Etu e si gbaara ụmụafọ Naịjirịa 103 ụgbọ nwamkpị site na mba Turkey

Akụkọ kwuru na otu onye Fada so na ndị nwụrụ na mwakpo ahụ

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Chinonso Ugorji, Jessica Nwankwo, Uche Akolisa, Michael Ngene, Michael Ilediagu

  1. Osote Onyeisiala Malawi, ndị ọzọ anwụọla n'ihe mberede ụgbọelu

    Saulos Chilima

    Ebe foto si, Saulos Chilima/X

    Osote Onyeisiala Malawi bụ Saulos Chilima na mmadụ itoolu ndị ọzọ anwụọla n'ihe mberede ụgbọelu dịka ụgbọelu agha ha nọ n'ime ya kpọkasịrị.

    A malitere chọwara ụgbọelu ahụ achọ na nso Ugwu dị n'ọhịa Chakangawa. ụbọchị Monde dịka ha na-aga akwamozu onye bụbu minista mba ahụ.

    N'ozi ya, Onyeisiala Malawi bụ Lazarus Chakwera kwuru na o nweghị onye nọ n'ụgbọelu ahụ ji ndụ ya pụta.

    A malitere chọwa ha ozigbo mana ọnọdụ ihu igwe mere ka okwu sie ike. Chilima na onyeisiala mba Malawi esighị otu pati mana ha jịkọrọ ọnụ dịka e mere ntuliaka mba ahụ afọ anọ gara aga.

  2. Ụlọikpe atụọla mmadụ atọ nga maka ịkpaso Vinicius Jose Jr oke agbụrụ

    Vinicius Jose Jr

    Vinicius Jose Jr na-agbara ndị Real Madrid bọọlụ ka ndị na-akwadọ otu egwu bọọlụ Valencia mesoro omume ịkpa oke agbụrụ.

    Nke a mere n’abalị 23 Mee 2023 n’ọgbọ egwuruegwu a kpọrọ Mestalla nke ndị Valencia.

    Ka ihe ahụ mechara, La Liga kpọpụrụ mmadụ atọ ndị na-akwadọ otu egwu bọọlụ valencia ụlọikpe ebe a mara ha ikpe ma tụọ ha nga ọnwa asatọ.

    Ụlọikpe machịrị mmadụ atọ ahụ ịbanye n’ọgbọ egwuruegwu nke La-liga maọbụ ebe ndị mba Spain na-agba bọọlụ rụọ afọ atọ, mana e mechara mee ya afọ abụọ.

    Ndị wegara okwu ahụ n’ụlọikpe bụ Vinicius Jr La Liga na Spanish Football Federation (RFEF).

    Onyeisioche La-Liga bụ Javier Tebas kwuru na ọ bụ ihe ga-enye aka ibuso ịkpa oke agbụrụ agha n’egwuruegwu bọọlụ ma nye aka iti Vinicius Jr aka n’obi.

    Ọ gara n’ihu kọwaa na nke ahụ ga-abụ ihe ịdọ aka na ntị dịịrị ndị na-aga n’ọgbọ egwuruegwu ịkpaarị ndị mmadụ.

    “La-liga ga-achọta onye ị bụ, kpọpụ gị ụlọikpe maka ntaramahụhụ ga-eso ya”.

    Ndị otu egwu bọọlụ Real Madrid kwuru na ha “ga ejisiike na-echekwa ihe njirimara ha, wepu ịkpa oke agbụrụ na ihe ịkpa oke ọbụla n’asọmpị bọolụ”.

  3. Sịnetọ Ned Nwoko ekwuola ka ekepụta Anịọma steeti n’ime South East

    Sịnetọ Ned Nwoko

    Ebe foto si, PRINCE NED NWOKO/X

    Nkọwa foto, Sịnetọ Ned Nwoko ekwuola ka ekepụta Anịọma steeti n’ime South East

    Onye omeiwu na-anọchiteanya Delta North n’ụlọomeiwu sịnet bụ Ned Nwoko na-ekwu na ya ewepụtala atụmatụ iwu maka ikepụta Anịọma steeti.

    N’ozi o bipụtara n’akara ọbaozi X ya n’ụbọchị Mọnde 10 Juun 2024, Sịnetọ Ned Nwoko sịrị na ebumnoobi atụmatụ iwu ahụ bụ idozi ihe e mebiri emebi.

