Etu e si gbaara ụmụafọ Naịjirịa 103 ụgbọ nwamkpị site na mba Turkey

Akụkọ kwuru na otu onye Fada so na ndị nwụrụ na mwakpo ahụ

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Chinonso Ugorji, Jessica Nwankwo, Uche Akolisa, Michael Ngene, Michael Ilediagu

  1. Julian Assange atụọla ụkwụ n'Australia dịka nwoke nwere onwe ya

    Julian Assange enwerela onwe ya

    Ebe foto si, Reuters

    Julian Assange atụọla ụkwụ na mba ya bụ Australia dịka nwoke nweere onwe ya mgbe o si n'ụlọ mkpọrọ dị na mba Briten pụta.

    Ihe onyonyo esetere n'ọdọụgbọelu Canberra gosiri ebe ọ susuru nwunye ya ma makụọ nna ya dịka ndị ọkaiwu ya kwụrụ na-ele ha.

    Nwunye ya bụ Stella Assange mechara gwa ndị ntaakụkọ ka enye ya ohere ịnweta onwe ya dịka ọ sị "Julian kwesiri ịnweta oge ịchọpụtakwa ka mmwereonwe si atọ"

    Kemgbe afọ 14 gara aga ka Assange malitere ụlọọrụ Wikileaks na-agba mgba ịgbapụta onwe ya n'aka gọọmentị mba Amerịka boro ebubo ịgba atụmatụ nchekwa obodo ha n'anwụ.

    Julian n'onwe ya abịaghị ọgbakọ ndị ntakụkọ ahụ kama ọ hapụrụ nwunye ya na ndị ọkaiwu ya ka ha zara ajụjụ n'ọnụ ya.

    Stella na Julian lụrụ onwe ha n'afọ 2022 n'ụlọ mkpọrọ dị na Belmarsh mba Briten ma mụọ ụmụ abụọ.

  2. Etu nwaanyị dị ime si tụọ asị na ndị ntọ tọrọ ya

    Afọ nwaanyị dị ime

    Ndị uweojii Ogun steeti ekwuola na akụkọ nwaanyị dị ime ndị ntọ tọọrọ bụ adigboroja dịka nwaanyị ahụ tụrụ asị maka etu a sị tọrọ ya.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Omolola Odutola kwuru nke a n'akara soshal midia ya n'ụbọchị Monde.

    Odutola sị na ime pụrụ nwaanyị ahụ nke mere ka ọ gbalaga n'ebe di ya nọ n'ihi na ime apụọla ya ụfọdụ mgbe nke mere ka ụjọ jide ya nke ugbua.

    "Nwaanyị ahụ bụ Mrs Lateef gbagara Kwara steeti ma mechaa laghachite Abeokuta ebe nna ya so ya" ka o kwuru.

    Ndị uweojii sị na nwaanyị ahụ na-anata ọgwụgwọ ugbua.

  3. Ihe mberede okporoụzọ ataala isi mmadu asaa n'Abia

    Ụgbọala nwere ihe mberede n'okporoụzọ n'Aba,Abia steeti

    Mmadụ asaa anwụọla, ebe mmadụ ise merụrụ ahụ dịka ọdachi ihe mberede kpọtụrụa n' Ụkpakiri, n'Okpuru ọchịchị Obingwa ebe okporoụzọ 'Ikot Ekpene Road' n' Abia steeti.

    Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na o mere dịka ụgbọala Sienna nke ụlọọrụ 'Akwa Ibom Integrated Transport' na otu ụgbọala 'tipper' bu aja zukọtara isi . Onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ kwuru na ndị nile nọ n'ime ụgbọala ahụ nwụrụ. Ka ọ dị ugbua , a mabeghị ihe butere ọdachi ahụ.

    ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Maureen Chinaka kwuru na ọ bụ mmadụ abụọ nwụrụ n'ezie, ebe mmadụ ise merụrụ ahụ.

    Ọ gara n'ihu kwuo na e bugara ndị nile nwụrụ anwụ n'ụlọ ozu, ebe e bugara ndị merụrụ ahụ ụlọọgwụ,dịka ndịuweojii na-aga n'ihu ime nnyocha ihe butere ya bụ ọdachi.

    Ụgbọala 'Tipper'
  4. Atọhapụla Julian Assange dịka ọ nọchara afọ ise na nga

    Julian Assange

    Ebe foto si, Getty Images

    Dịka ọtụtụ afọ gachara, onye hibere ụlọọrụ Wikileaks akpọrọ Julian Assange ahapụla mba Briten gawa ebe mba Amerịka ga-ekpe ya ikpe.

