụtara, na mmadụ abụọ nwụrụ.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ha bugara mmadụ 10 merụrụ ahụ n'ụlọọgwụ Parklane nakwa ụlọọgwụ Orthopaedic dị na steeti ahụ maka nleta.

    Sokunbi gara n’ihu kwupụta na mpaghara Ugwu Onyeama bụ ebe ihe mberede okporoụzọ na-emekaari.

    O kwuru na ọ bụ oke oso ndị ọkwọ ụgbọala na-ebute ihe mberede n'ebe ahụ.

  15. Mba Senegala amalitela imepụta mmanụ agbidi nke mbụ ya

    Senegal esorola na mba ndị na-emepụta mmanụ agbidi

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala mba Senegal bụ Bassirou Diomaye Faye ekwuola na ha ga-echịkwa ego e nwetere site n’ire mmanụ ọfụma dịka mba amalitela ịrụpụta mmanụ agbidi na nke bụ ya.

    Ụlọọrụ mba Australia na-egwupụta mmanụ a kpọro Woodside kọwara ngwụpụta mmanụ ahụ dịka nnupkwu ụbọchị nakwa ezi nturuugo nye ụlọọrụ ha.

    Atụmatụ ọru ahụ a kpọrọ ‘Sangomar deep-water’ nwekwara mmanụ gaasị ka a na-atụ anya ị na-enwete ihe ruru udu mmanụ otu narị puku (100,000 barrels) kwa otu ụbọchị.

    A na-atụ anya na ọ ga-amụtara mba Senegal ọkpụrụkpụ ego na dọla, nke ga-anye aka iwulite akụnaụba ha.

    Thierno Ly, onyeisi ụlọọrụ mmanụ agbidi a kpọrọ Petrosen, kwuru na ugbua na mba ahụ abanyela n’agba ọhụrụ.

    “Anyị ewerela ezi ọnọdụ n’ohere maka otuto, nwogharị nakwa ọganihu nke akụnaụba na mmepe obodo anyị,” ka o kwuru.

    Ụlọọrụ Petrosen nwere pasentị 18 n’ego ọbụla pụtara n’ọrụ ahụ ebe ụlọọrụ Woodside nwere pasentị fọrọ afọ.

    Onyeisiala Faye banyere n’ọchịchị n’ọnwa Eprel na-agba mbọ inwe mkparịtaụka maka etu azụmaahịa mmanụ ahụ ga-esi adị bụ ihe o kwere na nkwa mgbe ọ na-azọ ọchịchị.

  16. Ihe mberede okporoụzọ ataala isi mmadụ atọ n’Anambra steeti

    Ụgbọala nwere ij=he mberede

    Ebe foto si, FRSC Anambra Command

    Ihe mberede ataala isi mmadụ atọ, ebe mmadụ isiii merụrụ ahụ na mpaghara dị iche iche n’ Anambra steeti.

    Otu nwoke nwụrụ na ihe mberede mere n’ụbọchị Tuzde(11/6/2024) n’ebe Nteje n’okporoụzọ si Ọka gawa Ọnicha metụtara ụgbọala kanka ‘Mack’ bu akara LSD760X na ụgbọala Toyota Camry with bu akara JRV358HK.

    Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ụgbọala abụọ ahụ nọ na nnukwu ọzọ,ụgbọọala Camrychọrọ ịgbafe tanka,, tanka were kụọ ya banye ọhịa.

    N’otu aka ahụ , ụmụnwaanyị abụọ nwụrụ, ebe mmadụ ise ndị ọzọ merụrụ ahụ na Obinetiti Ọkụzụ n’ebe Okporoụzọ si Ọnicha -Nteje gawa Oka n’ụbọchị Tuzde.

    Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ụgbọala tanka kopụrụ n’ụdọ gaa suo ụgbọala Toyota Diana ‘truck’.

