You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Chaịna na Indịa ekwenyela inwe mmekọ

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Ọgọst 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Otu Take It Back Movement eyiela egwu ime ngaghrịiwe ma ọ bụrụ na ndị uweojii atọghapụghị Omoyele Sowore

    Ndị otu Take It Back Movement ekwuola na ha ga-eme ngagharịiwe maka nwụchi ndị uweojii nwụchiri ma kpọchie onyeisi ha bụ Omoyele Sowore n’Abuja.

    Ọ bụ n’ụbọchị Tuzde 5 Ọgọst, 2025 ka ọkaiwu Omoyele Sowore bụ Tope Temokun kwuru na ndị uweojii kpọrọ Sowere oku ma kwuo na ọ bụ oge Sowore bịara n’ụlọọrụ ha ka a ga-agwa ya ihe mere ha ji kpọọ ya oku.

    Mana oge Sowore na ndị nkwado ya ụfọdụ gara ịza oku ahụ ndị uweojii kpọrọ ya n’isi ụlọọrụ ndị uweojii Force Headquaters dị n’Abuja n’ụbọchị Wenezde 7 Ọgọst 2025, ka ndị uweojii nwụchiri ma kpọchie ya.

    Akụkọ kwuru na ndị uweojii na-enyocha Sowore maka ebubo ime ihe adịgboroja nakwa ịkpalite ọgbaaghara n’obodo.

    N’aka nke ọzọ, otu Amnesty International nakwa ụfọdụ ndị ọkaiwu Naịjirịa akatọọla nwụchi nakwa mkpọchi Sowore nke ha kọwara dịka ihe megidere iwu Naịjirịa.

    Ozi Amnesty International wepụtara n’ụbọchị Wenezde 7 Ọgọst 2025, kọwara nwụchi Omoyele Sowore dịka nke megidere iwu ma metọọ ikike ya dịka nwaafọ Naịjirịa.

    Ka ọ dị ugbua, ndị ọkaiwu Sowore na-agba mbọ ịhụ na o nweere onwe n’aka ndị uweojii ahụ.

    Omoyele Sowore zorọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 na pati African Action Congress.

  2. Ụlọọrụ FAAN akọwaala ihe mere e ji chụpụ otiegwu Wasiu Ayinde n’ụgbọelu

    Ụlọọrụ na-elekọta ọdọ ụgbọelu na Naịjirịa a na-akpọ “Federal Airports Authority of Nigeria, (FAAN)” akọwaala ihe mere e jiri chụpụ otiegwu Wasiu Ayinde Marshal a maama dịka KWAM1 n’ime ụgbọelu ọ banyere.

    Onye na-ahụ maka mgbasaozi n’ụlọọrụ FAAN bụ Obiageli Orah kwuru na naanị ohere ha nwere bụ ime ka ọ hara iso ụgbọelu ahụ mee njem maka na ọ ji mmanya iwu machiri.

    Ọ sị na ndị ọrụ nchekwa n’ọdọ ụgbọelu bụ Aviation Security (AVSEC) dọrọ KWAM1 aka na ntị ka ọ hara iji mmanya ahụ banye n’ụgbọelu mana ọ jụrụ ajụ nke mere e ji chụpụ n’ụgbọelu ahụ.

    FAAN kwuru na ọ bụ ụgbọelu ‘Flight VK 201’ ka KWAM1 chọrọ ịbanye mgbe e wepụrụ ya.

  3. Kremlin ekwuola na Onyeisiala Trump na Putin ga-enwe nzukọ n’abalị ole na ole na-abịa

    Obi ọchịchị Kremlin mba Rọshịa ekwuola na Onyeisiala Donald Trump na Onyeisiala Vladimir Putin ga-enwe nzukọ n’ime abalị ole na ole na-abịa.

    Nke a na-abịa dịka Onyeisiala Trump kwuru na o nwere olileanya na ohere dị maka nzukọ ya na ndị isiala Rọshịa na Yukren iji kwụsị agha dị na Yukren.

    Cheta na Onyeisiala Trump nyere Rọshịa ruo ụbọchị Fraịde 9 Ọgọst ka ha na mba Yukren nwee kwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ.

    A na-atụ anya na Trump na Putin ga-enwe nzukọ a dịka onye ọrụ gọọmenti Amerịka bụ Steve Witkoff na Putin na-enwe nzukọ ụbọchị Wenezde 7 Ọgọst 2025.

    Witkoff agaala Rọshịa ugboro anọ banyere nke a mana enweghị nke mịtara mkpụrụ ọbụla.

