You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Chaịna na Indịa ekwenyela inwe mmekọ

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Ọgọst 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Ihe mberede okporoụzọ gburu mmadụ abụọ, merụọ ọtụtụ ahụ n'Ebonyi Steeti.

    Ụgbọala gwongworo na ụgbọala ndị njem bu mmadụ iri na asatọ kụkọtara onwe ha ma gbuo mmadu abụọ.

    Ihe mberede ahụ mere n'ihu Mahadum Ebonyi steeti n'ụbọchị Satọde Ọgọst 23, 2023.

    Ọnụ na-ekwuru ndị Uweojii na steetị ahụ bụ Joshua Ukandu kwuru na ọ bụ eziokwu na mmadụ abụọ nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ ahụ.

    Ukandu tinyere na ọ bụ ndị ọkwọ ụgbọala abụọ kpatara ajọ ihe mere.

    Mana ndị hụrụ ihe mere kwuru na ndị ọrụ nchekwa ụzọ a na-akpọ Federal Road Safety abịaghị ọsọ ọsọ mgbe mkpamkpa ahụ kpara.

  2. Nnamdi Kanu akpọọla oku ka NBA nnyocha ọkaikpe Binta Nyako, Tsammani, Lawal

    Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) nakwa onye wepụtara otu nchekwa Eastern Security Network (ESN) akpọọla ọkụ ka e mee nyocha n'isi ndị ọkaikpe Naijiria ọnụ ọgụgụ ha rụrụ atọ.

    Nnamdi Kanu bụ onye gọọmenti Naịjirịa kpọpụrụ ụlọikpe ma ji chie ya n'ụlọ ọrụ ndị uweojii nzuzo bụ Department of Security Services (DSS) n'Abuja kpọrọ oku ahụ n'akwụkwọ ọ degara ndị otu jikọtara ndị ọkaiwu bụ Naijiria Bar Association (NBA) n'ọnwa Ọgọọst 2025.

    N'akwụkwọ ahụ nke NBA natara, Nnamdi Kanu gụpụtara ndị ọkaikpe ọ chọrọ ka e mee nyocha dịka Binta Nyako, Haruna Tsammani na Garba Lawal.

    Kanu boro ndị ọkaikpe ahụ ebubo ime ihe na-enweghị nkwado n'iwu nakwa usoro ọrụ ha dịka ọkaikpe.

    Ọ gwara NBA ka ha nwee mkpebi ime ka ndị ọkaikpe dara iwu nwee ntaramahụhụ, ma ka ha tinye ọnụ n'ikpe ya na gọọmenti Naịjirịa.

    Dịka Kanu si kwuo "ugbua abụghị mgbe NBA ga-agba nkịtị maka na onye gbara nkịtị ekwetela".

  3. Rọshịa na-agbatị agha site na ịkwụsị mkparịtaụka udo - Onyeisiala Zelensky

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymr Zelensky na-ebo mba Rọshịa ebubo ịgbatịkwu agha dị n'etiti mba abụọ ahụ site na ‘ime ihe nille ha nwereike’ iji gbochie nzukọ ya na Onyeisiala Vladimir Putin maka ịkwụsị agha.

    Cheta na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-achọ ka ndị ndu mba abụọ nwee nzuko maka mkparịtaụka udo mana o kwuru n’ụbọchị Fraịde 22 Ọgọst ha abụọ dịka “mmanụ na mmanya – ha adịghị na mma”.

    N'aka nke minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba ofesi na Rọshịa Sergei Lavrov kwuru na Onyeisiala Putin dị njikere izute Onyeisiala Zelenksy “mgbe ihe ha ga-ekwu na nzukọ ahụ dị njikere”.

    Ọ gara n'ihu na-ebọ Onyeisiala Zelensky ebubo ịjụ ihe niile mba Rọshịa chọrọ.

  4. Mba UK ekweela ịkwụ ụmụafọ Kenya ọkụ gbara ala ha ego iti aka n'obi

    Gọọment mba UK ekwuola na ha ga-akwụ ụmụafọ Kenya ọkụ gbara ihe onwunwe ha oge ndịagha Britain na-eme ọzụzụ afọ anọ gara aga, ụgwọ iti aka n’obi.

