Onye ndụmọdụ banyere nchekwa
na Naịjirịa bụ Nuhu Ribadu ekwupụtala nwuchi mmadụ abụọ bụ ndị ndu otu na-eyi
ndụ egwu a kpọrọ ‘Ansaru terrorist group’.
Ribadu kwupụtara nke a na
mgbasaozi o nyere banyere ọnọdụ nchekwa n’isiụlọọrụ ya ma kwuo na ndị a
nwuchiri bụ Abu Baraa, onyeisi na Mahmuda bụ osote ya.
E kwuru na aka ndị a dị n’ọtụtụ
mwakpo iyi ndụ egwu na-eme na Naịjirịa, tinyere ntọrị ndị mmadụ gbagotere elu.
Ndịisi ndị ọrụ nchekwa dị iche
iche nọ mgbe a na-ekwupụta nwuchi ndị a.
Ribadu kọwara na “Mahmud Muhammad
Usman e ji Abu Bara’a maara bụ kpọrọ onwe ya ‘Emir nke Ansaru bụ onye na-ahazi out
iyi ndụ egwu ndị ọzọ jupụtara na Naịjirịa, ma bụrụkwa onye na-akpa nkata maka
ntọrị ndị mmadụ, izu ohi bụ nke ha ji akwado iyi ndụ egwu kamgbe ọtụtụ afọ.
“Onye nke abụọ bụ Mahmud al-Nigeria
e ji Mallam Mamuda maara, onye kpọrọ onwe ya onyeisi ọrụ nke Abu Bara’a. Ọ bụ
onye ndu otu “Mahmudawa” na-ezo na mpaghara Kainji mana na-akpa ike na Niger,
Kwara Steeti nakwa Benin Republic.
“A zụrụ Mamuda na Libya n’afọ
2013 ruo 2015 n’aha otu na-eyi ndụ egwu Jihad na Ijipt, Tunisia na Ọjerịa. Ọzụzụ
ya gbakwasịrị ụkwụ n’etu e si ebu ngwa ọgụ na ịrụ ogbunigwe.”
Ribadu kwuru na mmadụ abụọ ka a
na-achọ achọ kamgbe ọtụtụ afọ dịka ha mere ọtụtụ mwakpo gburu ma ndị nkịtị na ndịagha.
O kwuru na ụfọdụ mwakpo ha mere gụnyere
ịwakpo ụlọmkpọrọ Kuje n’afọ 2022, mwakpo ọdọ a na-emepụta uranium (akụrụngwa e
ji arụ ogbunigwe), ntọrọ ndị injinịa mba Fransị Francis Collomp na Katsina
Steeti, na ntọrọ Alhaji Musa Umar Uba n’ọnwa Mee afọ 2019.
“Aka ha dịkwa na ntọrọ Emir nke Wawa,
ha ndị ọzọ na-eyi ndụ egwu na Mali, Niger, Burkina Faso na-arụkọ ọrụ.
Ribadu kwuru na nwuchi mmadụ abụọ
a bụ ihe kachasị gbapụta ihe ndị ọrụ nchekwa na-eme iji chekwaa Naịjirịa.
O kwuru na nwuchi ndịisi otu Ansaru
a ga-ekposa ndị otu ka ha gharazie ịkpa ike na Naịjirịa.
Otu Ansaru a sepụtara isi mbụ n’ọnwa
Jenụwarị afọ 2012, site na nkwupụta ha mere na Kano Steeti, dịka otu alaka si n’otu
Boko Haram.