Etu e si gbaara ụmụafọ Naịjirịa 103 ụgbọ nwamkpị site na mba Turkey

Akụkọ kwuru na otu onye Fada so na ndị nwụrụ na mwakpo ahụ

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Chinonso Ugorji, Jessica Nwankwo, Uche Akolisa, Michael Ngene, Michael Ilediagu

  1. Mmadụ abụọ enwetala onwe ha n'ụlọọgwụ dịka ụlọelu dara n'Ebonyi Steeti

    Ụlọ dara n'Ebonyi

    Mmadụ abụọ a zọpụtara n'ụlọelu dara n' Abakaliki , Ebonyi steeti na-anata nleta n'ụlọọgwụ 'Alex Ekwueme Federal teaching hospital, Abakaliki."Otu ụlọelu ogogo abụọ nke ya na ụlọọgwụ ahụ nwekọrọ otu ahụ aja daara, merụọ mmadụ abụọ gụnyere ndị nọ ọrụ na ya bụ ụlọ na nsonso a.Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ụlọ ahụ nke onye nwe ya bụ ọmeiwu na-anọchite Afikpo North East n'Ụlọomeiwu Ebonyi Steeti bụ Ukie Ezeali, dara na mberede. Maazị Celestine Alua gwara onye ntaakụkọ anyị sị, `Anọ m n'ime ụlọ ahụ a na-arụ arụ oge ọ dara dagide anyị."Onye ọzọ na-arụ ọrụ n'ụlọ ahụ achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru sị, A na m ekpo ogwute n'akpa, , onye nwe ụlọ na-asị m mee ya ọfụma."“Naanị mmadụ abụọ tọrọ n'ime mana a zọpụtala hja, buga ha ụlọọgwụ.“ụlọ ahụ egosighị na ọ chọrọ ịda, e nwqere m isi ọma n'ihi na ngwaọrụ m dị n'ime ụlọ ahụ. Asị m ka m kwọchapụ aka tupu m m banye n'ụlọ ahụ buru akpa ngwaọrụ oge ọ dara."

    Oonye merụụ ahụ nọ ụlọgwụ
  2. Ndị ‘Gen Z’ emeela ngagharịiwe na mba Kenya megide oke ụtụisi

    Ndị Gen Z na-eme ngagharịiwe na mba Kenya

    Ebe foto si, Reuters

    Ụmụntoroọbịa ndị ọgbara ọhụrụ na-anaghị atụ egwu ọbụla eburula ngagharịiwe wụchie n’okporoụzọ mba Kenya nke mere ka gọọmentị kwụsị atụmatụ ịna ụtụisi ụfọdụ ha hiwere na mbụ.

    Ihe a malitere dịka ngosi iwe n’ihe onyonyo TikTok banyere iwu ụtụisi aghọọla ihe ịgbaisi akwara – na-enweghi otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọbụla kwanyere ya ọkụ.

    Ọchịchị Onyeisiala William Ruto emeela ihe ọtụtụ ọgbọ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-emenwughi – n’ikpokọta ọtụtụ ụmụafọ Kenya ọnụ na-agbanyeghi agbụrụ ha dị iche iche.

    Ngagharịiwe ndị Gen Z

    Ebe foto si, AFP

    N’ụbọchị Tuzde ka ọtụtụ ndị ntoroọbịa iwe na-ewe maka ọtụtụ ụtụisi ha na-akwụ ji ngagharịiwe gbochie njem n’okporoụzọ dị n’etiti isiobodo Nairobi na-atụghị egwu ndị uweojii bucha egbe na anwụrụ anya mmiri egwu.

    Ndị a jicha ekwentị ha na-eme ihe onyonyo dịka ha ndị ọrụ nchekwa na-agbarịta egbe ọnụ.

    Ngagharịiwe ahụ nke a kpọrọ “nọchie ụlọomeiwu”, bụ nke e ji soshal midia na-akwanye ya ọkụ a-abụghị nke otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ahazi.

    “Anyị bụ ndị Gen Z, anyị kpokọtara onwe anyị ọnụ. Anyị ji TikTok na-agwa ndị ntoroọbịa pụta bịa mee ngagharịiwe na-agwa kwa ha ihe mere ha ga-eji soro na ngagharịiwe ahụ,” otu onye so na-eme ngegharịiwe bụ Zaha Indimuli gwara onye ntaakụkọ.