    N’agbayeghị na gọọment UK ekwubeghị ego ole ha ga-akwụ, onye okaiwu na-annọchiteanya ndị ihe metụtara gwara BBC na ọ bụ nde abụọ na itoolu na ọnụ egọ Yuro (£2.9 million).

    Akụkọ kwuru na ọ bụ mmadụ puku asaa na nari asaa na iri abụọ na atọ ka ihe onwunwe ha mebiri emebi nakwa ahụike ha nwere nsogbu n’ihi ọkụ gbara na mpaghara Loodaiga Conservancy na ndagwurugwu Rift dị na Kenya.

    Cheta na gọọment UK kwuru na ọku ahụ gbara n'afọ 2022 mebiri ọtụtụ ihe dịka o sitere na stovu dara ada n'amaghị ama oge ndịagha ha na-enwe ọzụzụ ebe ahụ.

  5. Ndị uweojii anwụchiela otu nwoke a na-enyo enyo na ọ na-ere mgbọ egbe n’Anambra Steeti

    Ndị uweojii anwụchiela otu nwoke dị afọ iri isii na ise bụ onye a na-enyo enyo na ọ na-ere mgbọ egbe n’Anambra steeti.

    Ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweoji Anambra Steeti bụ Tochukwu Ikenga wepụtara, kọwaara na e jidere nwoke ahụ aha ya bụ Akpan Godwin dịka o ji mgbọ egbe ruru otu puku na otu nari na Nkpọr dị n’Ọnicha.

    Ikenga gara n’ihu kwuo na nwoke ahụ a na-enyo-enyo gwara dị uweojii mgbe a na-agba ya ajụjụ ọnụ, na ọ na-ere ngwaagha ma kpọ aha ndị ozo na-eso ya ere ahia ahụ iwu na-akwadoghị.

    O kwuru na ndị uweojii amalitela ime nnyocha iji nwuchie ndị ha na Akpan Godwin na-arụkọ ọrụ.

  6. Saụt Korea agbaala ndịagha Nọt Korea mgbọ ịdọ aka na ntị maka ịgafe okeala ha

    Saụt Korea ekwuola na ha gbara ndịagha Nọt Korea na-agafe okeala ewusiri ike dị n’etiti mba abụọ ahụ mgbọ ịdọ aka.

    N’aka nke ọzọ, ndị mgbasa ozi steeti nke Nọt Korea kwuru na ogbunigwe ahụ bụ "nkpasu iwe nke a kpachapụrụ anya" gbaa dịka obi ọchịchị mba Nọt Korea na-ebo goomenti Saụt Korea ebubo ịmalite ọgbaghara na-enweghị njikwa.

    Nke a pụtara ihe dịka Onyeisiala ọhụrụ nke mba Saụt Korea bụ Lee Jae Myung hapụrụ isi obodo Seoul n’ụbọchị Satọde 23 Ọgọst 2025 ịmalite njem nleta na Tokyo nakwa isi obodo mba Amerịka bụ Washington.

    Cheta na e kewara mba Korea abụọ kemgbe agha Korea bịara na njedebe n’afọ 1953.

  7. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde 23 Ọgọst, 2025.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sorokwa anyị na Websaịt, Facebook, Instagram na WhatsApp Chanelụ.

    Udo dịrị gị!

  8. Ụnwụ adaala nke mbụ ya n’obodo dị na Gaza - Otu Mbaụwa

    Otu na-ahụ maka nri nke ụlọọrụ UN na-akwado ekwuola na ụnwụ adaala nke mbụ ya n’obodo dị na Gaza.

    IPC kwuru na ihe karịrị mmadụ narị ise (500,000) nọ n’okeala Gaza na-agabiga oke "agụụ, ịda ogbenye na ọnwụ", dịka a na-atụ anya na "ọdachi" ahụ ga-agbasa ruo Deir al-Balah na Khan Younis n'ọnwa na-abịa.

    Mịnịstrị na-ahụ maka ihe na-eme na mba ofesi nke Izrel jụrụ akụkọ ahụ, ma kwuo na "ụnwụ adịghị na Gaza".

