Yukren, Amerịka bịnyere aka na nkwekọrịta akụ na ụba sitere n'okike maka ịkwụsị mwakpo Rọshịa

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Eprel 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. A hụla ụkọchukwu US a tọọrọ n’ụlọ ụka mgbe ọ na-agbasa ọzịọma na Saụt Afrịka

    Ụkọchukwu, Josh Sullivan

    Ebe foto si, Fellowship Baptist Church

    Nkọwa foto, Ụkọchukwu, Josh Sullivan

    A hụla ụkọchukwu Amerịka bụ Josh Sullivan a tọọrọ n’ụlọ ụka na Saụt Afrịka oge ọ na-agbasa ozi ọma n’izuụka garaaga.

    A hụrụ Josh Sullivan na mpaghara Gqeberha dị na Cape town ka ndị ọrụ nchekwa na ndị ntọ kwakọtachara mgbọ bụ nke butere ọnwụ mmadụ atọ.

    Ugbua enwebeghị ihe a maara banyere ndị ntọ ahụ, mana ụlọọrụ ndị uweojii na Saụt Afrịka a na-akpọ Hawks kwuru na “anyị nwetere ozi banyere ebe ndị ntọ ahụ kpọgara Josh Sullivan bụ nke mere anyị jiri gaa ebe ahụ. N’oge anyị ruru ebe ahụ ka ndị ntọ gbawara ọsọ ma na-agba ndị otu anyị egbe”.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Hawks bụ Avele Fumba kwuru na ọ bụ “mgbe ndị otu anyi ruru n’ụlọ ebe ha dobere Sullivan ka ndị omekeome ahụ jiri ụgbọala ha gbaa ọsọ ma na-agba ndị otu anyị egbe".

    Ọ gara n'ihu kọwaa na ọ bụ oge ha na-akwakọrịta mgbọ ka mmadụ atọ n’ime ndị ntọ ahụ nwụrụ.

  2. Chaịna adọọla aka na ntị banyere mmetụta tarifu Onyeisiala Trump agbanyeghị uto ha

    Chaịna adọọla aka na ntị banyere mmetụta tarifu Onyeisiala Trump

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Chaịna adọọla aka na ntị banyere mmetụta tarifu Onyeisiala Trump

    Chaịna adọọla aka na ntị banyere mmetụta tarifu Onyeisiala Donald Trump tinyere na mbubata si mba dị iche iche abata Amerịka, ga-enwe n’akụnaụba Chaịna agbanyeghị uto 5.4% mba ahụ nwere na nkeji mbụ nke afọ.

    Ọnụọgụgụ ahụ meriri atụmanya mmadụ mana ọnụọgụgụ a kpuchiri oge tupu mba Amerịka tinye ụtụisi ọhụrụ na ngwaahịa ndị Chaịna si na 10% gbagoro na 145%.

    Onye ntaakụkọ BBC kwuru na uto nwereike ịbụ maka etu ụlọ mepụta ihe di iche iche siri gbaa mbọ ibupụ ọtụtụ ihe tupu tarifu ọhụru ọchịchị Onyeisiala Trump amalite.

    Cheta na Chaịna etinyela ụtụisi mmegwara 125% na ngwaahịa ọbụla si Amerịka abata Chaịna.

    N’aka nke ọzọ, Onyeisiala Chaịna Xi Jinping nọ na Malaysia, dịka ọ na-eme njem nleta na mba dị na ndịda ọwụwa anyanwụ Eshịa iji kwalite mmekọ azụmahịa Chaịna na mba ndị ahụ.

    Ọzọ, Onyeisiala Trump kwupụtara ụbọchị iri itoolu (90) na tarifụ ọhụrụ ahụ dị elu na mba niile - ewezuga Chaịna.

    N’ozi ọhụrụ Onyeisi mgbasa ozi n'obi ọchịchị ‘White House’ Karoline Leavitt wepụtara, Onyeisiala Trump kwuru na ọ dị n'aka mba Chaịna ịbịakwute Amerịka ka ha abụọ mkparịtịụka banyere mmekọ azụmaahịa.

  3. Ndịagha RSF ekwupụtala mmalite ọchịchị ọzọ na Sudan

    Ndịagha RSF ekwupụtala mmalite ọchịchị mgba na Sudan

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndịagha RSF ekwupụtala mmalite ọchịchị mgba na Sudan

    Ndịagha nnupụisi kwuru na ha amalitela ọchịchị ga-agba gọọmentị ndịagha Sudan mgba, mgbe ọ gachara afọ abụọ amalitere agha nke kpalitere nsogbu enyemaka mmadụ kachasị n’ụwa niile.

    Onye ndu Rapid Support Forces (RSF), Mohamed Hamdan "Hemedti" Dagalo, kwuru na otu ahụ na-ewu naanị ọdịnihu dị mma maka Sudan."

