Etu e si gbaara ụmụafọ Naịjirịa 103 ụgbọ nwamkpị site na mba Turkey
Akụkọ kwuru na otu onye Fada so na ndị nwụrụ na mwakpo ahụ
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Ikechukwu Kalu, Chinonso Ugorji, Jessica Nwankwo, Uche Akolisa, Michael Ngene, Michael Ilediagu
Gọvanọ Abia Steeti ekwela ndiagha nkwa maka ezi nkwado gọọmenti.
Nkọwa foto, Gọvanọ Alex Otti
Gọvanọ Abia Steeti bụ Alex Otti, a gala n'ihu n'ịkwalite mmụọ ndịagha
Naijiria mgbe ọ gara nleta na 144 Battalion dị
na mpaghara Osisioma nke steeti ahu.
Nleta Gọvanọ Otti n’ogbe ndịagha ahụ sochiri nleta ya ụbọchị Satọde Juun
1 na 144 Battalion Asa, bụ ebe
o kelere ndị ọrụ nchekwa nọ ebe ahụ nakwa ịkasi nwunye ndịagha ahụ nwụrụ anwụ n'ọnwa Mee 30 n’Obikabi obi.
Gọvanọ Otti kwere ndịagaha ahụ nkwa
na gọọmenti Abia steeti ga-aga n’ihu na-akwado ha dịka ha na-arụ ọrụ ichekwa obodo na ụmụ amaala.
N’okwu ya “Abịara m ka m gwa unu okwu maka ihe ogbugbu ndị
otu unu n’otu izuụka gara aga na Obikabia
dị n'okpuru ọchịchị Obingwa”
“A chọrọ m ka unu mee nyocha nke
ọma n'ihi na ụfọdụ n'ime ndị ejidere na nyocha ahụ nwere ike ịbụ ndị aka ha
dị ọcha”
Ọ bụghị eziokwu na gọọmenti kpebiri ịkwụ N105,000 dịka ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ - Bayo Onanuga
Ebe foto si, Getty Images/Tinubu/twitter
Nkọwa foto, Wale Edun na Bola Tinubu
Onye ndụmọdụ pụrụiche na-mgbasa ozi nke onyeisiala bụ Bayo Onanuga ekwuola na ọ bughị eziokwu na mịnịsta
na-ahụ maka akụnaụba bụ Wale Edun weputara N105,000 dịka ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ
ndịọrụ Naịjirịa.
Onanuga mere ka amata nke a n'ozi o wepụtara n'akara soshal midia 'X' ya taa.
Ọ kpọrọ oku ka ohanaeze leghara akụkọ ahụ na-efeghari anya maka na ọ bughị eziokwu.
NDLEA anwụchiela ndị bu ọgwụike na-aga Saudi Arabia maka njem ala nsọ
Ebe foto si, NDLEA
Ụlọọrụ na
ahụ maka mgbọchị ọgwụike a kpọrọ National Drug Law Enforcement Agency
(NDLEA) nwụchịrị mmadụ anọ ndị na-aga
alansọ maka ibu ọgwụike.
Ndị ahụ
NDLEA nwụchịrị na-akwadozi isoro ndị ọzọ gaa alanso n’ụbọchị Wenesde tupuu a nwụchie ha.
Ọnụ na-ekwuru ndị NDLEA bụ Femi Babafemi kwuru na mmadụ anọ ndị ahụ ha jidere nọ n’ụlọ ọrịrị
na nkwari dị na Ladipo, Oshodi nke Lagos steeti bụ ebe e dobere ndị na-aga alansọ
tupuu a nwụchie ha.
Ọ gara n´ịhụ
kwụọ na ndị a e jidere gụnyere ụmụnwoke atọ na otu nwaanyị.
Onyeisi
ndị NDLEA bụ Mohamed Marwa kwuru na ha na-agba mbọ ịnwụchị ndị niile na-eji aghụghọ aga alansọ ka ha nwee ike na-ebupu ọgwụike nke na-emetọ aha Naịjirịa na mbaụwa.
“NDLEA na
ogbo ha na Saudi Arabia ga-ejikota aka ọnụ jide ndị na-ebupu maọbụ bụbata ihe
niile ịwụ machịbịdọrọ ma taa ha ahụhụ.