    Ndị a kpọrọ Gen Z bụ ndị ntoroọbịa a mụrụ na-agbata ngwụcha ọgbọ afọ 1990 ruo 2000 – Ha pụtara n’igwe, ṅụọ iyi na ngosi iwe agaghị akwụsị naanị na soshal midia.

    Ngagharịiwe ndị ntoroọbịa na Kenya

    Ebe foto si, EPA

    A nwụchiri ihe karịrị mmadụ 200 so na-eme ngagharịiwe a mana e mechara tọhapụ ha mgbe ndị ọkaiwu gara n’ụlọ ndị uweojii ebe a kpọchiri ha.

    Dịka ngagharịiwe na-aga n ‘ihu ọtụtụ awa, ụlọọrụ onyeisiala mba Kenya wepụtara ozi ma kwuo na ọ ga-ewepụ ụfọdụ ụtụisi ndị ahụ nke gụnyere ụtụisi ‘value added tax (VAT)’ e tinyere pasentị 16.

    Cheta na ụdịrị ihe a mere na Naịjirịa n’afọ 2020, mgbe ndị ntoroọbịa mere ngagharịiwe n’ihi etu ụfọdụ ndị uweojii si akpagbu ndị ntoroọbịa.

    Ọ malitekwara na soshal midia Twitter bụzi X ugbua, mgbe e ji akara #EndSARS na-egosi iwe ha ma mechaa buru ya pụta n’okporoụzọ steeti dị iche iche na Naịjirịa.

  3. Igbo ndị ọma e ji eme ọnụ daalụ!

    Anyị ji obi sara mbara anabata unu n'ọgbakọ anyị taa.

    Biko bịa buru oche gị ka ị gụọ akụkọ anyị na-egosi ihe ndị na-eme na Naịjirịa nakwa mbaụwa.

  4. Ụlọikpe ajụla ka a gbapụta Abba Kyari na mmadụ abụọ ọzọ n’ụlọ mkpọrọ

    Abba Kyari

    Ebe foto si, ABBA KYARI

    Nkọwa foto, Abba Kyari

    Ọkaipke Emeka Nwite ajụla ka a gbapụta Abba Kyari na mmadụ abụọ ọzọ ndị uweojii a na-ekpe ikpe n'ụlọ mkpọrọ.

    Ọkaipke Nwite kwuru na Kyari na ndị ọzọ ahụ enweteghị ihe ga-egosi na ha tozuru ya.

    A wuchiri ma kpochie Abba Kyari na ndị uweojii abụọ ndị ahụ ka e boro ebubo ibu ọgwụike n’ụbọchị Febwarị 14 afọ 2022 mgbe ndị ọrụ mgbochi ibu ọgwụike bụ 'National Drug Law Enforcement Agency' (NDLEA) kpọpụtara aha Kyari dịka onye a na-achọ achọ.

    Ụlọikpe nọrọ n’oge mbu ju ka a gbapụta Kyari na mmadụ abụọ ahụ ma nye iwu ka a kpọchie ha n’ụlọ mkpọrọ dị na Kuje, Abuja.

  5. Gọvanọ Rivers steeti eduola ndị isioche okpuruọchịchị 23 n’iyi ọrụ

    Ndị isioche okpuruọchịcchị e duru n'iyi ọrụ

    Ebe foto si, RIVER STATE GOVERNMENT

    Nkọwa foto, Ndị isioche okpuruọchịchị e duru n'iyi ọrụ

    Aka na-achị Rivas steeti bụ Siminalayi Fubara eduola mmadụ 23 n’iyi ọrụ dịka ndị ga-abụ ndị isioche opkpuruọchịchị steeti ahụ ruo mgbe a ga-eme ntuliaka okpuruọchịchị.

    Idu n’iyi ọrụ ahụ e mere n’obi ọchịchị gọọmenti di na Port Harcourt.

    Cheta na e nwere ọgbaghara na steeti ahụ ụbọchị Tuzde 18 Juun n’etiti gọọmenti steeti ahụ na ndịisioche okpuruọchịchị oge ọchịchị ha gwugoro.

    Ihe kpatara nke a bụ na ụfọdụ ndịisioche siri ọnwụ na ha agaghị ahapụ ọkwa ha n’ihi na onye bụbu onyeisioche ụlọomeiwu steeti ahụ bụ Martin Amaewhule megharịrị iwu hiwere okpuruọchịchị ma were ọnwa isii gbatịa oge ọrụ ha.

