You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Chaịna na Indịa ekwenyela inwe mmekọ

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Ọgọst 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Ụzọ kacha mma ị kwụsị agha bụ nkwekọrịta udo - Donald Trump

    Ka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin na-ezute, Trump na ndị ndu mba nọ n’otu NATO kpara nkata n’ekwenti ebe Trump nọ kwuo na ọ bụ i nwe nkekọrịta udo bụ naaanị usoro kacha mma ịkwụsị agha n’etiti Rọshịa na Yukren.

    Trump bụ onye ji akara ya na Truth soshal midia kwuru sị na atụmatụ ya wepụtara akala akwụsị agha kpamkpam karịa “amụma nkwụsịtụ ịkwa mgbọ”.

    Trump sị na “mpụtara na nkata ya na Putin kpara bụ nke gara nke ọma n’Alaska”.

    Ọ sị na Onyeisiala mba Yukren ga-abịa Washington DC ọzọ n’ụbọchị Monde ka ha nwee mkparịta ụka.

    Ọ sị na e mechaa ha na Putin ga-enwe mkparịtaụka nke nwereike igbochi ọnwụ ọtụtụ mmadụ.

  2. Trump ekwuola na enwebeghị nkwekọrịta ọbula, dịka ya na Putin zutere

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ya na onye otu ya na Rọshịa bụ Putin enwebeghị nkwekọrita ọbula maka ịkwụsị agha dị n’etiti Rọshịa na Yukren

    Nke a na-abịa dịka ndị isiala abụọ ahụ nwechara nzukọ ruru awa atọ n'Alaska.

    Trump kwuru sị n’agbanyeghị na enweghị nkwekọrịta, na e nwere ọganihu.

    O kwuru na Putin gosiri ezi mmasị ịkwụsị ọgụ dị n'etiti Rọshịa na Yukren.

    Dịka ha nwechara nzukọ, Trump kpọrọ onyeisiala Yukren Volodymyr Zelensky n’ekwenti ma gwa ya na ha ga-enwe nzukọ na isiobodo Amerịka bụ Washington n’ụbọchị Mọnde.

  3. Ụmụ Igbo, ụnụ asaala chi, Ọfọ anyị taa bụ ndụ mmiri, ndụ azụ. Mmiri atala ma azụ anwụla.

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo n'ụbọchị taa bụ Satọde 16 Ọgọst, 2025.

    Anyị abịala ọzọ iwetere gị akụkọ ndị na-akpọtụ n'ụwa taa.

    Biko gaa n'ihu sonyere anyị na websaịtị, Facebook, Instagram na Whatsapp chanelụ anyị ka i nweeike nweta akụkọ niile oge ha na-akpọtụ.

    Nnọọ nụ!

  4. Putin gara zọọ ụkwụ n'ebe e ji echeta mmekọ mba Rọshịa na Amerịka tupuu ọ gawa Anchorage

    Tupuu Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin agawa Alaska bụ ebe ya na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ga-enwe mkparịtaụka udo maka agha dị na Yukren, Putin gara zọọ ụkwụ n’ebe e ji echeta udo n’etiti Rọshịa na Amerịka n’oge agha mba ụwa nke abụọ.

    Ihe ahụ a kpụrụ akpụ na-egosi ụgbọelu nakwa ndị ọkwọ ụgbọelu si mba Amerịka na Rọshịa na-ekwe onwe ha n’aka nke na-echeta ụzọ ụgbọelu Alaska na Siberia.

    Otu n’ime ihe Putin na-achọ bụ ka a hụta Rọshịa dịka otu n’ime mba siri ike n’ụwa niile.

    Ọzọ bụ na Putin gara n’ebe ahụ zọọ ụkwụ ka ọ cheta age mba Amerịka na Rọshịa dị na mma na-abụghị mgbe mba abụọ ahụ na-ahụ onwe ha dịka ndị iro.

  5. A nwuchiela otu nwaafọ mba France a na-ebo ebubo nkwatu ọchịchị na mba Mali

    Ndị nchekwa nọ n'ọchịchị na mba Mali ekwuola na ha anwụchiela otu onye amaala mba France a na-enyo enyo na ọ bụ onyee ji arụ ọrụ maka nkwatu ọchịchị na mba Mali.