    Akụkọ si n’obi ọchịchị White House Amerịka kwuru na ọ dị ka Rọshịa na Yukren dị njikere inwe nzukọ a.

  4. Ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ọchiehi egbuola onye uweojii na mmadụ asatọ ndị ọzọ na Benue steeti

    Ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị ọchịehi egbuola mmadụ itoolu gụnyere otu onye uweojii na mwakpo ọhụrụ ha mere n’okpuru ọchịchị Agatu na Benue steeti.

    Otu onye obodo ahụ kọọrọ ụlọmgbasaozi Channels TV na ha bụ ndị omekome wakporo obodo Okwutanobe, Okpokpolo, Olegagbani na Ikpele dịcha n’okeala Benue steeti na Kogi steeti.

    Ọ kọwara na mwakpo ahụ malitere n’ụbọchị Fraịde izuụka gara aga ruo n’ụbọchị Tuzde 5 Ọgọst, 2025.

    Onyeisioche okpuru ọchịchị Agatu bụ Melvin Ejeh kwuru na mwakpo ndị ahụ niile bụ ihe mere eme.

    Ọ kọwara na ndị ekperima ahụ gburu mmadụ anọ n’obodo Okwitanobe, Okpokpolo na Olegugban ma gbuokwa mmadụ ise gụnyere onye uweojii n’obodo Ikpele.

    Ọ katọrọ mwakpo ahụ ma kwuo na ya chere na ọ bụ mmegwara maka ozi e nwetara na a na-ezu ehi n’obodo ndị e nwere n’okpuru ọchịchị Agatu.

    Onyeisioche ahụ rịọrọ ka ha nye gọọmenti oge ime nnyocha gbasara ebubo izu ehi karịa ime ihe n'ike nke onwe ha.

    Ka o si nadị, o nwebeghị ihe ụlọọrụ ndị uweojii Benue steeti kwurula gbasara ọnọdụ a.

  5. Ndị Mịnịsta mba Gana abụọ na mmadụ isi ọzọ anwụọla n'ihe mberede ụgbọelu

    Ndị Mịnịsta abụọ na mba Gana na mmadụ isii ndị ọzọ anwụọla n’ihe mberede ụgbọelu dịka helikọpta ha nọ n’ime ya kpọkasịrị.

    Onyeisi ọrụ mba ahụ bụ Julius Debrah kwupụtara nke a na mgbasaozi o mere.

    “Ọ bụ ihe mwute nye m ikwupụta ọdachi mere n amba anyị n’ụtụtụ a. Gọọmenti ji mwute na-ekwupụta ọnwụ mmadụ ndị a n’ihe mberede ụgbọelu.

    • Dkt. Edward Omane Boamah (Mịnịsta nchekwa)
    • Dkt. Ibrahim Murtala Mohammed (Mịnịsta na-ahụ maka ebe obibi, sayensị na tekịnụzụ)
    • Dkt. Muniru Mohammed Limuna (Onye na-arụ ọrụ dịka onye nchịkọta nchekwa)
    • Dkt. Samuel Sarpong (Osote onyeisioche NDC)
    • Samuel Aboagye (Onye zọburu ọkwa omeiwu)
    • Onyendu ngalaba ndịagha ‘Squadron’ bụ Peter Bafemi Anala
    • Onyeagha ụgbọelu bụ Twum Ampadu
    • Onyeagha Ernest Addo Mensah

    "Gọọmenti ezigarala ezinaụlọ ndị a nwụrụ ozi itiaka n’obi.”

    Ndịagha ụgbọelu mba Gana kwupụtara na mbụ na helikọpta Z9 nọ na-aga na mpaghara Ashante furu efu.

    Ha kwuru na ụgbọelu ahụ fepuru n’ụbọchị Wenezde n’elekere itoolu nke ụtụtụ si n’Accra na-aga Obuasi.

  6. Onye ozi Donald Trump ezutela Putin, Rọshịa, Yukren nwereike ịkwụsị ịkwa mgbọ

    Onyeozi mba Amerịka bụ Steve Witkoff na Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin ezutela n’obodo Kremlin.

    Nke a na-eme dịka ụbọchị Ikpeazu Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump wepụtara maka mba Rọshịa ikwete n’atụmatụ ịkwụsịtụ agha na mba Yukren na-abịa nso.

    ụlọọrụ mgbasaozi na Rọshịa kwuru na mkparịtaụka n’etiti ha abụọ ruru ihe dịka awa atọ n’ụbọchị Wenezde.