    Ndị ahụ

    Aha ndị ahụ Gọvanọ Fubara duru n’iyi ọrụ gunyere:

    Madigai Dickson - Okpuruọchịchị Abua/Odua

    Happy Benneth - Okpuruọchịchị Ahoada East

    Mazi Daddy John Green - Okpuruọchịchị Ahoada West

    Otonye Briggs - Okpuruọchịchị Akuku Toru

    Reginald Ekaan - Okpuruọchịchị Andoni

    Orolosoma Amachree - Okpuruọchịchị Asari Toru

    Alabota Anengi Barasua - Okpuruọchịchị Bonny

    Anthony Soberekon - Okpuruọchịchị Degema

    Brain Gokpa - Okpuruọchịchị Eleme

    David Omereji - Okpuruọchịchị Emouha

    John Otamiri - Okpuruọchịchị Etche

    Kenneth Kpeden - Okpuruọchịchị Gokana

    Darlington Orji - Okpuruọchịchị Ikwerre

    Marvin Yobana - Okpuruọchịchị Khana

    Chijioke Ihunwo - Okpuruọchịchị Obia/Akpor

    Princewill Ejekwe- Okpuruọchịchị Ogba/Egbema/Ndoni

    Evans Bipi - Okpuruọchịchị Ogu/Bolo

    Princess Ogan - Okpuruọchịchị Okrika

    Promise Reginald - Okpuruọchịchị Omuma

    Enyiada Cookey-Gam - Okpuruọchịchị Opobo/Nkoro

    Gogo Philip - Okpuruọchịchị Oyigbo

    Ichemati Ezebunwo - Okpuruọchịchị Port Harcourt

    Matthew Dike - Okpuruọchịchị Tai

  6. Ọkụ agbagbuola ọtụtụ mmadụ na Chad dịka ụlọ ngwaagha gbara ọkụ

    Ọdọ ngwagha  mba Chad

    Ebe foto si, Screengrab

    Ndị mmadụ amabeghị ọnụọgụgụ ha anwụọla dịka nnukwu ọkụ gbara n'ụlọ ndọkwa ngwaagha na mba Chad.

    Mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ nke mba chat bụ Abderaman Koulamallah kwuru na ọkụ ọgbụgba ahụ mere na ụlọndokwa ngwaagha dị na mpaghara Goudji dị n'isisobodo mba ahụ bụ N'Djamena.

  7. A tọhapụla Justin Timberlake

    Justine Timberlake

    Ebe foto si, Sag Harbor

    Nd uweojii mpaghara Sag Harbor dị na Amerịka atọhapụla otiegwu a ma ama bụ Justin Timberlake dịka a nwuchichara ya maka ebubo ịiji anya mmanya kwọọ ụgbọala.

    Timberlake gara Sag Harbor dị na Hamptons, Long Island bụ ebe e ji mara ndị nwere agba.

    A nwụchiri n'etiti ndelri (midnight) dịka ndị uweojii kwụsịrị ụgbọala BMW na-acha ntụntụ agaje mana ọ kwụsịghị.

    Ndị uweojii kwuru na anya ya na-acha ọbara ọmara ma ebe ọnụ ya na-esi mmanya mmanya.

    Okwu ya dịka ka onye mmanya na-egbu ebe ọ dakwatra nwale ha mere ya iji mata ma anya edoro ya.

  8. Ndeewonu o!

    Ụmụ afọ, ụnụ asaala chi?

    Nkke onye chiri, ya zere.

    Biko, sonye anyị ebe a maka akụkọ dị mkpa taa.

  9. Ụfọdụ ndị ọrụ customs na-agbakọrọ ndị na-ere ọgwụike aka - Onyeisi ụlọọrụ Customs

    Adewale Adeniyi

    Ebe foto si, NIGERIA CUSTOMS SERVICE/X

    Nkọwa foto, Adewale Adeniyi

    Onyeisi ụlọọrụ Nigeria Customs Service (NCS) bụ Adewale Adeniyi ekwuola na ndị na-ere ọgwụike agaala n’ihu na-etinye ndị ọrụ custom n’ọrụ ọgwụike iji gbanarị nyocha ndi ọrụ nchekwa.

    Adeniyi mere ka amata nke a mgbe ụlọọrụ NCS gosiputara ọgwụike ha machibidoro na Tin-Can Port.

    Ọ gara n’ihu kwuo na, "Onye ọrụ customs ọbụla e jidere na-enyere ndị na-ere ọgwụike aka, ga-enweta ntaramahụhụ dịka iwu si kwado."

