Yukren, Amerịka bịnyere aka na nkwekọrịta akụ na ụba sitere n'okike maka ịkwụsị mwakpo Rọshịa

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Eprel 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Aljiria na Mali gbochiri ụgbọelu si mba ha ịgafe n’ikuku ha maka duronu a gbaturu

    Aljiria na Mali gbochiri ụgbọelu si mba ha ịgafe n’ikuku ha maka duronu a gbaturu

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Aljiria na Mali gbochiri ụgbọelu si mba ha ịgafe n’ikuku ha maka duronu a gbaturu

    Esemokwu dị n’etiti mba Aljiria na Mali na-akawanye njọ dịka mba abụọ ahụ gbochiri ụgbọelu ha ịgafe n’ikuku ha maka duronu mba Mali, Aljiria gbaturu n’okeala ha abụọ.

    N’ụbọchị Sọnde, Mali boro Aljiria ebubo ịkwado ndị na-eyi mmadụ egwu na-ejighị ihe akaebe dịka Aljiria wakporo duronu mba Mali n’izu gara aga.

    Aljiria bụ ndị mbụ gbochiri ụgbọelu si Mali ịgafe n’ikuku ha tupu Mali emechaa kwupụta na ha na-egbochikwa ụgbọelu si Aljiria ịgafe n’ikuku ha, iji megwara nke ha.

    Ebubo ahụ nke mịnịstrị mba ofesi Mali wepụtara n’akwụkwọ ozi ahụ, katọrọ nkọwa Aljiria mere maka duronu ahụ dịka ha kwuru na duronu ahụ mebiri usoro iwu ikuku ha.

  2. Chaịna ejikerela 'ịlụ ọgụ' dịka Onyeisiala Trump na-eyi egwu ịmanye 50% tarifu

    Onyeisiala Trump

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Trump

    Chaịna ekwuola na ha adịla njikere ‘ịlụ ọgụ ruo ọgwụgwụ’ dịka Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump na-enyi egwu na ọ ga-etinye 50% tarifu na mbubata niile si Chaịna abata Amerịka.

    Onyeisiala Trump kwuru na ya ga-aga n’ihu ime nke a n’ụbọchị Tuzde, ma ọ bụrụ na Chaịna ewepụghị tarifu mmegwara ha tinyere na mbubata niile si Amerịka abata Chaịna.

    Mana Mịnịstrị na-ahụ maka azụmahịa na Chaịna na-ebo gọọmentị Trump ebubo mwakpo anya, ma kwuo na tarifu ya bụ "omume mmegbu"

    Tarifu ọhụrụ a nwereike ime ka ụfọdụ ụlọọrụ dị n’Amerịka na-ebubata ụfọdụ ngwaahịa sitere na Chaịna na-akwụ ụtụisi ruru 104%.

    N’aka nke ọzọ, ọtụtụ ahịa dị n’Eshia mepere n’ụbọchị Tuzde amalitela ịgbanwe ebe Taiwan stọọkụ hụrụ ọdịda 4% ọzọ.

    Ahịa stọọkụ kacha ukwuu dị na Yurop - gụnyere FTSE 100 nke London - mechiri n’ihe karịrị 4% na Mọnde.

  3. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nụ

    Anyị na-asị ụnụ nọọ n’ọgbakọ BBC News Igbo.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga na-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme n'ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile.

    Mana Michael Ngene na Chinonso Ugorji ga-emechaa sonyere anyị n'oge ehihe.

    Dịka ụnụ na-esonyere anyị taa bụ Tuzde 8 Eprel 2025, ọfọ anyị bụ n’ụbọchị taa ga-amịtara anyị mkpụrụ ọma.

    Ya gazie!

  4. Mali eboola Aljiria ebubo ịkwado ndị na-iyi ọha egwu

    Mali ebuola Aljiria ebubo ịkwado ndị na-iyi ọha egwu

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Mali ebuola Aljiria ebubo ịkwado ndị na-iyi ọha egwu

    Mali ebuola mba Aljiria ebubo ịkwado ndị na-iyi ọha egwu dịka Aljiria gbaturu otu duronu ndị Mali n'okeala ha.

    N’ozi nke mịnịstrị na-ahụ maka ihe na-eme na mba ofesi na Mali wepụtara na Sọnde, ka ha katọrọ nzaghachi ndị Aljiria na duronu ahụ emebiela usoro iwu mbara ikuku ya.

