Yukren, Amerịka bịnyere aka na nkwekọrịta akụ na ụba sitere n'okike maka ịkwụsị mwakpo Rọshịa

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Eprel 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Rọshịa na-aga n'ihu ịwakpo Yukren agbanyeghị nkwa 'nkwụsịtụ ọgụ Ista' Putin - Zelensky

    Onyeisiala Putin na Onyeisiala Zelensky

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Putin na Onyeisiala Zelensky

    Onyeisiala Yukren Volodymyr Zelensky boro Rọshịa ebubo igosi ụwa na ha nkwụsịtụrụ ọgụ Yukren ebe ndịagha ha na-aga n’ihu ibuso agha n'ebe ụfọdụ na Yukren.

    Onyeisiala Zenlesky kwuru n’ime awa isii mbụ nke nkwụsịtụ ọgụ n'Ista bụ iwu Onyeisiala Putin nyere, ndiagha Rọshịa atọọla ogbunigwe ruru narị atọ na iri asatọ na asaa (387) ebe ndịagha Yukren nọọ ma wakpoo ha ugburu iri na itoolu (19), ebe duronu jiri ugboro narị abụọ na iri itoolu (290).

    Ụlọ mgbasa ozi BBC enwebeghị ike ịchọpụta ma nke a ọ bụ eziokwu maọbụ okwu asị.

    Cheta na Onyeisiala Putin nyere ndịagha ya iwu ka ha "kwụsị ọrụ agha niile" na Yukren maka nkwụsịtụ nwa oge, nke agha Yukren.

    O kwuru nkwụsịtụ agha Yukren nke nwa oge nke awa iri atọ (30) ga-amalite n’awa nke isii na Rọshịa n’ụbọchị Satọde nwere ruu ime abalị ụbọchị Sọnde.

    Mba Yukren tụrụ aro maka ịgbatị nkwekọrịta ahụ ka o ruo ụbọchị iri atọ (30) ọzọ.

    Onyeisiala Zelensky gbakwụnyere na ndịagha Yukren na-azaghachi ha ebe niile dịka onye iro kwesịrị n'ọnọdụ ọgụ.

  2. Igbo bụ Igbo, ụnụ abọọla chi?

    Nnọọ nụ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde 20 Eprel, 2025.

    Anyị na-asị ụmụnne anyị ndị okpukpere chi Kraịst ‘Ista ọma’.

    Ka ụbọchị taa wete ọtụtụ ihe ọma na ndụ anyị.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie ga na-ewetere anyị akụkọ ihe na-eme n’ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka nakwa n’ụwa niile. Michael Ngene ga-emechaa sonyere anyị n’oge ehihe.

    Ya gazie.

  3. Ndị uweojii akọwaala ihe ha jiri nwụchie nwata ahụ guzooro n’ihu ahịrị ụgbọala Peter Obi

    Ndị uweojii akọwaala ihe ha jiri nwụchie nwata ahụ guzooro n’ihu ahịrị ụgbọala Peter Obi

    Ebe foto si, Peter Obi/Facebook

    Ụlọorụ ndị uweojii Legọs steeti ekwuola ihe mere ha jiri nwụchie nwata nwoke ahụ gbara afọ iri na asatọ (18) bụ Alabi Quadri, onye a malitere ịnụ aha ya n’oge ntuliaka afọ 2023 maka iguzo n’ihu ahịrị ụgbọala Peter Obi.

    N’ozi ọ wepụtara n’akara ọbaozi X ya n’ụbọchị Satọde 19 Eprel 2025, ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ndị uweojii Legọs steeti bụ Benjamin Hundeyin kwuru na a nwụchiri Quadri ma kpọchie ya maka ịlụ ọgụ.

    Hundeyin sịrị na a nwụchiri nwata ahụ ma kpụpụ ya n’ụlọikpe oge a chọpụtara na ọ lụrụ ọgụ ọjọọ na mpaghara Amukoko dị na Legọs steeti na mmalite afọ a.