    O kwuru na oge na-adighị anya, ụlọọrụ customs ga-ewepụta aha ndị achọpụtara na-enyere ndị ọrụ ọgwụika ahụ aka.

    Adeniyi kwuru na ụlọọrụ customs machiri ọgwụike ọnụego ya ruru ijeri naira anọ na ụma abụọ (N4.2bn) nke gosiri mbọ ụlọọrụ NCS na-agba iji megide ndị na-ere ọgwụike n’Naịjirịa.

  10. Fubara edochiela ndịisioche okpuruọchịchị Rivas steeti

    Aka na-achị Rivas steeti bụ Siminalayi Fubara

    Ebe foto si, Fubara/Instagram

    Aka na-achị Rivas steeti ekwuola okwu gbasara ndịisioche okpuruọchịchị steeti ahụ dịka ndị mmadụ na-enwe ụjọ.

    Gọvanọ steeti ahụ bụ Siminalayi Fubara nọọrọ n’ụtụtụ Tuzde 18 Juun 2024 nye iwu ka ndị isi ọrụ n’okpuruọchịchị niile e nwere na Rivas steeti malite ilekọta okpuruọchịchị ha n’otu n’otu.

    Fubara nyere iwu ahụ n’ozi ọ gbasaara ndị Rivas steeti dịka oge ọchịchị ndịisioche okpuruọchịchị steeti ahụ kụụrụ ọnụ n’ụbọchị Monde 17 Juun 2024.

    O mere mgbasaozi ahụ dịka ụfọdụ ndịisioche jụrụ ịhapụ ọkwa ha, bụ nke mere ka ụfọdụ ndị ntorobịa gaa nọchie n’ogige ụlọọrụ okpuruọchịchị dị iche iche.

    Ihe kpatara nke a bụ na ụfọdụ ndịisioche siri ọnwụ na ha agaghị ahapụ ọkwa ha n’ihi na onyeisioche ụlọomeiwu steeti ahụ bụ Martin Amaewhule megharịrị iwu hiwere okpuruọchịchị ma were ọnwa isii gbatịa oge ọrụ ha.

    Ka osiladị, ụlọikpe ukwu dị na Rivas steeti kachapụrụ iwu ahụ ma kwuo na iwu Naịjirịa akwadoghị ya.

    Ọkaikpe Daketima Kio kwupụtara iwu ọhụrụ ahụ nyere ohere ka a gbatịa oge ọrụ ndịisioche a kpọrọ ‘Local Government Law No. 2 of 2024’ dịka nke iwu na-akwadoghị.

  11. Ndị uweoji awuchiela dibịa na-agwọrọ ndị e chere bụ ESN ọgwụ n’Anambra steeti

    Anambra Police Command

    Ebe foto si, Anambra Police Command

    Nkọwa foto, Ndị ji egbe ndị uweojii wuchiri

    Ndị uweojii na Anambra steeti awuchiela mmadụ anọ a na-eyo eyo na ha bụ ndị ESN na mpaghara Ufuma nke dị na okpuruọchịchị Orumba North nke steeti ahụ.

    Otu onye n’ime mmadụ anọ ahụ a wuchiri, bụ Maduabuchi Nwafor onye a ma ama dịka Omenkpo. Ndị uweojii kwuru na ọ bụ ya bụ dibịa na-emere ndị otu ya ọgwụ ma bụrụkwa n'ihu arusi ya ka ndị otu ahụ na-eme nzuko ma na-anabata ndị ọhụrụ otu ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga kwuru na otu onye na ndị ahụ a wuchiri a na-ekwughị aha ya kwetara na ya so na ndị ojiegbe na-etinye ọnọdụ onye a putakwanaezi nke e mere ụbọchị 30 Mee 2024 na mpaghara owuwa anyawụ Naịjirịa.

    Tochukwu kwuru na Kọmishọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Nnaghe Obono Itam, enyela iwu maka ezi nyocha iji chọpụta ma wuchie ndị ọzọ na-enweta ọgbaaghara na steeti ahụ.

    O kwere ndị steeti Anambra nkwa na ndị uweojii ga na-aga n’ihu ịgba mbọ iji weta ezi nchekwa na steeti ahụ.