    Nkwupụta a na-eme dịka mba UK haziri ọgbakọ iji cheta afọ abụọ a malitere agha, ebe odeakụkwọ na-ahụ maka ihe na-eme na mba ofesi nke UK kpọrọ oku maka ịchọta ụzọ udo.

    Agha ka na-aga n’ihu dịka ndịagha kwuru na a tụrụ ogbunigwe ebe ndịagha nnupụisi RSF nọ na mpụga obodo el-Fasher nke mere ka ọtụtụ puku mmadụ gbapụ n’ebe ndị gbara ọsọ agha bi na Zamzam.

    Hemedti kwuru na RSF na-ewu "ọnọdụ iwu" na ọ bụghị steeti nke ndị mmadụ na-achị n'otu n'otu.

    "Anyị anaghị achọ ọchịchị, kama ịdị n'otu. Anyị kwenyere na ọ dịghị agbụrụ, mpaghara, maọbụ okpukpere chi na-ejide ikike nke ndị Sudan, " nkwupụta ya na Telegram gụrụ.

    O kwuru na gọọmentị ya ga-agba mbọ ịhụ na ha wetere agụmaakwụkwọ na ahụike na mpaghara ndị RSF na-achị na mba Sudan niile.

    Ihe karịrị mmadụ narị anọ (400) anwụrụ na mwakpo ndị RSF mere n’oge adịbeghị anya dịka ụlọọrụ UN siri kwuo .

  4. Igbo bụ Igbo, ụtụtụ oma nụ oo.

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde 16 Eprel, 2025.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga na-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme n’ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka na mba ụwa niile. Chinonso Ugorji na Ikechukwu Kalu ga-emechaa sonyere anyị n’oge ehihe.

    Dịka ụnụ na-esonyere anyị, ka udo chịa na ndụ ụnụ niile.

    Ndewo!

  5. Trump ataala Zelensky ụta maka ịmalite agha ọzọ ka Rọshịa wakporo Yukren

    Onyeisiala Trump kwuru na Onyeisiala Zelensky bụ onye kpatara mwakpo ahụ nke tinyere ndụ ọtụtụ ndị Yukren na nsogbu.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Trump kwuru na Onyeisiala Zelensky bụ onye kpatara mwakpo ahụ nke tinyere ndụ ọtụtụ ndị Yukren na nsogbu.

    Onyeisiala Donald Trump na-achị Amerịka ataala onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky ụta maka ịmalite agha ọzọ n’etiti ha na mba Rọshịa. Nke a na-abịa dịka Rọshịa wakporo obodo Sumy dị na Yukren ma gbuo mmadụ 35 ebe mmadụ 117 meruru ahụ.

    Onyeisiala Trump kwuru na Onyeisiala Zelensky bụ onye kpatara mwakpo ahụ nke tinyere ndụ ọtụtụ ndị Yukren na nsogbu.

    N’okwu ya, Onyeisiala Trump kwuru na ọ dịghị mma iche aka mgba nye mba karịrị gị ma na-atụ anya ka mba ndị ọzọ gbatara gị ọsọ enyemaka.

    Akụkọ kwuru na mwakpo a Rọshịa wakporo Sumy ụbọchị Sọnde 13 Eprel, bụ nke mbụ ya kachasị njo n’afọ 2025.

    N’aka nke ọzọ, odeakwụkwọ otu Nato bụ Mark Rutte gara Yukren ụbọchị Tuzde 15 Eprel, 2025 iji gosi nkwado ha nye mba Yukren n’oge nsogbu a.

    Akụkọ kwuru na mwakpo a Rọshịa wakporo Sumy ụbọchị Sọnde 13 Eprel, bụ nke mbụ ya kachasị njo n’afọ 2025.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Akụkọ kwuru na mwakpo a Rọshịa wakporo Sumy ụbọchị Sọnde 13 Eprel, bụ nke mbụ ya kachasị njo n’afọ 2025.
    Akụkọ kwuru na mwakpo a Rọshịa wakporo Sumy ụbọchị Sọnde 13 Eprel, bụ nke mbụ ya kachasị njo n’afọ 2025.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Akụkọ kwuru na mwakpo a Rọshịa wakporo Sumy ụbọchị Sọnde 13 Eprel, bụ nke mbụ ya kachasị njo n’afọ 2025.
  6. Etu o si kpọtụọ na mmemme Ụzọiyi n’ Uke,Anambara steeti

    Mmanwú Uke

    Ebe foto si, Bon Onwubualili

    Nkọwa foto, Mmanwú dí iche iche gbara n' emume Uzoiyi n'Uke,Anambara Steeti

    Na nsonso a, ama Ositaosili n'Uke dị n’Anambara steeti kpọtụrụ akpọtụ dịka ụmụafọ obodo ahụ n’ọha na n’ụzọ lọtara maka emume Uzoiyi.

    Ụzọiyi bụ mmemme omenala ndị Uke na-eme kwa afọ tupu mmalite oge ọkụkọ ubi.

