Yukren, Amerịka bịnyere aka na nkwekọrịta akụ na ụba sitere n'okike maka ịkwụsị mwakpo Rọshịa
Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Eprel 2025.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere
Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nụ.
Anyị na-asị ụnụ
nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ ụbọchị nke abụọ n’ọnwa Eprel 2025.
Ekpere anyị
bụ na anyị niile ga-ahụta ihe ọma dịka ụnụ na-esonyere anyị taa.
Ọ bụ
Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga na-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme n'ala
Igbo, Naịjirịa nakwa mba ụwa niile.
Mana Ikechukwu
Kalu na Chinonso Ugorji ga-emechaa sonyere anyị n’oge ehihe.
Ka ọ dịrị
onye ukwu mma ma dịrị onye nta mma oo!
Gọọmenti Ebonyi Steeti anwụchiela Komishọna isii na Onyeisioche Okpuru Ọchịchị maka mpụ
Ebe foto si, Ebonyi State Government
Nkọwa foto, Gọvanọ Francis Nwifuru nwụchiri ndị ahụ maka mpụ
Gọvanọ Francis Nwifuru na-achị Ebonyi steeti anwụchiela Komishọna isii steeti ahụ maka ebubo mpụ.
Nke a na-abịa dịka gọọmenti steeti ahụ kwupụtara na ha na-achọ Komishọna ndị ahụ nakwa ụlọọrụ gọọmenti nyere ọrụ achọ.
Akụkọ kwuru na gọọmenti nyere Komishọna isii ahụ iwu ka ha nnyochaa ma hụ na ụlọọrụ gọọmenti nyere oru ịrụ ụlọ 140 n'obodo Izzo na Amaze maka ndị esemokwu dị n'etiti obodo Ezilo na Ezza Ezilo chụpụrụ n'ụlọ ha.
Onyeisioche kọmitii na-ahụ maka ọrụ ụlọ ahụ bụ Ilang Donates gbara nke a n'anwụ n'Abakaliki isi obodo Ebonyi steeti.
Ọ kwuru obi adịghị Gọvanọ Nwifuru ụtọ maka na ọrụ ahụ bụ nke e kwesịrị ịrụchago ugbua.
Aha Komishọna ndị ahụ a nwuchiri gụnyere Komishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ mahadum bụ Ọkammụta Omari Omaka, Komishọna na-ahụ maka gburugburu bụ Victor Chukwu, Komishọna na-ahụ maka ọdịnala bụ Ifeanyi Ogbuewu, Komishọna na-ahụ maka okpuru ọchịchị na echichi bụ Uchenna Igwe, Komishọna na-ahụ ahụike bụ Dọkịnta Moses Ekuma, Komishọna na-ahụ maka nleta ọrụ bụ Felix Igboke na onyeisioche okpuru ọchịchị Afikpo bụ Timothy Nwachi.
Tinubu agbatịala oge ọrụ Nandap dịka onyeisi ụlọọrụ Immigration
Ebe foto si, Bayo Onanuga/X
Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu enyela nkwado ka a
gbatikwuo oge ọrụ onyeisi ụlọọrụ Immigration bụ Kemi Nanna Nandap ruo n’abalị
31 Disemba, 2026.
Nke a dị n’ozi onye ndụmọdụ pụrụiche Onyeisiala na-ahụ maka
mgbasaozi bụ Bayo Onanuga tinyere aka na ya.
Onanuga kwuru na Nandap malitere ọrụ n’ụlọọrụ Immigration n’afọ
1989 mana Tinubu họpụtara ya dịka onye
Comptroller-General nke ụlọọrụ ahụ n’abalị mbụ nke ọnwa Maachị, 2024 dịka a tụrụ
anya na ọ ga-akwụsị ọrụ n’abalị 31 nke ọnwa Ọgọst, 2025.
“Dịka onyeisi ụlọọrụ Immigration, a hụtala agamniihu n’ọrụ e
tinyere ha n’aka tinyere ezi nlekọta okeala, ibugo usoro ndebanyeaha n’ogogo ọlọrọọhụrụ
nakwa ụkpụrụ nchekwa obodo,” ka Onanuga kọwara.