  12. Onyeagha agbagbuola onwe ya n’ihu ụlọọrụ ndịagha Abịa steeti

    Foto na-egosi ndịagha Naịjirịa

    Ebe foto si, HQ Nigerian Army/X

    Onyeagha bi n’ogige ndịagha Goodluck Ebele Jonathan Barrack nke 14 Brigade Headquarters dị n’okpuruọchịchị Ọhafịa Abịa steeti ma bụrụ onye e zigara n’ụlọọrụ ndịagha a kpọrọ Forward Operation Base (FOB) dị na Ngwa High School Abayi Osisioma ewepụla ndụ ya.

    Ya bụ onyeagha a matara aha ya dịka Vitalis bụ onye ji ọkwa Command Seargent Major (CSM) ma bụrụkwa nwaafọ Okpuala dị n’okpuruọchịchị Ngor Okpala n’Imo steeti.

    Ozi anyị nwetara na-ekwu na Vitalis gbara onwe ya egbe n’ihu ụlọọrụ Forward Operation Base na-emeghị ka a amata ihe mere o ji nwee ụdị mkpebi ahụ.

    Ndị nọ ya nso kwuru na tupu ọ nwụọ, enweghị ozi ọbụla ha nwetara banyere nsogbu ọ na-agabiga n’ụlọ maọbụ n’ụlọọrụ ya.

    Akụkọ kwuru na onyeagha ahụ miri ala kemgbe izuụka abụọ dịka na-enweghị onye nụrụ mkpọtụ ya maọbụ mata ebe o tinyere isi ebe mbọ niile ndị otu ya gbara inweta ya kụrụ afọ n’ala.

    E kwuru na onyeagha ahụ kwesịrị ịla ezumiike nka n’ọnwa Oktoba, afọ a lọghachiri n’ụlọọrụ ndịagha ma were egbe gbagbuo onwe ya.

    Ka osiladị, mbọ niile BBC Igbo gbarala inweta ọnụ na-ekwuru ndịagha n’Abịa steeti bụ Prince Innocent Omale kụrụ afọ n’ala dịka ọ na-enweghị ike zaa oku ekwentị ya maọbụ zaghachi ozi ndị e zigaara ya n’oge a na-ebipụta akụkọ a mana otu onyeagha na-achọghị ka a kpọọ ya aha kwetara na Vitalis furu izuụka abụọ gara aga ma mechaa dịrị ka onye ara lọghachite.

    Ọ sịrị na mgbe onyeagha nọ n’ụzọ tụsara egbe ya, Vitalis weere ya gbagbuo onwe ya n’ihi na ọ maara na a na-eme ya nnyocha.

    “A gaara eziga Vitalis na 82 Division Headquarters dị n’Enugwu n’izuụka a maka ịjụ ya ajụjụ gbasara ndịagha e gburu n’Aba izuụka abụọ gara aga,” ka onyeagha ahụ kwuru.

  13. Mba Amerịka ga-enye ndị enweghi akwụkwọ lụrụ ndị be ha ikike ịnọrọ

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisiala mba Amerika bụ Joe Biden akwadola ịkwụpụta na ndị nogoro afọ ịrị na mba ahụ ga enweta ikike ga eme ka ha nweike biri ebe ahụ ma rụọ ọrụ maọbụrụ na di maọbụ nwunye ha bụ onye Amerịka.

    Ikike ahụ ga enyere ọtụtụ ezinaulo karịrị 500,000 bụ ndị nọ na Amerika aka, nakwa ndị ntorobia bụ ndị na erubeghị afọ ịrị abụọ na otu gbadaa bụ ndị nne na nna ha nuru onye Amerịka.

    Na ọnwa Juun ka Joe Biden kwuru na ya ga eme usoro ịbata US bụ nke ga adịrị onye ọbụla mma.

    Mana Alex Cuic bụ onye ọkammụta n’ọkaịwụ gbasara ịbanye mba ahụ kọwara ndị BBC ịsịokwu n’ usoro ahụ Joe Biden weputara.

    Ọ sị naọ ga-eme ka ọtụtụ ndị mmadụ sị na US pụọ tupuu ha etịnye akwụkwọ ịlọghachịta azụ ọzọ dịka ịwụ sị kwado.

    Ọ sị na ọtụtụ ga enwe ihe mgbagwojuanya gbasara ọnọdụ ha na ikike ha nwere ịbụ ndị US.

    Otu na achọghị ka ịbata US dị mfe na akatọ ịwụ ahụ. Onyeisi ha bụ James Massa kwuru na “kama onyeisiala mba US ga akwụsị ndị na abata n’ụzọ ịwụ akwadọghị, ihe ọ mere bụ ịgwa ndị mmadụ na gọọmentị ga agbahara ha ma nye ha ikike ịbụ ndị Amerịka”.