    O kwuru na nkepụta Anịọma steeti dị ezigbo mkpa n’ihi na ọ ga-enye aka dozie ọnụọgụ steeti na-adịghị nhatanha na mpaghara Naịjirịa dị iche iche.

    Ọ sịrị na “mpaghara South East nwere naanị steeti ise ebe mpaghara ndị ọzọ nwere steeti isii n’otu n’otu ewezuga mpaghara North West nwere steeti asaa.”

    Dịka Ned Nwoko siri kwuo, ikepụta Anịọma steeti bara nnukwu uru iji hụ na ewetere ikpe nkwụmọọtọ nye ndị South East.

  4. Ndị omeiwu 35 akwadoola atụmatụ iwu maka naanị otu oge ọchịchị

    Ụlọomeiwu nnọchiteanya

    Ebe foto si, HOUSE OF REPRESENTATIVES NIGERIA/FACEBOOK

    Ndị omeiwu nnọchiteanya iri atọ na ise ewepụtala atụmatụ iwu iji belata oge ọchịchị onyeisiala na ndị gọvanọ ka ọ bụrụzie naanị afọ isii.

    Iwu ahụ a gụpụtara nke mbụ ya n’ụlọomeiwu nnọchiteanya n’ụbọchị Mọnde 10 Juun 2024 chọrọ ka e megharịa ụkpụrụ iwu Naịjirịa nke afọ 1999 tinyekwara iwu ntụliakaelu nke afọ 2022 iji nyere ọchịchị Naịjirịa na usoro ntụliakaelu aka.

    Ha chọrọ ka amalite ịhazi ntụliakaelu maka ọkwa niile n’otu mkpụrụ ụbọchị, gbasaa okwe ntụliakaelu n’ọbaozi intanet, dozie nsogbu niile metụtara ntụliakaelu imeụlọ tupu ahazie ntụliakaelu ma dozie nsogbu niile metụtara ntụliakaelu tupu eduo ndị nwetara mmeri n’iyi ọrụ.

    Ndị omeiwu ahụ chọkwara ka anabata mpaghara isii e kewara Naịjirịa ma malite ibugharị ọkwa onyeisiala n’ime mpaghara isii ndị ahụ.

    N’ime ndị omeiwu iri atọ na ise kwadoro atụmatụ iwu ahụ bụ Ikenga Imo Ugochinyere, Danga Abdullmaleek, Aliyu Mustapha, Francis Waive na ndị ọzọ.

  5. Eduola Narendra Modi n’iyi ọrụ dịka Praịm Mịnịsta India

    Eduola Narendra Modi n’iyi ọrụ dịka Praịm Mịnịsta India

    Ebe foto si, Reuters

    Onyendu otu ndọrọndọrọ ọchịchị Hindu Nationalist Bharatiya Janata Party (BJP) bụ Narendra Modi aṅụọla iyi ọrụ maka oge ọchịchị nke atọ dịka Praịm Mịnịsta India.

    A haziri mmemme ahụ n’ebe obibi onyeisiala India dị na Rashtrapati Bhavan.

    Otu Hindu Nationalist Bharatiya Janata Party nke Modi nọ n’isi ya nwetara oche ọchịchị narị abụọ na iri itoli na atọ (293) ebe otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-agba ya ụkwụ nwetara oche ọchịchị narị abụọ na iri atọ na anọ (234).

    N’oge Modi na-ekwu okwu, ọ sịrị na ya “ga-emeta onye niile mma dịka ọ dị n’iwu na-atụghị egwu ihe ọbụla.”

    Onyeisiala India bụ Draupadi Murmu dukwara ndị mịnịsta Mordi n’iyi ọrụ na mmemme ahụ.

  6. Ndịagha ememilaala ndị ekperima 6 n’Abịa steeti

    Ndịagha ememilaala ndị ekperima 6 n’Abịa steeti

    Ebe foto si, NIGERIAN ARMY/X

    Ndịagha Naịjirịa awakpoola okeọhịa Igboro dị n’okpuruọchịchị Arochukwu nke Abia steeti ma gbuo ndị ekperima isii a na-enyo enyo aka ha dị na mwakpo nakwa ogbugbu ndịagha ise n’Aba n’izuụka gara aga.

    Nke a dị n’ozi ndịagha Naịjirịa bipụtara n’akara ọbaozi X ha n’ụbọchị ụka Sọnde 9 Juun 2024.