    Ha kwuru na ngbatu a gbaturu duronu ahụ bụ omume ndị iro eburu n'uche mana mba Aljiria enwebegi ihe ha kwuru maka ebubo a.

    Mgbatu onyunyo n'efe na-elu bu ihe dị mkpa na Mmụba nke esemokwu nyere ha dị ka mba Mali, ndị ha na ya jikọrọ aka bụ mba Niger na Mba Burkina Faso akpọghachitela ndị nnọchianya ha na Mba Aljiria

    Cheta na ndịagha mba Malị na-ebu agha megịde ndịagha nnupụisi Tuareg na-enye nsogbu n’ugwu mpaghara Mali.Ha nwere ebe siri ike n’obodo Tinzaoutin, nke gafere okeala Mali na Aljiria.

    N’afọ gara-aga, mba Mali, Niger na Burkina Faso kewapụrụ onwe ha na ECOWAS ma jikọọ aka wepụta mpaghara a na-akpọ ‘Alliance of Sahel States’.

    Mgbatu duronu ahụ Aljiria mere, e mela ka mmekọrịta mba na mba dị n’etiti mba abụọ ahụ kawanye njọ dịka mba Mali, Nijel na Burkina Faso kpọghachitere ndị nnọchiteanya gara Aljiria.

  5. Oke ide mmiri egbuola mmadụ 33 na Kinshasa, isi obodo mba Kongo

    Nwoke na-azọ onwe n'elu ụgbọala ide mmiri riri

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Nwoke na-azọ onwe n'elu ụgbọala ide mmiri riri

    Oke mmiri ozuzu na ide mmiri ataala isi mmadụ 33 na Kinshasa bụ isi obodo mba Kongo.

    Akụkọ ndị ọchịchị mba wepụtara kwuru na ọtụtụ ndị bi na mpaghara ahụ na-agba mbọ ịgbapụ ebe ahụ iji zọọ ndụ ha na ezinaụlọ ha.

    Ihe ruru mmadụ dị nde iri na asaa (17million) bi na Kinshasa nke dị n’elu osimiri Kongo bụ otu n’ime osimiri kachasị na mbaụwa niile.

    Akụ kwuru na ide mmiri bụ ihe a na-ahụkarị na Kinshasa maka oke mbuze ala.

    Onyeisiala Felix Tshisekedi adọọla aka na nti ma kwuo ọ bụ mgbanwe ihu igwe bụ ihe na-eme ka ide mmiri ahụ kawanye njọ.

    Ide mmiri ahụ malitere kemgbe abalị Fraịde 4 Eprel ruo Satọde 5 Eprel, eburula ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ.

    Ọtụtụ ndị obodo kwuputara iwe ha ebe ndị ọchịchị nọ maka na ha emeghị ihe ha kwesịrị ime iji gbochie ide mmiri ahụ ma nyere ha aka.

    Ndị oke ide mmiri ahụ buuru ụlọ ha.

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Ndị oke ide mmiri ahụ buuru ụlọ ha.
  6. Ahịa stọọkụ adala n'Eshia na Yurop maka tarifu Onyeisiala Donald Trump

    Ahịa Stọọkụ na Taiwan

    Ebe foto si, EPA

    Nkọwa foto, Ahịa Stọọkụ na Taiwan

    Ahịa stọọkụ dị na mpagahara Eshia na Yurop amalitela ịda n’ihi tarifu ọhụrụ nke Onyeisiala Donald Trump tinyere na mbubata niile si mba dị iche iche abata mba Amerịka.

    Tarifu ọhụrụ nke Onyeisiala Donald Trump tinyere na mbubata niile na-abata Amerịka amalitela eziga ụjọ n’ụwa niile dịka ahịa stọọkụ nke mba Yurop dara mgbe ahịa malitere n’ụtụtụ a.

    Ndekọ Dax na Jamini gbadara ihe fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ 10%, tupu ọ gbakee ntakịrị, ebe FTSE 100 na London gbadara ihe fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ 6%.

    Na Shanghai, stọọkụ gbadara karịa 8% n'otu oge, ebe nke Hong Kong's Hang Seng gbadara ihe fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ 13%.

    Na mbu, stọọkụ dara nke ukwuu n’Amerịka, na-egosi n’ahịa Wall Street ga-ada mgbe ahịa Amerịka mepere emepe.

    Ọ dịda nke taa, na-esote ọdịda n'izu gara aga bụ n’ihi iwu Onyeisiala Donald Trump manyere n’ụtụisi zuru ụwa ọnụ n’ahịa a na-ebubata n’Amerịka.