    Nkọwa ndị uweojii na-abịa dịka Ụlọikpe Majie tọhapụrụ Quadri n’ụbọchị Tọzde 17 Eprel 2025 dabere na ndụmọdụ sitere n’aka onyeisi na-ahụ maka ekpemikpe na Legos steeti bụ nke kwuru na e nweghị ihe akaebe a chọtara iji kwado ebubo iji egbe ezu ohi e boro nwata ahụ.

    Ọkaiwu Quadri bụ Inibehe Effiong kwuru na a nwụchiri ma kpọchie nwata ahụ n’ihi ebubo ụgha ndị akpụobi abụọ a ma ama n’Amukoko boro ya.

    Effiong boro ebubo na ụmụnwoke abụọ ahụ tọọrọ Quadri n’akụkụ ụlọ ya, nyefee ya n’aka ndị uweojii ma boo ya ebubo na o sooro lụọ ọgụ.

    Ọkaiwu ahụ kpughere na ya agaala n’ihu na-anata ozi iyi ndụ egwu site n’aka ụmụnwoke ahụ kemgbe afọ 2023 n’ihi na ọ natara onyinye site n’aka ndị na-akwado Peter Obi.

    Ọ bụ eziokwu na e kwuburu na okwu ahụ bụ maka ịlụ ọgụ mana ndị uweojii kpụpụrụ Quadri n’ụlọikpe ma boo ya ebubo iji egbe ezu ohi n’ụbọchị 26 Jenụwarị 2025.

    Effiong kwuru na e tinyere Quadri na ndị okenye anọ ọ na-amaghị n’ụlọmkpọrọ ma kọwaa na nwata ahụ adịghị afọ iri na asatọ (18).

    Oge ọ na-enye nkọwa gbasara okwu ahụ, Hundeyin sịrị na ọnọdụ ahụ kpọtụrụ n’ụbọchị 22 Jenụwarị 2025 mgbe ndị ntorobịa lụsoro onwe ha ọgụ ma bute ọgbaaghara na obi iko n’elu n’obodo.

    Ọ gbakwunyere na ụfọdụ mmadụ merụrụ ahụ dịka e bibiri ngwongwo ọhanaeze na nke mmadụ nkịtị tinyekwara na e zuru mmadụ ndị na-agafe agafe ohi n’oge ahụ e nwere ọgbaaghara.

  4. Gọọmenti Naịjirịa emechiela ọdọụgbọelu Enugwu

    Gọọmenti Naịjirịa emechiela ọdọụgbọelu Enugwu

    Ebe foto si, Akanu Ibiam International Airport Enugu

    Ụlọọrụ na-elekọta ọdọụgbọelu ndị e nwere na Naịjirịa bụ Federal Airports Authority of Nigeria (FAAN) ekwupụtala gbasara mmechi ọdọụgbọelu Akanu Ibiam International Airport dị n’Enugwu.

    Nke a dị n’ozi onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhanaeze na nchekwa ndị ahịa n’ụlọọrụ FAAN bụ Obiageli Orah wepụtara n’ụbọchị Fraịde 18 Eprel 2025.

    Orah kwuru na mmechi ahụ na-agaghị egbu oge bụ iji nye ohere maka ọrụ nrụzigharị.

    Ozi ahụ kọwara na e nwere ntipu na mpaghara dị oke mkpa n’okporo ụgbọelu nke ọdọụgbọelu ahụ.

    Ha kọwara na ọrụ gbatagbata ga-adị na mpaghara okporo ụgbọelu ahụ malite n’ụbọchị 22 Eprel ruo n’ụbọchị 6 Mee 2025.

    Ụlọọrụ FAAN rịọrọ ọhanaeze mgbaghara maka iwepụta ozi gbasara mmechi ọdọụgbọelu ahụ n’azụ oge nakwa n’oge a tụghị anya ya.

    Gọọmenti Naịjirịa emechiela ọdọụgbọelu Enugwu

    Ebe foto si, FAAN/X

  5. Mmadụ ndị nwụrụ na mwakpo e mere na Benue steeti eruola 20 – Gọvanọ Alia

    Mmadụ ndị nwụrụ na mwakpo e mere na Benue steeti eruola 20 – Gọvanọ Alia

    Ebe foto si, Hyacinth Alia/X

    Ọnụọgụ mmadụ ndị nwụrụ oge ndị ọchịehi mere mwakpo n’okpuru ọchịchị Ukum na Logo dị na Benue steeti eruola iri abụọ (20) dịka ndị nchekwa na ndị nwe obodo na-agagharị n’ime obodo ndị ọ meụtara iji chọta ndị dị ndụ.