    Dịka ndịagha siri kwuo, nke ahụ mere n’oge ndị otu ọrụ ‘Udo Ka’ gbara mbọ ịnwụchi ndị ekperima aka ha dị n’ọnwụ ndịagha tinyekwara ịnapụta ndị otu Indigenous People of Biafra (IPOB) ngwaọgụ ha napụrụ ndị ọrụ nchekwa.

    Ozi ahụ kwuru na ndịagha zutere ogbuniigwe dị iche iche n’oge ha na-abanye na ya bụ ogbe ndị ekperima nke mere ka otu n’ime ha nweta obere ihe mmerụahụ.

    Ka osiladị, ndịagha banyere n’ebe mgbazo ndị omekoome ahụ, memilaa isii n’ime ha ebe ndị ọzọ buuru ogogo apa mgbọ dị iche iche rie mbọmbọ.

    Ihe anapụtara ndị ekperima ahụ gụnyere egbe, ogbuniigwe, ọkọlọtọ Biafra nakwa ụgbọala Toyota Tundra na Hilux.

  7. Ndị otu gọvanọ Naịjirịa chọrọ itinye ọgbaaghara n’obodo - NLC

    Akara ngosi NLC na NGF

    Ebe foto si, NLC/NGF

    Nkọwa foto, Akara ngosi NLC na NGF

    Otu jikọrọ ndịọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress akatọọla nkwupụta ndị otu Nigeria Governors' Forum, NGF na ha enweghị ike ịkwụ ụgwọ opekatampe N60,000.

    Ha gwara ndị gọvanọ ahụ ka ha ghara itinye ọgbaaghara n’obodo.

    NLC kwuru na "Okwu ndị gọvanọ ahụ abụghị eziokwu maka na ego FAAC e sila na ijeri naira 700 ruo N1.2 trillion nke pụtara na gọọmenti steeti nwere nnukwu ego."

    Onyeisi mgbasa ozi nke NLC, Benson Upah, dụrụ ndị gọvanọ ọdụ ka ha belata ọnụ ahịa ọchịchị, belata nrụrụaka maa bunwe ọdịmma ndịọrụ ụzọ.

  8. Ọtụtụ mmadụ anwụọla n’ọtụtụ mwakpo e mere na DR Congo

    Ihe ngosi ala
    Nkọwa foto, Ihe ngosi ala

    Ihe ruru mmadụ 45 anwụọla n'ọtụtụ mwakpo mere n’izuụka gara aga na mpaghara North Kivu nke Democratic Republic of Congo.

    O ruola ọtụtụ afọ e ji anụ agha maka oke ọlaedo na mpaghara ahụ, nke mere ka ndị mmadụ hapụ n'ụlọ ha.

    Gọọmenti Congo ekwubeghị onye kpatara ogbugbu ahụ, mana ọtụtụ ndị isi obodo na-ekwu na ọ bụ ndị AlakụbaAllied Democratic Forces (ADF) mere ya.

    Ndị mwakpo a wakporo ọtụtụ obodo dị na mpaghara gbara obodo Beni gburugburu, ebe ọtụtụ mmadụ gbagara kemgbe.

    Akụkọ na-ekwu na mpaghara kacha njọ bụ Mamove, ebe a gbakwara ọtụtụ ụlọ ọkụ ma zuo ọgba tum tum.

    Leon Siviwe, onyeisi nchịkwa na Beni, gwara ụlọ ọrụ mgbasa ozi AFP ụbọchị Wenezde, na "ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ nwere ike ịrị elu dịka ọrụ nzọpụta na-aga n'ihu.

    E hibere ADF n'ofe oke ọwụwa anyanwụ Uganda n’afọ 1990s, ha wee bulite ngwaọgụ iji megide onyeisiala obodo ahụ bụ Yoweri Museveni, na-ebo ya ebubo maka mkpagbu gọọmentị na-akpagbu ndị Alakụba.

    Njikọ ha ya na Islamic State malitere ihe dị ka afọ isii gara aga, mana ndị nyocha na-ekwu na njikọ ndị ahụ adịghị ire.

    Ihe ntanetị nke Islam State wepụtara kwuru na otu n'ime mwakpo mere na North Kivu bụ ndị ụka Kraịst ka ezubere ya.

    Ọrụ ndịagha Uganda na ndị Kongo megide ndị nnupụisi ADF malitere n’afọ 2021 mana ha akwụsịbeghị mwakpo a na-awakpo ndị mmadụ.

