Julius Abure na Usman Nenadi: Ụlọikpe kachasị enyela mkpebị banyere onye bụ onyeisioche otu Lebọ Patị
Ebe foto si, Julius Abure/x and Nenadi Usman/x.
Nkọwa foto, Julius Abure na Nenadi Usman.
Ụlọikpe kachasị na Naịjirịa enyela mkpebi ma sị na
Julius Abure bụ onyeisioche otu ndọndọrọ ọchịchị Lebọ patị.
Ụlọikpe nyere mkpebi ahụ n’Abụja n'ikpe gbasara onye bụ onyeisi oche otu Lebọ Patị n’etiti Julius Abure na Sinetọ Nenadi Usman.
N’okwu
Obiora Ifoh bụ ọnụ na-ekwuru otu Patị ahụ binyere aka ka ha kenere ụlọikpe
kachasị na Naịjirịa maka inye mkpebi ahụ n'okwu ahụ.
Ifoh kwuru
na “anyị ji ohere a na-agwa ndị bụ ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị Lebọ patị ka ha
kwadoo Julius Abure na ndị ndu ha dịka ụlọikpe kpebiri ikpe gbasara onye bụ onyeisi
oche”.
Mana ka ụlọikpe kachasị nyere mkpebi ya, Sinetọ Nenadi Usman jiri akara X soshal mịdịa sị "Lebọ patị bụ otu ezinaụlọ na-enweghị nkewa, naanị ihe anyị chọrọ bụ ka anyị dozie Naịjirịa"
"Ugbua enweghị onye meriri maọbụ onye e merirị; anyị niile kwesiri ịbịakọta ọnụ ma dozie obodo anyị".
Cheta na mgbe nkewa batara n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị Lebọ patị bụ mgbe ha mere ọgbakọ ịwepụta ndị ndu ha.
N’oge ahụ, ọtụtụ Lebọ patị gara Umuahia dị n’Abịa steeti ga-wepụta Sinetọ Nenadi Usman dịka onyeisi oche, ebe ndị nke ọzọ wepụtara Julius Abure n’ọgbakọ ha mere n’ọnwa Maachị abalị 27 n’afọ 2027.
Gọvanọ Hope Uzodimma eduola onye ga na-arụgodu ọrụ ka Nnukwu Ọkaikpe Imo steeti n’iyi ọrụ
Ebe foto si, Hope Uzodimma/X
Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma eduola Ọkaikpe
Theophilus Nnamdi Nzeukwu n'iyi ọrụ dịka onye ga na-arụgodu ọrụ ka Nnukwu Ọkaikpe Imo
steeti.
Ọnọdụ a na-abịa dịka ọ gachara ọtụtụ ọnwa otu National
Judicial Council (NJC) chụpụrụ onye bụbu Nnukwu Ọkaikpe Imo steeti bụ Theresa
Chikeka maka ịtụ asị gbasara afọ ole ọ dị.
Oge ọ na-ahazi mmemme ahụ n’obi ọchịchị dị n’Owere, Uzodimma
kwughachiri ebumnobi ọchịchị ya ime ka ngalaba ikpe Imo steeti bụrụ nke a ga-atụkwasịnwụ
obi.
O kwuru na nhọpụta Ọkaikpe Nzeukwu bụ nke ụlọọrụ Judicial
Service Commission (JSC) kpachapụrụ anya mee site n’irubeisi n’iwu Naịjirịa.
Ebe foto si, Hope Uzodimma/X
Uzodimma gbara Nzeukwu ume ka ọ gbapụ ọsọ n’usoro e ji ahọpụta Nnukwu Ọkaikpe ga-adịgide adịge n’Imo steeti.
Ọ gara n’ihu gwa ndị niile na-arụ ọrụ na ngalaba ikpe ka ha hụta ọrụ ha dịka nke dị nsọ ma nye ha ndụmọdụ ka ha were nkwụbaakaọtọ na ịtụ egwu Chineke na-arụ ọrụ ha.
N’okwu nnabata ya, Ọkaikpe Nzeukwu kelere Gọvanọ Uzodimma na ụlọọrụ JSC maka ntụkwasịobi ha nwere n’ebe ọ nọ.
O kwere nkwa na ya agaghị agharịpụ ntụkwasịobi ahụ ma ṅụọ iyi na ya ga-ewebata ọnọdụ ọhụrụ nke nwere ntụkwasịobi na inye ngụkọ na ngalaba ikpe nke Imo steeti.