    Na nkwupụta nke Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa bụ Ọchịagha Daoud Aly Mohammedine mere n'ụlọorụ mgbasaozi mba Mali, ndịagha ji ọchịchị boro ebubo na Yann Vezilier nke ha na-enyocha na-arụrụ mba Fransị ọrụ, mana o nwebeghị ihe nwaamadị ahụ nakwa mba Fransị kwurula gbasara ebubo a.

    E wepụtara foto ya na nke ndị ọchịagha anwụchiri maka atụmatụ ịnapụ ọchịchị n’ike na mba Mali.

  6. Trump ekwuola na Putin agaghị eji ya mee ihe egwuruegwu, dịka ha na-akwado maka nzụkọ

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na Putin agaghị eji ya gwuo egwu dịka ha abụọ na-akwado inwe nzukọ n'Alaska maka agha dị n’etiti Rọshịa na Yukren.

    Nzukọ a ga-abụ nke mbụ ha kemgbe ọnwa isii, mana onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky agaghị eso na nzukọ ahụ.

    Onye odeakwụkwọ nchekwa UK bụ John Healey kwuru na ọ na-atụ anya na nzukọ a ga-eweta nkwekọrita zuru oke maka ịkwụsị agha.

  7. Ọhanaeze daalụ nụ, Ka ụbọchị taa maara onye niile mma

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo n'ụbọchị taa bụ Fraịde 15 Ọgọst, 2025.

    Anyị abịala ọzọ iwetere gị akụkọ ndị na-akpọtụ n'ụwa taa.

    Biko gaa n'ihu sonyere anyị na websaịtị, Facebook, Instagram na Whatsapp chanelụ anyị ka i nweeike nweta akụkọ niile oge ha na-akpọtụ.

    Nnọọ nụ!

  8. Ndị uweojji anwuchiela onye ụkọchukwu a na-enyo enyo maka idina nwaanyị n'ike

    Ngalaba ndị uweojii n'Orlu dị n'Imo steeti anwuchiela onye ụkọchukwu na onye otu ya maka idina nwaanyị gbara afo iri abụọ n'ike.

    Nke a dị n'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steti bụ Henry Okoye wepụtara n'ụbọchị Tọzde 14 Ọgọst, 2025.

    Okoye sịrị na onye ụkọchukwu ahụ a na-enyo enyo, aha ya bụ Ikenna Emmanuel dị afọ iri ato na abụọ ma bụrụ onye Umuobom dị n'okpuru ọchịchị Ideato South. Ọ bụkwa onye na-elekota ụlọụka Authentic Power City.

    Ọ kọwara na ha nwuchiri ụkọchukwu ahụ na Franklin Chizoba, onye e kwuru ratara nwaanyị ahụ n’ụlọ ya bụ ụkọchukwu n'ụbọchị 30 Juun, 2025 n'ụdị na a chọrọ ikpere ya ekpere.

    Ozi ahụ sịrị na "onye ụkọchukwu nyere nwaanyị ahụ mmanya ka ọ ṅụọ. Obere oge nke a mechara, ike bịara bịa gwụ ya nke mere ha bụ mmadụ abụọ ji dinaa ya n’ike."

    Ka akụkọ a pụtara n’ihe, ndị uweojii nọ n'Orlu nwuchiri mmadụ abụọ ahụ. Mgbe a na-agba ha ajụjụ ọnụ ịmata nke bụ eziokwu, ha abụọ kwetere na ọ bụ ihe ha mere ma gaa n’ihu kwuo na ha na-enwe mmekọ nwoke na nwoke.

    A kpụpụrụ ha abụọ n’ụlọikpe n'ụbọchị 12 Ọgọst 2025, ma tinye ha na mkpọrọ dị n'Owerri dịka a na-eche ụbọchị a ga-ekpe ha ikpe.

  9. Amnesty Int’l ewepụtara ndekọ mmadụ ole e gburu na mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa

    Otu na-ahụ maka ikike dịara mmadụ bụ Amnesty International ekwuola na site na Janụarị 2021 ruo Juun 2023 na e gburu mmadụ ruru 1,844 na mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ.