    Na aka nke ọzọ, ndị na ahụ maka ikike dịịrị mmadụ bụ American Civil Liberties Union ( ACLU) gbara Joe Biden akwụkwọ n’ụlọikpe ma kwụọ na ọ dara ịwụ na echekwa etu e sị abata Amerika.

    Aaron Reichlin-Melnick na-arụ ọrụ dịka onye nchịkọta n’ụlọọrụ a kpọrọ American Immigration Council kwuru na onyeisiala mba ahụ na agba mbọ iweta ịgbọ mkpa na ịkwụsị nsọgbụ ahụ ndị mmadụ na-arụ aka.

  14. Ndị echeere na-amanye 'Sit at Home' egbuola mmadụ atọ na Nnewi

    Ndị uweojii na-eme nyocha banyere ihe mere na Nnewi

    Ebe foto si, Anambra Police Command

    Nkọwa foto, Ndị uweojii na-eme nyocha banyere ihe mere na Nnewi

    Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola na ihe ruru mmadụ atọ nwụrụ mgbe ndị omekome bu egbe wakporo otu ebe na Nnewi dị na steeti ahụ.

    N'ozi nke ọnụ na-ekwuru steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga wepụtara, ọ sị na Kọmịshọna ha na steeti ahụ bụ Nnaghe Obono Itam nyere iwu ka anwụchie ndị kpara mkpa mkpa a ma kwe nkwa na a ga-enweta ikpe nkwụmọtọ maka ndị nwụrụ.

    "Ndị omekome ahụ bụ ụgbọala ọkwụọtọ ekene eze na-acha ọbara ọbara na-akpa mkpamkpa na Nnewi ebe ha tọọrọ otu onye.

    ndị ọrụ nchekwa chụrụ ha ọsọ rue na Nnobi ebe ha nọ kwakọrịta mgbọ, ọ bụ mgbe nke ahụ na-eme ka mgbọ tụrụ otu onye nchekwa ime obodo nakwa mmadụ abụọ ọzọ"

    Dịka o si kwuo, e buuru ndị niile ihe metụtara gaa ụlọọgwụ ebe mmadụ atọ nwụrụ dịka mmadụ abụọ ndị ọzọ na-anata ọgwụgwọ.

  15. Onye ọbụla laghachi n’ubi iji belata ọnụahịa ihe oriri - Buhari

    Muhammadu Buhari

    Ebe foto si, Garba Shehu/X

    Onyeisiala Naịjirịa pụrụ apụ bụ Muhammadu Buhari akpọọla ndị Naịjirịa oku ka ha laghachi n’ubi kọpụta ihe oriri iji gboo nsogbu ọnụahịa ihe oriri na-arị elu.

    Buhari kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu ozugbo e kpechara ekpere Eid na Daura dị na Katsina steeti.

    O kwuru sị “e ji m ohere a na-akpọ ndị Naịjirịa oku ka ha kwụrụ n’onwe ha. Ka anyị laghachi n’ubi iji kọpụta ihe anyị ga-eri, anyị pụrụ ime nke a”.

    “Ọ bụrụ ma anyị tụlee etu ihe oriri si arị elu ugbua, anyị ga-achọpụta na ihe a abụghị oge e ji anọdụ otu ebe,” ka Buhari kwuru.

    Ka anyị gaa n’ihu na-azụrụ ihe ndị emepụtara n’ala anyị. Gọọmenti anyị emeela ọtụtụ atụmatụ maka mmepe obodo anyị. N’ihi ya, ana m agba onye ọbụla ume, ọkachasị ndị ntorobịa ka ha gaa n’ihu na-arụ ọrụ dị oke mkpa iji wulite ọnọdụ obodo anyị,” ka Buhari kwuru.

  16. Atụmatụ ịzụtara Onyeisiala na osote ya ụgbọelu abụọ gosiri na gọọmenti enweghị mmetụta gbasara ndị ọ na-achị - Peter Obi

    Peter Obi

    Ebe foto si, Peter Obi/Instagram

    Onye jiri aha Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntụliaka 2023 bụ Peter Obi akatọọla atụmatụ ụlọomeiwu na-eme ịzụtara Onyeisiala Bola Tinubu na osote ya bụ Kashim Shettima ụgbọelu ọhụrụ abụọ ma kwuo na nke ahụ gosiri na gọọmenti enweghị mmetụta gbasara ndị ha na-achị.