    Otu nnupụisi ọzọ, a kpọrọ M23, amalitela na-egbu ndị mmadụ na ọwụwa anyanwụ Democratic Republic ma na-anapụ ndịagha gọọmentị ala.

    A ghọtara na Rwanda na-akwado ndị nnupụisi M23, mana Kigali gọnarịrị nke a.

  9. Ntụlịaka e mere na Saụt Afrịka bụ ihe ịmaatụ nye mba Afrịka niile – Peter Obi

    Peter Obi

    Ebe foto si, Peter Obi/Instagram

    Nkọwa foto, Peter Obi

    Onye zọrọ ọkwa onyeisiala na ntụliaka afọ 2023 n’otu Labour Pati bụ Peter Obi e toola ntụliaka mba Saụt Afrịka mere n’izuụka gara aga.

    N’ozi Peter Obi wepụtara n’akara soshal midia X ya taa, o kwuru na mba Afrịka niile gba gburugburu nwere ọtụtụ ihe ha ga-amụta na ntụliaka ahụ ọ kọwara dịka nke e mere n’ụzọ kwụrụọtọ ma bụrụkwa nke e ji ama atụ.

    Ọ gara n’ihu kpọọoku ka gọọmeti Naịjirịa nakwa ụlọọrụ na-ahụ maka ntụliaka bụ Independent National Electoral Commission hụ na a na-eme ntụliaka n’ụzọ ziri ezi nke ga-enyere mee ka ọchịchị onye kwuo uche ya kwụsie ike n’Naịjirịa.

  10. United Nation etinyela aha ndịagha Isreal dịka ndị na-eme mwakpo megide ụmụaka

    Ụmụaka na-agba ọsọ ndụ

    Ebe foto si, EPA-EFE/REX/Shutterstock

    Otu United Nation tinyere aha ndịagha mba Isreal n’akwụkwọ ndịagha na-ada iwu n’ichekwa ụmụaka n’afọ gara aga dịka onye nnọchiteanya ha si kwuo.

    Gilad Erdan kwuru na ọ natara ozi ahụ n’ụbọchị Fraịde ma kọwaa na mkpebi ahụ bụ ‘ihe ihere’. Mịnịsta na-ahụ maka mba ndị ọzọ bụ Isreal Katz kwuru na nke a “ga-emetụta mmekọrịta Isreal na UN”

    Ọnụ na-ekwuru Onyeisiala mba Palestine gwara ụlọ ntaakukọ Reuters na mkpebi bụ ụzọ dị mma iji nwụchie Isreal n’ihe ọ kpọrọ mpụ niile ha na-eme.

    E gbuola ọtụtụ ụmụaka n’ime mwakpo Isreal na-awakpo otu Hamas n’obodo Gaza, ebe ọtụtụ ndị na-achọsi ike inwete enyemaka obibi ndụ.

    Akwụkwọ nke odeakwụkwọ UN na-ewepụta kwa afọ gụnyere aha ndị gburu ụmụaka n’oge ọgbaghara, ndị gbochiri ha inwete nri na mmiri, ndị na-awakpo ụlọakwụkwọ na ụlọọgwụ.

    Mana o dochabeghi anya kpọmkwem ụdịrị mpụ a na-ebubo ebubo na ndịagha Isreal mere.

    Akụkọ kwuru na a ga-etinyekwu aha ndị Hamas nakwa otu Jihad n’akwụkwọ ahụ.

    Praịm Mịnịsta mba Isreal kwuru na UN etinyela onwe ha “n’akwụkwọ akụkọ ojii nke ụwa” ma gbakwụnye na ndịagha Isreal bụ “ndịagha kachasị enwe nkwanye ugwu n’ụwa”.

    Isreal malitere ịwakpo ndị Hamas mgbe ndị otu wakpochara obodo ha dị nso na Gaza n’ọnwa Ọktoba 2023, gbuo ihe ruru mmadụ 1,200 gụnyere ụmụaka 38 ma tọọrọ mmadụ 252 dịka Isreal si kwuo.

    N’ọnwa gara aga, UN kwuru na e gbuola ụmụaka ruru 7,797 n’oge agha dịka akara si n’aka mịnịstrị ahụike nke Hamas nọ n’isi si kwuo.