    N’aka nke ọzọ, onyeisi ụlọọrụ UN bụ António Guterres kwuru na nsogbu a bụ "ọdachi mmadụ mere" dịka ọ kpọrọ oku maka inye enyemaka mmadụ ohere na-enweghị njedebe na Gaza.

    Ọ na-abịa dịka Praịm Minista Izrel Benjamin Netanyahu kwuru na ndị otu ya akwadola atụmatụ maka mbuso agha ọhụrụ n’obodo Gaza.

    Ndị IDF na-ekwu na ọ gwala ndị dọkịta na ndị ọrụ enyemaka ka ha malite ikwapụ ndị mmadụ tupu Izrel amalite ịtụ ogbunigwe ya.

  9. Izrel ekwuola na ha ga-amalite mkparịtaụka iji tọhapụ ndị niile e ji eji

    Praịm Minista Izrel bụ Benjamin Netanyahu ekwuola na ya enyela ntuziaka maka mkparịtaụka, iji malite ntọhapụ ndị e ji eji fọrọ afọ ma kwụsịkwa agha dị na Gaza.

    O kwuru na a ga-eme nke a n’usoro “Izrel ga-anabata”.

    N’abalị Tọzde ka Netanyahu gwara ndịagha Izrel, na ndị ha na ya so achị akwadola atụmatụ ime mwakpo kpụ ọkụ n’ọnụ na mpaghara ugwu Gaza.

    Ndị ọchịchị Izrel kwadoro mwakpo ahụ n’agbanyeghị na mbaụwa na ụfọdụ ndị mba ahụ gbara ụkwụ megide ya.

    N’ụbọchị Mọnde ka Hamas nabatara atụmatụ ndị omeeudo si mba Qatar na Ijipt wepụtara ka a kwụsị ịkwa mgbọ ụbọchị iri isii.

    Dịka Qatar siri kwuo, atụmatụ ahụ ga-eme ka a tọhapụ ọkara ndị e ji eji fọdụrụ na Gaza.

    Mana na nzaghachi nke mbụ ya, Netanyahu anabatabeghị atụmatụ ahụ e chere n’ihu ya.

    Ụlọmgbasaozi Izrel kwuru na onyeagha Izrel sịrị na ha ga-ezipụ ndị na-ekwuchitere ha maka inweghachi mkparịtaụka, ọ bụrụ ma a chọta ebe a ga-anọ hazie ya.

  10. Igbo Chukwu gọziri, ya gazie ooo, Ọfọ anyị taa bụ ndụ mmiri, ndụ azụ. Mmiri atala ma azụ anwụla.

    Anyị ji ekele na ihu sara mbara anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo taa bụ Fraịde Orie 22 Ọgọst, 2025.

    Soro anyị na Websaịt, Facebook, Instagram na WhatsApp Chanelụ maka akụkọ niile na-akpọtụ n'ụwa.

    Ọ bụ Chinonso Ugorji na Marvelous Obomanu ga-anọ n'isi ụgbọ n'ụtụtụ a, dịka Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga-esonyere anyị na mgbede.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị taa...

  11. Ndị Palestine agbapụla na Gaza dịka Izrel kwuru na agha esula

    Ọtụtụ ndị Palestine agaala n'ihu na-agbapụ n'obodo Gaza dịka ndịagha Izrel malitere ibu agha.

    Ndị ọchịchị obodo ahụ kwuru na ihe a bụ agba nke mbụ n'usoro ndịagha Izrel siri hazie mwakpo ahụ.

    Ndịagha Izrel enwetela ebe mgbakwasịụkwụ n'ime obodo Gaza, nke bụ ebe obibi ihe karịrị ndị Palestine otu nde.

    Izrel kpachiri obodo ahụ dịka ha kwachara mgbọ dị egwu ma tụọkwa ogbunigwe aghara aghara kemgbe ụbọchị atọ gara aga.

    Ọnọdụ a emeela ka odeakwụkwọ Otu Mbaụwa bụ António Guterres kpọghachi oku ka a kwụsị ịkwa mgbọ na-egbughị oge, "iji gbanarị ọnwụ na mbibi" nke mwakpo "na-aghaghị ibute".

