Yukren, Amerịka bịnyere aka na nkwekọrịta akụ na ụba sitere n'okike maka ịkwụsị mwakpo Rọshịa

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Eprel 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Gọọmenti Naịjirịa adọọla steeti 30 aka na ntị maka nnukwu mmiri ozuzo na oke idemmiri

    Gọọmenti Naịjirịa adọọla steeti 30 aka na ntị maka nnukwu mmiri ozuzo na oke idemmiri

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọọmenti Naịjirịa ebuola amụma na a ga-enwe nnukwu mmiri ozuzo na oke idemmiri n’ime steeti iri atọ (30) tinyere isi obodo ha bụ Abuja.

    Minista na-ahụ maka akụ ndị si na mmiri na adịmọcha bụ Joseph Utsev kwupụtara nke a n’ụbọchị Tọzde 10 Eprel 2025 oge ọ na-ekwupụta ka e siri tụọ anya gbasara idemmiri n’afọ 2025 nke ụlọọrụ Nigeria Hydrological Services Agency (NIHSA) haziri n’Abuja.

    Dịka o siri kwuo, steeti ndị ọnọdụ ahụ ga-akachasị metụta gụnyere Abịa, Adamawa, Akwa Ibom, Anambra, Bauchi, Bayelsa, Benue, Borno, Cross-River, Delta, Ebonyi, Edo, Gombe, Imo, Jigawa, Kebbi, Kogi, Kwara, Lagos, Nasarawa, Niger, Ogun, Ondo, Osun, Oyo, Riva, Sokoto, Taraba, Yobe, Zamfara na isi obodo Naịjirịa bụ Abuja.

    Gọọmenti Naịjirịa adọọla steeti 30 aka na ntị maka nnukwu mmiri ozuzo na oke idemmiri

    Ebe foto si, Getty Images

    Ọ kọwara na steeti ndị bi n’akụkụ osimiri na mpaghara ndịda Naịjirịa ga-ahụta oke idemmiri n’ihi na osimiri ga-eto karịa ka ọ kwesịrị.

    Steeti ndị ahụ gụnyere Cross Riva, Delta, Riva, Akwa-Ibom na Edo steeti.

  2. A tọhapụla mmadụ 12 na-achọ nwereonwe Biafra eji kamgbe afọ 2021

    A nwuchiri ndị a kamgbe afọ 2021

    Ebe foto si, Bar. Ifeanyi Ejiofor/Facebook

    Mmadụ iri na abụọ na-achọ nwereonwe Biafra a nwuchiri n’Ebonyi Steeti kamgbe afọ 2021 enwerela onwe ha ugbua.

    Nke a dị n’ozi ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor na-ekwuchiteọnụ wepụtara n’akara soshal midia na Tọzde 10 Eprelụ, 2025.

    Ejiofor kwuru na ndị a so na mmadụ iri atọ na isii a nwuchiri kamgbe ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa Mee afọ 2021 na-agbanyeghi ọtụtụ iwu ụlọikpe nyerela ka a tọhapụ ha.

    Ejiofor kwuru na nke a na-abịa dịka direktọ na-ahụ maka ikpe mmadụ ikpe n’Ebonyi nabatara ikpe niile ụlọikpe kpebiri n’isi mmadụ iri na abụọ ma wezuga akwụkwọ ebubo ọhụrụ ọ gbara n’isi ha.

    Ọ gara n’ihu kwuo na nke a gosiri na aka ndị a dị ọcha n’ebubo niile e boro ha bụ nke ụlọikpe kwupụtarala ọtụtụ mgbe.

    Ọkaiwu Ejiofor kwuru na ọ gbara mbọ hụụ na ụlọmkpọrọ ebe e ji ndị a tọhapụrụ ha na nrubeisi n’iwu ụlọikpe nyere.

    O kwuru na ụlọọrụ ha dị njikere ịhụ na ndị nke ka fọrọ e ji eji ga-enwere onwe ha – bụ ndị ọ kwuru na ụlọikpe ruru anọ n’Ebonyi steeti nyerela iwu sị ka a tọhapụ ha.

  3. NERC eriela ụlọọrụ asatọ na-ekesa ọkụ latrik nha N628m

    NERC eriela ụlọọrụ asatọ na-ekesa ọkụ latrik nha N628

    Ebe foto si, NERC, Enugu Disco/X

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ụzọ e si eji ọkụ latrik eme ihe na Naịjirịa bụ Nigerian Electricity Regulatory Commission (NERC) eriela ụfọdụ ụlọọrụ na-ekesa ọkụ latrik nha nde naịra 628.03 maka erubeghị isi n'ogogo ụgwọ ọkụ latrik e mebere maka ndị enweghị igwe meter.