    Mana Onyeisiala Trump agbachiterela iwu ya, na-agwa ndị ntaakụkọ na "mgbe ụfọdụ ị ga-aṅụ ọgwụ iji dozie ihe".

    Ụgbọmmiri na-amịpụta mmanụ crude

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ụgbọmmiri na-amịpụta mmanụ crude

    Dịka a na-elekwasị anya n’etu ahịa stọọkụ si ada maka tarifu ọhụru Onyeisiala Trump, ọnụ ahịa ngwaahịa ndị ọzọ dịka mmanụ ‘crude’na ọla kọpa na-agbadakwa n’ike.

  7. Zimbabwe ga-ewepụ ụtụisi na ngwaahịa si Amerịka

    Onyeisiala mba Zimbabwe Emmerson Mnangagwa

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala mba Zimbabwe Emmerson Mnangagwa

    Onyeisiala mba Zimbabwe Emmerson Mnangagwa ekwuola na ya ga-akwụsịtụ ụtụisi tarifu na ngwaahịa si Amerịka na mbọ iji hụ na mba ahụ na ọchịchị Onyeisiala Donald Trump nwere mmekọrịta dị mma.

    Nke a na-eme ka ọ gachara abalị ole na ole Onyeisiala Trump tinyere 18% tarifu na ngwaahịa si Zimbabwe abata Amerịka.

    Onyeisiala Mnangagwa kwuru n’akara X na atụmatụ a ga-enyeaka ịhụ na ngwaahịa si Amerịka na-abata n’ahịa Zimbabwe ma kwalite uto nke mbupụ ngwaahịa Zimbabwe gawa mba Amerịka.

    Mmekọrịta mba na mba dị n’etiti Amerịka na Zimbabwe mebiri kemgbe Zimbabwe malitere iwu ala butere esemokwu ihe dịka afọ iri abụọ na ise (25) gara aga, ya na n'ihi enweghị ezi ikike dịrị mmadụ na mba ahụ.

    Dịka data gọọmentị Amerịka na-egosi, azụmahịa n'etiti mba abụọ a ruru naanị nde dọla $111.6 (£86.6m) n’afọ 2024.

    N’aka nke ọzọ, Amerịka bupụrụ ngwaahịa ruru nde dọla $43.8 na Zimbabwe n’afọ 2024, nke gosiri ngbago 10.6% site na nke afọ gara aga, ebe mbubata gbadara 41% ruo nde dọla $67.8m.

    Onye nnyocha ndọrọ ndọrọ ọchịchị Zimbabwe Tendai Mbanje gwara ụlọọrụ mgbasa ozi AFP na mkpebi Onyeisiala Zimbabwe a agaghị ebute nnukwu uru akụnaụba na mba Zimbabwe mana ọ ga-abara naanị Amerịka uru.

  8. Igbo bụ Igbo, ụnụ abọọla chi?

    Anyị na-asị ụnụ nọọ n’ọgbakọ BBC News Igbo.

    Dịka ụnụ na-esonyere anyị taa bụ Mọnde 7 Eprel 2025, ekpere anyị bụ na izu a ga-adịrị anyị niile mma.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga na-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme n'ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile.

    Mana Michael Ngene ga-emechaa sonyere anyị n'oge ehihe.

    Ndewo ụnụ!

  9. Ihe karịrị mba 50 na Amerịka amalitela mkparịtaụka ibelata tarifu ọhụrụ Trump wepụtara

    Onyeisiala Amerịka Donald Trump

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Amerịka Donald Trump

    Akụkọ kwuru na ihe karịrị mba 50 na Amerịka amalitela inwe mkparịtaụka iji ibelata tarifu ọhụrụ Onyeisiala Trump wepụtara.

    Ozi onyeisi ụlọọrụ National Econonmic Council bụ Kevin Hasset wepụtara, kwuru na mba Indoneshia na Taịwan ekwuola na ha agaghị amanye tarifu ọbụla na nzaghachi nye tarifu ọhụrụ ahụ.

    Praịm Mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netantahu agawala Washington DC izute Onyeisiala Trump maka mkparịtaụka na tarifu ọhụrụ a.

    Nke a na-abịa dịka tarifu 10% Onyeisiala Trump manyere na mbubata niile na-abata Amerịka malitere ụbọchị Satọde 5 Eprel, 2025.