    Aka na-achị Benue steeti bụ Gọvanọ Hyacinth Alia kpughere nke a oge ya na ndị ntaakụkọ ụlọmgbasaozi Channels Television nwere mkparịtaụka.

    Alia kọwara na e buuru ụzọ chọta ozu mmadụ ise na Gbagir ma bugaa ha n’ọbaozu mana ka e mesịrị, ndị na-achọ ikwu na ibe ha chọtara ozu mmadụ abụọ ndị ọzọ.

    O kwuru na ndị nchekwa enyela otu ezinaụlọ gbara isi akwara ili nwanne ha ozugbo n’obodo Gbagir ikikere ime nke ahụ.

    Dịka Gọvanọ Alia siri kwuo, ndị uweojii butekwara ozu mmadụ iri abụọ (12) na Logo ma bugaa ha n’ọbaozu, bụ nke mere ka ọnụọgụ mmadụ niile e gburu na mwakpo ahụ a sị ndị ọchịehi mere bụrụzie iri abụọ (20)

    Gọọmenti Benue steeti kwughachiri na ha dị nkwadode ichekwa ndụ na ngwongwo ụmụafọ steeti ahụ ma gwa ndị niile nwere ozi bara uru ka ha gaa kọọrọ ndị nchekwa iji nwee ike gboo nsogbu enweghị nchekwa dị na steeti ahụ.

  6. Ụlọikpe Kachasị n’Amerịka akwụsịla ọchụchụ ụmụafọ Venezuela a tụrụ nga

    Ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ

    Ụlọikpe kachasị n’Amerịka enyela gọọmenti Onyeisiala Donald Trump iwu ka a akwụsị ọchụchụ ndị mba Venezuela a kpọchiri maka ebubo iso n’otu.

    Akụkọ kwuru na a kpọchiri ọtụtụ ụmụnwoke ndị ahụ na mpaghara ugwu Texas.

    Cheta na Onyeisiala Trump eboola ọtụtụ ndị Venezuela ebubo iso n’otu dị iche iche ma tinye ha n’ụlọ mkpọrọ dị n’El Salvador. O mere nke site n’ikike iwu 1798 Alien Enemies Act nke nyere onyeisiala ikike ịnwụchi , kpọchie ma chụọla ndị mba ọzọ a na-ahụta dịka ndị iro.

    Iwu a bụ naanị ugboro atọ ka ọ pụtara ihe n’oge agha.

  7. Ụtụtụ ọma ndị be anyị.

    Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde ahịa Eke 19 Eprel, 2025.

    Anyị na-asị ka ụbọchị taa nwetara gị na ezinaụlọ gị naanị ihe ọma.

    Ndewo.

  8. PDP adịghị njikere maka ntuliaka 2027 - Wike

    PDP adịghị njikere maka ntuliaka 2027 - Wike

    Ebe foto si, Nyesom Wike/X

    Minista na-ahụ maka isi obodo Naịjirịa bụ Nyesom Wike ekwuola na otu ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama na-agba gọọmenti ụkwụ bụ Peoples Democratic Party (PDP) enweghị atụmatụ rijuru afọ nke ha ga-eji merie pati All Progressives Congress (APC) na ntuliaka afọ 2027.

    Wike kwuru nke a oge ya na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka n’Abuja n’ụbọchị Fraịde 18 Eprel 2025.

    Onye ahụ bụbu gọvanọ Riva steeti kwuru na dabere n’ọnọdụ PDP nọ ugbua, a gaghị asị na ha dị njikere maka ntuliaka afọ 2027 n’ihi nsogbu ndị ndu ha na-enwe.

    Ọ sịrị “PDP adịghị njikere maka ntuliaka afọ 2027, nke ahụ doro anya. Etu ihe si kwụrụ ugbua, ọgbaaghara dị n’etiti ndị ndu ha.”