Gọọmemti etiti ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ha ka na-agwụ 'subsidy' mmanụ ụgbọala
Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị
etiti ekwusiela ike ebe ha kwụụ banyere mwepụ ego mgbakwụnye ha na-akwụ na mmanụ
ụgbọala na ọ gbanwebeghi site n’ihe ọ bụ kamgbe Onyeisiala Bola Tinubu kwuru na
a kwụsịla ya n’ọnwa Mee 2023.
Ha kwuru na
ọ kwụsịla bụ na ọ kwụsịla, na o nweghi ego tarị naịra 5.4 ọbụla gọọmentị mawapụtara
maka ịkwụ maka ụgbọala n’afọ 2024.
Minista
na-ahụ maka akụnaụba bụ Wale Edun kwuru na iwu ahụ onyeisiala Tinubu nyere
banyere nkwụsị ịkwụ ụgwọ mmanụ ụgbọala ka kwụsi ike.
O kwuru na
gọọmentị na-agbasi mbọ ike ibelata ahụhụ ndị mmadụ na-ata site n’iwepụta atụmatụ
dị iche iche.
Ha gakwara
n’ihu katọọ akụkọ ahụ na-efegharị nke kwuru atụmatụ gọọmentị wepụtara iji hazie
akụnaụba bụ asị ọcha na o sighi ha n’aka.
Ha kwuru ka
ndị Naịjirịa wepụ anya n’akwụkwọ ndị ahụ, na ọ bụ akwụkwọ atụmatụ nke Onyeisiala
Tinubu na-etinyebeghi aka na ya.
Mmadụ karịrị 27 anwụọla n'ogbunigwe Isreal tụrụ n’ogige izerendụ otu United Nation
Ebe foto si, EPA
Ogbunigwe
mba Isreal tụrụ n’ogige izerendụ nke otu United Nations dị na Gaza ebe ọtụtụ ndị
gbara ọsọndụ bi egbuola ihe karịrị mmadụ iri abụọ na asaa dịka ndị ọrụ si kwuo.
Ndịagha mba
Isreal kwuru na ha tụrụ ogbunigwe n’ụlọakwụkwọ otu United Nations nwe bụ nke “otu
Hamas bi n’ime ya”.
Ndị ntaakụkọ
bi n’ebe ahụ gwara BBC na ụgbọelu agha nke mba Isreal tụrụ ọnụ ogbunigwe abụọ n’ime
ụlọakwụkwọ nke ogogo ya dị elu bụ ebe ndị gbara ọsọndụ bi.
Ọnụ
na-ekwuru otu Hamas ebola Isreal ebubo “igbu ọchụ”.
Ụgbọala e
ji ebu ozu nakwa ndị ọrụ gbata gbata agaala ebe ahụ na-ebuga ndị merụrụ ahụ na
ndị nwụrụ n’ụlọọgwụ nakwa ụlọozu.
Ihe onyonyo
na-efegharị na soshal midia gosiri ụlọakwụkwọ mebiri emebi nakwa ozu ndị mmadụ
a fụchiri na nkịrịka akwa n’ụlọozu.
“Agha atụọl
anyị ọnụ! A chụpụla anyị n’ụlọ anyị ọtụtụ oge. Ha gburu ụmụaka anyị mgbe ha
na-ehi ụra.” Ka otu nwaanyị merụrụ ahụ kwuru n’ihe onyonyo.
Onyeisi
ngalaba mgbasaozi otu Hamas bụ Ismail al-Thawabta jụrụ ịnabata ihe Isreal na ndịagha
otu Hamas zoro n’ime ụlọakwụkwọ United Nation ahụ.
“Ndị a na-akọ
akụkọ ụgha iji kwadoo mbụ na ọchụ ha na-egbu megide ọtụtụ ndị gbara ọsọndụ,” ka
ọ gwara ụlọ ntaakụkọ Reuters.
Ụlọọrụ nchekwa
mba Isreal (Isreal Defence Forces) kwuru na ụgbọelu ha tụrụ ogbunigwe kpọmkwem
n’ogige ndị Hamas dị n’ime ụlọakwụkwọ Unrwa na mpaghara Nuseirat.
O kwuru na ha
gburu otu agha nnupuisi Hamas na otu Jihad na-eyi ndụ egwu bụ ndị so wakpoo
obodo ha n’ụbọchị asaa nke ọnwa Ọktoba afọ 2023 nke butere ọnwụ mmadụ 1,200 ma tọrọ
mmadụ 251.