    E boro Assange ebubo ikpa nkata ịchọpụta ma kwupụta atụmatụ nchekwa obodo nke mba Amerịka.

    Mana Assange na onwe ya na-ekwusi ike na atụmatụ ndị ahụ o ji (metụtara agha Afghanistan na Iraq) bụ ndị tinyere ndụ ndị mmadụ na nsogbu.

    Cheta na kemgbe afọ ise gara aga, Assange nọ n'ụlọ mkpọrọ mba Briten ebe o si agba mbọ ịhụ na ezichighaghi ya mba Amerịka iji kpe ya ikpe.

    Mana ụlọntakuko CBS na-ekwu ugbua na nkwekọrịta Assange na gọọmentị mba Amerịka nwere kwuru na agaghị atụ ya nga kama otu abalị ma o kweta na ikpe mara ya.

    Ụlọọrụ ya bụ Wikileaks kwuru n'akara X ha na Assange esila n'ụlọ mkpọrọ Belmarsh pụọ n'ụbọchị Monde ma si ebe ahụ gawa ọdọụgbọ elu Stanstead n'ehihie ebe "banyere ụgbọelu si mba UK pụọ".

    Ihe onyonyo ekesara gosikwara Assange ebe ọ nọ n'ime ụgbọala tupu ọ gawa Stanstead mana BBC achọpụtabeghi ma ọ bụ eziokwu.

    Nwunye ya bụ Stella Assange kelere ndị nkwado ya maka etu ha si gbaa mbọ afọ kwuru afo ịhụ na nke a bịara na mmezu.

    Nkwekọrịta ahụ ya na gọọmentị Amerịka nwere ga-ebi n'ụlọikpe dị na mba Mariana Islands n'ụbọchị Wenzde bụ June 26.

  5. Ọtụtụ ụmụaka nọ n’agụụ na Sudan – UNICEF

    Ọtụtụ ụmụaka nọ n’agụụ na Sudan – UNICEF

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisi ngalaba otu mbaụwa na-ahụ maka ụmụaka bụ UNICEF n’ịchafụ Bekee ekwuola na Sudan bụ otu n’ime mba ndị kachasị njọ maka ụmụaka.

    Catherine Russell kwuru na Sudan abụrụla mba kachasị nwee ọnụọgụ ụmụaka gbapụrụ n’ụlọ dịka nde kwuru nde n’ime ha bụ ndị anaghị eriju afọ ma bụrụkwa ndị anaghị aga akwụkwọ.

    Akụ ihe oriri mba Sudan adakpọọla dịka otu abụọ na-ebuso onwe ha agha bụ ndịagha Sudan na otu nchekwa a kpọrọ Rapid Support Forces (RSF) na-egbochi mbubata ngwa enyemaka ndị a chọsiri ike.

    Ụmụaka bụ ndị ọnọdụ agụụ kachasị emetụta, ka Russell gwara BBC oge ọ na-aga Nairobi. Ọ sịrị na nde itoli anaghị enweta nri zuru oke mgbe niile ebe ihe ruru nde anọ anaghị enweta akụrụngwa ndị ahụ ha chọrọ nke ọma.

    Ọ sịrị “o teela aka mgbe anyị kwesịrị ime ihe. Anyị kwesịrị ime ihe ugbua, ma ọ bụghị ya ihe akawanye njọ.”

  6. Mmadụ 19 anwụọla na mwakpo ụlọụka Dagestan dị na mba Rọshịa

    Ihe onyonyo gosiri ebe ihe ahụ mere.

    Ebe foto si, Screenshot/BBC

    Ihe ruru mmadụ iri na itoolu anwụọla na mwakpo e mere n'akụkụ Dagestan dị na mba Rọshịa.

    Na mwakpo ahụ nke mere n'ụbọchị ụka, ụlọụka abụọ, otu ụlọ ekpere ndị juu nakwa ụlọorụ ndị uweojii so n'ebe ndị awakporo n'obodo kachasị ukwu nke Dagestan bụ Mackhachkala.

    Akụkọ na-ekwu na ndị bu egbe kpara mkpa mkpa ahụ kpara nkata ime ya tupu o mezuo.

    Onyeisi mpaghara ahụ bụ Sergei Melikov kwuru na a ma ndị kpara ya bụ nkata mwakpo mana o nweghi onye ọ tụrụ aka maọbụ kpọọ aha.