Chaịna ekwuola na ha ga-amanye ụtụisi 34% n'ihe niile e si mba Amerịka ebubata
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Chaina
Mba Chaịna
ekwuola na ha ga-amanye pasenti iri atọ na anọ na ngwaahịa niile si mba Amerịka
abata na Chaịna.
Mịnịstrị na-ahụ maka ego na azụmaahịa n amba Chaịna mere
ka a mata nke a ma kwuo na amụma ahụ
ga-ebido n’Epril 10 2025.
Ha katọrọ ụtụisi
mba Amerịka manyere n’ihe niile e si mba
Chaịna ebubata n’Amerịka ma kwuo na “ọ dara iwu mba ụwa ji azụ ahịa”.
Onyeisiala
mba Amerịka bụ Donald Trump kwupụtara nay a amanyere ụtụisi 54% n’ọnụahịa ihe niile e si mba Chaịna ebubata n’Amerịka.
Nke a mere
mba Chaịna dịka ndị ọ kacha metụta n’ụtụisi ọhụrụ mba Amerịka manyere na ngwaahịa
e si mba dị icheiche ebubata n’Amerịka.
Ndị uweojii ka anyị nụrụ na ha kwụrụ chịm iji gbochie ihe ọbụla nwereike imetụta udo obodo.
N'okwu ya oge ụlọikpe kwupụtara mkpebi ha, Yoon kwuru rịọrọ ndị Saụt Korịa mgbaghara n'ihi na o meghị ihe ha tụrụ anya n'aka ya dịka onyeisiala ha.
Cheta na ọgbaaghara dapụtara na mba Saụt Korịa n'onwa Disemba 2024 oge Yoon nyefere ikike ọchịchị n'aka ndịagha.
Ọ bụ nke a mere ka a napụ ya ikike ya dịka onyeisiala ụbọchị Satọde 14 Disemba 2024.
Ụfọdụ ndị ọrụ ya maara ya kwuru na Yoon bụ onye na-eme ihe ọbụla masịrị ya malite oge ọ dị na nwata.
Ugbua ụlọikpe iwu kwadoro nchụpụ Yool dịka onyeisiala, a ga-eme ntụliaka n'ime abalị iri isii na abịa iji họpụta onye ga-abụ onyeisiala ọhụrụ.ba Saụt Korịa.
Ụtụisi ọhụrụ Trump wepụtara emetụtala azụmahịa na mba Ọstrelịa na Eshia
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Onyeisiala Trump manyere ụtụisi 10% na ngwaahịa ọbụla si mba ọzọ abata Amerịka
Ụtụisi ọhụrụ Onyeisiala
Donald Trump na-achị Amerịka wepụtara, akpụọla azụmahịa mba Eshia na Ọstrelịa
afọ n'ala.
Nke a bụ ụbọchị abụọ
nke na-eme ebe akụkọ na-ekwu na ụtụisi ọhụrụ nwereike inwe mmetụta nye azụmahịa
mbaụwa gbaa gburugburu.
Azụmahịa mba Amerịka kpụkwara
afọ ala. Nke mbụ ya kemgbe ọrịa Covid tiwapụrụ n'afọ 2020.
Onyeisiala Trump kwuru
na ụtụisi ọhụrụ ya na-aga nke ọma ma kwuo na o ga-ewulite azụmahịa n'ọdịnihu.
N'aka nke ọzọ ndị mbaụwa
ekwuola na ha ga-azaghachi mmanye ụtụisi 10% ahụ Onyeisiala Trump manyere na
ngwaahịa ọbụla si mba ọzọ abata Amerịka nke ga-amalite ụbọchị Satọde 5 Eprel,
2025.
Ndị be anyị, unu abọọla chi?
Anyị ji obi ụtọ anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 4 Eprel 2025.
Ọfọ anyị bụ ka ihe ọma niile so ụbọchị taa bụ ahịa orie ruo gị na ezinaụlọ aka.
Ije ọma ga-abụ nke gị taa.
Ndewo!