    Onyeisiala mba Amerịka ekwuola n’oge garaaga na ya ga-amanye nnukwu ntarama ahụhụ n’isi Rọshịa ma ọ bụrụ na ha akwụsịghị agha ha na-ebuso mba Yukren.

    Mana Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky kwuru na ọ bụ mgbe ego kọrọ mba Rọshịa ka ha ga-achọ udo ma kwado atụmatụ Amerịka wepụtara ịmanye nnukwu ụtụisi n’isi mba dị icheiche na-azụ mmanụ agbịdị ndị Rọshịa.

  7. Ụlọọrụ UN adọla aka na ntị maka oke agụụ dị n'obodo Sudan ndịagha nnupụisi juputara

    Ụlọọrụ UN na-ahụ maka nri adọla aka na ntị banyere oke agụụ jidere ezinaụlọ ndị tọrọ n’obodo el-Fasher nke Sudan.

    Ulọọrụ World Food Programme (WFP) kwuru na ya esila n’okporoụzọ buga nri n’obodo ahụ dị na mpaghara ọdịda ọwụwa anyanwụ Darfur n’ihe ruru otu afọ.

    Cheta na ndịagha nnupụisi sitere na Rapid Support Forces (RSF) gbara El-Fasher gburugburu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọnwa iri na isii – ma kpebisie ike iweghaara ya n'aka ndịagha Sudan.

    Ịdọ aka na ntị nke ụlọọrụ WFP na-abịa dịka ndị na-akwado mgbanwe obodo malitere ịkọ akụkọ ọnwụ sitere n’agụụ n’obodo ahụ, nke ka bụ ebe obibi ihe dịka mmadụ narị puku atọ (300,000).

  8. Ihe karịrị mmadụ 100 na-efu efu n'ihi oke idemmiri mere n’Indịa

    Ihe karịrị otu narị mmadụ na-efu efu ugbua ebe otu onye nwụrụ mgbe ihu igwe adịghị mma butere oke idemmiri na steeti Uttarakhand na mpaghara ugwu nke mba Indịa.

    Ọrụ nnapụta na-aga n'ihu na mpaghara Uttarkashi mgbe oke mmiri si n'ugwu na-asọda n'ime obodo Dharali n’ụbọchị Tuzde, na-ekpuchi okporoụzọ na ụlọ ndị nọchiri ụzọ ya.

    Ka ọ dị ugbua, e zigago ụfọdụ ndịagha n’obodo Dharali kemgbe Tuzde, mana ndị ọrụ nzaghachi ọdachi ndị ọzọ na ndị ọrụ mpaghara enweghị ike iru ebe ahụ n'ihi okporo ụzọ mebiri emebi na oke mmiriozuzo.

    Cheta na oke mmiri ozuzo na-adakwasị steeti Himalaya nke Uttarakhand n'ime izu ole na ole gara aga.

    A napụtara ihe dịka mmadụ otu narị na iri atọ ruo ugbua na Uttarkashi, onyeisi Minista na-ahụ maka Uttarakhand Pushkar Singh Dhami gwara ndị ntaakụkọ n'ụtụtụ Wenezde.

  9. Rụwanda ekweela ịnabata ndị a chụpụrụ na mba Amerịka ruru mmadụ 250

    Mba Rụwanda kwuru na ya ga-anabata ndị kwagara mba Amerịka mmadụ narị abụọ na iri ise na nkwenye nkwekọrịta nke atụmatụ nke ọchịchị Onyeisiala Donald Trump ịkwaghara ndị mbịarambịara a chụpụrụ achụpụ.

    N'okpuru atụmatụ a, a ga-enye ndị a chụpụrụ achụpụ "ọzụzụ ndị ọrụ, nlekọta ahụike na ebe obibi iji malite ndụ ha na Rụwanda", ọnụ na-ekwuchitere gọọmenti bụ Yolande Makolo gwara BBC.

    Otu ọnọdụ nke nkwekọrịta ahụ bụ na Rụwanda ga-enwe "ikike ịkwado onye ọ bụla a na-atụ anya ịkpọbata na mba ya", ọ gbakwụnyere.

    Obi ọchịchị mba Amerịka White House ekwubeghị okwu banyere nkwekọrịta ahụ mana ọ gwara BBC na ọ na-agwa mba ndị “na-achọ inyere anyị aka iwepu ndị ọbịa iwu na-akwadoghị nke onye bụbu onyeisiala Joe Biden” kwere ka ha bata n’Amerịka.