  11. Ụgwọọnwa opekatampe: Anyị ga-akwụ N62,000 – gọọmenti; Anyị chọrọ N250,000 – Otu jikọtara ndị ọrụ

    Mkparịtaụka maka ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ

    Ebe foto si, Nkeiruka Onyejeocha/X

    Gọọmenti Naịjirịa na ngalaba ụlọọrụ ndị kwụụrụ na nke onwe ha ekwetala ịkwụ ndị ọrụ puku naịra iri isii na abụọ (N62,000) dịka ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ.

    Ha kwupụtara nke a na nzukọ were ogologo oge ha na otu jikọtara ndị ọrụ Naịjirịa nwere n’ụbọchị Fraịde 7 Juun 2024.

    N’aka nke ha, otu jikọtara ndị ọrụ kwuru na ihe ha na-atụ anya dịka ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ bụ narị puku naịra abụọ na iri ise (N250,000).

    Ka osiladị, apịakọọla mkparịtaụka gbasara ụgwọọnwa opekatampe nke otu jikọrọ ndị ọrụ, ngalaba ụlọọrụ ndị kwụụrụ na nke onwe ha na gọọmenti malitere kemgbe ọnwa ole na ole.

    A ga-ezigara Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu mkpebi ndị e nwere na nzukọ ahụ ebe a tụrụ anya na ọ ga-eziga akwụkwọ n’ụlọomeiwu maka ilebara ya anya.

    Cheta na gọọmenti kwuru n’oge mbụ na ihe ya nwere ike ịkwụ ndị ọrụ dịka ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ bụ puku naịra iri isii (N60,000) ebe ndị ọrụ kwuru n’oge ahụ na ihe ha chọrọ bụ narị puku naịra anọ na iri itoli na anọ (N494,000).

    Dịka gọọmenti na-apụghị imejupụta ọnọdụ ahụ, ndị ọrụ banyere mfanyeakanụụkwụ n’abalị 3 nke ọnwa Juun 2024.

  12. Ụlọelu adaala ma kugbuo mmadụ 5 n’Abia steeti

    Ụlọelu dara n'Abịa steeti

    Ebe foto si, Anthony Anekwe

    Nkọwa foto, Ụlọelu adaala ma kugbuo mmadụ 3 n’Abia steeti

    Mmadụ 5 anwụọla dịka ụlọelu nwere okpukpo atọ dagidere ha n’Umumbi okpuruọchịchị Ukwa West dị n’Abia steeti.

    Njinji ahụ jiri n’ehihie nke ụbọchị Fraịde 7 Juun 2024 n’oge ndị ahụ na-arụ ọrụ na ya bụ ụlọ.

    Ndị bi n’obodo ahụ gwara onye ntaakụkọ anyị na ụlọ ahụ dara n’oge ndị ọrụ na-akụ ya gbamgbam ma na-etekwa ya aja mana ka osiladị, ndị ọkwa nka atọ na-akụ ụlọ ahụ gbamgbam nyara ndụ.

    E kwuru na mmadụ ise ndị ụlọ ahụ kụgidere gụnyere mmadụ atọ na-ete ya bụ ụlọ aja tinyere ụmụnne abụọ ndị gara ịmalite ọrụ n’ụlọ ahụ.

    A na-ekwu na onye nwe ụlọ ahụ nọ mba ofesi dịka ụmụnne ya bụ ndị na-ahụ maka ọrụ n’ebe ahụ.

    N’oge anyị kpọrọ Onyeisioche okpuruọchịchị Ukwa West bụ Newman Azu n’ekwentị, ọ kọwara ozi ahụ dịka eziokwu.

    Ka ọ dị, ebupụtala ozu mmadụ ise niile ahụ dịka a na-agba mbọ ịmata ndị ha bụ ọkachasị ndị nke a na-enyo enyo na ha si mba ndị ọzọ.

    Ụlọelu dara ada n'Abịa steeti

    Ebe foto si, Anthony Anekwe

  13. Anyị enweghị ike ịkwụ N60,000 dịka ụgwọọnwa opekatampe – Ndị otu Gọvanọ Naịjirịa

    NGF

    Ebe foto si, NGF/X

    Nkọwa foto, NGF

    Gọvanọ 36 nke Naịjirịa ajụla N60,000 dịka ụgwọọnwa opekatampe nke gọọmentị etiti kwuru na ha ga-akwụ ndịọrụ.

    Na nkwupụta nke otu ndị gọvanọ obodo ahụ bipụtara, na ngalaba soahal midia X ha, ha kwuru na ịkwụ N60,000 dịka ụgwọọnwa opekatampe abụghị ihe ga-enwe isi.