Etu mmadụ anọ si gbuo onye Injinịa kpọrọ ha ọrụ ma lie ozu ya
Ebe foto si, Delta State Police Command
Ndị uweojii Delta Steeti kwuru na aka ha akparala mmadụ abụọ n’ime
mmadụ anọ a na-enyo na aka ha dị n’ogbugbu otu nwoke Injinịa na-arụ ụlọ a kpọrọ
Chigozie Udalor ma lie ozu n’obere ili.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Bright Edafe
kwuru na a nwụchiri ndị a n’ụbọchị abụọ nke ọnwa Eprelụ, 2025.
Na nkọwa o nyere, Edafe kwuru na nnyocha e mere gosiri na
mmadụ anọ a bụ ndị Benue Steeti Udalor kpọtara ka ha rụọrọ ya ọrụ, gburu ya mgbe
ha chọpụtara na nnukwu ego dị n’ọbaego ya.
O kwuru na ụbọchị 12 Disemba, 2024 ka nwanne Udalor a kpọrọ
Hyacinth Nnalue kpọtụụrụ ndị uweojii ma kwuo na ha na-achọ nwanne ha bụ Udalor kamgbe
ụbọchị 10 Disemba.
O kwuru na Udalor bụ onye na-elekọta ebe ọ na-arụ ụlọ e ji
akụ azụ dị n’ebe a na-akpọ Bod Camp n’obodo Akwukwu.
O kwuru na ngwa ngwa ha nwetere ozi a na ha malitere ime nnyocha
nke mere e jiri nwuchie mmadụ abụọ n’ụbọchị 31 Maachị, 2025.
Ha nwuchiri otu n’ime ha bụ Davido Tacho ka ọ na-achọ iji
ekwentị Udalor ha gburu egbu adọrọ ego n’ọbaego ya. Ebe e mechara nwuchie
Daniel Orshio bụ onye si kpaa arụ a.
Akụkọ kwuru na dịka mmadụ anọ na-arụrụ Udalor ọrụ na ha chọpụtara
na ọkpụrụkpụ ego dị n’ọbaego ya nke mere ha jiri kpaa nkata ma were ‘hammer’
tigbuo ya.
Ha kechiri ozu ya ma lie ya n’obere ili dị n’akwụkwọ ebe ha
na-arụ ọrụ.
Dịka ọ dị ugbua, Edafe kwuru na mmadụ abụọ ha ji eji
na-enyere ha aka n’ime nnyocha nakwa ịgba mbọ nwuchie abụọ fọrọ afọ.
Gọvanọ Sanwo-Olu arịọla ndị bi na Legọs mgbaghara maka mkpachi okporoụzọ mere na Wenezde
Ebe foto si, Babajide Sanwo-Olu/X
Gọvanọ
Babajide Sanwo-Olu nke Legọs Steeti arịọla ndị bi n’obodo ahụ mgbaghara maka oke
kpachikpachi mere n’ụzọ n’ụbọchị Wednezde maka mmechi e mechiri akwammiri ‘Independence
Bridge’.
Mmechi
akwammiri a butere nnukwu ntaramahụhụ nye ndị bi na Legọs maka na ọtụtụ ndị
mmadụ hiri n’okporoụzọ n’ihi mkpachi nke okporoụzọ.
Mgbe
Sanwo-Olu gara njem nleta n’ebe a na-arụzi akwammiri ahụ na Tọzde, ọ rịọrọ ndị
mmadụ mgbaghara maka mkpachi ahụ ma kwuo na a ga-arụcha ụzọ ahụ ngwa ngwa iji
belata mkpachi okporoụzọ.
E mechiri
akwammiri ahụ n’ụbọchị Wenezde maka ịrụzi ya, nke butere nnukwu kpachikpachi n’okporoụzọ
site n’ụtụtụ ruo n’ụtụtụ Tọzde.
Ihe onyonyo
fesara na soshal midia gosiri ka ọtụtụ ndị mmadụ na ụgbọala ha kwụcha n’okporoụzọ
na-agbapụghị ọsọ ọbụla.
Ukọchukwu Naịjirịa a tụrụ mkpọrọ afọ asatọ na mba Saụt Afrịka maka ebubo ịma ụmụnwaanyị elu n'ike enwerela onwe ya
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Timothy Omotoso
A tụrụ nwaafọ Naịjirịa bụ ụkọchukwuTimothy Omotoso mkpọro afọ asato na mba Saụt Afrịka.
Timothy
Omotoso bụ onye amaama na-ekwusa ozi ọma sịte n’onyonyo na mba Saụt Afrịka ma
wee ụlọụka na mpaghara Pọrtu Elizabeti.