    Na nso nso a, ụfọdụ pati ndị na-agba gọọmenti ụkwụ gụnyere PDP nọ na-agba mbọ ijikọta onwe ha ọnụ iji maa APC aka n’afọ 2027.

    Ka o sinadị, njem ahụ agaala n’ihu na-ahụta ihe mkpọbiụkwụ dị iche iche n’ihi mmasị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ụfọdụ.

  9. Sịnetọ Natasha akpọọla oku ka e weghachi ndị nchekwa ya dịka e mechara mwakpo n’ụlọ ya

    Sịnetọ Natasha akpọọla oku ka e weghachi ndị nchekwa ya dịka e mechara mwakpo n’ụlọ ya

    Ebe foto si, Senator Natasha Akpoti-Uduaghan

    Onye omeiwu na-anọchiteanya Kogi Central a kwụsịtụrụ ọrụ bụ Sịnetọ Natasha Akpoti-Uduaghan arịọla Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa ka o weghachi ndị nchekwa ha napụrụ ya oge ụlọ omeiwu sịnetị kwụsịtụrụ ya ọrụ.

    Ọ kpọrọ oku ahụ oge ndị ekperima wakpochara ụlọ nnanna ya dị na Kogi steeti n’ụbọchị Tuzde 15 Eprel 2025.

    Ụfọdụ akwụkwọ akụkọ Naịjirịa rụtụrụ aka n’ozi ụlọọrụ onye omeiwu ahụ wepụtara ma kwuo na mwakpo ahụ bụ nke e mere oge nwanne ya nwoke nke obere gara ịhụ ka atụmatụ ọrụ Natasha ji n’aka n’obodo ya bụ Obeiba-Ihima si aga.

    Sịnetọ Natasha kwuru na ọ bụ ya ka e lekwasara anya mee mwakpo ahụ maka na ndị ekperima ahụ chere na ya nọ n’ụlọ.

    Ndị ahụ mere ya bụ mwakpo mebiri ụfọdụ akụkụ ụlọ nke nwaanyị omeiwu ahụ kwuru na ọ bụ nke nnanna ya.

    Ọ bụ n’ọnwa Maachị ka ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa kwụsịtụrụ Natasha Akpoti-Uduaghan ọrụ ruo ọnwa isii ma napụkwa ya ndị nchekwa ya na ụgwọọnwa ya n’ihi ebubo akparamaagwa na-ezighị ezi.

  10. Ogbunigwe Izrel tụrụ na Khan Yunis egbuola ndị Palestine 10

    Ogbunigwe Izrel tụrụ na Khan Yunis egbuola ndị Palestine 10

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị ọrụ enyemaka nọ na Gaza ekwuola na ogbunigwe Izrel tụrụ n’ụtụtụ Fraịde gburu opekatampe ụmụafọ Palestine iri (10) n’obodo a ma ama bụ Khan Yunis.

    N’ozi onyeisi ụlọọrụ nchekwa Gaza bụ Mahmoud Bassal wepụtara n’ọbaozi Telegram, o kwuru na ụfọdụ mmadụ nwetara mmerụahụ n’oge mwakpo ahụ.

    Ka o sinadị, ndịagha Izrel ekwubeghị okwu ọbụla gbasara ya bụ mwakpo.

    Ụlọọrụ ahụ kwuru na e gburu opekatampe mmadụ iri anọ (40) oge e mere mwakpo n’abalị Tọzde 17 Eprel 2025, nke ọtụtụ n’ime ha bụ ndị bi n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ.

  11. Amerịka ekwuola na ha ga-akwụsị mbọ ha na-agba iweta udo n'etiti Yukren na Roshịa n'oge adịghị anya

    Marco Rubio kwuru na ha agaghị aga n'ihu na-agba mbọ inweta udo n'etiti mba abụọ ahụ ma ọ bụrụ na ha adịghị njikere ịnabata udo.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Marco Rubio kwuru na ha agaghị aga n'ihu na-agba mbọ inweta udo n'etiti mba abụọ ahụ ma ọ bụrụ na ha adịghị njikere ịnabata udo.