    Ọnọdụ ahụ metụtara ụlọọrụ ndị na-ekesa ọkụ latrik n'Abuja, Eko, Enugu, Ikeja, Jos, Kaduna, Kano na Yola.

    Ụlọọrụ NERC kwupụtara nke a site n'ozi ha wepụtara n'ụbọchị Tọzde 10 Eprel, 2025.

    Ha kọwara na ha zọpụrụ njem ahụ oge ha tulegharịchara etu e siri nakọọ ụgwọ ọkụ latrik n'agbata ọnwa Julaị na Septemba afọ 2024, nke kpughere na ụlọọrụ ndị ahụ e riri nha erubeghị isi n'ogogo e wepụtara.

    NERC sịrị na nha ahụ e riri ụlọọrụ ndị ahụ bụ pasenti ise n'ime akatamkpo ego ha nafere ndị mmadụ n'ime ọnwa ndị ahụ a na-elebara anya.

    Ha gara n'ihu gwa ụlọọrụ ndị ahụ ka ha rọpụtara ndị ahịa ha usoro iti aka n'obi n'ọnwa Mee afọ 2025.

  4. “Ọ bụ ebubo asị ka e ji tinye Alabi Quadri n’ụlọnga Kirikiri, Legọs” – Effiong

    Onye ọkaiwu, Inibehe Effiong

    Ebe foto si, Inibehe Effiong / X

    Nkọwa foto, Inibehe Effiong

    Onye ọkaiwu bụ Inibehe Effiong ekwuola na ọ bụ ebubo asị ka e jiri tinye nwata nwoke a maama dịka Alabi Quadri n’ụlọnga Kirikiri, n’Apapa, Legos.

    Alabi Quadri bụ nwatakịrị na-erubeghị afọ iri na asatọ wuruenwu maka foto e sere ya n’oge e mere ntuliaka Onyeisiala Naịjirịa n’afọ 2023.

    E setere Alabi na foto ebe ọ na-anabata Peter Obi bụ onye ji otu ndọrọndọrọ ọchịchị Lebọ Patị na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n’afọ ahụ bụ nke mere ka ọtụtụ ndị mmadụ nye ya ego.

    Ọkaiwu Inibehe Effiong kọwara na ọ bụ mgbe Alabi wuchere enwu nakwa ego ndị mmadu nyere ya mere ndị anya ụfụ jiri na-enye ya nsogbu ma na-amaja ya.

    N’okwu ya “Alabi Quadri erubeghị afọ iri na asatọ mana n’akwụkwọ ebubo ndị uweojii tinyere n’ụlọikpe ka ha siri na o ruola”.

    “Ihe anyị hụrụ gosiri na enweghị nyocha ndị uweojii mere tupuu ha eduga ya ụlọikpe”.

    “Nke a abụghị mgbe mbụ e ji ndị uweojii na-akpagbu nwatakịrị a. Ihe a niile bidoro n'afó 2023 mgbe a na-achụ nta vootu na ndọrọndọrọ Onyeisiala Naịjirịa”.

    “E were ndị na-ekwu na ọ bịabeghị nye ha ihe. Mgbe ha kpụrụ ya gaa n’ụlọ ndị uweojii ka ha kwuru na o so na-anụ ọgụ. Mana mgbe ezinaụlọ ya gara ịgbapụta ya ka ndị uweojii tinyere ebubo ịzu ohi n’isi ya”.

    “Ọ nọrọ ihe dịka abalị asaa n’ụlọ ndị uweojii tupuu e buga ụlọikpe majie tinyere ya n’ụlọnga”.

  5. Eze Charles, nwunye ya ezutela Pope Francis

    Eze Charles na nwunye ya bụ Ezenwaanyị Camilla gbara akwụwkọ afọ 20 gara aga gara zute Pope Francis

    Ebe foto si, Vatican Media

    Eze Charles na Ezenwanyí Camilla nke mba Briten na onyeisi ụka Katolik n'úwa bụ Pope Francis nwere nzukọ na Vatican ebe ọ nọ kelee ha maka ncheta afọ 20 ha mere agbamakwụkwọ..