    Izrel chọrọ igosi na ha ka na-aga n'ihu n'atụmatụ ịkpachi mpaghara Gaza niile, n'agbanyeghị nkatọ mbaụwa.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndịagha sị na ndịagha amalitela ọrụ na mpaghara Zeitoun nakwa Jabalia iji tụọ ntọala maka mwakpo ahụ.

    Ọ sịrị na Minista nchekwa Izrel bụ Isreal Katz kwadoro nke ahụ n'ụbọchị Tuzde, dika a ga-eme ka otu na-ahụ maka nchekwa mara maka ya n'ime izuụka a.

  12. EFCC, NIS achụpụla ndị mba ofesi mmadụ 51 ụlọikpe tụrụ nga maka igwu chamdum ịntanet

    Ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) nakwa ndị ọrụ Nigerian Immigration Service (NIS) achụnaala ndị mba ofesi mmadụ iri ise na out bụ ndị mba ofesi ụlọikpe tụrụ nga maka igwu chamdum n’ịntanet nakwa iyi ọha egwu ịntanet.

    N’ime mmadụ iri ise na otu ahụ gunyere ndị mba Chaịna mmadụ iri ise na otu onye mba Tunịsịa.

    Nke a na-eme ya ndị mba ofesi mmadụ otu narị na abụọ bụ ndị a chụpụrụ na Naịjirịa kemgbe Frịde, Ọgọst 15, 2025.

    Ndị a so na mmadụ 192 bụ ndị mba ofesi e jidere na Legos maka mpụ na igwu chamdum n'íntanet.

  13. ASUU ekwupụtala na ha ga-agba abụbọ ọrụ

    Otu jịkọrọ ndị nkuzi mahadum bụ Academic Staff Union of Universities (ASUU) adọọla aka na ntị kwuo na ha ga-agba abụbọ ọrụ maka na gọọmenti etiti na-ada mba na nkwekọrịta dị icheiche ha nwere, ọkọchasị nke afọ 2009.

    ASUU boro gọọmenti etiti ebubo ịda mba na nkwekọrịta ha nwere maka ịkwado ma ịtinye ego na mahadum.

    Onyeisi ASUU na Naịjirịa bụ Christopher Piwuna kwuru na ASUU na-edi ọnọdụ ahụ kamgbe afọ abụọ.

    Christopher Piwuna kwuru nke a mgbe ọ na-eme ihe nkuzi na Mahadum Jọs dị na Plateau steeti.

    Piwuna gụpụtara ọtụtụ nkwa gọọmenti etiti kwere ASUU nakwa nkwekọrịta niile ha nwere mana enweghị nke e mezuru.

    Ọ sị na “ASUU edeela akwụkwọ degara gọọmenti etiti ugboro ole ma ole mana gọọmenti adịghị aza ha nke mere na ASUU enwghị ihe ọzọ ha ga-eme na-abụghị ịgba abụbọ ọrụ”.

  14. Ndịagha Sudan gọnarịrị ịtụ ogbunigwe n'ụgbọala bu ihe enyemaka

    Ndịagha Sudan agọnarịla ịtụ ogbunigwe n'ụgbọala bu ihe enyemaka nke ndị World Food Programme (WFP), bụ nke na-aga mpaghara Darfur ụkọ nri na-enye nsogbu.

    Ndịagha nnupụisi Rapid Support Forces (RSF) tara ndịagha Sudan ụta maka aghae buru n’ụbọchị Wenezde 20 Ọgọst, 2025 n'obodo Mellit nke ndị RSF na-achịkọta.

    WFP enyeghi oke nkọwa gbasra agha ahụ mana ha kwuru na ụgbọala atọ n’ime ụgbọala iri na isii so onwe ha kpọkara ma gbaa ọkụ.

    Ka o sina dị nweghị ihe mere ndị ọrụ so na-eme njem ahụ.

  15. Poopu Leo XIV ga-eme njem mba ofesi mbụ ya na Lebanọn

    Poopu Leo XIV na-akwado ime njem na mba Lebanọn n’afọ a, nke nwereike ịbụ njem mba ofesi mbụ kemgbe a họpụtara ya dịka onyeisi ụka Katọlik n’ọnwa Mee, 2025.