    Melikov gara n'ihu kwuo na ọtụtụ ndị nkịtị nwụrụ nke gụnyere Fada Nikolai Kotelnikov bụ onye bi n'obodo Derbent kemgbe afọ iri anọ gara aga.

    Amanyela abalị atọ iji rụ ụjụ ga-amalite n'ụbọchị Monde.

    Amabeghi ndị bụ ndị ojiegbe mere ihe ahụ kpọm kwem mana n'ihe onyonyo, Melikov kwuru na mwakpo ahụ bụ nke akpara nkata ya n'ofesi ma kwukwa na ugbua Dagestan esonyela n'agha dị n'etiti Rọshịa na Yukren.

    "Anyị ghọtara ndị kpara nkata iyi ndụ egwu a nakwa ihe ha bu n'uche mgbe ha kpara ya" ka o kwuru

    Otu onye ọnụ na-eru n'okwu na mba Yukren bụ Dmitrty dọrọ aka na ntị na a tụọ mwakpo niile aka na o si na Yukren na Nato, ọ ga-ebute nsogbu ukwu n'ọdịnịhụ.

    Eserese gosiri Dagestan ebe ihe ahụ mere
  7. Ndịagha ebibiela ụgbọmmiri 14 eji ezu ohi mmanụ n’Abia steeti

    Onyeisi ndịagha 82 Division Enugu

    Ebe foto si, Nigerian Army

    Ndịagha Naịjirịa eburula ụgbọmmiri iri na anọ (14) na ọtụtụ ite mmanụ agbịdị anapụtara ndị na-ezu ohi mmanụ n’Isimini Waterside dị n’okpuruọchịchị Ukwa West nke Abịa steeti.

    Onyeisi ndịagha 82 Division Enugu bụ Major Gen. Hassan Dadda, onye duuru ndị ọrụ ya gaa na mpaghara ahụ kwuru na ha kweere ndị ohi mmanụ ahụ ọnya mkpụrụụbọchị ise tupu enweta ha.

    Dịka Dada siri kwuo, a nwụchiri mmadụ isii a na-enyo enyo ma nyefee ha n’aka ndị Civil Defence maka ime nnyocha nakwa ịkpọpụ ha n’ụlọikpe.

    N’oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu, Dada sịrị na ụgbọmmiri asatọ n’ime iri na anọ ahụ e jichiri ejichi bụ nnukwu ụgbọmmiri Cotonou ebe ndị nke ọzọ bụ ndị obere.

    O kwuru na ha amatala onyendu ndị ohi mmanụ ahụ riri mbọmbọ ma ṅụọ iyi na ndị ọrụ ‘Udo Ka’ agaghị enye ohere maka ndị omekome na-akụnyere ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa ụkwụ.

    Ụgbọmmiri ndị e ji ezu ohi mmanụ n'Abia steeti

    Ebe foto si, Nigerian Army

  8. EFCC anwụchiela mmadụ 2 na-arụbu n’ụlọakụ maka izuru ego n’akpaego onye nwụrụ anwụ

    Mmadụ abụọ ndị anwụchiri maka izuru ego n'akpaego onye nwụrụ anwụ

    Ebe foto si, EFCC/Facebook

    Nkọwa foto, Mmadụ abụọ ndị anwụchiri maka izuru ego n'akpaego onye nwụrụ anwụ

    Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụakaego na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) anwụchiela mmadụ abụọ bụbu ndị ọrụ n’ụlọakụ Union Bank dị na Makurdi maka izu nde naịra anọ, otu narị puku naịra na iri itoli na itoli na narị naịra ise (N4,199,500) n’akpaego onye nwụrụ anwụ.

    Nke a dị n’ozi EFCC wepụtara n’akara ọbaozi Facebook ya n’ụbọchị ụka Sọnde 23 Juun 2024.

    Dịka ha siri kwuo, a nwụchiri mmadụ abụọ ahụ a na-enyo enyo bụ Idah Ogoh na Agbo Okwute n’isi obodo Benue steeti bụ Makurdi n’ụbọchị Fraịde 21 Juun 2024 n’isochi mkpesa ụlọakụ ahụ nyere gbasara ego ha wepụrụ n’akpaego otu nwoke nwụrụ anwụ bụ Emmanuel Azer Agenna.

    Ụlọakụ Union Bank chọpụtara nrụrụaka mmadụ abụọ ahụ n’oge ezinaụlọ Emmanuel nwụrụ anwụ nyere mkpesa banyere ego ndị a na-ewepụ n’ụzọ na-ezighị ezi n’akpaego ya.

