Mmadụ abụọ enwetala onwe ha n'ụlọọgwụ dịka ụlọelu dara n'Ebonyi Steeti

Mmadụ abụọ a zọpụtara n'ụlọelu dara n' Abakaliki , Ebonyi steeti na-anata nleta n'ụlọọgwụ 'Alex Ekwueme Federal teaching hospital, Abakaliki."Otu ụlọelu ogogo abụọ nke ya na ụlọọgwụ ahụ nwekọrọ otu ahụ aja daara, merụọ mmadụ abụọ gụnyere ndị nọ ọrụ na ya bụ ụlọ na nsonso a.Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ụlọ ahụ nke onye nwe ya bụ ọmeiwu na-anọchite Afikpo North East n'Ụlọomeiwu Ebonyi Steeti bụ Ukie Ezeali, dara na mberede. Maazị Celestine Alua gwara onye ntaakụkọ anyị sị, `Anọ m n'ime ụlọ ahụ a na-arụ arụ oge ọ dara dagide anyị."Onye ọzọ na-arụ ọrụ n'ụlọ ahụ achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru sị, A na m ekpo ogwute n'akpa, , onye nwe ụlọ na-asị m mee ya ọfụma."“Naanị mmadụ abụọ tọrọ n'ime mana a zọpụtala hja, buga ha ụlọọgwụ.“ụlọ ahụ egosighị na ọ chọrọ ịda, e nwqere m isi ọma n'ihi na ngwaọrụ m dị n'ime ụlọ ahụ. Asị m ka m kwọchapụ aka tupu m m banye n'ụlọ ahụ buru akpa ngwaọrụ oge ọ dara."






