  10. A ga-enwe "oke ọdachi" ma Izrel gbasaa ọrụ ndịagha na Gaza - Otu onyeisi UN

    Otu onyeisi ụlọọrụ UN adọla aka na ntị na a ga-enwe "oke ọdachi" ma ọ bụrụ na mba Izrel gbasaa ọrụ ndịagha ya na Gaza.

    Nke a na-abịa dịka akụkọ kwuru na Praịm Minista Benjamin Netanyahu na-agbasi mbọ ike ka Izrel weghaara Gaza kpamkpam.

    Osote odeakwụkwọ bụ Miroslav Jenča gwara ndị otu na-ahụ maka nchekwa bụ UN Security Council na ihe a ga-abụ "oke egwu", ma nwee ike itinye ndụ ndị Palestine ọzọ n'ihe ize ndụ, yana ndị Izrel Hamas eji eji.

    Ndị mgbasa ozi Izrel kwuru na Netanyahu na-achọ izute ndị ọrụ nchekwa ya n'izu a.

    "Atụmatụ ahụ amalitela. Anyị na-aga maka mmeri zuru oke nke okeala Gaza Strip - na imeri Hamas," ka onyeisi ọrụ Izrel kwuru.

  11. Ndị be anyị, mma mma nu oo

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde 6 Ọgọst 2025.

    Anyị ga na-ewetere unu akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Biko sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa WhatsApp Channelụ anyị.

    Ka ọ dịrị onye ọ bụla mma taa.

    Daalụ!

  12. Natanyehu na-achọ ka mba Izrel nwere ọchịchị n’ala Gaza niile

    Praịm mịnịsta mba Izrel bụ Benjamine Netanyahu chọrọ ka ha nwere ọchịchị n’ala Gaza niile dịka ụlọ mgbasa ozi n’Izrel si ekwu ugbua.

    A sị na dịka Benjamin Netanyahu ga-ezute ndị isi ụlọọrụ nchekwa mba Izrel na otu ihe n’ime ihe niile ha ga-akpa bụ etu Izrel ga-esi nwere Gaza.

    Ha sị na ọ bụ otu onye ọnụ na-eru n’okwu na mba Izrel gwara ndị ntaakụkọ sị na “atụmatụ ahụ apụtara. Anyị na-aga n’ihu n’iwere ọchịchị n’ala Gaza ma chụpụ ndị Hamas”.

    Ọ sị na “ọ bụrụ na onyeisi ndị ọrụ nchekwa mba Izrel anabataghị atụmatụ ahụ naanị ihe ọ ga-eme bụ iritu n’oche”.

  13. Mba Amerịka nwereike ịna ego ruru $15,000 maka akwụkwọ njem vịsa

    Mba Amerịka nwereike ịnara ndị chọrọ ịbata na mba ha maka ịzụ ahịa maọbụ njem nleta ego ndose ruru $15,000 ($11,300) maka akwụkwọ njem vịsa.

    Amerịka chọrọ ijiri ọnwa iri na abụọ tulee etu ọ ga-esi nyere aka kwụsịtụ ndị na-anọfe oke na mba ha.

    Mana ndekọ si Amerịka apụta ugbua emeghị ka a mara mba niile usoro ọhụrụ a ga-emetụta.

    Gọọmenti Donald Trump emeela ọtụtụ ihe ịkwụsịtụ ndị si ụzọ adịgboroja abata na mba Amerịka.

  14. Gọọmenti Legọs Steeti ewepụtala aha ogige obibi 176 na-enweghị akwụkwọ nkwado gọọmenti

    Gọọmenti Legọs Steeti ewepụtala aha ogige obibi estate 176 na-enwetaghị nkwado gọọmenti ma nye ha abalị iri abụọ na otu ka ha nweta akwụkwọ nkwado gọọmenti zuruoke.

    Akwụkwọ ozi ụlọọrụ na-ahụ maka nhazi obodo na Legọs steeti wepụtara ụbọchị Mọnde 4 Ọgọst, 2025, kwuru na ogige obibi ndị ahụ dị na mpaghara Eti-Osa, Ibeju-Lekki na Epe.

    Odeakwụkwọ ụlọọrụ na-ahụ maka ndozi obodo bụ Oluwole Sotire kwuru na ogige ndị ahụ enweghị nkwado gọọmenti maka nakwa mịnịstrị na-ahụ maka nhazi na mmepe obodo steeti ahụ.

    Sotire kwuru na gọọmenti nyere ogige obibi ndị ahụ abalị iri abụọ na otu iji ga nweta akwụkwọ nkwado n’aka gọọmenti.

    Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ahụ bụ Mukaila Sanusi gwara BBC na ọ bụrụ na ha enwetaghị akwụkwọ nkwado ahụ, na gọọmenti ga-amachi ogige ahụ niile.

    Ogige obibi ndị ahụ gụnyere:

    • Adron Homes, Elerangbe
    • Aina Gold Estate, Okun-Folu
    • Almond Gardens, Igbo-Esan
    • Atlantic Bay Estate, Awoyaya
    • Apple Shore Park, Akodo
    • Beach Front Gardens, Akodo
    • Belvic Housing Estate, Okun Lepia
    • Bricks and Bars Estate Phase II La Campaign Tropicana
    • Bright Water Estate Limited, Ibeju
    • Horizon Estate, Harris Drive, Sapata Eti-Osa LGA
    • Melrose Park Estate - Harris Drive, Sapata Eti-Osa LGA
    • Victoria Crest Ill - Harris Drive, Sapata Eti-Osa LGA
    • Atlantic Ville Estate - Harris Drive, Sapata Eti-Osa LGA
    • Pacific Abode – Adekunle Idowu Close, Sapata Eti-Osa LGA
    • Royal View Estate – Ikota, Off Lekki Epe Expressway Eti-Osa LGA na ọtụtụ ndị ọzọ.

    Akwụkwọ a kpọrọ Layout Approval na bekee bụ akwụkwọ ụlọọrụ Lagos State Physical Planning Permit Authority (Laspppa) na-enye.

    Ọ bụ akwụkwọ gọọmenti na-enye iji gosi na ụlọ obibi ọbụla rubere isi nye iwu Legọs steeti tupu a malite ịrụ ya.

  15. Chaịna ekwuola na mmadụ 7,000 ebutela nje 'chikungunya virus'

    Ihe karịrị mmadụ puku asaa ebutela nje anwụnta na-enyefe n'ofe mpaghara Guangdong nke Chaịna kemgbe ọnwa Julaị, na-akpali usoro ndị yiri nke e mere n'oge ọrịa Covid-19.

    N'obodo Foshan, nke ọrịa ahụ kachasị metụta, ndị na-arịa ọrịa chikungunya ga-anọrịrị n'ụlọọgwụ, ebe a ga-eji ụgbụ anwụnta kpuchie akwa ha.

    Enwere ike ịhapụ ha naanị mgbe a chọpụtara na nje ahụ adịghịzi ha n’ahụ ma ọ bụ na njedebe nke ọnụnọ otu izu n’ụlọọgwụ.

    Nje ahụ nke na-agbasa site n’arụ nke anwụnta bu ọrịa, na-ebute ahụ ọkụ na oke ahụ mgbu, nke nwereike ịdị ruo ọtụtụ afọ.

    Ọ bụ ezie na ọ dị ụkọ na Chaịna, ọrịa chikungunya na-apụtakarị ihe na mapaghara Saụt na ndịda ọwụwa anyanwụ nke Esịa na akụkụ ụfọdụ nke Afrịka.

  16. Ndị ojiegbe awakpola onye omeiwu Ebonyi steeti ma gbuo ndị uweojii abụọ n’Imo Steeti

    Njinji jiri ụbọchị Sọnde 3 Ọgọst, 2025 n’Okigwe, Imo Steeti dịka ndị ojiegbe wakporo onye omeiwu Ebonyi Steeti bụ Kingsley Ikoro ma gbuo ndị uweojii na-echekwa.

    Ndị hụrụ oge mwakpo ahụ mere kwuru na ụgbọala bu onyeomeiwu ahụ mebiri n’ụzọ oge ha na-eme njem na mpaghara ahụ. E kwuru na Kingsley Ikolo gwara ndị uweojii abụọ so ya eme njem ka ha nọrọ chọọ etu ha ga-esi mezie ụgbọala ahụ mebiri dịka ya onwe ya gara n’ihu ime njem ya.

    Ọ bụ oge ahụ ka ndị omekome ahụ wakporo ndị uweojii abụọ ahụ.

    Cheta na okporoụzọ Okigwe bụ nke e ji mwakpo ndị omekome mara.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Henry Okoye kọwara mwakpo ahụ dịka ihe jọgburu onwe ya ma kwe nkwa na ha ga-anwụchi ndị omekome ahụ.

    O kwuru na ndị ọrụ ya amalitela ime nnyocha n’ime ọhịa na obodo gbara ebe ahụ gburu gburu iji nwụchie ndị kpara mkpamkpa ahụ.