    Dabere na mkpesa ahụ, ya bụ ụlọakụ mere nnyocha ma chọpụta na otu onye ọrụ ụlọakụ ahụ bụ Ifah Ogoh jiiri akara ọbaego nwoke ahụ nwụrụ anwụ were kaadị ndọrọego bụ debit card n’abalị 10 Mee 2023.

    Ya bụ nnyocha gara n’ihu chọpụta na Ogoh weere kaadị ahụ nye onye ọrụ ibe ya bụ Agbo Okwute bụzi onye gara nye ya onye otu ha maka ịdọrọ ego n’akpaego nwoke ahụ nwụrụ anwụ.

    Ka osiladị, a ga-akpọpụ mmadụ niile ahụ a na-enyo enyo n’ụlọikpe ozugbo ndị uweojii mechara nnyocha.

  9. Ihere mee ekwensu, anyị ga-arụgharị ụlọụka ọzọ - Chris Oyakhilome

    Pastor Chris Oyakhilome hibere ụlọụka Believers Love World a ma dịka Christ Embassy

    Ebe foto si, Screenshot/Supplied

    Onye hiwere ụlọụka Christ Embassy bụ Pastor Chris Oyakhilome agwala ekwensu ka ihere megbuo ya.

    Chris Oyakhilome kwupụtara nke a oge ọ na-ekwu okwuchukwu n’ụbọchị ụka Sọnde 23 Juun 2023 dịka ọkụ gbachara ụlọụka ya n’ụzọ ụtụtụ.

    Ọ gara n’ihu kwuo na enweghị ihe na-eme nwa Chukwu na mberede n’ihi na Chineke nwere atụmatụ gbasara ihe ọbụla mere nwa ya.

    O kwuru sị “anyị ga-ekpocha ma zachaa ebe ahụ, rụọ ụlọ nke mara mma karịa; ọ bụ ihe anyị ga-eme. Ihere megbuo ekwensu.”

    “Anyị kwesịrị iji anya ime mmụọ lebara ndụ anya. Nke a abụghị ihe ị ga-akpọ ihe mberede n’ihi na anyị abụghị mmadụ nkịtị; anyị na-enweta enyemaka oge niile.”

    “Ọ gwara anyị sị ọbụladị mgbe anyị na-aga ije, anyị agaghị atụ egwu n’ihi na anyị agaghị akpọ ụkwụ na nkume maka na o nyewo ndị mmụọozi ya iwu banyere anyị.”

    “Nke ahụ pụtara na ihe ọbụla mere na ndụ gị dabara n’atụmatụ Chineke. Ihe mberede anaghị eme nwa nke Chukwu,” ka Chris Oyakhilome kwuru.

  10. Ọkụ na-agba ụlọụka Christ Embassy dị na Legọs ugbua

    Ndị ọrụ mmenyụọkụ

    Ebe foto si, Screenshot/Channels TV

    Akụkọ na-ewu ugbua bụ na ụlọụka ndị Christ Embassy nke dị n'ebe akpọrọ Oregun dị na Legọs na-agba ọkụ ugbua.

    N'ihe onyonyo ndị BBC Igbo hụrụ anya na-efegharị na soshal midia, ọkụ na-agba n'elu ụlọ dị ukwu na-acha ọcha nke gosiri foto onye nwe ụlọụka ahụ bụ Chris Oyakhilome n'ihu ya.

    A hụkwara ndị ọrụ mmenyụọkụ ebe ha na-agba mbọ ịkwụsị ya bụ ọkụ nakwa anwụrụ ojii so ya ifesa ebe niile.

    Dịka ihe si kwụrụ ugbua, a mabeghi ma o nwere ndị nwụrụ maọbụ merụọ ahụ na ya bụ ọkụ ọgbugba.

    Ụlọ ntaakụkọ Channels kwuru na ọkụ ahụ malitere ịgba kemgbe ụzụ ụtụtụ ụbọchị ụka.

    BBC Igbo ka na-agba mgbọ ịnweta ndị ọrụ mmenyụọkụ na ndị ọrụ gbatagbata nke Legọs steeti n'ekwentị mana ha azabeghi.

  11. E gburu mmadụ 22 n’ogbuniigwe a tụrụ n’akụkụ ụlọọrụ anyị dị na Gaza – Red Cross

    Ụgbọala International Committee of the Red Cross

    Ebe foto si, AFP

    Otu International Committee of the Red Cross (ICRC) kwuru na ogbuniigwe ebibiela ụlọorụ ha dị na Gaza ma gbuo mmadụ iri abụọ na abụọ (22) gbatara ọsọ ndụ na mbaraezi ha.