    Praịm Mịnịsta UK bụ Keir Starmer adọọla aka na nti ma kwuo na ụwa emebiela ma kwe nkwa na gọọmenti UK dị njikere ichekwe akụnụba ha.

    Ndị ihe gbasara akụnaụba doro anya ekwuola na tarifu ọhụrụ ga-enwe mmetụta nye azụmahịa mba Amerịka mana Onyeisiala Trump arịọla Amerịka ka ha nwee ndidi.

  10. Popu Francis pụtara n'ogige St Peter Square ikele igwe mmadụ

    Mgbe Popu pụtara na St Peter Square na Vatịkan taa

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mgbe Popu pụtara na St Peter Square na Vatịkan taa

    Onyeisi ụka Katọlik na mba ụwa niile bụ Popu Francis pụtara taa na St Peter Square dị na Vatịkan dịka ọ hapụrụ ụlọọgwụ mgbe ọ gachara izuụka ise nke ọgwụgwọ ya.

    Popu pụtara obere oge n’ọgbọ n'oche nkwagharị yana tubu iku ume dị n'okpuru imi ya.

    O kelere ndị mmadụ "Ndewo onye ọ bụla," na-efere igwe mmadụ aka na-aṅụrị ọṅụ ma sị ha daalụ nke ukwuu."

    Popu ahụ dị afọ iri asatọ na asatọ pụtara n’ụlọọgwụ dị na Rome na 23 Maachị 2025, ma pụtakwa na wido ụlọọgwụ ụbọchị ahụ inye ndị mmadụ ngọzị.

    Cheta na ndị dọkịta kwuru na Popu ga-anọ n’ụlọ ya ihe ruru ọnwa abụọ mana ndị Vatịkan kwuru na ahụ Popu na-aka mma ugbua dịka iku ume ya, ikwu okwu na megharị ahụ ya na-akawanye mma.

    Nnyocha ọbara e mere ya gosiri n'ọrịa ngụgụ ya na-adị mma ntakịrị ntakịrị dịka Popu na-achọ obere ikuku si na oxygen, mana a na-enye ya obere nke ahụ n'ụbọchị yana nnukwu ya n’abalị.

  11. NDLEA anwụchiela ụmụnne abụọ bu ọgwụike n’ọdụ ụgbọelu Legọs

    Ụfọdụ ndị a na-enyo enyo ndị ọrụ NDLEA wụchiri na steeti dị iche iche na Naịjirịa

    Ebe foto si, NDLEA/Facebook

    Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị a na-enyo enyo ndị ọrụ NDLEA wụchiri na steeti dị iche iche na Naịjirịa

    Ngalaba na-ebu agha megide ọgwụike na Naịjirịa bụ 'National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA), ekwuola na ha awụchiela ụmụnne abụọ bu ọgwụike ‘Cocaine’ ruru 5kg n’akpa akwa ha n’ọdụ ụgbọelu Murtala Muhammed International Airport, dị na Legọs steeti.

    Ha jidere ụmụnne abụọ a bụ John Abugu dị afọ 43 na Kenneth Abugu dị afọ 31, mgbe ha chọrọ ịbanye ụgbọelu na-aga Indịa n’ụbọchị 3 Eprel 2025, dịka ha kwuru na ha na-aga Indịa inwete nleta ahụike.

    N’otu ụbọchị ahụ, ndị ụlọọrụ ahụ jide kwara otu nwoke dị afọ iri abụọ bụ Parker Darren Hazekia Osei onye Gana ma bụrụkwa nwa amaala Breten dịka o bu ọgwụike ‘Loud’ ruru 19.40kg.

    Onye ahụ a na-enyo enyo kwuru na ya bụ nwata akwụkwọ ‘Computer Science’ na mahadum East London University dị n’UK. O so ụgbọelu Ethiopian Airlines si na Bangkok, Thailand lọta na Legọs.

    N’aka nke ọzọ, ndị ọrụ NDELA jide kwara otu agadị nwoke dị afọ 75 bụ Nna Nnanna Felix ebe o ji ọgwụike skunk ruru1.6kg ya na Kannabis mgbe ha gara mbuso agha n’Umunteke Asa dị n’okpuru ọchịchị Ukwa West n’Abịa steeti.

    Onye ọzọ ha jidere bụ otu onye a na-enyo enyo David Chinemerem dị afọ iri abụọ na otu dịka o ji 2,050 ampoules nka pentazocine. A wụchiri ya n’Umuode dị n’Aba n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Eprel.