A tụrụ Timothy
Omotoso mkporọ maka ebubo ịdịna ụmụnwaanyị n'ike n’ime ụlọ ụka ya.
N'oge a na-ekpe ya ikpe ka ọ gwara ụlọikpe na aka ya dị ọcha.
Otu n'ime ndị gbara akaebe megide Timothy kwuru na ọ dinara ya n'ike mgbe ya dị naanị afọ iri na anọ.
Mana mgbe a na-ekpebi
ikpe ahụ n’ubochi Wenezde garaaga ka onye ọkaikpe kwuru na aka Timothy Omotoso dị ọcha.
Omotoso
kenere ndị ntaakụkọ ma Chineke maka etu ụlọikpe siri kpebie ikpe ya.
Cheta na mbụ, ụlọikpe
tọghapụrụ Lusanda Sulani na Zikiswa Sitho bụ ndị e bokọrọ ha na Timothy Omotoso ebubo ahụ.
E jidere Omotoso n’afọ 2017 n’ọdọ ụgbọelu mgbe ọ
chọrọ isi na mba Saụt Afrịka pụọ.
Ikpe ya bụ nke mbụ e kpere n’ihu onyonyo nke
mmadụ niile kiriri na mba ahụ bụ mba ịma ụmụnwaanyị elu n’ike bụ okwu a kpụ n’ọnụ.
Lee nkenke nkọwa banyere ụtụisi Trump wepụtara
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump
Onyeisiala mba
Amerịka bụ Donald Trump ewepụtara amụma ụtụisi ọhụrụ maka n’ihe niile e si mba ọzọ atụbata na mba ahụ.
Amụma ụtụisi ahụ
metụtara mba ọbụla n’ụwa niile mana e were ndị pasentị nke ha ka ibe ya.
Pasenti
10 ka a manyere n’ihe niile ga-abata na mba Amerịka:
Trump
manyere opekatampe pasenti 10 na ngwa ahịa nakwa ihe niile si mba ụwa abata n’Amerịka.
Nke a metụtakwara mba dị icheiche dịka UK, Ostrelịa,
Ajentịna, na Saụdị Arebịa. Nke a ga-ebido n’Epril 5, 2025.
Mba
Pasentị ụtụisi ha pụrụiche:
Trump wepụtara
mba dị 60 bụ ndị ọ hụrụ dịka ndị kwesiri ịkwụ ụtụisi karịa ndị ọzọ. Ọmụma ụtụisi
mba ndị nke a ga-ebido n’Epril 9, 2025. Mba ndị ahụ gunyere:
Mba niile so n’otu jịkọrọ Yurop:
20pasenti
Mba Chaịna: 54%
Mba Japan: 24%
Mba
Kanada na Meziko:
Trump manyere
ụtụisi 25pasentị n’ihe niile si na mba abụọ ahụ.
Ụgbọala e
bubatara n’Amerịka:
Ụgbọala
niile e si mba ọzọ tụbata n’Amerịka ka Trump manyere ụtụisi 25pasenti. Nke a ga-ebido n’Epril 3, 2025.
Ụmụ Igbo unu asaala chi?
Ka Olisa bi n'igwe gozie ụbọchị taa dịka unu na-esonyere anyị.
Ọ bụ Michael Ilediagu ga-enwetere unu akụkọ ihe na-eme n'ala Igbo, Naịjirịa nakwa mba ụwa niile, mana Ikechukwu Kalu na Chinonso Ugorji ga-esonyere ya n’ehihe.
Ndewo !
Ọnọdụ USAID etinyela mba Myanmar n'ahụhụ inweta enyemaka mba Amerịka maka ala ọma jijiji
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Myanmar
Mba Amerịka enweghị ike ịnyere Myanmar aka kemgbe ala ọmajijiji dakwasara ha maka etu gọọmenti Donald Trump siri kwụsị ndị ọrụ USAID ọrụ.
USAID n’ọnụ bekee pụtara ‘US Agency for International Development”.
Mana onye ọrụ USAID kwuru na kemgbe ọdachi ala ọmajijiji dakwasịrị mba Myanmar na mba Amerịka enweghị ike ịnyere ha aka ma kwuo na ọnọdụ dị etu ahụ ‘na-emetụta ndụ ndị mmadụ”.