    Odeakwụkwọ gọọmenti Amerịka bụ Marco Rubio ekwuola na mba Amerịka ga-ewezuga onwe ya n'atụmatụ mbọ ha na-agba iweta udo n'etiti mba Yukren na Roshịa ma ọ bụrụ na enweghị ihe gosiri na atụmatụ a ga-amịta mkpụrụ n'ime abalị ole na ole na-abịa.

    Marco Rubio kwuru na ha agaghị aga n'ihu na-agba mbọ inweta udo n'etiti mba abụọ ahụ ma ọ bụrụ na ha adịghị njikere ịnabata udo.

    Rubio kwuru nke a n'ọgbakọ ya na ndị isi mba Yurop mere ụbọchị Fraịde 18 April, 2025, mere ka o doo anya na mba Amerịka nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị mkpa ha nwere ilebanye anya na ya.

    Ọ gwara ha na n'ime abalị ole na ole na-abịa, Amerịka ga-ekpebi ka ha a ga-akwụsị ịgba mbọ iweta udo n'ọgụ ahụ taraala ọtụtụ isi mmadụ ma metụta ezinaụlọ dị iche iche.

    Cheta na Roshịa malitere ịwakpo mba Yukren n'afọ 2022 ma tinye iwu dị iche iche banyere nkwekọrịta udo.

    N'agbanyeghị na ọchịchị Onyeisiala Trump agbaala mbọ ịkwụsị agha a, mbọ ya niile amụtaghị mkpụrụ ọbụla.

  12. Tinubu si Yurop elebara ọchịchị Naịjirịa anya – Obi ọchịchị Naịjirịa

    Tinubu si Yurop elebara ọchịchị Naịjirịa anya – Obi ọchịchị Naịjirịa

    Ebe foto si, Bayo Onanuga/X

    Obi ọchịchị Naịjirịa ekwuola na onyeisiala Bola Tinubu na-elebara ọchịchị mba ahụ anya n’agbanyeghị na ọ nọ mba Yurop.

    Ọnụ na-ekwuru onyeisiala Naịjirịa bụ Bayo Onanuga kwuputara nke a n’ozi ọ wepụtara n’ụbọchị Tọzde 17 Eprel 2025.

    Onanuga kọwara na ọ bụ nwa mgbe nta ka agaghị ahụ onyeisiala anya na Naịjirịa n’ihi na njem ọ gara ga-akụrụ ọnụ n’ime izuụka abụọ.

    O kwuru na Tinubu hapụrụ Paris gawa Lọndọn na ngwụcha izuụka dịka ya na ndị oso ya achị gara n’ihu na-enwe mkparịtaụka kwa mgbe kwa mgbe iji lebara okwu ndị gbara ọkpụrụkpụ anya.

    Onanuga kọwara na onyeisiala Tinubu enyela ndị isi ụlọọrụ nchekwa Naịjirịa ntụziaka ka ha leba anya n’ọnọdụ ndị na-eyi egwu n'akụkụ mba ahụ dị iche iche.

    O mere ka o doo anya na ọ bụ mgbe mmemme ncheta mbilite n’ọnwụ Kraịst gafechara ka Tinubu ga-alọghachi Abuja ma maliteghachi ọrụ n’obi ọchịchị Aso Rock.

    O kelere ọhanaeze maka igosi mmetụta ha ma kwee ndị Naịjirịa nkwa na ọchịchị na-aga n’ihu na-enweghị ihe mkpọbiụkwụ ọbụla.

  13. Tidjane Thiam ekwuola na ọ ga-azọ ọkwa onyeisiala mba Ivori Kost

    Thiam gbara afọ 62 ma bụrụ onye otu pati PDCI, bụ naanị ya na-apụta ịzọ ọkwa ahụ n'aha pati ndị ọzọ chọrọ inwere ọchịchị n'Ivọri Kost

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Thiam gbara afọ 62 ma bụrụ onye otu pati PDCI, bụ naanị ya na-apụta ịzọ ọkwa ahụ n'aha pati ndị ọzọ chọrọ inwere ọchịchị n'Ivọri Kost

    Tidjane Thiam onye bụbu onyeisi ụlọakụ Credit Suisse ekwuola na ọ ga-azọ ọkwa onyeisiala Ivori Kosy na ntuliaka a ga-eme na mba ahụ n'ọnwa Ọktoba 2025.