    Obi depụtara nke a n’akara ọbaozi X ya n’ụbọchị Mọnde 17 Juun 2024.

    O kwuru na mkpebi ahụ bụ nke na-ekwesịghị ekwesị n’ihi ogogo ihe isiike ndị Naịjirịa na-agabiga ugbua tinyere enweghị nchekwa, agụụ, ụbịam ọnụntụ na ikikere naịra na-agba ọnyụpa.

    Obi gara n’ihu kwuo na ihe gọọmenti kwesịrị ime ugbua bụ ịchọta ụzọ a ga-esi belata nhujuanya ụmụ mmadụ ma gboo nsogbu ha karịa ị dị na-ebi ndụ okomoko.

    Peter Obi depụtara ozi ahụ dịka kọmitii ụlọomeiwu nnọchiteanya na-ahụ maka nchekwa obodo gwara Gọọmenti Etiti ka ọ zụta ụgbọelu ọhụrụ abụọ maka Onyeisiala Bola Tinubu na Osote ya bụ Kashim Shettima n’ihi na ndị nke ochie ha nwere etozughị oke ife n’elu.

  17. "Ụdịrị ọrịa otolo dị na Legọs na-akpa ike ma na-efesi ike" - Kọmịshọna ahụike

    Ndị na-arịa ọrịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Kọmịshọna ahụike na Legọs steeti bụ Ọkammụta Akin Abayomi ekwuola na ụdịrị ọrịa otolo na-efegharị na steeti ahụ bụ nke kacha sị ike ma nwee ike n'ofufe.

    O kwuru nke a n'ozi o nyere gbasara ọnọdụ ọrịa ahụ na steeti ya n'ụbọchị Monde.

    Ọ sịkwa na ha chọpụtara na ọnụọgụgụ ndị butere ọrịa ahụ jizi nwayọ agbadata dịka o nyere ọnụọgụgụ ahụ ka: mmadụ 350 mere mkpesa maka ọrịa ahụ, mmadụ 17 butere ya ebe mmadụ 15 nwụrụ site na mmiri ikọ mmadụ n'ahụ.

    iji nyere ndị mmadụ aka Abayomi dụrụ ọdụ sị "debe akụkụ gị ọcha, ṅụọ naanị mmiri dị ọcha ma gbaga ụlọọgwụ ma o nwee ka ahụ si mee gị"

    O kwukwara na ụlọọgwụ gọọmentị niile na steeti ahụ ga-enye ndị butere ọrịa ọgwụgwọ n'efu.

    Skip Instagram post
    Hapụ Instagram ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of Instagram post

    Ndọmọdụ a Kọmịshọna Abayomi nye dịkarịrị ndị na-eme emume Salah mkpa dịka ọ sịkwa ha hie asaa n'anya ma debe ebe ha na-esi nri ọcha.

    Ọ sịkwa na ngalaba dị ịcheiche dịka NCDC bụ ụlọọrụ na-ahụ maka ọrịa na-efe efe na Naịjirịa, ngalaba ahụike mbaụwa bụ WHO, nakwa UNICEF na-enye ha nkwado n'ịlụso ya bụ ọrịa otolo ọgụ.

  18. Aka akparala mmadụ atọ na ezu ohi batịrị ụgbọala n’Enugwu

    Ndị ohi batịrị ahụ

    Ebe foto si, Enugu state Police

    Ndị uweojii Enugwu steeti ekwuola na aka kpaara mmadụ atọ maka ịzụohi batịrị ụgbọala na steeti ahụ.

    Ọnụ na ekwuru ndị uweoji bụ Daniel Ndukwe mere ka a mata nke n’akwụkwọ ozi ọ kesara ndị nta akụkọ.

    N’ọzị ahụ, Daniel kwuru na “ndị uweoji nọ ọrụ na mpaghara Awkunanaw dị n’Enugwu jidere ụmụnwoke atọ aha ha bụ Eze Ebuka, dị afọ 24, Nnamdi Chukwuemeka, dị afọ 21, na Friday Ilo, dị afọ 31 maka ịzụ ọhị batịrị ụgbọala”.

    “Anyị nwetara mkpesa dị icheiche gbasara mmadụ atọ ndị ahụ tupuu ndị ọrụ anyị awuchie ha n’Akwunanaw n’ihe dịka elekere abụọ nke ehihe n’ụbọchị Fride garaaga”.