    Etu ahụ ka siri jidekwa Nwada Ngozi Ogili dị afọ 33 n’ụzọ Okene-Lokoja dịka o bu 3kg methamphetamine were si Legọs na-aga isi obodo Naịjirịa, Abụja.

    Ha ga kwara ebe Nwada ahụ na-aga e buga ọgwụike ahụ n’Apo mechanic Abụja were wụchie ọtụtụ ọgwụike gụnyere Loud, Colorado, na cannabis.

  12. A tọrọla onye ọrụ gọọmentị n'Ebonyi steeti – Ndị Uweojii

    Ndị Uweojii Naịjirịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị Uweojii Naịjirịa

    Ndị Uweojii ekwuola na a tọrọla Nwada Blessing Adagba bụ onye nhazi Ngbo Central Development Center dị n’okpuru ọchịchị Ohaukwu n’Ebonyi Steeti.

    Akụkọ ụlọ mgbasa ozi Channels tv kwuru na ajọ ihe a mere n’ụbọchị Tọzde 3 Eprel 2025 emela ka egwu jide ndị obodo ahụ.

    O kwuru na ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ SP Joshua Ukandu kwuru na ngalaba na-ebu agha megide ndị ntọrọ mmadụ na-arụsi ọrụ ike ịhụ na-atọhapụrụ ya.

    Ụlọọrụ mgbasa ozi Channels Television kwuru na a tọọrọ Nwada Adagba n’ime abalị n’obodo Okposhi Eheku dị n’okpuru ọchịchị Ohaukwu.

    Ha kwuru na ihe a mere mgbe ụmụnwoke yigharịrị ka ndịagha wakporo ụlọ Blessing Adagba. Ha gwara Nwada ahụ ka o meghere ha ụzọ mana Nwada ahụ jụrụ n’ihi ha bịara n’ime abalị.

    Mana ndị ntọọ ahụ jiegbe wakpoo onye nhazi ahụ wee tọọrọ ya gawa n'ebe mmadụ na-amaghị.

    Akụkọ kwuru na ndị bi n’obodo ahụ na ndị ọrụ nchekwa n'Ohaukwu na-agba mbọ ịhụ na onye ahụ a tọọrọ lọtara n'udo.

  13. Amerịka kagbuola visa ndị Saụt Sudan maka esemokwu mbula

    Amerịka kagbuola visa ndị Saụt Sudan maka esemokwu mbula

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Amerịka kagbuola visa ndị Saụt Sudan maka esemokwu mbula

    Odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Marco Rubio ekwupụtala na Amerịka akagbuola akwụkwọ visa ha nyere ndị ji Saụt Sudan paspọtụ n’ihi na mba ahụ dị n’Afrịka ekweghị ịnabata ụmụamaala ha mba Amerịka gbara ụgbọ nwa nkpi n’oge.

    Rubio kwuru na Satọde 5 Eprel 2025, na Amerịka ga-amalite ịkwụsị ụmụamaala Saụt Sudan, obodo kacha ọhụrụ n'ụwa, na ọdụ ụgbọmmiri esi abata Amerịka.

    Ọ tara gọọmentị mgbanwe ọchịchị nke Saụt Sudan ụta maka ịjụ ịnabata nlọghachi nke ụmụamaala ya lọtara n'oge.

    Cheta na otu ihe pụtara ihe n’usoro iwu mbata na ọpụpụ Onyeisiala Donald Trump wepụtara bụ iwepụ ndị na-akwaga na mba Amerịka n'ụzọ iwu akwadoghị ma kwe nkwa ịkpọla ọtụtụ ndị mmadụ.

    Rubio kwuru na oge eruola mgbe gọọmentị mgbenwe mba Saụt Sudan ga-akwụsị irigbu Amerịka.

    O kwukwara na mba ọbụla kwesịrị ịnabata ụmụamaala ha lọtara alọta n’oge nke gụnyere ndị mba Amerịka chụlatara.

    Nke a na-eme mgbe egwu dị na Saụt Sudan ga-amalite agha obodo ọzọ.

    Cheta na ụbọchị 8 Maachị, mba Amerịka nyere iwu ka ndị abụghị ndịọrụ gbatagbata si Saụt Sudan pụọ n’Amerịka.

  14. Izrel ekwetala mmejọ maka igbu ndịọrụ gbatagbata mmadụ 15 na Gaza

    Flaagị mba Izrel

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Flaagị mba Izrel

    Izrel ekwetala na ndịagha ha mejọrọ dịka ha gburu ndịọrụ gbatagbata mmadụ iri na ise na-amaghị ama na ndịda Gaza na 23 Maachị 2025.