    Iji merụba emume Uzoiyi, Ụmụafọ Uke jii nri na mmanya kwọọa ndị ọbịa ha,ma jiri ọjị gọọ ọfọ ndụ ma kpee ekpere ọganihu ihe ha ga-akọnye n’ala.

    Mmanwú dí iche iche gbara n' emume Uzoiyi n'Uke,Anambara  Steeti

    Ebe foto si, Bon Onwubualili

    Mmanwú dí iche iche gbara n' emume Uzoiyi n'Uke,Anambara  Steeti

    Ebe foto si, Bon Onwubualili

    Nkọwa foto, Mmanwú dí iche iche gbara n' emume Uzoiyi n'Uke,Anambara Steeti

    Mmọnwụ dí iche iche díka Enyi Nnụnụ, Ọzọdímgba, Ijele wdgz gbara n'ọgbọ na mmemme ahụ.

    Dịka otu okenye Uke bụ Bon Onwubualili si gwa BBC Igbo, ‘ Uzoiyi nke pụtara ụzọ e si aga iyi bụ emume na-adanye n’ụka Afọ mbụ n’ọnwa Eprelu kwa afọ.

    “N’obodo Uke,anyị nwere Mmiri Idezuna na Obiaja. Mmiri abụọ a nwere alụsị. Ya mere tupu mmalite Udummiri, a na-asụ ọhịa toro n’ụzọ mmiri a. Ọ bụ ma a sụchaa ọhịa gara ụzọ mmiri ndị a ka emume a na-eme abalị atọ na-amalịte.”

    Ọ gara n’ihu kọwaa na mmemme ahụ na-amalite Fraide ụbochị Eke ma bie n’Ụbọchịụka Afọ.

    Enyi nnụnụ

    Ebe foto si, Bon Onwubualili

    Nkọwa foto, Enyi Nnunụ so na mmanwụ gbara n'emume Uzọiyi n'Uke
  7. Mmadụ ndị tinyere ego na CBEX atụfuola ọtụtụ ego

    Mmadụ ndị tinyere ego na CBEX atụfuola ọtụtụ ego

    Ebe foto si, Getty Images

    Ọtụtụ ndị Naịjirịa amalitela ịkwa akwa arịrị na soshal midịa dịka ha tụfuchara ọtụtụ ego n’atụmatụ nchekwa ego a kpọrọ CBEX.

    Ndị tinyere ego n’atụmatụ ahụ kwuru na ha enweghị ike ịdọrọ ego kemgbe ụfọdụ ụbọchị mana oge ha gbara mbọ ịdọrọ ego ka ha chọpụtara na e nweghịzi ego ọbụla dị n’ọbaego ha.

    CBEX bụ atụmatụ dijitaalụ e ji etinye ego ma bụrụkwa nke na-eji pasenti otu narị (100%) mụbaa ego ndị e tinyere n’ime otu ọnwa.

    Onye ọbụla tinyere ego na-enwetakwu ego ma ha kpọta onye ọzọ ga-esonye n’atụmatụ ahụ.

    CBEX bụ atụmatụ e ji atụ mgbere ego kripto malitere ọrụ na Naịjirịa n’afọ gara aga.

    Otu nwoke aha ya bụ Ola gwara BBC Pidgin na ya tụfuru ihe ruru narị puku naịra anọ na iri ise (450,000) oge o tinyechara ego n’atụmatụ CBEX.

    Ọnọdụ ahụ emeela ka ụfọdụ ndị ntorobịa iwe juru obi wakpoo ụlọọrụ CBEX dị n’Ibadan ma kwakọrọ nwongwo dị n’ụlọọrụ ha.

    Na mbụ ka ụlọọrụ na-ahụ maka mgbanwerịta ego na Naịjirịa bụ Nigerian Securities and Exchange Commission dọrọ ndị Naịjirịa aka na ntị megide itinye ego n’ụlọọrụ ndị na-ahụ maka ego n’ịntaneetị a na-enyeghị nkwado.

    Ha kwuru na ọ bụ nnukwu arụ itinye ego n’ụlọọrụ ndị ahụ.

  8. Mbụzeala na-achọ ikewapụ anyị n’Umuahia North – Ndị obodo Emede

    Mbụzeala na-achọ ikewapụ anyị n’Umuahia North – Ndị obodo Emede

    Ebe foto si, Asonye

    Ndị obodo Emede kwụụrụ onwe ya n’okpuru ọchịchị Umuahia North akpọkuola gọọmenti Abịa steeti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka n’ihi mbụzeala chọrọ ikewapụ obodo ha.

    Eze na-achị obodo ahụ bụ Eze Allen Okpokiri kpọrọ ya bụ oku arịrịọ na mpaghara ahụ mbụzeala na-enye nsogbu.