    Ozi sitere n’aka otu ICRC kwuru na “nnukwu ogbuniigwe dara na mbaraezi ụlọọrụ nakwa ebe obibi otu International Committee of the Red Cross n’ehihie Fraịde.”

    Ozi ahụ gbakwunyere na onye ọbụla nwere okenaọrụ ịkpachapụ anya iji hapụ iweta mbibi nye ndị mmadụ na akụrụngwa e ji enyere ndị mmadụ aka.

    Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ nchekwa Izrel gwara BBC na nnyocha e mere na mmalite gosiri na e nweghị ihe na-egosi na ọ bụ ha tụrụ ogbuniigwe na mpaghara ahụ ma gbakwunye na ha ka na-eme nnyocha banyere ya bụ ọnọdụ.

    Dịka ozi ICRC siri kọwaa, “ogbuniigwe ahụ bibiri ụlọọrụ ICRC nke ihe gbara ya okirikiri bụ ọtụtụ ndị gbara ọsọ ndụ nke gụnyere ndị ọrụ ha bụ ụmụafọ Palestine.”

    “Ọnọdụ ahụ e meela ka ọnụọgụ mmadụ ndị merụrụ ahụ rịa elu n’ụlọọgwụ Red Cross Field dị nso ebe ahụ dịka ya bụ ụlọọgwụ nabatara mmadụ iri abụọ na abụọ (22) e gburu egbu na iri anọ na ise (45) ndị merụrụ ahụ,” ka ICRC kwuru.

    ICRC kwuru na njinji ahụ bụ otu n’ime ọtụtụ ndị ọzọ a na-ahụta na nsonso a.

    Ka o siladị, mịnịstry na-ahụ maka ahụike na Gaza nke Hamas na-elekọta kwupụtara ọnụọgụ dị iche dịka ọ sịrị na e gburu mmadụ iri abụọ na ise (25) ma merụọ iri ise (50) ndị ọzọ ahụ na mwakpo ahụ ọ na-ebo Izrel.

  12. Ihe mere Gọọmentị Naịjirịa ji chọrọ ire ụgbọelu atọ nke ụlọọrụ onyeisiala ji eme njem

    Gọọmentị Naịjirịa chọrọ ire ụgbọelu onyeisiala ji eme njem

    Ebe foto si, Bola Ahmed Tinubu/Twitter

    Dịka ọtụtu ndị mmadụ na-akatọ atụmatụ ire ụgbọelu atọ ụlọọrụ onyeisiala Naịjirịa ji eme njem, gọọmentị apụtala ma kọwaa ihe mere ha ji chọrọ ire ụgbọelu ndị ahụ.

    Gọọmentị kwuru na ihe mere a ga-eji ree ụgbọelu ndị ahụ bụ na ha nwere nsogbu nke ga-efu ọtụtụ ego iji dozie ha.

    Onye enyemaka pụrụiche nke Onyeisiala Naịjirịa bụ Abdul’Azeez Abdul’Azeez gwara BBC na mgbe Onyeisiala Bola Tinubu weere ọchịchị na e nwere ụgbọelu isii n’obi ọchịchị nakwa helikọpta anọ.

    O kwuru “enwere otu nnukwu ụgbọelu onyeisiala na-eji eme njem ma nwekwaa ndị obere ise ọzọ, n’ime ụgbọelu ndị ahụ, ọtụtụ n’ime ha adịchaghị mma iji eme njem, ọkachasị na o teela aka a zụtara ha maọbụ nsogbu ha nwere nke ga-eri nnukwu ego iji rụzie ha.”

    “Ọ bụ n’ihi nke a mere ka Onyeisiala kwete na ọ ga-aka mma emezie ma ree ha.”

    Onye enyemaka pụrụiche nke Onyeisiala Naịjirịa kwuru na ọ bụ ụgbọelu atọ gụnyere nke onyeisiala ji eme njem ka a chọro ire.

    O kwuru “Ọ bụrụ na e ree ụgbọelu atọ ndị a, a ga-azụta ọzọ dị mma na-agaghị enye nsogbu.”

    Nke a na-abịa dịka otu kọmitii na-ahụ maka nchekwa n’ụlọomeiwu nta wepụtara atụmatụ ka a zụọ ụgbọelu abụọ, nke onyeisiala na osote onyeisiala.