    Osote onyeisi ụka Katọlik na mba Lebanọn bụ Achibishọpụ Paul Sayah kwuru na Vatikan ka na-atule njem atụmatụ njem ahụ ma kwuo na ekwubeghị oge njem a ga-abụ.

    Njem a bụ nke e kwuru na ọ dị mkpa nye Poopu Leo XIV onye kpọrọ oku ọtụtụ ugboro maka udo na mpaghara middle east nakwa ịdị n’otu nye n’agbanyeghị nkwenye maọbụ okpukperechi onye na-ekpe.

    Ọtụtụ kwuru na njem mbụ onyeisi ụka katọlik ọbụla ga-eme, bụ nke na-atụ ntọala banyere ihe ọchịchị ya ga-agbado ụkwụ.

    Lebanọn bụ mba nwere ndị ụka katọlik ruru nde abụọ ma bụrụkwa mba a maara dịka nke nwere ọtụtụ ndị okpukperechi dị iche iche.

  16. Rọshịa ejirila droonu 574, ogbunigwe 40 wakpoo mba Yukren

    Rọshịa atụọla mba Yukren droonu ọnụ ọgụgụ ya ruru 574 nakwa ogbunigwe 40.

    Dịka ndị ọchịchị na mba Yukren si kwuo, nke a bụ mwakpo kacha Rọshịa mere Yukren kamgbe izu ụka ole ma ole gara aga.

    Droonu na ogbunigwe ahụ gburu otu onye na mpaghara Lviv, mana akụkọ sị na mmadụ iri na ise meruru ahụ na mpaghara Transcarpathia.

    Mwakpo ahụ na-eme dịka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-agba mbọ ịkwụsị agha n’etiti mba Yukren na Rọshịa.

    Mịnịsta mba Yukren na-ahụ maka mba ofesi bụ Andrii Sybiha kwuru na “mwakpo Rọshịa ahụ bụ ihe gosiri o ji dị mkpa na agha kwụsịrị”.

  17. Unu abọọla chi?, Ka ụbọchị taa maara onye niile mma

    Nnukwu ọṅụ na obiụtọ ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo taa.

    Soro anyị na Websaịt, Facebook, Instagram na WhatsApp Chanelụ maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

    Gaa n'ihu nọnyere anyị taa...

  18. Gịnị mere ụlọikpe ji machie akara ọbaego Mele Kyari bụbu onyeisi NNPCL?

    Ụlọikpe ukwu etiti dị n’Abuja enyela iwu ka a machie akara ọbaego anọ Mele Kyari nwere n’ụlọakụ Jaiz Bank maka ebubo nrụrụaka na mpụ dị iche iche.

    Ọkaikpe Emeka Nwite nyere iwu n’ụbọchị Tuzde 19 Ọgọst dịka ọkaiwu ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) BỤ Ogechi Ujam degara akwụkwọ ma rịọ ụlọikpe ahụ ka ọ machie akara ọbaego ndị ahụ ruo oge ụlọọrụ EFCC mechara nnyocha ha.

    Ọkaikpe Nwite kwuru na o nyere iwu ahụ maka na o kwenyere na akwụkwọ arịrịọ ahụ EFCC wetara nakwa ihe akaebe ya na ya so bụ nke tozuru etozu.

    Ọkaikpe Nwite yigharịrị ikpe ahụ n’ụbọchị Tuzde 23 Septemba, 2025 bụ ụbọchị ụlọikpe ga-anụ nchọpụta nnyocha EFCC mere.

    Cheta na n’ụbọchị Mọnde 11 Ọgọst, 2025, ụlọọrụ EFCC gbara akwụkwọ ma kwuo na aka Mele Kyari dị n’akara ọbaego ndị ahụ ha chọpụtara na ego dị n’ime ha bụ nke e nwetara site na nrụrụaka na mpụ.

    EFCC gwara ụlọikpe ka ha nye iwu maka mmachi akara ọbaego 0017922724 – Mele Kyari, akara ọbaego 0018575055 – Guwori Community Development Foundation na akara ọbaego 0018575141 – Guwori Community Development Foundation (Flood Relief). Akara ọbaego ndị a niile dị n’ụlọakụ Jaiz Bank.