    Ọ kọwara na mbụzeala ahụ nwere ike ikewapụ obodo ya na mpaghara steeti ahụ ndị ọzọ ọ bụrụ na e nweghị ihe ọbụla e mere ngwangwa gbasara ya.

    Eze Okpokiri kwuru na ego a ga-eji lebara mbụzeala ahụ anya karịrị ndị obodo ya dịka o gosiri olileanya na aka na-achị Abịa steeti bụ Alex Otti ga-agbatara ndị obodo ya ọsọ enyemaka.

    Dịka o siri kwuo, e nweghị ụzọ ndị ọzọ e si abata obodo ahụ ma kọwaa na ụzọ ahụ sitere Umuagu Ata bụ nke e si aga obodo ndị gụnyere Umuakanu, Umueze, Udide, Umuodudu, Agbo na Ubani Ibeku.

    Ndị ndu obodo tinyere ọnụ n’okwu ahụ gụnyere Chief Innocent Iheukwumere na Chief Lawrence Nwaobiara, ndị kwuru na enyemaka gọọmenti ga-azọpụta obodo ahụ na nkewapụ.

    Mbụzeala na-achọ ikewapụ anyị n’Umuahia North – Ndị obodo Emede

    Ebe foto si, Asonye

  9. Nsogbu ọzọ adapụtara n'etiti NBA na Onye ọchịchị Rịvas Steetị bụ Ibas

    Onye ọchịchị gbatagbata na-achị Rịvas Steetị bụ Ibok-Ete Ibas na Onyeisi otu jikọrọ ndị ọkaiwu na Naịjirịa bụ Afam Osigwe

    Ebe foto si, Afam Osigwe / X na Rivers state Television / Facbook

    Nkọwa foto, Ibok-Ete Ibas na Afam Osigwe

    Otu jikọtara ndị ọkaiwu na Naịjirịa bụ Nigeria Bar Association (NBA) na onye ọchịchị gbatagbata na-achị Rịvas Steetị bụ Ibok-Ete Ibas na-enwe ezigbo nsogbu ugbua.

    Ihe na-esere ha bụ ego nkwado Gọvanọ Sim Fubara e wepụrụ n'oche nyere ndị NBA maka ime ọgbakọ ha na Rịvas Steetị.

    Esemokwu ọhụrụ a bidoro ka onye ọchịchị gbatagbata steeti ahụ bụ Ibok-Ete Ibas gwara ndị NBA ka ha wechita akatamkpo “ego ruru N300,000,000 e si n'akpa steeti ahụ nye ha” dịka akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru steeti ahụ bụ Hector Igbikiowubo ziputara si kwuo.

    Mana onyeisi ndị na-ahazị ọgbakọ NBA nke afọ a bụ Ọkaiwu Emeka Obegolu kwuru na enweghị ego ọbụla ha ga-enwechị enye Rịvas steeti.

    N’okwu ya "anyị adịghị eresi mmadụ ikike ị haziri anyị ọgbakọ anyị na-eme kwa afọ".

    "Ego gọọmenti Rịvas steeti nyere anyị bụ onyinye n'efu ka ọ bụ, enweghị ka o si bụrụ iwu na anyị ga-eme ọgbakọ na steetị ahụ.".

  10. Lee ihe na-eme ugbua n’etiti Peter Obi na Gọvanọ Benue steeti bụ Fada Hyacinth

    Peter Obi na Fada Hyacinth Lormen Alia na ụmụaka

    Ebe foto si, Peter Obi, Fada Hyacinth Lormen Alia / X

    Nkọwa foto, Peter Obi na Fada Hyacinth Lormen Alia

    Peter Obi bụbu Gọvanọ Anambra steeti ma bụrụkwa onye ji bụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị Lebọ patị zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n’afọ 2023 na Gọvanọ na-achị Benue Steeti bụ Fada Hyacinth Lormen Alia enweela nghọtafe.

    Mmadụ abụọ a were nghọtafe n'oge Peter Obi nyibere njem nleta na Benue Steeti nakwa Plateau steeti.

    Na Plateau steeti, Peter Obi gara na Bokkos ga leta ndị ihe na-esiri ike maka ọnọdụ ndị ojiegbe tinyere ha ma nye ha ego nkwado.

    Obi mechere gaa zute Gọvanọ na-achị steeti ahụ bụ Caleb Mutfwang tupuu ọ malite njem ị ga na Benue steeti bụ ebe nghọtafe siri dapụta.

    Lee oge Peter Obi gara Plateau  steeti

    Ebe foto si, Peter Obi / X

    Nkọwa foto, Peter Obi na ndi Bokkos dí na Plateau steeti

    Ọ bụ n'ụzọ ka Peter Obi na-aga Benue steeti ka ọ wetere ozi na-amaja obi si n'ụlọọrụ Gọvanọ Benue steeti bụ Fada Hyacinth Lormen Alia.