    N'ozi nke obi eze Buckingham Palace wepụtara, Eze na Ezenwaanyị kwuru na obi ndị ha "ụtọ" na- Popu agbakele ịnabata ha ọbịa- ebe ha nwere ohere ịhụ ma kelee ya n'ihu na ihu ."

    Nzukọ ahụ mere n'abalị nke atọ na njem ọrụ ha gara na mba Italị dịka enwere ọgbakọ oriri na ọṅụṅụ na Romu ụbọchị Wednezde.

    Nke a na-abịa dịka ha kagbuburu atụmatụ izute Popu n'ihi ọrịa nke Popu daburu.

  6. Onyeisiala mba Chaịna bụ ‘otu onye na ndị kacha mara ihe n’ụwa niile’ – Trump

    Donald Trump na Xi Jinping

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Donald Trump na Xi Jinping

    N’agbenyeghị na mba Amerịka na mba Chaịna na-enwe nhọtafe maka atụmatụ ụtụisi a manyere n'ihe niile a na-ebubata na mba ha, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump etoola ogbo ya bụ Xi Jinping nke mba Chaịna.

    Donald Trump kọwara Xi Jinping dịka otu onye na ndị kacha mara ihe n’ụwa niile.

    Trump n’oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n’ụlọọrụ ya siri na “Xi Jinping bụ onye maara ihe. Mụ na ya nwereike ịnwe nkwekọrịta dị mma”

    Trump kwukwara na “Xi bụ otu onye na ndị kacha mara ihe n’ụwa niile”.

    “Ọ maara ihe o kwesiri ime ma hụkwa ndị obodo ya n’anya. Mụ na ya ga-akpa nkata n’ekwe ntị”.

  7. Ụmụ Igbo unu asaala chi?

    Anyị na-asị unu nọọ n’ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tozde 10 Eprel 2025.

    Ọ bụ Michael Ilediagu ga-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme n'ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile.

    Mana Ikechukwu Kalu na Chinonso Ugorji ga-esonyere ya n'oge ehihe.

    Ndewo!

  8. Ụlọọrụ NAFDAC amalitela ịgbape ụlọahịa ndị ha gbachiri n’Ogbo-Ogwu dị n’Onitsha

    Ụlọahịa ndị a gbachiri n'Ogbo-Ogwu dị n'Onitsha

    Ụlọọrụ na-ahụ nri na ọgwụ na Naịjirịa ejirila nwayọọ na-agba ụlọahịa ndị ha gbachiri n’Ogbo-Ogwu dị n’Onitsha nke Anambra Steeti.

    Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ ahụ gbachiri ụlọahịa ndị a n’ụbọchị iri nke ọnwa Febụwarị 2025 maka ebubo na ha na-ere ọgwụ adịgboroja nke megidere iwu Naịjirịa.

    Ụlọahịa ndị a gbachiri n'Ogbo-Ogwu dị n'Onitsha

    Osote onyeisi ụlọọrụ NAFDAC bụ Tunji Omoyemi bụ onye du ndị ọrụ ha na-agbape ụlọahịa ndị a.

    Ha kwuru na ọ bụ ndị mezurula ihe iwu na-achịkwa ire ọgwụ kwuru ka a na-agbapụ ụlọahịa ha maka ịmalite ire na ịzụ ahịa ha.

    Onyeisioche ndị ahịa ahụ bụ Ndubuisi Chukwulota gwara ndị ahịa ibe ya ka ha jisie ike mee ihe ụlọọrụ a chọrọ iji hụụ na a gbapere ụlọahịa mmadụ niile.

    Ụlọahịa ndị a gbachiri n'Ogbo-Ogwu
  9. Ndị Labour Party azọrọla njem gaa n’isi ụlọọrụ INEC, chọọ ka a nabata Usman dịka Onyeisioche

    Ndị Labour Party azọrọla njem gaa n’isi ụlọọrụ INEC, chọọ ka a nabata Usman dịka Onyeisioche

    Ebe foto si, Peter Obi/Labour Party

    Ndị ndu Labour Party azọrọla njem gaa n’isi ụlọọrụ INEC dị n’isi obodo Naịjirịa bụ Abuja.

    Ndị duuru ha gaa njem ahụ bụ onye jiri aha otu ahụ zọọ ọkwa onyeisiala n’afọ 2023 bụ Peter Obi na aka na-achị Abịa steeti bụ Alex Otti dịka nnukwu kọmịshọna INEC bụ Sam Olumekun nabatara ha.