Kamgbe ahụ
e gbuola ihe ruru mmadụ 36,580 n’obodo Gaza dịka minista ahụike nke ngalaba
Hamas si kwuo.
Mba Isreal
kwuru na ha mere nyocha ọfụma iji hụụ na ọtụtụ ndị nkịtị agaghị emerụ ahụ tupu
ha atụọ ogbunigwe ahụ.
Igbo ndị ọma ndewo nụ ooo!
Anyị ji aka na unu tetara ụfọma taa?
Biko bịa nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo nke taa maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.
Daalụ!
NLC na gọọmenti etiti amalitela mkparitaụka ụgwọọnwa opekatampe n’Abuja
Ebe foto si, Nkeiru Onyejeocha/Facebook
Nkọwa foto, Nzukọ gọọmenti na otu jikọrọ ndịọrụ
Gọọmeti etiti na otu jikọrọ ndịọrụ amalitela nzukọ banyere
ụgwọọnwa opekatampe ka ha kwusiri abụbụọrụ.
Nzukọ a nke kọmitii gọọmenti hibere maka ụgwọọnwa opekatampe ahụ
malitere ozo taa n’Abuja iji kwekọrita ụgwọọnwa opekatampe ndịọrụ.
Ndị nọ na nzukọ ahụ gunyere onyeisi NLC Joe Ajaero, onyeisi TUC
Festus Osifo.
Ndị ọzọ gunyere minista na-ahụ maka akụnaụba Wale Edun, minista
na-ahụ maka akụnaụba na ndozi Atiku Bagudu, minista na-ahụ maka ọrụ Nkeiruka
Onyejeocha, onye nọchitereanya odeakwụkwọ gọọmeti etiti na ndị ọzọ.
Cheta na onyeisiala Bola Tinubu nọrọ ụbọchị Tuzde 4 Juun 2024
nye kọmitii ahụ iwu ka ha mee ngwa ngwa wepụta ụgwọọnwa opekatampe ndịọrụ n’oge
n’adighị anya.
Ndịagha Naịjirịa ekwuola na onweghi ndị mmadụ ha gburu n’Ọwụwa Anyanwụ
Ebe foto si, Nigerian Army
Ndịagha Naịjirịa
agọrọla ụkwụ na aka ha n’ebubo kwuru na gburu ọtụtụ ndị mmadụ na mpaghara Ọwụwa
Anyanwụ nke Naịjirịa.
Ebubo na ndịagha
gburu ọtụtụ mmadụ si n’ọnụ Simon Ekpa bụ onyendu otu ngalaba Indigenous People
of Biafra (Ipob).
Mana ọnụ
na-ekwuru ndịagha bụ Onyema Nwachukwu, n’ozi o wepụtara kwuru na ndịagha emeela
nyocha banyere ebubo bụ nke na-ewu na soshal midia ma chọpụta na o nweghi ihe
akaebe kwadoro ebubo ahụ.
Ọchịagha
Nwachukwu kwuru na ihe onyonyo ahụ na-efegharị nke gosiri ka ndịagha na-agba
egbe mere na mgbe ndịagha mmiri na-anwale ngwagha ha nwere.
Ekpa wepụtara
ozi banyere ihe onyonyo ahụ ma kwuo na ndịagha na-agbagbusi ndị mmadụ na mpaghara
Ọwụwa Anyanwụ ma tinye ozu ha n’ime mmiri,
Ọchịagha Nwachukwu
gara n’ihu kwuo na ihe ahụ mere na mpaghara Ndịda Anyanwụ nke Naịjirịa na ọ bụghị
n’Ọwụwa Anyanwụ na o nweghi ihe gosiri na ọ bụ ndị mmadụ ka a na-agba egbe n’ime
mmiri.
Cheta na ndị
ojiegbe nọọrọ n’ụbọchị Tọzde gara aga wakpoo ogige ndịagha dị n’Obikabia
Junction dị n’Aba, Abia Steeti ma gbagbuo ndịagha ise.
Ndịagha
kwuru na ọ bụ otu Ipob kpara arụ ahụ mana onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ Emmanuel
Iwuanyanwu kwuru na aka ya na Nnamdi Kanu bụ onyendu Ipob adịghị na mwakpo ahụ.