    Cheta na ndị njem nke Palestine Red Crescent Society (PRCS) bu ụgbọala eji ebu ndị ahụ adịghị, ụgbọala ụlọọrụ UN na ụgbọ ọkụ si Gaza's Civil Defence gbara ọkụ na nso Rafah.

    Izrel kwuru na mbụ na ndịagha ha malitere ịkwa mgbọ n’ihi na ndị njem ahụ rutere ha nso n’ụzọ a na-enyo enyo n'ọchịchịrị na-enweghị ọkụ ihu maọbụ ọkụ na-egbuke egbuke.

    Izrel ekwetala mmejọ maka igbu ndịọrụ gbatagbata mmadụ 15 na Gaza

    Ebe foto si, Palestine Red Crescent Society

    Nkọwa foto, Izrel ekwetala mmejọ maka igbu ndịọrụ gbatagbata mmadụ 15 na Gaza

    O kwuru na mgbe ụgbọala ahụ na-eme njem na mbụ, ha na ndịagha na-enwe kwenye tupu ha amalite njem.

    Ihe onyonyo dị n’ekwentị nke ụlọ mgbasa ozi New York Times kasara, nke otu onye n'ime ndị ọrụ ahụike e gburu gosiri na ụgbọala ndị ahụ nwere ọkụ dịka ndịọrụ ahụ zara oku iji nyere ndị merụrụ ahụ aka.

    Ndịagha nchekwa Izrel (IDF) kwuru na opekatampe mmadụ isii n'ime ndị dọkịta ahụ nwere ihe jikọtara ha na Hamas - mana ha enyebeghị ihe akaebe ọ bụla.

    O kwetara na ndịọrụ ahụike ahụ enweghị ngwa ọgụ mgbe ndịagha Izrel melitere ịgba ha mgbọ.

  15. Mba Amerịka amalitela ịnakọta tarifu 10% na mbubata niile na Satọde

    Mgbe Onyeisiala Trump wepụtara tarifu ọhụrụ na mbubata Amerịka

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mgbe Onyeisiala Trump wepụtara tarifu ọhụrụ na mbubata Amerịka

    Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump agbaala ndị Amerịka ume, sị ha 'kwụsie ike' dịka mba ahụ malitere ịnakọta tarifụ “baseline” 10% na mbubata niile na Satọde 5 Eprel 2025.

    Onyeisiala Trump gbara ndị Amerịka ume dịka ụtụisi 10 tarifu ahụ butere ọgbaaghara n’ọnụahịa.

    Mba UK na Fransị so n’ọtụtụ narị mba ndị ọzọ tarifu ọhụrụ Onyeisiala Trump tinyere metụtara mana ndị ndu ha kwuru na ha ka ga-enwe mkparịtaụka.

    N’aka nke ọzọ, mba Chaịna bụ mba ụtụisi ọhụrụ ahụ metụtara nke ukwuu, e tinyela tarifu mmegwara na ngwaahịa si Amerịka.

    N’ihi nke a, ndekọ ngwaahịa stọọkụ atọ niile dị n’Amerịka jiri ihe karịa 5% daa na Fraịde, yana S&P 500 gbadatara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 6%, nke gosiri izu kachasị njọ na stọọkụ Amerịka kemgbe 2020.

    Puku kwuru puku mmadụ gbakọtara na Washington DC, New York na obodo ndị ọzọ iji mee ngagharịiwe megide ọtụtụ atụmatụ iwu Onyeisiala Trump - site na akụ na ụba ruo na mbelata mmefu ego gọọmentị.

    N’ime ihe niile ndị a, Onyeisiala Trump kọwara mgbanwe ahịa dịka "mgbanwe akụ na ụba", nke Amerịka "ga-emeri".

    Ọ gwara ndị Amerịka n’akara Truth Social na ha "Kwụsie ike, ọ gaghị adị mfe, mana njedebe ga-abụ akụkọ ihe mere eme,".

    Cheta na atụmatụ iwu ọhụrụ Onyeisiala Trump wepụtara e tinyela ihe ịma jijiji n’azụmahịa mba ụwa niile.

    Otu onye a ma ama Elon Musk bụkwa ezigbo enyi Onyeisiala Trump kwuru na Amerịka na mba dị na Yurop kwesịrị iwepụ ụtụisi tarifu na ngwaahịa dị n’etiti ha.