    Amnesty kwuru nke a n’ozi ha depụtara ọhụrụ ma kesaa n’akara ọba ozi X soshal mịdịa ha.

    Ha kwuru na ọ bụ maka na Gọọmentị Naịjirịa na-ada mba n’ihazi ọnọdụ nchekwa na mpaghara ahụ so akpata ọnọdụ ọjọọ.

    N’okwu ha “Gọọmenti eweghị ike ihazị nchekwa na ndịda ọwụwa anyawụ butere ọnọdụ ndị omekome ji eme ihe masịrị ha”.

    “Ọtụtụ ngaraba ọrụ gọọmentị na ndị na-abụghị nke gọọmentị akpaala arụ dị egwu ma gbuo mmadụ ọnụ ọgụgụ ha dị okpekatampe 1,844 bido na Jenuwarị 2021 ruo na Juun 2023”.

  10. Yurop ga-eziga enyemaka ọkụ ọhịa na Spen dịka ọnụọgụgụ ndị nwụrụ na-arị elu

    Otu jikọrọ mba dị na Yurop bụ European Union (EU) ga-eziga ụgbọelu abụọ iji nyere mba Spen aka n’ibu agha megide ọkụ ọhịa na-agba gburugburu mba ahụ nke gbugoro mmadụ atọ.

    Minista na-ahụ maka ihe na-eme n’ime obodo bụ Fernando Grande-Marlaska gwara ndị mgbasa ozi mpaghara na ọ rịọrọ EU ka ebuga ụgbọelu ya abụọ na-atụ bọmbụ mmiri na mpaghara ọkụ ahụ kacha emetụta.

    Enyemaka a na-abịa dịka onye nke atọ nwụrụ mgbe ọ na-ebu agha megide ọkụ ọhịa na mpaghara ugwu ọdịda anyanwụ León, yana ka Spen kpọrọ EU oku enyemaka nke mbụ banyere ọdachi.

    Cheta na ụlọọrụ na-ahụ maka ihuigwe na Spen AEMET adọọla aka na ntị banyere oke okpomọkụ na-aga n'ihu ruo ụbọchị Mọnde, ebe okpomọkụ ga-akarị 44C n'akụkụ ụfọdụ, na-ebute nchegbu banyere ọkụ ọhịa ịga n’ihu na-agbasa.

  11. Ndị ọrụ enyemaka agwala Izrel ka ha kwụsị iji agụụ mere ngwa ọgụ

    Ihe karịrị ndị ọrụ enyemaka otu narị ebinyela aka n’akwụkwọ ka a kpọọ Izrel oku ka ha kwụsị iji enyemaka mere ngwa ọgụ na Gaza dịka agụu na-emekpa ọtụtụ mmadụ ahụ ebe ahụ.

    Ufọdụ ndị ọrụ enyemaka gunyere Oxfam na Médecins Sans Frontières (MSF), sị na Izrel na-agwa ha na ha “enweghị ikike” inye aka ma ha emeghị ka Izrel si kwuo.

    Ha kọwara na kemgbe ọnwa Maachị, ndi ọrụ enyemaka enwebeghị ike bugaa otu gwongworo ihe enyemaka na Gaza.

    Mana Izrel gọrọ agọ na ha tinyere mmachi n'enyemaka, ma kwuo na iwu ha tinyere n'ọnwa Maachị mere ka enyemaka ruo ndị mmadụ aka ewezuga ndị Hamas.

  12. Zelensky ga-ezute Starmer, dịka a na-eche maka nzukọ ga-adị n’etiti Trump na Putin

    Praịm Minista mba UK bụ Keir Starmer ka a tụrụ anya ịnabata onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky na Downing Street n’ụtụtụ Tọzde 14 Ọgọst, 2025.

    Dịka a na-eche maka nzukọ ga-adị n’etiti onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump na onye otu ya nke mba Rọshịa bụ Vladmir Putin, Starmer kwuru na e nwere “ezigbo ohere” maka nkwụsị ịkwarịta mgbọ n’etiti Rọshịa na Yukren.