Ụlọomeiwu Kaduna steeti agwala EFCC ka ha nyocha El-Rufai na ndị ọzọ.
Ebe foto si, Nasir El-Rufai/Instagram
Nkọwa foto, Nasir El-Rufai
Ụlọomeiwu
Kaduna steeti a gwala ụlọọrụ gọọmentị na-ebu agha megide nrụrụraka bụ 'Economic
and Financial Crime Commision' (EFCC) ka ha bido nyocha na ikpe aka chibụru
steeti ahụ bụ Nasir El-Rufai na ndị ọzọ eboro ebubo rụrụ ya ọrụ oge ọ nọ n’ọchịchị.
Kọmitii ụlọomeiwu ahụ hibere iji nyochaa El-Rufai nyere ndụmọdụ a taa n'akwụkwọ ozi
ha degara ụlọomeiwu ahụ.
Onyeisi
Kọmitii ahụ bụ Henry Zacharia kwuru na gọọmenti El-Rufai biri ego n’usoro megidere iwu ma nwere ya mee ihe
ozo.
Onyeisi
ụlọomeiwu Kaduna, Yusuf Liman, kwuru na ọchịchị El-Rufai zuru ego ruru ijeri
naira 423 (N423b).
O nyere iwu ka ụlọọrụ EFCC ga-n’ihu nyocha maa kpe El-Rufai na ndị
ọzọ so ya rụọ ọrụ ikpe.
A nwụchiela onye omeiwu Zamfara Steeti maka ịkwado ndị ekperima
Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii
Zamfara Steeti ekwuola na ha anwụchiela ọtụtụ ndị isiokpokpo na steeti ahụ gụnyere
otu onye omeiwu steeti maka ebubo na aka ha dị n’akpankpa ndị ekperima na-eme
na steeti.
Kọmishọna
ndị uweojii bụ Mohammad Dalijan kwupụtara nke a mgbe onyeisi otu na-ebuagha megide
iyi ndụ egwu n’otu United Nation bụ Thomas Parker kpọptụụrụ ya n’isiụlọọrụ ndị uweojii
na Zamfara.
Mana
Dalijan akpọghị aha ndị isiokpokpo ahụ ha nwụchiri maka mpụ a.
Ọ rịọrọ otu
United Nation ka e nyere ha aka hiwe ọtụtụ ngalaba na-enye aka inyochapụta mpụ
dịka ọ dị na steetị ndị gụnyere Lagos, Borno nakwa ndị ọzọ.
Dalijan
kwuru n’ezie na mpụ na iyi ndụ egwu na-ebelata na steeti ahụ maka itinye uchu n’ọrụ
nke ndị ọrụ nchekwa na-etinye.
Na nzaghachị,
Parker kwuru na ha bịara na Zamfara Steeti ịza oku enyemaka nke Gọvanọ Dauda
Lawal kpọrọ otu United Nations banyere ọnọdụ nchekwa.
O kwuru na
ha bịara ime nchọpụta etu ọnọdụ nchekwa dị nakwa ụzọ ha ga-esi enye aka.
Kọmishọna ndị
uweojii n’Anambra steeti bụ Nnaghe Obono enyela iwu ka a malite ime nnyoch banyere
mmebi nakwa ozuzu akụrụngwa akwammiri Niger nke abụọ dị n’Onitsha.
Onye
na-ekwuchite ọnụ ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga kwupụtara na kọmishọna
ahụ nyere onyeisi ndị uweojii na mpaghara ebe akwammiri ahụ dị iwu ka ọ malite ime
nnyocha iji chọpụta ndị kpara ajọ agwa ahụ.
Ikenga rịọrọ
ohanaeze ka ha dere juu dịka nnyocha ahụ na-aga n’ihu.
Nkọwa foto, Foto David Umahi
N’aka nke ọzọ,
mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ David Umahi akatọọla mmebi nakwa ozuzu e zuru akụrụngwa akwammiri ahụ.
O kwuru na
ajọ agwa ahụ bụ ihe a na-atụghị anya n’ihi na evnwere ndị ọrụ nchekwa ọ bụ ọrụ
ha ịchekwa akwammiri ahụ.
Umahi kwuru na ọ ga-eziga ndị ọrụ nchekwa kara aka n’akwammiri ahụ iji gbochie ajọ agwa ahụ.