    O kwuru na nke a nwereike ịmepụta "mpaghara azụmahịa n'efu n'etiti Yurop na Nọt Amerịka.

  16. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nụ oo

    Anya na-asị ụnụ nọọ n’ọgbakọ BBC News Igbo.

    Dịka ụnụ na-esonyere anyị taa bụ Sọnde 6 Eprel 2025, ekpere anyị bụ na ọ ga-adịrị onye ukwu mma ma dịrị onye nta mma.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie ga na-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme n'ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile.

    Mana Michael Ngene ga-emechaa sonyere anyị n'oge ehihe.

    Udo dịrị ụnụ!

  17. Ndị uweojii anapụtala ndị Chaịna anọ n’Abịa steeti

    Ndị uweojii anapụtala ndị Chaịna anọ n’Abịa steeti

    Ebe foto si, Abia State Police Command

    Ụlọọrụ ndị uweojii Abịa steeti nke onyendu ha bụ DPO ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Uturu na njikọaka ndịagha na ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ anapụtala ụmụafọ Chaịna anọ na ndị uweojii abụọ na-edugharị ha.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abịa steeti bụ Maureen Chinaka mere ka anyị mata nke a n’ozi o bipụtara n’ụbọchị Satọde 5 Eprel 2025.

    Akụkụ ozi ahụ sịrị “nke a sochiri mkpesa anyị natara n’ụbọchị Fraịde 4 Eprel 2025 mgbe o jiiri ihe dịka ọkara gaa elekere ise nke mgbede na ndị ojiegbe a maghị ndị ha bụ wakporo ndị Chaịna na-arụ ọrụ n’ala anyị na ndị uweojii na-edugharị ha oge ha na-aga n’ụlọọrụ ha dị n’Agukwu-Amaya, Ndundu Uturu dị n’okpuru ọchịchị Isuikwuato”.

    Ozi ahụ kwuru na ndị Chaịna abụọ bụ Quan na Cai tinyere onye uweojii bụ Audu Saidu nwụrụ oge ahụ e mere ha mwakpo dịka ha bụ ndị ekperima buuru egbe onye uweojii ahụ rie mbọmbọ.

    “Oge anyị natara ozi ahụ, ndị uweojii Abịa steeti na njikọaka ndịagha na ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ malitere ịchọgharị ndị ekperima ahụ”.

    “E mechara napụta ndị Chaịna atọ na ndụ dịka otu n’ime ha nwetara mmerụahụ. Onye uweojii nke anyị napụtara bụ Uba Ahmed nwetara mmerụahụ site n’egbe a gbara ya n’ụkwụ mana ha abụọ na-anara ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ FMC dị n’Abakaliki ugbua,” ka ozi ahụ kwuru.

    Ozi ahụ gara n’ihu kọwaa na dịka ndị uweojii garuru mpaghara ahụ n’ụbọchị taa bụ Satọde 5 Eprel 2025, ha napụtara onye uweojii ọzọ bụ Ijeagwa Friday na ndụ.

  18. Ndị nchekwa ekposaala ogige ndị ekperima dị n’Anambra steeti

    Ndị nchekwa ekposaala ogige ndị ekperima dị n’Anambra steeti

    Ebe foto si, Anambra State Police Command

    Otu ndị ọrụ nchekwa nke ndị uweojii nọ n’isi ya, bụ nke gụnyere ndịagha, ndịagha mmiri, ndị DSS na ndị nche Anambra steeti agaala kposaa ogige ndị ekperima dị n’Ogbunka.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga mere ka anyị mata nke a n’ozi ọ wepụtara n’ụbọchị Satọde 5 Eprel 2025.

    Ikenga kwuru na ha kpara ya bụ ike di egwu dabere n’ozi bara ezigbo uru ha nọ kemgbe na-enweta.

    Ọ kọwara na e nwere nkwarịta mgbọ n’etiti ndị nchekwa na ndị ekperima ahụ ihe ruru elekere isii mana ndị nchekwa gosiri ha ike ka ike ma kụnyụọ ogbunigwe niile ha jiri chekwaa onwe ha.

    Dịka ya bụ ozi siri kwuo, ụfọdụ ndị ekperima ahụ buuru ogogo apa mgbọ dị iche iche rie mbọmbọ dịka ndị uweojii kpachiri mpaghara ahụ iji zute nsogbu ndị nwereike ịdapụta ma hụkwa na ha nwụchiri ndị ekperima gbara ọsọ.

