Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky kwuru na e gbuola
mmadụ asatọ gụnyere otu nwatakịrị na Kyiv.
Zelensky, onye kwupụtara nke a n’ụbọchị Tọzde, sịrị na nke
ahụ mere oge Rọshịa jiri abalị kwaa ha mgbọ dị egbu.
Minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba ahụ bụ Ihor Klymenko
kwupụtara n’ọbaozi Telegram, na ndị nwụrụ anwụ gụnyere obere ụmụaka abụọ.
Onyeisi Kyiv bụ Vitali Klitschko kwuru na opekatampe mmadụ
iri atọ na asatọ merụrụ ahụ na mwakpo ọjọọ ahụ e ji droonu na ogbunigwe mee.
N’ozi o bipụtara n’ọbaozi X, Zelensky kwuru na Kremlin ahọrọla
“ogbunigwe karịa mkparịtaụka”, ma kwughachi mkpa ọ dị inye Rọshịa “ntaramaahụhụ
ọhụrụ siri ike.”
Mwakpo ọjọọ ahụ bịara ka e tinyechara ụlọ ndị Yukren karịrị
otu narị puku n’ọchịchịrị n’ihi mwakpo Rọshịa jiri droonu mee n’akụrụngwa ọkụ
latrik ha n’ụbọchị Wenezde.
N’ozi o bipụtara n’ọbaozi Telegram, Onyeisi ndịagha Kyiv bụ
Tymur Tkachenko kwuru na otu n’ime ụmụaka ndị e gburu egbu dị afọ iri na anọ,
ma kwuo na opekatampe ụmụaka ise merụrụ ahụ na mwakpo ahụ.
Ọ rụtụrụ aka kwuo na a wakporo obodo karịrị iri abụọ, dịka ọtụtụ
ụlọ gbara ọkụ, tinyere ụlọakwụkwọ ọtaakara.