    Nkwupụta ahụ kwuruna"Nke a pụtara na ọtụtụ steeti ga-emefu ego niile ha na-enwetara n'aka gọọmenti etiti n'ịkwụ ụgwọọnwa ndịọrụ, n'enweghị ihe ọ bụla fọdụrụ iji rụọ ọrụ ndị ọzọ,".

    Ndị Gọvanọ ahụ gara n’ihu kwuona ụfọdụ steeti ga-ebido ịgbaziri ego iji kwụọ ndịọrụ ụgwọọnwa.

    Ndị gọvanọ ahụ kọwara na "Nke a abụghị ihe ga-abara obodo uru, gụnyere ndị ọrụ,".

  14. Ndịagha ụgbọelu Naịjirịa ga-ehibe ọdụ ndịagha n’Abia steeti

    Gọvanọ Alex na Ndịagha ụgbọelu
    Nkọwa foto, Gọvanọ Alex na Ndịagha ụgbọelu

    Gọvanọ Abia steeti Alex Otti e kelere onyeisi ndịagha ụgbọelu Naịjrịa bụ Air Vice Marshal Hasan Abubakar maka inye nkwado ka e guzobe ọdụ ụgbọelu ndịagha na steeti ahụ.

    O kwuru nke a mgbe ọ nabatara Air Vice Marshal Hasan Abubakar na ndịọrụ ya bụ ndị gara leta ya n’obi gọọmenti steeti ahị.

    Gọvanọ Otti kwere nkwa na gọọmentị steeti ya ga-enye ha ala ebe ha ga-arụ ọdụ ndịagha ụgbọelu

    O kwuru na gọọmentị steeti ya ga-enye ha ụgbọala ha ga-eji arụ ọrụ, ebe obibi ndịọrụ na ihe ndị ọzọ ga-enyere aka ịhụ na ọrụ ọdụ ndịagha ụgbọele a pụtara ihe.

    Ọ gara n’ihu kwuputa na ọdụ ndịagha ụgbọele ahụ ga-enweta nyere aka kwalite nchekwa ndụ na ihe onwunwe ụmụ amaala.

  15. Etu otu nwada nọọsụ si nwụọ n’ụlọ enyi ya nwoke n’Imo steeti.

    Otu onye nọọsụ anwụọla n’ụlọ enyi ya nwoke n’Imo steeti.

    Otu onye nọọsụ aha ya bụ Ginikachukwu Judith Okoro anwụọla n’ụlọ enyi ya nwoke n’Owerri Imo steeti.

    Ozi anyị nwetara na-ekwu na Gịnịkachukwu gbara afọ 23 bụụrụ onye nọọsụ n’ụlọọgwụ Edoziem Clinic dị n’Awaka okpuruọchịchị Owerri North nke Imo steeti tupu ọnwụ ya.

    N’oge BBC Igbo garuru n’ezinaụlọ Gịnịkachukwu dị n’okporoụzọ Road Safety, Amawire Egbu n’okpuruọchịchị Owerri North nke Imo steeti, nne ya bụ Caroline Iheji kwuru na ọyị nwa ya nwaanyị bụ Charles Chidiebere Ndukwu jiiri ọsọ bịa n’ụlọ ya mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere 2 nke ime abalị gwa ya na nwa ya nwaanyị dara ma nwụọ.

    Dịka o siri kwuo, oge ọ garuru n’ụlọọgwụ e bugara nwa ya, ọ chọpụtara ihe mmerụahụ dị iche iche n’ihu ya nakwa n’azụ isi ya.

    O kwuru na mgbe a jụrụ ya etu nwa ya siri nweta ihe mmerụahụ ndị ahụ, Charles kwuru na ọ bụ n’ihi ihe o tiri ya mgbe ọ na-agba mbọ ịkpọlite ya.

    Caroline Iheji kọwara na Charles Chidiebere Ndukwu, nwaafọ Nkwerre dị n’Imo steeti bụ onye ndị uweojii ji eji ugbua dịka ọ na-akpọ oku ikpe nkwụmọọtọ maka nwa ya nwaanyị nwụrụ anwụ.

    Ka o siladị, n’oge onye ntaakụkọ BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye, ọ zaghị oku ekwenti ya.