    Ka o sinadị, ndị nchekwa weghachitere ngwongwo dị iche iche dịka ite nri, ihe ndị e ji esi nri nakwa ụfọdụ akụkụ ụgbọala a na-enyo enyo ndị ekperima ahụ zuru n’ohi.

  19. Anyị enyebeghị nkwado ka a họpụta onye ga-arụgodu ọrụ ka Nnukwu Ọkaikpe Imo steeti – NJC

    Anyị enyebeghị nkwado maka nhọpụta onye ga-arụgodu ọrụ ka Nnukwu Ọkaikpe Imo steeti – NJC

    Ebe foto si, @njcNig, Hope Uzodimma/X

    Otu na-elekọta ndị Ọkaikpe Naịjirịa bụ National Judicial Council (NJC) ekwuola na ha akwadoghị nhọpụta Ọkaikpe Theophilus Nnamdi Nzeukwu dịka onye ga na-arụgodu ọrụ ka Nnukwu Ọkaikpe Imo steeti.

    Otu NJC kwupụtara nke a n’ụbọchị Fraịde 4 Eprel 2025 n’ozi onyeisi ngalaba mgbasaozi ha bụ Kemi Babalola Ogedengbe binyere aka na ya.

    Ha kwuru na ya bụ ọnọdụ na-abịa dịka ha nụrụ akụkọ kwuru na aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma họpụtara Nzeukwu, bụ onye nọ n’ahịrị nke anọ n’ogogo ndị Ọkaikpe dịka Nnukwu Ọkaikpe Imo steeti.

    Ozi ahụ kwuru na Gọvanọ Uzodimma degaara ha akwụkwọ iji rịọ ka ha nye ya nkwado ịhọpụta Nzeukwu dịka onye ga na-arụgodu ọrụ ka Nnukwu Ọkaikpe Imo steeti n’agbanyeghị ọnọdụ ya dịka onye nke anọ n’ahịrị ndị Ọkaikpe.

    Ha kwuru na Uzodimma depụtasịri ihe ndị mere ọ chọghị ịhọrọ otu n’ime ndị Ọkaikpe atọ ọkwa ha kachasị elu n'Imo steeti.

    “Anyị chọrọ ime ka ọhanaeze mara na ndị otu anyị enwebeghị mkpebi ọbụla gbasara ya bụ leta n’ihi na ọ bụ n’ọgbakọ anyị ga-adị n’ụbọchị 29 Eprel na 30 Eprel 2025 ka anyị kpebiri ilebara ya anya”.

    “N’ihi nke a, anyị chọrọ ịgwa ọhanaeze na ndị otu anyị enyebeghị nkwado ka Gọvanọ Uzodimma họpụta onye ga na-arụgodu ọrụ ka Nnukwu Ọkaikpe,” ka ozi ahụ kwuru.

    Ndị otu NJC gara n’ihu kwuo na aka ha adịghị na nhọpụta Ọkaikpe Theophilus Nnamdi Nzeukwu dịka onye ga na-arụgodu ọrụ ka Nnukwu Ọkaikpe Imo steeti.

  20. Ndị na-azụ ahịa n’Amerịka ejikerela maka mmetụta ụtụisi ọhụrụ Trump tinyere

    Ndị na-azụ ahịa n’Amerịka ejikerela maka mmetụta ụtụisi ọhụrụ Trump tinyere

    Ụfọdụ ndị na-azụ ahịa n’Amerịka achịrịla obi n’aka maka mmetụta ụtụisi ọhụrụ onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump tinyere.

    Ọnọdụ a na-abịa dịka Trump tinyere ụtụisi 10% n’elu ngwaahịa sitere n’ụfọdụ mba, nke gụnyere mba UK.

    Onyeisi otu National Black Farmers Association gwara BBC na ụtụisi ndị ahụ na-emetụta ngalaba ha “kpọmkwem”.

    Ụfọdụ ụlọọrụ a ma ama dịka Apple na Nike ebidola ịhụta mmetụta atụmatụ ọhụrụ ndị ahụ dịkwa ka azụmahịa mbaụwa na-agabiga ọnọdụ tara akpụ.

    Trump anọrọla ugboro ugboro na-agọchitere atụmatụ ya dịka o kwuru na itinye ụtụisi dị elu na ngwaahịa ndị e si mba ọzọ tụbata ga-eme ka akụnaụba mba Amerịka “sara ọkụ”.