    Ha gwara ụlọọrụ ahụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa ka ha nabata Nenadi Usman dịka onyeisioche Labour Party.

    Ọnọdụ a na-abịa n’ime mkpụrụ ụbọchị ole na ole Ụlọikpe Kachasị wezugara nchabi ikpe Ụlọikpe Mkpegharị nke nabatara Julius Abure dịka onyeisioche Labour Party.

  10. Ndị gọvanọ PDP etinyela akwụkwọ n’Ụlọikpe Kachasị maka ọrụ a kwụsịrị Fubara

    Ndị gọvanọ PDP etinyela akwụkwọ n’Ụlọikpe Kachasị maka ọrụ a kwụsịrị Fubara

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị gọvanọ iri na otu (11) si n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) e tinyela akwụkwọ n’Ụlọikpe Kachasị iji jụọ ase ma onyeisiala Bola Tinubu o nwere ikike ịkwụsị gọvanọ ọrụ.

    Akwụkwọ ahụ ha bụ ndị gọvanọ wepụrụ n’ụlọikpe na-ama aka megide ọnọdụ gbatagbata onyeisiala kwupụtara na Riva steeti.

    Ozi anyị nwetara na-ekwu na ọ bụ n’ụbọchị Tuzde 8 Maachị 2025 ka ndị gọvanọ wepụrụ okwu ahụ n’ụlọikpe.

    Ndị tinyere aka n’akwụkwọ ahụ bụ ndị gọvanọ Adamawa, Enugwu, Osun, Oyo, Bauchi, Akwa Ibom, Plateau, Delta, Taraba, Zamfara na Bayelsa steeti.

    Akwụkwọ ahụ ha tinyere site n’aka ndị Ọkaikpe Ukwu steeti ha bụ nke gbakwasara ụkwụ n’ọkpụrụkpụ ihe asatọ.

    Ha chọrọ ka ụlọikpe ahụ chọpụta ma onyeisiala o nwere ikike ịkwụsị gọvanọ a họpụtara n’usoro ọchịchị onyue kwuo uche ya ọrụ.

    Ndị gọvanọ ahụ chọkwara ka ụlọikpe kọwaa ma ụzọ na etu onyeisiala Tinubu siri kwupụta ọnọdụ gbatagbata na Riva steeti ọ dabara n’ụkpụrụ iwu nke e mere n’afọ 1999.

  11. Ihe karịrị mmadụ 113 anwụọla mgbe ụlọ oringo dakwasịrị ha na Dominican Republic

    Ezinaụlọ ndị nwanne ha tọrọ n'ime ụlọ ahụ

    Ebe foto si, Reuters

    Ọtụtụ ndị ọrụ gbata gbata nọ n’ọrụ kamgbe abalị na-achọ ndị ụvụrụ aja dakwasịrị mgbe otu ụlọ oringo dara n’isiobodo Santo Domingo nke mba Dominican Republic.

    Opekatampe ihe ruru mmadụ 113 anwụọla ebe ihe karịrị 150 merụrụ ahụ n’ọdachi a mere n’elekere isii nke ụtụtụ Tuzde n’ụlọ oringo ‘Jet Set Club’ dịka ndị ọrụ si kwuo.

    Ọtụtụ ndị mmadụ nọ n’ime ụlọ oringo ahụ na-enwe aṅụrị mgbe otu onye otiegwu a kpọrọ Rubby Perez na-eti egwu.

    Otiegwu Perez, onye na-akụ Baseball a kpọrọ Octavio Dotel nakwa otu onye gọvanọ na mpaghara ahụ so na ndị nwụrụ n’ọdachi a.

    Rubby Perez na-eti egwu na otu onye Gọvanọ so na ndị nwụrụ

    Ebe foto si, Shutterstock

    Otu ihe onyonyo BBC hụrụ gosiri ka Perez na-eti egwu n’ọgbọ ebe nwoke sere ihe onyonyo ahụ na-atụ aka na-ekwu na ihe si n’elu daa, n’otu ntabi anya ihe ndị mmadụ malitere iti mkpu dịka ihe onyonyo ahụ kwụsịrị.

    A matabeghi kpọmkwem mmadụ ole nọ n’ụlọ ahụ mgbe ihe a mere mana a na-ekwu na ha ruru mmadụ 500 maọbụ 1000.