    Ụlọọrụ na-ahụ maka nchekwa na njem okporoụzọ bụ FRSC n’ịchafụ kwuru na ọ bụịgba oke ọsọ nakwa ịgbali ịgafe ụgbọala ọzọ n’ihu n’ụzọ ekwesịghị ekwesị butere ihe mberede ahụ.

    Ha kwuru na ebugara ndị merụrụ ahụ ụlọọgwụ ma donye ndị nwụrụ anwụ n’ụlọ ozu.

    Onyeisi ha bụ Corps Commander Adeoye Irelewuyi dọrọ ndị ọkwọụgbọala aka na ntị ka ha na-erube isi n’iwu metụtara ịgba n’okporoụzọ.

    Cheta na otu nwaanyị nwụrụ na ihemberede mekwara n’ out re na Ukpo Junction n’okporoụzọ e si Onicha gawa Nteje-Oka n’abalị 10 nke ọnwa Juun,

    Nke a mere dịka ụgbọala Toyota Delica nwere akara’NZN116LK na ụgbọala Toyota Diana, nwere akara ACA529XA zukọtara onwe ha.

    Ụgbọala nwere ihe mberede

    Ebe foto si, FRSC

  17. Joe Biden ekwuola na ọ gaghị itinye ọnụ n’ikpe a mara nwa ya maka mpụ ibu egbe

    Onyeisiala Joe Biden na nwa ya bụ Hunter Biden makọrọ onwe ha.

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden ekwuola na ọ ga-akwanyere ikpe ahụ a mara nwa maka mpụ ibu egbe.

    Ndị nnycha ebubo a kpọrọ jury dị mmadụ 12 kwuru na ikpe maara Hunter Biden dị afọ 54 maka na ọ tụrụ asị banyere ahụike ụbụrụ ya n’ime akwụkwọ o dere maka inwete ikike ịzụ egbe n’afọ 2018.

    Ịga mkpọrọ cheere ya n’ihu site n’ikpe ahụ, nke ga-abụ mbụ a na-ama nwa onyeisiala mba Amerịka ikpe maka mpụ.

    Ikpe a maara ya na-abịa dịka Onyeisiala Biden na-achụ nta vootu maka ịbụ onyeisiala ọzọ n’ọnwa Nọvemba, ebe a mabuloa Donald Trump na-ama aka ikpe maka ime mpụ na New York.

    Onyeisiala Biden agaghị n’ụlọikpe mana ọtụtụ ndị ezinaụlọ ha gụnyere nwunye onyeisiala bụ Jill Biden gara n’ụlọikpe. Nwunye Hunter Biden na nwanne ya nwoke nọkwa n’ụlọikpe.

    Onyeisiala Biden mechara gaa na Wilmington, Delaware mgbe e kpechara ikpe ahụ, kelee ma makụọ nwa ya nwoke n’okporoụzọ ọdọụgbọelu.

    “Abụ m onyeisiala, ma bụrụkwa nna. Mụ na Jill hụrụ nwa anyị n’anya nakwa, obi juru anyị afọ n’etu o si too ma bụrụ dimkpa nwoke,” ka o kwuru. Biden gbakwụnyere na “m nabatara mpụtara ikpe ahụ ma...m ga-aga n’ihu na-akwanyere ụlọikpe anyị ugwu dịka Hunter ga-agbagha ikpe ahụ”.

    Onyeisiala Biden dị mbụ kachapụ echiche ịgbaghara nwa ya bụ onye ebubo mpụ bụ ihe mmechu ihu nye ha dịka ndị nyocha ikpe na-achọ igosi na ọ nọ na-aṅụ ọgwụike mgbe o tinyere akwụkwọ ikike ịzụrụ egbe.

    Ha jụrụ onye bụbu nwunye ya Kathleen Buhle na enyi ya nwaanyị Zoe Kestan bụ ndị gbara akaebe na o nwere nsogbu ịṅụ ọgwụike bụ nke metụtara ezinaụlọ ya nakwa ndị enyi ya.