    Nzụkọ ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ a ga-enwe na No 10 bụ nke a kpachapụrụ anya hazie iji gosi nkwado mba UK.

    Trump ekwuola na a ga-enwe “ihe ọghọm dị egwu” ọ bụrụ ma Putin ekwetaghị ịkwụsị agha dị na Yukren.

    Onyeisiala Amerịka kwuru nke a oge ya na ndị ndu Yurop nwechara nzukọ ụnyahụ.

    Zelensky kwuru na Amerịka dị “njikere ịkwado anyị”, ebe Chancellor mba Jamini bụ Merz kwuru na Trump ekwetela ịkwanyekwu Putin ọkụ n’ahụ ọ bụrụ na enwetaghị nkwekọrịta udo.

  13. Igbo bụ Igbo ụnụ anwụchula, Anyị sị oji ngajị eri, cheta onye ji aka!

    Ọbiụtọ na ihu ọchị ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo nke taa bụ Tọzde 14 Ọgọst 2025.

    Ọ ga-amasị anyị ka ị gaa n'ihu nọnyere anyị maka akụkọ niile na-eme n'ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka nakwa n'ụwa dum.

    Cheta na i nwereike sonyere anyị na websaịtị, Facebook, Instagram na Whatsapp chanelụ anyị maka akụkọ niile ị chọrọ.

    Ọ bụ Chinonso Ugorji na Marvelous Obomanu ka gị na ha ga-anọ n'ụtụtụ a, mana Uzoamaka Ewuzie, Michael Ngene na Michael Ilediagu ga-eburu oche n'oge ehihie.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị...

  14. Kim Jong Un na Vladimir Putin ekwela onwe ha nkwa ị jịkọ aka ọnụ

    Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin na ogbo ya nke mba Nọt Korịa bụ Kim Jong Un ekwela onwe ha nkwa ịjịkọ aka ọnụ nakwa ị dị n’otu n'etiti mba ha abụọ.

    Ndị isiala mba abụọ ahụ kwere nkwa ahụ mgbe ha nwere mkparịtaụka n’ekwentị n’abalị garaaga.

    Nke a na-eme dịka Onyeisiala mba Rọshịa na Amerịka na-akwado ịnwe mkparịta ụka n’ụbọchị Frịade.

    N’ozi obi ọchịchị mba Rọshịa wepụtara ka ha kwuru na ha na mba Nọt Korịa nwere nkwekọrịta banyere mmepe obodo ha abụọ, ibi ka ezigbo agbataobi na ezi mmekọ.

    Mana ndị ntaakụkọ na mba Nọt Korịa na-ede sị na Onyeisiala ha bụ Kim nwere obi aṅụrị banyere mpụtara n’oku ekwentị ya na Putin.

  15. Zelensky awụchiela Berlin maka mkparịtaụka ya na ndị isi mba Yurop na Onyeisiala Trump

    Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky awụchiela Berlin isi obodo mab Jamini maka mkparịtaụka ya na ndị isi alal mba ndị dị na Yurop na Onyeisiala Donald Trump na-achị Amerịka dịka a na-atụ anya ọgbakọ US-Russia summit a ga-eme ụbọchị Fraịde 15 Ọgọst, 2025.

    Akụkọ kwuru na ndị isi mba ndị dị na Yurop gụnyere Praịm Mịnịsta UK bụ Keir Starmer na-akpọ oku ka Yukren sonye na mkparịtaụka na mkpebi ọbụla Onyeisiala Trump na Putin ga-eme oge ha ga-ezuta onwe ha.

    Nke bụ eziokwu bụ na Yukren na Rọshịa ekwuola na ha chọrọ ka agha ahụ kwụsị mana mba abụọ enwebeghị nkwekọrịta kemgbe.

    N’ụbọchị Mọnde 11, Ọgọst, 2025, Onyeisiala Trump kwuru na ọ ga-agba mbọ mee ka Rọshịa nyeghachi Yukren mpaghara ala niile ha nweere mana o kwukwara na nke nwereike ibute mgbanwe n’ala ndị ahụ.