Cheta na ọ bụ site n’out USAID ka mba Amerịka siri enyere ọtụtụ mba aka n’oge ha were ọnọdụ gbatagbata.
Kemgbe ụbọchị Fraịde garaaga bụ ụbọchị ala ọmajiji dakwasịrị Myanmar, mmadụ ruru 2,700 nwụrụ ebe ndị ọzọ ruru 4,500 meruru ahụ.
Elon Musk bụ onye ndụmọdụ pụrụiche nke Donald Trump adịla njikere imechi ụlọọrụ USAID ka ọ mechere ka ndị ọrụ ha gaa ezumuike ọrụ.
Val Kilmer na-eme ihe nkiri Hollywood anwụọla ka ọ gbachara afọ 65
Ebe foto si, Alamy
Ndị na-ahazi ihe nkiri na Hollywood akwaala arịrị maka ọnwụ
onye na-eme ihe nkiri a kpọrọ Cal Kilmer, onye nwụrụ ka ọ gbachara afọ 65.
Kilmer so mee ọtụtụ ihe nkiri ndị wuru ewu n’agbata afọ 1980
ruo 1990, nke gụnyere ‘Top Gun na Batman Forever’.
Otu onye kọwaara Kilmer dịka ‘ezigbo onye ya na mmadụ kwesịrị
ịrụkọ ọrụ nakwa onye na-eme mmadụ obi ụtọ.”
Cher na-eti egwu bụ ọyị nwaanyị Kilmer kwuru na ọ bụ ezigbo ọyị,
siri ike ruo oge ọ na-arịa ọrịa.
Ebe foto si, Paramount via Shutterstock
Kilmer nwụrụ site n’ọrịa oyi a kpọrọ ‘pneumonia’ n’ụbọchị Tuzde na Los Angeles, dịka nwa ya nwaanyị bụ Mercedes si gwaa ndị ntaakụkọ n amba Amerịka.
O kwuru na a chọpụtara na nna ya nwere ọrịa kansa nke akpịrị n’afọ 2014 mana o mechara gbakee.
Ọwụwa a wara ya n’akpịrị metụtara etu o si ekwu okwu ma gbochie ya ị na-eme ihe nkiri ọfụma, mana o mechara lọghachị n’afọ 2022 n’ihe nkiri ‘Top Gun: Maverick’ ya na Tom Cruise mere.
Tracheotomy surgery affected his voice and curtailed his acting career, but he returned to the screen to reprise his role as fighter pilot Iceman alongside Tom Cruise in 2022's Top Gun: Maverick.
Ụlọikpe Tribunal akagbuola mkpesa pati AA megide Gọvanọ Okpobholo nke Edo Steeti
Ebe foto si, HE Sen Monday Okpebholo/Facebook
Ụlọikpe Tribunal dị n’Abuja
na-ahụ ntuliaka ọkwa Gọvanọ Edo Steeti akụchapụla mkpesa pati Action Alliance
(AA) mere megide nhọpụta Monday Okpebholo nke pati All Progressive Congress
(APC) dịka Gọvanọ Steeti ahụ.
Ụlọikpe
a kwuru na otu onye a kpọrọ Adekunle Omoaja so gbaa akwụkwọ ahụ enweghi ikike ịgba
ụdịrị akwụkwọ ahụ.
O kwuru
na Omoaja esoghi n’ụzọ ọbụla mee ntuliaka ọkwa gọvanọ nke pụtara na o nweghi
ikike itinye ọnụ maọbụ ị sị na ntuliaka ahụ agaghị ọfụma.
Ụlọoikpe gara n’ihu kwuo na ihe bụ iwe Omoaja bụ na a hụtaghị
ya dịka Onyeisioche nke Action Alliance maka ịhọpụta onye ji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa,
mana a sị na ebubo ya achịtaghị aja n’iwu ntuliaka nke afọ 2022.
Omoaja gwara ụlọikpe n’akwụkwọ ọ gbara ka ha kagbuo mkwupụta
ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec kwupụtara Okpebholo dịka onye meriri na
ntuliaka aka ahụ.
O bokwara ebubo nrụrụaka ma kwuo na Okpebholo enwetezughi
akara vootu kachasị na ntuliaka ahụ.
He also alleged corruption and that Okpebholo and APC did
not win majority of lawful votes in the election.