    Ka ọ dị ugbua, e tinyela ozu ndị uweojii ahụ nwụrụ n’ọba ozu dịka nnyocha na-aga n’ihu.

  17. Indịa akọwaala egwu Trump na-eyi itinye ụtụisi na mmanụ agbịdị mba Rọshịa dịka nke na-ekwesịghị ekwesị

    Indịa akọwaala egwu Donald Trump na-eyi itinye ụtụisi dị elu na mmanụ agbịdị o si mba Rọshịa azụbata dịka nke “na-ekwesịghị ekwesị na nke na-adabaghị adaba”.

    N’ozi o bipụtara n’ọbaozi Truth Social, Onyeisiala Amerịka dọrọ aka na ntị sị na ya ga-ebuli ụtụisi, ma kwuo na Indịa “achọghị ịma gbasara mmadụ ole ndịagha Rọshịa gburu na Yukren”.

    Ka ọ dị ugbua, Indịa so n’ime mba ndị kachasị azụ mmanụ agbịdị mba Rọshịa. Ọ bụrụla ngwaahịa dị oke mkpa Mosko na-atụga mba ndị ọzọ kemgbe ụfọdụ mba dị na mpaghara Yurop kwụsịrị azụmaahịa ha na mba Rọshịa n’ihi mwakpo ha malitere ime na mba Yukren n’afọ 2022.

    Ka o si nadị, Trump ekwughị kpọmkwem ihe ụtụisi ọhụrụ ahụ ga-abụ, mana ọnọdụ ahụ na-abịa n’ime naanị otu mkpụrụ ụbọchị o kpughere nnukwu ụtụisi dị 25% maka mba Indịa.

  18. Amerịka akatọla nkpọchi n’ụlọ nke onye bụbu onyeisiala mba Brazil Jair Bolsonaro

    Ụlọikpe kasị elu na mba Brazil enyela iwu ka akpọchie onye bụbu Onyeisiala Jair Bolsonaro na mkpọrọ ụlọ.

    Cheta na a na-ekpe Bolsonaro ikpe maka ebubo na ọ kpara nkata ịkwatu ọchịchị, nke ọ gọrọ agọ.

    Onye ọkaikpe na-ahụ maka nnyocha Bolsonaro, Alexandre de Moraes, kwuru na mkpebi a bụ n'ihi na Bolsonaro erubeghị isi n’iwu mmachi nke etinyere ya n'ọnwa gara aga.

    Na nzaghachi, ndị ọkaiwu Bolsonaro gọrọ agọ maka ebubo imebi iwu mmachi ya ma kwuo na ha ga-ekpegharị ikpe ahụ, dịka ụlọọrụ mgbasa ozi Reuters siri kwuo.

    Na nkwupụta ha wepụtara n’akara X, mba Amerịka kwuru na ọ "na-akatọ" iwu ụlọikpe ahụ ma kwuo na "ndị niile na-enyere aka na ịkwado omume mmachibido iwu" ga-aza ajụjụ.

  19. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma,

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tuzde 5 Ọgọst 2025.

    Anyị ga na-ewetere unu akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Biko sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa WhatsApp Channelụ anyị.

    Ka ụbọchị taa mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Ndewo!

  20. Gọọmenti ekweela nkwa inye ndị D’Tigress $100,000 n’isi n’isi maka iburu iko FIBA Women’s AfroBasket 2025

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ekweela nkwa na ya ga-enye ụmụnwaanyị Naịjirịa na-agba bọọlụ nke nkata a na-akpọ D’Tigress ego, ma ala maka ituru ugo n’egwuriegwu FIBA Women’s AfroBasket 2025.

    Osote Onyeisiala Naịjirịa bụ Kashim Shettima bụ onye nabatara ndị D’Tigress n’Abuja n'aha Onyeisiala Bola Tinubu gwara ndị D'Tigress na gọọmenti ga-enye ha $100,000 ahụ n’isi n’isi.

    Shettima kwukwara na gọọmenti ga-enye ndị ọzọ niile so ha gaa asọmpị ahụ $50,000 ma nyekwa ha otu ala n’isi n’isi.

    D’Tigress Naịjirịa turu ugo ma nweta mmeri nke asaa n’asọmpị bọọlụ nkata (Basketball) na mba Afrịka.

    Naịjịrịa meriri ndị Mali n’agba nke ikpeazụ na FIBA Women’s AfroBasket 2025 ma turu ugo.