    Thiam gbara afọ 62 ma bụrụ onye otu pati PDCI, bụ naanị ya na-apụta ịzọ ọkwa ahụ n'aha pati ndị ọzọ chọrọ inwere ọchịchị n'Ivọri Kost.

    Akụkọ kwuru na Thiam ebiela na mba ofesi ihe karịrị afọ iri abụọ ma nweta akwụkwụ njirimara paspọt mba Frans.

    Mana ka ọ dị ugbua, Thiam agbaala akwụkọw njirimara ahụ arụkwaghịm iji nweike ịzọ ọkwa onyeisiala mba Ivori Kost.

    Thiam, onye jibu ọkwa Minista, arụọla ọrụ dịka onyeisi ụlọọrụ dị iche iche nke gụnyere Aviva, Prudential and Credit Suisse, mana akụkọ kwuru na ọ gbara arụkwaghịm n'ọrụ ahụ oge e nwere ọtụtụ ndị malitere ịgba ya mgba okpuru.

    Otu pati họpụtara ka o jiri aha ha zọọ ọkwa onyeisiala n'ihi na ọ bụ naanị nwere ngabasị ha chọrọ n'ime onye ga-azọrọ ọkwa ahụ.

    Ka ọ dị ugbua, pati RHDP bụ pati ji ọkwa ọchịchị ahọpụtabeghị onye ga azọrọ ha ọkwa na ntuliaka ahụ mana akụkọ na-ekwu na onyeisiala Alsaane Ouattara nwereike ịzọ ọkwa onyeisiala ọzọ.

  14. Yukren ekwupụtala nkwekọrịta ha na mba Amerịka nwere banyere ihe ọnatarachi

    Mịnịsta mba Yukren na-ahụ maka akụnaụba bú Yulia Svyrydenko

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mịnịsta mba Yukren na-ahụ maka akụnaụba bú Yulia Svyrydenko

    Gọọmenti Yukren ekwupụtala nkwekọrịta ha na mba Amerịka nwere banyere ihe ọnatarachị.

    Mịnịsta mba Yukren na-ahụ maka akụnaụba bú Yulia Svyrydenko, kwuru na nkwekọrịta ga-enyere aka wulite mmekọ mba Ykren na Amerịka n’ihe gbasara akụnaụba ma nyere aka rụgharịa mmebi niile mere na Yukren kemgbe ọgụ dị n’etiti ha na mba Rọshịa malitere.

    Obi ọchịchị Amerịka na-atụ anya na ha ga-ekpebi ma chịkọta ihe niile banyere nwkekọrịta n’ime izuụka a.

  15. Ndị uweojii a hụrụ ka ha na-anara ndị Chaịna ego ga-anata ntaramaahụhụ - Ụlọọrụ ndị uweojii

    Ndị uweojii a hụrụ ka ha na-anara ndị Chaịna ego ga-anata ntaramaahụhụ - Ụlọọrụ ndị uweojii

    Ebe foto si, Screenshot

    Ụlọọrụ ndị uweojii Naịjirịa ekwuola na ha ga-enye ndị uweojii a hụrụ ebe ha na-anara ụmụafọ Chaịna ego ntaramaahụhụ.

    Ndị uweojii kwupụtara nke a n’ụbọchị Tọzde 17 Eprel 2025 n’ozi ha bipụtara n’akara ọbaozi Facebook ha.

    N’otu ihe onyonyoo fesara ebe niile, a hụrụ ụfọdụ ụmụafọ Chaịna ka ha na-enye ndị uweojii Naịjirịa kwụ n’ahịrị akwụkwọ ego naịra ruru puku ise kwa otu onye.

    Dịka ya bụ ọnọdụ gbawara ya obi, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa bụ Olumuyiwa Adejobi katọrọ akparamaagwa ndị uweojii ahụ ma kọwaa ya dịka omume ndị na-aṅụjughị mmiri ara afọ.

    Ọ gara n’ihu kwusie ya ike na ndị uweojii Naịjirịa ga-aga n’ihu na-arụ ọrụ ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị iji nweta ntụkwasịobi ọhanaeze.