  18. Otti akwụsịtụla kọmishọna na-ahụ maka ahụike ọrụ n’Abịa steeti

    Alex Otti

    Ebe foto si, Alex Otti/Instagram

    Aka na-achị Abịa steeti bụ Alex Otti enyela nkwado ka a kwụsitụ kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Dr. Ngozi Okoronkwo ọrụ.

    Nke a dị n’ozi kọmịshọna mgbasaozi Abịa steeti bụ Okey Kanu tinyere aka na ya n’ụbọchị Tuzde 11 Juun 2024.

    Dịka Kanu siri kwuo, nkwụsịtụ ọrụ ahụ bụ iji nye ohere ka e mee kọmịshọna ahụ nnyocha n’ihi ebubo ajọ akparamaagwa e boro ya.

    Ozi ahụ siri na ya bụ mkpebi dabara n’atụmatụ Gọvanọ Otti ịhụ na ndị ahọpụtara n’ọkwa rụrụ ọrụ ha oge niile maka ọdịmma ụmụafọ Abịa.

    Ka o siladị a gwala odeakwụkwọ ukwu nke mịnịstrị ahụịke Abịa steeti bụ Dr. Ifeyinwa Kalu na onye ndụmọdụ pụrụiche gọvanọ n’okwu metụtara ahụike bụ Dr. Ngozi Azodo ka ha na-elekọta mịnịstrị ahụ ruo mgbe e mechara nnyocha gbasara ebubo ahụ e boro Dr. Okoronkwo.

  19. Ndị ojiegbe agbagbuola ndị uweojii abụọ n’Imo steeti

    Aboki Danjuma

    Ebe foto si, Henry Okoye/X

    Ndị ojiegbe amatabeghị ndị ha bụ egbuola ndị uweojii abụọ na otu mmadụ nkịtị n’Akabọ dị n’okpuruọchịchị Ikeduru n’Imo steeti.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye kwupụtara nke a n’otu ozi o wepụtara n’aha kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Aboki Danjuma.

    Dịka o siri kwuo, njinji ahụ jiri n’ụtụtụ Tuzde 11 Juun 2024 n’oge ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu IPOB na ESN wakporo ebe ndị uweojii na-enyocha ndị mmadụ ma malite ịgba egbe aghara aghara.

    Ọ sịrị na ndị uweojii gbara nnukwu mbọ iguzogide ndị ekperima ahụ mana mmadụ abụọ n’ime ha tụfuru ndụ ha tinyekwara otu onye nkịtị na-agafe agafe.

    O kwuru na kọmịshọna ndị uweojii Imo steeti edurula ndị uweojii gaa n’ogbe ahụ iji were anya ya hụ ka ebe ahụ dị ma nye iwu ka ha gbaa mbọ chọpụta ndị aka ha dị na mwakpo ahụ.

  20. Ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ: Ndị ọrụ ga-echere mkpebi onyeisiala - Ajaero

    Otu jikọtara ndị ọrụ Naịjirịa na-eme ngagharịiwe

    Ebe foto si, Nigeria Labour Congress/X

    Onyeisioche otu jikọtara ndị ọrụ Naịjirịa bụ Joe Ajaero ekwuola na ndị ọrụ ga-echere mkpebi Onyeisiala Bola Tinubu gbasara nkwekọrịta otu kọmitii na-ahụ maka ụgwọọnwa opekatampe.

    Ajaero kwuru nke a na Geneva mba Switzerland n’oge nnukwu ọgbakọ otu jikọtara ndị ọrụ na mbaụwa.

    Ọ sịrị na ndị ọrụ agaghị amalite mfanyeakanụụkwụ ruo mgbe onyeisiala mere ka a mata ebumnoobi ya gbasara nkwekọrịta ahụ e chere n’ihu ya maka ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ.

    Cheta na gọọmenti kwere nkwa ịkwụ ndị ọrụ puku naịra iri isii na abụọ (N62,000) dịka ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ ebe ndị ọrụ na-achọ ka akwụọ ha narị puku naịra abụọ na iri ise (N250,000).