Ọ gbakwunyere na Tinubu na-ekele Nandap maka iti ịgba n’ọrụ
ma gbaa ya ume ka ọ gaa n’ihu na-emejupụta ebumnobi ụlọọrụ Immigration.
Ọhanaeze eweela iwe dịka otu nwoke kwuru na ya na-alụ nwata nwaanyị dị afọ asatọ na-efu efu na Sọmalịa
Ebe foto si, Mohamed Salh
Iwe na ọnụma ejula ndị mmadụ obi na mba Sọmalịa dịka a chọpụtara
na nwata nwaanyị dị afọ asatọ furu kemgbe ọnwa isii bi n’ụlọ otu nwoke kwuru na
ọ bụ di ya.
Ezinaụlọ nwata ahụ bi na mpaghara Puntland kwupụtara ya dịka
onye na-efu efu n’ọnwa Septemba gara aga.
Ka ọnwa ole na ole gasịrị, a chọpụtara na nna nwata ahụ nyere
nkwado ka ọ lụọ otu okenye aha ya bụ Sheikh Mahmoud.
Ndị nchekwa wakporo ụlọ nwoke ahụ n'izuụka gara aga ma ji ike
banye n’ime ya dịka ha hụrụ na nwoke ahụ kpọchiri onwe ya na nwata ahụ n’ime ụlọ.
Ọnọdụ ahụ butere iwe na ọnụma na soshal midịa nakwa ngagharịiwe
n’isi obodo Sọmalịa bụ Mogadishu.
O mekwara ka a malite inwe nrụrịtaụka ọhụrụ gbasara iwu ndị
na-echekwa ụmụaka dịka a na-enweghị afọ dị n’iwu maka alụmdi na nwunye.
“Ihe kachasị atụ n’anya bụ ebubo ntọrị nakwa ozi e nwetara
na ezinaụlọ nwata ahụ amaghị ebe ọ nọ kemgbe ọtụtụ ọnwa,” ka Fadumo Ahmed bụ
onyeisi otu na-ahụ maka ikike mmadụ bụ Somali Women Vision Organisation gwara
BBC.
“Anyị nwere ntụkwasịobi na ụlọọrụ ndị maara ọrụ ha ga-eme ihe niile kwesịrị ekwesị n’okpuru iwu,” ka o kwuru.
Nwanne nna nwata ahụ kwuru na nwanne ha nwaanyị si n’ụlọ ha
dị na Bosaso kpọrọ nwata ahụ n’ọnwa Septemba gara aga. Nwanne ha nwaanyị ahụ sịrị
na ya na-eduga nwata ahụ ka ọ hụ nwanne nna ya ọzọ.
Ma ka ọnwa ole na ole gasịrị, ihe onyonyoo fesara ebe niile
ma gosi nwata ahụ ebe ọ na-agụ Koran.
Ezinaụlọ ya malitere ịchọgharị nwata ahụ ma mechaa chọpụta
na ọ nọ na mpaghara Carmo, bụ ebe ya na Sheikh Mahmoud bi.
Mmadụ anọ
anwụọla dịka mba Izrel siri n’elu tụọ ogbunigwe na mpaghara ndịda isi obodo
Beirut agbanyeghị nkwekọrịta nkwụsị ọgụ dị n'etiti mba Izrel na ndịagha nnupụisi
Hezbollah.
Mịnịstrị ahụike
nke Lebanọn kwuru na ogbunigwe ahụ merụrụ mmadụ asaa ahụ.
Mwakpo Izrel
ahụ bụ nke abụọ na-eme na mpaghara Dahieh, ebe Hezbollah nwere ọnọdụ siri ike
n'agbanyeghị nkwekọrịta nkwụsị agha malitere n’onwa Nọvemba.
Ndịagha Izrel
kwuru na ha chọrọ otu n'ime ndi otu Hezbollah onye nyere ndị Hamas aka hazie mwakpo
ha mere ndị nkịtị Izrel mana enwebeghị ihe ọbụla Hezbollah kwuru banyere mwakpo
a.
Lebanon's
President Joseph Aoun condemned the strike, calling it a dangerous warning.
Onyeisiala mba
Lebanon bụ Joseph Aoun katọrọ mwakpo a, ma kwuo na ọ ihe ịdọ aka na ntị dị njọ.