  16. Ndị uweojii agbarụọla ihu etu ndị ọkwọ ụgbọala si eburu ndị ọrụ ha agba ọsọ n'okporoụzọ

    Ndị ọrụ uweojii nke Naịjirịa

    Ebe foto si, NIgeria Police

    Ndị uweoji adọọla aka na ntị nye ndị ọkwaụgbọala na-ebu ndị ọrụ ha na ndị ọrụ nchekwa ọzọ agba ọsọ ma ọ bụrụ a kwụsị ha maka nyocha maọbụ ịda iwu n'okporoụzọ.

    Olumuyiwa Adejobi bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweoji na Naịjirịa kọwara na agw a bụ ịtọrọ onye ọrụ nchekwa ahụ bụ nke megidere iwu Naịjirịa.

    N'okwu ya “ndị ọrụ anyị na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ga-ejide ụgbọala, ha baa n’ime ụgbọala ahụ iji kpụrụ ọkwọụgbọala gawa n'ụlọọrụ ha, mana ọtụtụ ndị ọkwọụgbọala ga-eburu ndị ọrụ nchekwa ahụ gbawa ọsọ”.

    Adejobi gara n’ịhụ rịọ ndị mmadụ ka ha kwụsị ịtọrọ ndị uweoji maọbụ ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na-arụ ọrụ nchekwa ụgbọala n’okporoụzọ.

    “Ọ bụrụ na ị daa iwụ, ihe ọsọrọ ya bụrụ; sọrọ ndị uweojii maọbụ ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ gaa n’ụlọọrụ ha. Rubere ha ịsị, sọrọ ha gaa ebe ọbụla ha kpụ gị na-aga”.

    Adejobi ji ohere ahụ gosi ọtụtụ ihe onyonyo ebe ndị ọkwọụgbọala tọọrọ ndị uweoji banyere n'ụgbọala ha ma buru ha na-agba ọsọ.

  17. Ihe butere ọgụ n’etiti ndị ọrụ ọtawaike gọọmenti na ndị ahịa akpakara igwe n’Enugwu

    Ebe a na-ere akpakara igwe n'Enugwu steeti

    A sịrị na ọgụ dara n’etiti ndị na-ere akpakara igwe a kpọrọ “Iron condemn” na ndị ọrụ ọtawa ike gọọmenti wepụtara ataala isi otu nwoke n’Enugwu steeti.

    Mkpamkpa ahụ kpara ụbọchị Tuzde 4 Juun 2024 n’Abakpa Nike dị n’Enugwu steeti.

    Ihe kpatara nsogbu ahụ bụ na gọọmenti Enugwu wepụtara iwu ma guzobe otu ọrụ ọtawa ike ọrụ ha bụ ịchụpụcha ma kpochaa ebe niile ndị ahụ na-ekpo igwe dobere ya.

    Mịnịstrị na-ahụ maka gburugburu obibi wepụtara ozi kwuo na ndị ahụ na-ere akpakara igwe na-eji ureghure emebi gburugburu Enugwu.

    Ọ sịkwara na ndị ahịa akpakara igwe ahụ na-emekwa mpụ dị iche iche dịka ikpuchi ndị ohi na ndị ala adịghị mma.

    Ebe a na-ere akpakara igwe n'Enugwu steeti

    Nke a mere gọọmenti Enugwu jiri tinye iwu na onye ọbụla a hụrụ ka ọ na-atụtụ akpakara igwen’ime Enugwu ga-ahụ ihe ọkụ ji ntị oke eme.

    Ndị ọrụ ọtawa ike ahụ weere iwe gaa n’Abakpa, Emene nakwa ebe ndị ọzọ dị iche iche.

    Ọ bụzị n’Abakpa ka ndị ahịa akpakara igwe na ndị ọrụ ọtawa ike malitere ịlụ ọgụ nke meruru ọtụtụ mmadụ ahụ ma taa isi otu onye.

    Mana ozi gọọmenti Enugwu wepụtara ekwughị na mmadụ nwụrụ n’ọgụ ahụ kama ha dere na otu onye meruru nnukwu ahụ n’oge ndị ahịa akpakara ji oloolo ‘bottle’ na mma na-achọ igbu ndi ọrụ gọmenti.

    Ha kwukwara na a gbara otu ụgbọala gọọmenti ọkụ.

    Ebe a na-ere akpakara igwe n'Enugwu steeti
  18. Egbuola ihe karịrị mmadụ 150 na Sudan

    Egbuola ihe karịrị mmadụ 150 na Sudan

    Ebe foto si, GEZIRA STATE RESIDENTS

    Opekata mpe mmadụ 150 ndị gụnyere ụmụntakịrị 35 anwụọla n’otu obodo dị na mpaghara etiti Sudan.