  13. Agbagbuola otu onye mkpesa ‘anti tax’ na Kenya

    Onyeagha na-agba egbe

    Ebe foto si, a

    Ndị na-eme mkpesa megide ụtụisi na Kenya nọ na mwute dịka e gburu nwaokorobịa gbara afọ iri abụọ na itoli (29) n’oge a na-eme mkpesa megide iwu ụtụisi ọhụrụ ahụ.

    Onye Dọkịta gwara ndị ntaakụkọ na nwaokorobịa ahụ mere mkpesa na Nairobi ụbọchị Tọzde gara aga bụ Rex Kanyike Masai nwụrụ site na mgbọegbe a gbara ya.

    Ndị uweojii gbara ikuku na-afụ ose n’anya nakwa egbe mmiri n’ebe ndị ahụ na-eme mkpesa n’ụzọ udo nọ.

    Akụkọ kwuru na ndị mkpesa ahụ zọọrọ njem gaa n’akụkụ ụlọomeiwu Kenya, ebe ndị omeiwu na-arụrịtaụka maka atụmatụ e ji ewebata ụtụisi ọhụrụ.

    Amnesty International eboola ndị uweojii Kenya ebubo iji akaike achịkọta ndị na-eme mkpesa tinyere ịnwụchi ọtụtụ n’ime ha.

    N’oge mkpesa ahụ a kpọkwasara ‘Nọchie n’ụlọomeiwu’ maọbụ ‘Occupy Parliament’ n’asụsụ Bekee malitere n’ụbọchị Tuzde, akwa arịrị ụmụ mmadụ manyere gọọmenti ịwepụ ụfọdụ atụmatụ ndị na-akpalite nsogbu dịka ụtụisi pasenti iri na isii (16%) e tinyere n’elu achịcha nakwa ụtụisi pasenti abụọ na ụma ise (2.5%) e tinyere n’elu ụgbọ kwa afọ.

  14. E gbuola nwataakwụkwọ Alex Ekwueme Federal University Ebonyi steeti

    Magnus Okeke a tọọrọ ma gbuo na mahadum

    Ebe foto si, PRO Alex Ekwueme Federal University

    E gbuola nwataakwụkwọ nọ n’ogogo 400 na mahadum Alex Ekwueme Federal University Ndufu Alike Ikwo dị n’Ebonyi steeti bụ Magnus Okeke dịka atọchaara ya.

    Ozi sitere n’aka ọnụ na-ekwuru mahadum ahụ bụ Iyke Ubochi kọwara na nwataakwụkwọ ahụ furu n’abalị mbụ nke ọnwa Juun, afọ 2024 n’oge ọ na-alaghachi n’ebe obibi ya dị n’Ohankwu Ndufu-Alike.

    Ọ sịrị na ndịisi mahadum ahụ nọ kemgbe agbakọọrọ ndị uweojii na ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ aka iji napụta nwataakwụkwọ ahụ n’aka ndị tọọrọ ya mana ka e mesịrị, a chọtara ozu ya n’akụkụ iyi dị n’obodo ahụ.

    Dịka Ubochi siri kwuo, nnyocha ndị ọrụ nchekwa mere na-egosi na ọ bụ ndị omekoome si n’Ohankwu gburu Magnus Okeke nke onyendu ha bụ Ogobuchi Uhuo a maara dịka OG Royal.

    Ọ sịrị na ndị ọrụ nchekwa anwụchiela ụfọdụ ndị a na-enyo enyo aka ha dị n’arụ ahụ ma gbakwunye na a chọtara ozu nwataakwụkwọ ahụ na-ere ure n’ụbọchị Mọnde 17 Juun 2024 n’okpuru akwammiri iyi Ako dị na Nwakpu n’okporoụzọ siri Ikwo gawa Abakaliki.

    Onyeisi otu jikọtara ụmụakwụkwọ mahadum ahụ bụ Comrade Johnpaul Eze sịrị na enyi nwataakwụkwọ ahụ nwụrụ anwụ kwuru na enyi ya nwoke agbaghị isi akwara oge ndị ntọ jiiri ọgbaatumtum tọọrọ ya.

    Onye President General ndị obodo Ohankwu bụ Chibuike Igwe siri na ndị obodo ahụ na-agbakọọrọ ndị ọrụ nchekwa aka iji chọpụta ihe butere ya bụ ọnọdụ ọjọọ.

    Ka osiladị, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi steeti bụ Joshua Ukandu akọwaala ozi ahụ dịka eziokwu ma kwuo na adọnyela ozu nwataakwụkwọ ahụ nwụrụ anwụ n’ọbaozu ebe nnyocha na-aga n’ihu.