O kwukwara na e kweghi pati AA họpụta onye ga-eji ọkọlọtọ
ha zọọ ọkwa na-agbanyeghi na ọ bụ onyeisioche pati ahụ.
Ụlọọrụ Inec kwupụtara Okpebholo dịka onye ji vootu
291,667 merie ndị maara ya aka ebe Asue Ighodalo nke Peoples Democratic Party
(PDP) ji vootu 247,655 na-eso ya na ntuliaka ahụ.
A tụgharịala ikpe ọnwụ a mara ndị Amerịka atọ maka ime atụmatụ nkwatu ọchịchị na DR Kongo
Ebe foto si, Reuters
A tụgharịala ikpe ọnwụ a mara ụmụafọ Amerịka atọ maka mbọ ha
gbara na nkwatu ọchịchị kụrụ afọ n’ala na mba DR Kongo n'afọ gara aga ka ọ bụrụzie
mkpọrọ ọka.
Ha so n’ime mmadụ iri atọ na asaa (37) ụlọikpe ndịagha mara
ikpe n’ọnwa Septemba afọ gara aga.
E boro mmadụ atọ ahụ ebubo ịnọ n’isi mwakpo e mere n’obi ọchịchị
onyeisiala nakwa n’ụlọ otu onye na-akwado Onyeisiala Félix Tshisekedi n’ọnwa
Mee gara aga.
Ntụgharị ikpe ahụ na-abịa dịka onye mba Amerịka họpụtara ọhụrụ ka onye
ndụmọdụ pụrụiche maka okwu ndị metụtara Afrịka bụ Massad Boulos
ga-awuchi DR Kongo.
Boulos bụ nna di nwa Onyeisiala Trump bụ Tiffany ka a tụrụ
anya iwuchi Kinsasha n’ụbọchị Tọzde 3 Eprel 2025 maka njem ga-ebugakwa ya mba Rụwanda,
Kenya na Yuganda.
Mịnịsta
na-ahụ maka nchekwa na Izrel bụ Israel Katz ekwuola na ndịagha Izrel ga-aga n’ihu
weghaara mpaghara dị iche iche na Gaza dịka ndịagha ha na-agbasa ọrụ ngwa ọgụ
ha.
O kwuru nae
be ndị ha ga-eweghaara ga-esonye n’ebe a ga-akpọ mpaghara nchekwa.
N’ozi o wepụtara
n’ụbọchị Wenezde 2 Eprel 2025, Katz kwuru na ịgbasa ihe ngwa ọgụ na Gaza ga-enyeaka
imebi ma kpochapụ ndị na-eyi ọha egwu yana akụrụngwa ndị na-eyi ọha egwu.
O kwukwara
na nke a ga-achọ ka apụpụ ndị Palestine ọtụtụ na mpaghara ahụ.
Nke a na-eme
mgbe ụlọọgwụ dị na Gaza kwuru na e gbụrụ ihe ruru ndị Palestine mmadụ iri na
ise na mpaghara n’oge abalị.
Ụlọọrụ na-ahụ
maka nchekwa obodo nke Hamas kwuru na enwetara ozu mmadụ iri na abụọ, gụnyere ụmụaka,
n'ụlọ dị na mpaghara Khan Younis.
Akụkọ kwuru
na mba Izrel na-atụ ogbunigwe na mpaghara okeala mba Ijipụt. Nke a na-egosi na
mba Izrel nwereike ịmalite mbuso agha ọhụrụ na Gaza.
Onyeisiala
Naịjirịa Bola Tinubu agbanweela ndị isi ụlọọrụ Nigerian National Petroleum
Company (NNPC) Limited, ma wepụ onyeisi oche, Pius Akinyelure na onyeisi,
Mallam Mele Kyari.
N’akwụkwụ
ozi onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Onyeisiala bụ Bayo Onanuga wepụtara n’ụbọchị Wenezde
2 Eprel 2025, o kwuru na Onyeisiala Tinubu ewepụla ndị otu bọọdụ a họpụtara ya
na Akinyelure na Kyari na Nọvemba 2023.
O kwuru na ọ
bụ Bashir Ojulari bụ onye ga-eburu oche dịka onyeisi NNPC ebe Ahmadu Kida ga-abụ
onyeisi oche bọọdụ ga-enwe mmadụ iri na otu dịka ndị otu ya.