  16. Mba Amerịka na Sọmalịa esila n’elu tụọ ndị al-Shabab ogbunigwe

    Mba Amerịka na Sọmalịa e sila n’elu tụọ ndị al-Shabab ogbunigwe

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba Amerịka na Sọmalịa esila n’elu tụọ ogbunigwe megide ndịagha nnupuisi oge ha na-ebu agha maka ndị ga-eweghara otu obodo gbara ọkpụrụkpụ.

    Dịka gọọmenti siri kwuo, ogbunigwe ahụ a kpachapụrụ anya tụọ na mpaghara Adan Yabaal dị na mgbagougwu isi obodo Sọmalịa bụ Mogadishu bịara n’ime awa ole na ole ndị al-Shabab wakporo obodo ahụ.

    Ministri na-ahụ maka mgbasaozi kwuputara n’akara ọbaozi X ha na n’ime ndịagha iri na abụọ (12) e gburu n’oge ahụ e si n’elu tụọ ogbunigwe gụnyere ụfọdụ ndịagha ọkwa ha dị elu sitere n’otu ha na al-Qaeda nwere njikọ.

    Agha nke ọhụrụ a dara n’oge a na-atụ ụjọ na ndịagha jihad nwereike ibilite ọzọ na Sọmalịa dịka mwakpo ndịagha nnupuisi riri elu tinyere nke e mere ahịrị ụgbọala onyeisiala Hassan Sheikh Mohamud n’ọnwa gara aga.

    Al-Shabab na-elekọta ọtụtụ mpaghara ndịda na etiti Sọmalịa nọ kemgbe na-alụso gọọmenti agha n’ihe ruru afọ iri abụọ (20).

    Ha na-achọ ikwatu ọchịchị gọọmenti etiti mba ahụ ma hibe mba ndị alakụba.

  17. Ndị sayentis ahụla ihe gosiri na ndụ dị na planetị ọhụrụ

    Ihe eserese na-egosi K2-18b

    Ebe foto si, Cambridge University

    Nkọwa foto, Ihe eserese na-egosi K2-18b ụwa ’ọzọ dí ebe dí anya

    Ndị sayentis achọpụtala ihe akaebe ọhụrụ gosiri na a nwere uwa ọzọ n'aga kpakpando kgburugburu nke mmadụ newere ike ibi.

    Ndị nchocha si na mahadum Cambridge na-enyocha planetị ahụ a kpọrọ K2-18b bụ ebe a hụrụ ụdị 'molecules' nke dị n'ụwa a nke na-enye aka imepụta ihe dị ndụ.

    Nke a bụ nke abụọ a na-ahụ kemikal e ji ama ihe dị ndụ n'ụwa nke ahụ nke James Webb Space Telescope (JWST) nke Nasa chọpụtara.

    Mana ndị nchọpụta ahụ na ndị ọkachamara n'ihe gbasara kpakpand na-ekwu na o dị mkpa ime nchọpụta gaa n'ihu na ya bụ ihe.

    Onyeisi ndị nchọpụta ahụ bụ Ọkammụta Nikku Madhusudhan, Gwara onye ntakụkọ BBC bụ Pallab Ghosh na o nwere olileanya inweta ihe akaebe were any banyere nchọpụta ahụ n'oge na adịghị anya.

    "Nke a bụ ihe aka ebe kachasị gbaa ọkpụrụkpụ na-egosi na ihe ndị ndụ dị ebe ahụ. Ana m ekwu na anyị ga-enwe ike ikwu kpọmkwem n'ime otu afọ maọbụ abụọ.."

  18. US na Yurop ga-enwe mkparịtaụka maka ịnweta udo na mba Yukren

    Yukren

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Yukren

    Steve Witkoff bụ onye ọrụ pụrụiche nke Onyeisiala mba Amerịka nakwa onye nnọchịaanya mba ahụ bụ Marco Rubio ekwuola na Amerịka na Yurop ga-enwe mkparịtauka banyere mbọ ha na-agba ịnwete udo ma kwụsị agha dị na Yukren.