O kwere nkwa ezi onyinye nye onye ọbụla ga-enye aka ijide ndị mebiri ma na-ezu akụrụngwa akwammiri ahụ.
Ebe foto si, Peter Obi/Instagram
Nkọwa foto, Peter Obi
N'otu aka ahụ, onye zọrọ ọkwa onyeisiala n’otu Labour Party na ntụliaka afọ 2023 bụ Peter Obi akpọọla
oku ka gọọmenti tinye uchu n’ọrụ ha iji nwụchie ndi ahụ mebiri ma zuo akụrụngwa akwammiri
2nd Niger Bridge.
Obi kọwara mmebi ahụ dịka ihe iche aka mgba nye gọọmenti n’ọrụ ya iji dozie obodo.
Ọ gara n’ihu
kele nwamadi ahụ wepụtara ihe onyonyo banyere mmebi ahụ nke fesara na soshal midia, maa kpọ oku
ka onye ọbụla jikọ aka chekwa akụrụngwa gọọmenti tinyere iji dozie obodo.
Mmadụ ruru 30 na-egwu ọlaedo ka tọrọ n’ime ala na Niger Steeti
Ebe foto si, NSEMA
Ihe ruru
mmadụ iri atọ ka tọrọ n’ime ala bụ ebe ha dabara mgbe ha na-egwupụta ọlaedo na
Niger Steetị dị na mpaghara ugwu nke Naịjirịa.
Mkpamkpa a
mere n’ụbọchị Mọnde mana akụkọ apụtaghi ihe ọsịsọ banyere maka abụbụọrụ ndị ọrụ
Bekee gbara ụbọchị ahụ.
O mere n’obodo
a kpọrọ Galkogo dị n’okpuruọchịchị Shiroro nke steeti ahụ dịka a sị na ọ bụ oke
mmiri ozuzo mere ala ahụ jiri zee.
Onyeisi ọrụ
gbata gbata na steeti ahụ bụ Abdullahi Baba Arah gwara BBC na otu onye anwụọla
ebe azụpụtala ihe ruru mmadụ isii dịka ha ka na-agba mbọ ịzọpụta ndị ka tọọrọ
ebe ahụ.
Niger so n’otu
steetị na Naịjirịa nwere ọtụtụ ihe ọnatarachi mana nsogbu nchekwa na-echere ha
aka mgba.
Na mpaghara
ahụ, a na-ahụta ka ọtụtụ ndị mmadụ na-egwupụta ihe ọnatarachi ndị a n’ụzọ iwu
na-akwadoghi na-enweghi ezi nkwado maka ihe izendụ.
A kpụla nwaanyị nwe 'Arrow of God Orphanage' Anambra, maka ịgba mgbere ụmụaka
Ebe foto si, Arrow of God Orphanage/Facebook
Ngalaba na-ebuagha megide mgbere mmadụ bụ 'National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons9Naptip) akpụp.ụla onye nwe ụlọ nlekọta ụmụaka enweghị nne'Arrow of God Orphanage' ụlọikpe maka ebubo ịgba mgbere mmadụ.
A kpụpụrụ Clara Chinwe Deborah Ogo bụ onyeagha lara ezumike nka n'Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Ọka, isiobodo Anambara steeti maka ebubo ire nwa ọhụrụ nwaanyị dị ọnwa ise nke megidere Akụkụ nke 21 Iwu megidere ịgba mgbere mmadụ nke afọ 2015 ,dịka ọnụ na-ekwuru NAptip bụ Adekoye Vincent, si gbaa n'ama n'ozi o wepụtara na nsonso a.
Cheta na Gọọmentị Anambra steeti nwụchiri Ogo nwe ụlọ ndị enweghị nne ahụ dị Nkwelle-Ezunaka, n'Okpuru Ọchịchị Oyi dị n' Anambara Steeti, n'aka Naptip ka onye ntaakụkọ mechara nnyocha gbara n'anwụ arụ mgba mgbere ụmụaka na-eme n'ọgige ahụ.n'afọ 2023.
'Arrow of God Orphanage' nwere ogige ha na Legọs nakwa n'Anambra steeti.