    Ndị ọrụ gbata gbata akụwaala ụfọdụ akụkụ ụlọ ahụ iji nwee ohere chọpụta ndị ka tọọrọ n’ụlọ ahụ.

    Nwaanyị ji foto nwa ya nwaanyị ka tọrọ n'ụlọ ahụ

    Ebe foto si, Reuters

    Ọtụtụ ezinaụlọ ndị nwanne ha tọrọ n’ụlọ ahụ nọ n’ezi na-ekpe ekpere ka ha pụta na ndụ.

    Zulinka bụ ada Perez so nna ya na-etiegwu mgbe ụlọ ahụ dara kwuru na ọ bụ di ya zọrọ ya ndụ site n’iji ahụ ya echekwa ya ka ụlọ ahụ na-ada, mana ya na di ya mechara pụta na ndụ ebe nna Perez nwụrụ anwụ.

  12. A kpọlaala ụmụafọ Amerịka atọ a tụrụ mkpọrọ maka nkwatu ọchịchị kụrụ afọ n’ala na DR Kongo

    A kpọlaala ụmụafọ Amerịka atọ a tụrụ mkpọrọ maka nkwatu ọchịchị kụrụ afọ n’ala na DR Kongo

    Ebe foto si, A kpọlaala ụmụafọ Amerịka atọ a tụrụ mkpọrọ maka nkwatu ọchịchị kụrụ afọ n’ala na DR Kongo

    A kpọlaala ụmụafọ Amerịka atọ a mara ikpe maka isonye na nkwatu ọchịchị kụrụ afọ n’ala na mba DR Kongo ka ha gaa nọchapụ mkpọrọ ha na mba Amerịka.

    Ụlọikpe ndịagha mara mmadụ atọ ahụ ikpe ọnwụ tupu a tụgharịa ya ka ọ bụrụzie mkpọrọ ọka n’izuụka gara aga.

    Ọnụ na-ekwuru ngalaba ụlọọrụ na-ahụ maka ihe ndị na-eme n’Amerịka bụ Tammy Bruce kwuru na mmadụ atọ ahụ bụ ndị “e ji eji”.

    Mba Kongo kpọghachiri ụmụafọ Amerịka ahụ oge ha bụ mba abụọ tulechara nkwekọrịta iji leba anya n’akụrụngwa ndị gbara ọkpụrụkpụ jupụtara na Kongo.

  13. E gbuola mmadụ anọ n'ọgbaghara dị n’etiti obodo abụọ n’Ebonyi steeti

    Gọvanọ Francis Nwifuru

    Ebe foto si, Ebonyi State Government press office

    Nkọwa foto, Gọvanọ Francis Nwifuru

    Ihe ruru mmadụ anọ anwụọla ebe a gbara ọtụtụ ụlọ ọkụ maka ọgbaghara dị n’etiti obodo Ndukwe, Amasiri dị n’okpuru ọchịchị Afikpo na obodo Okporojo dị n’okpuru ọchịchị Osso Edda n’Ebonyi steeti, n’ihi ala.

    BBC chọpụtara na esemokwu ala ahụ dị n’etiti obodo abụọ bụ ihe gafere ọtụtụ afọ iri dịka gọọmentị gara aga gbara mbọ nwete akwụkwọ ọcha Kọmitii ewepụtara ka o mee nnyocha banyere esemokwu ala ahụ.

    Agbanyeghị nke a, esemokwu ahụ ka na-aga n’ihu dịka ọtụtụ nwụrụ ebe ka na-emebi ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ n’ihi e mezubeghị atụmatụ niile Kọmitii ahụ wepụtara.

    Otu onye achọghị ka akpọ aha ya gwara BBC na ọtụtụ mmadụ anwụọla ebe ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ mebiri n’obodo abụọ ahụ kemgbe ọgbaghara ahụ malitere ma ka na-aga n’ihu.

    Mana gọọmentị Ebonyi steeti kwupụtara na ala ahụ butere esemokwu nke obodo abụọ ahụ dị na mpaghara nchekwa.

    Onyeisioche nke okpuru ọchịchị Edda bụ Chima Ekumankama bụ onye kwuru na ihe ruru mmadụ anọ anwụrụ n’Okporojo Idima n’ihi esemokwu ahụ, kwuru na ezigala ndị ọrụ nchekwa ebe ahụ iji weta udo.