Praịm Mịnịsta
Lebanọn Nawaf Salam kwuru na mwakpo ahụ megịdere nkwekọrịta nkwụsị agha nke ha na
Izrel nwere.
Cheta na ụbọchị
Fraịde gara aga bụ 28 Maachị 2025, bụ nke mbụ Izrel na-awakpo Beirut kemgbe
nkwekọrịta nkwụsị agha malitere iji nwete agha ọnwa iri na atọ dị n’etiti Izrel
na Hezbollah na njebede.
Edeoga agbaala Lebọ Pati arụkwaghịm banye PDP
Ebe foto si, Enugu State Government
Nkọwa foto, Edeoga agbaala Lebọ Pati arụkwaghịm banye PDP
Onye jibu ọkọrọtọ
Lebọ Pati were zọọ ọkwa gọvanọ Enugwu steeti na ntuliaka e mere n’afọ 2023 bụ Chijioke
Edeoga alaghachitela na Peoples Democratic Party (PDP) dịka ọ gbara Lebọ Pati arụkwaghịm.
Onyeisi oche
pati PDP na steeti ahụ bụ Martins Chukwunweike na ndị ọchịchị ndị ọzọ nabatara Edeoga
na ndị na-akwado ya n’ụlọọrụ pati ahụ dị n’Enugwu n’abalị Mọnde 31 Maachị 2025.
Edeoga
kelere Gọvanọ Peter Mbah na ndị Eha-Amufu Ward III dị n’Isi-Uzo LGA, na ndị isi
otu pati PDP na steeti ahụ maka ime ka nlọghachi ya mezue.
Ọ kpọkuru ndị
mmadụ ka ha jikọọ aka ọnụ kwado ezigbo ọrụ Gọvanọ Mbah na-arụ na steeti ahụ.
Ebe foto si, Enugu State Government
Nkọwa foto, Chijioke Edeoga
Cheta na Edeoga na ndị isi pati PDP n’Enugwu steeti nwere nzukọ n’ọnwa Jenụwarị 2025 nke mere ka akụkọ banyere ịlaghachite ya malite efegharị ebe ọbụla.
Ndị Zimbabwe
amalitela ngagharịiwe iji mee ka Onyeisiala Zimbabwe Emmerson Mnangagwa gbaa arụkwaghịm.
Akụkọ kwuru
na ọtụtụ ndị mmadụ apụtaghị isonye na ngagharịiwe ahụ n’ihi n’ọtụtụ ndị ọrụ
nchekwa jupụtara n’okporoụzọ niile.
Ọ bụ naanị
mmadụ ole na ole sonyere ngagharịiwe ahụ mana ndị uweojii chụsara ha.
Cheta na otu
ndịagha iwe na-ewe, bụ ndị boro Onyeisiala Mnangagwa ebubo nrụrụaka yana ịchọọ ịrapagidesi
ike n'ọchịchị.
Onyeisi ndị
na-eme ngagharịiwe ahụ bụ Blessed Geza gwara ndị Zimbabwe n’akara X ka ghara ịbụ
ndị ụjọ.
Cheta na Mnangagwa
ghọrọ onyeisiala n'afọ 2017 mgbe a chụpụrụ onye bụbu onyeisiala Robert Mugabe nọrọ
ogologo oge, mana ọchịchị ya ugbu a bụ nke abụọ na nke ikpeazụ.
Geza chọrọ ka
osote onyeisiala Constantine Chiwenga weghaara ọchịchị n’aka Mnangagwa, kpọrọ
ndị Zimbabwe ka ha jupụta n’okporoụzọ dịka ọchọrọ ịkwada ọchịchị onyeisiala Mnangagwa.
N’otu ihe
onyonyo na-efegharị na soshal midia, ka e gosiri etu ndị uweojii si jiri ‘teargas’
na-achụpụ igwe mmadụ gbakọrọ na President Robert Mugabe Square na Harare.
Ndịagha ọchịchị Sahel amanyela ụtụ mbubata 0.5% na ngwaahịa ECOWAS
Ndịagha
ọchịchị ọdịda anyanwụ Afrika na-achị mba Mali, Niger na Burkina Faso amanyela ụtụ mbubata 0.5% na ngwaahịa
si ECOWAS iji kwado otu mpaghara ahụ bụ Alliance of Sahel States (AES) ha
hiwere ọhụrụ.