    Nke ahụ mere n’oge ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu na-alụso ndịagha ọgụ bụ Rapid Support Forces (RSF) gburu mmadụ n’igwe.

    Kemgbe ihe karịrị ọnwa atọ ka ndị otu ahụ jiri malite ịdọ ndọrọ ndọrọ ka ha nọrọ n’isi ọchịchị mba Sudan.

    Ka osiladị, otu RSF ekwubeghị okwu gbasara ebubo ahụ a na-ebo ha mana ha turu ọnụ n’ụbọchị Tọzde gbasara ịwakpo ụlọọrụ ndịagha abụọ.

    Ihe onyonyoo a gbasara n’ọbaozi dị iche iche n’ụbọchị Wenezde gosiri ọtụtụ ozu mmadụ e ji akwa ọcha fụchie ma kwadoo maka olili na mpaghara Wad al-Nourah dị na Gezira steeti.

    UNICEF na-ekwu na e gburu ụmụntakịrị 35 na mwakpo ahụ ma merụọ ihe karịrị 20 ahụ.

    Nnukwu onyeisi ụlọọrụ UNICEF bụ Catherine Russel kọwara ihe mere n’oge mwakpo ahụ dịka nke na-agba anyammiri.

    Dịka Russel siri kwuo, egbuola ma merụọ ọtụtụ ụmụntakịrị ahụ kemgbe afọ gara aga, chụpụ ihe karịrị nde ise n’ụlọ ebe ọtụtụ ndị ọzọ ka e weere n’ọrụ ndịagha, tọrọ ọtụtụ ma kwasoo ọtụtụ iko n’ike.

  19. Ndị omeiwu Naịjirịa amalitela atụmatụ ikewapụta Steeti ọhụrụ n'Ọwụwa Anyanwụ

    Ndị ụlọomeiwu nta nke Naịjirịa

    Ebe foto si, House of Reps

    Ndị ụlọomeiwu nta nke Naịjirịa a kpọro ‘House of Representatives amalitela iwu ikewapụta steetị ọhụrụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nke Naịjirịa.

    Ha mere nke site n’ime ka atụmatụ iwu ikewapụta ‘Orlu Steeti’ gafee ngụpụta nke mbụ n’ọgbakọ ha mere n’ụbọchị Wenezde.

    Onye na-akwado iwu ahụ bụ omeiwu Ikenga Ugochinyere na-anọchiteanya mpaghara Ideato North na South nke Imo Steeti nakwa ndị ọzọ.

    Atụmatụ iwu kọwara na nke a ga-emetụta iwu Naịjirịa nke e mere n’afọ 1999 bụ nke ga-eme ka e nwee steeti 37 na-abụghịzi 36 ọ bụ ugbua.

    Iwu ahụ ga-emekwa ka Orlu Steeti ahụ nwee okpuruọchịchị iri abụọ na asatọ gụnyere; Orlu, Orsu, Oru West, Oru East, Ideato North, Ideato South, Njaba, Nkwerre, Nwangele, Isu, Oguta, Ohaji Egbema, Onuimo, Ihiala, Uga, Ihiala, Uli, Ozubulu, Akokwa, Arondizuogu, Umuchu, Umunze, Umuaku, New Ideato North, Nwabosi West, Nwabosi East, Owerre Nkworji, Alaoma, Amaifeke, and Owerrebiri Umuowa.

    Ugochinyere rịọrọ ndị omeiwu ibe ya ka ha biko kwadoo atụmatụ iwu ahụ ka o nwee ike gafee ngụpụta nke abụọ.

    Ọ bụrụ na e kewapụta steeti Orlu ahụ, mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ga-enwezi steeti isii, ebe North-West nwere asaa, ndị ọzọ nwechara steeti isii ugbua.

    N’otu aka ahụ, mpaghara South-West na-achọkwa ka e kewapụta steeti ọzọ a kpọro Oke-Ogun na mpaghara ha.

  20. Igbo mma mma nụ ooo!

    Anyị na-ekele unu n'ụtụtụ taa na-asị unu abịala n'ọgbakọ BBC Igbo.

    Ngwa! Tọọ ntị n'ala gere akụkọ ndị hiri odo n'ụwa gbaa gburu gburu.

    Ndewo!