    “Mgbe ndị ọrụ anyị gbara Eze Ebuka na Nnamdi Chukwuemeka ajujuọnụ ha kwuputara na ha zuru ọtụtụ batịrị ụgbọala ma resi ya Friday Ilo bụ onye nke anyị jidere ma nweta batịrị rụrụ ịrị na ise n’aka ya”.

    “Anyị hụrụ batịrị dị icheiche, ma nke ụgbọala, nke keke, na ndị ọzọ”.

    Ndukwe gara n’ihu kwuo na ndị uweoji ga akpụpụ ha ụlọikpe na ha mechaa nyocha.

  19. Ndị uweojii anwụchiela ndị ohi 2 n’Anambra steeti, napụta ha egbe

    Ndị ohi abụọ anwụchiri n'Anambra

    Ebe foto si, Anambra Police

    Ndị uweojii Anambra steeti anwụchiela mmadụ abụọ a na-achọ achọ n’ihi ebubo idina nwaanyị n’ike na iji egbe ezu ohi.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kwupụtara nke a n’ozi ọ wepụtara n’ụbọchị ụka Sọnde 16 Juun 2024.

    Dịka o siri kwuo, ọ bụ n’ụtụtụ Satọde 15 Juun 2024 ka ndị uweojii nwụchiri Chukwuma Diji gbara afọ iri atọ na ise (35) a na-etu Sympathy maọbụ Chi-boy na Michael Edochie gbara afọ iri atọ na otu (31) a na-etu Mikel.

    Ozi ahụ kọwara na Chukwuma Diji bụ nwaafọ Obinagu Umudun dị n’Abagana ebe Michael Edochie bụ nwaafọ Eziabunabu Abagana.

    Egbe na mgbọ egbe anapụtara ndị ohi n'Anambra

    Ebe foto si, Anambra Police

    A na-ebo ha ebubo ịkwaso otu nwaanyị nọ na di iko n’ike n’Obinagu Abagana tinyekwara nwaagbọghọ ha tikara ụlọ ya ma kwasoo ya na enyi ya nwaanyị iko n’ike ma werekwa egbe napụ ha ego.

    N’oge a nwụchiri ha, ndị uweojii napụtara ha egbe ntụ ‘double barrel’ abụọ na otu egbe ntụ ‘single barrel’ tinyekwara mgbọ egbe isii na otu ọgbaatumtum Q-link.

    Ka o siladị, kọmịshọna ndị uweojii Anambra steeti bụ Nnaghe Itam enyela iwu ka enyefee ha n’aka ngalaba ndị uweojii Criminal Investigation Department maka ilebaara ha anya.

    Ọgbaatumtum anapụtara ndị ohi n'Anambra

    Ebe foto si, Anambra Police

  20. Ọkaikpe onye uweojii gbara egbe n'ime ụlọikpe anwụọla

    Uwe ndị uweojii mba Kenya

    Ebe foto si, Getty Images

    Monica Kivuti bụ onye Ọkaikpe agbara egbe na mbido izu gara aga anwụọla site n'ahụ ọ merụrụ mgbe mgbọ tụrụ ya.

    Kivuti bụ nke otu onye uweojii gbara egbe n'ime ụlọikpe ebe ọ na-ekpe ikpe n'isiobodo Nairobi nke mba Kenya.

    Iwe onye uweojii ahụ bụ na Kivuti kagburu ohere ị si n'ụlọ abịa ikpe nke enyeburu nwunye ya tupu o si ebe ahụ gbalaga.

    Ozi nke Martha K Koome depụtara n'akara Twitter ya si na Monica Kivuti, Okaikpe kachasị n'ụlọikpe Makadara anwụọla site n'ezigbo ahụ ọ merụrụ.

    "Anyị bụ ndị ezinaụlọ ndị ọrụ ụlọikpe kwụdoro ya n'oge mwute ukwu a" ka o dekwara.

    Onye uweojii mere ihe a enyere aha ya dịka Samson Kipchirchir Kipruto nwụkwara ọnwụ dịka ndị uweojii ibe ya gbagburu ya mgbe o mechara ihe ahụ.

    Ọgbakọ ndị ọrụ ụlọikpe n'obodo ahụ ekwuola na ha ga-amalite atụmatụ ihibe nchekwa zụrụoke maka ndị otu ha.

    Ndị uweojii sị na nyocha banyere ihe mere ka na-aga n'ihu.