Etu ịgba obere nwa nri nwereike isi gbuo ya
Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe
ukwu dị na Ghana atụọla otu onye nlekọta ụmụaka n’ụlọakwụkwọ Happy Bloomers
Private School mkpọrọ afọ ise maka ịgba obere nwa dị ọnwa 11 nri ma gbagbuo ya.
Otu ihe
onyonyoo fesara ebe niile n’afọ 2021 gosiri ebe onye nlekọta ụmụaka ahụ gbara
afọ 56 aha ya bụ Clara Yanyi-Ampah kefere obere nwata aka n’azụ ma na-agba ya
nri dị n’ime iko.
Nwata ahụ nọ
n’ebe akwa ma na-esi ọnwụ mana onye nlekọta ahụ gara n’ihu na-agba ya nri.
Mgbe ọ gasịrị
obere oge, nwata ahụ e dere duu ma kwụsị iku ume.
Ụlọakwụkwọ
Happy Bloomers ekwuola na ihe onye nlekọta ụmụaka ahụ mere bụ nke megidere iwu ụlọakwụkwọ
ahụ.
Nnyocha e
mere nwata ahụ n’oge ọ nwụrụ gosiri na ụmụ irighiri nri banyere ya n’ụfụrụkpọ.
Nri gara
mechie ọwa ikuku nwata ahụ.
Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Onyeisiala Mexico ọhụrụ bụ Claudia Sheinbaum
Ebe foto si, Getty Images
·A
mụrụ Sheinbaum n’abalị 24 ọnwa Juun 1962 na mba Mexico
·Nna
ya bụ Carlos Sheinbaum bụ onye na-azụ ahịa nakwa onye na-ere ọgwu nke nne na
nna ya sitere Lithuania bata Mexico n’ime afọ 1920.
·Nne
ya bụ Annie Pardo bụ onye Dọkịta nakwa onye ‘Biologist’ nke nne na nna ya bụ ndị
Sephardic Jew si Bulgaria wuchie n’afọ 1940.
·Sheinbaum
tolitere n’obodo ndị kpatara ego dị na mpaghara ndịda isi obodo Mexico bụ ebe ọ
nọọrọ na-ekwu maka ndọrọndọrọ ọchịchị oge niile.
·Sheinbaum
gara akwụkwọ n’otu ụlọakwụkwọ na-akwalite nkwụrụnankeonwe ụmụakwụkwọ bụ nke ejighị
mara mba Katolik. Ọ bụ n’ụlọakwụkwọ ahụ ka o nọọrọ wulite akparamaagwa nwaanyị
na-eme ihe ike.
·Amlo
hopụtara Sheinbaum n’ọkwa ma nye ya ọrụ abụọ ndị gụnyere; ịzacha ma kpochaa otu
n’ime obodo ndị kachasị nwee ureghure n’ụwa dum tinyekwara ịrụ okporoụzọ Periférico
nke abụọ, nke bụ okporoụzọ kachasị buo ibu na mba ahụ. Ọ rụchapụrụ ọrụ abụọ ndị
ahụ.
·Mgbe
ọchịchị Amlo kụụrụ ọnụ n’afọ 2006, Sheinbaum laghachiri n’ọrụ nkụzi ma soro na
ndị nwetara onyinye nkwanyeugwu ‘Noble Peace Price’ maka ime nnyocha gbasara
mgbanwe ọnọdụ ihu eluigwe.
·O
tinyekwara aka na ndọrọndọrọ ọchịchị ma bụrụ ọnụ na-ekwuru Amlo n’oge achụmtavootu
onyeisiala ya kụrụ afọ n’ala n’afọ 2006 nakwa 2012.
·N’afọ
2015, ọ banyere na ndọrọndọrọ ọchịchị n’uju dịka ọ zọrọ ọkwa ‘Mayor’ Tlalpan dị
na Mexico ma nwetakwa mmeri.
·Dịka
ọ gasịrị afọ atọ, Amlo nwetara mmerị dịka Onyeisiala mexico ebe Sheinbaum
nwetara mmeri dịka onye ‘Mayor’ Mexico City.
Claudia Sheinbaum abụrụla onyeisiala nwaanyị mbụ na Mexico
Ebe foto si, Getty Images
Claudia Sheinbaum dị afọ 61 abụrụla nwanyị mbụ meriri ntụlịaka onyeisiala na mba Mexico.