    Odeakwụkwọ mba UK bụ David Lammy ga-aga mkparịtaụka ahụ nke mbụ a na-enwe banyere agha dị na Yukren kemgbe Febuwarị afọ a.

    A na-atụanya na Witkoff na Rubio ga-ezute Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron na ndị otu ya.

    US na-ekwu na mkparịtaụka ahụ bụ maka ịkwụsị agha Rọshịa na-ebuso Yukren ma nye ohere ka Witkoff kọwaara ndị Yurop ihe pụtara na mkparịtaụka Ya na Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin were n’uzuụka garaaga.

  19. Yahaya Bello edegarala Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa akwụkwọ, chọọ ka a nwụchie Natasha

    Yahaya Bello edegarala Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa akwụkwọ, chọọ ka a nwụchie Natasha

    Ebe foto si, Yahaya Bello/X, Natasha Akpoti-Uduaghan/Instagram

    Aka chịburu Kogi steeti bụ Yahaya Bello edegarala Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa akwụkwọ ma chọọ ka a nwụchie onye omeiwu na-anọchiteanya Kogi Central bụ Natasha Akpoti-Uduaghan maka ebubo ikwutọ aha ya.

    N’akwụkwọ mkpesa Ọkaiwu ya bụ N.A. Abubakar degarala Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa n’ụbọchị Wenezde 16 Eprel 2025, Bello rịọrọ ndị uweojii ka ha kpọọ Natasha Akpoti-Uduaghan oku ka o were ihe akaebe gaa kọwaa ebubo ndị o boro ya.

    Ọ gwara ndị uweojii ka ha nwụchie ma kpee Akpoti-Uduaghan ikpe ọ bụrụ na o nweghị ike nye nkọwa rijuru afọ gbasara ebubo ahụ o boro ya.

    Yahaya Bello edegarala Natasha Akpoti-Uduaghan akwụkwọ site n’aka onye Ọkaiwu ya ma gwa ya ka ọ rịọ mgbaghara n’ihu ọhanaeze maka ebubo ikwutọ aha ya maọbụ ọ kpọpụ ya n’ụlọikpe.

    Bello kwuru na Akpoti-Uduaghan kwutọrọ aha ya na mmemme nnabata a haziri n’okpuru ọchịchị Okehi dị na Kogi steeti n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Eprel 2025.

    Dịka o siri kwuo, omume nwaanyị omeiwu ahụ megidere mpaghara 24(1)(b) nke iwu megidere ikwutọ aha mmadụ n’ịntaneetị bụ Cybercrimes (Prohibition, Prevention, Etc.) Act nke e mebere n’afọ 2015.

  20. Ụlọikpe Kachasị akwadoola nkọwa nwaanyị dabere n’etu e siri kee ya

    Ụlọikpe Kachasị akwadoola nkọwa nwaanyị dabere n’etu e siri kee ya

    Ebe foto si, EPA

    Ndị Ọkaikpe n’Ụlọikpe Kachasị nke mba United Kingdom ewerela otu olu kpebie na a ga-akọwa mmadụ dịka nwaanyị dabere n’ọdịdị e siri kee ya.

    Mkpebi a na-achịkọta okwu ahụ nọ n’ihu ụlọikpe kemgbe ọtụtụ oge, bụ nke nwereike imetụta ka e si enye mmadụ ikike dabere n’ọdịdị e siri kee ya na mba Scotland, England na Wales.

    Ụlọikpe ahụ kwadoro ọkpụkpọoku ndị otu ‘For Women Scotland’ bụ ndị tinyere akwụkwọ n’ụlọikpe megide gọọmenti Scotland.

    Ha siri arụmarụ kwuo na nchekwa a na-enye mmadụ dabere n’ọdịdị e siri kee ya kwesịrị ịbụ maka naanị ndị a mụrụ dịka nwaanyị.

    Ka o sinadị, Ọkaikpe Lord Hodge sịrị na e kwesịghị ịhụta mkpebi ahụ dịka mmeri nke otu mpaghara megide mpaghara nke ọzọ ma rụtụ na na iwu mba ahụ ka na-enye nchekwa maka mmadụ ndị a na-akpagbu n’ihi na ha gbanwere ọdịdị e siri kee ha.