    Ọzị ahụ sị na Gọvanọ Alia “amaghị na Peter Obi a ga-eji ndụ ya laa ma ọ bụrụ na ọ bịa na Benue steeti" bụ nke ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Benue steeti bụ Tersoo Kula kesere ndị ntaakụkọ.

    Na nkọwa Peter Obi nyere n’akara X soshal mịdịa ya ka ọ sị na ya gbara mbọ ime ka Gọvanọ Benue mara na ya na-abịa, ebe ya na-aga na ihe ya ga-ime na steeti ahụ.

    Peter Obi, Gọvanọ Plateau steeti bụ Caleb Mutfwang na onye ọzọ

    Ebe foto si, Peter Obi / X

    Nkọwa foto, Peter Obi, Gọvanọ Plateau steeti bụ Caleb Mutfwang na onye ọzọ

    Obi si na ya enweteghị Gọvanọ Benue n’ekwentị mgbe niile ya kpọrọ ya ma kọwaa ihe gara n’etiti ya na onyeisi nchekwa Gọvanọ steeti ahụ bu onye mechere zitere ya ozi na-enyi egwu maka ndụ ya bụ nke ha kesere ndị ntaakụkọ.

    N’okwu ya “e were m mmasị ị ga na n’ụlọakwụkwọ ndị nọọsụ Bishọp rụrụ na Gboko nakwa ogige ndị na-enweghị ụlọ maka ọgbaaghara mere na Benue steeti”

  11. Mmadụ 51 anwụọla na mwakpo mere na Plateau steeti

    Gọvanọ Caleb Mutfwang

    Ebe foto si, Caleb Mutfwang/X

    Nkọwa foto, Gọvanọ Caleb Mutfwang

    Aka na-achị Plateau steeti bụ Gọvanọ Caleb Mutfwang akpọọla nzụkọ ndị nchekwa na steeti ahụ dịka ihe ruru mmadụ iri ise na otu nwụrụ na mwakpo mere ụnyahụ na Plateau steeti nke Naịjirịa.

    O kwuru na ndịagha nnupụisi ruru otu narị wakporo otu obodo na Mọnde 14 Eprel 2025 were merụọ ndị nkịtị ahụ n’ụlọ ha.

    Ndị ọchịchị kwuru na ndị jiegbe malitere ịkwa mbọ ebe niile n’obodo Zike ebe ndị nwụrụ anwụ gụnyere ụmụnwaanyị na ụmụaka.

    Mwakpo a bụ nke kachaa ọhụrụ n’ọgbaghara na-eme na steeti Plateau, ebe a na-enwe esemokwu agbụrụ.

    Cheta na mmadụ iri ise na abụọ nwụrụ oge e nwere ụdịrị mwakpo ahụ n’izu abụọ gara aga.

  12. Amerịka na UK nwere ezigbo ohere inwe nkwekọrịta azụmahịa - Osote Onyeisiala Vance

    Osote Onyeisiala Amerịka Vance

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Osote Onyeisiala Amerịka Vance

    Osote Onyeisiala mba Amerịka JD Vance ekwuola na mba Amerịka na UK nwere ohere iwe nkwekọrịta azụmaahịa dịka Onyeisiala Donald Trump na-ejikere iwepụta tarifu ọhụrụ n’ọgwụ na chiipu.

    Ugbua, mbubata si UK abata Amerịka na-akwụ 10% tarifu dịka ụgbọala, ígwè na aluminom na-akwụ nnukwu ụgwọ mana Vance kwuru na ọchịchị Onyeisiala Trump na-agba mbọ ka ya na ọchịchị Keir Starmer inwe nkwekọrịta.

    Onye ntaakụkọ BBC kwuru na Osote Onyeisiala Vance ekwuchaghị ihe dị mma banyere mmekọ Amerịka na Yurop.

    N’aka nke ọzọ, Amerịka amalitela nnyocha nchekwa banyere semikọdọọtọ na ahịa ọgwụ - nke nwereike ibute nkwụsị anaghị tarifu n’ahịa ọgwụ.

    Mana Onyeisiala Chaịna Xi Jinping gara nje nleta na mpagahara ndịda ọwụwa anyanwụ nke Eshia a kpọọla oku ka Vietnam jikọọ aka megide otu mba imegbu mmadụ n’ahia.

  13. Onyeisiala Trump akwụsịla ijeri dọla abụọ ‘$2bn’ ego mahadum Harvard

    Onyeisiala Trump akwụsịla ijeri dọla abụọ ‘$2bn’ ego mahadum Harvard

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Trump akwụsịla ijeri dọla abụọ ‘$2bn’ ego mahadum Harvard

    Ọchịchị Onyeisiala Donald Trump ekwuola na ọ ga-akwụsị inye ego karịrị ijeri dọla abụọ ‘$2bn’ (£1.5bn) gọọmentị etiti na-enye mahadum Harvard, dịka ọ gachara awa ole na ole ụlọakwụkwọ ahụ jụrụ ime ihe ndị obi ọchịchị Amerịka ‘White House’ chọrọ.