Nke a na-eme dịka mba atọ ahụ na-aga n'ihu na njikọta
akụ na ụba na ndọrọ ndọrọ ọchịchị kemgbe ha kewapụrụ n’otu mpaghara ọdịda
anyanwụ Afrịka bụ ECOWAS.
Ndịagha ọchịchị
mba atọ ahụ kwupụtara na ụtụ ahụ ga-amalite ozugbo na mbubata niile sitere na mpụga okeala
ha. Ha kwukwara na ọ gaghị metụta ihe enyemaka mmadụ.
Cheta na mba
atọ ahụ wepụrụ onwe ha n’otu ECOWAS na mbido afọ a dịka ha na-ebo ECOWAS ebubo na
ha ekweghị ịkwado ọgụ ha na-alụ megide ọgbaaghara ndịagha nnupụisi Islamist.
N’aka nke ọzọ,
ọpụpụ mba atọ ahụ yana imanye ụtụ mbubata ga-ewebata ihe mgbochi ahia kwụsịrị ọtụtụ
iri afọ nke azụmaahịa efu n’ọdịda anyanwụ Afrika.
Chetakwa na otu
ECOWAS machiri mba atọ ahụ ma kwuo ka ha nweghachite ọchịchị onye kwuo uche ya
mana ha mechara wepụ mmachi ahụ na-emezughị ebumnauche ha.
Myanmar amalitela iru uju otu izu dịka olileanya ịchọta ndị lanarịrị ala ọmajijiji na-ebelata
Ebe foto si, BBC Burmese
Nkọwa foto, Myanmar amalitela iru uju otu izu dịka olileanya ịchọta ndị lanarịrị ala ọmajijiji na-ebelata
Ihe karịrị
mmadụ puku abụọ anwụọla n’ala ọmajijiji mere na Myanmar yana na Thailand nakwa
Chaịna n’ụbọchị Fraịde 28 Maachị 2025.
Ọchịchị ndịagha
nke Myanmar ekwupụtala iru uju otu izu ya na obere oge ịgbachi nkịtị n’ụbọchị
Tuzde oge ọkụrụ elekere 12:51 na mpaghara ahụ, nke bụkwa oge ala ọmajijiji ahụ
mere na Fraịde.
N’agbata obi
ha bụ Thailand, mmadụ iri abụọ anwụọla ebe a chụpụrụ ọtụtụ puku mmadụ n’ụlọ
gbawara agbawa na Bangkok.
Dịka ndị nchọta
ndị dị ndụ ka na-achọ ndị lanarịrị ihe mberede ahụ mana olilianya ịchọta ndị dị
ndụ na-ebelata dịka ọ gafechara abalị atọ ala ọmajijiji ahụ mechaara.
Ụlọọrụ UN
kwuru na ala ọmajijiji ahụ emela ka ọnọdụ ihe enyemaka mmadụ kawanye njọ na
Myanmar bụ mba nọ n’agha obodo kemgbe afọ anọ.
Agbanyeghị
ihe ala ọmajijiji ahụ mebiri, akụkọ kwuru na ndị isi ndịagha ka na-atụ
ogbunigwe megide otu ndị nnupụisi na-akwado ọchịchị onye kwuo uche ya.
Ebe foto si, BBC Burmese
Nkọwa foto, Myanmar amalitela iru uju otu izu
Igbo bụ Igbo, ụnụ abọọla chi?
Igbo bụ Igbo, ụnụ abọọla chi?
Anyị na-asị gị nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tuzde Eprel 1 2025.
Ọfọ anyị bụ ka ọnwa Eprel mịtara anyị niile mkpụrụ ọma n'otu n'otu.
Ndị ọrụ anyị nọ n'ọgbọ n'ụtụtụ a bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu. Ha ga na-ewetara gị akụkọ ihe na-eme n'ala Igbo, Naịjirịa nakwa mba ụwa niile.
Michael Ngene na Chinonso Ugorji ga-esonyere anyị n’oge ehihe.