  15. Ọrịa otolo agbagbuola ihe karịrị mmadụ 37 na Naịjirịa – NCDC

    Ọrịa otolo malitere ịkpa ike ọhụrụ na Naịjirịa na mbido afọ 2024

    Ebe foto si, Gett

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ NCDC n’ịchafụ ekwuola na ọrịa otolo a na-akpa ike na Naịjirịa ugbua egbuo ihe karịrị mmadụ 37.

    E be ọrịa a kachasị akpa ike bụ na Legọs ebe mmadụ karịrị 401 ebutela ya dịka o gburula mmadụ 24, dịka onye ndụmọdụ gọvanọ Legọs n’okwu ahụike bụ Kemi Ogunyemi si kwuo.

    N’otu aka ahụ, kọmishọna ahụike n’Ogun Steeti bụ Tomi Coker kwuru na ọrịa a egbuola otu onye ebe mmadụ iri na anọ butere ya.

    Ụlọọrụ NCDC n’ozi ha wepụtara, kwuru na site n’ọnwa Jenụwarị ruo Juun na mmadụ 1,141 ka a na-enyocha butere ya ebe mmadụ karịrị 65 bu ọrịa a kpọmkwem. N’ime ndị a ihe karịrị mmadụ 37 anwụọla n’okpuruọchịchị 96 dị na steeti 30 na Naịjirịa.

    N’ihi etu ọrịa otolo a si na-akpa ike ugbua, ụlọọrụ na-ahụ maka ahụike n’ụwa bụ World Health Organisation na United Nations nwere ọgbakọ na Naịjirịa n’ụbọchị Tuzde.

    Ọrịa otolo bụ ọrịa na-esi na nje bacteria a na-akpa ‘vibrio cholera’ a na-esi na mmiri na nri.

    Ọrịa otolo na-ebu mmadụ ịnyị nsi mmiri mmiri nke nwereike igbu onye ahụ n’otu ntabi anya.

  16. Igbo ndị ọma ndewo nụ ooo!

    Igbo ndị ọma ekpere anyị taa bụ ka ụbọchị a maara gị na mma.

    Biko, bịa nọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

  17. Anyị nwere ike ịgba abụbụọrụ ma ndị otu anyị nwechaa nzukọ - Onyeisi ASUU

    ASUU

    Ebe foto si, ASUU/INSTAGRAM

    Nkọwa foto, ASUU

    Onyeisi otu jịkọrọ ndị nkuzi mahadum Naịjirịa bụ Academic Staff Union of Universities (ASUU), bụ Prof Emmanuel Osodeke ekwuola okwu banyere akụkọ na-efegharị na otu ASUU na-akwado ịgba abụbụọrụ.

    Mgbe BBC kpọtụrụ Osodeke iji chọpụta nke bụ eziokwu, ọ gwara nayị na ka ọ dị ugbua, ASUU na-achịkọta ndị otu ha niile na steeti niile iji nwe nkwkọrita tupu ha e mee ngaghariiwe iji mee ka gọọmenti nụ olu ha.

    O kwuru na ngaghariiwe ebidola na Kano na Sokoto ebe a na-atụ anya na e nwere ike ime ngaghariiwe ahụ na steeti ndị ọzọ.

    Ọ gara n’ihu kwuputa na “Ọ bụrụ na gọọmenti egeghị anyị ntị ka anyị mechara ngaghariiwe, anyị ga-akpọ nzuko iji chọpụta ka anyị a ga-agba abụbụọrụ.”

  18. Mmadụ 34 anwụọla n'India ka ha ṅụrụ mmaya na-egbu egbu

    Foto onye nọ n'ụlọọgwụ
    Nkọwa foto, Foto onye nọ n'ụlọọgwụ

    Ihe ruru mmadụ 34 anwụọla ka ha ṅụrụ mmaya ‘bootleg’ na-egbu egbu na steeti Tamil Nadu nke dị na ndịda India.

    Ya bụ ihe mere na mpaghara Kallakuruchi ebe ọtụtụ ndị obodo bidoro ịrịa ọrịa ka ha ṅụrụ mmaya na-egbu egbu n’abalị Tuzde.

    Akụkọ kwuru na mmadụ 80 na-enweta nleta n’ụlọọgwụ maka afọ ọsisa ebe ndị ọrụ na-ekwu na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ nwere ike ịgbagọ.