    Ozi Ngalaba Mmụta nke mahadum Harvard wepụtara kwuru na echiche ọ bụ ikike m na-enye nsogbu nke ukwuu na mahadum na kọleji kacha ewu ewu na mba Amerịka.

    Cheta na obi ọchịchị Amerịka ‘White House’ zigara ọtụtụ ihe ha chọrọ na Harvard n’izu gara aga bụ ihe o wepụtara iji mbuso agha megịde mmegbu ndị Juu n’ụlọakwụkwọ.

    Nke a gụnyere mgbanwe n’ọchịchị, etu esi anabata ndị ọrụ na usoro esi anabata ụmụ akwụkwọ.

    Mahadum Harvard jụrụ ihe ndị ahụ ụbọchị Mọnde 14 Eprel 2025 ma kwuo na obi ọchịchị White House chọrọ 'ịchịkwa' ya.

    Mahadum ahụ bụ otu nnukwu ụlọ akwụkwọ n’Amerịka guzogidere nrụgide ọchịchị Onyeisiala Trump iji mgbanwe iwu ha.

    Mgbanwe ndị obi ọchịchị White House na-achọ ga-agbanwe ọrụya ma nyefee nnukwu ikike ya n’aka gọọmentị.

    Onyeisiala Trump na-ebo mahadum ahụ ebubo anaghị chebe ụmụ akwụkwọ Juu mgbe kọleji nọ n’Amerịka mere ngagharịiwe megide agha Gaza.

  14. Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi?

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tuzde 15 Eprel, 2025.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga na-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme n’ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka na mba ụwa niile. Chinonso Ugorji ga-emechaa sonyere anyị n’oge ehihe.

    Dịka ụnụ na-esonyere anyị, ọfọ anyị bụ na ọ ga-adịrị onye ukwu mma ma dịrị onye nta mma.

    Ka udo chịa na ndụ gị!

  15. Ndịagha Naijiria akwaala arịrị na ndị Igbo achọzighị ịbata ọrụ 'Army'

    Ndịagha Naijiria akwaala arịrị na ndị Igbo achọzighị ịbata ọrụ “Army”

    Ebe foto si, Enugu State Government

    Nkọwa foto, Ndịagha Naijiria akwaala arịrị na ndị Igbo achọzighị ịbata ọrụ “Army”

    Ndịagha Naijiria etiela mkpu na ụmụafọ Igbo agbaala ọsọ n’ịrụ ọrụ “Army”.

    Nke a mere ka ndịagha Naịjirịa na-agagharị n’okpuru ọchịchị dị iche iche iji yọọ ụmụ igbo ka ha pụta denye aha na ndị ga-aba ọrụ agha.

    Onyeisi ndịagha nke ọrụ ya bụ ịchọpụta ndị ga-eso ọrụ agha n’afọ 2025 bụ Brigadier General Chima Ekeator bere arịrị si na afọ kwuru afọ ndị Igbo anaghizi ekweta iba ọrụ agha, nke mere ka uru ndi Igbo na-efunarị ha.

    Ekeator kpọkọrọ ndị isi okpuru ọchịchị niile si n’Enugwu, ndị eze obodo niile, ndị isi obodo nakwa ndi ọnụ n’eru n’okwu n’ala igbo gwa ha n’agwọ nọ n’akịrịka n’ihi na ndị Igbo na-achọ itufu oke ha.

    O kwuru “iji maa atụ, afọ a bụ 2025 naanị mmadụ otu nari tinyere akwụkwọ n’Enugwu steeti si na ha chọrọ ibata “army” mana ndị tinyere akwụkwọ na Kaduna di puku atọ”

    Ọ yọrọ ndị ntorobia Enugwu ka ha hapụ asiri akọọrọ ha ma pụta bia were oke ruuru ha n’ọrụ agha Naịjirịa.

    “Ọ bụ asị na ndị igbo nọ n’ọrụ “army” ka a na-eziga n’iru agha ka ha nwụọ. Ọtụtụ ụmụ Igbo dịka mụ onwe m nọ na nnukwu ọkwa dị elu. Nwanne anyị nwoke Chibuzor Ogbuabo bụkwa onye n’elekọta ngwa agha gburu gburu”

    Kọmishọna n’ahụ maka egwuregwu na ndị ntorobịa n’Enugwu bụ Lloyd Ekweremmadu kwuru na ọ bụ ihe mwute na ụmụ Igbo aghọtaghị na nnukwu uru dị n’ọrụ agha.

    Ekweremmadụ bụ onye nọchitere Gọvanọ Enugwu steeti bụ Peter Mbah kwere nkwa na gọọmentị Enugwu ga-enye aka kọwaara ụmụ Enugwu uru ịba ọrụ agha bara.

    Ndị Eze obodo nakwa ndị isi okpuru ọchịchị kwekwara nkwa ịgba mbọ.