    O kwuru na ya agala ebe ahụ ajọ ihe ahụ mere iji gbaa ndị obodo ahụ ume ma kwe nkwa na gọọmentị ga-ewete esemokwu ahụ n’isi njedebe.

    O nyere aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Francis Nwifuru ozi ekele maka iziga ndị ọrụ nchekwa na mpaghara ahụ.

    N’aka nke ọzọ, onyeisioche okpuru ọchịchị Afikpo bụ Timothy Nwachi kwuru na gọọmentị ezigala ndị ọrụ nchekwa ebe ahụ.

    Ọ gwara ndị obodo Amasiri ka ha nọrọ jụụ ruo mgbe gọọmentị ga-eme mkpebi n'okwu a.

    Mgbe onye ntaakụkọ anyị kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Joshua Ukandu, o kwuru na a gwabeghị ihe ọbụla banyere ọgbaghara ahụ dị n’etiti obodo abụọ ahụ.

  14. Ndị NSCDC achọpụtala valvụ eji amị mmanụ ‘crude’ n'ụzọ iwu na-akwadoghị n’Abia steeti

    Ebe eji valvụ amịrị mmanụ ‘crude’ n'ụzọ iwu na-akwadoghị n’Abia steeti

    Ebe foto si, Nigeria Security and Civil Defence Corps/Facebook

    Nkọwa foto, Ebe eji valvụ amịrị mmanụ ‘crude’ n'ụzọ iwu na-akwadoghị n’Abia steeti

    Ndị ụlọọrụ Nigeria Security and Civil Defence Corps (NSCDC) achọpụtala valvụ eji amịrị mmanụ ‘crude’ n'ụzọ iwu na-akwadoghị site na nnukwu ụzọ paịpụ dị n'ọdọ mmiri Umuoelechi nke Abia steeti.

    Ebe eji valvụ amịrị mmanụ ‘crude’ n'ụzọ iwu na-akwadoghị n’Abia steeti

    Ebe foto si, Nigeria Security and Civil Defence Corps/Facebook

    Nkọwa foto, Ebe eji valvụ amịrị mmanụ ‘crude’ n'ụzọ iwu na-akwadoghị n’Abia steeti

    N’ozi ụlọọrụ nchekwa ahụ wepụtara na Facebook, kwuru na-achụpụtara nke a oge ndị ọrụ ha na-arụ ọrụ nnyocha na mpaghara ahụ.

    Ha kwuru na valvụ ahụ a kwụnyere n’ụzọ paịpụ mmanụ crude ahụ, na-enyere ndị na-ezu mmanụ crude aka ịmịrị mmanụ buru ibu na mmadụ achọpụtaghị.

    Ebe eji valvụ amịrị mmanụ ‘crude’ n'ụzọ iwu na-akwadoghị n’Abia steeti

    Ebe foto si, Nigeria Security and Civil Defence Corps/Facebook

    Nkọwa foto, Ebe eji valvụ amịrị mmanụ ‘crude’ n'ụzọ iwu na-akwadoghị n’Abia steeti

    Ha kwuru na ọ bụ Commandant General's Special Intelligence Squad mere nchọpụta a.

  15. Tarifu Onyeisiala Trump tinyere na mbubata niile n’Amerịka amalitela

    Tarifu Onyeisiala Trump tinyere na mbubata niile n’Amerịka amalitela

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Tarifu Onyeisiala Trump tinyere na mbubata niile n’Amerịka amalitela

    Tarifu ọhụrụ Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump tinyere na mbubata niile si mba iri isii (60) dị n’ụwa abata Amerịka amalitela.

    Nke a gụnyere ụtụisi 104% ọ manyere na ngwaahịa niile si mba Chaịna, bụ mba kachasị na mbupụ ngwaahịa n’ụwa niile.

    Cheta na tarifu Onyeisiala Trump gbakwunyere na mbubata si Chaịna malitere n’ihi na Chaịna ekweghị ewepụ tarifu mmegwara ha manyere na mbubata si mba Amerịka.

    Ọzọ, mbubata si Chaịna a ga-Amerịka were ihe ruru 2% n’akụnaụba mba Chaịna mana ha kwuru na ha nwereike ịnọ na-enweghị nke a, na o nweghị ihe ọ ga-eme ha.

    Chaịna gara n’ihu kwuo na ha dị njikere iso mba Amerịka kparịtaụka iji dozie tarifu Onyeisiala Trump gbakwụnyere na ngwaahịa si Chaịna.