    Ndị ọchichị e kwuola na a kwusila otu onye uweojii na ndị ọrụ na-ebu agha megide ọgwụike na mmaya na-egbu egbu ọrụ.

    Ọtụtụ mmadụ na-anwụ n’India kwa afọ site n’iṅụ mmaya adigboroja na-egbu egbu.

    Ndị na-emepụta mmaya ahụ na-etinyekarị methanol - ụdị mmanya na-egbu egbu nke ukwuu a na-eji egbochi ihe ịkpọ nkụ - iji bulie ike ya.

    Ọ bụrụ na mmadụ rie ntakịrị methanol, o nwere ike ime ka ị kpuoo ìsì, imebie imeju, ike ọgwụgwụ, isi ọwụwa, ịgbọagbọ, afọ mgbu, anya ịkọọkọ ma ọ bụ ọnwụ.

    Mịnịsta Tamil Nadu bụ MK Stalin kwuru na a ga-enye ezinaụlọ ndị ahụ nwụrụ otu nde rupees “1million reupees” ma nye ezinaụlọ ndị nọ n’ụlọọgwụ puku rupees iri ise “50,000 reupees”.

  19. Ọnuego mmanụ ụgbọala ji 223 pasentị rịa elu Orji n’ime otu afọ - NBS

    Mmanụ Ụgbọala

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndekọ ndị ụlọọrụ a kpọrọ ‘National Bureau of Statistics (NBC)’ wepụtara kwuru na ọnụego mmanụ ụgbọala ji pasenti 223 rịa elu sị na N238.11 ruo N7770 kwa otu lita

    NBC mere ka a mata nke a na ndeko ha ji egosi etu mmanụ ụgbọala sị rịa elu nakwa steetị ọ kachasị adị elu.

    Na ndeko ahụ, mmanụ ụgbọala kachasị adala ọnụ na Jigawa Steeti bụ ebe a na-ere ya N937.50 kwa otu lita.

    Ndị ọzọ gụnyere Ondo Steeti bụ ebe a na-ere ya N882.67 nakwa Benue Steeti bụ ebe a na-ere ya N882.22 kwa lita.

    N’aka nke ọzọ, Lagos, Niger na Kwara steeti bụ ebe akachasị ere mmanụ ụgbọala ọnụala.

    A na-ere ya N642.16 na Lagos steeti, ebe ọ bụ N642.16 na Niger Steeti ma bụrụ N645.15 na kwara Steeti.

  20. Steeti Louisiana enyela iwu ka amagide iwu iri dị n'akwụkwọ nsọ n'ụlọakwụkwọ niile

    Jeff Landry bụ gọvanọ steeeti Louisianna tinyere aka n'akwụkwọ iwu ahụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Louisiana aburula steeti mbụ na mba Amerịka nyere iwu ka e tinye ịwụ iri dị n'akwụkwọ nsọ n'ụlọakwụkwọ ha niile dị na steeti ahụ site na ọtakara ruo mahadum.

    Gọvanọ steeti ahụ bụ Jeff Landry binyere aka ná akwụkwọ mere ịwụ ahụ ka ọ bụrụ iwu na ntọala gọọmenti ahụ.

    A na-atụ anya na ndị na-akwado ikike dịịrị mmadụ na otu ndị ọzọ ga-akpụpụ gọọmenti steeti ahụ n'ụlọikpe maka na iwu ahụ megidere iwu na-achị mba Amerịka mere ka e nwee ndịiche n'etiti gọọmenti na okpukperechi.

    Ịwụ ahụ kwuru na "ụlọomeiwu agaghị emepụta iwu ga-akwado okpukperechi ọbụla maọbụ machie mmadụ ikpere chi ya".

    Mana iwu ahụ na-ekwu maka iwu iri dị n'akwụkwọ nsọ kọwara ebe maọbụ etu a ga-esi magide ya n'ụlọakwụkwọ ndị a niile.

    Steeti dịka Texas, Oklahoma na Utah wepụtara ụdị iwu dị etu a n'oge gara aga.

    Mana n'afọ 1980, ụlọikpe ukwu kagburu iwu ndị dị etu na Kentucky mgbe a chọrọ ka a magide ụdị iwu ahụ n'ụlọakwụkwọ.

    E nwere ọtụtụ oge ndị mmadụ na ndị ọchịchị gara n'ụlọikpe maka magide akwụkwọ iwu iri nke dị n'akwụkwọ nso n'ụlọakwụkwọ, n'ụlọikpe nakwa ụlọọrụ niile ndị gọọmenti nwe.