Na nsonazu ndị na ahazị ntụrịaka na mba Mexico deputara, Claudia Sheinbaum ji ihe dịka pasentị 58 maọbụ pasentị 60 were na merie na ntụlịaka ahụ a mere n’ụbọchị Sunde.
Claudia ji ihe ruru pasnetị 30 were na emeri onye ojiegoachụego bụ Xóchitl Gálvez.
Claudia ga e were ọkwa onyeisiala n'ụbọchị nke mbụ na Oktoba afọ a bụ ụbọchị ikpeazu onyeisiala ha ugbua bụ Andrés Manuel López Obrador ga anọ n'ọkwa.
Claudia kwere nkwa na ya ga eso usoro Andrés Manuel López Obrador ji achị bụ maka nkwarite ọnọdụ mmadụ bụ otu ihe njiri mara ọchịchị López.
Ọ gwara ndị na eso ya na “nke a bụ nke mbụ nwanyị na abụ onyeisiala n’ihe ruru afọ 200 na mba Mexico”.
“Ekwuola m ya na mbido, ọ bụghị naanị ịnọ n’oche onyeisiala, ọ bụ maka ụmụnwanyị niile”.
“Agaghị m ada mba imeputa ebum n’obi unu”.
Claudia gara n’iru kelee onye ọzọ zọrọ onyeisiala bụ Xóchitl Gálvez maka ikweta na emeriala ya.
Ndị uweojii Anambra steeti achọwala nwaanyị tufuru nwa ọhụrụ ya
Ebe foto si, ANAMBRA POLICE
Komishiona ndị uweoji na Anambra steeti, CP Nnaghe Obodo enyeela ịwụ ka awuchie ndị aka ha di na ọnwụ nwa ọhụrụ a hụrụ ozu ya ebe a na ewupu ahịhịa n’akpa n’Anambra steeti.
Nyocha mbụ e mere gosiri na ọ bụ nwa ọhụrụ a mụrụ ka dị naanị otu abalị bụ nke nwaanyị echeere bụ nne nwa ahụ tufuru ya n'ime akpa.
Ọnụ na ekwuru ndị uweoji n’Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga mere ka amata nke a n’ozi ọ nyere ndị nta akụkọ na abalị abụọ nke ọnwa Juun.
Akwụkwọ ozi ahụ kwuru “nyocha anyị megoro ugbua na egosi na nwatakịrị ahụ erubeghị abalị abụọ”.
Ọ gara n’ịhụ kwụọ na “nwanyị a na enyoenyo na ọ bụ ya mụrụ nwa ahụ bụ ihe tufura ya n’ikpo ahịhịa”.
Kọmịshịọna ndị uweoji jị ohere ahụ kpọkụọ ohanaeze, na onye ọbụla nwere ozi ga enyere ndị uweoji aka ijide nwanyị ahụ aka ya dị na ya.
Ihe mberede okporoụzọ ataala isi mmadụ 3 n’Anambra steeti
Ebe foto si, FRSC ANAMBRA STATE
Ihe mberede
okporoụzọ emeela n’Idemili Obosi nke Anambra steeti ma gbuo mmadụ atọ.
Ọnụ
na-ekwuru ụlọọrụ Federal Road Safety Corps (FRSC) n’Anambra steeti bụ Margaret Onabe
kọwara nke a dịka eziokwu n’oge onye ntaakụkọ BBC kpọrọ ya n’ekwentị.
Onabe sịrị
na nke a mere n’ụbọchị ụka Sọnde 2 Juun 2024 mgbe o jiri ihe dịka nkeji ise gaa
elekere itoli nke ụtụtụ.
Dịka o siri
kwuo, ihe mberede ahụ gụnyere otu ọgbaatumtum, ụgbọala keke atọ na-acha odoodo,
ụgbọala Toyota Hiace abụọ, otu ụgbọala Mack trailer ọcha na otu ụgbọala Toyota
Camry.
Mmadụ iri
na ise bụ ndị zutere ihe mberede ahụ dịka atọ n’ime ha nwụrụ, ise enweta ihe
mmerụahụ ebe asaa ndị ọzọ bụ ndị anapụtara na-enweghị ihe mmerụahụ ọbụla.
Ndị hụrụ ka
njinji ahụ siri jie kwuru na ndị na-anakọ ụtụ chọrọ ịnara ndị ọkwọụgbọala keke
ego tupu nnukwu ụgbọala ‘trailer’ ahụ na-enweghị ike ijikọlata onwe ya esuo ụgbọala
niile ahụ.