    Onyeisiala Trump kwuru na tarifu ndị a bụ nnukwu ihe mana ọ ga-akwalite akụnụba mba Amerịka.

    N’aka nke ọzọ, ndị ọkachamara na-adọ aka na ntị na ha nwereike ibuli ọnụahịa maka ndị na-azụ ahịa n’Amerịka.

    Ahịa stọọkụ ka na-agbada n’ụwa niile dịka FTSE 100 nke London gbadara 2.5% mgbe o meghere, stọọkụ mba Yurop dara ebe stọọkụ isi ahịa dị n’Eshia gbatịkwuru ọdịda ha mgbe tarifu malitere.

  16. Ibas ewepụla ndị isioche gọọmenti okpuru ọchịchị 23 na Rịvas steeti, tinye ndị ọzọ

    Ibok-Ete Ekwe Ibas bụ Onye ọchịchị gbatagbata na Rịvas Steetị

    Ebe foto si, Bayo Ananuga / X na Rivers state Television /facebook

    Nkọwa foto, Ibok-Ete Ekwe Ibas

    Onye ọchịchị gbatagbata na Rịvas Steetị bụ Ibok-Ete Ekwe Ibas ewepụla ndị isi oche na-achị gọọmenti okpuru ọchịchị iri na atọ e were na Rịvas Steeti ma tinye ndị nke ya.

    Ibas mere ka a mata nke n'akwụkwọ ozi odeakwụkwọ steeti ahụ bụ ọkachamara Ibibia Lucky Worika zigara ndị nta akụkọ.

    Rivas steeti

    Ebe foto si, Rivers state television / facebook

    Nkọwa foto, Lee ndị ọhụrụ e tinyere n'ọkwa dịka ndị isioche gbatagbata na Rívas steeti

    N'ime akwụkwọ ozi ahụ ka e kwuru na ndị ọhụrụ ha nyere ọrụ isioche gọọmenti okpuru ọchịchị steeti ahụ ga-amalite ọrụ n'Epril 7, 2025.

  17. Saụt Sudan ga-anabata nwoke a chụpụrụ n'Amerịka iji kwụsị esemokwu visa

    Onyeisiala Saụt Sudan Salva Kiir

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Onyeisiala Saụt Sudan Salva Kiir

    Saụt Sudan kwuru na ọ ga-ekwe ka nwoke a chụpụrụ n’Amerịka bata na mba ha iji kwụsị esemokwu dị n’etiti mba abụọ ahụ maka ihe banyere visa.

    Cheta na odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Marco Rubio kwupụtara n’ụbọchị Satọde na Amerịka ga-akagbu visa ha nyere ndị niile si Saụt Sudan. O kwuru na nke a bụ maka etu Saụt Sudan siri jụ ịnabata ụmụamaala ha, a chụpụrụ n’Amerịka.

    Na mbụ, Mịnịstrị na-ahụ maka mba ofesi na Saụt Sudan kwuru na nke ahụ mere mgbe a kọwaara otu nwoke abụghị onye mba ha dịka onye Saụt Sudan.

    Mana ugbua, gọọmentị Saụt Sudan kwuru na ya ejikerela ịnabata nwoke ahụ na mba ha ma kwuo na ọ bụ n’ihi mmekọrịta dị n’etiti enyi na enyi.

    O kwuru na nwoke ahụ a chụpụrụ achụpụ e kwuru na ọ bụ nwaamaala DR Kongo, nwereike irute Juba n’ụtụtụ Wenezde.

    Mịnịstrị na-ahụ maka mba ofesị na Saụt Sudan kwuru na ha gwara ndị ọrụ gọọmentị niile na-arụ n’ọdụ ụgbọelu Juba International Airport, ka ha hụ na nwoke ahụ batara n’udo.

  18. Igbo bụ Igbo, ụnụ abọọla chi?

    Anyị na-asị ụnụ nọọ n’ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde 9 Eprel 2025.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga na-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme n'ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile.

    Mana Ikechukwu Kalu na Chinonso Ugorji ga-emechaa sonyere anyị n'oge ehihe.

    Dịka ụnụ na-esonyere anyị, ekpere anyị bụ na ọ ga-adịrị onye ọbụla ọma.

    Ndewo!