    EFCC kwuru na nnyocha mbụ ha mere chọpụtara na ego ruru narị nde naịra isii (600m) dị n’ọbaego ndị ahụ bụ nke e nwetara site na nrụrụaka nakwa ihe ndị ọzọ megidere iwu.

    EFCC kọwara na ha chọpụtara na Mele Kyari ji akara ọbaego ndị ahụ anara ego si n’ụlọọrụ NNPCL nakwa ọtụtụ ụlọorụ mmanụ agbidi ndị ọzọ.

    N’aka nke ọzọ, Mele Kyari kwuru n’oge gara aga na aka ya adịghị na nrụrụaka ọbụla oge ọ nọ n’ọkwa dịka onyeisi ụlọọrụ NNPCL.

    Ọ gọnarịrị na ụlọọrụ EFCC nwuchiri ya maka nrụrụaka ijeri dọla abụọ na ụma atọ ($2.6billion) e wepụtara maka ịrụzi ụlọọrụ mmanụ agbidi Naịjirịa.

    N’out ozi o wepụtara n’akara X ya n’ọnwa Mee, Mele Kyari gbara afọ 60 kọwara ebubo ndị ahụ dịka aka ọrụ ndị na-agba ya mgba okpuru chọrọ imetọ aha ya. O kwuru na ya kwụrụ chịm ịzara ọnụ ya n’ebubo ndị ahụ.

  19. A na-achọ mmadụ 20 dịka NEMA mechiri ọrụ ịchọ ndị na-efu efu ebe ahụ ihe mberede ụgbọmmiri mere na Sokoto Steeti

    Ụlọọrụ National Emergency Management Agency (NEMA) nọrọ n’ụbọchị Wenezde 20 Ọgọst, 2025 kwuo na ha achọtala ozu mmadụ atọ n’ihe mberede ụgbọmmiri ahụ mere na Sokoto Steeti.

    N’ime mmadụ 50 ahụ nọ n’ụgbọmmiri ahụ, NEMA kwuru na ha chọtara mmadụ 25 n’ime ha ma mee ka o doo any ana ha akwụsịla ọrụ ịchọ ndị mmadụ n’ebe ahụ.

    Onyeisi ụlọorụ NEMA na Sokoto Steeti bụ Aliyu Kafindangi kwuru na ha na-agba mbọ iji chọta ndị ahụ nọ n’ụgbọmmiri ahụ bu ndị ọrụ ugbo na ndị ahịa kpuru kemgbe abalị atọ gara aga.

    Kafindangi kwuru na kwụsịrị ọrụ ịchọ ndị ọzọ maka na kemgbe o megoro awa iri abụọ na anọ ihe mbered ahụ mere, ha jighị aka na e nwere onye ọbụla ọzọ dị ndụ ha ga-achọta na ndụ.

    O mere ka o doo any ana ihe mere ụgbọmmiri ahụ ji kpuo bụ maka na o bu ibu karịrị ya.

  20. Mba Amerịka na Honduras na Uganda enweela nkwekọrịta maka mbula ndị mbịarambịara

    Mba Amerịka na Honduras na Uganda enweela nkwekọrịta mbula mba ọzọ dịka ha na-emegide mbata na ọpụpụ n’usoro iwu na-akwadoghị, dịka akwụkwọ ụlọọrụ CBS ha na BBC na-arụkọ ọrụ n’Amerịka nwetara kwuru.

    Uganda kwenyere ịnabata ọnụọgụgụ edoghị anya nke ndị kwabatara Afrịka na Eshia bụ ndị gbagara n’okeala Amerịka na Meziko, ebe Honduras ga-anabata ọtụtụ narị ndị a chụpụrụ na mba ndị na-asụ Spanish, ka CBS kọrọ.

    Nke a so n’atụmatụ ọchịchị onyeisiala Donald Trump iji nwete ọtụtụ mba ka ha nabata ndị a chụpụrụ n’Amerịka abụghị ụmụafọ mba a na-ebuga ha.

    Ndị na-akwado ikike mmadụ katọrọ atụmatụ a, na-ekwu na ọ ga-etinye ndị na-akwaga mba ọzọ n’ọnọdụ ihe ize ndụ ma ziga ha na mba ndị nwereike imerụ ha ahụ.