    Ndị eze bịara nzukọ ha na ndịagha Naịjirịa

    Ebe foto si, Enugu State Government

    Nkọwa foto, Ndị eze bịara nzukọ ha na ndịagha Naịjirịa
  16. Mmadụ abụọ gụnyere nwa ọnwa itoolu anwụọla n’ihe mberede - Ụlọọgwụ

    Ụfọdụ ndị merụrụ ahụ n'ihe mberede mere n'Uduma ‘junction’ n’Uburu nke Ebonyi steeti.

    Ebe foto si, Agwu Nwogo

    Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị merụrụ ahụ n'ihe mberede mere n'Uduma ‘junction’ n’Uburu nke Ebonyi steeti.

    Ndị njem mmadụ abụọ gụnyere nwa ọnwa itoolu anwụọla n’ihe mberede mere na mpaghara Uduma ‘junction’ n’Uburu nke Ebonyi steeti.

    Ndị ụlọọgwụ kwupụtara na ndị njem abụọ ahụ nwụrụ mgbe e butere ha n’ụlọọgwụ.

    N’aka nke ọzọ ndị njem mmadụ iri abụọ na atọ nwere ihe mmerụ ahụ gụnyere mgbaji aka na ụkwụ na nnukwu mmerụ ahụ n’ụbụrụ.

    Dịka onye akaebe siri kwuo, ụgbọala bu mmadụ iri abụọ na ise gụnyere ụmụaka enweghị njikwa kụkọrọ n’ụgbọala ọzọ ka o ji oke ọsọ agbafe n'apata dị nkọ.

    Nke a mere ka ụgbọala ahụ tụgharịa ugboro atọ ma butere ndị njem ahụ nnukwu mmerụ ahụ.

    Ruo n'ụtụtụ a, ndị ọrịa mmadụ iri na asatọ (18), gụnyere onye ọkwọ ụgbọala, na-anata ọgwụgwọ na ngalaba mberede na gbatagbata nke ụlọọgwụ David Umahi Federal University Teaching Hospital (DUFUTH), na ngalaba nlekọta ahụike.

    E nyere mmadụ anọ ndị njem nwere obere mmerụ ahụ nleta ma hapụ ha ka ha laa.

    Mana otu nwatakịrị dị ọnwa iri na otu nwere nnukwu mmerụ ahụ n’ụbụrụ ya ka nọ n'ọnọdụ dị oke egwu dịka a nabatara ya ugbu a na ngalaba nlekọta kpụ ọkụ n'ọnụ, ebe a na-akwado ya n’iku ume.

    N’akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ụlọọgwụ DUFUTH bụ Agwu Nwogo wepụtara, kwuru na ndị njem ahụ bụ ụmụafọ Ebonyi steeti be n’Imo steeti bụ ndị na-alaghachi ebe ha bi dịka ha gachara olili ozu n’Okporike dị n’Abakaliki.

    Ndị nlekọta ụlọọgwụ ekwupụtala mwute maka ihe ahụ merenụ ma kwe ọhanaeze nkwa na a na-eme ihe niile enwere ike ime iji hụ na ndị merụrụ ahụ nwetara nlekọta ahụike kacha mma.

  17. Onyeisiala Trump ekwuola na iwepụ tarifu n’ekwentị Chaịna mere agaghị anọte aka

    Onyeisiala Trump ekwuola na iwepụ tarifu n’ekwentị Chaịna mere agaghị anọte aka

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Onyeisiala Trump ekwuola na iwepụ tarifu n’ekwentị Chaịna mere agaghị anọte aka

    Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump ekwuola na iwepụ tarifu n’ekwentị na ụfọdụ ngwaọrụ eletrọnịkị ndị ọzọ esi mba Chaịna ebubata n’Amerịka nwereike ọ gaghị anọte aka.

    Cheta na mba Amerịka wepụrụ ụfọdụ ngwaọrụ eletrọnịkị si Chaịna ka ha hapụ ịkwụ 145% tarifu ọchịchị Onyeisiala Trump tinyere na mbubata niile si Chaịna.

    Mana Onyeisiala Trump kwuru na ozi o wepụtara n’akara soshịa midia na ọ dịghị onye ga-agbanarị maka azụmaahịa na-ezighi ezi.

    O kwuru na ngwa teknụzụ ndị Chaịna ka ga-na akwụ tarifu 20% dịka Amerịka ga etinye ya na tarifu dị iche.

    N’aka nke ọzọ, ndị ọrụ Chaịna na mbụ kpọkuru Onyeisiala Trump ka ọ "kagbuo" ụtụisi mbubata, na-agba ya ume ka o mee mezie mmejọ ya.

    Mana Onyeisiala Chaịna Xi Jinping agawala Vietnam, ka ọ na-achọ ịkwalite mmekọrịta azụmaahịa ya n amba dị na mpaghara ndịda ọwụwa anyawụ Eshia n’ihi tarifu onyeisiala Amerịka tinyere na mbubata si Chaịna.