  16. Trump ga-enwe mkparịtaụka n’etiti Zelenzky na ndị ndu Yurop dịka a na-eche maka nzukọ ya na Putin

    Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky, ndị ndu Yurop na onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ga-enwe mkparịtaụka taa.

    Ya bụ mkparịtaụka a ga-enwe n’ịntaneetị na-abịa dịka a na-eche maka nzukọ ga-adị n’etiti Donald Trump na onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladmir Putin n’Alaska n’ụbọchị Fraịde.

    Na mkparịtaụka ahụ, a tụrụ anya na ndị ndu Yurop gụnyere Praịm Minista mba UK bụ Keir Starmer, ga-ekwupụtaghachi na ekwesịghị inwe mkpebi ọbụla n’azụ Yukren, tinyere ịgbanwe okeala ha n’ike.

    Zelensky, bụ onye gara Berlin izute Chancellor mba Jamini bụ Friedrich Merz, kwuru na “e kwesịrị ịkwanye Rọshịa ọkụ n’ahụ, iji hụ na onye niile nwere udo.”

    N’izuụka gara aga ka Trump kwuru na a ga-enwe “mgbanwerịta ụfọdụ okeala maka ọdịmma” Rọshịa na Yukren.

    Mana nke a kpaliri mmetụta na Kyiv nakwa gburugburu Yurop, dịka ha kwuru na e nwereike inye Mosko ikike isegharị okeala Yukren.

  17. Gọọmenti Naịjirịa enyela iwu ka e wezuga akwụkwọ ha gbara megide Comfort Emmanson dịka a ga-eme KWAM 1 onye nnọchiteanya ọdọụgbọelu

    Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naịjirịa bụ Festus Keyamo enyela iwu ka e wezuga akwụkwọ a gbara megide nwaada Comfort Emmanson ji ụgbọelu Ibom Air mee njem.

    Minista ahụ nyekwara iwu ka e mee ngwangwa tọhapụ ya n’ụlọmkpọrọ Kirikiri, ebe e jichiri ya kemgbe ụbọchị Mọnde.

    Ọ rịọkwara otu Airline Operators of Nigeria (AON) ka ha wezuga mmachi ha machiri nwaada Emmanson iji ụlọọrụ ụgbọelu ọbụla so n’otu ahụ mee njem ụbọchị ndụ ya niile, bụ nke ha kwetara ime.

    Cheta na Emmanson bụ onye ihe onyonyoo ya malitere ifegharị ebe niile kemgbe ụbọchị Mọnde n’ihi ebubo na o metọrọ onye ọrụ ụgbọelu Ibom Air, bụ nke mere ka a nwuchie ya.

    Ka o sina dị, ọtụtụ mmadụ gụnyere ndị Ọkaiwu katọrọ ụzọ e siri maa nwaada ahụ ikpe ma kwuo na ha ga-agba mbọ iji hụ na o nwetara ikpe nkwụmọtọ.

    ‎N’aka nke ọzọ, Keyamo agwala ụlọọrụ NCAA ka ha belata oge a machiri King Wasiu Ayinde Marshal (KWAM 1) iji ụgbọelu eme njem ka ọ bụrụzie naanị otu ọnwa.

    Nke a bụ maka mmachi a machiri KWAM 1 iji ụgbọelu mee njem ụbọchị ndụ ya niile n’ihi nsogbu ya na ụlọọrụ ụgbọelu ValueJet nwere.

    Keyamo kwukwara na KWAM 1 na NCAA ga-arụkọ ọrụ iji mee ya onye nnọchiteanya maka ezi usoro nchekwa nke ọdọụgbọelu, malite ugbua gawa n’ihu.

  18. Mba Fransị ekwetela na ha kpara arụ megide mba Kameroon mgbe ha na-achọ mnwereonwe

    Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron ekwetela na mba ha buru agha dị egwu megide ọchịchị mnwereonwe na ndị ndu mba Kameroon mgbe a na-achọ ka ha kwụrụ n’onwe ha.