  19. Anyị ga-agbachị ụlọmgbasaozi niile dị na Riva steeti ọ bụrụ ma ndị uweojii arịọghị mgbaghara maka imetọ ndị ntaakụkọ - NUJ

    Anyị ga-agbachị ụlọmgbasaozi niile dị na Riva steeti ọ bụrụ ma ndị uweojii arịọghị mgbaghara maka imetọ ndị ntaakụkọ - NUJ

    Ebe foto si, NUJ/X, Imo Police Command

    Otu jikọtara ndị ntaakụkọ na Naịjirịa bụ Nigeria Union of Journalists (NUJ), ngalaba ha nke Riva steeti enyela ụlọọrụ ndị uweojii Riva steeti mkpụrụ ụbọchị iri na anọ (14) iji rịọ mgbaghara maka ndị ntaakụkọ ise ha metọrọ oge a na-eme ngagharịiwe n’ụzọ udo na Pọtakọt.

    Ndị otu ahụ yiri egwu na ha ga-akwụsị ọrụ gburugburu steeti ahụ ọ bụrụ na ndị uweojii ajụ ịrịọ mgbaghara n’ihu ọhanaeze n’ime izuụka abụọ.

    N’ozi onyeisioche otu ahụ bụ Paul Bazia na odeakwụkwọ ha bụ Ijeoma Tubosia jikọtara aka wepụta, ha katọrọ akparamaagwa ndị uweojii aka ha dị na mmetọ ndị ntaakụkọ ahụ ma kpọọ oku ka a chọpụta ha ma kpee ha ikpe.

    Dịka ha siri kwuo “NUJ dịka otu na-elekọta ihe na-eme n’obodo agaghị afanye aka n’ụkwụ na-ele ka a na-emetọ ndị ntaakụkọ.”

    Ndị otu ahụ kọwara ya bụ ọnọdụ dịka nke na-enweghị ihe kpatara ya nakwa nke jọgburu onwe ya ma kwuo na ọ bụ mmetọ ikike ndị ntaakụkọ ọnọdụ ahụ metụtara.

    Ndị ntaakụkọ ha sị ndị uweojii metọrọ gụnyere Charles Opurum nke ụlọmgbasaozi Channels TV, Allwell Ene nke ụlọmgbasaozi Naija FM, Soibelemari Oruwari nke ụlọmgbasaozi Nigeria Info FM, Ikezam Godswill nke ụlọmgbasaozi AIT, na Femi Ogunkhilede nke ụlọmgbasaozi Super FM.

    Ha kwuru na ndị uweojii gbara ndị ntaakụkọ ahụ anwụrụ anyammiri, tie Opurum ihe ma kpọchie ya n’ụlọnga.

    NUJ kwuru na ọ bụ ihe na-agbawa obi na ndị uweojii na-ahụ maka nchekwa ndụ na ngwongwo tụgharịrị bụrụ ndị na-emekpa ụmụmmadụ ahụ, ọkachasị ndị ntaakụkọ na-arụ ọrụ e dunyere ha n’okpuru iwu.

  20. A chọrọ ka anyị kwuo na aka CoS n'ọchịchị Fubara dị n’ọkụ gbara ụlọ ndị omeiwu na Rịva steeti

    Gọvanọ Rịvas steeti bụ Gọvanọ Siminalayi Fubara

    Ebe foto si, Rivers state goverment / facebook

    Nkọwa foto, Gọvanọ Rịvas steeti bụ Gọvanọ Siminalayi Fubara

    Mmadụ atọ n’ime mmadụ anọ a wụchiri na mbụ maka ọkụ gbara ụlọ ndị omeiwu na Rivers steeti ewepụtala ebubo ọhụrụ ọzọ.

    Ha kwuru na a na-amanye ha egwu ka ha gbanwee okwu ha kwuru na mbụ n’oge e jidere ha banyere ọkụ gbara ụlọ ndị omeiwu na steeti ahụ.

    Ha kwuru na a chọrọ ka ha kwuo ihe ga-eme ka a sị na Edison Ehie bụ onye isi ndị ọrụ nke a kpọrọ Chief of Staff (CoS) n’ọchịchị Gọvanọ Siminalayi Fubara maara ihe gbasara ọkụ gbara ụlọ ndị omeiwu na steeti ahụ.

    Mmadụ atọ ndị ahụ bụ Chime Ezebalike, Kenneth Kpasa, Oladele Lukman, na MacPherson Olumini.

    Cheta na ụlọikpe tọhapụrụ ha ka ha nọchara ihe ruru ọnwa isii n’ụlọ mkpọrọ Kuje.