    Cheta na ntugharị Onyeisiala Trump mere na tarifụ n'izu gara aga kpatara nnukwu mgbanwe n'ahịa ego ụwa.

    Ọzọ, mịnịsta na-ahụ maka akụnaụba na Spain Carlos Cuerpo ekwupụtala na ọ na-aga Amerịka iji zute onyeisi ụlọakụ Scott Bessent n’ụbọchị Tuzde.

  18. Mwakpo Rọshịa ahụ gburu ọtụtụ na Yukren bụ mmejọ - Onyeisiala Trump

    Mgbe Rọshịa wakporo obodo Sumy na Yukren

    Ebe foto si, State Emergency Service of Ukraine

    Nkọwa foto, Mgbe Rọshịa wakporo obodo Sumy na Yukren

    Ọtụtụ mba dị n’ọdịda anyanwụ nke ụwa bụ enyi mba Yukren, a katọọla etu Rọshịa siri jiri ogbunigwe wakpoo obodo Sumy dị na Yukren nke gburu mmadụ iri atọ na anọ gụnyere ụmụaka abụọ ma merụọ mmadụ otu narị na iri na asaa (117) ndị ọzọ.

    A tụrụ ogbunigwe abụọ n’etiti obodo n’ụtụtụ ụbọchị Sọnde n’akụkụ Mahadum obodo ahụ na ebe a na-enwe ọgbakọ, nke mere ka ọtụtụ ozu tọgbọrọ n’okporoụzọ.

    Onyeisiala mba Amerịka Donald trump kọwara mwakpo ahụ dịka ihe dị njọ ebe onye ga-ewere ọkwa chanselọ na Jamini, Friedrich Merz, na-ebo Rọshịa ebubo ime mpụ agha.

    Enweghị nkọwa ọ bụla gbasara mwakpo a sitere na Rọshịa, onye ndịagha ya gafere n’okeala dị nso na-akwado maka mbuso agha.

    Mwakpo a na-eme mgbe mba Amerịka bụ ndị kachasị enyere ndịagha Yukren aka, na-achọ nkwụsị agha nke nọ n’afọ nke anọ ya dịka Onyeisiala Trump na-ahụ maka mkparitaụka udo.

    Oge a jụrụ Onyeisiala Trump banyere mwakpo ahụ, o kwuru na bụ ihe jọrọ njọ na a gwara ya na ọ bụ mmejọ mana o nyeghị nkọwa ọzọ.

    Na mbụ, onye nnọchianya Onyeisiala Trump pụrụ iche na Yukren, Lt-Gen Keith Kellogg lara ezumike nká, kwuru na mwakpo a agafeela "usoro ọ bụla dị mma".

  19. Ndị be anyị, ụtụtụ ọma nụ.

    Anyị na-asị ụnụ nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Mọnde 14 Eprel, 2025.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga na-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme n’ala Igbo, Naịjirịa, Afrịka na mba ụwa niile. Michael Ngene ga-emechaa sonyere anyị n’oge ehihe.

    Dịka ụnụ na-esonyere anyị, ọfọ anyị bụ na izu ọhụrụ a ga-amịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Udo dịrị gị!

  20. Ọchịagha Brice Oligui Nguema emeriela ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Gabon

    Tupu e mee ntuliaka ahụ, ọtụtụ mmadụ kwuru na Ọchịagha Nguema gbanwere iwu mba Gabon iji hụ na o nwetara mmeri na ntuliaka ahụ.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Tupu e mee ntuliaka ahụ, ọtụtụ mmadụ kwuru na Ọchịagha Nguema gbanwere iwu mba Gabon iji hụ na o nwetara mmeri na ntuliaka ahụ.

    Ọchịagha Brice Oligui Nguema bu onye nwere ọchịchị n’ike n amba Gabon n’afọ 2023 eturula ugo na ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere n amba ahụ ụbọchị Satọde, 12 Eprel, 2025.

    Akụkọ kwuru na mpụtara ntuliaka ahụ pụtara ihe, gosiri na Ọchịagha Brice Oligui Nguema ji vootu karịrị pasenti 90 merie ntuliaka ahụ.

    Tupu e mee ntuliaka ahụ, ọtụtụ mmadụ kwuru na Ọchịagha Nguema gbanwere iwu mba Gabon iji hụ na o nwetara mmeri.

    E kwuru na e gbochiri ọtụtụ ndị olu ha na-ada ụda na Gabon iso zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka ahụ.

    Mmeri ya pụtara na Ọchịagha Brice Oligui Nguema ga-eji ọkwa ọchịchị mba Gabon gaa n’ihu kemgbe ọ napụrụ Ali Bongo ọchịchị n’ike n’afọ abụọ gara aga.

    Cheta na ezinaụlọ Ali Bongo ji ọkwa ọchịchị mba Gabon kemgbe afọ 1967.