    O kwupụtara nke a n’akwụkwọ ozi o dere n’ụbọchị 30 Julaị, 2025 ma wepụta ya n’ụbọchị 12 Ọgọst, 2025, o degaara ya Onyeisiala mba Kameroon bụ Paul Biya.

    Nke a na-eso akwụkwọ mkpuhe ndị ọrụ nkọwa akụkọ ihe mere mgbe gboo nke mba Kameroon na Fransị gbakọtara aka dee, nke kpuhere ọtụtụ agwa mba Fransị kpara megide ndị na-achọ mnwereonwe Kameroon n’agbata afọ 1945 ruo 1971.

    “Na ngwụcha ọrụ ha, ndị ọ kọ akụkọ kwuru hoohaa na e buru agha na mba Kameroon, ebe gọọmenti na ndịagha mba Fransị mere mwakpo dị iche iche n’ọtụtụ mpaghara mba ahụ,” ka Macron kwuru, ma sị na mwakpo ahụ gakwara n’ihu mgbe Kameroon nweere onwe ha n’afọ 1960.

    “Ọ bụ ka ọ dị n’aka ugbua, ị nara ụta agwa na ihe gọọmenti mba Fransị kpara n’oge ndị ahụ,” ka ọ gbakwụnyere.

    Na-agbanyeghi ikwete na ha mere ihe ọjọọ, Macron arịọghị mgbaghara doro anya maka arụ gọọmenti na ndịagha mba Fransị mere.

    Onyendu mba Fransị kwupụtara mmadụ anọ so na-achọ mnwereonwe Kameroon nke ndịagha Fransị gburu, gụnyere Ruben Um Nyobe, bụ onyendu Pati UPC.

    E mere mkpebi inyochaa ma bipụta akwụkwọ banyere arụ Fransị kpara n’oge Kameroon na-achọ mnwere n’afọ 2022, mgbe Macron mere njem nleta na Yaoundé. Ụmụafọ mba ahụ kwanyere ọkụ n’ike ka Fransị kwete ma nabata na ha kpara arụ ma kwụọ ụgwọ n’ihi nke a.

    N’otu aka ahụ Macron gosiri mmasị ya inyere mba Kameroon aka ka e mekwuo nnyocha banyere okwu ahụ, ka kwuo mkpa ọ dị ka mba abụọ a tinye akwụkwọ nchọpụta a n’ụlọakwụkwọ mahadum obodo ha.

    BBC akpọtụrụla gọọmentị mba Kameroon banyere okwu na onyeisiala Fransị kwetere na ha kpara agwa ọjọọ.

    Ebe Macron ekwughi okwu maka etu e si akwụ ụgwọ ihe ọjọọ ndị a ha mere, ọ ga-abụ okwu a ga-akpụ n’ọnụ gawa n’ihu.

  19. Igbo mụrụ nze mụọ ọzọ!

    Kedụ ka unu mere n'ụtụtụ a?

    Anyị ji obi sara mbara anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo na websaịt, Facebook, Instagram na Whatsapp Chanelụ.

    Ndewo!

  20. Ndịagha National Guard awuchiela na Washington DC dịka Trump siri nye iwu

    Ndịagha National Guard amalitela iwuchi na Washington DC dabere n’iwu onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump nyere.

    A na-atụ anya obere nzukọ n’obi ọchịchị White House oge na-adịghị anya.

    Trump kwupụtara “ọnọdụ gbatagbata maka nchekwa ọhanaeze” n’ụbọchị Mọnde, ma zipụ ndịagha National Guard dị narị asatọ n’isi obodo Amerịka.

    Trump kwukwara na ya ga-eji ikike gọọmenti etiti weghara ngalaba ndị uweojii obodo ahụ, nke mbụ onyeisiala na-eme ụdị ihe ahụ.

    Onye Mayor na-elekọta obodo ahụ bụ Muriel Bowser jụrụ ịnabata ihe onyeisiala kwuru gbasara mpụ, dịka ihe ndekọ gosiri na ọnọdụ tigbuo zọgbuo dị n’obodo ahụ agbatuola karịa ka a hụtara ya n’ime afọ iri atọ ndị gara aga.