Onanuga
kwuru na Onyeisiala Tinubu họpụtara mmadụ isii ga-abụ ndị otu bọọdụ NNPC site
na mpaghara ọchịchị isii enwere na Naịjirịa.
Onyeisiala
Tinubu nyekwara bọọdụ ọhụrụ ahụ atụmatụ ime ihe ozugbo iji hazie nyochaa atụmatụ
nke NNPC yana ngwongwo ya bụ ụlọọrụ iji hụ na ha dabara na ebumnuche Naịjirịa.
O kwuru na ndị
niile a họpụtara ga-amalite ọrụ site n’ụbọchị taa bụ Wenezde 2 Eprel 2025.
A na-atụanya
na Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump ga-ekwupụta tarifu ọhụrụ taa nke obi ọchịchị
mba Amerịka ‘White House’ kpọrọ ụbọchị nnwere onwe ‘Liberation Day’.
Nke a nwereike ime ka ụgbọala, biya na mmanụ ụgbọala ịkawanye ọnụ na Amerịka.
Akụkọ kwuru
na a matabeghị etu ọnụahịa tarifu ahụ ga-esi ala elu maọbụ mba ndị ọ ga-emetụta,
mana Onyeisiala Trump kwuru na tarifu ọhụrụ ahụ ga-eme ka ndị Amerịka na-azụ
ngwaahịa emepụtara na mba Amerịka.
Mana ndị nnyocha
na-adọ aka na ntị na o nwere ike ịkwalite ọnụahịa ma kpalite agha azụmaahịa na mba
ụwa.
Mba dị na
Yurop kwuru na ha dị njikere itinye ọnụahịa mmegwara mana obi ọchịchị mba Amerịka
‘White House’ kwuru na Onyeisiala Trump dị njikere ka yana ụfọdụ mba nwee mkparịtaụka
banyere tarifu ọhụrụ a.
Cheta na
tarifu bụ ụtụ isi a na-akwụ n'ahịa esi mba ofesi ebubata, Ọ na-abụkarị pasentị
nke uru ngwaahịa ahụ, mana ọ bụ ụlọọrụ ndị na-azụta ngwaahịa ndị ahụ si mba ọzọ
ga-akwụ ụtụ isi ahụ.
Ndịagha Myanmar ajụla nkwụsị agha ha na ndị nnupụisi dịka mmadụ 2,700 nwụrụ n’ala ọmajijiji
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Ihe ala ọmajijiji mebiri na Myanmar
Ndịagha Mianmaa
ajụla nkwụsị ọgụ ha na ndị nnupụisi dịka ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ n’ala ọmajijiji mere
na mba ahụ na-arị elu.
Onyeisi ndịagha Mianmaa Min Aung Hlaing jụrụ oku ndịagha nnupụisi na-akpọ ka
enwee nkwekọrịta nkwụsị ọgụ iji kwe ka ihe enyemaka mmadụ bata na mpaghara ebe ala
ọmajijiji mere n’izu gara aga.
Otu ndị nnupụisi
atọ kpọrọ oku ka akwụsị agha nke obere oge dịka ndị ọchịchị kwuru na mmadụ puku
abụọ na narị asaa (2,700) anwụọla n’ihe mberede ahụ kpara mkpamkpa na mba ahụ ụbọchị
Fraịde 28 Maachị 2025, ebe ka na-achọ ọtụtụ mmadụ achọ.
Onyeisi ndịagha
Mianmaa kwuru na ndịagha ga-aga n’ihu ime ihe kwesịrị ekwesị iji nweta nchekwa
na mba ha.
Ụlọọrụ UN
kwuru na ala ọmajijiji ahụ emela ka ọnọdụ Mianmaa, nke nọọ n’agha kemgbe afọ anọ,
kawanye njọ.
Ala ọmajijiji
ahụ mekwara na mba ndị agbataobi ha dịka Thailand ebe e kwuru na mmadụ iri abụọ
na otu anwụọla.
Akụkọ kwuru
na ndị ọrụ ka na-achọ ndị dị ndụ na mba abụọ ahụ mana olilieanya ịhụ ndị lanarịrị
ihe mberede ahụ na-ebelata ugbua dịka a na-ebupụta ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ n’ebe ụlọ
dara adaa.
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ndị Buddhist mọnk na-ekpocha ihe n’ebe obibi ndị mọnk dị na Thahtay Kyaung mebiri emebi na Mandalay