Otiegwu Wasiu Ayinde Marshal a ma ama dịka
KWAM1 arịọla mgbahara maka esemokwu dapụtara n’etiti ya na ndị ụlọọrụ ụgbọelụ 'ValueJet' n'ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n'Abuja n’ụbọchị Tuezde 5 Ọgọst, 2025.
N’ihe onyonyo o wepụtara nye ndị mgbasaozi n’ụbọchị Fraịde 8 Ọgọst, 2025, KWAM1 kọwara na omume ya bụ ihe ihere na ụta dịịrị ya, dịka ọ rịọrọ Onyeisiala Tinubu, Mịnịsta na-ahụ maka ụgbọelu, ụlọọrụ ValueJet, onye
na-akwọ ụgbọelu ahụ, ndị na-eso ya, ezinaụlọ ya nakwa ndị Naịjirịa niile mgbahara.
O kwuru n’ihe bidoro okwu ụbọchị ahụ bụ maka ihe o ji na-aka nke ụfọdụ ndị si na ọ bụ mmanya ọkụ mana ihe o ji bụ mmiri make ahụike ya nke dọkinta gwara ya ka ọ na-aṅụ mmiri mgbe ọbụla.
Cheta na a machiri nwamadị a ime njem ụgbọelu ruo ọnwa isii ma kwụsịtụ onye ọkwọụgbọelu ahụ ọrụ n'ihi esemokwu ahụ.
Nwamadị a kwụchiri n'ihu ụgbọelu ahụ ma jụụ na ọ gaghị efepu maka na ha gwara ya wepụ iko o ji n'aka nke ha kwuru na ọ bụ mmanya ọkụ tupu ọ banye n'ime ụgbọelu ahụ.
Ọ jụrụ nke mere ha ụlọọrụ ValueJet jiri mechie ụzọ ụgboelu ahụ ma sị na ọ gaghị eso ha aga Legọs n'ihi nnupuisi ya.
Nke a butere ọtụtụ okwu na nkatọ na Naịjirịa kamgbe ihe ahụ mere.