Ka osiladị,
ndị na-agafe n’okporoụzọ n’oge ihe mberede ahụ mere kpọgara ndị merụrụ ahụ ụlọọgwụ
tupu ndị ọrụ FRSC awụchie, ka Onabe kwuru.
Anapụtachaala ụmụakwụkwọ Confluence University niile a tọọrọ - Gọọmenti Kogi
Ebe foto si, CONFLUENCE UNIVERSITY/FACEBOOK
Anapụtala ụmụakwụkwọ
mahadum Confluence University of Science and Technology niile a tọọrọ izuụka atọ
gara aga.
Kọmịshọna
na-ahụ maka mgbasaozi na nzirịtaozi na Kogi steeti bụ Kingsley Femi Fanwo kwupụtara
nke a n’akara ọbaozi X ya n’ụbọchị Sọnde 2 Juun 2024.
O dere n’ozi
ahụ sị “Gọọmenti Kogi na-ekwupụta ntọhapụ ụmụakwụkwọ asatọ nke Confluence
University of Science and Technology Osara fọdụrụ n’aka ndị ntọ.”
N’ozi ahụ,
Femi Fanwo kwuru na anapụtala ụmụakwụkwọ CUSTECH asatọ fọdụrụ n’aka ndị ntọ dịkwa
ka gọvanọ steeti ahụ bụ Ahmed Usman Ododo nyerela ntụziaka ka enye ụmụakwụkwọ
ndị ahụ na ndị nwe ha ezi nkwado iji nweta onwe ha nke ọma.
O kelere onyeisiala
Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu maka ịrọpụta “ngwongwo ndị kwesịrị ekwesị” iji hụ
na anapụtara ụmụakwụkwọ ndị ahụ ma kelekwaa ndị ọrụ nchekwa na onye ndụmọdụ
nchekwa Naịjirịa maka enyemaaka ha niile.
Ọ bụ n’abalị
9 Mee 2024 ka ndị ntọ wụchiri na mahadum ahụ mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere 9 nke
abalị ma tọrọ ụfọdụ ụmụakwụkwọ nọ n’ime ụlọakwụkwọ akwado maka ule ha.
Dịka mkpụrụ
ụbọchị atọ gasịrị, ndị uweojii steeti ahụ kwuru na ha anapụtala ụmụakwụkwọ 14 n’ime
ndị ahụ a tọọrọ.
Ụgwọọnwa opekatampe N494,000 nwere ike tikpọọ ọnọdụ akụnaụba – Gọọmenti Naịjirịa
Ebe foto si, Getty Images
Gọọmenti Naịjirịa
ekwuola okwu gbasara egwu otu jikọtara ndị ọrụ na-eyi ịbanye mfanyeakanụụkwụ
amaghị mgbe ọ ga-akwụsị n’ihi ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ.
Mịnịsta
mgbasaozi na nduziuche ọhanaeze bụ Mohammed Idris kwuru na ụgwọọnwa opekatampe N494,000
otu jikọtara ndị ọrụ na-achọ ka amalite kwụba ha bụ nke na-agaghị ekwe omume.
Idris kwuru
nke a n’oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n’Abuja. Ọ kọwara na ọnụego ahụ otu NLC
na TUC na-achọ nwere ike tisaa akụnaụba Naịjirịa.
Dịka Idris
siri kwuo “N494,000 otu jikọtara ndị ọrụ na-achọ ka amalite kwụba ha dịka ụgwọọnwa
opekatampe bụ nke ruru N9.5tr ma agbakọọ ya. O nwere ike tikpọọ akụnaụba Naịjirịa
ma metụtakwa ọdịmma ihe karịrị ụmụafọ Naịjirịa nde 200.”
Ọ bụ n’ụbọchị
Fraịde ka otu jikọtara ndị ọrụ bụ Nigeria Labour Congress (NLC) na Trade Union
Congress (TUC) kwupụtara na ha ga-amalite mfanyeakanụụkwụ n’ụbọchị Mọnde 3 Juun
2024 n’ihi ụgwọ ọkụ latrik ebuliri elu tinyere ịdamba gọọmenti inwe nkwekọrịta
banyere ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ.